Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 21

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, che iru-gi na Jerusalem, busa okwu-gi dika miri-ozuzo n’ebe ebe nsọ ya nile di, bu kwa amuma megide ala Israel;

3 si ala Israel, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, M’gāmiputa kwa mma-agham n’ọbọ-ya, bipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu.

4 Ebe M’gēbipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n’ihi nka ka mma-agham gēsi n’ọbọ-ya puta imegide anu-aru nile, bú madu, site na Ndida rue Ugwu:

5 anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, amiputawo mma-agham n’ọbọ-ya; ọ gaghi-alaghachi kwa ọzọ.

6 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ze ume; na nb͕aji úkwù na n’ilu obi ka i gēze ume n’anya-ha.

7 Ma ọ gēru, mb͕e ha gāsi gi, N’ìhi gini ka gi onwe-gi nēze ume? na i gāsi, Ọ bu n’ihi akukọ, n’ihi na ọ nābia: obi nile ọ bula gālọ kwa miri, aka nile gākuda, ike gāgwu mọ madu nile ọ bula, ikperè-ukwu nile gāghọ miri miri: le, ọ nābia, o ruwo kwa, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

8 Okwu Jehova we ruem nti, si,

9 Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Jehova siri: Si, Le, mma-agha, le, mma-agha, amuru ya amu, ọ bu kwa ihe emere ka ọ nēb͕u maramara:

10 amuru ya amu ka o we b͕ue madu nke-uku; emere ya ka ọ nēb͕u maramara ka o we di ka àmùmà: òbi gatọ kwa ayi utọ? nkpa-n’aka nwam, ọ nāju osisi nile ọ bula.

11 Ewe were ya nye ka eme ya ka ọ nēb͕u maramara, ka ewe jide ya n’ọbu-aka: amuru nke ahu amu, bú mma-agha, eme-kwa-ra nke ahu ka ọ nēb͕u maramara, ka ewe nye ya n’aka onye nēb͕u eb͕u.

12 Tie nkpu, kwasie ákwá ike, nwa nke madu: n’ihi na nke ahu di n’aru ndim, nke ahu di n’aru ndi-isi Israel: ndi arara nye mma-agha ka ha na ndim bu: n’ihi nka tie aka n’apata-ukwu-gi.

13 N’ihi na ọnwunwa di; gini gēme kwa ma ọ buru na ọbuná nkpa-n’aka nke nāju aju ghara idi? ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

14 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, kukọta ọbu-aka-gi abua; ka mma-agha di okpukpu atọ, bú mma-agha nke ndi anēb͕u eb͕u: nke ahu bu mma-agha nke onye uku ahu nke anēb͕u eb͕u, nke nāb͕achibido ha buruburu.

15 Ọ bu n’akuku ọnu-uzọ-ama nile ha ka M’tiyeworo ọnu-ọnu mma-agha, ka obi we lọ ha miri, ka ewe me kwa ka ihe-isu-ngọngọ ba uba: ewó! emewo ya ka ọ ghọ àmùmà, amuru ya amu ib͕u eb͕u.

16 Me onwe-gi ka i di otù, ga n’aka-nri; do onwe-gi n’usoro, ga n’akpa-ekpe; ebe ọ bula akaworo iru-gi àkà iga.

17 Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M’gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

18 Okwu Jehova we ruem nti, si,

19 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi uzọ abua, ka mma-agha nke eze Babilon we bia; n’otù ala ka ha abua gēsi puta: gi ka kwa akàrà yiri aka madu, ka ya n’isi uzọ obodo.

20 Uzọ ka i gēme, ka mma-agha we biarue Raba nke umu Amon, ru kwa Juda nime Jerusalem, bú ebe ewusiri ike.

21 N’ihi na eze Babilon guzoro n’ab͕ata uzọ, n’isi uzọ abua ahu, iju ase: o feghariri àkú-ya nile, jua ase n’aka terafim-ya, lekwasi imeju anya.

22 N’aka-nri-ya ka ihe iji ju ase bayere Jerusalem di, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi, isaghe ọnu n’ob͕ub͕u, iweli olu n’iti nkpu agha, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi imegide ọnu-uzọ-ama nile, iwukọta obo-ihe, iwu ulo-agha.

23 Ọ gādi-kwa-ra ha ka ọjuju-ase efu n’anya-ha, bú ndi ṅuworo ha iyi di iche iche: ma ya onwe-ya nēme ka echeta ajọ omume, ka ewe jide ha.

24 N’ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na unu emewo ka echeta ajọ omume unu, nime nkpughe njehie nile unu, ewe hu nmehie nile unu n’omume nile unu; n’ihi na emewo ka echeta unu, ọ bu n’ọbu-aka ka agējide unu.

