Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 21

1 Setan we guzo imegide Israel, o we kpalie Devid iguta Israel.

2 Devid we si Joab, si kwa ndi-isi ndi Israel, Jenu, gua Israel ọnu site na Bia-sheba we rue Dan; wetaranum ọnu-ọgugu-ha ka m’we mara ya.

3 Joab we si, Ka Jehova tukwasiri ndi-Ya, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise: onye-nwem, bú eze, hà abughi ndi-orù onye-nwem nwere, ha nile? n’ìhi gini ka onye-nwem nāchọ ihe a? n’ìhi gini ka ọ gāghọrọ Israel ihe-ikpe-ọmuma?

4 Ma okwu eze di ike n’ebe Joab nọ. Joab we pua, jegharia n’Israel nile, biarue Jerusalem.

5 Joab we nye Devid ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel. Israel nile we di orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ iri-na-asa na nnù iri, ndi nāmiputa mma-agha: Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri-na-asatọ na nnù iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.

6 Ma ọ gukọtaghi Livai na Benjamin n’etiti ha: n’ihi na okwu eze bu ihe-árú n’anya Joab.

7 Ọ we jọ njọ n’anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.

8 Devid we si Chineke, Emehiewom nke-uku n’ihe a m’meworo: ma ub͕u a, biko, me ka ajọ omume orù-Gi gabiga; n’ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.

9 Jehova we gwa Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke Devid, okwu, si,

10 Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēche n’iru gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M’we me gi ya.

11 Gad we biakute Devid, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nara n’onwe-gi otù n’ihe ndia;

12 ma ọ bu oké unwu arọ atọ; ma-ọbu ka ekpochapu gi ọnwa atọ n’iru ndi nākpab͕u gi, ọbuná mma-agha ndi-iro-gi nēru gi aru; ma-ọbu mma-agha Jehova ubọchi atọ, bú ajọ ọria nēfe efe n’ala, mọ-ozi nke Jehova nēbibi kwa n’ókè-ala nile nke Israel. Ma ub͕u a le okwu m’gēweghachiri Onye nēzitem.

13 Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko ka m’dabà n’aka Jehova; n’ihi na obi-ebere-Ya bara uba nke-uku: ma ka m’ghara idabà n’aka madu.

14 Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n’aru Israel: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we dapu n’Israel.

15 Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n’ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n’akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.

16 Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n’etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n’aka-ya, nke esetiri n’elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n’ala.

17 Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti.

18 Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n’ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.

19 Devid we rigo n’okwu Gad nke o kwuru n’aha Jehova.

20 Ọnan we chigharia, hu mọ-ozi ahu; umu-ya ndikom anọ ndi ya na ha nọ we nēzo onwe-ha. Ma Ọnan nāzọcha ọka wheat.

21 Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n’ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n’ala.

22 Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m’we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n’ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n’ebe ndi Israel nọ.

23 Ọnan we si Devid, Were ya n’onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n’anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m’nyeworo.

24 Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n’ego zuru ezu o ruru: n’ihi na m’gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m’gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m’nētiyeghi ego ọ bula.

25 Devid we nye Ọnan nnù shekel ọla-edo na ọgu iri n’ọtùtù iji zuru ebe ahu.

26 Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n’ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n’elu-igwe za ya n’elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.

27 Jehova we gwa mọ-ozi ahu; o we mighachi mma-agha-ya n’ọbọ-ya.

28 Na mb͕e ahu, mb͕e Devid huru na Jehova zara ya n’ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus, o we chua àjà n’ebe ahu.

29 Ma ebe-obibi Jehova, nke Moses mere n’ọzara, na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, di n’ebe di elu nime Gibeon na mb͕e ahu.

30 Ma Devid apughi ije n’iru ya iju Chineke ase: n’ihi na ọ turu egwu nke-uku n’ihi mma-agha mọ-ozi nke Jehova.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 22

1 Devid we si, Nka bu ulo Jehova, bú Chineke, nka bu-kwa-ra Israel ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.

2 Devid we si ka achikọta ndi-ọbìa ndi nọ n’ala Israel; o we guzo ndi nāwa nkume iwa nkume awaputara awaputa iwu ulo Chineke.

3 Devid dozi-kwa-ra ígwè riri nne ikpuru ibo ọnu-uzọ-ama nile ǹtú, na ikpu ihe-njikọta nile; na ọla riri nne nke anātùghi atù;

4 na osisi cedar nādighi ọnu-ọgugu: n’ihi na ndi Zaidon na ndi Taia butere osisi cedar riri nne nye Devid.

5 Devid we si, Solomon nwam bu nwata di kwa nrò, ma ulo ahu agēwuru Jehova, aghaghi ime ya ka ọ di uku kachasi ulo nile, ibu aha na ibu ihe mara nma diri ala nile: biko, ka m’doziere ya. Devid we dozie ri nne tutu ọ nwua.

