Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 1

1 Ma eze, bú Devid, ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; ha we chiri uwe kpuchie ya aru, ma aru-ya ekpoghi ọku.

2 Ndi-orù-ya we si ya, Ka ha chọrọ onye-nwem, bú eze, nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ka o guzo kwa n’iru eze, nēkposo kwa ya aru ọku; ka o dina kwa n’obi-gi, ka aru onye-nwem, bú eze, we kpo ọku.

3 Ha we chọ nwa-ab͕ọghọ mara nma n’ókè-ala nile nke Israel, we chọta Abishag onye Shunem, me ka ọ biakute eze.

4 Nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma nke-uku; o we nēkposo eze aru ọku, je-kwa-ra ya ozi; ma eze amaghi aru-ya.

5 Ma Adonaija nwa Hagit nēweli onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala, na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n’iru ya.

6 Ma ọ dighi mb͕e nna-ya mere ihe nēwuta ya n’ubọchi ndu-ya nile, si, Gini mere i meworo otú a? ọzọ kwa, onye ahu bu onye di nma n’aru nke-ukwu; nne-ya mu-kwa-ra ya mb͕e amusiri Absalom.

7 Okwu-ya we di n’ebe Joab nwa Zeruaia nọ, na n’ebe Abaiata onye-nchu-àjà nọ: ha we so Adonaija nēyere ya aka.

8 Ma Zedok, bú onye-nchu àjà, na Benaia nwa Jehoiada, na Netan, bú onye-amuma, na Shimai, na Rei, na ndi-dike ndi Devid nwere, esoghi kwa Adonaija.

9 Adonaija we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi na anu mara abuba chua àjà n’akuku nkume Zohelet, nke di n’akuku En-rogel; o we kpọ umu-nne-ya nile, bú umu-ndikom eze, na ndikom nile nke Juda, bú ndi-orù eze;

10 ma ọ kpọghi Netan, bú onye-amuma, na Benaia, na ndi-dike ahu, na Solomon, bú nwa-nne-ya.

11 Netan we gwa Bat-sheba, bú nne Solomon, okwu, si, Ì nughi na Adonaija nwa Hagit aghọwo eze, ma Devid, bú onye-nwe-ayi, amaghi?

12 Ma ub͕u a, biko, bia, ka m’dua gi ọdu, ka i we wepuga ndu-gi na ndu nwa-gi, bú Solomon.

13 Je bakwuru eze, bú Devid, si ya, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bughi gi onwe-gi ṅuru orù-gi nwayi iyi, si, N’ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m’nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n’oche-ezem? ọ̀ bu kwa gini mere Adonaija ghọworo eze?

14 Le, mb͕e i nọ nākpayere eze uka n’ebe ahu, mu onwem gēso kwa gi n’azu bata, kwujue okwu-gi nile.

15 Bat-sheba we bakuru eze rue ime-ulo: ma eze aghọwo agadi nke-uku: Abishag, bú nwayi Shunem, nēje-kwa-ra eze ozi.

16 Bat-sheba we rube isi, kpọ isi ala nye eze. Eze we si, Gini ka i nāchọ?

17 Ọ si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi were Jehova, bú Chineke-gi, ṅuara orù-gi nwayi iyi, si, N’ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m’nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n’oche-ezem.

18 Ma ub͕u a, le, Adonaija aghọwo eze; ma ub͕u a, onye-nwem, bú eze, i maghi ya:

19 o we chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha: ma ọ kpọghi Solomon, bú orù-gi.

20 Ma gi onwe-gi, onye-nwem, bú eze, anya Israel nile dikwasi gi, ka i we gosi ha onye gānọkwasi n’oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri.

21 Ma emeghi otú a, o gēru kwa, mb͕e onye-nwem, bú eze, soro nna-ya-hà dina n’ọnwu, na agāgu mu onwem na nwam, bú Solomon, na ndi-nmehie.

22 Ma, le, mb͕e ọ nọ nākpayere eze uka, Netan, bú onye-amuma, bata-kwa-ra.

23 Ha we gosi eze, si, Le, Netan, bú onye-amuma. O we bata n’iru eze, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n’ala.

24 Netan we si, Onye-nwem, bú eze, Ọ̀ bu gi onwe-gi siri, Adonaija gābu eze mb͕e m’nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n’oche-ezem?

25 N’ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n’iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu.

26 Ma ọ kpọghm, ọbuná mu onwem, bú orù-gi, ọ kpọghi kwa Zedok, bú onye-nchu-àjà, ọ kpọghi kwa Benaia nwa Jehoiada, ọ kpọghi kwa Solomon, bú orù-gi.

27 Ọ̀ gābu na ihe a sitere n’aka onye-nwem, bú eze, ma i meghi ka ndi-orù-gi mara onye gānọkwasi n’oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri?

28 Eze, bú Devid, we za, si, Kpọrọnum Bat-sheba. O we bata n’iru eze, guzo n’iru eze.

29 Eze we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,

30 n’ezie dika m’were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N’ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m’nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi n’oche-ezem n’ọnọdum; n’ezie otú a ka m’gēme ta.

31 Bat-sheba we rube isi kpuchie iru-ya n’ala, kpọ isi ala nye eze, si, Ka onye-nwem, bú eze Devid, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

32 Eze, bú Devid, we si, Kpọrọnum Zedok, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Netan, bú onye-amuma, kpọ kwa Benaia nwa Jehoiada. Ha we bia n’iru eze.

33 Eze we si ha, Chirinu ndi-orù onye-nwe-unu tiyere onwe-unu, me ka Solomon, bú nwam, nọkwasi n’inyinya mule nke m’nwere, me-kwa-nu ka ọ ridarue Gaihon:

34 ka Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, te ya manu n’ebe ahu ibu eze Israel: fù-kwa-nu opì, si, Ka eze, bú Solomon, di ndu.

35 Unu gēso kwa ya n’azu rigota, ọ gābia kwa nọkwasi n’oche-ezem; ya onwe-ya gābu kwa eze n’ọnọdum: ọ bu kwa ya ka m’nyeworo iwu ibu onye-ndú Israel na Juda.

36 Benaia nwa Jehoiada we za eze, si, Amen: ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem eze, si otú a.

37 Dika Jehova nọyeworo onye-nwem, bú eze, Ya nọyere Solomon otú a, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze onye-nwem, bú eze Devid.

38 Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, we rida, me ka Solomon nọkwasi n’inyinya mule nke eze, bú Devid, me ka o jerue Gaihon.

39 Zedok, bú onye-nchu-àjà, we si n’Ulo-ikwū were mpi manu ahu, te Solomon. Ha we fùa opì-ike; ndì Israel nile we si, Ka eze, bú Solomon, di ndu.

40 Ndi Israel nile we so ya n’azu rigo, ndi Israel nēb͕u kwa ọ̀jà, nāṅuri kwa oké ọṅù, ala we b͕awa n’olu-ha.

41 Adonaija na ndi nile akpọrọ, bú ndi ya na ha nọ, we nu ya mb͕e ha onwe-ha risiri ihe. Joab we nu olu opì-ike ahu, si, Gini mere olu a nke obodo nāb͕a aghara?

42 Mb͕e ọ nọ nēkwu okwu, le, Jonatan nwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, biara: Adonaija we si, Bata; n’ihi na nwoke bu dìnkpà ka i bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka i nēzì.

43 Jonatan we za, si Adonaija, N’ezie onye-nwe-ayi, bú eze Devid, emewo Solomon eze:

44 eze we ziga Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, tiyere ya, ha emewo kwa ka ọ nọkwasi inyinya mule eze nwere:

45 Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, etewo kwa ya manu ibu eze na Gaihon: ha esiwo kwa n’ebe ahu rigo nāṅuri ọṅu, obodo we b͕a aghara. Nka bu olu unu nuworo,

46 Ọzọ kwa, Solomon anọkwasiwo n’oche-eze nke ala-eze.

47 Ọzọ kwa, ndi-orù eze biara igọzi onye-nwe-ayi, bú eze Devid, si, Chineke-gi me ka aha Solomon di nma kari aha-gi, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze-gi: eze we kpọ isi ala n’elu ihe-ndina-ya.

