Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 11

1 Israel nile we chikọta onwe-ha n’ebe Devid nọ rue Hebron, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu.

2 Na mb͕e gara aga, ọbuná mb͕e Sọl bu eze, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova, bú Chineke-gi, we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú ndim, bú Israel.

3 Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na Devid we b͕a ndu nime Hebron n’iru Jehova; ha we te Devid manu ibu eze Israel, dika okwu Jehova n’aka Samuel si di.

4 Devid na Israel nile we jerue Jerusalem (nke ahu bu Jebus); ma n’ebe ahu ka ndi Jebus, ndi bi n’ala ahu, nọ.

5 Ndi bi na Jebus we si Devid, I gaghi-abata n’ebe a. Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.

6 Devid we si, Onye ọ bula nke buru uzọ tib͕u ndi Jebus gābu onye-isi na ọchi-agha. Joab nwa Zeruaia we buru uzọ rigo, o we buru onye-isi.

7 Devid we biri n’ebe ahu ewusiri ike; n’ihi ya ka ha kpọrọ ya obodo Devid.

8 O we wue obodo buruburu, site na Milo we rue buruburu ya: ma Joab mere ka obodo fọduru di ndu.

9 Devid we nāga n’iru, nēje nādi uku; Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọye-kwa-ra ya.

10 Ma ndia bu ndi-isi nke ndi-dike Devid nwere, ndi mere onwe-ha ka ha di ike n’akuku ya n’ala-eze-ya, ha na Israel nile, ime ya eze, dika okwu Jehova si di bayere Israel.

11 Nka bu kwa ọnu-ọgugu ndi-dike Devid nwere: Jashọbeam, bú nwa onye-Hakmonait, onye-isi nke orú na iri ahu; o feghariri ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u n’otù ub͕ò.

12 Nke so ya bu Eleeza nwa Dodo, onye Ahoa, onye ahu di n’etiti ndi-dike atọ ahu.

13 Onye ahu nọyere Devid nime Pas-damim, ma ndi Filistia chikọtara onwe-ha n’ebe ahu ibu agha, òkè ubi nke juputara n’ọka barley di kwa; ma ndi Israel b͕alagara n’iru ndi Filistia.

14 Ha we guzo onwe-ha n’etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia; Jehova we zọputa nzọputa uku.

15 Ndikom atọ n’etiti orú ndi-isi na iri ahu we ridarue oké nkume ahu jekuru Devid, rue ọb͕à Adulam; ma ọmuma-ulo-ikwū ndi-Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.

16 Ma Devid nọ n’ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.

17 Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m’ṅua miri sitere n’olùlù-miri Bet-lehem, nke di n’ọnu-uzọ-ama?

18 Ndikom atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n’olùlù-miri Bet-lehem, nke di n’ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma Devid ekweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova,

19 si, Ya burum ihe-árú sitere na Chinekem, ime ihe a: #m’gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n’aka-ha je? n’ihi na ha ji ndu-ha n’aka-ha kute ya. O kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.

20 Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n’etiti ndikom atọ ahu.

21 N’etiti ndikom atọ ahu anāsọpuru ya kari abua fọduru, o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.

22 Benaia nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n’ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n’etiti olùlù n’ubọchi snow nēzò.

23 Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, nwoke toro ogologo, cubit ise; ube di kwa n’aka onye Ijipt ahu dika oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; ma o ji nkpa-n’aka ridakuru ya, napu ube ahu n’aka onye Ijipt n’ike, were ube-ya b͕ue ya.

24 Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n’etiti ndi-dike atọ ahu.

