Categories
EZRA

EZRA 1

1 Ma n’arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n’ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n’ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n’odide-akwukwọ, si,

2 Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m’buru onye-nlekọta n’iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda.

3 Ònye nọ n’etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Chineke-ya nọyere ya, ya rigoru kwa Jerusalem, wue ulo Jehova, bú Chineke Israel, (Ya onwe-ya bu Chineke,) nke di na Jerusalem.

4 Ma onye ọ bula nke fọduru afọdu, site n’ebe nile ebe onye ahu nọ dika ọbìa, ka ndikom nke ebe-ya were ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo, ya na onyinye-afọ-ofufo-ha nke diri ulo Chineke nke di na Jerusalem, yere ya aka.

5 Ndi-isi ulo nke ndi bu nna Juda na Benjamin, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, bú onye ọ bula Chineke kpọtere mọ-ya, we bilie irigo iwu ulo Jehova nke di na Jerusalem.

6 Ndi nile nke nọ ha buruburu we were ihe ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo na ihe di oké ọnu-ahia, nāgughi ihe nile enyere n’afọ-ofufo, me ka aka-ha di ike.

7 Eze, bú Sairọs, chiputa-kwa-ra ihe ulo Jehova, nke Nebukadneza chipuru na Jerusalem tiye n’ulo ndi-chi-ya:

8 Sairọs, bú eze Peasia, we chiputa ha site n’aka Mitredat, bú odozi-àkù, gua ha nye Sheshbaza, bú onye-isi Juda.

9 Nka bu kwa ọnu-ọgugu-ha: orú ọkwa ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ọla-ọcha abua na ọgu iri, na orú mma na iteghete;

10 orú ọkwa ntà ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ntà ọla-ọcha na iri nke-abua di iche, na nnù ihe ọzọ abua na ọgu iri.

11 Ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha di nnù iri-na-atọ na ọgu iri. Ha nile ka, Sheshbaza chigotara, mb͕e ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ siri na Babilon rigorue Jerusalem.

Categories
EZRA

EZRA 2

1 Ma ndia bu umu ala ahu anāchi achi ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n’agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri na Babilon, ha we laghachi na Jerusalem na Juda, nwoke ọ bula n’obodo-ya;

2 ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:

3 umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua.

4 Umu Shefataia, ọgu iri-na-asatọ na iri na abua.

5 Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-asatọ na iri na ise.

6 Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na abua.

7 Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

8 Umu Zatu, nnù abua na ọgu asa na ise.

9 Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ.

10 Umu Bani, nnù na ọgu iri-na-abua na abua.

11 Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na atọ.

12 Umu Azgad, nnù atọ na orú na abua.

13 Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na isi.

14 Umu Bigvai, nnù ise na ọgu abua na iri na isi.

15 Umu Adin, nnù na ọgu abua na iri na anọ.

16 Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ.

17 Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na atọ.

18 Umu Jora, ọgu ise na iri na abua.

19 Umu Hashum, ọgu iri-na-otù na atọ.

20 Umu Giba, ọgu anọ na iri na ise.

21 Umu Bet-lehem, ọgu isi na atọ.

22 Ndikom Netofa, ọgu abua na iri na isi.

23 Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ.

24 Umu Azmavet, ọgu abua na abua.

25 Umu Kiriat-arim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ.

26 Umu Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù.

27 Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua.

28 Ndikom Bet-el na Ai, ọgu iri-na-otù na atọ.

29 Umu Nebo, ọgu abua na iri na abua.

30 Umu Magbish, ọgu asa na iri na isi.

31 Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

32 Umu Harim, ọgu iri-na-isi.

33 Umu Lod na Hadid na Ono, nnù na ọgu iri-na-isi na ise.

34 Umu Jeriko, ọgu iri-na-asa na ise.

35 Umu Senaa, nnù iteghete na orú na iri.

36 Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ.

37 Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

38 Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa.

39 Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa.

40 Ndi Livai: umu Jeshua na Kadmiel, nke umu Hodavaia, ọgu atọ na iri na anọ.

41 Ndi-ọbù-abù: umu Esaf, ọgu isi na asatọ.

42 Umu ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ha nile di ọgu isi na iri na iteghete.

43 Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;

44 na umu Kiros, na umu Siaha, na umu Padon;

45 na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Akub;

46 na umu Hagab, na umu Shamlai, na umu Hanan;

47 na umu Gidel, na umu Gaha, na umu Reaia;

48 na umu Rezin, na umu Nekoda, na umu Gazam;

49 na umu Uza, na umu Pasea, na umu Besai;

50 na umu Asna, na umu Meunim, na umu Nefisim;

51 na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua;

52 na umu Bazlut, na umu Mehida, na umu Hasha;

53 na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema;

54 na umu Nezia, na umu Hatifa.

55 Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Hasoferet, na umu Peruda;

56 na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel;

57 na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazébaim, na umu Ami.

58 Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua.

59 Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adan na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, na nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta:

60 umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

61 Site kwa n’umu ndi-nchu-àjà: umu Habaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n’umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n’aha-ha.

62 Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n’etiti ndi edere n’akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ha: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n’ọlu-nchu-àjà.

63 Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n’ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo.

64 Nkpọkọta ahu nile n’otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ,

65 nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri, bú ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù.

66 Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise;

67 camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi.