6 O we kpọ Solomon, bú nwa-ya, nye ya iwu iwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo.

7 Devid we si Solomon nwa-ya, Mu onwem, ọ di n’obim iwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo.

8 Okwu Jehova we ruem nti, si, I wusiwo ọbara ri nne, i buwo kwa agha uku di iche iche: i gaghi-ewuru aham ulo, n’ihi na i wusiwo ọtutu ọbara n’uwa n’irum:

9 le, agāmuru gi nwa-nwoke, onye ahu gābu nwoke izu-ike; M’gēme kwa ka o zuru ike pua n’aka ndi-iro-ya nile buruburu: n’ihi na Solomon ka aha-ya gābu, M’gēnye kwa Israel udo na idi-jū n’ubọchi-ya:

10 onye ahu gēwuru aham ulo; ya onwe-ya gāburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna; M’gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike n’elu Israel rue mb͕e ebighi-ebi.

11 Ub͕u a, nwam, ka Jehova nọyere gi; gi nwe kwa uche, wue ulo Jehova, bú Chineke-gi, dika O kwuworo bayere gi.

12 Nání Jehova nye gi ezi uche na nghọta, nye gi iwu bayere Israel; ọbuná idebe iwu Jehova, bú Chineke-gi.

13 Mb͕e ahu ka i gēnwe uche, ọ buru na i lezie anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke Jehova nyere Moses n’iwu bayere Israel: di ike, nwe kwa ume; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

14 Ma, le, na nwedam edoziworom ulo Jehova ọla-edo orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri, na ọla-ọcha orú nnù talent ọgu uzọ isi na uzọ ise; ma ọla na ígwè enweghi ọtùtù; n’ihi na o riri nne: edoziwokwam osisi na nkume; i gātukwasi kwa ha ihe.

15 Ndi nēje ozi ri-kwa-ra nne n’aka-gi, ndi nāwa nkume na osisi na ndi-ọ̀kà nkume na osisi, na ndi nile mara ihe n’ije-ozi ọ bula;

16 ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, enweghi ọnu-ogugu; bilie, lua ọlu, ka Jehova nọyere kwa gi.

17 Devid we nye ndi-isi nile nke Israel iwu iyere Solomon nwa-ya aka, si,

18 Jehova, bú Chineke-unu, Ọ̀ nọyeghi unu? Ọ̀ meghi kwa ka unu zuru ike buruburu? n’ihi na Ọ nyewo n’akam ndi bi n’ala; ebudawo kwa ala n’iru Jehova, na n’iru ndi-Ya.

19 Ub͕u a werenu obi-unu na nkpuru-obi-unu nye ichọ Jehova, bú Chineke-unu; bili-kwa-nu, wue ebe nsọ Jehova, bú Chineke, ibubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na ihe nsọ nile nke Chineke, n’ulo nke anēwuru aha Jehova.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 23

1 Ma Devid ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ, o we me Solomon, bú nwa-ya, eze Israel.

2 O we chikọta ndi-isi nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai.

3 Ewe gua ndi Livai ọnu site n’onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n’iru: ọnu-ọgugu-ha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndikom di ike, di orú nnù uzọ anọ na nnù iri-na-ise.

4 Nime ndia ndi ọlu-ha bu ichi achi n’ije-ozi ulo Jehova di orú nnù uzọ atọ; nnù ndikom iri-na-ise bu ndi-odozi-okwu na ndi-ikpe:

5 nnù ndikom iri bu ndi-ọnu-uzọ; nnù ndikom iri nēto Jehova n’ihe m’mere iji to Ya, ka Devid kwuru.

6 Devid we kè ha n’òkè, n’òkè, dika umu Livai si di; bú Giashon na Kohat, na Merari.

7 Nke ndi Giashon; Ladan na Shimai.

8 Umu-ndikom Ladan; onye-isi bu Jehiel, na Zitam, na Joel, atọ.

9 Umu-ndikom Shimai; Shel-omot, na Haziel, na Haran, atọ. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Ladan.

10 Umu-ndikom Shimai kwa; Jahat, na Zina, na Jeush, na Beria. Anọ ndia bu umu Shimai.

11 Jahat bu onye-isi, Ziza bu kwa nke-abua: ma Jeush na Beria enweghi ọtutu umu-ndikom; ha we ghọ otù ulo nna site n’igukọta ha n’otù.

12 Umu-ndikom Kohat; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel, anọ.

13 Umu-ndikom Amram; Eron na Moses: ewe kewapu Eron, ido ya nsọ ibu onye nsọ kachasi ndi nsọ nile, ya onwe-ya na umu-ya ndikom, rue mb͕e ebighi-ebi, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’iru Jehova, ijere Ya ozi, na igọzi n’aha-Ya, rue mb͕e ebighi-ebi.

14 Ma Moses, bú onye nke Chineke ahu, anākpọ umu-ya ndikom aha n’etiti ebo Livai.

15 Umu-ndikom Moses; Giashom, na Elieza.

16 Umu-ndikom Giashon; Shebuel, bú onye-isi.

17 Umu-ndikom Elieza bu kwa Rehabia, bú onye-isi. Ma Elieza enweghi umu-ndikom ọzọ; ma umu-ndikom Rehabia bara uba nke-uku.