25 Le, anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu: Devid we do ya onye-isi ndi nānu okwu-ya.

26 Ndi-dike nke usu nile nke ndi-agha kwa; Asahel nwa-nne Joab, Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;

27 Shamot onye Haroa, Hilez onye-Pelonait;

28 Ira nwa Ikesh onye Tekoa, Abieza onye Anatot;

29 Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahoa;

30 Maharai onye Netofa, Hiled nwa Beana onye Netofa;

31 Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin, Benaia onye Piraton;

32 Hurai nke miri-iyi Gaash, Abiel onye Araba;

33 Azmavet onye Bahurim, Eliahba onye Shaalabin;

34 nke umu Hashem onye-Gaizonait, Jonatan nwa Shagei onye-Hararait;

35 Ahiam nwa Saka onye-Hararait, Elifal nwa Ua;

36 Hefa onye-Mekeratait, Ahaija onye-Pelonait;

37 Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai;

38 Joel nwa-nne Netan, Mibha nwa Hagri;

39 Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia;

40 Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta;

41 Uraia onye Het, Zabad nwa Ahlai;

42 Adina nwa Shiza onye Reuben, onye-isi ndi Reuben, orú ndikom na iri so-kwa-ra ya;

43 Henan nwa Meaka, na Joshafat onye-Mitnait;

44 Uzia onye Ashterot, Shama na Jeiel, bú umu Hotam onye Aroea;

45 Jediael nwa Shimri, na Joha nwa-nne-ya, onye-Tizait;

46 Eliel onye-Mahavait, na Jeribai, na Joshavia, umu Elnaam, na Itma onye Moab;

47 Eliel, na Obed, na Jaasiel onye-Mezobait.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 12

1 Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n’ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n’etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n’agha ahu.

2 Ha nāchi uta, nēme aka-nri nēme kwa aka-ekpe n’itu nkume na n’iwere uta b͕a àkú; ha sitere n’umu-nne Sọl site na Benjamin.

3 Onye-isi bu Ahieza, na Joash, bú umu Shemaa onye Gibea; na Jeziel, na Pelet, bú umu Azmavet; na Beraka, na Jihu onye Anatot;

4 na Ishmaia onye Gibeon, bú dike n’etiti orú ndikom na iri ahu, na onye-isi orú na iri ahu; na Jeremaia, na Jahaziel, na Johanan, na Jozabad onye Gedira;

5 Eluzai, na Jerimot, na Bealia, na Shemaraia, na Shefataia onye-Harufait;

6 Elkena, na Ishia, na Azarel, na Joeza, na Jashọbeam, bú ndi Kora;

7 na Joela, na Zebadaia, bú umu Jeroham nke Gedoa.

8 Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n’ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n’usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n’elu ugwu;

9 Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ;

10 Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise;

11 Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa;

12 Johanan, bú nke-asatọ, Elzabad, bú nke-iteghete;

13 Jeremaia, bú nke-iri, Makbanai, bú nke-iri-na-otù.

14 Ndia, ndi sitere n’umu Gad, bu ndi-isi usu-ndi-agha: onye kachasi ntà ra ka ọgu ndikom ise, onye kachasi uku ra kwa ka nnù ndikom abua na ọgu iri.

15 Ndia bu ndikom ahu ndi gabigara Jọdan n’ọnwa mbu, mb͕e osimiri ahu nēruchi usọ-ya nile; ha we me ka ndi ndagwurugwu nile b͕alaga, ma n’Ọwuwa-anyanwu ma n’Ọdida-anyanwu.

16 Ufọdu nime umu Benjamin na Juda we biarue ebe ahu ewusiri ike biakute Devid.

17 Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n’uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n’aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n’aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n’akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba.

18 Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n’akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n’ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe.

19 Ufọdu nime Manase dinyekwara Devid, mb͕e o soro ndi Filistia bia imegide Sọl n’agha, ma ha eyeghi ha aka: n’ihi na ndi-isi ndi Filistia were idu-ọdu zilaga ya, si, Ọ gēwere isi-ayi danyere onye-nwe-ya, bú Sọl.

20 Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase.

21 Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n’ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n’usu-ndi-agha.

22 N’ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.

23 Ndia bu kwa ọnu-ọgugu ndi-isi nke ndi ejikere iso usu-ndi-agha; ha biakutere Devid nime Hebron ichighari ala-eze Sọl nye ya, dika okwu-ọnu Jehova si di.

24 Umu Juda ndi nēbu ọta na ube di nnù iri-na-asa, ndi ejikere iso usu-ndi-agha.

25 Site n’umu Simeon, ndi-dike bu dìnkpà iso usu-ndi-agha, nnù iri-na-asa na ọgu iri-na-ise.

26 Site n’umu Livai, nnù iri-na-otù na ọgu iri.

27 Jehoiada bu onye-ndú ndi Eron, nnù ndikom iteghete na ọgu ise so-kwa-ra ya;

28 na Zedok, bú nwa-okorọbia nke bu dike bu dìnkpà, na nke ulo nna-ya orú ndi-isi na abua.