48 Ọzọ kwa, otú a ka eze siri, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye nyeworom ta onye nānọkwasi n’oche-ezem, anyam nāhu kwa ya.

49 Ndi nile akpọrọ akpọ ndi Adonaija nwere we ma jijiji, bilie, je, nwoke ọ bula n’uzọ-ya.

50 Ma Adonaija turu egwu n’ihi Solomon; o we bilie, je, jide mpi ebe-ichu-àjà.

51 Ewe gosi Solomon, si, Le, Adonaija nātu egwu eze, bú Solomon: ma, le, o jidewo mpi ebe-ichu-àjà aka, si, Ka eze, bú Solomon, buru uzọ ṅuaram iyi na ọ gaghi-ewere mma-agha me ka orù-ya nwua.

52 Solomon we si, Ọ buru na ọ ghọ onye nēme nke-ọma, ọ dighi otù nime agiri-isi-ya gāda n’ala: ma ọ buru na ahuta ihe ọjọ n’aru ya, ọ gānwu kwa.

53 Eze, bú Solomon, we ziga, ha we me ka o si n’ebe-ichu-àjà rida. Ọ we bia kpọ isi ala nye eze Solomon: Solomon we si ya, La n’ulo-gi.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 2

1 Ma ubọchi Devid biaruru nso ka ọ nwua; o we nye Solomon, bú nwa-ya, iwu, si,

2 Mu onwem nēje n’uzọ uwa nile: ma di ike, buru kwa nwoke;

3 debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, bú Chineke-gi, ije n’uzọ-Ya nile, idebe ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n’iwu, na ikpé-ya nile, na ihe-àmà-Ya nile, dika ihe edere n’iwu Moses si di, ka i we nwe uche n’ihe ọ bula nke i nēme, na n’ebe ọ bula i nēche iru-gi:

4 ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike nke O kwuru bayerem, si, Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n’irum n’ezi-okwu n’obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agaghi-ebipu n’ulo-gi onye nwe inọdu n’oche-eze Israel, ka O kwuru.

5 Ọzọ kwa, gi onwe-gi amawo ihe Joab nwa Zeruaia merem, ihe o mere ndi-isi abua nke usu-ndi-agha nile nke Israel, bú Abnea nwa Nea na Amasa nwa Jeta, na o b͕uru ha, we wusi ọbara agha n’udo, tiye ọbara agha n’ihe-ọkiké-ya nke di n’úkwù-ya, na n’akpukpọ-ukwu-ya nke di n’ukwu-ya abua.

6 Gi me kwa dika amam-ihe-gi si di, ma ekwela ka isi-awọ-ya rida n’ala-mọ n’udo.

7 Ma mere umu Bazilai, bú onye Gilead, ebere, ka ha di kwa n’etiti ndi nēri ihe na table nke gi: n’ihi na otú a ka ha biakuterem mb͕e m’b͕apuru n’iru Absalom, bú nwa-nne-gi.

8 Ma, le, ọ di n’aka-gi, bú Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke Bahurim, onye ya onwe-ya kọcharam nkọcha jọb͕uru onwe-ya n’ubọchi m’jere Mahanaim: ma ya onwe-ya ridara izutem na Jọdan, m’we were Jehova ṅuara ya iyi, si, M’gaghi-ewere mma-agha me ka i nwua ma-ọli.

9 Ma ub͕u a agula ya n’onye ikpe nāmaghi, n’ihi na onye mara ihe ka i bu; i gāmara kwa ihe i gēme ya, ma i gēme ka isi-awọ-ya rida n’ala-mọ n’ọbara.

10 Devid we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’obodo Devid.

11 Ma ubọchi Devid bu eze Israel di ọgu arọ abua: arọ asa ka ọ bu eze na Hebron, orú arọ na iri na atọ ka ọ bu kwa eze na Jerusalem.

12 Solomon we nọkwasi n’oche-eze Devid nna-ya: ewe me ka ala-eze-ya guzosie ike nke-uku.

13 Adonaija nwa Hagit we biakute Bat-sheba nne Solomon. Ọ si, Ọ̀ bu n’udo ka i biaworo? Ọ si, Ọ bu n’udo.

14 Ọ si kwa, Enwerem okwu igwa gi. Ọ si, Kwue.

15 Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m’buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n’ihi na o sitere n’aka Jehova diri ya.

16 Ma ub͕u a otù aririọ ka mu onwem nāriọ n’aka-gi, achughachila irum. Ọ si ya Kwue.

17 Ọ si, Biko, si Solomon, bú eze, (n’ihi na ọ gaghi-achughachi iru-gi,) ka o nyem Abishag, bú nwayi Shunem, na nwunye.

18 Bat-sheba we si, Ọ di nma; mu onwem gāgwara gi eze okwu.

19 Bat-sheba we bakuru eze, bú Solomon, igwa ya okwu bayere Adonaija. Eze we bilie izute ya, we kpọ isi ala nye ya, nọkwasi n’oche-eze-ya, dọbara nne eze oche-eze; o we nọdu n’aka-nri-ya.

20 Ọ si, Ọ bu aririọ ntà ka mu onwem nāriọ n’aka-gi; achughachila irum. Eze we si ya, Riọ, nnem: n’ihi na m’gaghi-achughachi iru-gi.

21 Ọ si, Ka ewere Abishag, bú nwayi Shunem, nye Adonaija, bú nwa-nne-gi, na nwunye.

22 Eze, bú Solomon, we za, si nne-ya, N’ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāriọrọ Adonaija Abishag, bú nwayi Shunem? riọ-kwa-ra ya ala-eze; n’ihi na ya onwe-ya bu nwa-nnem nke-okenye; riọrọ ya ala-eze, riọ-kwa-ra Abaiata, bú onye-nchu-àjà, riọ-kwa-ra Joab nwa Zeruaia.

23 Eze, bú Solomon, we were Jehova ṅua iyi, si, Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ọ bughi imegide ndu-ya ka Adonaija kwuworo okwu a.

24 Ma ub͕u a Jehova nādi ndu, Onye meworo ka m’guzosie ike, O me kwa ka m’nọkwasi n’oche-eze Devid, bú nnam, Jehova Onye mewo-kwa-ram ulo, dika O kwuru, n’ezie agēme ka Adonaija nwua ta.

25 Eze, bú Solomon, we zìe ozi n’aka Benaia nwa Jehoiada; o we dakwasi ya, o we nwua.

26 Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n’Anatot, rue ubi-gi; n’ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m’gaghi-eme ka i nwua n’ubọchi ta, n’ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n’iru Devid, bú nnam, na n’ihi na ewedara gi n’ala n’ihe nile nke ewedara nnam n’ala nime ya.

27 Solomon we chupu Abaiata ka ọ ghara iburu Jehova onye-nchu-àjà; ka o we me ka okwu Jehova rè, bú nke O kwuru bayere ulo Ilai nime Shailo.

28 Akukọ ahu we rue Joab nti: n’ihi na Joab wezugara onwe-ya iso Adonaija n’azu, ọ bu ezie na o wezugaghi onwe-ya iso Absalom n’azu. Joab we b͕alaga n’Ulo-ikwū Jehova, jide mpi ebe-ichu-àjà.

29 Ewe gosi eze, bú Solomon, si, Joab ab͕alagawo n’Ulo-ikwū Jehova, ma, le, ọ nọ n’akuku ebe-ichu-àjà. Solomon we ziga Benaia nwa Jehoiada, si, Je, dakwasi ya.

30 Benaia we biarue Ulo-ikwū Jehova, si ya, Otú a ka eze siri, Puta. Ọ si, É-è; kama n’ebe a ka m’gānwu. Benaia we weghachiri eze okwu, si, Otú a ka Joab kwuru, ọ bu kwa otú a ka ọ zaram.

31 Eze we si ya, Me dika o kwuworo, dakwasi ya, lì kwa ya; ka i we si n’ebe m’nọ na n’ebe ulo nnam nọ wezuga ọbara awusiri n’efu, nke Joab wusiri.

32 Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n’isi-ya, n’ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.

33 Ọbara-ha gālaghachi kwa n’isi Joab, na n’isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.