18 Umu-ndikom Izha; Shelomit, bú onye-isi.

19 Umu-ndikom Hebron; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ.

20 Umu-ndikom Uziel; Maika, bú onye-isi, na Ishia, bú nke-abua.

21 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Umu-ndikom Mahli; Eleeza na Kish.

22 Eleeza we nwua, ma o nweghi umu-ndikom, ọ bu nání umu-ndinyom: umu-nne-ha, bú umu-ndikom Kish, we luru ha na nwunye.

23 Umu-ndikom Mushi; Mahli, na Ida, na Jeremot, atọ.

24 Ndia bu umu Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-ha agukọtara, n’ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndi nēje ozi ahu diri òfùfè ulo Jehova, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba.

25 N’ihi na Devid siri, Jehova, bú Chineke Israel, emewo ka ndi-Ya zuru ike; Ọ nēbi kwa nime Jerusalem rue mb͕e ebighi-ebi:

26 ọzọ kwa, ndi Livai agaghi-enwe ibūru ebe-obibi na ihe-ya nile diri òfùfè-ya.

27 N’ihi na n’okwu ikpe-azu Devid ka edere ndia, bú ọnu-ọgugu umu-ndikom Livai site n’onye b͕ara orú arọ we gaba.

28 N’ihi na ebe-nguzo-ha di n’akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n’ogige nile, na n’ime-ulo nile, na n’ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke;

29 na idozi achicha anēdo n’usoro, na idozi utu oka flour iji nye onyinye-inata-iru-ọma, na idozi mbadamba-achicha ekoghi-eko, na idozi ihe esiri n’ite isi ihe, na idozi ihe edere edè, na idebe ihe ọ bula itù ihe di miri miri na ihe ọ bula itù ihe ọzọ;

30 na iguzo kwa-ututu ikele na ito Jehova, otú a kwa n’anyasi;

31 na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n’ubọchi-izu-ike nile, na n’ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n’ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n’iru Jehova:

32 ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 24

1 Ekè-kwa-ra umu Eron òkè nile ha. Umu-ndikom Eron; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

2 Nedab na Abaihu we nwua n’iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà.

3 Devid we kè ha, ya na Zedok, onye sitere n’umu Eleeza, na Ahimelek, sitere n’umu Itama, dika ihe-nlekọta-ha si di n’òfùfè-ha.

4 Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

5 Ewe kè ha n’ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n’otù; n’ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n’umu Eleeza na n’etiti umu Itama.

6 Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n’akwukwọ n’iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama.

7 Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia;

8 nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim;

9 nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin;

10 nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija;

11 nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania;

12 nke-iri-na-otù putara Elaiashib, nke-iri-na-abua putara Jakim;

13 nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab;

14 nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea;

15 nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez;

16 nke-iri-na-iteghete putara Petahia, nke-orú putara Jehezkel;

17 nke-orú-na-otù putara Jakin, nke-orú-na-abua putara Gamul;

18 nke-orú-na-atọ putara Delaia, nke-orú-na-anọ putara Maazia.

19 Ndia bu ihe-nlekọta-ha ifè òfùfè-ha, ibà n’ulo Jehova, dika ikpé-ha si di site n’aka Eron nna-ha, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere ya iwu.

20 Ma nke umu Livai ndi fọduru: nke umu Amram, Shubael; nke umu Shubael, Jehdeia.

21 Nke Rehabia: nke umu Rehabia, onye-isi bu Ishia.

22 Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat.

23 Umu-ndikom Hebron kwa; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ.

24 Umu-ndikom Uziel, Maika; nke umu-ndikom Maika, Shamia.

25 Nwa-nne Maika, Ishia: nke umu-ndikom Ishia, Zekaraia.

26 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi: umu-ndikom Jaazia; Beno.

27 Umu-ndikom Merari; nke Jaazia, Beno, na Shoham, na Zakua, na Ibri.

28 Nke Mahli; Eleeza, onye nēnweghi umu-ndikom.

29 Nke Kish; umu-ndikom Kish, Jerahmeel.

30 Umu-ndikom Mushi kwa; Mahli, na Ida, na Jerimot. Ndia bu umu ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

31 Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n’iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 25

1 Devid na ndi-isi usu-ndi-agha we kewaputara òfùfè ufọdu nime umu Esaf, na nke Himan, na nke Jedutun, ndi nēwere ubọ-akwara, na une, na ájà, bu amuma: ọnu-ọgugu-ha, bú ndikom nēje ozi dika òfùfè-ha si di, we di:

2 nke umu ndikom Esaf; Zakua, na Josef, na Netanaia, na Asharela, bú umu Esaf; ha nọ n’aka Esaf, onye nēbu amuma n’aka eze.

3 Nke Jedutun: umu-ndikom Jedutun; Gedalaia, na Zeri, na Jeshaia, na Hashabaia, na Matitaia, isi; ha nọ n’aka nna-ha, bú Jedutun, onye nēwere ubọ-akwara bu amuma bayere ikele na ito Jehova.

