Categories
HOSEA

HOSEA 1

1 Okwu Jehova nke ruru Hosea nwa Beeri nti n’ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, na n’ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel.

2 Isi-nmalite nke ikwu-okwu Jehova n’ọnu Hosea. Jehova we si Hosea, Je, luru n’onwe-gi nwunye nke nākwa iko na umu amuru n’ikwa-iko: n’ihi na ala nka nākwa iko nke-uku, ghara iso Jehova.

3 O we je luru Gomea nwa-nwayi Diblaim; owe turu ime, mutara ya nwa-nwoke.

4 Jehova we si ya, Kpọ aha-ya Jezreel; n’ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, M’gēwere ọbara Jezreel leta ulo Jihu, M’gēme kwa ka ala-eze ulo Israel kwusi.

5 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na M’gāb͕aji uta Israel nime ndagwurugwu Jezreel.

6 O we turu ime ọzọ, mua nwa-nwanyi. Jehova we si Hosea, Kpọ aha-ya Lo-ruhama: n’ihi na M’gaghi-enwe kwa obi-ebere n’aru ulo Israel ọzọ, ka M’we bupuru ha nmehie-ha ma-ọli.

7 Ma n’aru ulo Juda ka M’gēnwe obi-ebere, M’gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M’gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.

8 O we me ka Lo-ruhama rapu ara, o we turu ime, mua nwa-nwoke.

9 Jehova we si, Kpọ aha-ya Lo-ami: n’ihi na unu onwe-unu abughi ndim, Mu onwem agaghi-abu-kwa-ra unu Chineke.

10 Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n’ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n’ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu.

11 Agāchikọta kwa umu Juda na umu Israel, ha gēdo-kwa-ra onwe-ha otù onye-isi, si n’ala-ha rigopu, n’ihi na ihe uku ka ubọchi Jezreel bu.

Categories
HOSEA

HOSEA 2

1 Sinu umu-nne-unu ndikom, Ami; si-kwa-nu umu-nne-unu ndinyom, Ruhama.

2 Unu na nne-unu kpe ikpe, kpenu; n’ihi na ya onwe-ya abughi nwunyem, Mu onwem abughi kwa di-ya: ya wezuga ikwa-iko-ya nile n’iru ya, ya wezuga kwa ikwa-iko nile nke nwanyi nwere di ọ nākwa n’etiti ara-ya abua;

3 ka M’we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n’ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;

4 ọ bu kwa n’aru umu-ya ndikom ka M’nāgaghi-enwe obi-ebere; n’ihi na umu-ndikom amuru n’ikwa-iko ka ha bu.

5 N’ihi na nne-ha akwawo iko: nwanyi nke turu ime ha emewo ihe-ihere: n’ihi na ọ siri, Ka m’jeso ndi nāhum n’anya, ndi nēnyem nrim na mirim na aji-anum na flax nkem na manum na ihe-ọṅuṅum.

6 N’ihi nka, le, M’gaje iji ogwu b͕achi uzọ-gi, M’gāb͕achibido kwa ya ogige, o we ghara ichọputa okporo-uzọ-ya nile.

7 Ọ gāb͕aso kwa ndi nāhu ya n’anya, ma ọ gaghi-eru ha aru; ọ gāchọ kwa ha, ma ọ gaghi-achọta ha: o we si, Ka m’je laghachikuru dim mbu; n’ihi na ọ dim nma mb͕e ahu kari ub͕u a.

8 Ma ya onwe-ya amaghi na ọ bu Mu onwem nyere ya ọka-ya na manya-vine ọhu ya, na manu ọhu ya, me ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba, bú nke ha ji mere Beal ihe.

9 N’ihi nka ka M’gānaghachi ọkam na mb͕e-ya, na manya-vine ọhum na mb͕e-ya akara àkà, M’gānaputa kwa aji-anum na flax nkem nke enyere ikpuchi ọtọ-ya.

10 Ma ub͕u a ka M’gēkpughe ọtọ-ya n’anya ndi nāhu ya n’anya, ọ dighi kwa onye ọ bula gānaputa ya n’akam.

11 M’gēme kwa ka obi-utọ ya nile kwusi, ya na ememe-ya, na ọnwa ọhu ya, na ubọchi-izu-ike-ya, na mb͕e-ya nile akara àkà.

12 M’gēme kwa ka osisi vine ya na osisi fig ya tọb͕ọrọ n’efu, nke ọ siworo, Onyinye ka ndia burum, nke ndi nāhum n’anya nyeworom: M’gēme kwa ha ka ha ghọ oké ọhia, anu ọhia ewe rie ha.