25 Ma gi onwe-gi, onye emeruworo aru, onye nēmebi iwu, bú onye-isi Israel, onye ubọchi-ya biaworo, na mb͕e ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu;

26 otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Wezuga ákwà-nkukù-isi ahu, bupu okpu-eze ahu: nka agaghi-abu kwa ihe ọ bu: me ihe nke di ala ka ọ di elu, me kwa ihe nke di elu ka ọ di ala.

27 Nkpù-iru, nkpù-iru, nkpù-iru ka M’gēkpù-ya: nka kwa, ọ gaghi-adi rue mb͕e ọ gābia, bú onye o ruru aka; M’gēwere kwa ya nye ya.

28 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, si, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere umu Amon, baye-kwa-ra ita-uta-ha, si; gi si kwa, Le, mma-agha, bú mma-agha nke amiputaworo, n’ihi ob͕ub͕u ka emere ya ka ọ nēb͕u maramara, otú ọ gēkwe ya inagide, ka o we di ka àmùmà:

29 mb͕e ha nāhuru gi ọhù efu, mb͕e ha nājuru gi ase okwu-ugha, itiye gi n’olu ndi nēmebi iwu ndi eb͕uru eb͕u, ndi ubọchi-ha abiawo, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu.

30 Mighachi ya n’ọbọ́-ya. N’ebe ekère gi, n’ala nputa-uwa-gi, ka M’gēkpe gi ikpe.

31 M’gāwukwasi gi ajọ iwem; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M’gēji fùkwasi gi: M’gēnye kwa gi n’aka ndikom bu nání anu-ọhia, ndi di ǹkà n’ibibi ebibi.

32 I gāghọrọ ọku nri; ọbara-gi gādi n’etiti ala-gi; agaghi-echeta gi: n’ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 22

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ì gēkpe ikpe, ì gēkpe obodo ọbara nka ikpe? i gēme kwa ka ọ mara ihe-árú nile ya.

3 I gāsi kwa, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le obodo nke nāwusi ọbara n’etiti ya, ka mb͕e-ya we bia, nke nēme kwa arusi di iche iche megide onwe-ya imeru onwe-ya!

4 N’ọbara-gi, bú nke i wusiworo, ka ikpe maworo gi, ọ bu kwa n’arusi-gi nile, bú nke i meworo, ka i ruru árú; i we me ubọchi-gi ka ha biarue nso, i we biarue ọgwugwu arọ-gi nile: n’ihi nka ka M’meworo gi ka i ghọrọ mba nile ihe-ita-uta, ka i ghọ-kwa-ra ala nile ihe-ọchì.

5 Ndi di nso na ndi di anya n’ebe i nọ gāchì gi ọchì, gi obodo nke aha-gi ruru árú, nke juputara n’ọb͕ub͕a-aghara.

6 Le, ndi-isi Israel, onye ọ bula ka ogwe-aka-ya ra, anọwo nime gi iwusi ọbara.

7 Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n’etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.

8 Ihe nsọm nile ka i ledaworo anya, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka i meworo ka ha ghara idi nsọ.

9 Ndi nāb͕a àmà ọjọ anọwo nime gi iwusi ọbara: ọ bu kwa n’ugwu nile ka ha riworo ihe nime gi: ajọ ihe-nzube ka ha meworo n’etiti gi.

10 Ọtọ nna ka ekpugheworo nime gi: nwanyi nke ruru árú n’idi-na-nsọ-ya ka ha wedaworo n’ala nime gi.

11 Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n’ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n’ala nime gi.

12 Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n’aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

13 Ma, le, akuwom ọbu-akam n’ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n’ihi ọbara-gi nke diworo n’etiti gi.

14 Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n’ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya.

15 M’gāchusa kwa gi n’etiti mba nile, fesa kwa gi n’ala nile; M’gēme kwa ka iru-árú-gi si nime gi gwusia.

16 Agēme kwa ka i ghara idi nsọ n’onwe-gi, n’anya mba nile; i we mara na Mu onwem bu Jehova.

17 Okwu Jehova we ruem nti, si,

18 Nwa nke madu, ulo Israel aghọworom afuru-uzu: ha nile bu ọla na b͕amb͕am na ígwè na opù, n’etiti oké ọku; afuru-uzu nke ọla-ọcha ka ha ghọworo.

19 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N’ihi na unu nile aghọwo afuru-uzu, n’ihi nka, le, M’gaje ichikọta unu n’etiti Jerusalem.

20 Dika esi achikọta ọla-ọcha na ọla na ígwè na opù na b͕amb͕am n’etiti oké ọku, ifunwu ya ọku, ib͕aze ya; otú a ka M’gāchikọta unu n’iwem na n’ọnumam, tọb͕ọ unu n’ebe ahu, b͕aze unu.