4 Nke Himan: umu-ndikom Himan; Bukia, na Matanaia, na Uziel, na Shebuel, na Jerimot, na Hananaia, na Hanani, na Eliata, na Gidalti, na Romamti-eza, na Joshbekasha, na Maloti, na Hotia, na Mahaziot:

5 ndia nile bu umu-ndikom Himan, bú onye-ọhu-uzọ eze n’okwu Chineke, iweli mpi elu. Chineke we nye Himan umu-ndikom iri na anọ na umu-ndinyom atọ.

6 Ndia nile nọ n’aka nna-ha n’ibù abù n’ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n’aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.

7 Ọnu-ọgugu-ha, tiyere umu-nne-ha, ndi ezíworo abù anābùku Jehova, bú ndi nile nwere nghọta, di ọgu iri-na-anọ na asatọ.

8 Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n’otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe.

9 Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:

10 nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

11 nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

12 nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

13 nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

14 nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

15 nke-asatọ mara Jeshaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

16 nke-iteghete mara Matanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

17 nke-iri mara Shimai, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

18 nke-iri-na-otù mara Azarel, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

19 nke-iri-na-abua mara Hashabaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

20 n’ife-nzà nke-iri-na-atọ ọ mara Shubael, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

21 nime nke-iri-na-anọ ọ mara Matitaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

22 nime nke-iri-na-ise ọ mara Jeremot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

23 nime nke-iri-na-isi ọ mara Hananaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

24 nime nke-iri-na-asa ọ mara Joshbekasha, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

25 nime nke-iri-na-asatọ ọ mara Hanani, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

26 nime nke-iri-na-iteghete ọ mara Maloti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-abua:

27 nime nke-orú ọ mara Eliata, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

28 nime nke-orú-na-otù ọ mara Hotia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

29 nime nke-orú-na-abua ọ mara Gidalti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

30 nime nke-orú-na-atọ ọ mara Mahaziot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

31 nime nke-orú-na-anọ ọ mara Romamti-eza, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 26

1 Bayere òkè nile nke ndi-ọnu-uzọ: nke ndi Kora; Meshelemaia nwa Kore, nke sitere n’umu Esaf.

2 Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom; Zekaraia, bú ọkpara, na Jediael, bú nke-abua, na Zebadaia, bú nke-atọ, na Jatniel, bú nke-anọ;

3 na Ilam, bú nke-ise, na Jehohanam, bú nke-isi, na Eliehoenai, bú nke-asa.

4 Obed-edom nwe-kwa-ra umu-ndikom, Shemaia, bú ọkpara, na Jehozabad, bú nke-abua, na Joa, bú nke-atọ, na Saka, bú nke-anọ, na Netanel, bú nke-ise;

5 na Amiel, bú nke-isi, na Isaka, bú nke-asa, na Peuletai, bú nke-asatọ: n’ihi na Chineke gọziri ya.

6 Amu-kwa-ra umu-ndikom nye Shemaia nwa-ya, ndi nāchi ulo nna-ha: n’ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha bu.

7 Umu-ndikom Shemaia; Ọtni, na Refael, na Obed, na Elzabad, umu-nne-ya bu ndi-dìnkpà, Elaihu, na Semakaia.

8 Ndia nile sitere n’umu Obed-edom: ha onwe-ha na umu-ha ndikom na umu-nne-ha, ndikom bu dìnkpà n’ike ifè òfùfè; ọgu ndikom atọ na abua nke Obed-edom nwere.

9 Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom na umu-nne, ndi-dìnkpà, iri na asatọ.

10 Hosa, onye sitere n’umu Merari, nwe-kwa-ra umu-ndikom; Shimri bú onye-isi, (n’ihi na ọ bu ezie na ọ bughi ọkpara, ma nna-ya mere ya onye-isi;)

11 na Hilkaia, bú nke-abua, na Tebalia, bú nke-atọ, na Zekaraia, bú nke-anọ: umu-ndikom na umu-nne nile nke Hosa nwere di iri na atọ.

12 Nke ndia ka òkè nile nke ndi-ọnu-uzọ-ama bu, bú nke ndi-isi nke ndi di ike nwere ihe-ndebe ọbuná dika umu-nne-ha, ije ozi n’ulo Jehova.

13 Ha we fe nzà, ma onye ntà ma onye uku, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bayere ọnu-uzọ-ama ọ bula.

14 Ife-nzà n’akuku ọwuwa-anyanwu we ma Shelemaia. Ha fe-kwa-ra nzà bayere Zekaraia nwa-ya, bú onye nādu ọdu nke nwere uche; ife-nzà-ya we puta n’akuku Ugwu.

15 Ife-nzà nke Obed-edom putara n’akuku Ndida; nke umu-ya ndikom puta-kwa-ra n’ulo nchikọta-ihe.

16 Nke Shupim na nke Hosa putara n’Ọdida-anyanwu, n’akuku ọnu-uzọ-ama Shaleket, n’uzọ atuliri atuli nke nārigo, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.