13 M’gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n’anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 N’ihi nka, le, Mu onwem gaje iràra ya, me ka ọ je n’ọzara, M’gāgwa kwa ya okwu nke gābà ya n’obi.

15 M’gēsi kwa n’ebe ahu nye ya ubi-vine-ya nile, na ndagwurugwu Ekoa ibu ọnu-uzọ olile-anya: ọ gāza kwa n’ebe ahu, dika n’ubọchi nile ọ di na nwata, na dika n’ubọchi o siri n’ala Ijipt rigoputa.

16 Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na i gākpọm Chi; i gaghi-akpọkwam Beal ọzọ.

17 M’gēwezuga kwa aha nile nke Bealim n’ọnu-ya, agaghi-ehota kwa ha n’aha-ha ọzọ.

18 N’ubọchi ahu Mu na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe na ihe nākpu akpu nke ala gāb͕ara ha ndu: ọ bu kwa uta na mma-agha na agha ka M’gāb͕ajipu n’ala-ha, me ka ha dina ala na ntukwasi-obi.

19 M’gēkwere kwa ilu gi n’Onwem rue mb͕e ebighi-ebi; e, M’gēkwere ilu gi n’Onwem n’ezi omume, na n’ikpé, na n’ebere, na n’obi-ebere nile.

20 M’gēkwere kwa ilu gi n’Onwem n’ikwesi-ntukwasi-obi: i we mara, Jehova.

21 O gēru kwa n’ubọchi ahu na M’gāza, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gāza elu-igwe, ha onwe-ha gāza kwa ala;

22 ala gāza kwa ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya; ha onwe-ha gāza kwa Jezreel.

23 M’gāgha-kwa-ra ya Onwem n’ala-ya dika nkpuru ọghigha; M’gēnwe kwa obi-ebere n’aru Lo-ruhama; M’gāsi kwa Lo-ami, Ndim ka i bu; ndi ahu gāsi kwa, Chinekem.

Categories
HOSEA

HOSEA 3

1 Jehova we sim, Je kwa, hu nwanyi n’anya nke iko huworo ya n’anya, nke bu kwa nwanyi aluru na nwunye nākwa iko, dika Jehova si ahu umu Israel n’anya, ọ bu ezie na ha onwe-ha nēche iru na chi ọzọ di iche iche, nāhu kwa mbadamba nkpuru-vine amiri ami n’anya.

2 M’we were ego ọla-ọcha iri na ise, na otù homer ọka barley, na nkera homer ọka barley, gotara ya onwem:

3 m’we si ya, Ọtutu ubọchi ka i gānọdurum; i gaghi-akwa iko, i gaghi-abu kwa nwan yi nke nwoke ọ bula: Mu onwem gādi kwa otú a n’ebe i nọ.

4 N’ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim:

5 emesia umu Israel gālata, chọ Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha; ha gēji kwa oké egwu biakute Jehova, biaru kwa idi-nma-Ya na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.

Categories
HOSEA

HOSEA 4

1 Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n’ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n’ala nka gēkpe, n’ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n’ala nka.

2 Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu.

3 N’ihi nka ka ala nka gēru újú, onye ọ bula nke bi nime ya gāta kwa aru, ya na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe; ọ bu kwa azù nile nke oké osimiri ka agēkpochapu.

4 Ma otú ọ di, ka onye ọ bula ghara ise okwu, ka onye ọ bula ghara kwa iba nba; n’ihi na ndi-gi di ka ndi nēseso onye-nchu-àjà okwu.

5 I gāsu kwa ngọngọ n’ehihie, ọzọ, onye-amuma gēso kwa gi su ngọngọ n’abali; M’gēme kwa ka nne-gi la n’iyì.

6 Emewo ka ndim la n’iyì site n’enweghi ọmuma Chineke: n’ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M’gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M’gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.

7 Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M’gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.

8 Nmehie ndim ka ha nēri, ọ bu kwa ajọ omume-ha ka ha nēbuli, onye ọ bula nkpuru-obi-ya, nye.

9 Ọ gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà: M’gēji kwa uzọ-ya nile leta ya, ọ bukwa omume-ya nile ka M’gēnyeghachi ya.

