Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 41

1 O we me ka m’biarue ulo uku Chineke, o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya, cubit isi n’obosara n’otù akuku, na cubit isi n’obosara n’akuku nke-ọzọ, nka bu obosara ulo-ikwū ahu.

2 Obosara nke ọnu-uzọ di kwa cubit iri; akuku abua nke ọnu-uzọ ahu di kwa cubit ise n’otù akuku, na cubit ise n’akuku nke-ọzọ: O we tùa ogologo-ya, ọgu cubit abua, na obosara-ya, orú cubit.

3 O we ba nime, tùa akuku-ọnu-uzọ ọ bula nke ọnu-uzọ ahu, cubit abua: na ọnu-uzọ, cubit ise; na obosara ọnu-uzọ, cubit asa.

4 O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n’iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

5 O we tùa mb͕idi ulo ahu, cubit isi; na obosara nke ulo ntà nke akuku n’otù n’otù, cubit anọ, buruburu ulo ahu n’akuku nile ọ bula.

6 Ulo ntà nke akuku di kwa otù ulo ntà nke akuku n’elu ulo ntà nke akuku ọzọ okpukpu atọ, ha di kwa orú na iri n’usoro; ha we ba nime mb͕idi ahu nke diri ulo ahu bayere ulo ntà nke akuku di ya buruburu n’akuku nile, ka ha we jide mb͕idi ahu, ghara ijide mb͕idi ulo onwe-ya.

7 Ulo ntà nke akuku ndia di obosara kari ka ha nāla elu elu n’idi ulo ahu buruburu; n’ihi na idi ulo ahu buruburu nāla elu elu buruburu ulo ahu n’akuku nile: n’ihi nka obosara nke diri ulo ahu di uku kari n’elu; otú a anēsi n’ulo ntà di ala rigorue ulo ntà kachasi elu site n’ulo ntà di n’etiti.

8 M’we hu na ulo ahu nwere ebe di elu buruburu n’akuku nile: ntọ-ala nile nke ulo ntà nke akuku bu ogologo zuru ezu nke ami ahu eji atù ihe, bú cubit uku isi.

9 Ib͕idi nke mb͕idi ahu, nke diri ulo ntà nke akuku, n’èzí, di cubit ise: ma nke fọduru bu ọnọdu nke ulo ntà nke akuku nke diri ulo ahu.

10 N’etiti ime-ulo abua ọ di orú cubit n’obosara buruburu ulo ahu n’akuku nile ọ bula.

11 Ma ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku chere iru n’ebe ahu fọduru, otù ọnu-uzọ n’uzọ nke Ugwu, na otù ọnu-uzọ n’akuku Ndida: obosara nke ebe ahu nke fọduru di kwa cubit ise buruburu n’akuku nile.

12 Ma ulo ahu anēwu ewu nke di n’iru ebe ekewapuru ekewapu n’akuku n’uzọ Ọdida-anyanwu, obosara-ya di ọgu cubit atọ na iri; mb͕idi nke ulo ahu anēwu ewu di kwa cubit ise n’ib͕idi-ya buruburu n’akuku nile, ogologo-ya di kwa ọgu cubit anọ na iri.

13 Ọ tù-kwa-ra ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise; na ebe ahu ekewapuru ekewapu, na ulo ahu anēwu ewu, na mb͕idi-ya nile, ogologo-ya di ọgu cubit ise;

14 na obosara nke iru ulo ahu, na nke ebe ahu ekewapuru ekewapu chere iru n’Iru-anyanwu, ọgu cubit ise.

15 Ọ tù-kwa-ra ogologo nke ulo ahu anēwu ewu n’iru ebe ahu ekewapuru ekewapu nke di n’azu ya, na ulo-njeghari-ya n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ, ọgu cubit ise; na ulo uku Chineke nke ime-ime, na uzọ-nbata nile nke ogige ahu;

16 nbata-uzọ-ya nile, na window nile emechiri emechi, na ulo-njeghari-ya nile buruburu n’okpukpu atọ ha, nke di na ncherita-iru nbata-uzọ ahu, nke ihe-nmachita nke osisi di ya buruburu n’akuku nile, site kwa n’ala rue window nile; ma window nile bu nke ekpuchiri ekpuchi;

17 rue elu ọnu-uzọ, ọbuná rue ulo ime-ime ya, na n’èzí, ru kwa mb͕idi-ya nile buruburu n’akuku nile n’ime na n’èzí, n’ọtùtù-ha.

18 Ọ bu kwa ihe emeworo ka o yie cherubim na nkwu; otù nkwu di n’etiti cherub na cherub, iru abua ka cherub ọ bula nwere;

19 iru madu we che iru na nkwu ahu di n’otù akuku, iru nwa-ọdum che-kwa-ra iru na nkwu ahu nke di n’akuku nke-ọzọ: otú a ka emere ya n’ulo ahu nile buruburu n’akuku nile.

20 Site n’ala rue elu ọnu-uzọ-ya ka cherubim na nkwu nke emere eme di: otú a ka mb͕idi nke ulo uku Chineke di.

21 Ma ulo uku Chineke ahu, akuku-ọnu-uzọ-ya nwere akuku anọ ra nrata; na iru ebe nsọ ya, n’ile ya anya ọ di ka ulo uku Chineke si di n’ile ya anya.

22 Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n’idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n’iru Jehova.

23 Ọ bu kwa ọnu-uzọ abua ka ulo uku Chineke na ebe nsọ ya nwere n’otù n’otù.

24 Ọ bu kwa ibo-ọnu-uzọ abua ka ọnu-uzọ ndia nwere n’otù n’otù, bú ibo-ọnu-uzọ abua nke nāga buruburu; ibo-ọnu-uzọ abua diri otù ọnu-uzọ, ibo-ọnu-uzọ abua di-kwa-ra ọnu-uzọ nke-ọzọ.

25 Ihe emere n’elu ha, bú n’elu ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Chineke, bu kwa cherubim na nkwu, dika nke emere n’elu mb͕idi-ya nile; nbata-uzọ nke osisi di kwa n’iru uzọ-nbata-ya n’èzí.