29 Site kwa n’umu Benjamin, bú umu-nne Sọl, nnù asa na ọgu iri: n’ihi na rue mb͕e ahu ndi ka n’ọnu-ọgugu nime ha nēdebe ihe-ndebe ulo Sọl.

30 Site kwa n’umu Efraim, orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-abua, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha n’ulo nke ndi bu nna-ha.

31 Site kwa na nkera ebo Manase, orú nnù uzọ abua na nnù ise, ndi akpọrọ n’aha n’aha, ibia ime Devid eze.

32 Site kwa n’umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di.

33 Site na Zebulun, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēdo agha n’usoro, ndi chiri ihe-agha nile, orú nnù uzọ isi na nnù ise; ndi nēdo onwe-ha n’usoro, nēnweghi obi abua.

34 Site kwa na Naftali, nnù ndi-isi abua na ọgu iri, orú nnù ndikom uzọ anọ na nnù iri-na-abua na ọgu iri so-kwa-ra ha nāchi uta na ube.

35 Site kwa na ndi Dan, bú ndi nēdo agha n’usoro, orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-otù na ọgu iri.

36 Site kwa n’Asha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ido agha n’usoro, orú nnù uzọ ise.

37 Site kwa n’ofè Jọdan, site n’umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, bú ndi nāchi ihe nile nke usu-ndi-agha iji bu agha, orú nnù uzọ iri-na-ise.

38 Ndia nile, bú ndikom agha, ndi nēdo agha n’usoro, were obi zuru okè biarue Hebron, ime Devid eze Israel nile: ọzọ kwa, ndi Israel nile nke fọduru nwere otù obi ime Devid eze.

39 Ha na Devid we nọ n’ebe ahu ubọchi atọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu: n’ihi na umu-nne-ha doziri ha ihe.

40 Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n’elu inyinya-ibu na n’elu camel, na n’elu inyinya mule, na n’elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n’uba: n’ihi na ọṅù di n’Israel.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 13

1 Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula.

2 Devid we si nkpọkọta nile nke Israel, Ọ buru na ọ di unu nma, ọ buru kwa na o sitere na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi zisara umu-nne-ayi ozi n’ebe nile, bú ndi fọduru n’ala nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi bi n’obodo ebe-ita-nri nile ha, ka ha we chikọta onwe-ha n’ebe ayi nọ:

3 ka ayi bughachi kwa ib͕e Chineke-ayi n’ebe ayi nọ: n’ihi na ayi achọghi ya n’ubọchi Sọl.

4 Nkpọkọta ahu nile we si na ha gēme otú a: n’ihi na okwu ahu ziri ezi n’anya ndi Israel nile.

5 Devid we kpọkọta Israel nile, site na Shaihoa nke Egypt we rue nbata Hemat, ime ka ib͕e Chineke si na Kiriat-jearim bia.

6 Devid we rigo, ya na Israel nile, rue Beala, rue Kiriat-jearim, nke Juda nwere, isi n’ebe ahu bugota ib͕e Chineke, bú Jehova, Onye nānọkwasi cherubim, nke akpọkwasiri Aha ahu.

7 Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n’ulo Abinadab: Uza na Ahio we nēdu ub͕ọ-ala ahu.

8 Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n’iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì.

9 Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Kidon, Uza we setia aka-ya ijide ib͕e ahu; n’ihi na ehi nāb͕a ukwu.

10 Iwe Jehova we di ọku megide Uza, O we tib͕ue ya, n’ihi na o setiri aka-ya metu ib͕e ahu: o we nwua n’ebe ahu n’iru Chineke.

11 Iwe Devid we di ọku, n’ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: o we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta.

12 Devid we tua egwu Chineke n’ubọchi ahu, si, M’gēsi aṅa me ka ib͕e Chineke biakutem?

13 Devid ewezugaghi kwa ib͕e ahu nye onwe-ya rue obodo Devid, ma o buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat.