10 Ha eriwo kwa ihe, ma afọ agaghi-eju ha; ha akwawo iko, ma ha agaghi-aba uba kari: n’ihi na ha arapuwo inu olu Jehova.

11 Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.

12 Ndim nāju ase n’aka osisi-ha, nkpa-n’aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n’ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n’okpuru Chineke-ha kwa iko.

13 N’elu ugwu nile ka ha nāchu àjà, n’elu ugwu ntà nile ka ha nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n’okpuru osisi oak na osisi poplar na osisi terebinth, n’ihi na ǹdò-ya di nma: n’ihi nka ka umu-unu ndinyom nākwa iko, ọ bu kwa n’ihi nka ka ndinyom unu luworo ọhu nākwa iko.

14 M’gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M’gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n’ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n’ala.

15 Ọ bu ezie na onye nākwa iko ka i bu, Israel, ma ka ikpe ghara ima Juda; unu abia-kwa-la na Gilgal, unu arigo-kwa-la na Bet-even, unu aṅu-kwa-la iyi, si, Jehova nādi ndu.

16 N’ihi na Israel ewezugawo onwe-ya, dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nēwezuga onwe-ya: ub͕u a ka Jehova gāzù ha dika nwa-aturu n’ebe sara mbara.

17 Onye ekekọtaworo n’arusi di iche iche ka Efraim bu; kwe ka ọ nọduru onwe-ya.

18 Iṅubiga-manya-ókè-ha ewezugawo onwe-ya: ha akwachiwo iko nti; ndi bu ọta-ha ahuwo ihere n’anya nke-uku.

19 Ifufe apiakọtawo ya na nkù-ya; ihere àjà nile ha gēme kwa ha.

Categories
HOSEA

HOSEA 5

1 Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n’ihi na unu ka ikpé a diri; n’ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n’elu Teboa.

2 Ndi-njehie abamiwo n’ib͕u madu; ma mu onwem bu onye nādọ ha nile aka na nti.

3 Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n’ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.

4 Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n’ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi.

5 Npako Israel azawo kwa oku n’iru ya: Israel na Efraim gāsu kwa ngọngọ n’ajọ omume-ha; Juda esowo kwa ha su ngọngọ.

6 Ha gāchiri ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha je ichọ Jehova; ma ha agaghi-achọta Ya: O seputawo Onwe-ya n’aru ha.

7 Jehova ka ha ghọb͕uworo; n’ihi na umu nābughi nke Ya ka ha muworo: ub͕u a ka ọnwa ọhu gēripia ha, ha na òkè nile ha.

8 Fùanu opì-ike nime Gibea, Fùanu opì nime Rema: tienu nkpu agha nime Bet-even: n’azu gi, Benjamin.

9 Efraim gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu n’ubọchi iba-nba: n’etiti ebo nile nke Israel ka M’meworo ka amara ihe kwesiri ntukwasi-obi.

10 Ndi-isi Juda adiwo ka ndi nēwezuga ókè-ala: n’aru ha ka M’gāwukwasi nrubiga-ókè nke iwem dika miri.

11 Onye anēmeb͕u emeb͕u ka Efraim bu, ọ bu onye anāzọpia n’ikpé; n’ihi na o kwere ijeso ihe enyere n’iwu.

12 Ma Mu onwem, dika nla ka M’nādiri Efraim, dika ire-ure ka M’nādiri ulo Juda.

13 Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n’aru-unu la.

14 N’ihi na Mu onwem gādiri Efraim ka ọdum, di-kwa-ra ulo Juda ka nwa-ọdum: Mu onwem, ọbuná Mu Onwem gādọka, la; M’gēbupu, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.

15 M’gāla, lata n’ọnọdum, rue mb͕e ikpe gāma ha, ha we chọ irum: n’ahuhu-ha ka ha gāchọsim ike.

Categories
HOSEA

HOSEA 6

1 Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n’ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi.

2 Ọ gēme ka ayi dighachi ndu mb͕e ubọchi abua gasiri: n’ubọchi nke-atọ ka Ọ gēme ka ayi bilie, ayi ewe di ndu n’iru Ya.

3 Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.

4 Gini ka M’gēme gi, Efraim? gini ka M’gēme gi, Juda? n’ihi na ebere-unu di ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n’isi-ututu.

5 N’ihi nka ka M’jiworo ndi-amuma b͕utue ha; ejiwom okwu nile nke ọnum b͕ue ha: ikpé-gi nile di kwa ka ìhè nke nāputa aputa.

