Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 31

1 O rue, n’arọ nke-iri-na otù, n’ọnwa nke-atọ, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

2 Nwa nke madu, Si Fero, bú eze Ijipt, si kwa ìgwè ndi-ya; Ònye ka i yiri n’idi-uku-gi?

3 Le, Asiria bu osisi cedar nime Lebanon nke nwere ngalaba mara nma, na ọtutu alaka nēnye ǹdò, na ogologo di elu; ọ bu kwa n’etiti alaka b͕ara ọhia ka ọnu-ọnu-ya di.

4 Miri mere ya ka o bùe ibù, ob͕u-miri mere ya ka ọ di elu: osimiri-ya nile nāga ebe-ya akuku ihe buruburu; uzọ-miri-ya nile ka o zigara osisi nile nke ọhia.

5 N’ihi nka ka ogologo-ya di elu kari osisi nile nke ọhia; eme-kwa-ra ka ngalaba-ya ba uba, alaka-ya nile to-kwa-ra ogologo site n’ọtutu miri, mb͕e ọ waputara ha.

6 Na ngalaba-ya nile ka anu-ufe nile nke elu-igwe luru akwu, ọ bu kwa n’okpuru alaka-ya nile ka anu ọhia nile muru umu, ọ bu kwa na ǹdò-ya ka oké mba nile biri.

7 Ọ we ma nma n’idi-uku-ya, n’ogologo nke alaka-ya nile: n’ihi na nkpọrọgwu-ya adiwo n’ebe ọtutu miri di.

8 Osisi cedar nile nke di n’ubi Chineke ab͕ara ogige ezoghi ya: osisi fir nile eyighi ngalaba-ya nile, osisi plane nile adighi kwa ka alaka-ya nile; ọ dighi kwa osisi ọ bula nke di n’ubi Chineke ab͕ara ogige nke yiri ya n’ima-nma-ya.

9 Ihe nke mara nma ka M’mere ya ka ọ ghọ n’iba-uba nke alaka-ya: osisi nile nke Iden, nke di n’ubi Chineke nke ab͕ara ogige, we kwoso ya ekworo.

10 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N’ihi na i di elu n’ogologo, na n’ihi na o tiyewo ọnu-ọnu-ya n’etiti alaka b͕ara ọhia, na n’ihi na obi-ya di elu n’idi-elu-ya;

11 M’gēnye kwa ya n’aka onye di ike nke mba nile; ọ ghaghi imeso ya: n’ihi nmebi-iwu-ya ka M’chupuworo ya.

12 Ndi ala ọzọ, bú ndi kariri mba nile n’ime ka madu ma jijiji, we bipu ya, tusa ya: n’elu ugwu nile na nime ndagwurugwu nile ka alaka-ya daworo, ewe nyajie alaka-ya nile nke akwukwọ-ha kpuchiri ha n’ebe nile miri si erù nke ala-ya; ndi nile nke ala ahu esiwo kwa na ǹdò-ya rida, ha we tusa ya.

13 N’elu ihe-ya dara ada ka anu-ufe nile nke elu-igwe gēbi, ọ bu kwa n’alaka-ya nile ka anu ọhia nile gādi:

14 ka osisi nile nke miri we ghara idi elu n’ogologo-ha, ghara kwa itiye ọnu-ọnu-ha rue etiti alaka b͕ara ọhia, ka ndi-ha ndi di ike we ghara iguzo n’idi-elu-ha, bú ndi nile nāṅu miri: n’ihi na ha nile ka ewereworo nye ọnwu, ijeru ala di n’okpuru uwa, n’etiti umu nke madu, ijekuru ndi nārida n’olùlù.

15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ubọchi mb͕e ọ ridaruru n’ala-mọ emerem ka erue újú: ekpuchirim ob͕u-miri n’ihi ya, eb͕ochi-kwa-ram osimiri-ya nile, ewe b͕ochibido ọtutu miri: eme-kwa-ram ka Lebanon yiere ya uwe-nkpe, osisi nile nke ọhia tubọ-kwa-ra atubọ n’ihi ya.

16 Emerem ka mba nile me nkpatu site n’olu nke ọdida-ya, mb͕e M’mere ka ọ ridarue ala-mọ, ya na ndi nārida n’olùlù: ewe kasie osisi nile nke Iden obi n’ala di n’okpuru uwa, bú osisi arọputara arọputa kachasi kwa nma na Lebanon, ndi nile nke nāṅu miri.

17 Ha onwe-ha so-kwa-ra ya ridarue ala-mọ, jekuru ndi ejiri mma-agha b͕u; e, ndi bu ogwe-aka-ya, ndi biri na ǹdò-ya n’etiti mba nile.

18 Ònye ka i yiri otú a nime nsọpuru na n’idi-uku n’etiti osisi nile nke Iden? ma emewo ka i rida, gi na osisi nile nke Iden, rue ala di n’okpuru uwa: n’etiti ndi anēbighi úgwù ka i gēdina, gi na ndi ejiri mma-agha b͕u. Nka bu Fero-na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 32

1 O rue, n’arọ nke-iri-na-abua, n’ọnwa nke-iri-na-abua, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

2 Nwa nke madu, buliere Fero, bú eze Ijipt, abù-ákwá, si ya, Nwa-ọdum nke mba nìle ka i yiworo: ma gi onwe-gi di ka ogologo anu n’oké osimiri nile; i we waputa n’osimiri-gi nile, ji ukwu-gi, b͕arua miri, zọrua osimiri nile ha.

3 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M’gāchiri nkpọkọta ọtutu ndi di iche iche b͕asa ub͕um n’elu gi; ha gādọgota kwa gi n’ub͕um.

4 M’gātusa kwa gi n’ala-gi, n’ọhia ka M’gētufu gi, me kwa ka anu-ufe nile nke elu-igwe bekwasi gi, M’gēme kwa ka anu-ọhia nke uwa nka nile riju afọ site n’anu-aru-gi.

5 M’gētiyekwasi kwa anu-aru-gi n’ugwu nile, were kwa idi-elu-gi mejue ndagwurugwu nile.

6 M’gēde kwa ọbara-gi n’ala dika miri, bú ebe i nēgwu miri, rue ugwu nile; ebe nile miri si erù gējuputa na gi.

7 Mb͕e M’nēmenyu gi, M’gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M’gēkpuchi n’igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya.

8 Ihe nile nke nēnye ìhè n’elu-igwe ka M’gēme ka ha jie nji n’elu gi, M’gētiyekwasi kwa ọchichiri n’ala-gi; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9 M’gākpasu kwa obi nke ọtutu ndi di iche iche, mb͕e M’gēme ka ntipia-gi bia n’etiti mba nile, rue ala di iche iche nke i nāmaghi.

10 M’gēme kwa ka i ju ọtutu ndi anya, ndi-eze-ha gāma jijiji bayere gi nke-uku, mb͕e M’gēfeghari mma-agham n’iru ha; ha gāma kwa jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, onye ọ bula n’ihi ndu-ya, n’ubọchi nke ọdida-gi.

11 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mma-agha nke eze Babilon gābiakwasi gi.

12 ọ bu site na mma-agha nile nke ndi-dike ka M’gēme ka ìgwè ndi-gi da; ndi kariri mba nile n’ime ka madu ma jijiji ka ha nile bu: ọ bu kwa ihe-npako nke Ijipt ka ha gāpunara ya, ewe kpochapu ìgwè ndi-ya nile.

