Categories
HABAKUK

HABAKUK 1

1 Ọhu nke Habakuk, bú onye-amuma, huru.

2 Jehova, rùe ole mb͕e ka m’ganētiku Gi, ma I dighi-anu? m’nētiku Gi nkpu, si, Ihe-ike! ma I dighi-azọputa.

3 N’ìhi gini ka I nēme ka m’hu ajọ ihe? n’ìhi gini ka I nēlegide nmeb͕u? ma ipunara-madu-ihe ma ihe-ike di n’irum: ilu-ọ̀gù we di, esem-okwu nēbuli kwa onwe-ya.

4 N’ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n’ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n’ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ.

5 Hunu n’etiti mba nile, legide-kwa-nu, ka o ju kwa unu anya nke-uku nke-uku: n’ihi na ọlu ka M’nālu n’ubọchi-unu, nke unu nāgaghi-ekwe, mb͕e agākọrọ unu ya.

6 N’ihi na, le, M’gaje ime ka ndi Kaldea bilie, bú mba ahu di ilu nke nēme kwa ngwa ngwa; ndi nējeghari na mbara uwa, inweta ebe-obibi di iche iche nke nābughi nke ha.

7 Ndi anātu ujọ, ndi dikwa egwu, ka ha bu: n’aka ha onwe-ha ka ikpé-ha na nbuli-elu-ha si aputa.

8 Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n’ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe.

9 Ha nile nābia ime ihe-ike; edosiri iru-ha ike dika ifufe Iru-anyanwu; ha we chikọta ndi adọtara n’agha dika ájá.

10 E, mba ahu nākwa ndi-eze emò, ndi-isi bu-kwa-ra ya ihe-ichì-ọchì: mba ahu nāchì ebe ọ bula ewusiri ike ọchì; n’ihi na o nēkpokọba ájá, we were ya.

11 Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya.

12 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi siteworo na mb͕e ochie, Jehova, bú Chinekem, Onye Nsọm? ayi agaghi-anwu. Jehova, ọ bu ikpe ikpe ka I doworo ya; Gi Oké Nkume, ọ bu kwa iba nba ka I tọworo ya ntọ-ala.

13 Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n’ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n’ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;

14 I we me madu ka ha di ka azù nke oké osimiri, dika ihe nākpu akpu, nke nēnweghi onye nāchi ha?

15 Ha nile ka o ji nkò-azù dọkpuru, o nēkpochapu ha n’eriri-ya, chikọta ha n’ub͕u-ya: n’ihi nka ka ọ nāṅuri, tegharia egwú ọṅù.

16 N’ihi nka ka ọ nāchuru eriri-ya àjà, nēsurere ub͕u-ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; n’ihi na site na ha ka òkè-ya nwere urù, ihe-oriri-ya ma-kwa-ra abuba.

17 Ọ̀ gēwere n’ihi nka nāwupu eriri-ya, ghara inwe ọmiko n’ib͕u mba di iche iche mb͕e dum?

Categories
HABAKUK

HABAKUK 2

1 N’elu ebe m’nēche ka m’gēguzo, guzo kwa onwem n’elu ebe ewusiri ike, m’gēche kwa ihu ihe Ọ gēkwu megidem, na ihe m’gāzaghachi bayere iba-nbam.

2 Jehova we zam, si, De ọhù ahu n’elu mbadamba-ihe di iche iche, tu ya akika, ka onye nāgu ya we b͕a ọsọ.

3 N’ihi na ọhù ahu nādiru mb͕e akara àkà, ọ nēkusi-kwa-ra ọgwugwu-ya ume ike, ọ gaghi-ekwu kwa okwu-ugha: ọ buru na ọ la azu, chere ya; n’ihi na ọ ghaghi ibia, ọ gaghi-anọ ọdù.

4 Le, nkpuru-obi-ya afuliwo onwe-ya, o zighi ezi nime ya: ma onye ezi omume gēji okwukwe-ya di ndu.

5 E, ọzọ kwa, n’ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n’ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n’ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n’ebe ọ nọ.

6 Ndia, hà nile agaghi-atu ilu megide ya, na okwu miri emi, ọbuná okwu omimi di iche iche, bayere ya, si, Ahuhu diri onye ahu nke nēme ka ihe nābughi nke ya ba uba! rùe ole mb͕e? onye ji ihe-ibe ebob͕u onwe-ya!

7 Ọ̀ bughi n’otù ntabi-anya ka ha gēbili, bú ndi nāta gi aru, ka ha gēteta, bú ndi nēme ka i ma jijiji, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-npunara?

8 N’ihi na i kwatawo ọtutu mba, ya ka ndi nile fọduru nime ndi nile di iche iche gākwata gi; n’ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.

