Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 1

1 Adam, Set, Enosh;

2 Kenan, Mahalalel, Jered;

3 Inok, Metusela, Lemek;

4 Noa, Shem, Ham, na Jefet.

5 Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras.

6 Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Difat, na Togama.

7 Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Rodanim.

8 Umu-ndikom Ham; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean.

9 Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka. Umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.

10 Kush muru Nimrod: onye ahu malitere ibu dike n’uwa.

11 Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim,

12 na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim.

13 Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het;

14 na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;

15 na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin;

16 na ndi Avad, na ndi Zema, na ndi Hemat.

17 Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram, na Uz, na Hul, na Geta, na Meshek.

18 Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.

19 Amuru umu-ndikom abua nye Iba; aha otù nime ha bu Peleg; n’ihi na ọ bu n’ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.

20 Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;

21 na Hadoram, na Uzal, na Dikla;

22 na Ibal, na Abimael, na Sheba;

23 na Ofia, na Havila, na Jobab. Ndia nile bu umu-ndikom Jọktan.

24 Shem, Apakshad, Shela;

25 Iba, Peleg, Reu;

26 Serug, Nehoa, Tira;

27 Abram, (nke ahu bu Abraham).

28 Umu-ndikom Abraham; Aisak, na Ishmael.

29 Ndia bu osuso-ọmumu nile ha: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam,

30 na Mishma, na Duma, na Masa; na Hedad, na Tima,

31 na Jetua, na Nafish, na Kidema. Ndia bu umu-ndikom Ishmael.

32 Umu-ndikom Ketura kwa, bú nwayi-iko Abraham: ọ muru Zimran, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua. Umu-ndikom Jọkshan kwa; Sheba, na Dedan.

33 Umu-ndikom Midian; Ifa, na Ifea, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura.

34 Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel.

35 Umu-ndikom Isọ; Elifaz, na Reuel, na Jeush, na Jalam, na Kora.

36 Umu-ndikom Elifaz; Timan, na Oma, na Zefi, na Gatam, na Kenaz, na Timna, na Amalek.

37 Umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza.

38 Umu-ndikom Sia kwa; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana, na Dishon, na Iza, na Dishan.

39 Umu-ndikom Lotan kwa; Hori, na Homam: nwa-nne-nwayi Lotan bu kwa Timna.

40 Umu-ndikom Shobal; Alian, na Manahat, na Ibal, na Shefi, na Onam. Umu-ndikom Zibeon kwa; Aja, na Ana.

41 Umu-ndikom Ana; Dishon. Umu-ndikom Dishon kwa; Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran.

42 Umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Jaakan. Umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran.

43 Ndia bu eze ndi bu eze n’ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel: Bela nwa Beoa; aha obodo-ya bu Dinhaba.

44 Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bọzra, we buru eze n’ọnọdu ya.

45 Jobab we nwua, Husham, nke sitere n’ala ndi Timan, we buru eze n’ọnọdu ya.

46 Husham we nwua, Hedad nwa Badad, onye tib͕uru Midian n’ọhia Moab, we buru eze n’ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Avit.

47 Hedad we nwua, Samla, nke sitere na Masrika, we buru eze n’ọnọdu ya.

48 Samla we nwua, Shaul, nke sitere na Rehobot n’usọ Osimiri, we buru eze n’ọnọdu ya.

49 Shaul we nwua, Beal-hanan nwa Akboa we buru eze n’ọnọdu ya.

50 Beal-hanan we nwua, Hedad we buru eze n’ọnọdu-ya; aha obodo-ya bu Pai: aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahab.

51 Hedad we nwua. Ndi-isi Edom bu kwa; Timna onye-isi, Alia onye-isi, Jetet onye-isi;

52 Ọhọlibama onye-isi, Ila onye-isi, Pinon onye-isi;

53 Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi;

54 Magdiel onye-isi, Iram onye-isi. Ndia bu ndi-isi Edom.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 2

1 Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun;

2 Dan, Josef na Benjamin, Naftali, Gad na Asha.

3 Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n’anya Jehova; O we me ka ọ nwua.

4 Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise.

5 Umu-ndikom Perez; Hezron na Hamul.

6 Umu-ndikom Zera kwa; Zimri, na Itan, na Himan, na Kalkol, na Dara: ha nile di ise.

7 Umu-ndikom Kami kwa; Eka, bú onye nēmekpa Israel aru, onye mekpuru ihe-nmekpu n’ihe ewezugara nye Jehova.

8 Umu-ndikom Itan kwa; Azaraia.

9 Umu-ndikom Hezron kwa, ndi amuru nye ya; Jerahmeel, na Ram, na Kelubai.

10 Ram we mua Aminadab; Aminadab mua Nahshon, bú onye-isi umu Juda:

11 Nahshon mua Salma, Salma mua Boaz;

12 Boaz mua Obed, Obed mua Jesi;

13 Jesi mua ọkpara-ya, bú Elaiab, na Abinadab, bú nke-abua, na Shimea, bú nke-atọ;

14 na Netanel, bú nke-anọ, na Radai, bú nke-ise;

15 na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa:

16 Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ.

17 Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael.

18 Keleb nwa Hezron muru umu site n’Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon.

19 Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua.

20 Hua mua Uri, Uri mua Bezalel.

21 Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub.

22 Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n’ala Gilead.

23 Geshua na Eram we nara ha Havot-jaia, ha na Kenat, na umu-obodo-ya, bú ọgu obodo atọ. Ndia nile bu umu-ndikom Makia nna Gilead.