14 Ib͕e Chineke we nọdu n’ezi-na-ulo Obed-edom n’ulo-ya ọnwa atọ: Jehova we gọzie ulo Obed-edom na ihe nile o nwere.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 14

1 Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà na nkume, na ndi-ọ̀kà n’osisi, iwuru Devid ulo.

2 Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, n’ihi na ebuliwo ala-eze-ya n’elu n’ihi ndi-Ya, bú Israel.

3 Devid we kuru ndinyom ọzọ nime Jerusalem: Devid we mua umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ.

4 Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon;

5 na Ibha, na Elishua, na Elpelet;

6 na Noga, na Nefeg, na Jafia;

7 na Elishama, na Beeliada, na Elifelet.

8 Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n’iru ha.

9 Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim.

10 Devid we jua Chineke ase, si, M’gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n’akam? Jehova we si ya, Rigo; M’gēnye kwa ha n’aka-gi.

11 Ha we rigorue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n’ebe ahu; Devid we si, Jehova ekwopúwo megide ndi-irom site n’akam, dika nkwopú miri. N’ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

12 Ha we rapu chi nile ha n’ebe ahu; Devid we kwue, ewe sure ha n’ọku.

13 Ndi Filistia we nọdu ọzọ na ndagwurugwu ahu.

14 Devid we jua Chineke ase ọzọ; Chineke we si ya, Arigola iso ha: si n’ebe ha nọ ga buruburu, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.

15 Ọ gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n’elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gāpu ibu agha: n’ihi na Chineke apuwo n’iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.

16 Devid we me dika Chineke nyere ya iwu: ha we tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia site na Gibeon we rue Gezea.

17 Aha Devid we pua jezue n’ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n’aru mba nile.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 15

1 Devid we mere onwe-ya ulo ufọdu n’obodo Devid; o we doziere ib͕e Chineke ọnọdu, we mara ya ulo-ikwū.

2 Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n’ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi.

3 Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya.

4 Devid we chikọta umu Eron na ndi Livai:

5 nke umu Kohat; Uriel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi:

6 nke umu Merari; Asaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri-na-otù:

7 nke umu Giashom; Joel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi na iri:

8 nke umu Elizafan; Shemaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri:

9 nke umu Hebron; Eliel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom anọ:

10 nke umu Uziel; Aminadab, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom ise na iri na abua.

11 Devid we kpọ Zedok, kpọ kwa Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, kpọ kwa ndi Livai, bú Uriel, na Asaia, na Joel, na Shemaia, na Eliel, na Aminadab,

12 si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m’doziri nye ya.

13 N’ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n’ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n’ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di.

14 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we do onwe-ha nsọ ibugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel.

15 Umu ndi Livai we were nkpa-n’aka-ya abua būru ib͕e Chineke n’ubu-ha n’elu ha, dika Moses nyere iwu, dika okwu Jehova si di.

16 Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n’elu n’ihi ọṅù.

17 Ndi Livai we guzo Himan nwa Joel; na site n’umu-nne-ya, Esaf nwa Berekaia; na site n’umu Merari, bú umu-nne-ha, Itan nwa Kushaia;

18 tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama.

19 Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha;

20 na Zekaraia, na Aziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Maaseia, na Benaia, chiri une nke dabàra n’olu umu-ab͕ọghọ;

21 na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, na Azazaia, chiri ubọ-akwara nke dabàra n’octave, ibu ndi-isi nke ndi-abù.

22 Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n’ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n’ibū ibu ahu, n’ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu.

23 Berekaia na Elkena bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.

24 Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n’iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.

25 Devid, na ndi-okenye Israel, na ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, we nēje iwere ọṅù si n’ulo Obed-edom bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova:

26 o rue, mb͕e Chineke yere ndi Livai ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova aka, na ha churu oke-ehi asa na ebulu asa n’àjà.

27 Ewere kwa uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha ke Devid ekike, ya na ndi Livai nile ndi nēbu ib͕e ahu, na ndi-ọbù-abù, na Kenania, bú onye-isi n’ibū ibu ahu tiyere ndi-ọbù-abù: ephod ákwà ọcha di kwa n’aru Devid.