13 M’gēme kwa ka anumanu-ya nile si n’akuku ọtutu miri la n’iyì; ukwu madu agaghi-ab͕aru kwa ha ọzọ, ukwu anumanu agaghi-ab͕aru kwa ha.

14 Mb͕e ahu ka M’gēme ka miri-ha do, me kwa ka osimiri nile ha rùe erù dika manu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15 Mb͕e m’gēme ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n’efu na ihe-iju-anya, ala b͕a aka n’ihe juru ya-ri, mb͕e M’gētib͕u ndi nile bi ya, ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

16 Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n’ihi Ijipt na n’ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

17 O rue, n’arọ nke-iri-na-abua, n’ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

18 Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n’okpuru uwa, ha na ndi nārida n’olùlù.

19 Ònye ka i tọkariri n’utọ? rida, ka eme kwa ka i soro ndi anēbighi úgwù dina.

20 N’etiti ndi ejiri mma-agha b͕u ka ha gāda: ewerewo ya nye mma-agha: kpupunu ya na ìgwè ndi-ya nile.

21 Ndi di ike nke ndi-dike gēsi n’etiti ala-mọ gwa ya okwu, ha na ndi nēyere ya aka: ha aridawo, ha edinawo ala, bú ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u.

22 N’ebe ahu ka Asiria na nkpọkọta ndi ya nile di; n’ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha:

23 ndi etiyere ílì nile ha na nsọtu nile nke olùlù, nkpọkọta ndi-ya di ílì-ya buruburu: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, bú ndi mere ka ujọ di n’ala ndi di ndu.

24 N’ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n’ebighi-úgwù rue ala di n’okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n’ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n’olùlù.

25 N’etiti ndi eb͕uru eb͕u ka ha nyeworo ya ihe-ndina n’etiti ìgwè ndi-ya nile; n’ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n’ihi na emere ka ujọ-ha di n’ala ndi di ndu, ha we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n’olùlù: n’etiti ndi eb͕uru eb͕u ka etiyeworo ya.

26 N’ebe ahu ka Meshek na Tubal na ìgwè ndi-ya nile nọ; n’ebe nile nke di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n’ihi na ha mere ka ujọ-ha di n’ala ndi di ndu.

27 Ha agaghi-esoro ndi-dike dina, bú ndi dara ada site na ndi anēbighi úgwù, ndi ridaworo n’ala-mọ chiri ihe-agha-ha, ha we tọb͕ọrọ mma-agha-ha n’okpuru isi-ha, ajọ omume nile ha dikwasi n’ọkpukpu-ha; n’ihi na ujọ ndi-dike ka ha bu n’ala ndi di ndu.

28 Ma gi onwe-gi, n’etiti ndi anēbighi úgwù ka agētipia gi, i gēso kwa ndi ejiri mma-agha b͕u dina.

29 N’ebe ahu ka Edom na ndi-eze-ya na ndi-isi-ya nile nọ, ndi atọb͕ọworo n’idi-ike-ha n’etiti ndi ejiri mma-agha b͕u: ndi ahu gēsoro ndi anēbighi úgwù, so kwa ndi nārida n’olùlù, dina.

30 N’ebe ahu ka ndi-isi Ugwu nọ, ha nile, na ndi Zaidon nile, ndi soro ndi eb͕uru eb͕u rida; n’ujọ-ha nke ha mere ka atua site n’idi-ike-ha ka ihere nēme ha; ha ewe soro ndi ejiri mma-agha b͕u dina n’ebighi-úgwù, būru ihere-ha, ha na ndi nārida n’olùlù.

31 Ndi ahu ka Fero gāhu, ewe kasie ya obi bayere ìgwè ndi-ya nile: ha bu ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na usu-ndi-agha-ya nile; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

32 N’ihi na emewom ka ujọ-ya di n’ala ndi di ndu: agēme kwa ka o dina n’etiti ndi anēbighi úgwù, ya na ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 33

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, gwa umu ndi-gi okwu, si ha, Ala ọ bula, mb͕e M’nēme ka mma-agha biakwasi ya, ma ndi ala ahu eweputawo otù onye n’etiti ha, me ya ka ọ ghọrọ ha onye-nche:

3 ọ we hu mma-agha ahu ka ọ nābiakwasi ala-ya, o buru na ọ fùa opì-ike-ya, dọ ndi-ya aka na nti;

4 mb͕e ahu onye nānu ihe nke nuworo olu opì-ike ahu, ma ọ naraghi idọ-aka-na-nti-ya, ọ buru na mma-agha ahu abia wepu ya, ọbara-ya gādi n’isi-ya.

5 Olu opì-ike ahu ka ọ nuru, ma ọ naraghi idọ-aka-na-nti-ya; ọbara-ya gādikwasi ya: ma onye ahu, asi na ọ nara idọ-aka-na-nti ahu, nkpuru-obi-ya ka ọ gēmewori ka o wepuga onwe-ya.

6 Ma onye-nche ahu, mb͕e ọ gāhu mma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fùghi opì-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka na nti, mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n’etiti ha; onye ahu, n’ihi ajọ omume-ya ka ewepuworo ya, ma n’aka onye-nche ahu ka M’gājuta ọbara-ya.

7 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, onye-nche ka M’doworo gi nye ulo Israel; i gānu kwa okwu site n’ọnum, dọ ha aka na nti site nam.

8 Mb͕e M’nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n’uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n’ajọ omume-ya; ma n’aka-gi ka M’gājuta ọbara-ya.

9 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n’uzọ-ya puta ka o we si nime ya chigharia, ma o sighi n’uzọ-ya chigharia; onye ahu gānwu n’ajọ omume-ya, ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.

10 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N’ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n’isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu?

11 Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n’uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n’uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?

12 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si umu ndim, Ezi omume nke onye ezi omume agaghi-anaputa ya anaputa n’ubọchi njehie-ya; ọzọ, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu, ọ gaghi-asu ngọngọ nime ya n’ubọchi o si na nmebi-iwu-ya chigharia: ọzọ kwa, onye ezi omume apughi idi ndu nime ya n’ubọchi o mehiere.

13 Mb͕e M’nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n’ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n’ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu.

14 Ọzọ, mb͕e M’nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume;

15 asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n’ike, jegharia n’ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.

16 Nmehie-ya nile nke o mehieworo agaghi-echeta ha megide ya: ihe ekpere n’ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghi idi ndu.

17 Ma umu ndim asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi: ma ha onwe-ha, uzọ-ha ka anādighi-atule.

18 Mb͕e onye ezi omume si n’ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, ọ gānwu kwa nime ha.

19 Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya chigharia, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume, n’ihi ihe ndia ka onye ahu gādi ndu.

20 Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. M’gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di.

21 O rue, n’arọ nke-iri-na-abua nke emere ka ayi je biri n’ala ọzọ, n’ọnwa nke-iri, n’ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, na otù onye nke siri na Jerusalem b͕apu biakuterem, si, Etikpọwo obodo-ayi.

22 Ma aka Jehova rurumri aru n’anyasi, tutu onye b͕apuru ab͕apu abia; O we saghe ọnum, rue mb͕e ọ biakuterem n’ututu; ewe saghe ọnum, m’we ghara ida kwa ob͕i ọzọ.