24 Ma mb͕e Hezron nwusiri nime Keleb-efrata, mb͕e ahu nwunye Hezron, bú Abia, we muara ya Ashua nna Tekoa.

25 Umu-ndikom Jerahmeel ọkpara Hezron bu kwa: Ram, bú ọkpara, na Buna, na Oren, na Ozem, na Ahaija.

26 Ma Jerahmeel nwere nwunye ọzọ, aha-ya bu Atara; nwayi ahu bu nne Onam.

27 Umu-ndikom Ram, bú ọkpara Jerahmeel, bu Maaz, na Jamin, na Eka.

28 Umu-ndikom Onam bu Shamai, na Jada: umu-ndikom Shamai kwa; Nedab, na Abishua.

29 Aha nwunye Abishua bu Abihail; o we muara ya Ahban, na Molid.

30 Umu-ndikom Nedab kwa; Seled, na Apaim: Seled we nwua nēnweghi umu-ndikom.

31 Umu-ndikom Apaim kwa; Ishi. Umu-ndikom Ishi kwa; Sheshan. Umu-ndikom Sheshan kwa; Ahlai.

32 Umu-ndikom Jada kwa, bú nwa-nne Shamai; Jeta, na Jonatan: Jeta we nwua nēnweghi umu-ndikom.

33 Umu-ndikom Jonatan kwa; Pelet, na Zaza. Ndia bu umu-ndikom Jerahmeel.

34 Ma Sheshan enweghi umu-ndikom, nání umu-ndinyom ka o nwere. Sheshan nwe-kwa-ra orù, bú onye Ijipt, aha-ya bu Jaha.

35 Sheshan we were nwa-ya nwayi nye Jaha, bú orù-ya, na nwunye; o we muara ya Atai.

36 Atai mua Netan, Netan mua Zabad;

37 Zabad mua Eflal, Eflal mua Obed;

38 Obed mua Jihu, Jihu mua Azaraia;

39 Azaraia mua Helez, Helez mua Eleasa;

40 Eleasa mua Sismai, Sismai mua Shalum;

41 Shalum mua Jekamaia, Jekamaia mua Elishama.

42 Umu-ndikom Keleb kwa, bú nwa-nne Jerahmeel; Misha, bú ọkpara-ya, onye ahu bu nna Zif; na umu-ndikom Marisha, bú nna Hebron.

43 Umu-ndikom Hebron kwa; Kora, na Tapua, na Rekem, na Shema.

44 Shema we mua Raham, bú nna Jọkeam; Rekem mu-kwa-ra Shamai.

45 Nwa-nwoke Shamai bu Maon; Maon bu nna Bet-zua.

46 Ifa, bú iko-nwayi Keleb, muru Haran, na Moza, na Gazez: Haran we mua Gazez.

47 Umu-ndikom Jahdai kwa; Regem, na Jotam, na Gishan, na Pelet, na Ifa, na Shaaf.

48 Iko-nwayi Keleb, bú Meaka, muru Sheba na Tiahana.

49 Ọ mu-kwa-ra Shaaf nna Madmana, na Sheva nna Makbina, na nna Gibea; nwa-nwayi Keleb bu Aksa.

50 Ndia bu umu-ndikom Keleb; nwa-nwoke Hua, ọkpara Efrata, Shobal nna Kiriat-jearim;

51 Salma nna Bet-lehem, Harif nna Bet-gadea.

52 Shobal nna Kiriat-jearim nwe-kwa-ra umu-ndikom; Haroe, nkera Menuhot.

53 Ab͕uru nile nke Kiriat-jearim kwa; ndi-Jeta, na ndi-Putait, na ndi-Shumatait, na ndi-Mishraait; nime ndia ka ndi Zọra na ndi Eshtaol si puta.

54 Umu-ndikom Salma; Bet-lehem, na ndi Netofa, Atrot-bet-Joab, na nkera ndi Mahanat, ndi Zọra.

55 Ab͕uru nile kwa nke ndi-ode-akwukwọ ndi bi na Jebez; ndi-Tiratait, ndi-Shimeatait, ndi-Sukatait. Ndia bu ndi-Kinait, ndi nēsite na Hamat, bú nna ulo Rikab.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 3

1 Ma ndia bu umu-ndikom Devid, ndi amuru nye ya nime Hebron: ọkpara-ya, bú Amnon, nwa Ahinoam nwayi Jezreel; nke-abua, Daniel, nwa Abigail nwayi Kamel;

2 nke-atọ, Absalom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; nke-anọ, Adonaija nwa Hagit;

3 nke-ise, Shefataia nwa Abital; nke-isi, Itream nwa Egla, bú nwunye-ya.

4 Umu isi ka amuru nye ya nime Hebron; o we buru eze n’ebe ahu arọ asa na ọnwa isi: orú arọ na iri na atọ ka ọ bu eze na Jerusalem.

5 Ma ndia ka amuru nye ya nime Jerusalem: Shimea, na Shobab, na Netan, na Solomon, anọ, bú nke Bat-shua nwa-nwayi Amiel:

6 na Ibha, na Elishama, na Elifelet;

7 na Noga, na Nefeg, na Jafia;

8 na Elishama, na Eliada, na Elifelet, iteghete.

9 Ndia nile bu umu-ndikom Devid, nāgughi umu-ndikom ndi-iko-ya ndinyom; Tema bu nwa-nne-ha nwayi.

10 Nwa Solomon bu Rehoboam, Abaija nwa-ya, Esa nwa-ya, Jehoshafat nwa-ya;

11 Joram nwa-ya, Ehazaia nwa-ya, Joash nwa-ya;

12 Amazaia nwa-ya, Azaraia nwa-ya, Jotam nwa-ya;

13 Ehaz nwa-ya, Hezekaia nwa-ya, Manase nwa-ya;

14 Emon nwa-ya, Josaia nwa-ya.

15 Umu-ndikom Josaia kwa; ọkpara-ya Johanan, nke-abua Jehoiakim, nke-atọ Zedekaia, nke-anọ Shalum.

16 Umu-ndikom Jehoiakim kwa: Jekonaia nwa-ya, Zedekaia nwa-ya.

17 Umu-ndikom Jekonaia kwa, bú onye-nkpọrọ: Shealtiel nwa-ya,

18 na Malkiram, na Pedaia, na Shenaza, na Jekamaia, na Hoshama, na Nedabaia.