34 Benaia nwa Jehoiada we rigo, dakwasi ya, me ka ọ nwua; ewe lìe ya n’ulo-ya n’ọzara.

35 Eze we tiye Benaia nwa Jehoiada n’ọnọdu-ya ka ọ buru onye-isi usu-ndi-agha: Zedok, bú onye-nchu-àjà, ka eze tiyere n’ọnọdu Abaiata.

36 Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Wuere onwe-gi ulo na Jerusalem, biri n’ebe ahu, esi-kwa-la n’ebe ahu pua je ebe ọ bula.

37 O gēru kwa, n’ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n’isi-gi.

38 Shimai we si eze, Okwu a di nma: dika onye-nwem, bú eze, kwuworo, otú a ka orù-gi gēme. Shimai we biri na Jerusalem ọtutu ubọchi.

39 O rue, n’ọgwugwu arọ atọ, na ndi-orù abua Shimai nwere b͕akuru Ekish, nwa Meaka, eze Gat. Ha we gosi Shimai, si, Le, ndi-orù-gi nọ na Gat.

40 Shimai we bilie, jikwa inyinya-ibu-ya, jerue Gat, jekuru Ekish, ichọ ndi-orù-ya: Shimai we je, me ka ndi-orù ya si na Gat biaghachi.

41 Ewe gosi Solomon na Shimai esiwo na Jerusalem je rue Gat, lata kwa.

42 Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Èmeghm ka i were Jehova ṅua iyi, m’we b͕ara gi àmà, si, Mara nke-ọma, na i ghaghi inwu n’ubọchi i gāpu je n’ebe ọ bula? i we sim, Ọ di nma, bú okwu m’nuru.

43 Ọ̀ bu kwa gini mere i nēdebeghi iyi Jehova, na ihe enyere n’iwu nke m’nyere gi n’iwu?

44 Eze si-kwa-ra Shimai, Gi onwe-gi mara ihe ọjọ nile nke obi-gi mara, nke i mere Devid, bú nnam: Jehova gēme kwa ka ihe ọjọ gi laghachi n’isi-gi.

45 Ma eze, bú Solomon, bu onye agọziri agọzi, agēme kwa ka oche-eze Devid guzosie ike n’iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi.

46 Eze we nye Benaia nwa Jehoiada iwu; ọ pua, dakwasi ya, ọ we nwua. Ewe me ka ala-eze guzosie ike n’aka Solomon.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 3

1 Solomon we ghọ ọgọ Fero eze Ijipt, kuru nwa-nwayi Fero, me ka ọ bata n’obodo Devid, rue mb͕e o wusiri ulo-ya, na ulo Jehova, na mb͕idi Jerusalem buruburu.

2 Nání na ndi Israel nāchu àjà n’ebe nile di elu, n’ihi na ọ dighi ulo ewuru aha Jehova rue mb͕e ahu.

3 Ma Solomon huru Jehova n’anya, nēje ije n’ukpuru nile nke Devid, bú nna-ya: ọ bu nání na ya onwe-ya nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe di elu.

4 Eze we jerue Gibeon ichu àjà n’ebe ahu; n’ihi na nke ahu bu oké ebe di elu: nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri ka Solomon surere n’elu ebe-ichu-àjà ahu.

5 Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M’gēnye gi.

6 Solomon we si, Gi onwe-gi emeworo orù-Gi, bú Devid nnam, ebere uku, dika o jere ije n’iru Gi n’ezi-okwu na n’ezi omume, na nime obi ziri ezi n’ebe I nọ; I we debere ya ebere uku a, nye ya nwa-nwoke nke nānọkwasi n’oche-eze-ya, dika ọ di ta.

7 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chinekem, Gi onwe-gi emewo orù-Gi eze n’ọnọdu Devid, bú nnam: ma mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata.

8 Orù-Gi nọ kwa n’etiti ndi-Gi I rọputaworo, ndi bara uba, ndi anādighi-aguta ha, ndi anādighi-agu kwa ha ọnu, n’ihi iba-uba-ha.

9 Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n’ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?

10 Okwu-ya we di nma n’anya Onye-nwe-ayi, na Solomon riọrọ ihe a.

11 Chineke we si ya, N’ihi na i riọrọ ihe a, ma i riọghi nye onwe-gi ọtutu ubọchi; i riọghi kwa àkù nye onwe-gi, i riọghi kwa ndu ndi-iro-gi; kama i riọworo onwe-gi nghọta inu ikpé;

12 le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n’azu gi.

13 Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n’etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile.

14 Ọ buru kwa na i je ije n’uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M’nyere n’iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M’gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.

15 Solomon we teta, ma, le, ọ bu nrọ: o we bata na Jerusalem, guzo n’iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Onye-nwe-ayi, sure àjà-nsure-ọku, chua àjà-udo, mere ndi-orù-ya nile oké oriri.

16 Mb͕e ahu ndinyom abua, bú ndi nākwa iko, biakutere eze, guzo n’iru ya.

17 Otù nwayi we si, Biko, onye-nwem, Mu onwem na nwayi a nēbi n’otù ulo; m’we mua nwa mb͕e mu na ya nọ n’ulo.

18 O rue, n’ubọchi nke-atọ mb͕e m’musiri nwa, na nwayi a mu-kwa-ra nwa; ayi onwe-ayi nọ kwa n’otù ebe; ọ dighi onye ala ọzọ ayi na ya nọ n’ulo, nání ayi abua nọ n’ulo.

19 Nwa nwayi a we nwua n’abali; n’ihi na o dinakwasiri ya.

20 O we bilie n’etiti abali, kupu nwam n’akukum, ma orù-gi nwayi nāraru ura, o we dọba ya n’obi-ya, ma nwa-ya nke nwuru anwu ka ọ dọbara n’obim.

21 M’we bilie n’ututu inye nwam ara, ma, le, ọ nwuwo: m’we tule ya n’ututu, ma, le, ọ bughi nwam nke m’muru.

22 Nwayi nke-ọzọ we si, É-è; kama nke di ndu bu nwam, nke nwuru anwu bu kwa nwa-gi. Ma nke-mbu nāsi, É-è; kama nke nwuru anwu bu nwa-gi, nke di ndu bu kwa nwam. Ha we kwue otú a n’iru eze.

23 Eze we si, Otù nwayi nāsi, Nka nke di ndu bu nwam, ma nwa-gi bu nke nwuru anwu: ma nke-ọzọ nāsi, É-è; kama nwa-gi bu nke nwuru anwu, ma nwam bu nke di ndu.

24 Eze we si, Wetaram mma-agha. Ha we weta mma-agha n’iru eze.

25 Eze we si, Kpọwanu nwa di ndu abua, nye otù nwayi otù nkera, nye kwa nwayi nke-ọzọ nkera ọzọ.

26 Nwayi ahu nke nwere nwa di ndu we si eze, (n’ihi na afọ chighariri ya n’aru nwa-ya,) o we si, Biko, onye-nwem, nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli. Ma nwayi nke-ọzọ nāsi, M’gaghi-enwe ya, i gaghi-enwe kwa ya; kpọwanu ya.

27 Eze we za, si, Nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli: nwayi a bu nne-ya.

28 Israel nile we nu ikpe eze kpere; ha we tua egwu eze: n’ihi na ha huru na amam-ihe Chineke di nime ya, ime ihe ekpere n’ikpe.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 4

1 Eze, bú Solomon, we buru eze Israel nile.

2 Ma ndia bu ndi-isi o nwere; Azaraia nwa Zedok bu onye-nchu-àjà;

3 Elihoref na Ahaija, umu-ndikom Shisha, bu ndi-ode-akwukwọ; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta;

4 Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi usu-ndi-agha; Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà;

5 Azaraia nwa Netan bu onye-isi nke ndi edoro ndi-isi; Zabud nwa Netan bu onye-isi n’ije ozi na eyì eze;

6 Ahisha bu onye-isi ulo eze; Adonairam nwa Abda bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.

7 Solomon nwe-kwa-ra ndikom iri na abua edoro ndi-isi Israel nile, ndi nāzù eze na ulo-ya: nwoke ọ bula nime ha nwe izù eze otù ọnwa n’arọ.