21 E, M’gākpọkọta unu, were ọku nke nrubiga-ókè nke iwem fukwasi unu, unu ewe b͕aze n’etiti ya.

22 Dika esi ab͕aze ọla-ọcha n’etiti oké ọku, otú a ka agāb͕aze unu n’etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, awukwasiwo unu ọnumam.

23 Okwu Jehova we ruem nti, si,

24 Nwa nke madu, si ya, Gi onwe-gi bu ala nke anēmeghi ka ọ di ọcha, miri ezokwasighi ya n’ubọchi ajọ iwe.

25 Nkekọta ọjọ nke ndi-amuma-ya di n’etiti ya, dika ọdum nāb͕ọ uja nke nādọb͕u anu-ndọb͕u: nkpuru-obi madu ka ha ripiaworo; àkù na ihe di oké ọnu-ahia ka ha nēwere; ha emewo ka ndinyom-ya di-ha nwuru ba uba n’etiti ya.

26 Ndi-nchu-àjà-ya emewo iwum ihe-ike, me ka ihe nsọm nile ghara idi nsọ: ọ dighi ókè ha kpaworo n’etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ha emeghi kwa ka madu mara ihe di iche n’etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka ha zonariworo anya-ha, ewe me ka M’ghara idi nsọ n’etiti ha.

27 Ndi-isi-ya n’etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n’iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.

28 Ọzọ, ndi-amuma-ya eteworo ha nzu, nāhu ọhù efu, nāju-kwa-ra ha ase okwu-ugha, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, ma Jehova ekwughi okwu.

29 Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n’ike; onye ewedara n’ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n’ekpeghi ikpe.

30 M’we chọ otù onye n’etiti ha, onye gaje ib͕a ogige, guzo kwa na ntipú n’irum n’ihi ala-ya, ka M’we ghara ibibi ya: ma achọtaghm.

31 M’we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M’jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M’tiyekwasiworo n’isi-ha; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 23

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, ndinyom abua diri, bú umu otù nne:

3 ha we kwa iko n’Ijipt; ọ bu mb͕e ha di na nwata ka ha kwara iko: n’ebe ahu ka abiagidere ara-ha, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ha piri ọnu-ọnu ara-ha aka, bú nke ha nwere mb͕e ha di nāmaghi nwoke.

4 Ma aha-ha bu Ohola, ya bu nke-okenye, na Oholiba, bú nwa-nne-ya: ha we ghọ ndi nkem, mua umu-ndikom na umu-ndinyom. Ma aha-ha, Sameria bu Ohola, Jerusalem bu Oholiba.

5 Ohola we kwa iko mb͕e ọ nọ n’okpurum; agu ndi nāhu ya n’anya we gua ya, bú ndi Asiria ndi bu ab͕ata-obi-ya,

6 ndi yiri uwe anunu, ha bu ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, umu-okorọbia anāchọsi ike ka ha nile bu, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya.

7 O we kwaso ha iko nke-uku, ndi arọputara arọputa nke umu Asiria ka ha nile bu: ma onye ọ bula nke agu ya guru ya, arusi nile ha ka o ji merua onwe-ya.

8 Ma ikwa-iko-ya nile nke sitere n’Ijipt ka ọ nārapughi; n’ihi na ya na ha dinara mb͕e ọ di na nwata, ndi ahu pi-kwa-ra ọnu-ọnu ara-ya abua aka, bú nke o nwere mb͕e ọ di nāmaghi nwoke: ha we wukwasi ya ikwa-iko-ha dika miri.

9 N’ihi nka ka M’nyere ya n’aka ndi nāhu ya n’anya, n’aka umu Asiria, ndi agu ha guru ya.

10 Ndi ahu kpughere ọtọ-ya: umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ka ha chiri, ma ya onwe-ya ka ha jiri mma-agha b͕ue: o we ghọrọ ndinyom aha iji dọ ha aka na nti; ọ bu kwa ihe nile ekpere n’ikpe ka ha mere n’aru ya.

11 Nwa-nne-ya nwanyi, bú Oholiba, we hu nka, ma o bibiri onwe-ya kari nwa-nne-ya n’agu ndikom nke guru ya, na n’ikwa-iko-ya nile nke kariri ikwa-iko nile nke nwa-nne-ya.

12 Agu umu Asiria guru ya, bú ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, ndi bu ab͕ata-obi-ya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya, umu-okọrọbia anāchọsi ike ka ha nile bu.

13 M’we hu na ọ ruru árú; otù uzọ ka ha abua siri.

14 O we tukwasi ihe n’ikwa-iko-ya; o we hu ndikom akàrari na mb͕idi, bú onyinyo ndi Kaldea eji ihe-otite nācha uhie uhie kà,

15 ndi ekereri ihe-ọkiké n’úkwù-ha, ndi ejiri ákwà esijiri esiji kebiga isi-ha ókè, n’ile ha anya ndi-isi-agha ka ha nile bu, dika oyiyi umu Babilon nke Kaldea, bú ala amuru ha.