23 Okwu Jehova we ruem nti, si,

24 Nwa nke madu, ndi bi na nkpọnkpọ ebe ndia n’ala Israel nēkwu, si, Nání otù onye ka Abraham bu, o we nweta ala nka: ma ayi onwe-ayi bara uba; ayi ka enyeworo ala nka ibu ihe-nweta.

25 N’ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta?

26 Unu eguzowo n’elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta?

27 Otú a ka i gāsi ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem nādi ndu, n’ezie ndi nọ na nkpọnkpọ ebe nile gāda site na mma-agha, M’gēwere kwa onye nọ n’ọhia nye anu-ọhia ka ewe ripia ya, na ndi nọ n’ebe nile ewusiri ike na n’ọb͕à nile, n’ajọ ọria nēfe efe ka ha gānwu.

28 M’gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n’efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.

29 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’mesiri ala-ha ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu na ihe-iju-anya, n’ihi ihe-árú nile ha nke ha meworo.

30 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, umu ndi-gi ndi nēkwu okwu bayere gi n’akuku mb͕idi nile ha, na n’ọnu-uzọ nile nke ulo nile ha, ha agwaritawo onwe-ha okwu, onye ọ bula ọ gwa nwa-nne-ya, si, Biko, bianu, nuru ihe bu okwu a nke nēsi n’ọnu Jehova puta.

31 Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n’iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n’ihi na ihu-n’anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.

32 Ma, le, i diri ha ka abù nke ihu-n’anya riri nne, dika onye nwere olu mara nma, nke nākpọ kwa ubọ nke-ọma: n’ihi na ha anuwo okwu-gi nile, ma ha adighi-eme ha.

33 Ma mb͕e ọ gēme, (le, ọ nēme,) ha gāma kwa na onye-amuma anọwori n’etiti ha.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 34

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-ọzùzù-aturu nāzù Israel, bue amuma, si ha, bú ndi-ọzùzù-aturu ahu, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndi-ọzùzù-aturu nāzù Israel ndi nọworo nāzù onwe-ha! ọ̀ bughi ìgwè ewu na aturu ka ndi-ọzùzù-aturu gāzù?

3 Abuba-ha ka unu nēri, aji-ha ka unu nēyi, anu nke mara abuba nime ha ka unu nēb͕u; ma ìgwè ewu na aturu ka unu nāzùghi.

4 Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n’ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.

5 Ha we b͕asa, n’ihi na onye-ọzùzù-aturu anọgh: ha we ghọrọ anu ọhia nile ihe-oriri, we b͕asa.

6 Ìgwè ewu na aturu nkem nākpafu n’ugwu nile, na n’elu ugwu ntà ọ bula di elu: ọ bu kwa n’elu uwa nile ka ìgwè ewu na aturu nkem b͕asara: ọ dighi kwa onye nāju ajuju bayere ha, ọ dighi kwa onye nāchọ ha.

7 N’ihi nka, unu ndi-ọzùzù-aturu, nurunu okwu Jehova:

8 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n’ezie n’ihi na ìgwè ewu na aturu nkem ghọrọ ihe-nluta-n’agha, ìgwè ewu na aturu nkem ewe ghọrọ anu nile ihe-oriri, n’ihi na onye-ọzùzù-aturu adighi, na n’ihi na ndi-ọzùzù-aturum achọghi ìgwè ewu na aturu nkem, kama ndi-ọzùzù-aturu nāzù onwe-ha, ma ìgwè ewu na aturu nkem ka ha nāzùghi;

9 n’ihi nka, unu ndi-ọzùzù-aturu, nurunu okwu Jehova;

10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide ndi-ọzùzù-aturu; M’gājuta kwa ìgwè ewu na aturu nkem n’aka-ha, me ka ha kwusi izù ìgwè ewu na aturu ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-azù kwa onwe-ha ọzọ; M’gānaputa kwa ìgwè ewu na aturu nkem n’ọnu-ha, ka ha we ghara ighọrọ ha ihe-oriri.

11 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, M’gāchọ kwa ìgwè ewu na aturu nkem, chọputa ha.

12 Dika onye-ọzùzù-aturu si achọputa ìgwè aturu-ya, n’ubọchi ọ nọ n’etiti ìgwè ewu na aturu-ya nke b͕asara ab͕asa, otú a ka M’gāchọputa ìgwè ewu na aturu nkem; M’gānaputa kwa ha n’ebe nile ha b͕asara n’ubọchi nke igwe-oji na oké ọchichiri.

13 M’gēme kwa ka ha si na ndi nile di iche iche puta, M’gāchikọputa kwa ha n’ala nile, me ka ha ba n’ala-ha; M’gāzù kwa ha n’ugwu nile nke Israel, na n’akuku ebe nile miri si erù, na n’ebe-obibi nile nke ala-ha.

14 Ezi ihe-ọzùzù-aturu ka M’gēji zù ha, ọ bu kwa n’ugwu nile nke ebe di elu nke Israel ka ebe-ita-nri-ha gādi: n’ebe ahu ka ha gāmakpu n’ezi ebe-ita-nri, ọ bu kwa ihe-ọzùzù-aturu makarisiri nma ka ha gēji zù onwe-ha n’ugwu nile nke Israel.

15 Mu onwem gāzù ìgwè ewu na aturu nkem, Mu onwem gēme kwa ka ha makpue amakpu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

16 Nke furu efu ka M’gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M’gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M’gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M’gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M’gēkpochapu; M’gāzù ha n’ikpé ziri ezi.

17 Ma unu onwe-unu, ìgwè ewu na aturu nkem, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēkpe ikpe n’etiti anu na anu, ma ebulu ma nkpi.

18 Ọ̀ bu unu ihe ntà na unu ji ezi ihe-ọzùzù-aturu azù onwe-unu, ma unu gāzọtọ ihe-ọzùzù-aturu-unu fọdurunu n’ukwu-unu? ọ̀ bu kwa unu ihe ntà na ọ bu miri doro edo ka unu nāṅu, ma unu gāb͕aru miri fọdurunu n’ukwu-unu?

19 Ma ìgwè ewu na aturu nkem, ọ bu ihe ukwu-unu zọtọrọ ka ha ji azù onwe-ha, ọ bu kwa miri ukwu-unu b͕aruru ka ha nāṅu.

20 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, gēkpe kwa ikpe n’etiti anu mara abuba na anu tara aru.

21 N’ihi na unu ji akuku na ubu-aka enuzuga, na n’ihi na unu ji mpi-unu asọzuga anu nile nāria ọria, rue mb͕e unu chusasiri ha n’èzi;

22 n’ihi nka M’gāzọputa ìgwè ewu na aturu nkem, ha agaghi-aghọ kwa ihe-nluta-n’agha ọzọ; M’gēkpe kwa ikpe n’etiti anu na anu.

23 M’gēme kwa ka otù onye-ọzùzù-aturu biliere ha, ọ gāzù kwa ha, ọbuná orùm, bú Devid; ya onwe-ya gāzù ha, ya onwe-ya gābu-kwa-ra ha onye-ọzùzù-aturu.

24 Mu onwem, bú Jehova, gābu-kwa-ra ha Chineke, orùm, bú Devid, gābu kwa onye-isi n’etiti ha; Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.