8 Ndia bu kwa aha-ha: Ben-hua, n’ugwu Efraim:

9 Ben-deka, nime Makaz, na nime Shaalbim na Bet-shemesh, na Ilon-bet-hanan:

10 Ben-hesed, n’Arubot; ya nwere Soko na ala Hefa nile:

11 Ben-abinadab, n’ebe nile di elu nke Doa; Tafat nwa Solomon ka ọ nwere na nwunye:

12 Beana nwa Ahailud, nime Teanak na Megido, na Bet-shean nile nke di n’akuku Zaretan, n’okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ofè Jọkmeam:

13 Ben-geba, nime Remot-gilead; ya nwere Havot nke Jaia nwa Manase, nke di na Gilead; ya nwere akuku Agob, nke di na Beshan, ọgu obodo uku atọ nke nwere mb͕idi na nkpọrọ ọla:

14 Ahinadab nwa Ido, nime Mahanaim:

15 Ahimaaz, nime Naftali; onye ahu lu-kwa-ra Basemat nwa Solomon na nwunye:

16 Beana nwa Hushai, n’Asha na Bealot:

17 Jehoshafat nwa Parua, n’Isaka:

18 Shimai nwa Ila, nime Benjamin:

19 Gebea nwa Uri, n’ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n’ala ahu.

20 Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n’akuku oké osimiri n’iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.

21 Solomon we nāchi ala-eze nile site n’Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.

22 Ihe-oriri Solomon nke diri otù ubọchi bu kwa orú ọtùtù ọka na iri nke utu ọka flour, na ọgu ọtùtù ọka atọ nke utu ọka;

23 ehi iri mara abuba, na orú ehi site n’ebe anāzù anu, na ọgu aturu ise, nāgughi ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ọkuku emere ka ha ma abuba.

24 N’ihi na ya onwe-ya nwere ike n’aru ndi nile bi n’ofè Osimiri, site na Tifsa we rue Geza, bú n’aru eze nile n’ofè Osimiri: o nwe-kwa-ra udo site n’ofè ọzọ nile di ya buruburu.

25 Juda na Israel we biri na ntukwasi-obi, nwoke ọ bula n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan we rue na Biasheba, ubọchi nile nke Solomon.

26 Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ulo uzọ ise nke inyinya diri ub͕ọ-ala-ya, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri.

27 Ndi ahu edoro ndi-isi zù-kwa-ra eze, bú Solomon, na ndi nile nābiaru table nke eze Solomon nso, nwoke ọ bula n’ọnwa-ya: ha ekweghi ka ihe ọ bula kọ ukọ.

28 Ha nēweta kwa ọka barley na okporo-ọka n’ebe ndi ahu edoro ndi-isi nọ, nwoke ọ bula dika ihe ekpere ya n’ikpe si di, inye inyinya na inye inyinya ukwu ọsọ.

29 Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke-uku, na obi sara mbara, dika ájá nke di n’usọ oké osimiri.

30 Amam-ihe Solomon we ba uba kari amam-ihe umu Iru-anyanwu nile, kari kwa amam-ihe Ijipt nile.

31 Ọ we mara ihe kari madu nile; kari Itan onye-Ezrahait, na Himan, na Kalkol, na Dada, bú umu-ndikom Mahol: aha-ya we di na mba nile b͕ara ha buruburu.

32 Ọ tua nnù ilu asa na ọgu iri: abù-ya di kwa nnù abua na ọgu iri na abù ise.

33 O kwu-kwa-ra okwu bayere osisi, site na cedar nke di na Lebanon we rue hyssop nke nēpuputa na mb͕idi: o kwu-kwa-ra okwu bayere anu, baye-kwa-ra anu-ufe, baye-kwa-ra ihe nākpu akpu, baye-kwa-ra azù.

34 Ha we si na ndi nile bia inu amam-ihe Solomon, si n’eze nile nke uwa, bú ndi nuru amam-ihe-ya.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 5

1 Hairam, bú eze Taia, we zìe ndi-orù-ya jekuru Solomon: n’ihi na ọ nuru na ya ka ha tere manu ibu eze n’ọnọdu nna-ya: n’ihi na onye nāhu Devid n’anya ubọchi nile ka Hairam bu.

2 Solomon we zigara Hairam ozi, si,

3 Gi onwe gi amawo Devid, bú nnam, na ọ pughi iwuru aha Jehova, bú Chineke-ya, ulo n’ihi agha nke b͕ara ya buruburu, rue mb͕e Jehova tiyere ha n’okpuru ọbu-ukwu-ya abua.

4 Ma ub͕u a Jehova, bú Chinekem, emewo ka m’zuru ike buruburu; ọ dighi onye-nmegide, ọ dighi kwa ihe ọjọ daputara ayi.

5 Ma, le, m’nāsi na m’gēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, dika Jehova gwara Devid, bú nnam, okwu, si, Nwa-gi, onye M’gētiyekwasi n’oche-eze-gi n’ọnọdu gi, ya onwe-ya gēwuru aham ulo.

6 Ma ub͕u a nye iwu ka ha b͕utuerem osisi cedar site na Lebanon; ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi; m’gēnye kwa gi ugwọ-ọlu ndi-orù-gi dika ihe nile si di nke i gāsim: n’ihi na gi onwe-gi amawo na ọ dighi nwoke n’etiti ayi mara ib͕utu osisi dika ndi Zaidon.

7 O rue, mb͕e Hairam nuru okwu nile nke Solomon, na ọ ṅuriri ọṅu nke-uku, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu ta, Onye nyeworo Devid nwa mara ihe ibu onye-isi ndi uku a.

8 Hairam we zigara Solomon ozi, si, Anuwom ozi nke i ziterem: mu onwem gēme ihe nile nātọ gi utọ bayere osisi cedar, baye-kwa-ra osisi fir.

9 Ndi-orùm gēsi na Lebanon buputa ha oké osimiri: mu onwem gāb͕a kwa ha ka ha se n’elu oké osimiri rue ebe ahu nke i gēziterem ozi, m’gātọsa kwa ha n’ebe ahu, gi onwe-gi gēburu kwa ha: gi onwe-gi gēme kwa ihe nātọm utọ, n’inye ulom nri.

10 Hairam we nēnye Solomon osisi cedar na osisi fir, bú ka ihe nile nātọ ya utọ ra.

11 Solomon we nye Hairam orú nnù ọtùtù ọka uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat iburu ulo-ya ihe-oriri, na orú ọtùtù cor nke manu asuru asu: otú a ka Solomon nēnye Hairam kwa-arọ.

12 Jehova nye-kwa-ra Solomon amam-ihe, dika Ọ gwara ya; udo we di n’etiti Hairam na Solomon; ha abua we b͕a ndu.

13 Eze, bú Solomon, we weputa usu ndi nēfè òfùfè n’Israel nile; usu ahu ndi nēfè òfùfè bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise.

14 O ziga ha na Lebanon, orú nnù ndikom na nnù ise n’ọnwa na nb͕anwe: otù ọnwa ka ha nọ na Lebanon, ọnwa abua n’ulo: Adonairam bu kwa onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.

15 Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise ndi nēbu ibu, na orù nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n’ugwu;

16 nāgughi ndi-isi nke ndi edoro ndi-isi, bú ndi Solomon nwere, ndi bu isi n’ije-ozi ahu, nnù ndikom asatọ na ọgu ise, ndi nwere ike n’aru ndi ahu ndi nālu ọlu n’ije-ozi ahu.

17 Eze we nye iwu, ha we bute nkume uku, nkume di oké ọnu-ahia, iwere nkume awaputara awaputa tọ ntọ-ala ulo ahu.

18 Ndi-owu-ulo nke Solomon na ndi-owu-ulo nke Hairam na ndi Gebal we, dozie osisi na nkume iwu ulo ahu.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 6

1 O rue, n’arọ nke-nnù-na-ọgu-anọ site na mb͕e umu Israel siri n’ala Ijipt putasia, n’arọ nke-anọ nke Solomon bu eze Israel, n’ọnwa Ziv, nke bu ọnwa nke-abua, na o wubere Jehova ulo.

2 Ma ulo ahu nke eze, bú Solomon, wuru Jehova, ọgu cubit atọ ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di.

3 Uzọ-nbata kwa nke di n’iru ulo uku nke ulo ahu, orú cubit ka ogologo-ya di, n’iru obosara ulo ahu; cubit iri ka obosara-ya di n’iru ulo ahu.