19 Umu-ndikom Pedaia kwa; Zerubabel, na Shimai: umu-ndikom Zerubabel kwa; Meshulam, na Hananaia; Shelomit bu nwa-nne-ha nwayi:

20 na Hashuba, na Ohel, na Berekaia, na Hasadaia, na Jushab-hesed, ise.

21 Umu-ndikom Hananaia kwa; Pelataia, na Jeshaia: umu-ndikom Refaia, umu-ndikom Anan, umu-ndikom Obadaia, umu-ndikom Shekanaia.

22 Umu-ndikom Shekanaia kwa; Shemaia: umu-ndikom Shemaia kwa: Hatush, na Igal, na Baria, na Nearaia, na Shefat, isi.

23 Umu-ndikom Nearaia kwa; Elioenai, na Hizkia, na Azrikam, atọ.

24 Umu-ndikom Elioenai kwa; Hodavaia, na Elaiashib, na Pelaia, na Akub, na Johanan, na Delaia, na Anani, asa.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 4

1 Umu-ndikom Juda; Perez, na Hezron, na Kami, na Hua, na Shobal.

2 Reaia nwa-nwoke Shobal we mua Jahat; Jahat we mua Ahumai na Lahad. Ndia bu ab͕uru ndi Zọra.

3 Ndia bu kwa umu-ndikom nna Etam; Jezreel, na Ishma, na Idbash: aha nwa-nne-ha nwayi bu Hazelelponi:

4 na Penuel nna Gedoa, na Iza nna Husha. Ndia bu umu-ndikom Hua, bú ọkpara Efrata, nna Bet-lehem.

5 Ma Ashua nna Tekoa nwere ndinyom abua, bú Hela na Naara.

6 Naara we muara ya Ahuzam, na Hifa, na Timeni, na Haahashtari. Ndia bu umu-ndikom Naara.

7 Umu-ndikom Hela bu kwa Zeret, na Zoha, na Etnan.

8 Koz we mua Anub, na Zobiba, na ab͕uru nile nke Ahahel nwa Harum.

9 Ma asọpuru Jebez kari umu-nne-ya ndikom: ma nne-ya kpọrọ aha-ya Jebez, si, N’ihi na amurum ya n’ihe-nb͕u.

10 Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n’ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m’pua n’ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru.

11 Kelub nwa-nne Shua we mua Mehia, onye ahu bu nna Eshton.

12 Eshton we mua Bet-rafa, na Pasea, na Tehina, bú nna Ia-nehash. Ndia bu ndikom Rika.

13 Umu-ndikom Kenaz kwa; Ọtniel, na Seraia: umu-ndikom Ọtniel kwa; Hatat.

14 Meonotai we mua Ọfra: Seraia mu-kwa-ra Joab, bú nna Gi-harashim: n’ihi na ndi-ọ̀kà ka ha bu.

15 Umu-ndikom Keleb nwa Jefune kwa; Iru, na Ila, na Naam: umu-ndikom Ila kwa; na Kenaz.

16 Umu-ndikom Jehalelel kwa; Zif, na Zifa, na Tiria, na Asarel.

17 Umu-ndikom Ezra kwa; Jeta, na Mered, na Ifa, na Jalon: o we mua Miriam, na Shamai, na Ishba, bú nna Eshtemoa.

18 Nwunye-ya, bú Hajehudija, we mua Jered nna Gedoa, na Heba nna Soko, na Jekutiel nna Zanoa. Ndia bu kwa umu-ndikom Bitia, bú nwa-nwayi Fero, nke Mered luru na nwunye.

19 Umu-ndikom nwunye Hodia, nwa-nne-nwayi Naham, bu nna Keila onye-Gamait, na Eshtemoa onye Meakat.

20 Umu-ndikom Shimon kwa; Amnon, na Rina, na Ben-hanan, na Tilon. Umu-ndikom Ishi kwa; Zohet, na Ben-zohet.

21 Umu-ndikom Shila nwa Juda; Ia nna Lika, na Laada nna Marisha, na ab͕uru nile nke ulo ndi nākpa ezi ákwà ọcha, nke ulo Ashbia;

22 na Jokim, na ndikom Koziba, na Joash, na Saraf, bú ndi-nwe Moab, na Jashubi-lehem. Ma ihe ndia bu ihe ochie.

23 Ndi ahu bu ndi-ọkpu-ite, na ndi bi na Netaim na Gedira; ọ bu n’aka eze n’ije-ozi-ya ka ha biri n’ebe ahu.

24 Umu-ndikom Simeon; Nemuel, na Jamin, na Jarib, na Zera, na Shaul:

25 Shalum nwa-ya, Mibsam nwa-ya, Mishma nwa-ya.

26 Umu-ndikom Mishma kwa; Hamuel nwa-ya, Zakua nwa-ya, Shimai nwa-ya.

27 Shimai nwe-kwa-ra umu-ndikom iri na isi, na umu-ndinyom isi; ma umu-nne-ya ndikom enweghi ọtutu umu-ndikom, ab͕uru-ha nile abaghi kwa uba, ra ka umu Juda.

28 Ha we biri na Bia-sheba, na Molada, na Haza-shual;

29 na nime Bilha, na n’Ezem, na nime Tolad;

30 na nime Betuel, na nime Họma, na nime Ziklag;

31 na nime Bet-makabot, na nime Haza-susim, na nime Bet-biri, na nime Shaaraim. Ndia bu obodo-ha rue mb͕e Devid bu eze.

32 Obodo ntà ha bu Itam, na Ain, na Rimon, na Token, na Ashan, obodo ise:

33 na obodo ntà ha nile nke di obodo ahu buruburu, rue Beal. Ndia bu ebe-obibi-ha, ha nwe-kwa-ra akwukwọ-osuso-ọmumu-ha.