26 Window emechiri emechi na nkwu di kwa n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ, n’akuku nile nke uzọ-nbata: otù a ka ulo ntà akuku nile nke ulo ahu na nbata-uzọ-ya nile di.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 42

1 O we me ka m’puta ba n’ogige ahu di n’èzí, n’uzọ ahu nke di n’uzọ Ugwu: o we me ha m’ba n’ime-ulo ahu nke di na ncherita-iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, nke di kwa na ncherita-iru ulo ahu anēwu ewu n’akuku Ugwu.

2 N’iru ogologo nke ọgu cubit ise ka ọnu-uzọ nke Ugwu di, obosara-ya di kwa ọgu cubit abua na iri.

3 Na ncherita-iru orú cubit ahu nke diri ogige di nime, na na ncherita-iru pavement nke diri ogige di n’èzí, ka ulo-njeghari nke nēche iru n’ulo-njeghari ọzọ di n’okpukpu atọ.

4 N’iru ime-ulo nile ka otù uzọ-njeghari di, nke di cubit iri n’obosara n’ime, ọ bu uzọ nke di otù cubit: ọnu-uzọ nile ha chere iru n’Ugwu.

5 Ma ime-ulo nke kachasi elu di nkpunkpu kari: n’ihi na ulo-njeghari nēbipu ihe na ndia, kari nke ha nēbipu n’ime-ulo di ala ma-ọbu n’ime-ulo etiti, n’ulo ahu anēwu ewu.

6 N’ihi na okpukpu atọ ka ha di, ha enweghi kwa ogidi dika ogidi nke ogige abua ahu: n’ihi nka emere ka ime-ulo nke kachasi elu di nkpa kari nke di ala na nke etiti site n’ala.

7 Ma mb͕idi nke di n’èzí n’akuku ime-ulo nile, n’uzọ ogige di n’èzí n’iru ime-ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri.

8 N’ihi na ogologo nke ime-ulo nke diri ogige di n’èzí di ọgu cubit abua na iri: ma, le, n’iru ulo uku Chineke ọ di ọgu cubit ise.

9 Site kwa n’okpuru ime-ulo ndia ka nbata di n’akuku Iru-anyanwu, ebe anēsi n’ogige di n’èzí abata nime ha.

10 N’ib͕idi nke mb͕idi ogige n’uzọ Iru-anyanwu, n’iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n’iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di.

11 Uzọ nke di n’iru ha di kwa ka uzọ nke ime-ulo nke di n’uzọ Ugwu si di n’ile ha anya; dika ogologo-ha si di, otú a ka obosara-ha di: ọpùpù nile ha di ka ikpé nile ha si di, na dika ọnu-uzọ nile ha si di.

12 Ma dika ọnu-uzọ nile nke ime-ulo nile si di nke di n’uzọ Ndida, otú a ka otù ọnu-uzọ si di nke di n’isi uzọ, bú uzọ nke di n’iru mb͕idi n’uzọ Iru-anyanwu, ebe anābà nime ha.

13 O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n’iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n’ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n’ihi na ebe ahu di nsọ.

14 Mb͕e ndi-nchu-àjà nābà nime, ha agaghi-esi kwa n’ebe nsọ ahu puta n’ogige di n’èzí, kama n’ebe ahu ka ha gāwusa uwe-ha nke ha ji eje ozi; n’ihi na ihe nsọ ka ha bu: ha ewe yiri uwe ọzọ we biarue ihe diri ndi-ha.

15 Ma mb͕e ọ tùzusiri ulo ime-ime, o we me ka m’puta n’uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu nke iru-ya di n’uzọ Iru-anyanwu, o we tùa ya buruburu n’akuku nile.

16 O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Iru-anyanwu nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya buruburu.

17 O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Ugwu buruburu, nnù ami na ọgu ise.

18 Akuku Ndida ka ọ tùru, nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya.

19 O chigharia n’akuku Ọdida-anyanwu, were ami o ji atù ihe tùa ya, nnù ami na ọgu ise.

20 N’akuku anọ ka ọ tùru ya: o nwere mb͕idi buruburu n’akuku nile, ogologo-ya di nnù na ọgu ise, obosara-ya di kwa nnù na ọgu ise, ikpa ókè n’etiti ihe di nsọ na ihe emere ka ọ ghara idi nsọ.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 43

1 O we me ka m’jerue ọnu-uzọ-ama ahu, bú ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n’uzọ Iru-anyanwu:

2 ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n’uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n’ebube-Ya.

3 Ọ di kwa ka ọhù nke m’huru si di n’ile ya anya, dika ọhù m’huru mb͕e m’biara ibibi obodo ahu; ọhù nile di kwa ka ọhù ahu nke m’huru n’akuku osimiri Keba: m’we da kpuchie irum n’ala.

4 Ebube nke Jehova we bata nime ulo-Ya n’uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke iru-ya di n’uzọ Iru-anyanwu.

5 Mọ Chineke we buliem elu, me ka m’bata n’ogige di nime; ma le, ebube nke Jehova juputara n’ulo ahu.

6 M’we nu olu otù onye nāgwam okwu site n’ulo ahu; otù nwoke nēguzo kwa n’akukum.

7 O we sim, Nwa nke madu, nka bu ebe nke oche-ezem, na ebe nke ọbu-ukwu nke ukwum abua, ebe M’gēbi n’etiti umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: ulo Israel agaghi-emeru kwa aha nsọm ọzọ, ha onwe-ha, ma-ọbu ndi-eze-ha, site n’ikwa-iko-ha, na site n’ozu nile nke ndi-eze-ha n’ebe di elu ha;

8 mb͕e ha nētiye nbata-uzọ-ha n’akuku nbata-uzọ nkem, na akuku-ọnu-uzọ-ha n’akuku akuku-ọnu-uzọ nkem, ọ bu kwa nání mb͕idi di n’etiti mu na ha; ha emeruwo kwa aha nsọm site n’ihe-árú-ha nile nke ha meworo: M’we ripia ha n’iwem.