17 Ndi Livai isi nọ n’akuku ọwuwa-anyanwu, n’akuku Ugwu ha di anọ kwa-ubọchi, n’akuku Ndida ha di anọ kwa-ubọchi, ha di-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe abua abua kwa-ubọchi.

18 N’èzí ulo n’akuku Ọdida-anyanwu ha di anọ n’uzọ atuliri atuli, abua n’èzí ulo.

19 Ndia bu òkè ndi-ọnu-uzọ-ama; nke umu ndi Kora, na nke umu Merari.

20 Nime ndi Livai, Ahaija bu onye-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke, ọbuná idebe ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile.

21 Umu-ndikom Ladan; umu ndi Giashon, bú ndi Ladan nwere, ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Ladan onye Giashon nwere; Jehieli.

22 Umu-ndikom Jehieli; Zitam, na Joel nwa-nne-ya, bú ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Jehova.

23 Nke ndi Amram, nke ndi Izha, nke ndi Hebron, nke ndi Uziel:

24 Shebuel nwa Giashon, nwa Moses, bu kwa onye-isi ulo-àkù nile.

25 Umu-nne-ya kwa; bú umu nke Elieza: Rehabaia nwa-ya, na Jeshaia nwa-ya, na Joram nwa-ya, na Zikri nwa-ya, na Shelomot nwa-ya.

26 Shelomot nka na umu-nne-ya bu ndi-isi ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile nke Devid, bú eze, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na usu ọgu ndikom ise, na ndi-isi usu-ndi-agha, doro nsọ.

27 Site n’agha-ha nile, bú site n’ihe-nkwata, ka ha doro ya nsọ ime ka ulo Jehova di ike.

28 Ya na ihe nile Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na Sọl nwa Kish, na Abnea nwa Nea, na Joab nwa Zeruaia, doro nsọ; onye ọ bula nke doro ihe nsọ, ọ di n’aka Shelomit na umu-nne-ya.

29 Nke ndi Izha, Kenania na umu-ya ndikom diri ozi èzí n’ebe Israel nọ, ibu ndi-odozi-okwu na ibu ndi-ikpe.

30 Nke ndi Hebron, Hashabaia na umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, nnù ndikom anọ na ọgu ise, bu ndi-isi nlekọta Israel n’ofè Jọdan n’akuku Ọdida-anyanwu; bayere ozi nile nke Jehova, baye-kwa-ra òfùfè eze.

31 Nke ndi Hebron, Jerija bu onye-isi, ọbuná nke ndi Hebron, dika osuso-ọmumu nile ha si di n’ulo nke ndi bu nna. N’arọ nke-ọgu-abua Devid bu eze ka achọrọ ha, ewe chọta nime ha ndi-dike bu dìnkpà nime Jeza Gilead.

32 Ma umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, di nnù ndikom isi na ọgu iri-na-ise, ndi-isi ulo nke ndi bu nna; Devid, bú eze, we me ka ha buru ndi-nlekọta ndi Reuben na ndi Gad na nkera ebo ndi Manase, bayere ihe nile nke Chineke na ihe nile nke eze.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 27

1 Ma umu Israel, dika ọnu-ọgugu-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-odozi-okwu-ha ndi nējere eze ozi, n’ihe ọ bula nke òkè nile ndi nābata nāpu kwa n’ọnwa n’ọnwa, n’ọnwa nile nke arọ, otù òkè di orú nnù uzọ atọ.

2 Onye-isi òkè mbu nke diri ọnwa mbu bu Jashọbeam nwa Zabdiel: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

3 O sitere n’umu Perez, bú onye-isi nke ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha nke diri ọnwa mbu.

4 Ma onye-isi òkè nke ọnwa nke-abua bu Dodai onye Ahoa, na òkè-ya; Miklot bu kwa onye-ndú-ha: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

5 Onye-isi usu-ndi-agha nke-atọ nke diri ọnwa nke-atọ bu Benaia nwa Jehoiada onye-nchu-aja, ọ bu onye-isi: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

6 Onye ahu bu Benaia nke bu dike nke orú ndikom na iri ahu, ọ bu kwa onye-isi orú na iri ahu: Amizabad nwa-ya di kwa n’òkè-ya.

7 Onye-isi nke-anọ nke diri ọnwa nke-anọ bu Asahel nwa-nne Joab, Zebadaia nwa-ya so-kwa-ra ya: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

8 Onye-isi nke-ise nke diri ọnwa nke-ise bu Shamhut onye-Izrahait: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

9 Onye-isi nke-isi nke diri ọnwa nke-isi bu Ira nwa Ikesh onye Tekoa: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

10 Onye-isi nke-asa nke diri ọnwa nke-asa bu Hilez onye-Pelonait, onye sitere n’umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

11 Onye-isi nke-asatọ nke diri ọnwa nke-asatọ bu Sibekai onye Husha, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

12 Onye-isi nke-iteghete nke diri ọnwa nke-iteghete bu Abieza onye Anatot, nke ndi Benjamin: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

13 Onye-isi nke-iri nke diri ọnwa nke-iri bu Maharai onye Netofa, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

14 Onye-isi nke-iri-na-otù nke diri ọnwa nke-iri-na-otù bu Benaia onye Piraton, sitere n’umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

15 Onye-isi nke-iri-na-abua nke diri ọnwa nke-iri-na-abua bu Heldai onye Netofa, nke Ọtniel: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n’òkè-ya.

