Categories
I. JỌN

I. JỌN 1

1 Ihe nke diri site na mbu, ihe ayi nuworo, ihe ayi jiworo anya-ayi hu, ihe ayi kiriri, nke aka-ayi datukwara, bayere Okwu nke ndu ahu,

2 (emekwara ka ndu ahu puta ìhè, ayi ahuwo kwa ya, nāb͕a kwa àmà, kọ-kwa-ra unu ndu ahu, ndu nke diri n’ebe Nna ayi nọ, ewe me ka ọ putara ayi ìhè);

3 ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ:

4 ihe ndia ka ayi onwe-ayi nēde kwa n’akwukwọ, ka ewe mezue ọṅù-ayi.

5 Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n’ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya.

6 Ọ buru na ayi asi na ayi nēso Ya nwekọ ihe, ma ayi nējeghari n’ọchichiri, ayi nēkwu okwu-ugha, ayi adighi-eme kwa ezi-okwu:

7 ma ọ buru na ayi ejegharia n’ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n’ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n’etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile.

8 Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi.

9 Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.

10 Ọ buru na ayi asi na ọ dighi mb͕e ọ bula ayi mehiere, ayi nēme Ya onye-ugha, okwu-Ya adighi kwa nime ayi.

Categories
I. JỌN

I. JỌN 2

1 Umu-ntakirim, ihe ndia ka m’nēdegara unu n’akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n’ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume:

2 Ya onwe-ya bu kwa ihe ijuru Chineke obi bayere nmehie nile ayi; ma Ọ bughi ihe ijuru Ya obi bayere nání nmehie nke ayi onwe-ayi, kama Ọ bu kwa ihe ijuru Ya obi bayere nmehie nke uwa dum;

3 nime nka ka ayi ma-kwa-ra na ayi amawo Ya, ma ọ buru na ayi edebe ihe nile O nyere n’iwu.

4 Onye, nāsi, Amawom Ya, ma ọ dighi-edebe ihe nile O nyere n’iwu, ọ bu onye-ugha, ezi-okwu adighi kwa nime onye ahu:

5 ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n’ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya:

6 onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri.

7 Ndi m’huru n’anya, ọ dighi ihe ọhuu enyere n’iwu nkem m’nēdegara unu, kama ihe ochie enyere n’iwu nke unu nwere site na mbu: ihe ochie ahu enyere n’iwu bu okwu ahu nke unu nuru.

8 Ọzọ, ihe ọhu enyere n’iwu ka m’nēdegara unu, ya bu ihe nke bu ezi-okwu nime Ya na nime unu; n’ihi na ọchichiri ahu nāgabiga, ezi ìhè ahu nāmu kwa ub͕u a.

9 Onye nāsi na ya nọ n’ìhè ahu, ma ọ nākpọ nwa-nna-ya asì, ọ nānọ n’ọchichiri ahu rue ub͕u a.

10 Onye nāhu nwa-nna-ya n’anya nānọgide n’ìhè ahu, ọ dighi ihe nēme ka madu ma n’onyà di nime ya.

11 Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n’ọchichiri ahu, nējeghari kwa nime ọchichiri ahu, ọ mataghi kwa ebe ọ nāga, n’ihi na ọchichiri ahu mere ka anya-ya kpue ìsì.

12 Umu-ntakirim, anamedegara unu akwukwọ, n’ihi na agbagharawo unu nmehie-unu n’ihi aha-Ya.

13 Ndi bu nna, anamedegara unu akwukwọ, n’ihi na unu amawo Onye ahu Nke di site na mbu. Umu-okorọbia, anamedegara unu akwukwọ, n’ihi na unu emeriwo ajọ onye ahu. Umu-ntakirim, edegaram unu akwukwọ, n’ihi na unu amawo Nna-ayi.

14 Ndi bu nna, edegaram unu akwukwọ, n’ihi na unu amawo Onye ahu nke di site na mbu. Umu-okorọbia, edegaram unu akwukwọ, n’ihi na unu di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu, unu emeriwo kwa ajọ onye ahu.

15 Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa, n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n’anya, ihu-n’anya nke Nna-ayi adighi nime ya.

16 N’ihi na ihe nile nke di n’uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n’uwa.

17 Uwa nāgabiga kwa, ya na agu ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi.

18 Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu.

19 Ha siri n’etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n’ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n’etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.

20 Unu onwe-unu nwe-kwa-ra otite-manu site n’Onye Nsọ ahu, unu mata-kwa-ra ihe nile.

21 Ọ bughi n’ihi na unu amataghi ezi okwu ahu ka m’degara unu akwukwọ, kama ọ bu n’ihi na unu matara ya, ọ bu kwa n’ihi na ọ dighi ugha ọ bula si n’ezi-okwu ahu puta.

22 Onye bu onye-ugha ahu ma-ọbughi onye nāgọ si na Jisus abughi Kraist ahu? Onye nāgọnari Nna-ayi na Ọkpara-Ya, onye a bu onye ahu nēmegide Kraist.