4 O we mere ulo ahu window ufọdu di obosara nime, kpa kwa nkpa n’èzi.

5 O wu-kwa-ra okpukpu-ulo n’akuku mb͕idi ulo ahu buruburu, bú mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu, ma nke ulo uku Chineke ahu, ma nke ime-ime-ulo ahu: o me-kwa-ra ulo ntà nke akuku buruburu:

6 Okpukpu-ulo nke dikarisiri ala, cubit ise ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-etiti kwa, cubit isi ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-atọ kwa, cubit asa ka obosara-ya di: n’ihi na o tiyere ngwe n’ulo ahu buruburu n’èzí, ka ihe we ghara ibà na mb͕idi ulo ahu.

7 Ulo ahu, mb͕e anēwu ya, eji nkume nke awazuru awazu mb͕e ebutere ya wue ya: anughi kwa otùtù ma-ọbu anyu-ike ma-ọbu ihe-ọlu ọ bula nke ígwè n’ulo ahu, mb͕e anēwu ya.

8 Ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku nke-etiti di n’akuku aka-nri nke ulo ahu: ha we si n’uzọ-nrigo nke nāga buruburu nārigo n’ulo ntà nke-etiti, si kwa na nke-etiti je rue nke-atọ.

9 O we wue ulo ahu, wusia ya; o we were ibo na akuku osisi cedar kpue ulo ahu.

10 O wue okpukpu-ulo n’aru ulo ahu nile, cubit ise ka idi-elu-ha di: ha we dabere n’ulo ahu n’osisi cedar.

11 Okwu Jehova we biakute Solomon, si,

12 Ulo a nke gi onwe-gi nēwu, ọ buru na i jegharia n’ukpurum nile, ọ buru kwa na i me ihe nile M’kpere n’ikpe, ọ buru kwa na i debe ihe nile M’nyere n’iwu ijeghari nime ha; M’gēme kwa ka okwum guzosie ike n’ebe i nọ, bú nke M’gwara Devid, bú nna-gi.

13 M’gēbi kwa n’etiti umu Israel, M’gaghi-arapu kwa ndim, bú Israel.

14 Solomon we wue ulo ahu, wusia ya.

15 O were ibo osisi cedar wue mb͕idi ulo ahu nime; site n’ala ulo rue mb͕idi nke okpukpu, o were osisi machita ha nime: o were ibo osisi fir machita ala ulo.

16 O were ibo osisi cedar wue ebe di orú cubit n’azu ulo ahu, site n’ala ulo rue mb͕idi: o were ha wuere ya nime, ibu ime-ime-ulo, ibu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

17 Ulo ahu, nke ahu bú, ulo uku Chineke nke di n’iru ya, di ọgu cubit abua n’ogologo.

18 Osisi cedar di kwa n’aru ulo ahu nime, nke apiri ihe otutu, bú afufa-ọhia na okoko-osisi wara awa: ime ulo ahu nile bu osisi cedar; ọ dighi nkume ahuru anya.

19 O dozi-kwa-ra ime-ime-ulo n’etiti ulo ahu nime, itiye ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n’ebe ahu.

20 Ma n’iru ime-ime-ulo ahu di orú cubit n’ogologo, na orú cubit n’obosara, na orú cubit n’idi-elu-ya; ọ machita ya ọla-edo makarisiri nma: o were kwa osisi cedar machita ebe-ichu-àjà.

21 Solomon we were ọla-edo makarisiri nma machita ulo ahu nime: o me ka iyab͕a ọla-edo gabiga n’iru ime-ime-ulo ahu; ọ machita kwa ya ọla-edo.

22 Ọ machita-kwa-ra ulo ahu nile ọla-edo, rue mb͕e amachitazuru ulo nile: o were kwa ọla-edo machita ebe-ichu-àjà ahu nile bu nke diri ime-ime-ulo ahu.

23 O me-kwa-ra cherubim abua nke osisi manu olive n’ime-ime-ulo ahu, cubit iri ka elu-ha di.

24 Cubit ise ka otù nku cherub di, cubit ise ka nkù nke-ọzọ nke cherub di kwa: site na nsọtu nkù-ya we rue nsọtu nke-ọzọ nke nkù-ya di cubit iri.

25 Cubit iri ka cherub nke-ọzọ di kwa: cherubim abua ahu nwere otù ọtùtù na otù ọpipi.

26 Idi-elu otù cherub di cubit iri, otú a ka cherub nke-ọzọ di kwa.

27 O we tiye cherubim n’etiti ime-ulo: ha we b͕asa nkù cherubim ahu, nkù nke otù we metu mb͕idi, nkù cherub nke-ọzọ nēmetu kwa mb͕idi nke-ọzọ; nkù-ha nēmeturita onwe-ha, nkù na nkù, n’etiti ulo ahu.

28 Ọ machita cherubim ọla-edo.

29 Ọ tu-kwa-ra mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu n’eb͕ub͕u nke ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, n’ime na n’èzí.

30 Ọ machita-kwa-ra ala ulo ahu ọla-edo, n’ime na n’èzí.

31 O me ibo-uzọ osisi manu olive tiye n’ọnu-uzọ ime-ime-ulo ahu: ọfiere-uzọ na awara-uzọ abua bu otù uzọ n’uzọ ise nke mb͕idi.

32 Ibo-uzọ abua ahu bu osisi manu olive; ọ pia n’elu ha ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, ọ machita ha ọla-edo; o tisa kwa ọla-edo n’aru cherubim, na n’aru nkwu.

33 Otú a ka o me-kwa-ra awara-uzọ abua nke osisi manu olive itiye n’ọnu-uzọ ulo uku Chineke, site n’otù uzọ n’uzọ anọ nke mb͕idi;

34 na ibo-uzọ abua nke osisi fir; ibewa-uzọ abua nke otù ibo-uzọ nāga buruburu, ibewa-uzọ abua nke ibo-uzọ nke-ọzọ nāga kwa buruburu.

35 Ọ pia n’elu ha cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa: ọ were ọla-edo nke emere ka ọ dabà n’elu ihe eb͕uru eb͕ub͕u machita ha.

36 O were akuku nkume awara awa atọ na otù ariri osisi cedar awara awa wue ogige ime-ime.

37 N’arọ nke-anọ ka atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, n’ọnwa Ziv.

38 Ma n’arọ nke-iri-na-otù, n’ọnwa Bul, nke bu ọnwa nke-asatọ, ka ewusiri ulo ahu n’ihe-ya nile na n’ikpé-ya nile. O we nọ arọ asa n’iwu ya.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 7

1 Ma Solomon nọ arọ iri na atọ n’iwu ulo nke aka ya, ọ we wubìe ulo-ya nile.

2 O we wue ulo oké ọhia Lebanon; ọgu cubit ise ka ogologo-ya di, ọgu cubit abua na iri ka obosara-ya di kwa, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di, ọ di n’elu akuku anọ nke ogidi osisi cedar, osisi cedar awara awa di kwa n’elu ogidi ahu.

3 Ewere osisi cedar kpuchie ya n’elu, n’elu ọgu ulo ntà nke akuku abua na ise, nke di n’elu ogidi; iri na ise n’otù akuku.

4 Ọnọdu window di kwa n’akuku atọ, ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n’okpukpu atọ.

5 Ọnu-uzọ nile na awara-uzọ nile nwere akuku anọ ra nrata, n’ọnọdu window: ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n’okpukpu atọ.

6 O me-kwa-ra uzọ-nbata nke ogidi; ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, orú cubit na iri ka obosara-ya di kwa; uzọ-nbata di kwa n’iru ha; ogidi na nbata-uzọ di kwa n’iru ha.

7 Ọ me-kwa-ra uzọ-nbata nke oche-eze ebe ọ ganēkpe ikpe, bú uzọ-nbata ikpé: ewere kwa osisi cedar kpuchie ya site n’ala ulo rue ala ulo.

8 Ma ulo-ya ebe o nēbi, bú ogige ọzọ nke di nime uzọ-nbata, ọ di ka ọlu a si di. O wu-kwa-ra ulo nye nwa-nwayi Fero, (bú nwayi nke Solomon luru na nwunye,) dika uzọ-nbata nka.