9 Ub͕u a ka ha wezuga ikwa-iko-ha na ozu nile nke ndi-eze-ha n’ebe di anya n’ebe M’nọ, M’gēbi kwa n’etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

10 Gi onwe-gi, nwa nke madu, gosi ulo Israel ulo a, ka ihere ajọ omume nile ha we me ha: ka ha tù kwa ọtùtù-ya.

11 Ọ buru kwa na ihere ihe nile ha meworo eme ha, gi me ka ha mara òmùmò ulo a, na ọtùtù-ya, na ọpùpù-ya nile, na nbata-ya nile, na òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, na òmùmò-ya nile, na iwu-ya nile, de kwa ha n’akwukwọ n’anya-ha: ka ha we debe òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, me ha.

12 Nka bu iwu ulo a: n’elu ugwu-ya ókè-ala-ya nile buruburu n’akuku nile di nsọ kachasi ebe nsọ nile. Le, nka bu iwu ulo a.

13 Ma ndia bu ọtùtù ebe-ichu-àjà nime cubit: (cubit ahu bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka:) ala-ya bu otù cubit, ọ bu kwa otù cubit ka obosara-ya di, ókè-ya n’ọnu-ọnu-ya buruburu bu kwa otù ntù-aka: nka bu kwa ebe-ndọkwasi ebe-ichu-àjà nka.

14 Site n’ala-ya nke di n’ala rue ngwe di ala di cubit abua, obosara-ya di kwa otù cubit; ma site na ngwe dikari ntà rue ngwe dikari uku di cubit anọ, obosara-ya di kwa otù cubit.

15 Ebe-ichu-àjà onwe-ya di kwa cubit anọ; site n’ebe-ichu-àjà we rigo ka mpi anọ di kwa.

16 Ebe-ichu-àjà di cubit iri na abua n’ogologo-ya, na cubit iri na abua n’obosara-ya, ọ rara nrata n’akuku anọ ya rara nrata.

17 Ngwe-ya di kwa cubit iri na anọ n’ogologo-ya, na cubit iri na anọ n’obosara-ya n’akuku anọ ya rara nrata, ókè nke di ya buruburu di kwa nkera cubit; ala o nwere di kwa otù cubit buruburu; ihe-nrigo-ya nēche iru n’Iru-anyanwu.

18 O we sim, Nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ndia bu ukpuru nke ebe-ichu-àjà nkem n’ubọchi ha gēme ya, isure àjà-nsure-ọku n’elu ya, na iwusa ọbara n’elu ya.

19 I gēnye kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai ndi sitere na nkpuru Zedok, ndi dim nso, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ijerem ozi, nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie.

20 I gēwere kwa ufọdu n’ọbara-ya, tiyekwasi na mpi anọ ya, na n’elu nkuku anọ nke ngwe-ya, na n’ókè-ya buruburu: i we wepu nmehie-ya, kpuchie nmehie-ya.

21 I gēwere kwa oke-ehi nke àjà-nmehie ahu, ọ gēsure kwa ya n’ebe eleputara eleputa nke ulo a, n’èzí ebe nsọ a.

22 Ma n’ubochi nke-abua i gēweta nkpi nke zuru okè ibu àjà-nmehie; ha gēwepu kwa nmehie nke ebe-ichu-àjà, dika ha si were oke-ehi wepu nmehie-ya.

23 Mb͕e i wepusiri nmehie-ya, i gēweta nso nwa-oke-ehi nke zuru okè, na ebulu nke zuru okè site n’ìgwè ewu na aturu-gi.

24 I gēweta kwa ha nso n’iru Jehova, ndi-nchu-àjà gātusa kwa ha nnú, sure ha ọku, ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

25 Ubọchi asa ka i gēdozi otù ewu kwa-ubọchi ibu àjà-nmehie: ọ bu kwa nwa-oke-ehi, na ebulu nke sitere n’ìgwè ewu na aturu, bú anu zuru okè, ka ha gēdozi.

26 Ubọchi asa ka ha gēkpuchi nmehie nke ebe-ichu-àjà, me ka ọ di ọcha; ha ewe mejue ya aka.

27 Mb͕e ha debezusiri ubọchi asa ahu, ọ gēru kwa, n’ubọchi nke-asatọ, we ga n’iru, na ndi-nchu-àjà ganēme àjà-nsure-ọku nile unu na àjà-udo nile unu n’elu ebe-ichu-àjà; ihe-unu gātọkwam utọ; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 44

1 O we me ka m’laghachi n’uzọ ọnu-uzọ-ama nke ebe nsọ ahu nke di n’èzí, nke nēche iru n’Iru-anyanwu; ma ọnu-uzọ-ama ahu bu nke emechiri emechi.

2 Jehova we sim, Ọnu-uzọ nka gābu ihe emechiri emechi, agaghi-emeghe ya, ọ dighi kwa onye ọ bula gēsi ya bata, n’ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, esiwo ya bata; o we buru ihe emechiri emechi.

3 Ma onye-isi-unu, dika onye-isi ka ya onwe-ya gānọdu ala nime ya iri nri n’iru Jehova; ọ gēsi uzọ nke uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama nka bata, si kwa uzọ-ya pua.

4 O we me ka m’bia n’uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu n’iru ulo ahu; m’we hu, ma le, ebube Jehova juputara ulo Jehova: m’we da kpuchie irum n’ala.

5 Jehova we sim, Nwa nke madu, tukwasi obi-gi, were anya-gi abua hu, were nti-gi abua nu ihe ahu nile nke Mu onwem nāgwa gi bayere ukpuru nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra iwu-ya nile; tukwasi kwa obi-gi na nbata ulo a, ya na ọpupu nile nke ebe nsọ a.