25 Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M’gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n’ala-ha: ha gēbi n’ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n’oké ọhia.

26 M’gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M’gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.

27 Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n’elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n’aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè.

28 Ha agaghi-abu-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n’agha ọzọ, anu-ọhia nke uwa agaghi-eri kwa ha; ma ha gēbi na ntukwasi-obi, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.

29 M’gēme kwa ka ihe-ọkukù nke agāma aha-ya biliere ha, ha agaghi-abu kwa ndi oké unwu kpochapuworo n’ala-ha ọzọ, ha agaghi-ebu kwa ihere mba nile ọzọ.

30 Ha ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, bú Chineke-ha, nọyere ha, ha mara kwa na ha onwe-ha bu ndim, bú ulo Israel; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

31 Ma unu onwe-unu, ìgwè ewu na aturu nkem, bú ìgwè ewu na aturu nke ebe-ita-nrim, madu ka unu bu, Mu onwem bu Chineke-unu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 35

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, che iru-gi imegide ugwu Sia, bue amuma megide ya,

3 si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, ugwu Sia, M’gēseti kwa akam imegide gi, M’gēme kwa ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu na ihe-iju-anya.

4 Obodo-gi nile ka M’gēme ka ha ghọ nkpọnkpọ ebe, gi onwe-gi gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu; i we mara na Mu onwem bu Jehova.

5 N’ihi na i nwere iro ebighi-ebi, we rara umu Israel nye n’aka mma-agha na mb͕e nhuju-anya-ha, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu:

6 n’ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n’ezie nání ọbara ka M’gēme gi ka i ghọ, ọbara ganāchu kwa gi: ọ bu ezie na i kpọghi ọbara asì, ma ọbara gāchu gi.

7 M’gēme kwa ugwu Sia ka ọ ghọ ihe-iju-anya na ebe tọb͕ọrọ n’efu; M’gēbipu kwa nime ya onye nāgabiga na onye nālaghachi.

8 M’gēmeju kwa ugwu-ya nile na ndi-ya eb͕uru eb͕u: ugwu ntà gi nile na ndagwurugwu-gi nile na ebe-gi nile miri si erù, ndi ejiri mma-agha b͕u gāda nime ha.

9 Ebe nke tọb͕ọrọ n’efu mb͕e ebighi-ebi ka M’gēme gi ka i ghọ, madu agaghi-ebi kwa n’obodo-gi nile: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

10 N’ihi na i siwo, Mba abua ndia na ala abua ndia gābu nkem, ayi gēnweta kwa ya; ma Jehova nọrọ n’ebe ahu:

11 n’ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M’gēme kwa dika iwe-gi si di, na dika ekworo-gi si di nke i kwoworo site n’asì i kpọrọ ha; Mgēme kwa ka amara Mu onwem n’etiti ha, mb͕e M’gēkpe gi ikpe.

12 I gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, anuwo okwu-nlelì-gi nile nke i kwuworo megide ugwu nile nke Israel, si, Ha bu ebe tọb͕ọrọ n’efu, ayi ka ewereworo ha nye ka ayi we ripia ha.

13 Unu we were ọnu-unu me onwe-unu ka unu di uku imegidem, me ka okwu-unu ba uba imegidem: Mu onwem anuwo.

14 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ka ọṅù nke uwa nka nile ra, otú a ka M’gēme gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu.

15 Dika i ṅuriri ọṅu n’isi ihe-nketa nke ulo Israel, n’ihi na ọ tọb͕ọrọ n’efu, otú a ka M’gēme gi: ebe tọb͕ọrọ n’efu ka i gābu, gi ugwu Sia, na Edom nile, ọbuná Edom nile: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 36

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buere ugwu nile nke Israel amuma, si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Jehova.

2 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na onye-iro asiwo megide unu, Ehe! na, Ebe di elu nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga aghọworo ayi ihe-nnweta:

3 n’ihi nka bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na, ọbuná n’ihi na ha emewo ka unu tọb͕ọrọ n’efu, na n’ihi na ha eledawo unu buruburu, ka unu we ghọrọ mba nile fọdurunu ihe-nnweta, ewe me ka unu rigokwasi n’eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi-ire, buru akukọ ọjọ nke ndi-unu:

4 n’ihi nka, unu ugwu Israel, nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile na nkpọnkpọ ebe nile nke tọb͕ọrọ n’efu na obodo nile anapuru anapu, nke ghọwo-kwa-ra mba nile fọdurunu nke di buruburu ihe-nluta-n’agha na ihe-ikwa-emò:

5 n’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N’ezie n’ọku nke ekworom ka M’kwuworo okwu megide mba nile fọduru, megide kwa Edom nile, ndi wereworo alam nye onwe-ha ibu ihe-nnweta n’ọṅù nke obi-ha nile, nime nlelì nke nkpuru-obi-ha, ka ha we chupu ya ka ọ ghọ ihe-nluta-n’agha:

6 n’ihi nka bue amuma bayere ala Israel, si ugwu-ya nile, si kwa ugwu ntà ya nile, si ebe-ya nile miri si erù, si kwa ndagwurugwu-ya nile, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Lem anya, n’ekworom na n’ọnumam ka M’kwuworo okwu, n’ihi na ọ bu ọnọdu-ihere nke mba di iche iche ka unu būruworo:

7 n’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem eweliwo akam elu, si, N’ezie mba nile ndi di unu buruburu, ha onwe-ha gēbu ọnọdu-ihere-ha.

8 Ma unu onwe-unu, ugwu Israel, ngalaba-unu ka unu gāwaputa, miara ndim, bú Israel, nkpuru-unu; n’ihi na ha nọ nso ibia.

9 N’ihi na, le, Mu onwem diri unu, M’gēche kwa unu iru, agālu kwa unu dika ubi, gha unu ihe:

10 M’gēme kwa ka madu ba uba n’elu unu, bú ulo Israel nile, ha nile: madu gēbi kwa n’obodo-unu nile, ọ bu kwa nkpọnkpọ ebe nile unu ka agēwu:

11 M’gēme kwa ka madu na anumanu ba uba n’elu unu; ha gāba kwa uba, mua ọmùmù: M’gēme kwa ka madu bi nime unu dika ọnọdu mb͕e ochie unu si di, M’gēme kwa unu nma karia na mb͕e mbu unu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

12 M’gēme kwa ka madu jegharia n’elu unu, ọbuná ndim, bú Israel; ha gēnweta kwa gi, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-nketa, i gaghi-ab͕aba kwa ha aka umu ọzọ ma-ọli.

13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na ha nāsi unu, Ala nke nēri madu ka i bu, ala nke nāb͕aba mba-gi aka umu ka i buworo;

14 n’ihi nka i gaghi-eri kwa madu ọzọ, i gaghi-ab͕aba kwa mba-gi aka umu ọzọ, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta);

15 M’gaghi-eme kwa ka i nuru ọnọdu-ihere mba nile ọzọ, i gaghi-ebu kwa ita-uta nke ndi nile di iche iche ọzọ, i gaghi-eme kwa ka mba-gi su ngọngọ ọzọ; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

16 Okwu Jehova we ruem nti, si,

17 Nwa nke madu, mb͕e ulo Israel bi n’elu ala-ha, ha we merua ya site n’uzọ-ha, site kwa n’omume nile ha: dika iru-árú nke nwanyi di na nsọ, otú a ka uzọ-ha diri n’irum.