68 Ma ufọdu n’etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna, mb͕e ha biaruru ulo Jehova nke di na Jerusalem, ha nyere onwe-ha n’afọ-ofufo iwu ulo Chineke ime ka o guzo n’ọnọdu-ya:

69 dika ike-ha si di ka ha tiyere n’ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ asa na nnù iri-na-abua na ọgu iri, na nnù pound ọla-ọcha iri-na-abua na ọgu iri, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà ise.

70 Ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ufọdu nime ndi Juda, na ndi-ọbù-abù, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na Netinim, we biri n’obodo nile ha, Israel nile bi-kwa-ra n’obodo nile ha.

Categories
EZRA

EZRA 3

1 Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n’obodo nile ha, ndi ahu we chikọta onwe-ha dika otù onye rue Jerusalem.

2 Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n’elu ya, dika edeworo ya n’iwu Moses, bú onye nke Chineke.

3 Ha we me ka ebe-ichu-àjà guzosie ike n’ebe-ndọkwasi-ya nile; nihi na oké ujọ di n’aru ha n’ihi ndi ala ahu nile: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n’elu ya, bú àjà-nsure-ọku anēsure ututu na anyasi.

4 Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n’ubọchi-ha n’ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya;

5 mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo.

6 Site n’ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa ka ha malitere isurere Jehova àjà-nsure-ọku: ma akātọghi ntọ-ala ulo uku Jehova.

7 Ha nye kwa ndi nāwa nkume, nye kwa ndi-ọ̀kà n’osisi, ego; ha nye kwa ndi Zaidon, nye kwa ndi Taia, ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na manu, ka ha we si na Lebanon bute osisi cedar rue oké osimiri, rue Jafo, dika nkwenye nke Sairọs, bú eze Peasia, kweyere ha.

8 Ma n’arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n’ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n’umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n’agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n’onye b͕ara orú arọ ga n’iru, ibu ndi-isi n’ije-ozi nke ulo Jehova.

9 Jeshua we guzo, ya na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, na Kadmiel na umu-ya ndikom, bú umu Juda, dika otù onye, ibu ndi-isi nke ndi nēje ozi ahu n’ulo Chineke: umu-ndikom Henadad na umu-ha ndikom ṅa umu-nne-ha, bú ndi Livai.

10 Ma mb͕e ndi nēwu ulo tọrọ ntọ-ala ulo no, uku Jehova, ha we guzo ndi-nchu-àjà n’uwe-ha chiri opì, na ndi Livai, bú umu Esaf, chiri ájà, ito Jehova, dika ukpuru Devid, bú eze Israel, si di.

11 Ha we zarita onwe-ha n’ito na n’ikele Jehova, si, N’ihi na Ọ di nma, n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di n’ebe Israel nọ. Ndi Israel nile we tie oké nkpu, mb͕e ha toro Jehova, n’ihi na atọrọ ntọ-ala ulo Jehova.

12 Ma ọtutu nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-okenye ndi huru ulo mbu, mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo a n’anya-ha, ha nākwa ákwá n’oké olu; ọtutu nọ kwa n’iti nkpu n’ọṅù, nēweli olu-ha:

13 ndi Israel amataghi kwa ihe bu olu iti-nkpu ọṅù na nke bu olu ikwa-ákwá ndi Israel: n’ihi na ndi Israel nēti oké nkpu, ewe nu olu-ya rue ebe di anya.

Categories
EZRA

EZRA 4

1 Ndi nākpab͕u Juda na Benjamin we nu na umu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ nēwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo uku;

2 ha we biarue Zerubabel nso, biaru kwa ndi-isi ulo nke ndi bu nna nso, si ha, Ka ayi so unu wue ulo: n’ihi na ayi nāchọ Chineke-unu, dika unu si achọ; ma ayi onwe-ayi adighi-achu àjà site n’ubọchi Isa-hadon, bú eze Asiria, onye mere ka ayi rigorue ebe a.

3 Zerubabel na Jeshua na ndi fọduru nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel we si ha, Ọ dighi nke ayi na unu nwekọrọ n’iwuru Chineke-ayi ulo; kama ayi onwe-ayi gēwukwara Jehova, bú Chineke Israel, ulo, dika eze, bú Sairọs eze Peasia, nyere ayi iwu.

4 O rue na ndi ala ahu nēme ka aka ndi Juda ghara idi ike, ha nēme kwa ka ha tua egwu n’iwu ulo,

5 ha nēgota kwa ndi nādu ọdu megide ha, imebi idu-ọdu-ha, ubọchi nile nke Sairọs, bú eze Peasia, ọbuná rue ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.

6 Ma n’ọbubu-eze Ahasuerọs, na nmalite ọbubu-eze-ya, ha dere akwukwọ-nmegide imegide ndi bi na Juda na Jerusalem.

7 N’ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n’asusu Siria, asughariwo kwa ya n’asusu Siria.

8 Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, degara Ataksakses, bú eze, akwukwọ-ozi imegide Jerusalem otú a:

9 mb͕e ahu ha dere akwukwọ, bú Rehum, bú onye-nwe ikpe, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru, bú ndi-Dinait, na ndi-Afasatkait, na ndi-Tapelait, na ndi-Afasait, na ni-Akevait, na ndi Babilon, na ndi Shushan, na ndi-Dehait, na ndi Ilam,

10 na mba fọduru ndi Ọsnapa di uku di kwa ebube mere ka ha bia biri n’ala a, o we me ka ha nọdu n’obodo Sameria, ha na ndi fọduru n’ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a.