23 Onye ọ bula nke nāgọnari Ọkpara ahu, o nweghi kwa Nna ahu: onye nēkwuputa Ọkpara ahu, o nwe-kwa-ra Nna ahu.

24 Ma unu onwe-unu, ka ihe ahu unu nuru site na mbu digide nime unu. Ọ buru na ihe ahu unu nuru site na mbu adigide nime unu, unu onwe-unu gānọgide kwa nime Ọkpara ahu, nọgide kwa nime Nna-Ya.

25 Nka bu kwa nkwa ahu nke Ya onwe-ya kwere ayi, bú ndu ahu, nke bu ndu ebighi-ebi.

26 Ihe ndia ka m’degara unu n’akwukwọ bayere ndi nēduhie unu.

27 Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n’aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya.

28 Umu-ntakirim, nānọgide-kwa-nu nime Ya ub͕u a; ka ọ gābu, ma ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu, ghara kwa iwere ihere pua n’iru Ya n’ọbibia-Ya.

29 Ọ buru na unu matara na Ọ bu onye ezi omume, unu mara na onye ọ bula nke nēme ezi omume bu kwa onye amuworo site na Ya.

Categories
I. JỌN

I. JỌN 3

1 Lenu aha ihunanya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke: ayi bu kwa umu-Ya. N’ihi nka uwa amaghi ayi, n’ihi na ọ maghi Ya.

2 Ndi m’huru n’anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n’ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.

3 Onye ọ bula nke nwere olile-anya nka n’ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ di ọcha, dika Ya onwe-ya di ọcha.

4 Onye ọ bula nke nēme nmehie, ọ nēme kwa ihe nmebi iwu: nmehie bu kwa nmehie-iwu.

5 Unu mata-kwa-ra na emere ka Ya onwe-ya puta ìhè ka O we hichapu nmehie; nmehie adighi kwa nime Ya.

6 Onye ọ bula nke nānọgide nime Ya adighi-emehie: onye ọ bula nke nēmehie ahughi Ya anya mb͕e ọ bula, ọ maghi kwa Ya.

7 Umu-ntakirim, unu ekwela ka onye ọ bula duhie unu: onye nēme ezi omume bu onye ezi omume, dika Ya onwe-ya bu onye ezi omume:

8 onye nēme nmehie si n’ekwensu puta; n’ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n’iyì.

9 Onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-eme nmehie, n’ihi na nkpuru-Ya nādigide nime ya: ọ pughi kwa imehie, n’ihi na amuwo ya site na Chineke.

10 Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu: onye ọ bula nke nādighi-eme ezi omume esighi na Chineke puta, onye nke nādighi-ahu nwa-nna-ya n’anya esighi kwa na Ya puta.

11 N’ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n’anya:

12 ọ bughi dika Ken si buru onye si n’ajọ onye ahu puta, we b͕ue nwa-nne-ya. Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka o b͕uru ya? N’ihi na ọlu-ya jọrọ njọ, ma ọlu nke nwa-nne-ya ziri ezi.

13 Umu-nnam, ka ọ ghara iju unu anya ma ọ buru na uwa akpọ unu asì.

14 Ayi onwe-ayi matara na ayi esitewo n’ọnwu ba na ndu, n’ihi na ayi nāhu umu-nna-ayi n’anya. Onye nādighi-ahu n’anya nānọgide n’ọnwu.

15 Onye ọ bula nke nākpọ nwa-nna-ya asì bu ob͕u-madu: unu mata-kwa-ra na ọ dighi ob͕u-madu ọ bula nwere ndu ebighi-ebi nādigide nime ya.

16 Nime nka ka ayi maworo ihu-n’anya, n’ihi na Ya onwe-ya tọb͕ọrọ ndu-Ya n’ihi ayi: ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ itọb͕ọ ndu-ayi n’ihi umu-nna-ayi.

17 Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya?

18 Umu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n’anya n’okwu, ma-ọbu n’ire; kama ka ayi nāhu n’anya n’ọlu na ezi-okwu.

19 Nime nka ka ayi gāmara na ayi bu ndi nke ezi-okwu ahu, me kwa ka obi-ayi kwenye ekwenye n’iru Ya,

20 n’ihe ọ bula nke obi-ayi nāma ayi ikpé nime ya; n’ihi na Chineke ka obi-ayi uku, Ọ ma-kwa-ra ihe nile.

21 Ndi m’huru n’anya, ọ buru na obi-ayi amaghi ayi ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n’ebe Chineke nọ;

22 ihe ọ bula ayi nāriọ kwa, ayi nānata ya n’aka-Ya, n’ihi na ayi nēdebe ihe nile Ọ nyere n’iwu, ayi nēme kwa ihe nile nātọ utọ n’iru Ya.

23 Nka bu kwa ihe O nyere n’iwu, ka ayi kwere n’aha nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist, hurita kwa onwe-ayi n’anya, dika O nyere ayi iwu.