9 Eji nkume di oké ọnu-ahia wu ndia nile, bú nkume awara awa, dika ọtùtù si di, nkume eji mma-nkwọ kwọ, n’ime na n’èzí, bú site na ntọ-ala rue ndobi-ya, na n’èzí rue ogige uku ahu.

10 Ntọ-ala-ya bu kwa nkume di oké ọnu-ahia, bú nkume uku, nkume di cubit iri, na nkume di cubit asatọ.

11 Nkume nke di oké ọnu-ahia di kwa n’elu, dika ọtùtù nke osisi awara awa si di, na osisi cedar.

12 Ogige uku nke di buruburu nwe-kwa-ra akuku atọ nke nkume awara awa, na otù ariri nke osisi cedar awara awa; ọbuná dika ogige ime-ime ulo Jehova si enwe, na dika uzọ-nbata ulo si enwe.

13 Eze Solomon we ziga si na Taia kuputa Hairam.

14 Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n’ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n’amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n’ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile.

15 O we kpua ogidi ọla abua, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di: ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ogidi nke-abua buruburu.

16 O me-kwa-ra isi abua nke ọla awuru awu, itiye n’elu ogidi: cubit ise ka idi-elu otù isi di, cubit ise ka idi-elu isi nke-ọzọ di kwa.

17 Ihe-ọkpukpa, bú ihe emere ka ha yie ihe-ọkpukpa, na ihe aturu atu, bú ihe emere ka ha yie iyab͕a, diri isi nke di n’elu ogidi abua; asa diri otù isi, asa di-kwa-ra isi nke-ọzọ.

18 O me ogidi abua ahu; akuku abua dikwasi otù ihe-ọkpukpa buruburu, ikpuchi isi nke di n’elu pomegranate: otú a ka o me-kwa-ra isi nke-ọzọ.

19 Isi nke di n’elu ogidi n’uzọ-nbata ahu bu ihe emere ka ha yie urodi, cubit anọ.

20 Ma isi di kwa n’elu ogidi abua ahu n’elu, na ncherita-iru afọ nke di n’akuku ihe-ọkpukpa: pomegranate di ọgu iri, n’akuku nke dikwasi isi nke-ọzọ buruburu.

21 O guzo ogidi abua ahu n’uzọ-nbata nke ulo uku Chineke: o guzo ogidi aka-nri, kpọ aha-ya Jakin: o guzo ogidi aka-ekpe, kpọ aha-ya Boaz.

22 Ma n’elu ogidi ihe di nke emere ka o yie urodi: ewe luzue ọlu ogidi abua ahu.

23 O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n’otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di gburugburu gburugburu, cubit ise ka idi-elu-ya di: eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.

24 Afufa-ọhia di kwa n’okpuru ọnu-ya buruburu nke nāb͕a ya buruburu, iri di n’otù cubit, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu: afufa-ọhia ahu di ariri abua, awuru mb͕e awuru ya.

25 Ọ nēguzo n’elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n’Ugwu, atọ nēche iru n’Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n’Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n’elu, azu-ha nile di kwa nime.

26 Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: nnù bath ise ka ọ nānagide.

27 Ọ me ihe-ndọkwasi iri nke ọla; cubit anọ ka ogologo otù ihe-ndọkwasi di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa.

28 Ma nka bu otú emere ihe-ndọkwasi: ha nwere ihe-njikọ, bú ihe-njikọ n’etiti nkwukọta-ya:

29 ọdum na ehi na cherubim di n’ihe-njikọ nke di n’etiti nkwukọta ahu; ihe-ndọkwasi dikwasi na nkwukọta n’elu: ihe aturu atu nke emere ka o yie ihe-nkwuba di kwa n’okpuru ọdum nile na ehi nile.

30 Ihe-ndọkwasi ọ bula nwere wheel ọla anọ, na axle ọla: ukwu-ya anọ nwere ubu: n’okpuru ite ọsisa-miri ahu ka ubu ahu akpuru akpu di, n’akuku ihe aturu atu ọ bula.

31 Ọnu-ya nime isi-ya na n’elu di otù cubit: ọnu-ya di kwa buruburu, otú emere ihe-ndọkwasi, otù cubit na nkera cubit: ihe-ọpipi dikwasi kwa n’ọnu-ya, ihe-njikọ nile ha nwere akuku anọ ra nrata, ha adighi buruburu.

32 Wheel anọ ahu di n’okpuru ihe-njikọ: aka wheel di n’ihe-ndọkwasi: idi-elu otù wheel di otù cubit na nkera cubit.

33 Otú emere wheel nile di ka esi eme wheel ub͕ọ-ala: aka nile ha, na azu nile ha, na ihe nile nējikọta ha, na etiti nile ha, awuru ha nile awu.

34 Ubu anọ di na nkuku anọ nke ihe-ndọkwasi ọ bula: ubu-ya sitere n’ihe-ndọkwasi ahu.

35 Ihe di gburugburu gburugburu, nke idi-elu-ya di nkera cubit, di n’elu ihe-ndọkwasi ahu: aka-ya nile na ihe-njikọ-ya nile, nke di n’elu ihe-ndọkwasi ahu sitere na ya.

36 O b͕ue eb͕ub͕u cherubim na ọdum na nkwu n’elu mbadamba aka-ya nile, na n’elu ihe-njikọ-ya nile, dika ọnọdu di efu nke ebe ọ bula si di, ha na ihe aturu atu buruburu.

37 Otú a ka o mere ihe-ndọkwasi iri ahu: ha nile nwere otù ọwuwu, na otù ọtùtù, na otù ọpipi.

38 O me kwa ite ọsisa-miri iri nke ọla: ọgu bath abua ka otù ite ọsisa-miri nānagide: cubit anọ ka ite ọsisa-miri ọ bula di: otù ite ọsisa-miri di n’elu ihe-ndọkwasi ọ bula n’ihe-ndọkwasi iri ahu.

39 O tiye ihe-ndọkwasi ahu, ise n’akuku aka-nri ulo ahu, ise n’akuku aka-ekpe ulo ahu: o tiye kwa oké osimiri ahu n’akuku aka-nri ulo ahu n’akuku Iru-anyanwu, na ncherita iru Ndida.

40 Hairam me-kwa-ra ite ọsisa-miri nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Hairam we jebìe ozi nile nke o jere eze, bú Solomon, n’ulo Jehova:

41 ogidi abua ahu, na ọkwa abua nke isi nke di n’elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n’elu ogidi;

42 na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú akuku pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n’iru ogidi;

43 na ihe-ndọkwasi iri ahu, na ite ọsisa-miri iri ahu nke di n’elu ihe-ndọkwasi;

44 na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n’okpuru oké osimiri;

45 na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n’ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.

46 Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n’ala urọ n’etiti Sukot na Zaretan.

47 Solomon we dọba ihe ahu nile ghara itù ha, n’ihi na ha bara uba nke ukwu: achọputaghi ọtùtù ọla ahu.

48 Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n’ulo Jehova: ebe-ichu-àjà ọla-edo, na table nke achicha iru Chineke di n’elu ya, ọ bu ọla-edo:

49 na ihe-idọba-oriọna, ise n’aka-nri, ise n’aka-ekpe, n’iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo;

50 na iko nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na ihe-nkoye-ibo nile, ma nke diri ọnu-uzọ ime-ime ulo ahu, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, ma nke diri ọnu-uzọ ulo, bú ulo uku Chineke, ha bu ọla-edo.

51 Ewe jezue ozi nile nke eze, bú Solomon, jere n’ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o we tiye ha n’ulo-àkù nke ulo Jehova.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 8

1 Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiakute eze, bú Solomon, nime Jerusalem, isi n’obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.

2 Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze, bú Solomon, n’ememe, n’ọnwa Etanim, nke ahu bu ọnwa nke-asa.

3 Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi-nchu-àjà we bulie ib͕e ahu.

4 Ha we bugota ib͕e Jehova, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n’Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà na ndi Livai we bugota ha.

5 Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n’ebe ọ nọ, nọyere ya n’iru ib͕e ahu, n’āchu àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n’ihi iba-uba-ha.

6 Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n’ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n’okpuru nkù cherubim.