6 I gāsi kwa ndi nānupu isi, bú ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, site n’ihe-árú nile unu,

7 ebe unu meworo ka ndi ala ọzọ bata, bú ndi anēbighi úgwù n’obi anēbighi kwa úgwù n’anu-aru, inọ n’ebe nsọm, ime ka ọ ghara idi nsọ, bú ulom, mb͕e unu nēweta nrim nso, bú abuba na ọbara, ha we mebie ọb͕ub͕a-ndum, tiyere ihe-árú nile unu.

8 Unu edebeghi kwa ihe-ndebe nke ihe nsọm nile: unu we do ha ndi nēdebe ihe-ndebem n’ebe nsọm nye onwe-unu.

9 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ dighi onye ala ọzọ, nke anēbighi úgwù n’obi nke anēbighi kwa úgwù n’anu-aru, gābata n’ebe nsọm, bú onye ala ọzọ ọ bula nke di n’etiti umu Israel.

10 Otú ọ di, ndi Livai ndi si n’ebe M’nọ je n’ebe di anya, mb͕e Israel kpafuru akpafu, ndi siri n’ebe M’nọ kpafue so arusi nile ha; ha aghaghi ibū kwa ajọ omume-ha.

11 Ma ha gābu ndi nēje ozi n’ebe nsọm, ndi-nlekọta n’ọnu-uzọ-ama nile nke ulo nkem, nēje kwa ozi n’ulo ahu: ha onwe-ha gēb͕uru ndim anu àjà-nsure-ọku-ha na nke àjà ọzọ ha, ha onwe-ha gēguzo kwa n’iru ha ijere ha ozi.

12 N’ihi na ha nējere ha ozi n’iru arusi nile ha, we ghọrọ ulo Israel ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume; n’ihi nka ka M’weliri akam imegide ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ha gēbu kwa ajọ omume-ha.

13 Ma ha agaghi-abiakutem nso, iburum ndi-nchu-àjà, na ibiaru ihe nsọm nile nso, bú ihe nile di nsọ kachasi ihe nsọ nile: ma ha gēbu ọnọdu-ihere-ha, na ihe-árú nile ha nke ha meworo.

14 Ma M’gēme ha ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a, ifè òfùfè-ya nile, na ime ihe ọ bula nke agēme nime ya.

15 Ma ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, umu Zedok, ndi debere ihe-ndebe nke ebe nsọm mb͕e umu Israel siri n’ebe M’nọ kpafue, ndi ahu gābiakutem nso ijerem ozi; ha gēguzo n’irum iweta nsom abuba na ọbara; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta:

16 ha onwe-ha gābata n’ebe nsọm, ha onwe-ha gābiaru kwa table nkem nso, ijerem ozi, ha gēdebe kwa ihe-ndebem.

17 O gēru kwa, mb͕e ha batara n’ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime, na ọ bu uwe flax ka ha gēyi; ọ dighi kwa uwe aji-anu gābiakwasi n’aru ha, mb͕e ha nēje ozi n’ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime, na nime ulo.

18 Ihe-ike-n’isi nke flax gādi n’isi-ha, uwe-ukwu nke flax gādi kwa n’úkwù-ha, ha agaghi-eji ihe nākpata ọsusọ ke onwe-ha n’úkwù.

19 Ma mb͕e ha nāpu n’ogige di n’èzí, bú ogige di n’èzí ipukuru ndi Israel, ha gēyipu uwe nile ha, nke onwe-ha nēje ozi nime ha, ha gādọba kwa ha n’ime-ulo nsọ ndia, yiri uwe ọzọ, ka ha we ghara iji uwe-ha do ndi Israel nsọ.

20 Ha agaghi-akọpu kwa isi-ha, ha agaghi-eme kwa ka agiri-isi-ha to ogologo; nání nkpacha ka ha gākpacha isi-ha.

21 Ọ dighi kwa manya-vine onye-nchu-àjà ọ bula gāṅu, mb͕e ha nābata n’ogige di nime.

22 Ọ dighi kwa nwanyi nke di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi nke achupuru achupu, ka ha gālu na nwunye: kama umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ndi sitere na nkpuru ulo Israel, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru nke bu nwunye onye-nchu-àjà nwuru anwu, ka ha gālu.

23 Ọ bu kwa ndim ka ha gēzí ihe di iche n’etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ọ bu kwa ihe di iche n’etiti ihe di ọcha na ihe ruru árú ka ha gēme ka ha mara.

24 Ọzọ, n’ise-okwu ọ bula ndi ahu gēguzo ikpe ikpe; ikpém nile ka ha gēji kpe ya: ọ bu kwa iwum nile na ukpurum nile nime mb͕em nile akara àkà ka ha gēdebe; ubọchi-izu-ikem nile ka ha gēdo nsọ.

25 Ọ dighi kwa madu nke nwuru anwu ka ha gābiaru nso imeru onwe-ha: ma otú ọ di, ha gēmeru onwe-ha n’ihi nna, na n’ihi nne, na n’ihi nwa-nwoke, na n’ihi nwa-nwanyi, na n’ihi nwa-nne-nwoke, na n’ihi nwa-nne-nwanyi nke nēnweghi di.

26 Mb͕e emesiri ka ọ di ọcha, ọ bu kwa ubọchi asa ka agāguru ya.

27 Ma n’ubọchi ọ gābata n’ebe nsọ, n’ogige di nime, ije ozi n’ebe nsọ, ọ gēweta àjà-nmehie-ya nso; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

28 Ọ gāghọ-kwa-ra na ihe-nketa; Mu onwem bu ihe-nketa-ha: ọ dighi kwa ihe-onwunwe unu gēnye ha n’Israel; Mu onwem bu ihe-onwunwe-ha.

29 Onyinye-inata-iru-ọma na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma ka ndi ahu gēri; ọzọ, ihe nile ọ bula nke ewezugara nye Chineke n’Israel, ha gēnwe ya.

30 Ọzọ, ihe mbu nke nkpuru mbu nile nke ihe ọ bula, àjà-nbuli ọ bula nke ihe ọ bula, site n’àjà-nbuli nile unu, ndi-nchu-àjà gēnwe ya: ọ bu kwa utu ọka mbu unu ka unu gēnye onye-nchu-àjà, ime ka ngọzi dakwasi n’ulo-gi.