34 Na Meshobab, na Jamlek, na Josha nwa Amazaia;

35 na Joel, na Jihu nwa Joshibia, nwa Seraia, nwa Asiel;

36 na Elioenai, na Jaakoba, na Jeshohaia, na Asaia, na Adiel, na Jesimiel, na Benaia;

37 na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaia, nwa Shimri, nwa Shemaia;

38 Ndia ndi baworo n’akwukwọ n’aha bu ndi-isi n’ab͕uru-ha: ulo nke ndi bu nna-ha we basa rue ọtutu.

39 Ha we jerue nbata Gedoa, rue n’akuku ọwuwa-anyanwu ndagwurugwu, ichọ ihe iji zù ìgwè ewu na aturu-ha.

40 Ha we chọta ihe-ọzùzù mara abuba di kwa nma, ala ahu sa-kwa-ra mbara n’akuku-ya abua, nādi kwa jū, nwe kwa udo; n’ihi na ndi bi n’ebe ahu na mb͕e gara aga sitere na Ham.

41 Ndia ndi edeworo n’akwukwọ n’aha we bia n’ubọchi Hezekaia, bú eze Juda, tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū-ha, na Meunim ndi ahuru n’ebe ahu, ha we wezuga ha ka ebibie ha, rue ta, we biri n’ọnọdu ha: n’ihi na ihe eji zù ìgwè ewu na aturu-ha di n’ebe ahu.

42 Ufọdu nime ha, bú ufọdu nime umu Simeon, nnù ndikom na ọgu ise, je-kwa-ra ugwu Sia; Pelataia, na Nearaia, na Refaia, na Uziel, bú umu Ishi, bu ndi-isi-ha.

43 Ha we tib͕ue ndi fọduru n’etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n’ebe ahu, rue ta.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 5

1 Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n’ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n’ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n’akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di.

2 N’ihi na Juda di ike n’etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:)

3 umu-ndikom Reuben ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami.

4 Umu-ndikom Joel; Shemaia nwa-ya, Gog nwa-ya, Shimai nwa-ya;

5 Maika nwa-ya, Reaia nwa-ya, Beal nwa-ya;

6 Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n’ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere.

7 Na umu-nne-ya ndikom dika ab͕uru nile ha si di, mb͕e edere akwukwọ-osuso-ọmumu nke osuso-ọmumu nile ha; onye-isi, bú Jeiel, na Zekaraia,

8 na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n’Aroea, we rue Nebo na Beal-meon:

9 ma n’ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n’osimiri Yufretis: n’ihi na anu-ulo-ha bara uba n’ala Gilead.

10 Ma n’ubọchi Sọl ha busoro ndi Haga agha, ndi dara n’aka-ha: ha we biri n’ulo-ikwū-ha n’elu ala nile nke ọwuwa-anyanwu Gilead.

11 Umu Gad biri kwa na ncherita-iru ha, n’ala Beshan rue Saleka:

12 Joel, bú onye-isi, na Shafam, bú nke-abua, na Janai, na Shefat nime Beshan:

13 na umu-nne-ha ndikom nke ulo nke ndi bu nna-ha; Maikael, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Iba, asa.

14 Ndia bu umu-ndikom Abihail nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikael, nwa Jeshishai, nwa Jahdo, nwa Buz;

15 Ahi nwa Abdiel, nwa Guni, bú onye-isi ulo nke ndi bu nna-ha.

16 Ha we biri na Gilead nime Beshan, na n’ime-obodo-ya, na n’ebe-ita-nri nile nke Sheron, rue ọpupu nile ha.

17 Edere ha nile n’akwukwọ-osuso-ọmumu n’ubọchi Jotam, bú eze Juda, na n’ubọchi Jeroboam, bú eze Israel.

18 Umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, nime ndi bu dìnkpà, ndikom nēbu ọta na mma-agha, nāzọgide kwa uta ikwe ya, ndi ezíwo-kwa-ra ibu agha, di orú nnù ndikom uzọ ise na nnù iri-na-otù na ọgu iri-na-asatọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha.

19 Ha we buso ndi Haga, na Jetua, na Nafish, na Nodab, agha.

20 Ewe yere ha aka imegide ha, ewe nye ndi Haga na ndi nile ha na ha yikọrọ n’aka-ha: n’ihi na ọ bu Chineke ka ha kpọkuru n’agha ahu, O we kwe ka ha riọta ihe ha riọrọ; n’ihi na ha tukwasiri Ya obi.

21 Ha we chiri anu-ulo-ha n’agha: camel-ha orú nnù uzọ isi na nnù ise, na ìgwè ewu na aturu orú nnù orú uzọ na uzọ iri-na-otù na nnù ise, na inyinya-ibu nnù ise, na madu orú nnù uzọ iri-na-abua na nnù iri.

22 N’ihi na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u dara, n’ihi na agha ahu sitere na Chineke. Ha we biri n’ọnọdu ha rue mb͕e emere ka ha je biri n’ala ọzọ.

23 Umu nkera ebo Manase biri kwa n’ala ahu: site na Beshan rue Beal-heamon na Senia na ugwu Heamon ka ndi ahu bara uba.

24 Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú Ifa, na Ishi, na Eliel, na Azriel, na Jeremaia, na Hodavaia, na Jahdiel, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha.

25 Ha we mekpue emekpu megide Chineke nke ndi bu nna-ha, soro chi nile nke ndi ala ahu kwa iko, bú ndi Chineke kpochapuru n’iru ha.

26 Chineke Israel we kpọte mọ Pul, bú eze Asiria, na mọ Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, o we me ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, o we me ka ha biarue Hala, na Haboa, na Hara, na osimiri Gozan, rue ta.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 6

1 Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari.

2 Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.

