Categories
HAGAI

HAGAI 1

1 N’arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n’ọnwa nke-isi, n’ubọchi mbu n’ọnwa, ka okwu Jehova si n’aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,

2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Ndi nka siri, Oge ibia erughi, bú oge iwu ulo Jehova.

3 Okwu Jehova we si n’aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si,

4 Ọ̀ bu oge unu nwere, unu onwe-unu, ibi n’ulo-unu amachitara osisi, mb͕e ulo a bu nkpọnkpọ ebe?

5 Ma ub͕u a, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n’uzọ nile unu.

6 Unu aghawo ọtutu nkpuru, ma nke-ntà ka unu webatara; unu nēri ihe, ma ọ dighi afọ juworo unu; unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ma ọ dighi nṅuju-afọ unu ṅujuworo; unu yiri uwe, ma ọ dighi okpom-ọku nēkpo madu; ọzọ, onye nāluta ugwọ-ọlu nāluta ugwọ-ọlu itiye n’akpa puru epu.

7 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n’uzọ nile unu.

8 Rigonu n’ugwu, bute osisi, wue ulo a, ọ gātọkwam utọ, agāsọpu-kwa-ram, ka Jehova siri.

9 Unu lere anya ihe bara uba, ma, le, ọ ghọrọ ihe ntà; mb͕e unu bulatara ya ulo, M’we fùsasia ya, N’ìhi gini? (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). N’ihi ulom, nke bu nkpọnkpọ ebe; ma unu onwe-unu nāb͕a ọsọ, onye ọ bula ọ b͕akuru ulo nke aka ya.

10 N’ihi nka ka elu-igwe nke di n’elu unu b͕ochiworo igirigi, ala eb͕ochiwo kwa ihe-omume-ya.

11 M’we kpọ oge ọkpukpọ-nku ka ọ dakwasi ala nka na ugwu-ya nile na ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya na ihe nile nke ala nēpuputa na madu na anumanu na ihe nile unu dọb͕uru onwe-unu n’ọlu inweta.

12 Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi Israel nile fọduru, we ge nti olu Jehova, bú Chineke-ha, ge kwa nti okwu nile nke Hagai, bú onye-amuma, dika Jehova, bú Chineke-ha, zitere ya; ndi Israel we tua egwu n’iru Jehova.

13 Hagai, bú onye-ozi Jehova, we gwa ndi Israel okwu n’ozi Jehova, si, Mu onwem nọyere unu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 Jehova we kpọte mọ Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, na mọ Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na mọ nke ndi Israel nile fọduru; ha we bia je ozi n’ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha,

15 n’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, n’ọnwa nke-isi, n’arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze.

Categories
HAGAI

HAGAI 2

1 N’ọnwa nke-asa, n’ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu, okwu Jehova we si n’aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si,

2 Biko, gwa Zerubabel nwa Shealtiel okwu, bú onye nāchi ala Juda, gwa kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, gwa kwa ndi Israel fọduru, si,

3 Ònye fọduru n’etiti unu nke huru ulo a n’ebube mbu ya? ọ̀ di kwa aṅa n’anya-unu onwe-unu ub͕u a? ọ̀ dighi nání ka ihe-efu n’anya-unu?

4 Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n’ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta),

5 dika okwu ahu si di nke Mu na unu b͕ara n’ọb͕ub͕a-ndu-mb͕e unu siri n’Ijipt puta, Mọm nēguzo kwa n’etiti unu: unu atula egwu.

6 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ fọduru otù ub͕ò, nwa mb͕e ntà ka ọ bu, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa na oké osimiri na ala kpọrọ nku me nkpatu;

7 M’gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M’gēmeju kwa ulo a n’ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

8 Mu nwe ọla-ọcha nile, ọ bu kwa Mu nwe ọla-edo nile; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

9 Ebube ikpe-azu nke ulo a gādi uku kari ebube mbu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: ọ bu kwa n’ebe a ka M’gēnye udo; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

10 N’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n’arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we si n’aka Hagai bú onye-amuma, bia, si

11 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Biko, jua ndi-nchu-àjà ajuju iwu, si,

12 Le, ọ buru na onye ọ bula eburu anu nsọ n’ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya, were kwa ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya metu achicha, ma-ọbu ofé, ma-ọbu manya-vine, ma-ọbu manu, ma-ọbu ihe-oriri ọ bula, ọ̀ gādi nsọ? Ndi-nchu-àjà we za, si, É-è.

13 Hagai we si, Ọ buru na onye ruru árú site na madu nwuru anwu emetu ihe ọ bula n’ihe ndia, ọ̀ gāru árú? Ndi-nchu-àjà we za, si, Ọ gāru árú.

14 Hagai we za, si, Otú a ka ndi nka di, ọ bu kwa otú a ka mba nka di n’irum; (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); ọ bu kwa otú a ka ọlu ọ bula nke aka-ha di; ọzọ, ihe ha nēweta nso n’ebe ahu, ihe ruru árú ka ọ bu.

15 Ma ub͕u a, biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a site n’ubọchi ta laghachi azu, site na mb͕e akātukwasighi nkume n’elu nkume n’ulo uku Jehova:

16 na mb͕e ahu nile, mb͕e madu biara n’obo-ihe di orú ọtùtù, ha di nání iri; mb͕e madu biara n’ebe-inara-manya-vine ikupu ọgu ite abua na iri, nání orú di.

17 Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, ji kwa ákú-miri-ígwé, tib͕ue unu n’ọlu nile nke aka-unu; ma ọ dighi nchighari unu chigharikuterem; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

18 Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n’ubọchi ta laghachi azu, site n’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n’ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya.

19 Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n’ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n’ubọchi ta ka M’ganāgọzi unu.

20 Okwu Jehova we rue Hagai nti nke ub͕ò abua n’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, si,

21 Gwa Zerubabel, bú onye nāchi ala Juda, okwu, si, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa me nkpatu:

22 M’gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M’gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M’gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya.

23 N’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M’gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n’ihi na gi ka M’rọputaworo; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.