31 Ihe ọ bula nke nwuru n’onwe-ya, na ihe adọb͕uru adọb͕u, ma ọ bu anu-ufe ma-ọbu anumanu, ndi-nchu-àjà agaghi-eri ya.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 45

1 Ma mb͕e unu gēme ka ala-unu dayere onwe-unu n’ihe-nketa, unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli, bú otù òkè di nsọ nke ala ahu: ogologo-ya gādi orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n’ogologo, obosara-ya gādi kwa orú nnù na nnù ise: ihe nsọ ka ọ gābu n’ókè-ala-ya nile buruburu.

2 Site n’ala nka nnù ami na ọgu n’ogologo na nnù na ọgu ise n’obosara gādiri ebe nsọm, ọ gēnwe akuku anọ rara nrata buruburu; ma ọgu cubit abua na iri gāburu ya ebe-ita-nri buruburu.

3 Site n’ọtùtù a ka i gātù kwa, ogologo nke gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, na obosara nke gādi orú nnù ami na nnù ise: ọ bu kwa nime ya ka ebe nsọ, nke bu ebe di nsọ kachasi ebe nsọ nile, gādi.

4 Òkè nsọ nke ala ahu ka ọ bu; ndi-nchu-àjà, bú ndi-oje-ozi nke ebe nsọ, gēnwe ya, bú ndi nābia nso ijere Jehova ozi; ọ gābu-kwa-ra ha ebe ulo nile ha gādi, na ebe nsọ diri ebe nsọ nkem.

5 Orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n’ogologo, na orú nnù ami na nnù ise n’obosara, gādiri ndi Livai, bú ndi-oje-ozi nke ulom, ighọrọ ha ihe-onwunwe, orú ime-ulo.

6 Ihe-onwunwe nke obodo a ka unu gēnye kwa, nnù ami iri-na-abua na ọgu iri ka obosara-ya gādi, ogologo-ya gādi kwa orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, n’akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ: ulo Israel nile gēnwe ya.

7 Ihe onye-isi-unu nwere gādi kwa n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo a, n’iru àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na n’iru ihe-onwunwe nke obodo a, n’akuku Ọdida-anyanwu chere iru n’Ọdida-anyanwu, na n’akuku Iru-anyanwu chere iru n’Iru-anyanwu: ogologo-ya gādi kwa n’akuku otù nime òkè ndia, site n’ókè-ala Ọdida-anyanwu rue ókè-ala Iru-anyanwu.

8 N’ala nka ọ gāburu ya ihe-onwunwe n’Israel: ndi-isim agaghi-eme kwa ndim ihe-ike ọzọ; kama ala nka ka ha gēnye ulo Israel dika ebo nile ha si di.

9 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n’ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n’aru ndim; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

10 Ihe-osìsì ziri ezi, na ephah ziri ezi, na bath ziri ezi, ka unu gēnwe.

11 Ephah na bath gābu otù ọtùtù, ka bath we ruta otù uzọ n’uzọ iri nke homer, ka ephah we ruta kwa otù uzọ n’uzọ iri nke homer: dika homer si di, otú a ka ọtùtù-ya gādi.

12 Shekel gābu kwa orú gerah: orú shekel, orú shekel na ise, shekel iri na ise, ka maneh-unu gābu.

13 Nka bu àjà-nbuli nke unu gēbuli; otù uzọ n’uzọ isi nke ephah site na homer nke ọka wheat, unu gēnye kwa otù uzọ n’uzọ isi nke ephah site na homer nke ọka barley:

14 òkè manu, bú nke bath nke manu, gābu kwa otù uzọ n’uzọ iri nke bath sitere na cor, nka bu bath iri, ọbuná otù homer; n’ihi na bath iri bu otù homer:

15 na otù nwa-aturu nke sitere n’ìgwè ewu na aturu, bú nke sitere n’ọgu umu-aturu iri, site n’ebe-ita-nri nke Israel nke miri nēde nke-ọma; ibu onyinye-inata-iru-ọma, na ibu àjà-nsure-ọku, na ibu àjà-udo, ikpuchiri ha nmehie; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

16 Ndi nile nke ala nka gādi n’àjà-nbuli a diri onye-isi n’Israel.

17 Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n’ememe nile, na n’ọnwa ọhu nile, na n’ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha.

18 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ọnwa mbu, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, i gēwere nwa-oke-ehi nke zuru okè; i gēwepu kwa nmehie nke ebe nsọm.

19 Onye-nchu-ajam gēwere ufọdu n’ọbara àjà-nmehie ahu, tiye ya n’akuku-ọnu-uzọ nke ulo a, na n’ebe nkuku anọ nke ngwe diri ebe-ichu-àjà nka, na n’elu akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime.

20 Ọ bu kwa otú a ka i gēme n’ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n’amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya.

21 N’ọnwa mbu, n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, ka unu gēnwe ememe ngabiga, bú ememe nke ubọchi asa; achicha ekoghi-eko ka agēri.

22 Onye-isi gēdozi kwa n’ubọchi ahu otù oke-ehi n’ọnọdu onwe-ya na n’ọnọdu ndi nile nke ala nka, ibu àjà-nmehie.

23 N’ubọchi asa nke ememe ahu ọ ganēdozi àjà-nsure-ọku ichuru Jehova, bú oke-ehi asa na ebulu asa nke zuru okè, kwa-ubọchi n’ubọchi asa ahu; na àjà-nmehie, bú otù nkpi, kwa-ubọchi.

24 Onyinye-inata-iru-ọma ka ọ gēdozi kwa, bú otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, otù hin nke manu di-kwa-ra otù ephah.

25 N’ọnwa nke-asa, n’ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, n’ememe ahu, ka ọ ganēme dika ihe ndia si di n’ubọchi asa ya; dika àjà-nmehie, na dika àjà-nsure-ọku, na dika onyinye-inata-iru-ọma, na dika manu.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 46

1 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche iru n’Iru-anyanwu gābu ihe emechiri emechi n’ubọchi ọlu isi unu; ma n’ubọchi-izu-ike ka agēmeghe ya, ọ bu kwa n’ubọchi nke ọnwa ọhu ka agēmeghe ya.