18 M’we wukwasi ha ọnumam n’ihi ọbara ahu nke ha wukwasiri n’ala-ha, na n’ihi na ha jiri arusi nile ha merua ya:

19 M’we chusa ha n’etiti mba nile, ha we b͕asa n’ala nile: dika uzọ-ha si di, na dika omume nile ha si di, otú a ka M’kpere ha ikpe.

20 Ha we biarue mba nile ebe ha biara, ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ; mb͕e anēkwu okwu bayere ha, si, Ndi nke Jehova ka ndia bu, ọ bu kwa n’ala-Ya ka ha siri puta.

21 Ma enwerem ọmiko n’aru aha nsọm, nke ulo Israel mereri ka ọ ghara idi nsọ n’etiti mba nile, ebe ha biara.

22 N’ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bughi n’ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, unu ulo Israel, kama ọ bu n’ihi aha nsọm, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n’etiti mba nile ebe unu biara.

23 M’gēdo kwa aha ukum nsọ, nke emere ka ọ ghara idi nsọ n’etiti mba nile, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n’etiti ha; mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e agēdom nsọ nime unu n’anya-ha.

24 M’gēweputa kwa unu n’etiti mba nile, chikọputa kwa unu n’ala nile, me ka unu bata n’ala-unu.

25 M’gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M’gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.

26 M’gēnye kwa unu obi ọhu, ọ bu kwa mọ ọhu ka M’gētiye nime unu: M’gēwezuga kwa obi nkume n’anu-aru-unu, nye unu obi nke bu anu-aru.

27 Mọ nkem ka M’gētiye nime unu, me ka ọ buru n’ukpurum nile ka unu gējeghari, ọ bu kwa ikpém nile ka unu gēdebe, me ha.

28 Unu gēbi kwa n’ala ahu nke M’nyere nna-unu-hà; unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke.

29 M’gāzọputa kwa unu n’iru-árú nile unu: M’gākpọ kwa ọka, me ka ọ ba uba, M’gaghi-atukwasi unu oké unwu.

30 M’gēme kwa ka nkpuru osisi na ihe-omume nke ubi ba uba, ka unu we ghara inara kwa ita-uta nke oké unwu n’etiti mba nile ọzọ.

31 Unu gēcheta kwa uzọ ọjọ nile unu, na omume nile unu nke nādighi nma; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n’anya-unu n’ihi ajọ omume nile unu na n’ihi ihe-árú nile unu.

32 Ọ bughi n’ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), maranu nka: ka ihere uzọ nile unu me unu, ka etiye kwa unu n’ọnọdu-ihere, unu ulo Israel.

33 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ubọchi M’mere ka unu si n’ajọ omume nile unu di ọcha, n’ubọchi ahu ka M’gēme ka madu bi n’obodo nile unu, agēwu kwa ebe nile tọb͕ọrọ n’efu.

34 Ala-ubi ahu nke tọb͕ọrọ n’efu ka agālu kwa, n’ọnọdu ibu ebe tọb͕ọrọ n’efu n’anya onye ọ bula nāgabiga.

35 Ha gāsi kwa, Ala nka nke tọb͕ọrọ n’efu aghọwo ubi dika ubi Iden ab͕ara ogige; ọzọ, obodo nile nke bu nkpọnkpọ, nke tọb͕ọrọ n’efu, nke akwaturu n’ala, ha aghọwo ebe ewusiri ike nke madu bi nime ha.

36 Mba nile nke fọduru n’ala di unu buruburu gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, ewuwo ebe nile akwaturu akwatu, ku kwa ubi nke tọb͕ọrọ n’efu: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu, M’gēme kwa ya.

37 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọzọ, nka ka M’gēkwe ka ulo Israel juam ase bayere ya, ka M’we mere ha ya; M’gēme ka ha ba uba na madu dika ìgwè ewu na aturu.

38 Dika ìgwè ewu na aturu di nsọ, dika ìgwè ewu na aturu nke Jerusalem na mb͕e-ya nile akara àkà; otú a ka nkpọnkpọ obodo nile gējuputa na ìgwè ewu na aturu nke bu madu: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 37

1 Aka Jehova we dikwasim, O we me ka m’pua apu nime Mọ nke Jehova, O we dọbam n’etiti ndagwurugwu ahu; ma ndagwurugwu ahu juputara n’ọkpukpu;

2 O we me ka m’gabiga n’akuku ha buruburu n’akuku nile: ma, le, ha bara uba nke-uku n’elu ndagwurugwu; ma, le, ha kpọrọ nku nke-uku.

3 O we sim, Nwa nke madu, Ọkpukpu ndia, hà gādi ndu? M’we si, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi mara.

4 O we sim, Bue amuma n’elu ọkpukpu ndia, si ha, Unu ọkpukpu kpọrọ nku, nurunu okwu Jehova.

5 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ọkpukpu ndia: Le, Mu onwem gaje ime ka ume ba nime unu, unu ewe di ndu.

6 M’gētiyekwasi kwa unu akwara, me ka anu-aru rigokwasi unu, M’gēkpuchi kwa unu akpukpọ-aru, tiye ume nime unu, unu ewe di ndu, we mara na Mu onwem bu Jehova.

7 M’we bue amuma dika esiri nyem iwu: otù olu we da mb͕e m’nēbu amuma, ma, le, ime-nkpatu di, ọkpukpu we biarute onwe-ha nso, ọkpukpu n’ọkpukpu nke ya.

8 M’we hu, ma, le, akwara dikwasi ha, anu-aru rigota-kwa-ra, akpukpọ-aru we kpuchie ha n’elu: ma ume adighi nime ha.

9 O we sim, Buere ifufe amuma, bue amuma, nwa nke madu, si ifufe, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si n’ifufe anọ bia, gi ume, kukwasi ndia eb͕uru eb͕u ume, ka ha we di ndu.

10 M’we bue amuma dika O nyerem iwu, ume we ba nime ha, ha we di ndu, guzo ọtọ n’ukwu-ha, buru oké usu-ndi-agha di uku ri nne.

11 O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n’iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi.

12 N’ihi nka bue amuma, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gēmeghe ílì nile unu, me ka unu si n’ílì-unu rigoputa, unu ndim; M’gēme kwa ka unu bata n’ala Israel.

13 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’meghesiri ílì-unu, na mb͕e M’mesiri ka unu si n’ílì-unu rigoputa, unu ndim.

14 M’gētiye kwa Mọm nime unu, unu ewe di ndu, M’gēme kwa ka unu nọdu n’ala-unu: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me ya; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

15 Okwu Jehova we ruem nti, si,

16 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were otù osisi n’onwe-gi, de n’elu ya, Nke Juda, na nke umu Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n’otù: were kwa osisi ọzọ, de n’elu ya, Nke Josef, osisi Efraim, na nke ulo Israel nile ndi ekekọtaworo ya na ha n’otù:

17 gi jikọta kwa ha, otù na ibe-ya, nye onwe-gi, ka ha ghọ otù osisi, ka ha we ghọ otù n’aka-gi.