7 N’ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha rue ebe ib͕e ahu, cherubim we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n’aka-ya abua n’elu.

8 Nkpa-n’aka we di ogologo, ewe hu isi nkpa-n’aka site n’ebe nsọ n’iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n’èzí: ha we di n’ebe ahu, rue ta.

9 Ọ dighi ihe di n’ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses dọbara n’ebe ahu na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n’ala Ijipt puta.

10 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n’ebe nsọ puta, na igwe-oji juputara ulo Jehova,

11 ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n’ihi igwe-oji ahu: n’ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova.

12 Mb͕e ahu Solomon siri, Jehova asiwo na O gēbi n’oké ọchichiri.

13 N’ezie ewuworom I ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi.

14 Eze we chigharia iru-ya, gọzie nkpọkọta nile nke Israel: nkpọkọta nile nke Israel nēguzo kwa.

15 Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya mezue ya, si,

16 Site n’ubọchi mb͕e M’mere ka ndim, bú Israel, si n’Ijipt puta, arọputaghm obodo n’ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n’ebe ahu; ma arọputaram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel.

17 O we di n’obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo.

18 Jehova we si Devid, bú nnam, N’ihi na ọ di n’obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n’obi-gi:

19 otú ọ di, gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu: kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n’úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo.

20 Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m’we bilie n’ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n’oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m’we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo,

21 doro ib͕e ahu ọnọdu n’ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n’ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na nna-ayi-hà b͕ara, mb͕e O mere ka ha si n’ala Ijipt puta.

22 Solomon we guzo n’iru ebe-ichu-àjà Jehova n’iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua n’ebe elu-igwe di:

23 ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n’elu-igwe di n’elu, ma-ọbu n’elu uwa di n’okpuru; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n’iru Gi:

24 I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta.

25 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n’irum n’inọkwasi n’oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n’irum dika i jeghariworo n’irum.

26 Ma ub͕u a, Chineke Israel, biko, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid nnam.

27 Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbi n’elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m’wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi?

28 Ma che iru n’ekpere orù-Gi, na n’aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n’iru Gi ta:

29 ka anya-Gi abua we nāsaghe n’ebe ulo a di abali na ehihie, bú n’ebe ebe ahu di nke I siworo, Aham gādi n’ebe ahu: ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n’ebe a di.

30 Ge kwa nti aririọ-amara orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n’ebe ebe a di: Gi onwe-gi nuru kwa n’ebe obibi-Gi, n’elu-igwe; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara.

31 Ihe ọ bula nke nwoke gēmehie nime ya megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n’iru ebe-ichu-àjà-Gi n’ulo a:

32 Gi onwe-gi nuru kwa n’elu-igwe, me kwa, kpe ndi-orù-Gi ikpe, igu onye nēmebi iwu n’onye nēmebi iwu, itukwasi uzọ-ya n’isi-ya; na igu onye ezi omume n’onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di.

33 Mb͕e anētib͕u ndi-Gi, bú Israel, n’iru onye-iro, n’ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha alaghachikute Gi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ Gi amara n’ulo a:

34 Gi onwe-gi nuru kwa n’elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n’ala nke I nyere ndi bu nna-ha.

35 Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n’ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n’ebe a, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n’ihi na I nēweda ha n’ala:

36 Gi onwe-gi nuru kwa n’elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n’ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa.

37 Mb͕e oké unwu gādi n’ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e onye-iro-ha gānọchigide ha n’agha n’ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ọria ọ bula;

38 ekpere ọ bula, aririọ ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti nke obi-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n’ebe ulo a di:

39 Gi onwe-gi nuru kwa n’elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, b͕aghara, me kwa, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n’ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu nile, nání Gi;)

40 ka ha we tua egwu Gi ubọchi nile nke ha onwe-ha nēbi n’elu ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà.

41 Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n’ala di anya bia n’ihi aha-Gi;

42 (n’ihi na ha gānu aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti;) mb͕e ọ gābia kwa kpe ekpere n’ulo a;

43 Gi onwe-gi nuru kwa n’elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n’ulo a nke m’wuworo.

44 Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso onye-iro-ha agha, n’uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Jehova n’uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n’ebe ulo a di nke m’wuworo aha-Gi:

45 Gi nuru kwa n’elu-igwe ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha.

46 Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n’ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie,) I we wesa ha iwe, rara ha nye n’iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n’agha ewe dọta ha n’agha je n’ala onye-iro, n’ebe di anya ma-ọbu n’ebe di nso;

47 ha we chegharia n’obi-ha n’ala ebe adọtara ha n’agha, we chigharia, riọ Gi amara n’ala ndi nādọta ha n’agha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi;

48 ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n’ala ndi-iro-ha, bú ndi dọtara ha n’agha, ha ewe kpere Gi n’uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na ulo nke m’wuworo aha-Gi:

49 Gi nuru kwa n’elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha;

50 Gi b͕aghara kwa ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi, na njehie-ha nile nke ha jehieworo megide Gi; Gi nye kwa ha ka enwe obi-ebere n’aru ha n’iru ndi nādọta ha n’agha, ka ha we nwe obi-ebere n’aru ha:

51 n’ihi na ndi-Gi na ihe-nketa-Gi ka ha bu, ndi I mere ka ha si n’ala Ijipt, n’etiti oké ọku ígwè ahu, puta:

52 ka anya-Gi abua we nāsaghe n’aririọ-amara orù-Gi, na n’aririọ-amara ndi-Gi, bú Israel, ige nti ha na nkpọku nile ha nākpọku Gi.

53 N’ihi na Gi onwe-gi kewaputara ha n’etiti ndi nile nke uwa, iburu Gi ihe-nketa, dika I kwuru n’aka Moses, bú orù-Gi, mb͕e I mere ka nna-ayi-hà si n’Ijipt puta, Onye-nwe-ayi, bú Jehova.

54 O rue, mb͕e Solomon kpebìri ekpere a nile na aririọ-amara a nile nye Jehova, na o siri n’iru ebe-ichu-àjà Jehova bilie, site n’ib͕u ikperè-ya abua n’ala, site kwa n’ime ka aka-ya abua b͕asa n’ebe elu-igwe di.

55 O we guzo, were oké olu gọzie nkpọkọta nile nke Israel, si,

56 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nyeworo ndi-Ya, bú Israel, izu-ike, dika ihe nile nke O kwuru si di: ọ dighi otù okwu dapuru n’okwu-Ya nile di nma, nke O kwuru n’aka Moses, bú orù-Ya.

57 Ka Jehova, bú Chineke-ayi, nọyere ayi, dika Ọ nọyere nna-ayi-hà: ka Ọ ghara irapu ayi, ka Ọ ghara kwa ib͕anari ayi:

58 ka O we wezuga obi-ayi ka ha biakute Ya, ije ije n’uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n’iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, nke O nyere nna-ayi-hà n’iwu.

59 Ka okwum ndia, nke m’jiri riọ amara n’iru Jehova, di kwa nso Jehova, bú Chineke-ayi, ehihie na abali, ka O we mezie ikpé orù-Ya, na ikpé ndi-Ya, bú Israel, ihe ubọchi n’ubọchi-ya:

60 ka ndi nile nke uwa we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; onye ọzọ adighi.

61 Ka obi-unu zu kwa okè n’ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ijeghari n’ukpuru-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n’iwu, otú ọ di ta.

62 Eze, ya na Israel nile, nāchu kwa àjà n’iru Jehova.

63 Solomon we chua ihe àjà nke àjà-udo nke ọ churu nye Jehova, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na umu Israel nile we ra ulo Jehova nye Chineke.

64 N’ubọchi ahu ka eze doro etiti ogige nke di n’iru ulo Jehova nsọ; n’ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma na abuba àjà-udo n’ebe ahu: n’ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke di n’iru Jehova di ntà kari inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba àjà-udo.

65 Solomon we me ememe na mb͕e ahu, ya na Israel nile, nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt, n’iru Jehova, bú Chineke-ayi, ubọchi asa na ubọchi asa, bú ubọchi iri na anọ.