28 Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, chiri kwa opì, na ájà, nēbugota ibe ọb͕ub͕a-ndu Jehova, nēwere une na ubọ-akwara me ka anu udà-ha.

29 O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova biaruru obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēgwu kwa egwú; o we leda ya anya n’obi-ya.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 16

1 Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n’etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n’iru Chineke.

2 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n’aha Jehova.

3 Ọ we kesara madu ọ bula n’Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.

4 O we tiye ufọdu nime ndi Livai n’iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:

5 ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;

6 Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n’iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.

7 Mb͕e ahu, n’ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n’aka Esaf na umu-nne-ya.

8 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;

Menu ka amara omume-Ya nile n’etiti ndi nile n’uwa.

9 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;

Tugharinu uche n’oké ọlu-Ya nile.

10 Nētonu onwe-unu n’aha nsọ Ya:

Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.

11 Nāchọnu Jehova na ike-Ya;

Chọnu iru-Ya mb͕e nile.

12 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;

Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;

13 Unu nkpuru Israel, bú orù-Ya,

Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.

14 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:

N’uwa nile ka ikpé-Ya nile di.

15 Chetanu ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi ebi,

Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n’iwu;

16 Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,

Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;

17 O we me ka o guzoro Jekob ibu ukpuru,

Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:

18 Si, Gi ka M’gēnye ala Kenean,

Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:

19 Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole;

E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;

20 Ha we nējeghari si n’otù mba jerue mba ọzọ,

Si n’otù ala-eze jerue ndi ọzọ.

21 O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;

O we bara ndi-eze nba n’ihi ha;

22 Si, Unu emetula ndim etere manu aka,

Unu emejo-kwa-la ndi-amumam.

23 Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile;

Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n’otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

24 Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n’etiti mba nile,

Akukọ oké ọlu-Ya nile n’etiti ndi nile di iche iche.

25 N’ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:

Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n’elu chi nile.

26 N’ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:

Ma Jehova mere elu-igwe.

27 Ebube na ima-nma di n’iru Ya:

Ike na ọṅù di n’ebe-Ya.

28 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,

Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

29 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:

Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n’iru Ya:

Kpọnu isi ala nye Jehova n’ima-nma nke idi-nsọ.

30 Ka o nēb͕u unu nb͕u site n’iru Ya, unu elu-uwa nile:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya.

31 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;

Ka ha si kwa n’etiti mba nile, Jehova bu eze.

32 Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya;

Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;

33 Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n’iru Jehova,

N’ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.

34 Kelenu Jehova; n’ihi na Ọ di nma:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

35 Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi,

Chikọta kwa ayi, naputa ayi n’aka mba nile,

Ikele aha nsọ Gi,

Na inya isi n’otuto-Gi.

36 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu,

Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.

37 O we rapu n’ebe ahu, n’iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n’iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n’ubọchi-ya si di:

38 na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama:

39 na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n’iru ebe-obibi Jehova n’ebe di elu nke di na Gibeon,

40 isurere Jehova àjà-nsure-ọku n’elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n’ututu na n’anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n’iwu Jehova, nke O nyere Israel n’iwu;

41 ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n’aha n’aha, ikele Jehova, n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;

42 ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n’ọnu-uzọ-ama.

43 Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n’ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 17

1 O rue, mb͕e Devid biri n’ulo-ya, na Devid siri Netan, bú onye-amuma, Le, mu onwem nēbi n’ulo cedar, ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nēbi n’okpuru ákwà-nkwuba.

2 Netan we si Devid, Ihe nile nke di n’obi-gi, me ya; n’ihi na Chineke nọyere gi.

3 O rue, n’abali ahu, na okwu Chineke ruru Netan nti, si,

4 Je, si Devid, bú orùm, Otú a ka Jehova siri, Gi onwe-gi agaghi-ewurum ulo ibu ebe M’gēbi:

5 n’ihi na ebighm n’ulo site n’ubọchi M’mere ka Israel rigota, rue ta; kama esim n’otù ulo-ikwū ba n’ulo-ikwū ọzọ, si kwa n’otù ebe-obibi ba n’ebe-obibi ọzọ.