18 Ma mb͕e umu ndi-gi gāgwa gi okwu, si, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n’ebe i nọ?

19 gwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gaje iwere osisi Josef nke di n’aka Efraim, na ebo nile nke Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n’otù; M’gētiyekọ kwa ha na ya, bú osisi Juda, me ka ha ghọ otù osisi, ha ewe ghọ otù n’akam.

20 Osisi abua ahu nke i nēde ihe n’elu ha gādi kwa n’aka-gi n’anya-ha.

21 Gwa kwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem ganāchiputa umu Israel n’etiti mba nile, ebe ha jere, M’gāchikọputa kwa ha n’akuku nile, me ka ha bata n’ala-ha:

22 M’gēme kwa ha otù mba n’ala-ha, n’ugwu nile nke Israel; otù eze gābu-kwa-ra ha nile eze: ha agaghi-abu kwa mba abua ọzọ, agaghi-ekera kwa ha ala-eze abua ọzọ ma-ọli:

23 ha agaghi-eji kwa arusi nile ha, ma-ọbu ihe-árú nile ha, ma-ọbu njehie nile ha, meru onwe-ha ọzọ: kama M’gāzọputa ha n’ebe-obibi nile ha, ebe ha mehieworo, M’gēme kwa ka ha di ọcha: ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke.

24 Orùm, bú Devid, gābu kwa eze-ha; ọ bu kwa otù onye-ọzùzù-aturu ka ha nile gēnwe: ọ bu kwa n’ikpém nile ka ha gējeghari, ukpurum nile ka ha gēdebe kwa, me ha.

25 Ha gēbi kwa n’ala ahu nke M’nyeworo orùm, bú Jekob, nke nna-unu-hà biri nime ya; ha gēbi kwa nime ya, ha onwe-ha, na umu-ha, na umu umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi: Devid, bú orùm, gābu-kwa-ra ha onye-isi rue mb͕e ebighi-ebi.

26 Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo: ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ gābu n’ebe ha nọ: M’gēdo kwa ha, me ka ha ba uba, M’gētiye kwa ebe nsọm n’etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

27 Ebe-obibim gādi kwa n’elu ha, M’gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi.

28 Mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, Onye nēdo Israel nsọ, mb͕e ebe nsọm gādi n’etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 38

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, che iru-gi na Gog, nke ala Megog, bú onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal, bue amuma megide ya,

3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal:

4 M’gēchighari gi, tiye nb͕a-aka-imi n’àb͕à-gi abua, me ka i puta, gi na usu-ndi-agha-gi nile, ma inyinya ma ndi-inyinya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha nile, ọ bu nkpọkọta madu bara uba chiri ọta uku na ọta, ndi nējide mma-agha, ha nile:

5 Peasia na Etiopia na Put soro ha; ha nile chiri ọta na okpu-agha:

6 Goma na usu-ndi-agha-ya nile; ulo Togama nke akuku Ugwu dikarisiri anya, na usu-ndi-agha-ya nile: ọbuná ọtutu ndi di iche iche so gi.

7 Buru onye jikere, e, jikere onwe-gi, gi onwe-gi, na nkpọkọta ndi-gi nile, ndi akpọkọtaworo n’ebe i nọ, gi buru ha ọchi-agha.

8 Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n’ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n’ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n’ọtutu ndi di iche iche, n’elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n’etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.

9 I gārigo kwa, dika ikuku siri ike ka i gābia, dika igwe-oji ikpuchi ala ka i gādi, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ọtutu ndi di iche iche so gi.

10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu, na ihe di iche iche gābata n’obi-gi, i gēchè kwa èchìchè ọjọ:

11 i gāsi kwa, M’gārigo imegide ala bu nání obodo nēnweghi mb͕idi; m’gābakwasi ndi nọ jū, ndi nọ na ntukwasi-obi, ha nile bi n’ebe nēnweghi mb͕idi, ọ dighi kwa ihe-ntuchi ma-ọbu ibo-ọnu-uzọ ha nwere:

12 ikwata ihe-nkwata na iluta ihe-nluta n’agha; ichighari aka-gi imegide nkpọnkpọ ebe nke madu bi nime ha ub͕u a, na imegide otù ndi nke achikọputaworo na mba di iche iche, nke lutaworo anu-ulo na ihe-ahia n’ọlu, ndi bi n’elu-ala nke uwa.

13 Sheba na Dedan na ndi-ahia Tashish na umu-ọdum-ya nile gāsi gi, Ọ̀ bu ikwata ihe-nkwata ka gi onwe-gi nābia? ọ̀ bu iluta ihe-nluta n’agha ka i kpọkọtaworo nkpọkọta ndi-gi? ọ̀ bu ibupu ọla-ọcha na ọla-edo, ichipu anu-ulo na ihe-ahia, ikwata oké ihe-nkwata?

14 N’ihi nka bue amuma, nwa nke madu, si Gog, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bughi n’ubọchi ahu mb͕e ndim, bú Israel, bi na ntukwasi-obi ka i gāmara ya?

15 I gēsi kwa n’ebe-gi, n’akuku nile nke Ugwu dikarisiri anya, bia, gi onwe-gi, na ọtutu ndi di iche iche so gi, ndi nānọkwasi inyinya ka ha nile bu, ha bu nkpọkọta madu di uku na usu-ndi-agha bara uba:

16 i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n’ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M’gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n’anya-ha, gi Gog.

17 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M’kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n’aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n’ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M’gēme ka i biakwasi ha?

18 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, n’ubọchi Gog nābia imegide ala Israel, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na ọnumam gārigota n’imim.

19 Ọ bu kwa n’ekworom n’ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M’kwuworo, si, N’ezie n’ubọchi ahu ime-nkpatu uku gādi n’elu ala Israel;

20 azù nile nke oké osimiri, na anu-ufe nke elu-igwe, na anu ọhia, na ihe nile nke nākpu akpu, bú nke nākpu akpu n’ala, na madu nile ndi nọ n’elu uwa, ewe me nkpatu site n’irum, agākwatu kwa ugwu nile, ebe nile di nkputankpu gāda kwa, mb͕idi nile ọ bula gādaru kwa ala.

21 M’gākpọ kwa mma-agha ka ọ dakwasi ya n’ugwum nile, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): mma-agha onye ọ bula ganēmegide nwa-nne-ya.

22 Mu na ya gēkpe kwa ikpe n’ajọ ọria nēfe efe na n’ọbara; ọ bu kwa oké miri-ozuzo nēzobiga ókè, na oké ákú-miri-ígwé, na ọku, na brimstone, ka M’gēme ka ha zokwasi ya, zokwasi kwa usu nile nke ndi-agha-ya, zokwasi kwa ọtutu ndi di iche iche so ya.

23 M’gēme kwa Onwem ka M’di uku, M’gēdo kwa Onwem nsọ, me ka amara Mu onwem n’anya ọtutu mba; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 39

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma megide Gog, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal:

2 M’gēchighari kwa gi, duru gi, me ka i si n’akuku nile dikarisiri anya nke Ugwu rigota; M’gēme kwa ka i bia n’elu ugwu nile nke Israel:

3 M’gētipu kwa uta-gi n’aka-ekpe-gi, me ka àkú-gi nile dapu n’aka-nri-gi.

4 N’elu ugwu nile nke Israel ka i gāda, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ndi di iche iche ndi nēso gi: udele nile di iche iche na anu ọhia ka M’gēwere gi nye, ka ha we rie gi.