6 N’ihi na ebere atọwom utọ, ọ bughi àjà; ọmuma Chineke atọwokwam utọ kari àjà-nsure-ọku nile.

7 Ma ndi ahu agabigawo pua n’ọb͕ub͕a-ndum, dika Adam: n’ebe ahu ka ha ghọb͕uworom.

8 Gilead bu obodo nke ndi nālu ajọ ihe, nke ewereworo ọbara zọtọsia ya.

9 Ọzọ, dika usu ndi nāpunara madu ihe nēche anwu onye ọ bula, otú a ka òtù ndi-nchu-àjà nēb͕u madu n’uzọ Shekem: e, ajọ ihe-nzube ka ha meworo.

10 N’ulo Israel ka M’huworo ihe jọb͕uru onwe-ya: n’ebe ahu ka ikwa-iko nke Efraim nākwa di, emeruwo Israel.

11 Ọzọ, gi Juda, akaworo gi owuwe-ihe-ubi àkà, mb͕e M’gēme ka ndim adọtara n’agha lata.

Categories
HOSEA

HOSEA 7

1 Mb͕e M’gāgwọ Israel, mb͕e ahu ka ekpughere ajọ omume Efraim, na ihe ọjọ nile nke Sameria; n’ihi na ha aluwo ọlu ugha: ọzọ, onye-ori nābà n’ulo, usu ndi nāpunara madu ihe amadewo kwa n’èzí.

2 Ma ha adighi-asi n’obi-ha na ọ bu ihe ọjọ nile ha ka M’chetaworo: ub͕u a ka omume nile ha b͕aworo ha buruburu; na ncherita-irum ka ha di.

3 Ha ji ihe ọjọ ha eme ka eze ṅuria, ji kwa okwu-ugha nile ha eme ka ndi-isi ṅuria.

4 Ha nile bu ndi nākwa iko; ha di ka ite-ọku uku nke osi-ite meworo ka ọ di ọku; ọ kwusiri ikpọnwu site na mb͕e edoziri utu ọka flour agwọrọ agwọ rue mb͕e emere ka o ko eko.

5 N’ubọchi eze-ayi ndi-isi jiri idi-ọku nke manya-vine ria ọria; o soro ndi nākwa emò setia aka-ya.

6 N’ihi na ha ebutewo obi-ha nso dika ite-ọku uku, mb͕e ha nēche anwu: ogologo abali nile ka osi-ite-ha nāraru ura; n’ututu ihe ahu nēre dika ọku nēnwu enwu.

7 Ha nile di ọku ka ite-ọku uku, ha ewe ripia ndi-ikpe-ha; ndi-eze nile ha adawo n’ala: ọ dighi onye nākpọkum n’etiti ha.

8 Efraim, n’etiti ndi nile di iche iche ka ya onwe-ya nāgwa onwe-ya ọgwa; Efraim aghọwo ob͕e achicha nke anātugharighi atughari.

9 Ndi ala ọzọ eripiawo ike-ya, ma ya onwe-ya amagh: e, efesawo ya isi-awọ, ma ya onwe-ya amaghi.

10 Npako Israel azawo kwa okwu n’iru ya: ma ha alaghachikuteghi Jehova, bú Chineke-ha, ha achọtaghi kwa Ya, n’ihe a nile.

11 Efraim we di ka nduru nēnweghi uche, ọ dighi obi amam-ihe o nwere: Ijipt ka ha kpọkuworo, Asiria ka ha jekuworo.

12 Mb͕e ha nēje M’gāb͕asa ub͕um n’aru ha; dika anu-ufe nke elu-igwe ka M’gēme ka ha rida: M’gādọ ha aka na nti, dika ihe nzukọ-ha nuworo.

13 Ahuhu diri ha! n’ihi na ha awafunariwom; nbibi diri ha! n’ihi na ha ejehiewo megidem: ọ bu ezie na Mu onwem nāb͕aputa ha, ma ha onwe-ha ekwuwo okwu-ugha di iche iche megidem.

14 Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n’elu ihe-ndina-ha: n’ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.

15 Ọ bu ezie na Mu onwem adọwo ha aka na nti, me ka ogwe-aka-ha di ike, ma Mu ka ha nēchè ihe ọjọ megide.