11 Nka bu ndeputa edeputara n’akukwọ-ozi ahu nke ha zigara ya, bú Ataksakses, bú eze; Ndi-orù-gi, bú ndikom n’ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a.

12 Ka eze mara, na ndi-Ju, bú ndi siri n’ebe i nọ rigokute ayi, ha abawo na Jerusalem; ha nēwu obodo ahu nke nupuru isi nēsì kwa ísì, ha ewubìwo mb͕idi-ya nile, jikọta ntọ-ala-ya nile.

13 Ub͕u a, ka eze mara, na, ọ buru na ewue obodo a, wuzu kwa mb͕idi-ya nile, ọ dighi utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ, ha gātu, ma n’ikpe-azu ọ gēme ka ihe funari ndi-eze.

14 Ub͕u a, n’ihi na nnú ulo uku eze bu nnú-ayi, na n’ihi na ayi enweghi ntachi-obi ihu ọtọ nke eze, ayi we zìe ozi me ka eze mara;

15 ka ewe chọ n’akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n’akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n’etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n’ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe.

16 Ayi onwe-ayi nēme ka eze mara na, ọ buru na ewue obodo a, luzu kwa mb͕idi-ya nile, n’ihi ya ọ dighi òkè i gēnwe n’ofè osimiri.

17 Eze zigara Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru ndi bi na Sameria, na ndi fọduru n’ofè osimiri, Udo, na ihe ọzọ di otú a.

18 Akwukwọ-ozi ahu nke unu zitere ayi, aguputawo ya nke-ọma n’irum.

19 M’we nye iwu, ewe chọ, chọputa na obodo a, site n’ubọchi nile nke mb͕e ochie, nēbuli onwe-ya imegide ndi-eze, anākpali kwa madu inupu isi na imegide ndi-isi nime ya.

20 Ndi-eze di ike abuwo kwa ndi-isi Jerusalem, bú ndi nwere ike n’aru ndi nile nọ n’ofè osimiri; anēnye kwa ha utu-ala na utu-ahia na utu-uzọ.

21 Ub͕u a nyenu iwu ime ka ndikom a kwusi, ka aghara kwa iwu obodo a, rue mb͕e m’gēnye iwu.

22 Lezi-kwa-nu anya ka nmehie ghara idi n’ime ihe a: n’ìhi gini ka ihe ọjọ a gādi uku ime ka ihe funari ndi-eze.

23 Mb͕e ahu site na mb͕e aguru ndeputa akwukwọ-ozi nke Ataksakses, bú eze, n’iru Rehum, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha, ha were ngwa ngwa jerue Jerusalem, jekuru ndi-Ju, were ihe-ike na usu-ndi-agha me ka ha kwusi.

24 Mb͕e ahu ọlu ulo Chineke nke di na Jerusalem kwusiri; o we kwusi rue arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.

Categories
EZRA

EZRA 5

1 Ma ndi-amuma, bú Hagai onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido, buru amuma nye ndi-Ju ndi nọ na Juda na nime Jerusalem; ọ bu n’aha Chineke Israel ka ha buru amuma nye ha.

2 Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume.

3 Na mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n’ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, biakutere ha, we si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, na iluzu mb͕idi a?

4 Mb͕e ahu otú a ka ayi siri ha. Ha siri, Òle aha ndi nēwu ulo a anēwu?

5 Ma anya Chineke-ha di n’aru ndi-okenye ndi-Ju, ha we ghara ime ka ha kwusi, rue mb͕e okwu ahu jeruru Daraiọs nti: mb͕e ahu ha we zighachi akwukwọ-ozi bayere ihe a.

6 Ndeputa akwukwọ-ozi nke Tatenai, bú onye nāchi ala n’ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ya, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n’ofè osimiri, zigara Daraiọs, bú eze.

7 Ha zigara ya akwukwọ, otú a ka ede-kwa-ra nime ya; Daraiọs, bú eze, nwe akwukwọ a, udo nile diri ya.

8 Ka eze mara, na ayi jere n’ala anāchi achi, bú Juda, rue ulo Chineke uku, ma anēwere nkume nkpọrè wue ya, anēdo kwa osisi nime mb͕idi, anālu kwa ọlu a ọsọsọ, ọ nāga kwa nke-ọma n’aka-ha.

9 Mb͕e ahu ayi juru ndi-okenye ahu, si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, iluzu mb͕idi a?

10 Ọzọ kwa, ayi juru ha aha-ha, ime ka i mara, ka ayi we de aha ndikom ahu ndi bu isi-ha n’akwukwọ.

11 Ma otú a ka ha zaghachiri ayi okwu, si, Ayi onwe-ayi bu ndi-orù nke Chineke nke elu-igwe na uwa, ayi nēwu kwa ulo nke ewuru ọtutu arọ gara aga site na mb͕e a, nke otù eze uku nke Israel nwere wuru, wuzu kwa.

12 Ma mb͕e nna-ayi-hà kpasusiri Chineke nke elu-igwe iwe, O nyere ha n’aka Nebukadneza, bú eze Babilon, onye Kaldea, o we me ka ulo a la n’iyì, o me-kwa-ra ka ndi-ayi je biri na Babilon.