3 Umu Amram kwa; Eron, na Moses, na Miriam. Umu-ndikom Eron kwa; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

4 Eleeza muru Finehas, Finehas muru Abishua;

5 Abishua we mua Buki, Buki mua Uzi;

6 Uzi mua Zerahia, Zerahia mua Meraiot;

7 Meraiot mua Amaraia, Amaraia mua Ahaitub;

8 Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Ahimaaz;

9 Ahimaaz mua Azaraia, Azaraia mua Johanan;

10 Johanan mua Azaraia, (ọ bu onye ahu bu onye-nchu-àjà n’ulo Solomon wuru nime Jerusalem:)

11 Azaraia mua Amaraia, Amaraia mua Ahaitub;

12 Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Shalum;

13 Shalum mua Hilkaia, Hilkaia mua Azaraia;

14 Azaraia mua Seraia, Seraia mua Jehozadak;

15 Jehozadak we je mb͕e Jehova mere ka Juda na Jerusalem je biri n’ala ọzọ n’aka Nebukadneza.

16 Umu-ndikom Livai; Giashom, na Kohat, na Merari.

17 Ma ndia bu aha umu-ndikom Giashom; Libni, na Shimai.

18 Umu-ndikom Kohat bu Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.

19 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

20 Nke Giashom; Libni nwa-ya, Jahat nwa-ya, Zima nwa-ya;

21 Joa nwa-ya, Ido nwa-ya, Zera nwa-ya, Jeaterai nwa-ya.

22 Umu-ndikom Kohat; Aminadab nwa-ya, Kora nwa-ya, Asia nwa-ya;

23 Elkena nwa-ya, Ebiasaf nwa-ya, na Asia nwa-ya;

24 Tahat nwa-ya, Uriel nwa-ya, Uzaia nwa-ya, na Shaul nwa-ya.

25 Umu-ndikom Elkena kwa; Amasai, na Ahimot.

26 Ma Elkena: umu-ndikom Elkena; Zofai nwa-ya, na Nehat nwa-ya;

27 Elaiab nwa-ya, Jeroham nwa-ya, Elkena nwa-ya.

28 Umu-ndikom Samuel kwa; ọkpara-ya, bú Joel, na nke-abua, bú Abaia.

29 Umu-ndikom Merari; Mahli, Libni nwa-ya, Shimai nwa-ya, Uza nwa-ya;

30 Shimea nwa-ya, Hagia nwa-ya, Asaia nwa-ya.

31 Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike.

32 Ha we nēje ozi n’iru ebe-obibi ulo-ikwū nzute n’abù, rue mb͕e Solomon wuru ulo Jehova nime Jerusalem: ha we guzo n’ibu ndi-isi òfùfè-ha dika ikpe ekpere ha si di.

33 Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel;

34 nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa;

35 nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasai;

36 nwa Elkena, nwa Joel, nwa Azaraia, nwa Zefanaia;

37 nwa Tahat, nwa Asia, nwa Ebiasaf, nwa Kora;

38 nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, nwa Israel.

39 Na nwa-nne-ya nwoke, bú Esaf, onye nēguzo n’aka-nri-ya, bú Esaf nwa Berekaia, nwa Shimea;

40 nwa Maikael, nwa Baaseia, nwa Malkija;

41 nwa Etni, nwa Zera, nwa Adaia;

42 nwa Itan, nwa Zima, nwa Shimai;

43 nwa Jahat, nwa Giashom, nwa Livai.

44 Umu-ndikom Merari, bú umu-nne-ha, nọ kwa n’aka-ekpe: Itan nwa Kishi, nwa Abdi, nwa Maluk;

45 nwa Hashabaia, nwa Amazaia, nwa Hilkaia;

46 nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shemea;

47 nwa Mahli, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livai.

48 Enye-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi Livai, ifè òfùfè nile nke ebe-obibi ulo Chineke.

49 Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n’elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n’iwu.

50 Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya;

51 Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya;

52 Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya;

53 Zedok nwa-ya, Ahimaaz nwa-ya.

54 Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n’ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n’ihi na ha nwere ife-nzà mbu,

55 ha we nye ha Hebron n’ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya;

56 ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile.

57 Umu Eron ka ha nye-kwa-ra obodo nb͕aba, Hebron; na Libna na ebe-ita-nri-ya nile, na Jatia, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile;

58 na Hilen na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;

59 na Ashan na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile:

60 site kwa n’ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n’ab͕uru-ha nile.

61 Enye-kwa-ra umu Kohat, bú ndi fọduru, nime ab͕uru ebo ahu, nime nkera ebo ahu, bú nkera ebo Manase, obodo iri n’ife-nzà.

62 Enye-kwa-ra umu Giashom, dika ab͕uru nile ha si di, site n’ebo Isaka, site kwa n’ebo Asha, site kwa n’ebo Naftali, site kwa n’ebo Manase nime Beshan, obodo iri na atọ.

63 Enyere umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, site n’ebo Reuben, site kwa n’ebo Gad, site kwa n’ebo Zebulun, obodo iri na abua n’ife-nzà.

64 Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.

65 Ha we nye obodo ndia, nke ha kpọrọ aha, site n’ebo umu Juda, site kwa n’ebo umu Simeon, site kwa n’ebo umu Benjamin, n’ife-nzà.

66 Ma ufọdu nime ab͕uru umu Kohat nwere obodo ókè-ala nile ha site n’ebo Efraim.

67 Ha nyere ha obodo nb͕abà, bú Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n’ugwu Efraim; Gezea kwa na ebe-ita-nri-ya nile;

68 na Jọkmeam na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile;

69 na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile:

70 site kwa na nkera ebo Manase; Anea na ebe-ita-nri-ya nile, na Bileam na ebe-ita-nri-ya nile ka enyere umu Kohat fọduru.

71 Enyere umu Giashom, site n’ab͕uru nkera ebo Manase, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, na Ashtarot na ebe-ita-nri-ya nile:

72 site kwa n’ebo Isaka; Kedesh na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;

73 na Remot na ebe-ita-nri-ya nile, na Anem na ebe-ita-nri-ya nile:

74 site kwa n’ebo Asha; Mashal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile;

75 na Hukok na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile:

76 site kwa n’ebo Naftali; Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, na Hamon na ebe-ita-nri-ya nile, na Kiriataim na ebe-ita-nri-ya nile.