2 Onye-isi gēsi kwa n’uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama n’èzí bata, guzo n’akuku akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, ndi-nchu-àjà gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya, na àjà-udo-ya nile, ọ gākpọ kwa isi ala na nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, we pua: ma agaghi-emechi ọnu-uzọ-ama rue anyasi.

3 Ndi ala nka gākpọ kwa isi ala n’oghere ọnu-uzọ-ama ahu n’iru Jehova n’ubọchi-izu-ike nile, na n’ọnwa ọhu nile.

4 Ma àjà-nsure-ọku nke onye-isi gēweta nso Jehova n’ubọchi-izu-ike bu umu-aturu isi zuru okè na otù ebulu zuru okè;

5 onyinye-inata-iru-ọma bu kwa otù ephah bayere ebulu ahu, ọ gētiye kwa n’umu-aturu onyinye-inata-iru-ọma, bú onyinye nke aka-ya, ya na manu, otù hin diri otù ephah.

6 Ma n’ubọchi ọnwa ọhu ọ gābu nwa-oke-ehi zuru okè, na umu-aturu isi, na otù ebulu, ihe zuru okè ka ha gābu:

7 ọ bu kwa otù ephah etiyere n’oke-ehi ahu, na otù ephah etiyere n’ebulu ahu, na ihe etiyere n’umu-aturu ahu dika aka-ya gēru, na manu, otù, hin otù ephah, ka o gēji dozie onyinye-inata-iru-ọma.

8 Ma mb͕e onye-isi-unu gābata, uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama ahu ka ọ gēsi bata, ọ bu kwa uzọ-ya ka ọ gēsi pua.

9 Ma mb͕e ndi ala nka gābia n’iru Jehova nime mb͕e di iche iche akara àkà, onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu bata ikpọ isi ala gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida pua; ma onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida bata gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu pua: ọ gaghi-esi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke o siri bata laghachi, kama otù iru ahu ka ọ gāpu.

10 Ma onye-isi, ọ bu n’etiti ha, mb͕e ha nābata, ka o gēso bata; ọzọ, mb͕e ha nāpu, ha gāpu n’otù.

11 Ọzọ, n’ememe nile na nime mb͕e nile akara àkà onyinye-inata-iru-ọma gābu otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, ọ gētiye kwa n’umu-aturu onyinye aka-ya, na manu, otù hin otù ephah.

12 Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n’Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n’ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri.

13 Ọzọ, otù nwa-aturu nke b͕ara otù arọ nke zuru okè ka i gēdozi ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova kwa-ubọchi: kwa-ututu kwa-ututu ka i gēdozi ya.

14 I gēdozi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma kwa-ututu kwa-ututu, otù uzọ n’uzọ isi nke otù ephah, na manu, otù uzọ n’uzọ atọ nke otù hin, iji gwọ utu ọka flour; ọ bu onyinye-inata-iru-ọma anēnye Jehova mb͕e nile n’ukpuru ebighi-ebi.

15 Otú a ka ha gēdozi nwa-aturu ahu, na onyinye-inata-iru-ọma ahu, na manu ahu, kwa-ututu kwa-ututu, ibu àjà-nsure-ọku mb͕e nile.

16 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e onye-isi gēnye onye ọ bula n’umu-ya ndikom onyinye, ihe-nketa-ya ka ọ bu, umu-ya ndikom gēnwe ya; ihe-onwunwe-ha ka ọ bu n’ihe-nketa.

17 Ma mb͕e ọ gēnye otù onye nime ndi-orù-ya onyinye nke sitere n’ihe-nketa-ya, ọ gābu kwa nke ya rue arọ izilaga orù ka o nwere onwe-ya; onyinye ahu we laghachikute onye-isi; nání na ihe-nketa-ya, bú ihe-nketa umu-ya ndikom, nke ha ka ọ gābu.

18 Ọzọ, onye-isi agaghi-ewere ihe ọ bula n’ihe-nketa nke ndim, inapu ha ihe-nketa-ha n’ike; ihe nke si n’ihe-onwunwe-ya puta ka ọ gēme ka umu-ya ndikom keta: ka ndim we ghara ib͕asa, onye ọ bula ọ pua n’ihe-onwunwe-ya.

19 O we me ka m’si na nbata ahu nke di n’akuku ọnu-uzọ-ama ahu bata n’ime-ulo nsọ nile nke ndi-nchu-àjà, nke nēche iru n’Ugwu; ma le, n’ebe ahu ka otù ebe di n’azu ya chere iru n’Ọdida-anyanwu.

20 O we sim, Nka bu ebe ahu ebe ndi-nchu-àjà gēsi anu àjà-ikpe-ọmuma na anu àjà-nmehie, ebe ha gēsi onyinye-inata-iru-ọma; ka ha we ghara iweputa ha n’ogige di n’èzí, ido ndim nsọ.

21 O we me ka m’puta ba n’ogige di n’èzí, o we me ka m’gabiga na nkuku anọ nke ogige ahu; ma, le, otù ogige di na nkuku ọ bula nke ogige ahu n’otù n’otù.

22 Nime nkuku anọ nke ogige ahu ka ogige di nke ejikọtara ejikọta, ọgu cubit abua n’ogologo, orú cubit na iri n’obosara: otù ọtùtù diri ha anọ nime nkuku anọ ahu.

23 Ọzọ, otù ariri ulo di buruburu nime ha, buruburu ha anọ, bú ulo ewuru nwere ebe-isi-ite n’okpuru ariri nile buruburu.

24 O we sim, Ndia bu ulo nke ndi nēsi ite, ebe ndi-oje-ozi nke ulo a gēsi anu àjà ndi Israel.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 47

1 O we me ka m’laghachi rue ọnu-uzọ ulo ahu; ma, le, miri nēsi n’okpuru nbata-uzọ nke ulo ahu n’akuku Iru-anyanwu puta, n’ihi na iru ulo ahu di n’Iru-anyanwu: miri ahu nēsi kwa n’okpuru rùda, site n’akuku aka-nri nke ulo ahu, site n’akuku Ndida nke ebe-ichu-àjà.