16 Ha nālaghachi, ma ọ bughi Onye nọ n’elu ka ha nālaghachikute; ha di ka uta nāghọ aghughọ: ndi-isi-ha gāda site na mma-agha, site n’oké iwe nke ire-ha: nka bu ikwa-emò-ha n’ala Ijipt.

Categories
HOSEA

HOSEA 8

1 Tiye opì-ike n’okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n’ihi na ha agabigawo pua n’ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.

2 Mu ka ha gētiku, si, Chinekem, ayi, bú Israel, mara Gi.

3 Israel ajusiwo ezi ihe: onye-iro gāchu ya.

4 Ha onwe-ha edowo ndi-eze, ma ọ bughi site n’akam; ha edowo ndi-isi, ma amaghm: ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha ka ha jiworo mere onwe-ha arusi di iche iche, ka ewe bipu ha.

5 Ọ jusiwo nwa-ehi-gi, Sameria; iwem adiwo ọku megide ha: rùe ole mb͕e ka ha nāgaghi-enwe ike ighọ ndi nēmeghi ihe ọjọ?

6 N’ihi na Israel ka ọbuná ihe a si puta; onye-ọ̀kà mere ya, ọ bughi kwa Chineke ka ọ bu: n’ihi na umu-irighiri-ihe ka nwa-ehi Sameria gāghọ.

7 N’ihi na ifufe ka ha nāgha dika nkpuru-ọghigha, ọ bu kwa oké ifufe ka ha gēwe dika ihe-ubi: ọ dighi ọka guzoro eguzo o nwere; ihe-opupú agaghi-eme utu ọka; ọ buru na o me ma eleghi anya, ndi ala ọzọ gēloda ya.

8 Elodawo Israel: ub͕u a ha aghọwo ihe dika ihe nādighi-atọ utọ n’etiti mba nile.

9 N’ihi na ha onwe-ha arigowo n’Asiria, dika inyinya-ibu-ọhia nke nání ya nọ iche: Efraim egowo ndi nāhu ya nānya.

10 E, mb͕e ha gēgo ha n’etiti mba nile, ub͕u a ka M’gāchikọta ha; ọ gēwuta kwa ha nwa mb͕e ntà site n’ibu eze ndi-isi gēbo ha.

11 N’ihi na Efraim emewo ka ebe-ichu-àjà ba uba imehie, ya bu na ebe-ichu-àjà nile aghọworo ya nmehie.

12 Anamedere ya orú nnù ihe na nnù ise nke iwum, ma dika ihe ala ọzọ ka aguworo ha.

13 Àjà nile nke onyinyem nile, ha nāchu anu nàjà, we rie ya; ihe-ha adighi-atọ Jehova utọ: ub͕u a ka Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha; ha onwe-ha gālaghachi n’Ijipt.

14 Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M’gēzite ọku n’obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.

Categories
HOSEA

HOSEA 9

1 Aṅurila, Israel, rue otite-egwú-ọṅù, dika ndi nile di iche iche; n’ihi na i puwo n’aka Chineke-gi kwaba iko, i huwo onyinye n’anya n’ebe-nzọcha-ọka nile.

2 Ebe-nzọcha-ọka na ebe-nzọcha-nkpuru-vine agaghi-azù ha, manya-vine ọhu gēbilata-kwa-ra ya.

3 Ha agaghi-ebi n’ala Jehova; ma Efraim gālaghachi n’Ijipt, ọ bu kwa n’Asiria ka ha gēri ihe ruru árú.

4 Ha agaghi-awusiri Jehova àjà manya-vine, àjà di iche iche ha agaghi-atọ kwa Ya utọ: dika nri ndi nēru újú ka nri-ha gādiri ha; ndi nile ndi nēri ya gāghọ ndi ruru árú: n’ihi na nri-ha gādiri ọchichọ nkpuru-obi-ha; ọ gaghi-abata n’ulo Jehova.

5 Gini ka unu gēme n’ubọchi nke mb͕e ákàrà, na n’ubọchi ememe Jehova?

6 N’ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n’ulo-ikwū nile ha.

7 Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n’ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n’ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.

8 Onye-nche ka Efraim bu n’aka Chinekem: ma onye-amuma, ib͕udu nke osi-ọnyà di n’uzọ-ya nile, ikpọ-asì di kwa n’ulo Chineke-ya.