77 Enyere umu Merari, bú ndi fọduru nime ndi Livai, site n’ebo Zebulun, Rimono na ebe-ita-nri-ya nile, na Teboa na ebe-ita-nri-ya nile:

78 enye-kwa-ra ha n’ofè Jọdan n’akuku Jeriko, n’akuku ọwuwa-anyanwu Jọdan, site n’ebo Reuben, Beza n’ọzara na ebe-ita-nri-ya nile, na Jahza na ebe-ita-nri-ya nile,

79 na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile:

80 site kwa n’ebo Gad; Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile,

81 na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 7

1 Ma umu-ndikom Isaka; Tola, na Pua, na Jashub, na Shimron, anọ.

2 Umu-ndikom Tola kwa; Uzi, na Refaia, na Jeriel, na Jahmai, na Ibsam, na Shemuel, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú ndi nke Tola; ha bu ndi-dike bu dìnkpà n’osuso-ọmumu nile ha: ọnu-ọgugu-ha n’ubọchi Devid di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-isi na ọgu iri.

3 Umu-ndikom Uzi kwa; Izrahia: umu-ndikom Izrahia kwa; Maikael, na Obadaia, na Joel, na Ishia, ise: ndi-isi ka ha nile bu.

4 Usu ndi nāpunara madu ihe nke usu-ndi-agha so-kwa-ra ha, n’osuso-ọmumu-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù iri: n’ihi na ha nwere ọtutu ndinyom na umu-ndikom.

5 Umu-nne-ha kwa nke ab͕uru nile nke Isaka, ndi-dike bu dìnkpà, di orú nnù uzọ iri na nnù iri-na-asa na ọgu iri, edewo ha nile n’akwukwọ-osuso-ọmumu.

6 Umu-ndikom Benjamin; Bela, na Bekea, na Jediael, atọ.

7 Umu-ndikom Bela kwa; Ezbon, na Uzi, na Uziel, na Jerimot, na Iri, ise; ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ndi-dike bu dìkpà; edewo kwa ha n’akwukwọ-osuso-ọmumu, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na orú na iri na anọ.

8 Umu-ndikom Bekea kwa; Zemira, na Joash, na Elieza, na Elioenai, na Ọmri, na Jeremot, na Abaija, na Anatot, na Alemet. Ndia nile bu umu-ndikom Bekea.

9 Edewo kwa ha n’akwukwọ-osuso-ọmumu, dika osuso-ọmumu nile ha si di, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri na ọgu iri.

10 Umu-ndikom Jediael kwa; Bilhan: umu-ndikom Bilhan kwa; Jeush, na Benjamin, na Ihud, na Keneana, na Zetan, na Tashish, na Ahishaha.

11 Ndia nile bu umu Jediael, dika ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù atọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha ibu agha.

12 Shupim kwa, na Hupim, bú umu Ia, na Hushim, bú umu Ahea.

13 Umu-ndikom Naftali; Jahaziel, na Guni, na Jiza, na Shalum, bú umu Bilha.

14 Umu-ndikom Manase; Asriel, onye nwunye-ya muru: (iko-ya nwayi, bú nwayi Eram, muru Makia nna Gilead:

15 Makia we luru nwunye n’etiti Hupim na n’etiti Shupim, aha nwa-nne-ya nwayi bu kwa Meaka;) aha nwa nke-abua bu kwa Zelọfehad: ma Zelọfehad nwere umu-ndinyom.

16 Meaka, bú nwunye Makia, we mua nwa-nwoke, o we kpọ aha-ya Peresh; aha nwa-nne-ya nwoke bu Sheresh; umu-ya ndikom bu Ulam na Rakem.

17 Umu-ndikom Ulam kwa; Bedan. Ndia bu umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase.

18 Nwa-nne-ya nwayi, bú Hamoleket, we mua Ishhod, na Abieza, na Mahla.

19 Umu-ndikom Shemida bu kwa Ahian, na Shekem, na Likhi, na Aniam.

20 Umu-ndikom Efraim kwa; Shutela, na Bered nwa-ya, na Tahat nwa-ya, na Eleada nwa-ya, na Tahat nwa-ya,

21 na Zabad nwa-ya, na Shutela nwa-ya, na Eza, na Elead, ndi ndikom Gat, ndi amuru n’ala, b͕uru, n’ihi na ha ridatara ichiri anu-ulo-ha.

22 Efraim, bú nna-ha, we rue újú ọtutu ubọchi, umu-nne-ya we bia ikasi ya obi.

23 O we bakuru nwunye-ya, o we turu ime, mua nwa-nwoke, nna-ya we kpọ aha-ya Beria, n’ihi na ulo-ya di n’ọnọdu ọjọ.

24 Nwa-ya nwayi bu Sheera, onye wuru Bet-horon di n’okpuru, na nke di n’elu, na Uzen-sheera.

25 Refa bu kwa nwa-ya, na Reshef, na Tela nwa-ya, na Tahan nwa-ya;

26 Ladan nwa-ya, Amaihud nwa-ya, Elishama nwa-ya;

27 Nun nwa-ya, Joshua nwa-ya.

28 Ihe-onwunwe nile ha na ebe-obibi nile ha bu Bet-el na umu-obodo-ya, na n’akuku ọwuwa-anyanwu Naaran, na n’akuku Ọdida-anyanwu Gezea na umu-obodo-ya; na Shekem na umu-obodo-ya, rue Aza na umu-obodo-ya:

29 na n’akuku umu Manase, Bet-shean na umu-obodo-ya, Teanak na umu-obodo-ya, na Megido na umu-obodo-ya, na Doa na umu-obodo-ya. Nime ndia ka umu Josef nwa Israel biri.

30 Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi.