16 Agu ha we gua ya mb͕e ọ nēle ha anya, o we zigara ha ndi-ozi rue Kaldea.

17 Umu Babilon we biakute ya n’ihe-ndina nke ikwa-iko, ha we merua ya n’ikwa-iko nile ha, o we rua árú site na ha, nkpuru-obi-ya we kewapu n’ebe ha nọ.

18 O we kpughe ikwa-iko-ya nile, kpughe kwa ọtọ-ya: nkpuru-obim we kewapu n’aru ya, dika nkpuru-obim si ekewapu n’aru nwa-nne-ya.

19 O we me ka ikwa-iko-ya nile ba uba, n’icheta ubọchi nile ọ di na nwata, mb͕e ọ kwara iko n’ala Ijipt.

20 Agu ndikom-ha nākwa iko we gua ya, ndi anu-aru-ha bu anu-aru inyinya-ibu, uré-ha bu kwa uré inyinya.

21 I we leta ajọ ihe-nzube nke mb͕e i di na nwata, n’ipi ọnu-ọnu ara-gi abua nke ndi Ijipt piri n’ihi ara abua nke i nwere mb͕e i di na nwata.

22 N’ihi nka, Oholiba, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M’gaje ikpọte ndi nāhu gi n’anya imegide gi, bú ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n’ebe ha nọ, M’gēme kwa ka ha si n’ebe nile di buruburu biakwasi gi;

23 bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n’inyinya ka ha nile bu.

24 Ha gābiakwasi kwa gi chiri ihe-agha, na ub͕ọ-ala, na wheel nākpọre akpọre, chiri kwa nkpọkọta nke ndi di iche iche; ọta uku na ọta na okpu-agha ka ha gēji do onwe-ha imegide gi buruburu: M’gēnye kwa ha ikpé n’aka, ha gēkpe kwa gi n’ikpe nile ha.

25 M’gēdo kwa ekworom imegide gi, ha gēmeso kwa gi n’ọnuma; imi-gi na nti-gi abua ka ha gēwezuga; ọzọ, ndi gēsota gi n’azu gāda site na mma-agha: umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom ka ha gāchiri; ọku gēripia kwa ndi gēsota gi n’azu.

26 Ha gēyipu kwa uwe-gi nile n’aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma.

27 M’gēme kwa ka ajọ ihe-nzube-gi kwusi n’aru gi, ya na ikwa-iko-gi nile sitere n’ala Ijipt: i gaghi-eweli kwa anya-gi abua le ha, i gaghi-echeta kwa Ijipt ọzọ.

28 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M’gaje inye gi n’aka ndi i nākpọ asì, n’aka ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n’ebe ha nọ:

29 ha gēmeso kwa gi n’ikpọ-asì, wepu ihe nile i dọtara n’idọb͕u onwe-gi n’ọlu, ha gārapu kwa gi i b͕arasia ọtọ: agēkpughe kwa ọtọ nke ikwa-iko-gi nile, ma ajọ ihe-nzube-gi ma ikwa-iko-gi nile.

30 Agēme gi ihe ndia, n’ihi na i kwasoro mba di iche iche iko, n’ihi na i jiwo arusi nile ha rua árú.

31 N’uzọ nwa-nne-gi nwanyi ka i jeworo ije; M’gēwere kwa ìko-ya nye gi ṅ’aka.

32 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Iko nwa-nne-gi nwanyi ka i gāṅu, bú iko nke miri emi nke sa-kwa-ra mbara: i gāghọ onye anāchì ọchì na onye anākwa emò: ọ nānagide ihe ri nne.

33 N’iṅubiga-manya-ókè na ihe-nb͕u ka i gējuputa, n’iko ihe-iju-anya na itọb͕ọrọ-n’efu, n’iko nwa-nne-gi nwanyi, bú Sameria.

34 I gāṅu kwa ya, ṅusia ya, ọbuná ejùjù-ya nile ka i gāracha, ara-gi abua ka i gādọwapu: n’ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

35 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N’ihi na i chezọwom, tufuem n’azu-gi, n’ihi nka gi onwe-gi būru kwa ajọ ihe-nzube-gi na ikwa-iko-gi nile.

36 Jehova we sim: Nwa nke madu, i gēkpe Ohola na Oholiba ikpe? gosi kwa ha ihe-árú nile ha.

37 N’ihi na ha akwawo iko, ọbara di kwa n’aka-ha, ọ bu kwa arusi nile ha ka ha kwasoworo iko; ọzọ kwa, umu-ha ndikom, bú ndi ha mutaram, ka ha mere ka ha gabigara ha ọku, ka o we ripia ha.