5 N’ọhia ka i gāda: n’ihi na Mu onwem ekwuwo, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

6 M’gēziga ọku n’aru Megog na n’aru ndi bi n’agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

7 Aha nsọm ka M’gēme kwa ka amara ya n’etiti ndim, bú Israel; M’gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n’Israel.

8 Le, ọ nābia, ọ gēme kwa, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta); nka bu ubọchi ahu nke M’kwuworo okwu bayere ya.

9 Ndi bi n’obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n’aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa:

10 ha ewe ghara ikpata nkú n’ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n’oké ọhia; n’ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n’agha; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

11 O gēru kwa n’ubọchi ahu, na M’gēnye Gog otù ebe ílì ozu n’Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n’akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n’ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog.

12 Ma ọnwa asa ka ulo Israel gānọ nēlì ha, ka ha we me ka ala-ha di ọcha.

13 E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n’ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

14 Ọ bu kwa ndi ganalu ọlu mb͕e nile ka ha gēkewaputa, ndi ganāgabiga n’ala-ha nēlì ndi-ngabiga ahu, bú ndi fọduru n’elu ala, ime ka ọ di ọcha: n’ọgwugwu ọnwa asa ka ha gāchọputa.

15 Ma ndi nāgabiga n’ala gāgabiga; mb͕e onye ọ bula gāhu ọkpukpu madu, ọ gēwu kwa ihe-iriba-ama n’akuku ya, rue mb͕e ndi nēlì ozu gēlìwo ya-ri na ndagwurugwu Hamon-Gog.

16 Ọzọ kwa, aha nke otù obodo gābu Hamona. Ha ewe me ka ala ahu di ọcha.

17 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si nnunu nile di iche iche, si kwa anu ọhia nile ọ bula, Chikọtanu onwe-unu, bia; zukọputanu n’akuku nile di buruburu, n’ihi àjàm nke Mu onwem nāchuru unu, bú àjà di uku M’nāchu n’elu ugwu nile nke Israel, ka unu we rie anu, ṅu kwa ọbara.

18 Anu-aru ndi-dike ka unu gēri, ọ bu kwa ọbara ndi-isi nke uwa ka unu gāṅu, nke ebulu, na nke umu-aturu, na nke ewu, na nke oké-ehi, anu gbara abuba nke Beshan ka ha nile bu.

19 Unu gēriju kwa abuba afọ, ṅubiga ọbara ókè, bú nke sitere n’àjàm nke M’churu n’ihi unu.

20 Afọ inyinya na ub͕ọ-ala na ndi-dike na ndi-agha nile gēju unu table nkem; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

21 M’gēdo kwa nsọpurum n’etiti mba nile, mba nile gāhu kwa ihe M’kpere n’ikpe nke M’meworo, na akam nke M’tukwasiworo ha.

22 Ulo Israel ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, site n’ubọchi ahu we ga n’iru.

23 Mba nile gāma kwa na ọ bu n’ihi ajọ omume-ha ka emere ka ulo Israel je biri n’ala ọzọ; n’ihi na ha mekpuru emekpu megidem, M’we zonari ha irum: M’we nye ha n’aka ndi nākpab͕u ha, ha we site na mma-agha, ha nile.

24 Dika iru-árú-ha si di na dika njehie nile ha si di, otú a ka M’mere ha: M’we zonari ha irum.

25 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ub͕u a ka M’gēme ka ndi Jekob adọtara n’agha lata, M’gēnwe kwa obi-ebere n’aru ulo Israel nile; M’gēkwo-kwa-ra aha nsọm ekworo.

26 Ha gēbu kwa ihere-ha, na nmekpu nile ha nke ha mekpuworo megidem, mb͕e ha gēbi n’ala-ha na ntukwasi-obi, mb͕e ọ gaghi-adi onye ọ bula nēme ka ha ma jijiji;

27 mb͕e M’gēmewori ka ha si n’etiti ndi nile di iche iche lata, mb͕e M’gāchikọputawo ha-ri n’ala nile nke ndi-iro-ha, ewe dom nsọ nime ha n’anya ọtutu mba.

28 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, ebe M’mere ka ha je biri n’ala ọzọ n’etiti mba nile, M’we chikọba ha n’ala-ha; M’gaghi-eme kwa ka onye ọ bula nime ha fọdu n’ebe ahu ọzọ;

29 M’gaghi-ezonari kwa ha irum ọzọ: n’ihi na awukwasiwom Mọm n’ulo Israel; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 40

1 N’arọ nke-orú-na-ise nke emere ka ayi je biri n’ala ọzọ, n’isi-nmalite arọ ahu, n’ubọchi nke-isi nke ọnwa, n’arọ nke-iri-na-anọ site na mb͕e etikpọsiri obodo-ayi, n’otù ubọchi ahu, aka Jehova dim n’aru, O we me ka m’bia n’ebe ahu.

2 N’ọhù di iche iche nke Chineke ka O mere ka m’bata n’ala Israel, Ọ dọbam n’ugwu di elu nke-uku, nke ihe dika obodo anēwu ewu di n’elu ya n’akuku Ndida.

3 O we me ka m’bia n’ebe ahu, ma le, otù nwoke, ma ele ya anya ọ di ka ọla si di n’ile ya anya, eriri flax di kwa n’aka-ya, ya na amì eji atù ihe; onye ahu nēguzo kwa n’ọnu-uzọ-ama.

4 Nwoke ahu we gwam okwu, si, Nwa nke madu, were anya-gi abua hu, were kwa nti-gi abua nu, tukwasi kwa obi-gi n’ihe nile Mu onwem nēme ka i hu; n’ihi na ọ bu ime ka i hu ha ka emeworo ka i bia ebe a: gosi ulo Israel ihe nile nke gi onwe-gi nāhu.

5 Ma le, otù mb͕idi di n’èzí ulo ahu buruburu n’akuku nile, n’aka nwoke ahu ka amì eji atù ihe di kwa nke di cubit isi n’ogologo, cubit ọ bula bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka: o we tùa ib͕idi nke mb͕idi ahu anēwu ewu, otù ami; na idi-elu-ya, otù ami.

6 O we biarue ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n’uzọ Iru-anyanwu, ọ rigo ihe-nrigo-ya, tùa nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu, otù ami n’obosara: ọbuná otù nbata-uzọ, otù ami n’obosara.

7 Ime-ulo ọ bula bu otù ami n’ogologo, na otù ami n’obosara; n’etiti ime-ulo abua di cubit ise; nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama n’akuku uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n’ulo bu otù ami.

8 O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n’ulo, otù ami.

9 O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, cubit asatọ; na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, cubit abua; uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n’ulo.

10 Ime-ulo nke ọnu-uzọ-ama n’uzọ Iru-anyanwu di atọ n’otù akuku, atọ n’akuku nke-ọzọ; otù ọtùtù ka ha atọ nwere: ọ bu kwa otù ọtùtù ka akuku-ọnu-uzọ abua nwere n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ.

11 O we tùa obosara nke oghere ọnu-uzọ-ama, cubit iri; na ogologo nke ọnu-uzọ-ama, cubit iri-na-atọ;

12 na ókè-ala n’iru ime-ulo nile, otù cubit n’otù akuku, na ókè-ala, otù cubit n’akuku nke-ọzọ; na ime-ulo onwe-ya, cubit isi n’otù akuku na cubit isi n’akuku nke-ọzọ.