2 O we me ka m’si uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu n’akuku Ugwu puta, o we me ka m’ga buruburu n’uzọ di n’èzí rue ọnu-uzọ-ama di n’èzí, n’uzọ nke nēche iru n’Iru-anyanwu; ma le, miri nēsi n’akuku aka-nri rùputa nke-ntà nke-ntà.

3 Mb͕e nwoke ahu puru ga n’Iru-anyanwu jide eriri n’aka-ya, o we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m’gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru nkwonkwo-ukwu.

4 O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m’gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru ikperè-ukwu. O we tùa nnù cubit abua na ọgu íri, me ka m’gabiga, ọ bu miri nke ruru úkwù.

5 O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri; ọ bu osimiri nke m’nāpughi igabiga: n’ihi na miri ahu etowo eto, buru miri ogwugwu, osimiri nke anāgaghi-agabiga.

6 O we sim, Ì huwo nka, nwa nke madu? O we me ka m’je, ọ we me ka m’laghachi n’usọ osimiri ahu.

7 Mb͕e m’laghachiri, le, n’usọ osimiri ahu ka ọtutu osisi nke bara uba nke-uku di, n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ.

8 O we sim, Miri ndia nāpu ga na buruburu-ala Iru-anyanwu, ha we rùda n’Araba, rùrue oké osimiri ahu; nime oké osimiri ahu ka miri ahu nke anēme ka ha puta gērùbà; ewe gwọ miri-ya.

9 Ọ gēru kwa, na anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu gādi ndu, bú nke nēnuputa enuputa, n’ebe ọ bula osimiri abua ndia gērute; azù nke bara uba nke-uku gādi kwa: n’ihi na miri ndia eruwo n’ebe ahu, ewe gwọ miri nke oké osimiri ahu, ihe nile ọ bula gādi kwa ndu n’ebe osimiri ahu gērute.

10 Ọ gēru kwa, na ndi-ọkù gēguzo n’akuku ya: site n’En-gedi we rue En-eglaim gābu ebe ib͕asa ub͕u; iche iche ka azù-ha gādi, dika azù oké osimiri uku, bara uba nke-uku.

11 Ma ebe-ya nile nke bu nání apiti, na ọdọ-miri-ya nile, agaghi-agwọ ha; nnú ka agārara ha nye.

12 Ọ bu kwa n’osimiri ahu, n’usọ-ya, n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n’ihi na miri-ya, n’ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.

13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Nka gābu ókè-ala, nke unu gēsi ketara onwe-unu ala nka dika ebo iri na abua nke Israel si di: Josef gēnweta òkè ala di iche iche.

14 Unu gēketa kwa ya, otù onye dika nwa-nne-ya; n’ihi na ewelirim akam inye ya nna-unu-hà: ala nka gādaye n’aka-unu n’ihe-nketa.

15 Nka gābu kwa ókè-ala nke ala-unu: n’akuku Ugwu, site n’oké osimiri uku, n’uzọ Hetlon, rue nbata Zedad;

16 Hemat, Berota, Sibraim, nke di n’etiti ókè-ala Damaskọs na ókè-ala Hemat; Haza-hatikon, nke di n’ókè-ala Hauran.

17 Ókè-ala site n’oké osimiri gābu kwa Haza-inon n’ókè-ala Damaskọs, ma n’Ugwu n’akuku Ugwu bu ókè-ala Hemat. Nka bu kwa akuku Ugwu.

18 Ma akuku Iru-anyanwu, site n’etiti Hauran na Damaskọs na Gilead, na ala Israel, gābu Jọdan; site n’ókè-ala Ugwu rue oké osimiri nke Iru-anyanwu ka unu gātù. Nka bu kwa akuku Iru-anyanwu.

19 Ma akuku Ndida nke nēche iru na Ndida gēsite na Tema rue miri Meribot-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. Nka bu kwa akuku Ndida nēche iru na Negeb.

20 Ma akuku Ọdida-anyanwu gābu oké osimiri uku, site n’ókè-ala Ndida rue na ncherita-iru nbata Hemat. Nka bu akuku Ọdida-anyanwu.

21 Unu ewe ketara onwe-unu ala nka dika ebo nile nke Israel si di.

22 Ọ gēru kwa, na unu gēme ka ọ dayere unu n’ihe-nketa, ka ọ daye-kwa-ra ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n’etiti unu, ndi muworo umu n’etiti unu: ha gādi kwa unu dika ndi amuru n’ala n’etiti umu Israel; ha gēso unu dabà n’ihe-nketa n’etiti ebo nile nke Israel.

23 Ọ gēru kwa na, n’ebe ahu nke ọbìa nọ dika ọbìa nime ya, n’ebe ahu ka unu gēnye ya ihe-nketa-ya; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 48

1 Ma ndia bu aha ebo nile: site na nsọtu Ugwu, n’akuku uzọ Hetlon rue nbata Hemat, Haza-inon n’ókè-ala Damaskọs, n’akuku Ugwu n’akuku Hemat; ọ gēnwe kwa akuku Iru-anyanwu na nke Ọdida-anyanwu; Dan, otù òkè.

2 N’akuku ókè-ala Dan, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Asha, otù òkè.

3 N’akuku ókè-ala Asha, site n’akuku Iru-anyanwu we rue akuku Ọdida-anyanwu; Naftali, otù òkè.

4 N’akuku ókè-ala Naftali, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Manase, otù òkè.

5 N’akuku ókè-ala Manase, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Efraim, otù òkè.

6 N’akuku ókè-ala Efraim, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Reuben, otù òkè.

7 N’akuku ókè-ala Reuben, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku ọdida-anyanwu; Juda, otù òkè.

8 Ma n’akuku ókè-ala Juda, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu, ka àjà-nbuli nke unu gēbuli gādi, orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri bu obosara-ya, ogologo-ya gādi kwa ka otù nime òkè ndia, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu: ebe nsọ Chineke gādi kwa n’etiti ya.