6 N’ebe nile nke M’nējeghari n’etiti Israel nile, ọ̀ di okwu M’gwara otù nime ndi-ikpe Israel, nke M’nyere iwu izù ndim, si, N’ìhi gini ka unu nēwurughm ulo cedar?

7 Ma ub͕u a otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n’ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n’ebe i nēso ìgwè ewu na aturu, kuru gi, ka i buru onye-ndú ndim, bú Israel:

8 M’we nọyere gi n’ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n’iru gi; M’gēme-kwa-ra gi aha, dika aha ndi uku ndi nọ n’uwa.

9 M’gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otù ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n’ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eme kwa ha ọzọ ka ha nāka nká ngwa ngwa, dika na mbu,

10 na dika site n’ubọchi mb͕e M’nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel: emewokwam ka ndi-iro-gi nile ruru ala. Anamegosi kwa gi na Jehova gēwuru gi ulo.

11 Ọ gēru kwa, mb͕e ubọchi-gi zuru ijeso nna-gi-hà, na M’gēme ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, onye gēsite n’umu-gi ndikom; M’gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.

12 Onye ahu gēwurum ulo, M’gēme kwa ka oche-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.

13 Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa: M’gaghi-ewezuga kwa eberem n’ebe ọ nọ, dika M’wezugara ya n’ebe ọ nọ, bú onye buru gi uzọ:

14 ma M’gēme ka o nēguzo n’ulom na n’ala-ezem rue mb͕e ebighi-ebi: agēme kwa ka oche-eze-ya buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.

15 Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.

16 Devid, bú eze, we ba, nọdu ala n’iru Jehova; ọ si, Ònye ka m’bu, Jehova, bú Chineke, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m’biarue na mb͕e a?

17 Ma nka bu ihe ntà n’anya-gi, Chineke; I we kwue okwu bayere ulo orù-Gi rue mb͕e di anya, I huwokwam dika ọnọdu nke madu nọ n’elu si di, Jehova, bú Chineke.

18 Gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ bayere nsọpuru orù-Gi? n’ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi.

19 Jehova, n’ihi orù-Gi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka amara ihe uku ndia nile.

20 Jehova, ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.

21 Ma òle mba di ka ndi-Gi, bú Israel, nke bu otù mba nke nēguzo iche n’uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ibu otù ndi, imere Onwe-gi aha site n’ihe-idi-uku na ihe di egwu, ichupu mba di iche iche n’iru ndi-Gi, ndi I siri n’Ijipt b͕aputa?

22 I we doro Onwe-gi ndi-Gi, bú Israel, ibu otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke.

23 Ma ub͕u a, Jehova, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, ka eme ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.

24 Ka eme kwa ka ọ buru ihe kwesiri ntukwasi-obi, ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, bu Chineke Israel nwere: agēme kwa ka ulo Devid, bú orù-Gi, guzosie ike n’iru Gi.

25 N’ihi na Gi onwe-gi, Chinekem, ekpughewo nti orù-Gi, si na I gēwuru ya ulo: n’ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpe ekpere n’iru Gi.

26 Ma ub͕u a, Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a:

27 ma ub͕u a I kwerewo igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n’iru Gi: n’ihi na Gi onwe-gi, Jehova, agọziwo, o we buru ihe agọziri agọzi rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 18

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala, o we nara n’aka ndi Filistia Gat na umu-obodo-ya.

2 O tib͕u-kwa-ra Moab; Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma.

3 Devid tib͕u-kwa-ra Hedareza, bú eze Zoba, rue Hemat, mb͕e o nēje ime ka ike-ya guzo n’akuku osimiri Yufretis.

4 Devid we napu n’aka-ya nnù ub͕ọ-ala abua na ọgu iri, na nnù ndi-inyinya iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n’etiti ha.

5 Siria Damaskọs we bia iyere Hedareza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n’etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.

6 Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs; Siria we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

7 Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedareza, chita ha na Jerusalem.

8 Devid we si na Tibhat, si kwa na Kun, bú obodo Hedareza, chiri ọtutu ọla nke-uku, nke Solomon ji me oké osimiri ọla ahu, na ogidi nile, na ihe ọla nile.