24 Onye nēdebe kwa ihe nile O nyere n’iwu nānọgide nime Ya, Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ya. Nime nka ka ayi makwara na Ọ nānọgide nime ayi, site na Mọ Nsọ ahu Nke O nyere ayi.

Categories
I. JỌN

I. JỌN 4

1 Ndi m’huru n’anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n’ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n’uwa.

2 Nime nka ka unu mara Mọ nke Chineke: mọ ọ bula nke nēkwuputa na Jisus Kraist abiawo n’anu-aru bu mọ nke siri na Chineke puta:

3 ma mọ ọ bula nke nādighi-ekwuputa Jisus, o sighi na Chineke puta: nka bu kwa mọ nke onye ahu nēmegide Kraist, nke unu nuworo na ọ nābia; ọ bu kwa n’oge di ub͕u a ka ọ nọ n’uwa.

4 Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n’ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n’uwa uku.

5 Ndi ahu bu ndi nke uwa: n’ihi nka ha nēkwu okwu nke si n’uwa puta, uwa nānu kwa olu-ha.

6 Ayi onwe-ayi bu ndi siri na Chineke puta: onye mara Chineke nānu olu-ayi; onye nēsighi na Chineke puta adighi-anu olu-ayi. Ayi sitere na nka mara mọ ezi-okwu ahu, na mọ nduhie ahu.

7 Ndi m’huru n’anya, ka ayi hurita onwe-ayi n’anya: n’ihi na ihu-n’anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n’anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke.

8 Onye nādighi-ahu n’anya amaghi Chineke; n’ihi na Chineke bu ihu-n’anya.

9 Nime nka ka emere ka ihu-n’anya Chineke puta ìhè nime ayi, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ muru nání Ya zite n’uwa, ka ayi we di ndu site n’aka-Ya.

10 Nime nka ka ihu-n’anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n’anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n’anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi.

11 Ndi m’huru n’anya, ọ buru na Chineke huru ayi n’anya otú a, ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n’anya.

12 Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula: ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n’anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n’anya-Ya zue okè nime ayi:

13 nime nka ka ayi mara na ayi nānọgide nime Ya, na Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ayi, n’ihi na O nyewo ayi ufọdu nime Mọ nke Ya.

14 Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa.

15 Onye ọ bula nke gēkwuputa na Jisus bu Ọkpara Chineke, Chineke nānọgide nime ya, ya onwe-ya nānọgide kwa nime Chineke.

16 Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n’anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n’ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n’anya; onye nānọgide kwa n’ihu-n’anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya.

17 Nime nka ka emeworo ka ihu-n’anya zue okè n’akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n’ubọchi ikpé ahu; n’ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n’uwa nka.

18 Egwu adighi n’ihu-n’anya: kama ihu-n’anya nke zuru okè nāchupu egwu n’èzí, n’ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya

19 Ayi onwe-ayi nāhu n’anya, n’ihi na Ya onwe-ya buru uzọ hu ayi n’anya.

20 Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n’anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n’ihi na onye nādighi-ahu nwa-nna-ya n’anya, bú onye ọ huworo, ọ pughi ihu Chineke n’anya, bú Onye ọ nāhughi mb͕e ọ bula.

21 Ihe a enyere n’iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n’ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n’anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n’anya.

Categories
I. JỌN

I. JỌN 5

1 Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n’anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n’anya.

2 Nime nka ka ayi mara na ayi nāhu umu Chineke n’anya, mb͕e ọ bula ayi nāhu Chineke n’anya, me kwa ihe nile O nyere n’iwu.

3 N’ihi na nka bu ihu-n’anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adighi kwa arọ́.

4 N’ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi.

5 Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke?

6 Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.

7 Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n’ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu.

8 N’ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.

9 Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n’ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya.

10 Onye kwere n’Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n’ihi na o kweghi n’àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya.

11 Àmà ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebighi-ebi, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya.

12 Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu.

13 Ihe ndia ka m’degara unu n’akwukwọ, bú ndi kwere n’aha Ọkpara Chineke, ka unu we mata na unu nwere ndu ebighi-ebi.

14 Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n’ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi:

15 ọ buru kwa na ayi matara na Ọ nānu olu-ayi n’ihe ọ bula ayi nāriọ, ayi matara na ayi nwere ihe-aririọ ahu ayi riọ̀woro n’aka-Ya.

16 Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m’nāgwa ya ka o kpe.

17 Ajọ omume nile bu nmehie: nmehie di kwa nke nādighi-eweta ọnwu.

18 Ayi matara na onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-emehie; kama Onye ahu Nke amuru Ya site na Chineke nēdebe ya, ajọ onye ahu adighi-emetu kwa ya aka.

19 Ayi matara na ayi bu ndi si na Chineke puta, uwa dum nātọb͕ọ kwa n’aka ajọ onye ahu.

20 Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.

21 Umu-ntakirim, chenu onwe-unu nche ka unu ghara ikpere arusi.