38 Ọzọ kwa, nka ka ha meworom: ha emeruwo ebe nsọm n’ubọchi ahu, me ka ubọchi-izu-ikem nile ghara idi nsọ.

39 N’ihi na mb͕e ha b͕uru umu-ha ndikom nye arusi nile ha, ha we bata n’ebe nsọm ubọchi ahu ime ka ọ ghara idi nsọ; ma, le, otú a ka ha meworo n’etiti ulom.

40 Ọzọ kwa, unu nēziga ikpọ ndikom ndi nēsi n’ebe di anya bia: bú ndi ezigaworo onye-ozi, ma, le, ha biara; ndi i sara aru n’ihi ha, de ihe n’anya-gi abua, chiri ihe-ichọ-nma chọ onwe-gi nma,

41 nọkwasi n’ihe-ndina di nsọpuru, nke table edoro n’usoro di kwa n’iru ya, ọ bu kwa ihe-nsure-ọkum nke nēsì ísì utọ na manum ka i dọbara n’elu ya.

42 Olu ìgwè madu ndi nọ n’udo di kwa nime ya: tukwasi kwa ndikom ndi sitere n’ọra madu, emewo ka ndi nāṅubiga manya ókè si n’ọzara bia; ha we tiye ọla-aka n’aka nke ndinyom ahu, na okpu-eze mara nma n’isi-ha.

43 M’we kwue okwu bayere nwanyi ahu kara nká n’ikwa-iko-ya nile, si, Ub͕u a ka ha gākwa iko nile ọ nākwa, ya onwe-ya gākwa kwa iko.

44 Ha we bakuru ya, dika madu si abakuru nwanyi nākwa iko: otú a ka ha bakuru Ohola, bakuru kwa Oholiba, bú ndinyom ahu nēzube ajọ ihe.

45 Ma ndi ezi omume, ha onwe-ha gēkpe ha ikpe nke ndinyom nākwa iko na ikpé nke ndinyom nāwusi ọbara; n’ihi na ndinyom nākwa iko ka ha bu, ọbara di kwa n’aka-ha.

46 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M’gēme ka nkpọkọta madu rigota imegide ha, M’gēwere kwa ha nye ka ha ghọ ihe-ntughari na ihe-nluta-n’agha.

47 Nkpọkọta madu ahu gēwere kwa nkume tub͕ue ha, were mma-agha-ha b͕ue ha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha gēb͕u, ulo nile ha ka ha gēsure n’ọku.

48 M’gēme kwa ka ajọ nzube kwusi n’ala-unu, ka ewe dọ ndinyom nile aka na nti, ha ewe ghara ime dika ajọ nzube-unu si di.

49 Ha gētiyekwasi kwa unu ajọ nzube-unu, ọ bu kwa nmehie nile nke arusi nile unu ka unu gēbu: unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 24

1 Okwu Jehova we ruem nti n’arọ nke-iteghete, n’ọnwa nke-iri, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, si,

2 Nwa nke madu, dere onwe-gi aha nke ubọchi a, bú ubọchi nke ta: eze Babilon kwagidere Jerusalem n’ubọchi nke ta.

3 Tu-kwa-ra ulo nnupu-isi ahu ilu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Sikwasi ite ahu, sikwasi ya, ọzọ kwa, b͕aye ya miri:

4 chikọta anu-ya abọrọ abọ nime ya, bú ọbubọ ọ bula di nma, utaku-ukwu, na ọlu-aka; kpojue ya n’ọkpukpu arọputara arọputa.

5 Were aturu arọputara arọputa n’ìgwè ewu na aturu, tukọba kwa ọkpukpu n’okpuru ya: me ya ka ọ b͕ọ nke-ọma; ka esi kwa ọkpukpu-ya nile n’etiti ya.

6 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu, bú ite nke nchara-ya di nime ya, nke nchara-ya nāpughi nime ya! weputa ya n’ọbubọ n’ọbubọ; nzà amaghi ya.

7 N’ihi na ọbara-ya adiwo n’etiti ya; n’elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya ka ọ debere ya; ọ wusighi ya n’ala, ikpuchi ya ájá;

8 ka o we me ka ọnuma rigota ibọ̀ ọ́bọ̀, ya ka M’ji tiye ọbara-ya n’elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya, ka ewe ghara ikpuchi ya.

9 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu! Mu onwem gēme kwa ka obo-ya di uku.

10 Me ka nkú ba uba, muye ọku, sizue anu ahu, me ka ofé-ya lọ alọ, ka esure kwa ọkpukpu-ya nile.

11 Guzo kwa ite ahu n’elu icheku-ọku-ya nēre ere mb͕e ihe nādighi ya, ka o we di ọku, ọla-ya ewe re ọku, iru-árú-ya ab͕aze kwa n’etiti ya, ka nchara-ya we gwusia.