13 Ma n’arọ mbu nke Sairọs, bú eze Babilon, Sairọs, bú eze, nyere iwu iwu ulo Chineke a.

14 Ọzọ kwa, ihe nile nke ulo Chineke, nke ọla-edo na nke ọla-ọcha, nke Nebukadneza chiputara n’ulo uku Chineke di na Jerusalem, chibata ha n’ulo uku nke Babilon, ihe ahu ka Sairọs, bú eze, chiputara n’ulo uku Babilon, nye ha n’aka otù onye, Sheshbaza bu aha-ya, onye o mere onye nāchi ala;

15 ọ si ya, Chiri ihe ndia, je, dọba ha n’ulo uku Chineke ahu nke di na Jerusalem, ka ewu kwa ulo Chineke n’ọnọdu-ya.

16 Mb͕e ahu Sheshbaza ahu biara, tọ ntọ-ala nile nke ulo Chineke nke di na Jerusalem: ma site na mb͕e ahu we rue ub͕u a ka anēwu ya, ma ewuzughi ya.

17 Ma ub͕u a, ọ buru na ọ di eze nma, ka achọ n’ulo àkù eze, nke di n’ebe ahu nime Babilon, ma ọ bu ezie na esitere n’aka Sairọs, bú eze, nye iwu iwu ulo a nke Chineke nime Jerusalem, ka eze zite-kwa-ra ayi ihe nātọ ya utọ bayere okwu a.

Categories
EZRA

EZRA 6

1 Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, nyere iwu, ha we chọ n’ulo akwukwọ, ebe adọbara àkù nime Babilon.

2 Ewe chọta akwukwọ-npiakọta n’Ekbatar, n’ulo uku nke di n’ala anāchi achi, bú Midia, ma ihe-ncheta di nime ya nke edeworo otú a.

3 N’arọ mbu nke Sairọs, bú eze, Sairọs, bú eze, nyere iwu; Ulo Chineke nime Jerusalem, ka ewue ulo ahu, bú ebe ha nāchu àjà, ka atọ kwa ntọ-ala-ya si-ike; idi-elu-ya gādi ọgu cubit atọ, obosara-ya ọgu cubit atọ;

4 akuku atọ nke nkume nkpọrè, na otù ariri osisi ọhu: ka esi kwa n’ulo eze nye ego iji lu ọlu ahu:

5 ọzọ kwa, ka enyeghachi ihe ọla-edo na ọla-ọcha nke ulo Chineke, bú nke Nebukadneza chiputara n’ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, chita na Babilon, ka achighachi kwa ha n’ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, ihe ọ bula n’ọnọdu-ya, gi dọba kwa ha n’ulo Chineke.

6 Ub͕u a, Tatenai, bú onye nāchi ala n’ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n’ofè osimiri, dinu n’ebe di anya site n’ebe ahu:

7 rapunu ọlu ulo a nke Chineke; kwe ka onye-isi ndi-Ju na ndi-okenye ndi-Ju wue ulo a nke Chineke n’ọnọdu-ya.

8 Anēsite kwa n’akam nye iwu bayere ihe unu gēme ndi-okenye ahu nke ndi-Ju iwu ulo a nke Chineke: ka eme ngwa si n’àkù eze, bú nke sitere n’utu anātu n’ofè osimiri, nye ndikom ahu ego iji lu ọlu ahu, ka ha ghara ikwusi.

9 Ihe di kwa ha nkpà, ma umu-oke-ehi, ma ebulu, ma umu-aturu, iji churu Chineke nke elu-igwe àjà-nsure-ọku, ma ọka wheat, ma nnú, ma manya-vine, ma manu, dika okwu-ọnu ndi-nchu-àjà si di, bú ndi nọ na Jerusalem, ka ewere ya nye ha kwa-ubọchi nēmehiegh:

10 ka ha we nēweta nso ihe ísì utọ nye Chineke nke elu-igwe, nēkpe kwa ekpere bayere ndu eze, na nke umu-ya ndikom.

11 Anēsite kwa n’akam nye iwu, na onye ọ bula nke gāb͕anwe okwu a, ka adọputa osisi n’ulo-ya, bulie onye ahu kpọgide ya n’elu ya; ka eme kwa ulo-ya ebe-ikpofu-ahihia n’ihi nka:

12 Chineke kwa Nke mere aha-Ya ka o biri n’ebe ahu, Ya tudà eze na ndi ọ bula nke gēseti aka-ya ib͕anwe okwu a, na ime ka ulo a nke Chineke nke di na Jerusalem la n’iyì. Mu onwem, bú Dariọs, enyewo iwu; ka ewere ngwa ngwa me ya.

13 Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n’ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.

14 Ma ndi-okenye nke ndi-Ju nēwu ulo, ihe nāga-kwa-ra ha nke-ọma, site n’ibu-amuma nke Hagai, bú onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido. Ha we wue, wuzu kwa ya, site n’ihe Chineke Israel nyere n’iwu, na site n’ihe Sairọs na Daraiọs na Ataksakses, bú eze Peasia, nyere n’iwu.

15 Ma n’ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n’arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a.

16 Umu Israel, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi fọduru n’umu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, were ọṅù me ememe nke irara ulo a nke Chineke nye Chineke.

17 Ha we weta nso n’irara ulo a nke Chineke nye Chineke ọgu oke-ehi ise, na ọgu ebulu iri, na nnù umu-aturu; na nkpi iri-na-abua, iji churu Israel nile àjà-nmehie, dika nguta nke ebo nile nke Israel si di.

18 Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n’òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n’akwukwọ Moses.

19 Umu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ we me ememe ngabiga n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.