9 Ahuhu diri onye nēritara ulo-ya urù ọjọ, ido akwu-ya n’elu, ka ewe naputa ya n’ọbu-aka ihe ọjọ!

10 I duworo ulo-gi ọdu ihere, ibipu ọtutu ndi di iche iche, i we nēmehie megide nkpuru-obi-gi.

11 N’ihi na nkume gēsi na mb͕idi tie nkpu, ntuhie gēsi kwa n’osisi di n’ulo za ya.

12 Ahuhu diri onye ji ọbara ewu obodo, onye ji kwa ajọ omume me ka obodo guzosie ike!

13 Le, ò siteghi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha na ndi di iche iche nādọb͕u onwe-ha n’ọlu nye ọku, na ike nāgwu kwa mba nile n’efu?

14 N’ihi na uwa gējuputa n’ọmuma ebube Jehova, dika miri si ekpuchi oké osimiri.

15 Ahuhu diri onye nēme ka madu-ibe-ya ṅua ihe, onye nāgwakọta ya na ọnuma-gi, ọzọ, i nēme kwa ka ọ ṅubiga manya ókè, ka i we legide ọtọ-ha anya!

16 Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n’elu ebube-gi.

17 N’ihi na ihe-ike emere Lebanon gēkpuchi gi, na nbibi nke anumanu di iche iche, nke mere ka ha tua ujọ; n’ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.

18 Ùrù gini ka arusi apiri api bara, na onye nēme ya apiwo ya? ùrù gini ka arusi awuru awu na onye-ozízí okwu-ugha bara, na onye nākpu ihe-ya akpuru akpu atukwasiwo ya obi, ime arusi dara ob͕i di iche iche?

19 Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya.

20 Ma Jehova nọ n’ulo uku Ya di nsọ: dere du n’iru Ya, gi uwa nile.

Categories
HABAKUK

HABAKUK 3

1 Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n’elu Shigionoth.

2 Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m’tua egwu:

Jehova, tute ọlu-Gi n’etiti arọ nile,

N’etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya;

N’oké iwe cheta obi-ebere.

3 Chineke si na Timan nābia,

Onye Nsọ si kwa n’ugwu Peran.Selah

Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile,

Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.

4 Onwunwu-Ya di ka ìhè;

Ìhè nēnwuputa n’aka-Ya:

Ọ bu kwa n’ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.

5 N’iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga,

Anwuru-ọku si kwa n’ukwu-Ya abua nāputa.

6 O guzoro, we tùa uwa;

O lere anya, we me ka mba nile kuja:

Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi,

Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala;

Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya.

7 N’okpuru ajọ ihe ka m’huworo ulo-ikwū nile nke Kushan:

Ákwà-nkwuba nile nke ala Midian nāma jijiji.

8 Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide?

Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide?

Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide?

Na I nānọkwasi n’inyinya-Gi nile,

N’ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.

9 Ab͕abasiri uta-Gi ọtọ;

Iyi nile aṅuru ebo-Gi nile bu okwu-ọnu kwesiri ntukwasi-obi.Selah

I nēji osimiri b͕awa ala.

10 Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali;

Okè miri-ozuzo gabigara:

Ob͕u-miri mere ka olu-ya da,

Chilie aka-ya elu.

11 Anyanwu na ọnwa guzoro n’ebe-obibi-ha;

N’ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga,

N’onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà.

12 N’oké iwe ka I nāzọ ije n’ala,

N’iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.

13 I putawo ìhè izọputa ndi-Gi,

Izọputa onye-Gi etere manu;

I mabipuwo isi n’ulo ndi nēmebi iwu,

B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu.Selah

14 I jiwo nkpa-n’aka-ya dupue ndi-agha-ya isi:

Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam:

Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n’ala n’ebe-nzuzo.

15 I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n’oké osimiri,

Bú obo nke ọtutu miri.

16 Anurum, afọm we ma jijiji,

N’olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta;

Ire-ure nābà n’ọkpukpum nile, ọ bu kwa n’ọnọdum ka m’nāma jijiji:

Ka m’we zue ike rue ubọchi ahuhu,

Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n’usu ndi nāpunara madu ihe.

17 Asi na osisi fig adighi-ama ifuru,

Na ọ dighi ihe-ọmume di n’osisi vine;

Na ihe aluputara n’osisi olive ebilatawo,

Na ubi nile emeghi ihe-oriri;

Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n’ogige ewu na aturu,

Na ọ dighi ìgwè ehi di n’ulo ehi:

18 Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova,

M’gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.

19 Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem,

Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele,

Ọ bu kwa n’ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M’zọ ije.

Ọ diri Onye-isi Abù, n’ubọ-akwaram nile.