9 Ha abamiwo n’ibibi onwe-ha, dika n’ubọchi nke Gibea: Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha.

10 Dika nkpuru-vine n’ọzara ka M’chọtara Israel; dika nkpuru nke buru uzọ cha n’osisi fig n’oge mbu ya ka M’huru nna-unu-hà: ma ha onwe-ha biakutere Beal-peoa, kewaputa onwe-ha nye ihere ahu, ghọ ihe-árú dika ihe ahu ha huru n’anya.

11 Efraim, dika anu-ufe ka nsọpuru-ha gēfepu: ọmumu-nwa na idi-ime na itu-ime ewe ghara idi.

12 E, ọ buru na ha azulite umu-ha, ma M’gāb͕aba ha aka nwa, madu ọ bula ewe ghara idi: e, ahuhu di-kwa-ra ha mb͕e M’gēsi n’aru ha wezuga Onwem!

13 Efraim, dika M’leworo Taia anya, bú ihe akuworo n’ebe mara nma: ma Efraim aghaghi ichiputara ob͕u-madu umu-ya.

14 Nye ha, Jehova: gini ka I gēnye? nye ha afọ nēmebi ime na ara kpọrọ nku.

15 Ihe ọjọ nile ha di nime Gilgal: n’ihi na n’ebe ahu ka M’kpọrọ ha asì: n’ihi ihe ọjọ nke omume nile ha ka M’gāchupu ha n’ulom: M’gaghi-ahu kwa ha n’anya ọzọ; ndi-isi-ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha.

16 Etib͕uwo Efraim, nkpọrọgwu-ha akpọnwuwo, ha agaghi-ami nkpuru: e, asi na ha amua nwa, ma M’gēme ka umu afọ-ha anāchọsi ike nwua.

17 Chinekem gāju ha, n’ihi na ha egeghi Ya nti: ha gābu kwa ndi nāwaghari n’etiti mba nile.

Categories
HOSEA

HOSEA 10

1 Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.

2 O kesawo obi-ha; ub͕u a ka ikpe gāma ha: Ya onwe-ya gētipia ebe-ichu-àjà nile ha, bibie ogidi nile ha.

3 N’ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n’ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi?

4 Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi.

5 Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n’ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n’ihi nsọpuru-ya, n’ihi na o siwo n’ebe ọ nọ je biri n’ala ọzọ.

6 Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n’Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.

7 Emewo ka Sameria la n’iyì, ya na eze-ya, dika irighiri-osisi n’elu miri.

8 Agēkpochapu kwa ebe nile di elu nke Even, bú nmehie Israel: ogwu na uke gēpulite n’ebe-ichu-àjà nile ha; ha gāsi kwa ugwu nile, Kpuchienu ayi; ha gāsi kwa ugwu ntà nile, Dakwasinu ayi.

9 Site n’ubọchi Gibea ka i mehieworo, gi Israel: n’ebe ahu ka ha guzoro; ka agha anēbuso umu ajọ omume we ghara irute ha nime Gibea.

10 Mb͕e M’chọrọ, M’gādọ ha aka na nti; agāchikọta kwa ndi nile di iche iche imegide ha, mb͕e agēke ha ab͕u n’ajọ omume-ha abua.

11 Efraim bu kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke emeworo ka ọ muta ihe, nke nāhu izọcha ọka n’anya; ma Mu onwem agabigawo n’elu olu-ya di nma: M’gēme ka anọkwasi Efraim dika inyinya; Juda gādọ ihe eji gwu ala-ubi, Jekob gētipiara ya ájá.

12 Gharanu onwe-unu nkpuru n’ezi omume, wenu ihe-ubi dika ebere si di; lucharanu onwe-unu ubi: n’ihi na ọ bu mb͕e ichọ Jehova, rue mb͕e Ọ gābia, zokwasi unu ezi omume dika miri.

13 Unu aluwo nmebi-iwu dika ubi, ajọ omume ka unu weworo dika ihe-ubi; unu eriwo nkpuru okwu-ugha: n’ihi na i tukwasiri uzọ-gi obi, n’iba-uba nke ndi-dike-gi.

14 Nkpọtu gēbili kwa n’etiti umu-nna-gi, ọ bu kwa ebe-gi nile ewusiri ike ka agēbibi, dika Shalman bibiri Bet-abel n’ubọchi agha: nne n’elu umu-ya ka atupiara.

15 Otú a ka Bet-el gēme unu n’ihi ihe ọjọ unu nke kachasi ihe ọjọ nile: na chi-ọbubọ ka agēme ka eze Israel lasia n’iyì.