20 N’ihi na ndi-nchu-àjà na ndi Livai mere onwe-ha ka ha di ọcha n’otù; ha nile di ọcha: ha we b͕uere umu nile nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ anu ngabiga, b͕u-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà, b͕u-kwa-ra onwe-ha.

21 Umu Israel we rie, bú ndi nēsi n’etiti ndi emere ka ha je birl n’ala ọzọ lata, ha na onye ọ bula nke nēkewapu onwe-ya n’ọrurú nke mba nile nke ala ahu iso ha, ichọ Jehova, bú Chineke Israel,

22 ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n’ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n’ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n’ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.

Categories
EZRA

EZRA 7

1 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, n’ọbubu-eze nke Ataksakses, bú eze Peasia, Ezra nwa Seraia, nwa Azaraia, nwa Hilkaia,

2 nwa Shalum, nwa Zedok, nwa Ahaitub,

3 nwa Amaraia, nwa Azaraia, nwa Meraiot,

4 nwa Zerahia, nwa Uzi, nwa Buki,

5 nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà:

6 Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n’iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n’aru ya.

7 Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n’arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.

8 O we biarue Jerusalem n’ọnwa nke-ise, nke ahu di n’arọ nke-asa nke eze.

9 N’ihi na n’ubọchi mbu nke ọnwa mbu, nke ahu bu ntọ-ala nke nrigo ahu site na Babilon, ma ọ bu n’ubọchi mbu nke ọnwa nke-ise ka ọ biaruru Jerusalem, dika ezi aka Chineke-ya si di n’aru ya.

10 N’ihi na Ezra doziri obi-ya ichọ iwu Jehova, na ime ya, na izí ukpuru-Ya na ikpé-Ya n’Israel.

11 Ma nka bu ndeputa akwukwọ-ozi ahu nke eze, bú Ataksakses, nyere Ezra, bú onye-nchu-aja, bú ode-akwukwọ, ọbuná ode-akwukwọ nke okwu nile nke ihe nile Jehova nyere n’iwu, na nke ukpuru-Ya nile O nyere Israel.

12 Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a.

13 Esitewo n’akam nye iwu, na onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo ije Jerusalem nime ndi Israel, na ndi-nchu-àjà-ha na ndi Livai, n’ala-ezem, ya so gi je.

14 N’ihi na anēsi n’iru eze na madu asa ndi nādu ya ọdu ziga gi iwere iwu Chineke-gi nke di n’aka-gi ju ajuju bayere Juda, baye-kwa-ra Jerusalem;

15 na ibūru ọla-ọcha na ọla-edo nke eze na ndi nādu ya ọdu were afọ-ofufo nye Chineke Israel, Onye ebe-obibi-Ya di na Jerusalem,

16 na ọla-ọcha na ọla-edo nile nke i gāchọta n’ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, tiyere onyinye-afọ-ofufo nke ndi-gi, na nke ndi-nchu-àjà-ha, ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha bayere ulo Chineke-ha nke di na Jerusalem;

17 n’ihi nka i gēme ngwa were ego a zuru oke-ehi na ebulu na umu-aturu, na onyinye-inata-iru-ọma-ha na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, i gēweta ha nso ebe-ichu-àjà nke ulo Chineke-unu nke di na Jerusalem.

18 Ma ihe ọ bula nke gādi gi nma, di kwa umu-nne-gi nma, iwere nke fọduru nime ọla-ọcha na ọla-edo ahu me, dika ọchichọ Chineke-unu si di ka unu gēme.

19 Ihe nile kwa nke anēnye gi iji fè òfùfè nke ulo Chineke-gi, gi me ha ka ha zue okè n’iru Chineke Jerusalem.

20 Ma nke fọduru n’ihe nile di nkpà nke ulo Chineke-gi, nke gādabayere gi inye, si n’ulo àkù eze nye ya.

21 Anēsite kwa n’akam, bú mu onwem, Ataksakses, bú eze, nye ndi-odozi-àkù nile ndi nọ n’ofè osimiri iwu, na ihe ọ bula Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, gāriọ unu, ka eme ya ngwa ngwa,

22 rue ọgu talent ọla-ọcha ise, ru kwa ọgu cor ọka wheat ise, ru kwa ọgu bath manya-vine ise, ru kwa ọgu bath manu ise, na nnú nke anēdeghi akwukwọ ọtùtù-ya.

23 Ihe ọ bula nke putara n’iwu Chineke nke elu-igwe, ka eme ya n’uzọ ziri ezi nye ulo Chineke nke elu-igwe; n’ihi na, n’ìhi gini ka iwe gādi megide ala-eze nke eze na umu-ya ndikom?

24 Ayi nēme kwa ka unu mara, na ọ dighi onye ka enyere ike n’aru ndi-nchu-àjà na ndi Livai ọ bula, ma-ọbu ndi nābù abù ọma, ma-ọbu ndi-ọnu-uzọ-ama, ma-ọbu Netinim, ma-ọbu ndi nēfè òfùfè nke ulo a nke Chineke, inara ha utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ.

25 Ma gi onwe-gi, Ezra, dika amam-ihe nke Chineke-gi nke di n’aka-gi si di, guputa ndi-ikpe na ndi-odozi-okwu, ndi gāburu ndi nile nọ n’ofè osimiri, bú ndi nile mara iwu Chineke-gi, ndi-odozi-okwu; me-kwa-nu ka ọ mara iwu ahu, bú onye nāmaghi.