9 Àjà-nbuli ahu nke unu gēbuliri Jehova, ogologo-ya gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara-ya gādi kwa orú nnù ami na nnù ise.

10 Ọ bu kwa ndia, bú ndi-nchu-àjà, gēnwe àjà-nbuli nsọ ahu; n’akuku Ugwu orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n’ogologo, n’akuku Ọdida-anyanwu obosara-ya di orú nnù na nnù ise, n’akuku Iru-anyanwu obosara-ya di orú nnù ise, n’akuku Ndida ogologo-ya di orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri: ebe nsọ nke Jehova gādi kwa n’etiti ya.

11 Ọ gādiri ndi-nchu-àjà ndi edoworo nsọ site n’umu Zedok, ndi debeworo ihe-ndebem; ndi nākpafughi mb͕e umu Israel kpafuru akpafu, dika ndi Livai kpafuru.

12 Ọ gābu-kwa-ra ha àjà-nbuli sitere n’àjà-nbuli nke ala nka, ihe di nsọ kachasi ihe nsọ nile, n’ókè-ala ndi Livai.

13 Ma n’akuku ókè-ala ndi-nchu-àjà, ka ndi Livai gēnwe orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n’ogologo, obosara-ya gādi orú nnù na nnù ise. Ogologo nile gādi orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara gādi kwa orú nnù na nnù ise.

14 Ha agaghi-erepu ihe ọ bula nime ya, ha agaghi-ab͕anwe kwa ya, agaghi-eme kwa ka nkpuru mbu ala ahu gabiga n’ebe ọzọ: n’ihi na ihe nsọ ka ọ buru Jehova.

15 Ma nnù ami iri-na-abua na ọgu iri nke fọduru n’obosara-ya, n’iru orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu, ihe nādighi nsọ ka ọ gābu, ọ gādiri obodo Jerusalem, ibu ebe-obibi na ibu ebe-ita-nri: obodo gādi kwa n’etiti ya.

16 Ma ndia gābu ọtùtù-ya; akuku Ugwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, akuku Ndida nnù iri-na-otù na ọgu ise, n’akuku Iru-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, na akuku Ọdida-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise.

17 Ebe-ita-nri ka obodo ahu gēnwe kwa; n’akuku Ugwu ọgu ami iri-na-abua na iri, n’akuku Ndida ọgu iri-na-abua na iri, n’akuku Iru-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri, n’akuku Ọdida-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri.

18 Ma nke fọduru n’ogologo-ya, n’akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, gādi orú nnù ami na nnù ise n’akuku Iru-anyanwu, na orú nnù na nnù ise n’akuku Ọdida-anyanwu: ọ gādi kwa n’akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ; ihe-ọmume-ya gābu-kwa-ra ndi nēfè obodo òfùfè nri.

19 Ọ bu kwa ndi nēfè obodo òfùfè gālu ya ubi, bú ndi sitere n’ebo nile nke Israel.

20 Àjà-nbuli ahu nile gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n’ogologo, na orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n’obosara: ihe nke nwere akuku anọ rara nrata, otú a ka unu gēbuli àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, tiyere ihe-onwunwe nke obodo.

21 Ma nke fọduru gādiri onye-isi, n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo, n’iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri nke àjà-nbuli ahu rue ókè-ala Iru-anyanwu, na n’akuku Ọdida-anyanwu n’iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu rue ókè-ala Ọdida-anyanwu, n’akuku òkè nile, ọ gādiri onye-isi: àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na ebe nsọ nke ulo Chineke gādi kwa n’etiti ya.

22 Ọzọ, site n’ihe-onwunwe nke ndi Livai, site kwa n’ihe-onwunwe nke obodo, n’etiti ala nke onye-isi nwere, n’etiti ókè-ala Juda na ókè-ala Benjamin, onye-isi gēnwe nke ahu.

23 Ma ebo nile nke fọduru: site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Benjamin, otù òkè.

24 N’akuku ókè-ala Benjamin, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Simeon, otù òkè.

25 N’akuku ókè-ala Simeon, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Isaka, otù òkè.

26 N’akuku ókè-ala Isaka, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Zebulun, otù òkè.

27 N’akuku ókè-ala Zebulun, site n’akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Gad, otù òkè.

28 Ma n’akuku ókè-ala Gad, n’akuku Ndida, nke nēche iru na Ndida, ókè-ala gēsite ọbuná na Tema rue miri Meribat-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku.

29 Nka bu ala ahu nke unu gēme ka ọ dayere ebo nile nke Israel n’ihe-nketa, ọ bu kwa ndia bu òkè-ha; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

30 Ma ndia bu ọpupu obodo Jerusalem nka; n’akuku Ugwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n’ọtùtù:

31 ọnu-uzọ-ama nile nke obodo gādi ka aha ebo nile nke Israel si di; ọnu-uzọ-ama atọ n’akuku Ugwu: ọnu-uzọ-ama Reuben, otù; ọnu-uzọ-ama Juda, otù; ọnu-uzọ-ama Livai, otù:

32 n’akuku Iru-anyanwu kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise; na ọnu-uzọ-ama atọ: bú ọnu-uzọ-ama Josef, otù; ọnu-uzọ-ama Benjamin, otù; ọnu-uzọ-ama Dan, otù:

33 n’akuku Ndida kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n’ọtùtù; na ọnu-uzọ-ama atọ: ọnu-uzọ-ama Simeon, otù; ọnu-uzọ-ama Isaka, otù; ọnu-uzọ-ama Zebulun, otù:

34 n’akuku Ọdida-anyanwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise, na ọnu-uzọ-ama atọ ha: ọnu-uzọ-ama Gad, otù; ọnu-uzọ-ama Asha, otù; ọnu-uzọ-ama Naftali, otù.

35 Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n’ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n’ebe ahu.