16 Ndi-isi kwa nke ebo nile nke Israel: nke ndi Reuben, Elieza nwa Zikri bu onye-ndú: nke ndi Simeon, Shefataia nwa Meaka:

17 nke Livai, Hashabaia nwa Kemuel: nke Eron, Zedok:

18 nke Juda, Elaihu, onye sitere n’umu-nne-Devid: nke Isaka, Ọmri nwa Maikael:

19 nke Zebulun, Ishmaia nwa Obadaia: nke Naftali, Jerimot nwa Azriel:

20 nke umu Efraim, Hoshea nwa Azazaia: nke nkera ebo Manase, Joel nwa Pedaia:

21 nke nkera ebo Manase di na Gilead, Ido nwa Zekaraia: nke Benjamin, Jaasiel nwa Abnea:

22 nke Dan, Azarel nwa Jeroham. Ndia bu ndi-isi ebo nile nke Israel.

23 Ma Devid agutaghi ọnu-ọgugu-ha site n’onye b͕ara orú arọ we rida: n’ihi na Jehova siri na Ọ gēme ka Israel ba uba dika kpakpando nke elu-igwe.

24 Joab nwa Zeruaia malitere iguta ha, ma ọ guzughi; iwe we dikwasi Israel n’ihi nka; etiyeghi kwa ọnu-ọgugu n’ọnu-ọgugu nke di n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke eze, bú Devid.

25 Onye-isi ulo-àkù nile nke eze bu Azmavet nwa Adiel: onye-isi ulo-àkù nile nke di n’ọhia, na n’obodo nile, na n’obodo ntà nile, na n’ulo-elu nile, bu kwa Jehonatan nwa Uzaia:

26 onye-isi ndi nēje ozi ubi ilu ọlu ala-ubi bu Ezri nwa Kelub:

27 onye-isi ubi-vine nile bu Shimai onye Rema: onye-isi nke ihe di n’ubi-vine itiye n’ulo nile anēdebe manya-vine bu Zabdi onye Shefam:

28 onye-isi osisi olive nile na osisi sycomore nile nke di n’ebe di ala ala bu Beal-hanam onye Geda: onye-isi ulo nile anēdebe manu bu Joash:

29 onye-isi ìgwè ehi nke nāta nri nime Sheron bu Shitrai onye Sheron: onye-isi ìgwè ehi nke di nime ndagwurugwu nile bu Shefat nwa Adlai:

30 onye-isi camel nile bu Obil onye Ishmael: onye-isi inyinya-ibu nile bu Jehdeia onye Meronot:

31 onye-isi ìgwè ewu na aturu bu Jaziz onye Haga. Ndia nile bu ndi-isi àkù nke Devid nwere.

32 Jonatan nwa-nne nna Devid bu onye nādu ọdu, nwoke nwere nghọta na ode-akwukwọ ka ọ bu: Jehiel nwa Hakmoni nọye-kwa-ra umu-ndikom eze:

33 Ahitofel bu kwa onye nādu eze ọdu: Hushai onye-Akait bu eyì eze:

34 ma nke nēso Ahitofel bu Jehoiada nwa Benaia, na Abaiata: onye-isi usu-ndi-agha eze bu Joab.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 28

1 Devid we kpọkọta ndi-isi nile nke Israel, bú ndi-isi ebo nile, na ndi-isi òkè nile ndi nējere eze ozi, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-isi àkù na anu-ulo nile eze nwere, na nke umu-ya ndikom nwere, ha na ndi-onozi, na ndi-dike, ọbuná dike ọ bula nke bu dìnkpà, rue Jerusalem.

2 Devid, bú eze, we guzo ọtọ n’ukwu-ya abua, si, Nurunum, umu-nnem, na ndim: mu onwem, ọ di n’obim iwuru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova ulo izu-ike, nke gābu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu Chineke-ayi; m’we dozie ihe iji ewu ulo.

3 Ma Chineke sirim, I gaghi-ewuru aham ulo, n’ihi na nwoke agha ka i bu, i wusiwo kwa ọbara.

4 Ma Jehova, bú Chineke Israel, rọputaram n’etiti ulo nile nke nnam ibu eze Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n’ihi na Juda ka Ọ rọputara ibu onye-ndú; ma n’ulo Juda Ọ rọputara ulo nnam; ma n’etiti umu-ndikom nnam ihem tọrọ Ya utọ imem ka m’buru eze Israel nile:

5 ma n’etiti umum ndikom nile, (n’ihi na ọtutu umu-ndikom ka Jehova nyerem,) O we rọputa Solomon nwam inọkwasi n’oche-eze nke ala-eze Jehova dika onye-isi Israel.