26 Ma onye nke nēmeghi iwu Chineke-gi, na iwu eze, ka ewere ngwa ngwa me ya ihe ekpere n’ikpe, ma ọ bu inwu ọnwu, ma-ọbu iwepu ya n’ala, ma-ọbu iri àkù-ya na nra, ma-ọbu ike ya ab͕u.

27 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, bu, Onye tiyeworo ihe di otú a n’obi eze, nime ka ulo Jehova nke di na Jerusalem ma nma;

28 Onye setiwo-kwa-ra ebere-Ya n’ebe m’nọ n’iru eze na ndi nādu ya ọdu, na n’iru ndi-isi nile nke eze bu ndi-dike. M’we me onwem ka m’di ike dika aka Jehova, bú Chinekem, si di n’arum, m’we chikọputa n’Israel ndi-isi isorom rigo.

Categories
EZRA

EZRA 8

1 Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, nka bu kwa akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi nēsom si na Babilon rigo, n’ọbubu-eze Ataksakses, bú eze.

2 Site n’umu Finehas, Giashom: site n’umu Itama, Daniel: site n’umu Devid, Hatush.

3 Site n’umu Shekania; site n’umu Parosh, Zekaraia: ndi soro ya, bú ndi edere n’akwukwọ-osuso-ọmumu diri ndikom, di ọgu asa na iri.

4 Site n’umu Pahat-moab, Eliehoenai nwa Zerahai; ndi soro ya di ọgu ndikom iri.

5 Site n’umu Shekania, nwa Jahaziel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri-na-ise.

6 Site kwa n’umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri.

7 Site kwa n’umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri.

8 Site kwa n’umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ.

9 Site n’umu Joab, Obadaia nwa Jehiel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri na iri na asatọ.

10 Site kwa n’umu Shelomit, nwa Josifia; ndi soro ya di ọgu ndikom asatọ.

11 Site kwa n’umu Bebai, Zekaraia nwa Bebai; ndi soro ya di orú ndikom na asatọ.

12 Site kwa n’umu Azgad, Johanan nwa Hakatan; ndi soro ya di ọgu ndikom ise na iri.

13 Site kwa n’umu Adonikam, bú ndi-ikpe-azu; ndia bu kwa aha-ha, Elifelet, na Jeuel, na Shemaia; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ.

14 Site kwa n’umu Bigvai, Utai na Zabud; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ na iri.

15 M’we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n’Ahava; ayi we nọ n’ọmuma-ulo-ikwū n’ebe ahu ubọchi atọ: m’we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m’chọtara n’ebe ahu.

16 M’we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m’kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.

17 M’we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m’we tiye n’ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi.

18 Ha we me ka otù nwoke nke nwere uche biakute ayi, dika ezi aka nke Chineke-ayi si di n’aru ayi, o sitere n’umu Mahli, nwa Livai, nwa Israel; na Sherebia na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-asatọ;

19 na Hashabaia, ya na Jeshaia nke sitere n’umu Merari, na umu-nne-ya na umu-ha ndikom, orú madu;

20 site kwa na Netinim, ndi Devid na ndi-isi nyere ka ha fè òfùfè nke ndi Livai, ọgu Netinim iri-na-otù: ha nile ka akpọrọ n’aha n’aha.

21 M’we kpọsa obubu-ọnu n’ebe ahu, n’akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n’ala n’iru Chineke-ayi ichọta n’aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.

22 N’ihi na emerem ihere iriọ n’aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n’ihi onye-iro nke di n’uzọ: n’ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n’aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya.

23 Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ.

24 M’we kewaputa na ndi-isi nke ndi-nchu-àjà madu iri na abua, bú Sherebia na Hashabaia, ha na madu iri ndi sitere n’umu-nne-ha,

25 m’we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n’ebe ahu, buliri:

26 m’we tùa nye ha n’aka nnù talent ọla-ọcha na ọgu iri-na-abua na iri, na ọgu talent ihe ọla-ọcha ise; na ọgu talent ọla-edo ise;

27 na orú ọkwa ntà ọla-edo, ọtùtù-ha bu nnù daric abua na ọgu iri; na ihe abua nke ezi ọla nācha edo edo, bú ihe anāchọsi ike dika ọla-edo.

28 M’we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.

29 Nechenu ha nche, debe kwa ha, rue mb͕e unu tùru ha n’iru ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, nime Jerusalem, n’ime-ulo nke ulo Jehova.

30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we nara ọtùtù nke ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile, ibūru ha biarue Jerusalem rue ulo Chineke-ayi.

31 Ayi we si n’osimiri Ahava n’ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n’aru ayi, O we naputa ayi n’aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n’uzọ.

32 Ayi we biarue Jerusalem, nọdu n’ebe ahu ubọchi atọ.

33 Ma n’ubọchi nke-anọ ka atùru ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile n’ulo Chineke-ayi nye n’aka Meremot, nwa Uraia, bú onye-nchu-àjà; Eleeza nwa Finehas nọye-kwa-ra ya; Jozabad nwa Jeshua na Noadaia nwa Binui, bú ndi Livai, nọye-kwa-ra ha;

34 n’ọnu-ọgugu na n’ọtùtù ka enyere ha ihe ọ bula: ewe de ọtùtù nile n’akwukwọ na mb͕e ahu.