31 Umu-ndikom Beria kwa; Heba, na Malkiel, onye ahu bu nna Biazait.

32 Heba we mua Jaflet, na Shoma, na Hotam, na Shua nwa-nne-ha nwayi.

33 Umu-ndikom Jaflet kwa; Pasak, na Bimhal, na Ashvat. Ndia bu umu Jaflet.

34 Umu-ndikom Shema kwa; Ahi, na Rohga, na Jehuba, na Eram.

35 Umu-ndikom Helem nwa-nne-ya kwa; Zofa, na Imna, na Shelesh, na Amal.

36 Umu-ndikom Zofa; Sua, na Hanefa, na Shual, na Beri, na Imra;

37 Beza, na Hod, na Shama, na Shilsha, na Itran, na Beera.

38 Umu-ndikom Jeta kwa; Jefune, na Pispa, na Ara.

39 Umu-ndikom Ula kwa; Ara, na Haniel, na Rizia.

40 Ndia nile bu umu Asha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi arọputara arọputa, ndi-dike bu dìnkpà, ha bu ndi-isi nke ndi-isi. Edewo kwa ha n’akwukwọ-osuso-ọmumu, nime usu-ndi-agha, n’ibu-agha, ọnu-ọgugu-ha bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ise.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 8

1 Benjamin we mua Bela, bú ọkpara-ya, na Ashbel, bú nke-abua, na Ahara, bú nke-atọ;

2 na Noha, bú nke-anọ, na Rafa, bú nke-ise.

3 Bela we nwe umu-ndikom; Ada, na Gira, na Abaihud;

4 na Abishua, na Neaman, na Ahoa;

5 na Gira, na Shefufan, na Huram.

6 Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat:

7 na Neaman, na Ahaija, na Gira, onye ahu mere ka ha je biri n’ala ọzọ; ọ mua Uza na Ahaihud.

8 Shaharaim we mua umu n’ọhia Moab, mb͕e o zilagasiri ha; Hushim na Baara bu ndinyom-ya.

9 O we site na Hodesh, bú nwunye-ya, mua Jobab, na Zibia, na Misha, na Malkam;

10 na Jeuz, na Shakia, na Miama. Ndia bu umu-ya ndikom, ha bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna.

11 O site-kwa-ra na Hushim mua Abaitub na Elpaal.

12 Umu-ndikom Elpaal; Iba, na Misham, na Shemed; onye ahu wuru Ono na Lod, na umu-obodo-ya:

13 na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n’Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga;

14 na Ahio, na Shashak, na Jeremot;

15 na Zebadaia, na Arad, na Eda;

16 na Maikael, na Ishpa, na Joha, bú umu-ndikom Beria;

17 na Zebadaia, na Meshulam, na Hizki, na Heba;

18 na Ishmerai, na Izlia, na Jobab, bú umu-ndikom Elpaal;

19 na Jakim, na Zikri, na Zabdi;

20 na Elienai, na Ziletai, na Eliel;

21 na Adaia, na Beraia, na Shimrat, bú umu-ndikom Shimai;

22 na Ishpan, na Iba, na Eliel;

23 na Abdon, na Zikri, na Henan;

24 na Hananaia, na Ilam, na Antot a;

25 na Ifdeia, na Penuel, bú umu-ndikom Shashak;

26 na Shamsherai, na Sheharia, na Atalaia;

27 na Jaareshia, na Elaija, na Zikri, bú umu-ndikom Jeroham.

28 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna n’osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi. Ndia biri na Jerusalem.

29 Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka:

30 nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nedab;

31 na Gedoa, na Ahio, na Zeka.

32 Miklot we mua Shimea. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.

33 Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.

34 Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.

35 Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tarea, na Ehaz.

36 Ehaz we mua Jehoada; Jehoada we mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza:

37 Moza mua Binea; Rafa bu nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:

38 Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan. Ndia nile bu umu-ndikom Azel.

39 Umu-ndikom Ishek nwa-nne-ya nwoke kwa; Ulam, bú ọkpara-ya, na Jeush, bú nke-abua, na Elifelet, bú nke-atọ.

40 Umu Ulam we buru ndi-dike bu dìnkpà, ndi-ọb͕a-uta, ha nwe-kwa-ra ọtutu umu-ndikom, na umu umu, ọgu asa na iri. Ndia nile sitere n’umu Benjamin.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 9

1 Ewe de Israel nile n’akwukwọ-osuso-ọmumu; ma, le, edere ha n’akwukwọ ndi-eze Israel: ma emere ka Juda je biri na Babilon n’ihi nmekpu ha mekpuru.

2 Ma ndi-obibi mbu ndi bi n’ihe-onwunwe-ha n’obodo nile ha bu, Israel, ndi-nchu-aja, ndi Livai, na Netinim.

3 Ma ufọdu nime umu Juda, na ufọdu nime umu Benjamin, na ufọdu nime umu Efraim na Manase, biri na Jerusalem;

4 Utai nwa Amihud, nwa Ọmri, nwa Imri, nwa Bani, onye sitere n’umu Perez nwa Juda.

5 Ndi sitere na ndi Shailo; Asaia, bú ọkpara, na umu-ya ndikom.

6 Ndi sitere n’umu Zera; Jeuel, na umu-nne-ha, nnù madu na ọgu iri-na-anọ na iri.

7 Ndi sitere n’umu Benjamin; Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaia, nwa Hasenua;

8 na Ibneia nwa Jeroham, na Ila nwa Uzi, nwa Mikri, na Meshulam nwa Shefataia, nwa Reuel, nwa Ibnija;

9 na umu-nne-ha, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nnù madu abua na ọgu asa na iri na isi. Ndikom ndia nile bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna diri ulo nke ndi bu nna-ha.

10 Ndi sitere na ndi-nchu-aja; Jedaia, na Jehoiarib, na Jakin;

11 na Azaraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke;

12 na Adaia nwa Jeroham, nwa Pashhua, nwa Malkija, na Maasai nwa Adiel, nwa Jahzera, nwa Meshulam, nwa Meshilemit, nwa Imea;

13 na umu-nne-ha, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha nwere, nnù madu anọ na ọgu asatọ; ndi-dike ndi bu dìnkpà ije ozi òfùfè ulo Chineke.