6 O we sim, Solomon nwa-gi, onye ahu gēwu ulom na ogigem nile: n’ihi na arọputawom ya iburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna.

7 M’gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, ọ buru na ọ di ike ime ihe nile M’nyere n’iwu na ikpém nile, dika esi eme ta.

8 Ma ub͕u a, n’anya Israel nile, bú nkpọkọta Jehova kpọkọtara, ma na nti Chineke-ayi, debenu, chọ kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n’iwu: ka unu we nweta ezi ala nka, me kwa ka umu-unu keta ya rue mb͕e ebighi-ebi, bú ndi gānọchi unu.

9 Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n’ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.

10 Ub͕u a le anya; n’ihi na Jehova arọputawo gi iwu ulo ibu ebe nsọ: di ike, me ya.

11 Devid we nye Solom nwa-ya ihe-atù nke uzọ-nbata ulo uku Chineke, na nke ulo-ya nile, na nke ulo-àkù-ya nile, na nke ime-ulo-elu-ya nile, na nke ime-ime-ulo-ya nile, na nke ulo ebe-nkpuchi-nmehie:

12 na ihe-atù ihe nile nke di n’aka-ya site na Mọ Nsọ bayere ogige nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra ime-ulo nile di buruburu, bayere ulo-àkù nile nke ulo Chineke, baye-kwa-ra ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile:

13 baye-kwa-ra òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, baye-kwa-ra ije-ozi nile nke òfùfè ulo Jehova, baye-kwa-ra ihe nile nke òfùfè ulo Jehova:

14 nke ọla-edo n’ọtùtù bayere ihe ọla-edo, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula; nke ọla-ọcha bayere ihe ọla-ọcha nile n’ọtùtù, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula:

15 n’ọtùtù kwa bayere ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna nile ha nke ọla-edo, n’ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile: baye-kwa-ra ihe-idọba-oriọna nile nke ọla-ọcha, ọla-ọcha n’ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile, dika òfùfè ihe-idọba-oriọna ọ bula:

16 na ọla-edo n’ọtùtù bayere table nile achicha anēdo n’usoro, bú table ọ bula; ọla-ọcha kwa bayere table ọla-ọcha nile:

17 na ndudu nile, na ọkwa-nwusa nile, na iko nile, nke ọla-edo anāgwaghi agwa: baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-edo nile n’ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula; baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-ọcha nile n’ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula:

18 baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ọla-edo anuchara n’ọku n’ọtùtù: baye-kwa-ra ihe-atù ub͕ọ-ala, bú cherubim, ọla-edo, ndi nāb͕asa nkù-ha, kpuchie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.

19 Ihe a nile ka Jehova were odide-akwukwọ me ka m’mata site n’aka-Ya n’arum, ka Devid kwuru, bú ije-ozi nile nke ihe-atù a.

20 Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n’ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova.

21 Ma le, òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai di, ifè òfùfè nile nke ulo Chineke: onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo n’amam-ihe gādi kwa n’aka-gi n’ije-ozi ọ bula, ifè òfùfè ọ bula: ndi-isi na ndi Israel nile gēme kwa ka okwu-gi nile si di.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 29

1 Devid, bú eze, we si nkpọkọta Israel nile, Solomon nwam, onye Chineke rọputaworo nání ya, bu nwata, ọ di kwa nrò, ma ije-ozi a di uku: n’ihi na ọ bughi madu ka ulo uku a diri, kama ọ bu Jehova, bú Chineke.

2 Ma ewerewom ikem nile doziere ulo Chinekem ọla-edo iji me ihe ọla-edo, na ọla-ọcha iji me ihe ọla-ọcha, na ọla iji me ihe ọla, na ígwè iji me ihe ígwè, na osisi iji me ihe osisi; na nkume onyx, na nkume nhiọgide, na nkume ichọ-nma, na nke turu agwa, na nkume nile di oké ọnu-ahia, na nkume marble n’uba.

3 Ọzo kwa, n’ihi na ihe ulo Chinekem nātọm utọ, ebe m’nwere ihe nke akam, bú ọla-edo na ọla-ọcha, ewerewom ya nye ulo Chinekem, tukwasi ihe nile m’doziworo nye ulo nsọ ahu;

4 bú nnù talent ọla-edo asa na ọgu iri, nke ọla-edo Ofia, na nnù talent ọla-ọcha iri-na-asa na ọgu iri, bú nke anuchara n’ọku, iji machita mb͕idi nile nke ulo nile:

5 ọla-edo ahu bu iji me ihe ọla-edo, ọla-ọcha ahu bu kwa iji me ihe ọla-ọcha, na iji je ozi nile ọ bula n’aka ndi-ọ̀kà. Ònye kwa nēwere afọ-ofufo nye onwe-ya imejuru Jehova aka-ya ta?