35 Ndi nēsi na ndọta-n’agha bia, bú umu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, wetara àjà-nsure-ọku nso Chineke Israel, oke-ehi iri na abua n’ihi Israel nile ọgu ebulu anọ na iri na isi, ọgu umu-aturu atọ na iri na asa, nkpi iri na abua ibu àjà-nmehie: ihe a nile bu àjà-nsure-ọku isurere Jehova.

36 Ha we nye ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala n’ofè osimiri iwu nile nke eze: ha we yere ndi-Ju na ulo Chineke aka.

Categories
EZRA

EZRA 9

1 Ma mb͕e emere ka ihe ndia gwusia, ndi-isi biarurum nso, si, Ndi Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, ha ekewapughi onwe-ha n’etiti ndi di iche iche nke ala ọzọ, nēme dika ihe-árú-ha si di, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi Amon, na ndi Moab, na ndi Ijipt, na ndi-Amorait.

2 N’ihi na ha esiwo n’umu-ha ndinyom lutara onwe-ha nwunye, luta-kwa-ra umu-ha ndikom; nkpuru nsọ ahu we gwakọta onwe-ha na ndi di iche iche nke ala ọzọ: ma aka ndi-isi na ndi nāchi ala bu uzọ na nmekpu a.

3 Ma mb͕e m’nuru okwu a, adọwaram uwem na uwe-nwudam, ropu kwa ufọdu n’agiri-isi nke isim na aji afu-ọnum, m’we nọdu, ibobo we nwuam n’aru.

4 Ewe chikọta n’ebe m’nọ onye ọ bula nke nāma jijiji n’okwu Chineke Israel, n’ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ; ma mu onwem nānọdu, ibobo we nwuam n’aru, rue mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.

5 Ma na mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, esirim n’iweda onwem n’ala bilie, ọbuná na ndọwa na uwe-nwudam; m’we ruru ala n’ikperèm b͕asara Jehova, bú Chinekem, ọbu-akam abua;

6 M’we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n’ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n’ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe.

7 Site n’ubọchi nna-ayi-hà ayi onwe-ayi anọwo n’ikpe-ọmuma uku rue ta; ma n’ihi ajọ omume nile ayi ka enyere ayi onwe-ayi, na ndi-eze-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, n’aka ndi-eze ala ọzọ, na mma-agha, na na ndọta-n’agha, na nime nluta-n’agha, na n’ihere iru, dika o si di ta.

8 Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n’aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n’ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n’ọbubu-orù-ayi.

9 N’ihi na ndi-orù ka ayi bu; ma Chineke-ayi arapughi ayi n’ọbubu-orù-ayi, kama O setiwo ebere rue ayi aru n’iru ndi-eze Peasia, idebere ayi ndu, iwuli ulo Chineke-ayi elu, na ime ka nkpọnkpọ-ebe-ya nile guzo, na inye ayi mb͕idi nime Juda na nime Jerusalem.

10 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, àyi gāsi gini mb͕e ihe a gasiri? n’ihi na ayi arapuwo ihe nile I nyere n’iwu,

11 nke I nyere n’iwu site n’aka ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, si, Ala ahu nke unu onwe-unu nābata inweta ya, ala isọ-nsọ ka ọ bu n’isọ-nsọ nke ndi di iche iche nke ala ọzọ, site n’ihe-árú nile ha, nke juputaworo ya site n’otu ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ, n’ọrurú-ha.

12 Ma ub͕u a unu enyela umu-ha ndikom umu-unu ndinyom, unu ekuru-kwa-la umu-ha ndinyom nye umu-unu ndikom, unu achọ-kwa-la udo-ha ma-ọbu ọdi-nma-ha rue mb͕e ebighi-ebi: ka unu we di ike, rie ezi ihe nke ala ahu, me kwa ka umu-unu nweta ya rue mb͕e ebighi-ebi.

13 Ma mb͕e ihe nile a gasiri, nke nābiakwasi ayi n’ihi omume ọjọ nile ayi, na n’ihi ikpe-ọmuma uku ayi, n’ihi na Gi onwe-gi, bú Chineke-ayi, eb͕ochiwo ahuhu-nmehie-ayi, ka ọ ghara idi elu ka ajọ omume-ayi, I we nye ndi-nb͕apu di otú a,

14 àyi gālaghachi kwa mebie ihe nile I nyere n’iwu, we ghọ ọgọ ndi ahu ndi nēme ihe-árú ndia? Ì gaghi-ewesa ayi iwe, rue mb͕e emere ka ayi gwusi, ndi fọduru ma-ọbu ndi-nb͕apu we ghara idi?

15 Jehova, bú Chineke Israel, onye ezi omume ka I bu; n’ihi na ayi fọduru ibu ndi-nb͕apu, dika o si di ta: le, ayi nọ n’iru Gi n’ikpe-ọmuma-ayi; n’ihi na ọ dighi onye iguzo n’iru Gi n’ihi nka.

Categories
EZRA

EZRA 10

1 Ma mb͕e Ezra nēkpe ekpere, nēkwuputa kwa ekwuputa, nākwa ákwá nātuda kwa onwe-ya n’ala n’iru ulo Chineke, esiri n’Israel chikọta n’ebe ọ nọ nkpọkọta madu di ọtutu nke-uku, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri: n’ihi na ndi Israel kwara ákwá ri nne.

2 Shekania nwa Jehiel, nke sitere n’umu Ilam, we za, si Ezra, Ayi onwe-ayi emekpuwo emekpu megide Chineke-ayi, luta ndinyom ala ọzọ sitere na ndi di iche iche nke ala nka: ma ub͕u a Israel nwere olile-anya bayere ihe a.