9 Tou, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedareza, bú eze Zoba;

10 o we zìe Hadoram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n’ihi na o busoworo Hedareza agha, we tib͕ue ya; n’ihi na nwoke nke nēbuso Tou agha nke-uku ka Hedareza bu; ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha na nke ọla di kwa n’aka Hadoram.

11 Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n’Edom, site kwa na Moab, site kwa n’umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n’Amalek.

12 Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.

13 O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n’Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

14 Devid we buru eze Israel nile; o we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere m’ikpe na ezi omume.

15 Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta.

16 Zedok nwa Ahaitub, na Abimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Shavsha bu ode-akwukwọ;

17 Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n’aka eze.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 19

1 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na Nehash, bú eze umu Amon, nwuru, nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

2 Devid we si, M’gēmere Hanun nwa Nehash ebere, n’ihi na nna-ya merem ebere. Devid we ziga ndi-ozi ikasi ya obi bayere nna-ya. Ndi-orù Devid we ba n’ala umu Amon jekuru Hanun, ikasi ya obi.

3 Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n’anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi?

4 Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n’etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.

5 Ewe je gosi Devid ihe bayere ndikom ahu. O we ziga izute ha; n’ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6 Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.

7 Ha we gotara onwe-ha orú nnù ub͕ọ-ala uzọ anọ, na eze Meaka na ndi-ya; ha we bia ma ulo-ikwū-ha n’iru Medeba. Umu Amon si-kwa-ra n’obodo nile ha chikọta onwe-ha, bia ibu agha.

8 Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

9 Umu Amon we puta, do agha n’usoro n’ọnu-uzọ obodo: ma ndi-eze ndi biara nọrọ onwe-ha n’ọhia.

10 Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n’etiti ndi Israel nile arọputara arọputa, do ha n’usoro izute Siria.

11 O tiye ndi Israel fọduru n’aka Abishai, bú nwa-nne-ya, ha we do onwe-ha n’usoro izute umu Amon.

12 Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m’gāzọputa kwa gi.

13 Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n’ihi ndi-ayi, na n’ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n’anya-Ya.

14 Joab na ndi soro ya we biarue nso n’iru ndi Siria ibu agha; ha we b͕alaga n’iru ya.

15 Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n’iru Abishai nwa-nne-ya, ba n’obodo. Joab we biarue Jerusalem.

16 Siria we hu na etib͕uru ha n’iru Israel, ha we ziga ndi-ozi, me ka Siria ndi nọ n’ofè Osimiri puta, Shofak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n’iru ha.

17 Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biakute ha, do agha n’usoro megide ha. Devid we do ndi-ya n’usoro izute Siria, ha we buso ya agha.

18 Siria we b͕alaga n’iru Israel; Devid we b͕ue n’etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ ise, bú ndi ji ukwu eje, o me-kwa-ra ka Shofak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, nwua.

19 Ndi-orù Hedareza we hu na etib͕uru ha n’iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Devid di n’udo, we fè ya òfùfè: Siria ekweghi kwa izọputa umu Amon ọzọ.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 20

1 O rue, na mb͕e ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Joab dupuru ndi-dìnkpà nke usu-ndi-agha, bibie ala umu Amon, bia, nọchigide Raba n’agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem. Joab we tib͕ue Raba, kwada kwa ya.

2 Devid we kpupu okpu-eze nke eze-ha n’isi-ya, we hu na o ruru otù talent ọla-edo n’ọtùtù, nkume di okè ọnu-ahia di kwa nime ya; o we di n’isi Devid: o weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku.

3 O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o do ha n’okpuru mma-nkwọ, na n’okpuru ígwè nēbì ihe, na n’okpuru anyu-ike. Otù a ka Devid nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.

4 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha biliri na Gezea nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Sipai, nke sitere n’umu Rafa: ewe me ka ha ruru ala.

5 Agha we di ọzọ ebusoro ndi Filistia; Elhanam nwa Jaia we tib͕ue Lahmi, bú nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.

6 Agha we di ọzọ na Gat, ma otù nwoke toro ogologo nọ n’ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ha nile di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.

7 Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimea, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.

8 Ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n’aka Devid, na site n’aka ndi-orù-ya.