12 O jiwo ndọbu nile ọ nādọbu onwe-ya n’ọlu me ka ike gwu ya: ma nchara-ya nke riri nne esighi nime ya pua; n’ọku ka nchara-ya di.

13 N’iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n’ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n’iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M’gēmewori ka ọnumam zuru ike n’aru gi.

14 Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu: ọ gābia, M’gēme kwa ya; M’gaghi-arapu, M’gaghi-eme kwa ebere, M’gaghi-echèghari; dika uzọ-gi nile si di, na dika omume-gi nile si di, otú a ka ha gēkpe gi ikpe; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15 Okwu Jehova we ruem nti, si,

16 Nwa nke madu, le, M’gaje iwere ihe-otiti napu gi onye ahu nke anya-gi nāchọsi ike: ma i gaghi-eti aka n’obi, i gaghi-akwa kwa ákwá, anya-miri agaghi-ab͕a kwa gi.

17 Ze ume, debe ọnu-gi du; i gaghi-emere ndi nwuru anwu oruru-újú, ke ihe-ike-n’isi-gi n’onwe-gi, akpukpọ-ukwu-gi ka i gētiye kwa n’ukwu-gi abua, i gaghi-ekpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-elu-gi, i gaghi-eri kwa nri ndi ọzọ.

18 M’we gwa ndi Israel okwu n’ututu; nwunyem we nwua n’anyasi: m’we me n’ututu dika ihe ahu si di enyerem n’iwu.

19 Ndi Israel we sim, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n’ebe ayi nọ, na gi onwe-gi nēme otú a?

20 M’we si ha, Okwu Jehova rurum nti, si,

21 Si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M’gaje ime ka ebe nsọm ghara idi nsọ, bú ihe-npako nke ike-unu, na ihe anya-unu abua nāchọsi ike, na ihe nke nkpuru-obi-unu nwere ọmiko n’aru ya; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom, ndi unu rapuworo, gāda kwa site na mma-agha.

22 Ma unu gēme dika m’meworo: unu agaghi-ekpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-unu, unu agaghi-eri kwa nri nke ndi ọzọ.

23 Ihe-ike-n’isi-unu gādi kwa unu n’isi, akpukpọ-ukwu-unu gādi kwa n’ukwu-unu: unu agaghi-eti aka n’obi, unu agaghi-akwa kwa ákwá; ma unu gāta aru n’ajọ omume nile unu, surita onwe-unu ude.

24 Ezikiel ewe ghọrọ unu ihe-ebube; dika ihe nile nke o meworo si di, otú a ka unu gēme: mb͕e nka gābia, unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

25 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ọ̀ gaghi-adi n’ubọchi mb͕e M’napuru ha ebe-ha siri ike, bú ihe-obi-utọ nke ima-nma-ha, na ihe anya-ha abua nāchọsi ike, na ihe ha buliworo nkpuru-obi-ha nye, bú umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,

26 ọ̀ gaghi-adi n’ubọchi ahu na onye b͕apuru ab͕apu gābiakute gi, ime ka i were nti-gi abua nu ya?

27 N’ubọchi ahu ka agāsaghe ọnu-gi n’ebe onye b͕apuru ab͕apu nọ, i gēkwu kwa okwu, ghara ida kwa ob͕i ọzọ: i we ghọrọ ha ihe-ebube; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 25

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, che iru-gi n’ebe umu Amon nọ, bue amuma megida ha:

3 si umu Amon, Nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na i siri, Ehe, megide ebe nsọm, mb͕e emere ya ka ọ ghara idi nsọ; na imegide ala Israel, mb͕e ọ tọb͕ọrọ n’efu; na imegide ulo Juda, mb͕e ha gara ije biri n’ala ọzọ:

4 n’ihi nka, le, M’gaje iwere gi nye umu Iru-anyanwu ibu ihe ha nwetara, ha gēdo kwa ebe-ulo-ikwū nile ha nime gi, me ebe-obibi nile ha nime gi; ndi ahu gēri nkpuru-gi, ọ bu kwa ndi ahu gāṅu miri-ara-ehi-gi.

5 M’gēme kwa ka Raba ghọ ebe-obibi nke camel, me kwa ka umu Amon ghọ ebe-nmakpu nke ìgwè ewu na aturu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

6 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na i kuwo aka, zọ ukwu n’ala, ṅuria ọṅu na nleli-gi nile nime nkpuru-obi-gi megide ala Israel;

7 n’ihi nka, le, Mu onwem esetiwo akam n’aru gi, M’gēwere kwa gi nye ka i ghọrọ mba nile ihe-nluta-n’agha; M’gēbipu kwa gi n’aru ndi nile di iche iche, me ka i si n’ala nile la n’iyì: M’gēkpochapu gi: i we mara na Mu onwem bu Jehova.