13 O we tùa ọnu-uzọ-ama site n’elu-ulo nke otù ime-ulo rue elu-ulo nke ime-ulo-ibe-ya, obosara-ya di orù cubit na ise; oghere na ncherita-iru oghere.

14 O we me akuku-ọnu-uzọ, ọgu cubit atọ; ọbuná rue akuku-ọnu-uzọ nke ogige, ọnu-uzọ-ama di buruburu n’akuku nile.

15 Ọzọ, site n’iru ọnu-uzọ-ama, na nbata, rue iru uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama di nime di ọgu cubit abua na iri.

16 Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n’ime ọnu-uzọ-ama buruburu n’akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n’ime ulo buruburu n’akuku nile: nkwu di kwa n’akuku-ọnu-uzọ ọ bula.

17 O we me ka m’bata n’ogige di n’èzí, ma, le, ime-ulo di iche iche na pavement di, nke emeworo nye ogige ahu buruburu n’akuku nile: orú ime-ulo na iri di na pavement ahu.

18 Pavement ahu di kwa n’akuku ọnu-uzọ-ama nile, na nso ogologo nke ọnu-uzọ-ama, bú pavement nke dikari ala.

19 O we tùa obosara-ya site n’iru ọnu-uzọ-ama ahu nke dikari ala rue iru nke ogige di nime n’èzí, ọgu cubit ise, n’akuku Iru-anyanwu na n’akuku Ugwu.

20 Ọnu-uzọ-ama ahu kwa nke nēche iru n’uzọ Ugwu, bú ọnu-uzọ-ama nke ogige di n’èzí, o tùru ogologo-ya na obosara-ya.

21 Ime-ulo-ya di atọ n’otù akuku, atọ n’akuku nke-ọzọ; akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile di ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama mbu: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

22 Window-ya nile na ulo-nbata-ya nile na nkwu-ya nile di kwa ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n’uzọ Iru-anyanwu; ọ bu kwa ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa ka ha ji arigo nime ya; ulo-nbata-ya nile di kwa n’iru ha.

23 Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama ọzọ, n’akuku Ugwu na n’akuku Iru-anyanwu; o we tùa site n’otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ, ọgu cubit ise.

24 O we me ka m’je n’uzọ Ndida, ma le, otù ọnu-uzọ-ama di n’uzọ Ndida: o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile dika ọtùtù ndia si di.

25 Window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n’akuku nile, dika window ndia: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

26 Ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa di kwa iji arigo ya, ulo-nbata-ya nile di kwa n’iru ha: o nwe-kwa-ra nkwu, otù n’otù akuku, otù n’akuku nke-ọzọ, n’akuku-ọnu-uzọ-ya abua.

27 Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime n’uzọ Ndida: o we tùa site n’otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n’uzọ Ndida, ọgu cubit ise.

28 O we me ka m’si n’ọnu-uzọ-ama nke Ndida ba n’ogige di nime: o we tùa ọnu-uzọ-ama nke Ndida dika ọtùtù ndia si di;

29 na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n’akuku nile: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

30 Ulo-nbata di kwa ya buruburu n’akuku nile, ogologo-ha di orú cubit na ise, obosara-ha di kwa cubit ise

31 Ulo-nbata-ya nile chere iru n’ogige di n’èzí; nkwu di kwa n’akuku-ọnu-uzọ-ya abua: nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere.

32 O we me ka m’bata n’ogige di nime n’uzọ Iru-anyanwu: o we tùa ọnu-uzọ-ama ahu dika ọtùtù ndia si di:

33 na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n’akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

34 Ulo-nbata-ya nile che-kwa-ra iru n’ogige di n’èzí; nkwu di kwa n’akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n’otù akuku na n’akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere.

35 O we me ka m’biarue ọnu-uzọ-ama nke Ugwu, o we tùa ya dika ọtùtù ndia si di;

36 ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile; window di-kwa-ra ya buruburu n’akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

37 Akuku-ọnu-uzọ-ya abua chere iru n’ogige di n’èzí; nkwu di kwa n’akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n’otù akuku, na n’akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo nwere.

38 Otù ime-ulo na ọnu-uzọ-ya di kwa n’akuku-ọnu-uzọ n’ọnu-uzọ-ama nile; n’ebe ahu ka ha nāsacha anu àjà-nsure-ọku.

39 Ọzọ, n’ulo-nbata nke ọnu-uzọ-ama ka table abua di n’otù akuku, table abua di kwa n’akuku nke-ọzọ, ha ewe b͕ue n’elu ha àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma.

40 Ọzọ, n’otù akuku n’èzí, ebe madu nārigoru oghere nke ọnu-uzọ-ama n’akuku Ugwu, ka table abua di; ọ bu kwa n’akuku ọzọ, nke diri uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, ka table abua di.

41 Table anọ di n’otù akuku, table anọ di kwa n’akuku nke-ọzọ, n’akuku ọnu-uzọ-ama; ha di table asatọ nke ha nēb͕u ihe nchu-àjà n’elu ha.

42 Table anọ di-kwa-ra àjà-nsure-ọke, nke nkume awara awa, ogologo-ha di otù cubit na nkera, obosara-ha di kwa otù cubit na nkera, idi-elu-ha di kwa otù cubit: n’elu ha ka ha nādọba kwa ihe nile nke ha ji eb͕u anu àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ.

43 Nko nke ra ka otù ntù-ọbu-aka di kwa, nke akpọgidesiri ike nime ulo-nbata buruburu n’akuku nile: ọ bu kwa n’elu table nile ahu ka anu nke onyinye iji biaru nso di.

44 Ọzọ, n’èzí ọnu-uzọ-ama di nime ka ime-ulo nke ndi-abù di n’ogige di nime, nke di n’akuku ọnu-uzọ-ama nke Ugwu; iru-ha di kwa n’uzọ Ndida: otù di n’akuku ọnu-uzọ-ama nke Iru-anyanwu nke iru-ya di n’uzọ Ugwu.

45 O we gwam okwu, si, Ime-ulo a, nke iru-ya di n’uzọ Ndida, diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a.

46 Ma ime-ulo a nke iru-ya di n’uzọ Ugwu diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjà: ndia bu umu Zedok, ndi si n’etiti umu Livai abiakute Jehova nso ijere Ya ozi.

47 O we tùa ogige ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise, obosara-ya di kwa ọgu cubit ise, o nwere akuku anọ ra nrata; ebe-ichu-aja di kwa n’iru ulo ahu.

48 O we me ka m’biarue uzọ-nbata nke ulo ahu, o we tùa akuku-ọnu-uzọ nke uzọ-nbata ahu, cubit ise n’otù akuku, cubit ise n’akuku nke-ọzọ: obosara ọnu-uzọ-ama di kwa cubit atọ n’otù akuku, cubit atọ n’akuku nke-ọzọ.

49 Ogologo uzọ-nbata ahu di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri na otù; ọbuná n’ihe-nrigo ahu nke ha ji arigo ya: ogidi di kwa n’akuku-ọnu-uzọ-ya abua, otù n’otù akuku, otù n’akuku ọzọ.