14 Ndi sitere na ndi Livai; Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, site n’umu Merari;

15 na Bakbaka, na Heresh, na Galal, na Matanaia nwa Maika, nwa Zikri, nwa Esaf;

16 na Obadaia nwa Shemaia, nwa Galal, nwa Jedutun, na Berekaia nwa Esa, nwa Elkena, onye bi n’obodo ntà ndi Netofa.

17 Ndi-ọnu-uzọ-ama kwa; Shalum, na Akub, na Talmon, na Ahaiman, na umu-nne-ha: Shalum bu onye-isi;

18 ma ha nọ rue ub͕u a n’ọnu-uzọ-ama eze n’akuku ọwuwa-anyanwu: ndi ahu bu ndi-ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū umu Livai nwere.

19 Ma Shalum nwa Kora, nwa Ebiasaf, nwa Kora, na umu-nne-ya, nke ulo nna-ya, bú ndi Kora, bu ndi-isi ije-ozi òfùfè ahu, ndi-nche nbata-uzọ nile nke ulo-ikwū: ndi bu nna-ha buri ndi-isi ọmuma-ulo-ikwū Jehova, ndi-nche uzọ-nbata;

20 Finehas nwa Eleeza bu kwa onye-ndú-ha na mb͕e gara aga, Jehova nọyere ya.

21 Zekaraia nwa Meshelemaia bu onye-ọnu-uzọ-ama nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

22 Ndia nile arọputara ibu ndi-ọnu-uzọ-ama nime nbata-uzọ nile di ọgu iri na iri na abua. Edere ndi ahu n’akwukwọ-osuso-ọmumu-ha n’obodo ntà ha, ndi ahu ka Devid na Samuel onye-ọhu-uzọ doro n’ọnọdu-ha, bú ọnọdu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi.

23 Ndi ahu na umu-ha bu kwa ndi-isi ọnu-uzọ-ama nile diri ulo Jehova, bú ulo nke ulo-ikwū ahu, n’ihe-ndebe.

24 N’akuku anọ ka ndi-ọnu-uzọ-ama nọ, n’Ọwuwa-anyanwu, na n’akuku Ọdida-anyanwu, na n’akuku Ugwu, na n’akuku Ndida.

25 Ma umu-nne-ha, n’obodo ntà nile ha, nwe ibata kwa-ubọchi-asa site na mb͕e rue mb͕e, inọyere ha:

26 n’ihi na n’ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka ha nọ, bú ndi-dike anọ nke ndi-ọnu-uzọ-ama, ha onwe-ha bu ndi Livai, ha bu kwa ndi-isi ime-ulo nile na ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke.

27 Buruburu ulo Chineke ka ha nānọ kwa ọnọdu-abali, n’ihi na n’isi-ha ka ndebe di, ha onwe-ha nwe-kwa-ra imeghe ya kwa-ututu.

28 Ufọdu nime ha bu kwa ndi-isi ihe òfùfè; n’ihi na n’ọnu-ọgugu ka ha nāchibata ha, n’ọnu-ọgugu kwa ka ha nāchipu ha.

29 Ufọdu nime ha kwa ka agutara ibu ndi-isi ihe, bú ibu ndi-isi ihe nile nke ebe nsọ ahu, na ibu ndi-isi utu ọka flour, na manya-vine, na manu, na frankincense, na uda di iche iche.

30 Ufọdu nime umu ndi-nchu-àjà nāsugwa kwa manu-otite nēsì ísì utọ nke uda di iche iche.

31 Matitaia kwa, otù onye nime ndi Livai, onye ahu bu ọkpara Shalum onye Kora, ọ nọ n’ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ibu onye-isi nke ihe esiri n’ite isi ihe.

32 Ufọdu nime umu ndi Kohat, bú ufọdu nime umu-nne-ha, bu ndi-isi achicha anēdo n’usoro, idozi ya kwa-ubọchi-izu-ike.

33 Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n’ime-ulo, ndi puru n’òfùfè ọzọ: n’ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n’ije-ozi ahu.

34 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai n’osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi: ndia biri na Jerusalem.

35 Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka:

36 na nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nea, na Nedab;

37 na Gedoa, na Ahio, na Zekaraia, na Miklot.

38 Miklot we mua Shimeam. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.

39 Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.

40 Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.

41 Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tahrea, na Ehaz.

42 Ehaz we mua Jara; Jara mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza;

43 Moza mua Binea; Refaia bu kwa nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:

44 Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan: ndia bu umu-ndikom Azel.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 10

1 Ma ndi Filistia busoro Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n’iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n’ugwu Gilboa.

2 Ndi Filistia we sosie ike n’azu Sọl na n’azu umu-ya ndikom; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl.

3 Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya; o we nēb͕u ya nb͕u site n’ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta.

4 Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa nma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n’ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.

5 Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, nwua.

6 Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ; ulo-ya nile nwu-kwa-ra n’otù.

7 Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.

8 O rue, n’echi-ya, mb͕e ndi Filistia biaru ibupu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl ma umu-ya ndikom ka ha tọb͕ọrọ n’ugwu Gilboa.

9 Ha we yipu ihe-agha-ya, būru isi-ya na ihe-agha-ya, ziga n’ala ndi Filistia buruburu, izisara arusi nile ha na ndi-ha ozi ahu.

10 Ha we dọba ihe-agha-ya n’ulo chi-ha, kpọgide okpokoro-isi-ya n’ulo Degon.

11 Jebesh-gilead nile we nu ihe nile ndi Filistia mere Sọl,

12 ndikom nile bu dìnkpà we bilie, būru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom, bubata ha na Jebesh, lìe ọkpukpu-ha n’okpuru osisi terebinth nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.

13 Sọl we nwua n’ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n’ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n’ihi na ọ juru ase n’aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase,

14 ma ọ jughi Jehova ase: O we me ka ọ nwua, O we chigharia ala-eze nye Devid nwa Jesi.