8 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na Moab na Sia nāsi, Le, ulo Juda di ka mba nile;

9 n’ihi nka, le, M’gaje imeghe akuku Moab site n’obodo ahu nile, site n’obodo-ya nile nke di na nsọtu-ala-ya, nke bu ima-nma nke ala ahu, bú Bet-jeshimot, na Beal-meon, na Kiriataim,

10 nye umu Iru-anyanwu, tiyere umu Amon, M’gēwere kwa ya nye ka ọ buru ihe ha nwetara, ka ewe ghara icheta umu Amon n’etiti mba nile:

11 ọ bu kwa Moab ka M’gēme ihe nile ekpere n’ikpe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

12 Otù a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na Edom emegidewo ulo Juda n’ibọ̀ ọ́bọ̀, na n’ihi na ikpe amawo ha nke-uku, ha we bọrọ onwe-ha ọbọ n’aru ha;

13 n’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M’gēseti kwa akam n’aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.

14 M’gēsi kwa n’aka ndim, bú Israel, tukwasi Edom ibọ̀-ọ́bọ̀m; ha ewe me n’Edom dika iwem si di na dika ọnumam si di: ha ewe mara ibọ̀-ọ́bọ̀m; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na ndi Filistia emesowo Juda n’ibọ̀-ọ́bọ̀, bọ̀ ọ́bọ̀ na nlelì nke di nime nkpuru-obi-ha ibibi ya n’iro ebighi-ebi;

16 n’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, Le, M’gaje iseti akam n’aru ndi Filistia, bipu ndi Keret, me ka ndi ọnu-miri oké osimiri fọduru la n’iyì.

17 M’gēji kwa iba-nba nile nke ọnuma bọ̀ ha ọ́bọ̀ nile di uku; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’gātukwasi ha ibọ̀-ọ́bọ̀m.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 26

1 O rue, n’arọ nke-iri-na-otù, n’ubọchi mbu nke ọnwa, na okwu Jehova rurum nti, si,

2 Nwa nke madu, n’ihi na Taia ekwuwo okwu megide Jerusalem, si, Ehe, etipiawo ya, bú obodo nke bu ọnu-uzọ ndi nile di iche iche; o chighariwo n’ebe m’nọ: m’gēju eju, emewo ya nkpọnkpọ ebe:

3 n’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, Taia, M’gēme kwa ka ọtutu mba rigota imegide gi, dika oké osimiri si eme ka nmali-miri-ya nile rigota.

4 Ha gēbibi kwa mb͕idi nile nke Taia, kwatue ulo-elu-ya nile: M’gākọchapu kwa ájá-ya n’aru ya, me ya ka ọ ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya.

5 Ebe ib͕asa ub͕u ka ọ gābu n’etiti oké osimiri; n’ihi na Mu onwem ekwuwo okwu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ gāghọ-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n’agha.

6 Ma umu-ya ndinyom ndi nọ n’ọhia, agēji mma-agha b͕ue ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

7 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M’gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n’Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.

8 Umu-gi ndinyom ndi nọ n’ọhia ka ọ gēji mma-agha b͕u: ọ gēwu kwa ulo-agha megide gi, wukọta obo-ihe imegide gi, welie ọta uku imegide gi.

9 Ọzọ, ihe-ya eji akwatu mb͕idi ka ọ gādọba imegide mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo-elu-gi nile ka o gēji mma-agha-ya kwada.

10 Site n’ìgwè inyinya-ya ájá-ha gēkpuchi gi: site n’olu ndi-inyinya, na nke wheel nākpọre akpọre, na nke ub͕ọ-ala, mb͕idi-gi nile gēme nkpatu, mb͕e ọ nābata n’ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika esi abata n’obodo nke ab͕awara ab͕awa.

11 O gēji ukwu inyinya-ya nile zọtọ èzí-gi nile: ndi-gi ọ gēji mma-agha b͕u, ogidi nile nke ike-gi gārida n’ala.

12 Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n’agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n’etiti miri.

13 M’gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.

14 M’gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n’ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Taia: Ọ̀ bughi site n’olu ọdida-gi, mb͕e ndi emeruru emeru nāsu ude, mb͕e anēb͕u eb͕u nke-uku n’etiti gi, ka agwe-etiti nile nēme nkpatu?

16 Ndi-isi nile nke oké osimiri gēsi n’oche-eze-ha ridata, chizuga uwe-nwuda-ha, ọ bu kwa uwe nile ha akpara nke-ọma ka ha gēyipu: ọma-jijiji nile ka ha gēyibe dika uwe; n’ala ka ha gānọdu, ma jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, ihe-gi gēju kwa ha anya.