66 N’ubọchi nke-asatọ o zilagara ndi Israel, ha we gọzie eze, la n’ulo-ikwū-ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n’ihi ezi ihe nile nke Jehova mere Devid, bú orù-Ya, nke O me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 9

1 O rue, mb͕e Solomon wubìri ulo Jehova, na ulo eze, na ihe nile nke di Solomon ezi nma n’obi nke tọrọ ya utọ ime,

2 na Jehova mere ka Solomon hu Ya anya nke ub͕ò abua, dika O mere ka ọ hu Ya anya na Gibeon.

3 Jehova we si ya, Anuwom ekpere-gi na aririọ-amara-gi, nke i riọworo n’irum: edowom ulo a, nke i wuworo, nsọ, itiye aham n’ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi; anyam abua na obim gādi kwa n’ebe ahu ubọchi nile.

4 Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n’irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, n’izu-okè nke obi, na n’izi-ezi, ime dika ihe nile si di nke M’nyeworo gi n’iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;

5 M’gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi n’isi Israel guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi; dika M’gwara Devid, bú nna-gi, okwu si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n’inọkwasi n’oche-eze Israel.

6 Ma ọ buru na unu esi n’isom laghachi ma-ọli, unu onwe-unu ma-ọbu umu-unu, unu-we ghara idebe ihe nile M’nyere n’iwu na ukpurum nile nke M’tiyeworo n’iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:

7 M’gēbipu kwa Israel n’elu ala nka nke M’nyeworo ha; M’gēsi kwa n’irum tupu ulo a, nke M’doworo nsọ nye aham; Israel gāghọ kwa ilu na ihe-àkùkù n’etiti ndi ọzọ nile:

8 ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāma ọsọ; ha gāsi kwa, N’ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?

9 Ha gāsi kwa, Ọ bu n’ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke-ha, Onye mere ka ndi bu nna-ha si n’ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n’ihi ya ka Jehova meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.

10 O rue, n’ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo abua nime ha, bú ulo Jehova na ulo eze,

11 (ma Hairam, bú eze Taia, were osisi cedar, were kwa osisi fir, were kwa ọla-edo, yere Solomon aka, dika ihe nile si di nke nātọ ya utọ,) na eze Solomon nyere Hairam orú obodo n’ala Galili mb͕e ahu.

12 Hairam we si na Taia puta ihu orú obodo ahu nke Solomon nyere ya; ma ha ezighi ezi n’anya-ya.

13 O we si, Gini bu obodo ndia nke i nyeworom, nwa-nnem? Ọ we kpọ ha ala Kabul, rue ta.

14 Hairam we zigara eze ọgu talent ọla-edo isi.

15 Ma nka bu ihe kpatara usu ndi nēfè òfùfè nke eze, bú Solomon, weputara; iwu ulo Jehova, na ulo nke aka ya, na Milo, na mb͕idi Jerusalem, na Hezoa, na Megido, na Gezea.

16 N’ihi na Fero, bú eze Ijipt, rigoro, were Gezea, sure ya n’ọku, b͕ue ndi Kenean ndi bi n’ọbodo ahu, were ya nye nwa-ya nwayi, bú nwunye Solomon, ka ọ buru ihe idu-ulo.

17 Solomon we wue Gezea, na Bet-horon di n’okpuru,

18 na Bealat, na Tema n’ọzara, n’ala-ya,

19 na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe di Solomon ezi nma n’obi, bú nke di ya ezi nma n’obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n’ala nile ọ nāchi.

20 Ma ndi nile fọduru n’etiti ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n’umu Israel;

21 umu-ha ndi fọduru inọchi ha n’ala, ndi umu Israel nāpughi iwezuga ka ebibie ha, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, bú ndi-orù, rue ta.

22 Ma ọ dighi orù Solomon mere site n’umu Israel: kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.

23 Ndia bu ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi bu ndi-isi n’ozi anējere Solomon, nnù madu na ọgu asa na iri, ndi nwere ike n’aru ndi nālu ọlu n’ije-ozi ahu.

24 Otú ọ di, nwa-nwayi Fero siri n’obodo Devid rigorue ulo-ya nke Solomon wuru nye ya: mb͕e ahu ka o wuru Milo.

25 Ub͕ò atọ n’arọ ka Solomon surere àjà-nsure-ọku na àjà-udo nye Jehova n’elu ebe-ichu-àjà nke o wuru, o we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ tiyere ya n’elu ebe-ichu-àjà nke di n’iru Jehova. O we wuzue ulo ahu.

26 Eze, bú Solomon, me-kwa-ra ub͕ọ n’Ezion-geba, nke di n’akuku Ilot, n’usọ Oké Osimiri Uhie, n’ala Edom.

27 Hairam we zìe ndi-orù-ya n’ub͕ọ-ya, bú ndi-ub͕ọ ndi mara oké osimiri, ha na ndi-orù Solomon.

28 Ha we biarue Ofia, si n’ebe ahu weta ọla-edo, nnù talent na orú talent, wetara eze, bú Solomon.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 10

1 Eze-nwayi Sheba we nānu akukọ Solomon bayere aha Jehova, o we bia iwere ilu di iche iche nwa ya.

2 Ọ biarue Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, gwa ya okwu nile nke di ya n’obi.

3 Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi okwu ọ bula ezonariri eze nke ọ nēgosighi ya.

4 Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe nile nke Solomon, na ulo nke o wuru,

5 na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha, na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na àjà-nsure-ọku-ya nke ọ nēsure n’ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ.

6 O we si eze, Ezi-okwu ka okwu ahu bu nke m’nuru n’alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi.

7 Ma ekweghm okwu ahu, rue mb͕e m’biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera-ya: i tukwasiwo amam-ihe na idi-nma n’akukọ nke m’nuru.

8 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n’iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.

9 Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n’oche-eze Israel: ọ bu n’ihi na Jehova huru Israel n’anya rue mb͕e ebighi-ebi ka O doro gi eze, ime ihe ekpere n’ikpe na ezi omume.

10 O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda biara ọzọ nke di ka uda ahu n’iba-uba, bú nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon.

11 Ọzọ kwa, ub͕ọ Hairam, nke siri n’Ofia bute ọla-edo, ha siri n’Ofia bubata osisi almug bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia.

12 Eze we were osisi almug ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ihe-ndabere, ọ were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: osisi almug di otú a abiaghi, ahughi kwa ha, rue ta.

13 Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o nyere ya dika aka eze, bú Solomon, si di. O we chigharia la n’ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya.

14 Ma ọtùtù ọla-edo nke biakutere Solomon n’otù arọ di nnù talent ọla-edo na ọgu iri-na-atọ na isi,

15 nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia wetara, na ọzuzu-ahia nke ndi nāzu ahia, na ọla-edo nke eze nile nke ndi gwara ọgwa, na ọla-edo nke ndi nāchi ala.

16 Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù shekel ọla-edo na ọgu iri bara n’otù ọta uku.

17 O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; pound ọla-edo atọ bara n’otù ọta: eze we tiye ha n’ulo oké ọhia Lebanon.

18 Eze me-kwa-ra oké oche-eze ọdu, machita ya ọla-edo anuchara anucha.

19 Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, oche-eze ahu nwe-kwa-ra elu di buruburu n’azu ya: aka di kwa n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ n’ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n’akuku aka ahu.

20 Ọdum iri na abua we nēguzo n’ebe ahu n’elu ihe-nrigo isi ahu n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula.

21 Ihe nile Solomon nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: ọ dighi nke bu ọla-ọcha; agughi ya n’ihe ọ bula n’ubọchi Solomon.

22 N’ihi na eze nwere ub͕ọ Tashish n’oké osimiri tiyere ub͕ọ Hairam: otù ub͕ò n’arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo.

23 Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n’àkù na n’amam-ihe.

24 Uwa nile we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n’obi-ya.

25 Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n’arọ n’arọ-ya.

26 Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, ọ we do ha n’obodo ub͕ọ-ala, na n’ebe eze nọ na Jerusalem.

27 Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume na Jerusalem, ọ me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n’ebe di ala n’uba.

28 Anēme kwa ka inyinya Solomon nwere si n’Ijipt puta; n’usu ka ndi-ahia eze nānara ha, otù usu n’ọnu-ahia-ya.

29 Otù ub͕ọ-ala we rigota si n’Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n’ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, nēweputa-kwa-ra ndi-eze Siria, site n’aka-ha.