3 Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n’ihe nile nke Chineke-ayi nyere n’iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.

4 Bilie; n’ihi na okwu a diri gi, ayi onwe-ayi nọye-kwa-ra gi: di ike, me kwa ya.

5 Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi.

6 Ezra we si n’iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n’ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n’ihi na o nēru újú n’ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ.

7 Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem;

8 ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n’ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di.

9 Ndikom nile nke Juda na Benjamin we chikọta onwe-ha na Jerusalem n’ubọchi atọ; nke ahu bu ọnwa nke-iteghete, n’ubọchi nke-orú n’ọnwa ahu: ndi ahu nile we nọdu n’amá ulo Chineke, nāma jijiji n’ihi okwu a, na site n’oké miri-ozuzo nile.

10 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we bilie, si ha, Unu onwe-unu emekpuwo emekpu, luta ndinyom ala ọzọ, itukwasi ihe n’ikpe-ọmuma Israel.

11 Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n’aru ndi di iche iche nke ala nka, na n’aru ndinyom ala ọzọ.

12 Nkpọkọta ahu nile we were oké olu za, si, O ziri ezi, dika okwu-gi nile n’ebe ayi nọ si di, ayi aghaghi ime otú a.

13 Ma ndi Israel di ọtutu, ọ bu kwa mb͕e oké miri-ozuzo, ike adighi kwa ayi iguzo n’èzí, ma ozi a abughi nke otù ubọchi, ọ bughi kwa nke ubọchi abua: n’ihi na ayi ejehiewo ri nne n’okwu a.

14 Biko, ka ndi-isi-ayi guzoro nkpọkọta nka nile, ka ndi nile ndi nọ n’obodo nile ayi bia kwa na mb͕e ezubere, bú ndi lutara ndinyom ala ọzọ, ha na ndi-okenye obodo nile ọ bula, na ndi-ikpe-ya, rue mb͕e iwe ọku nke Chineke-ayi bayere okwu a si n’aru ayi laghachi.

15 Otú ọ di, Jonatan nwa Asahel na Jahzeia nwa Tikva guzoro imegide ihe a: Meshulam na Shabetai, bú onye Livai, yekwara ha aka.

16 Umu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ we me otú a. Ewe kewapu Ezra, bú onye-nchu-àjà, na ndikom ọzọ, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha nile n’aha-ha kwa; ha we nọdu n’ubọchi mbu nke ọnwa nke-iri ka ha we jua ajuju okwu a.

17 Ha we jubìe ajuju n’okwu ndikom nile ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ n’ubọchi mbu nke ọnwa mbu.

18 Ewe chọta ufọdu n’etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n’etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia.

19 Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n’ihi ikpe-ọmuma-ha.

20 Na n’etiti umu Imea; Hanani na Zebadaia.

21 Na n’etiti umu Harim; Maaseia, na Elaija, na Shemaia, na Jehiel, na Uzaia.

22 Na n’etiti umu Pashua; Elioenai, na Maaseia, na Ishmael, na Netanel, na Jozabad, na Elasa.

23 Na n’etiti ndi Livai; Jozabad, na Shimai, na Kelaia, (onye ahu bu Kelita), na Petahia, na Juda, na Elieza.

24 Na n’etiti ndi-ọbù-abù; Elaiashib: na n’etiti ndi-ọnu-uzọ-ama; Shalum, na Telem, na Uri.

25 Na n’etiti Israel: n’etiti umu Parosh; Ramia, na Izia, na Malkija, na Mijamin, na Eleeza, na Malkija, na Benaia.

26 Na n’etiti umu Ilam; Matanaia, na Zekaraia, na Jehiel, na Abdi, na Jeremot, na Elaija.

27 Na n’etiti umu Zatu; Elioenai, na Elaiashib, na Matanaia, na Jeremot, na Zabad, na Aziza.

28 Na n’etiti umu Bebai; Jehohanan, na Hananaia, na Zabai, na Atlai.

29 Na n’etiti umu Bani; Meshulam, na Maluk, na Adaia, na Jashub, na Sheal, na Jeremot.

30 Na n’etiti umu Pahat-moab; Adna, na Kelal, na Benaia, na Maaseia, na Matanaia, na Bezalel, na Binui, na Manase.

31 Na n’etiti umu Harim; Elieza, na Ishija, na Malkija, na Shemaia, na Shimeon;

32 Benjamin, na Maluk, na Shemaria;

33 Na n’etiti umu Hashum; Matenai, na Matata, na Zabad, na Elifelet, na Jeremai, na Manase, na Shimai.

34 Na n’etiti umu Bani; Maadai, na Amram, na Uel;

35 na Benaia, na Bedeia, na Keluhi;

36 na Vania, na Meremot, na Elaiashib;

37 na Matanaia, na Matenai, na Jaasu;

38 na Bani, na Binui, na Shimai;

39 na Shelemaia, na Netan, na Adaia;

40 na Maknadebai, na Shashai, na Sharai;

41 na Azarel, na Shelemaia, na Shemaria;

42 na Shalum, na Amaraia, na Josef.

43 N’etiti umu Nebo; Jeiel, na Matitaia, na Zabad, na Zebina, na Ido, na Joel, na Benaia.

44 Ndia nile alutawo ndinyom ala ọzọ na nwunye: ufọdu nime ha nwe-kwa-ra ndinyom ndi ha siri n’aka ha mu umu-ndikom.