6 Ndi-isi ulo nke ndi bu nna, na ndi isi ebo Israel nile, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, ọbuná rue ndi-isi ije-ozi eze, we were afọ-ofufo nye onwe-ha.

7 Ha we nye iji fè òfùfè ulo Chineke ọla-edo nnù talent iri-na-abua na ọgu iri, na orú nnù darie na nnù ise, na ọla-ọcha orú nnù talent na nnù ise, na ọla orú nnù uzọ abua na nnù ise, na ígwè orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri.

8 Ndi achọtara nkume di oké ọnu-ahia n’aka-ha we nye ha itiye n’ulo-àkù nke ulo Jehova, n’aka Jehiel onye Giashon.

9 Ndi Israel we ṅuria ọṅu, n’ihi na ha were afọ-ofufo nye onwe-ha, n’ihi na n’obi zuru okè ka ha were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ha: ọzọ kwa, Devid, bú eze, ṅuriri ọṅu uku.

10 Devid we gọzie Jehova n’anya nkpọkọta ahu nile: Devid we si, Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova, bú Chineke Israel nna-ayi, site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

11 Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n’ihi na ihe nile di n’elu-igwe na n’uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi.

12 Ma àkù ma nsọpuru nēsite n’ebe I nọ bia, Gi onwe-gi nāchi kwa ihe nile; ọ bu kwa n’aka-Gi ka ume na idi-ike di; n’aka-Gi ka ọ di kwa ime uku, na ime ka ihe nile di ike.

13 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ayi onwe-ayi nēkele Gi, nēto kwa aha-Gi mara nma.

14 Ma ònye ka mu onwem bu, òle ndi ka ndim bu kwa, na ayi nwere ike iwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ayi otú a? n’ihi na n’ebe I nọ ka ihe nile si bia, ọ bu kwa ihe si n’aka-Gi bia ka ayi nyere Gi.

15 N’ihi na ndi-ọbìa ka ayi bu n’iru Gi, na ndi-nnọdu, dika nna-ayi-hà nile: ubọchi nile ayi n’elu uwa di ka onyinyo, olile-anya adighi kwa.

16 Jehova, bú Chineke-ayi, ọtutu ihe nile a nke ayi doziworo iwuru Gi ulo n’ihi aha nsọ Gi, n’aka-Gi ka o siri bia, ọ bu kwa Gi nwe ya nile.

17 Chinekem, ama-kwa-ram na Gi onwe-gi nānwaputa obi, izi-ezi nātọ kwa Gi utọ. Mu onwem, n’izi-ezi obim ka m’were afọ-ofufo nye Gi ihe nile ndia: ma ub͕u a ndi-gi, ndi ahutara n’ebe a, ewerewom ọṅù hu ha ka ha nēwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ha.

18 Jehova, Chineke nke Abraham na Aisak na Israel, bú nna-ayi-hà, debe nka nime nchèputa nke èchìchè nile nke obi ndi-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, me kwa ka obi-ha guzosie ike n’ebe I nọ:

19 nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n’iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem’doziworo ihe bayere ya.

20 Devid we si nkpọkọta ahu nile, Biko, gọzienu Jehova, bú Chineke-unu. Nkpọkọta ahu nile we gọzie Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, ha we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, nye kwa eze.

21 Ha we chuara Jehova àjà, sure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku, n’echi ubọchi ahu, bú nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù ebulu abua na ọgu iri, na nnù umu-aturu abua na ọgu iri, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, ọbuná àjà n’uba bayere Israel nile;

22 ha we were ọṅù uku rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n’iru Jehova ubọchi ahu. Ha we me Solomon nwa Devid eze nke ub͕ò abua, te ya manu nye Jehova ibu onye-ndú, ha te-kwa-ra Zedok manu ibu onye-nchu-aja.

23 Solomon we nọkwasi n’oche-eze Jehova, buru eze n’ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.

24 Ndi-isi nile, na ndi-dike, na umu-ndikom nile kwa nke eze, bú Devid, kweye-kwa-ra inọ n’okpuru Solomon, bú eze.

25 Jehova we me ka Solomon di uku ri nne n’anya Israel nile, O we tiyekwasi ya ebube ala-eze nke anātukwasighi eze Israel ọ bula nke buru ya uzọ.

26 Ma Devid nwa Jesi bu eze Israel nile.

27 Ma ubọchi nile ọ bu eze Israel di ọgu arọ abua; arọ asa ka ọ bu eze na Hebron, orú arọ na iri na atọ ka ọ bu kwa eze na Jerusalem.

28 O we nwua n’ezi isi-awọ, ubọchi nile nke ndu-ya na àkù na nsọpuru ju-kwa-ra ya afọ: Solomon nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

29 Ma ihe nile Devid, bú eze, mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n’akwukwọ ihe emere nke Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na n’akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n’akwukwọ ihe emere nke Gad, bú onye-ọhu-uzọ;

30 tiyere ọbubu-eze-ya nile, na idi-ike-ya, na mb͕e nile nke gabigara n’isi ya, na n’isi Israel, na n’isi ala-eze nile nke ala di iche iche.