17 Ha gēbuli kwa abù-ákwá bayere gi, si gi, Le, otú i laworo n’iyì, gi obodo nke madu biri nime gi, bú ndi sitere n’oké osimiri nile, gi obodo nke anēto eto, nke diri ike n’oké osimiri, ya onwe-ya na ndi bi ya, ndi mere ka ndi nile ndi bi nime ya tua ujọ ha!

18 Ub͕u a ka agwe-etiti gāma jijiji n’ubọchi ọdida-gi; e, ibobo gānwu agwe-etiti nile nke di n’oké osimiri n’aru n’ọpupu-gi.

19 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M’gēme gi nkpọnkpọ obodo, dika obodo nile nke madu nēbighi; mb͕e M’gēme ka ob͕u-miri rigokwasi gi, mb͕e ọtutu miri gēkpuchi gi;

20 M’gēme kwa ka i rida, gi na ndi nārida n’olùlù, ijekuru ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, M’gēme kwa ka i bi n’ala di n’okpuru uwa, n’ebe di nkpọnkpọ site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, gi na ndi nārida n’olùlù, ka madu we ghara ibi nime gi; M’gētiye kwa ima-nma n’ala ndi di ndu:

21 ihe-ima-jijiji ka m’gēme gi ka i buru, i gaghi-adi kwa ọzọ: agāchọ kwa gi, ma agaghi-achọta kwa gi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 27

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buliere Taia abù-ákwá;

3 si Taia, Gi onye bi na ab͕ata oké osimiri, onye bu onye-ahia nke ndi nile di iche iche rue ọtutu agwe-etiti, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Taia, gi onwe-gi asiwo, Mu onwem bu ebe mazuru nma.

4 N’etiti oké osimiri ka ókè-ala-gi nile di, ndi wuworo gi emewo ka ima-nma-gi zue okè.

5 Osisi fir nke si na Senia aputa ka ha jiworo mere gi ibo-ub͕ọ nile: osisi cedar nke si na Lebanon aputa ka ha wereworo imere gi akpu-ub͕o.

6 Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n’osisi igbe nke si n’agwe-etiti Kitim aputa, me.

7 Ezi ákwà ọcha nke akpara nke-ọma, bú nke si n’Ijipt aputa, ka ákwà-ifufe-gi buworo, iburu gi ọkọlọtọ; ákwà anunu na ákwà ododo nke si n’agwe-etiti Elaisha aputa ka ákwà-ǹdò-gi buworo.

8 Ndi bi na Zaidon na Avad abuworo gi ndi-umara: ndi-gi ndi mara ihe, gi Taia, anọwo nime gi, ha onwe-ha bu ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi.

9 Ndi-okenye Gebal na ndi-ya ndi mara ihe anọwo nime gi buru ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi: ub͕ọ nile nke oké osimiri na ndi-ub͕ọ-ha anọwo nime gi izu ahia gi.

10 Peasia na Lud na Put anọwo n’usu-ndi-agha-gi, ha bu ndi-agha-gi: ọta na okpu-agha ka ha kobere nime gi; ndi ahu gosiri ima-nma-gi.

11 Umu Avad na usu-ndi-agha-gi nọ n’elu mb͕idi-gi nile buruburu, Gamadim anọwo kwa n’ulo-elu-gi nile: ọta-ha ka ha kokwasiri na mb͕idi-gi nile buruburu; ndi ahu emewo ka ima-nma-gi zue oké.

12 Tashish bu onye-ahia-gi site n’iba-uba nke àkù nile ọ bula; ọla-ọcha na ígwè na b͕amb͕am na opù ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi nile.

13 Jevan, na Tubal, na Meshek, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: madu onwe-ha na ihe di iche iche nke ọla ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi.

14 Ndi ulo Togama chiri inyinya na ndi-inyinya na inyinya mule zua ihe-ahia-gi nile.

15 Umu Dedan bu ndi-ahia-gi: ọtutu agwe-etiti bu ahia aka-gi: ezé enyi na osisi ebony ka ha butere dika ùtú-gi.

16 Siria bu Onye-ahia-gi site n’iba-uba nke ihe di iche iche i mere ire ere: emerald, na ákwà ododo, na ákwà akpara nke-ọma, na ezi ákwà ọcha, na coral, na ruby, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi nile.

17 Juda na ala Israel, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ọka wheat nke Minit, na pannag, na manu-aṅu, na manu, na balm, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi.

18 Damaskọs bu onye-ahia-gi n’ihi iba-uba nke i mere ire ere, site n’iba-uba nke àkù nile ọ bula; o jiri manya-vine Helbon na aji-anu di ọcha zu.

19 Vedan na Jevan nēwere ogho aturu atu zua ihe-ahia-gi nile: ígwè nwupuru enwupu, na cassia, na calamus, adiwo n’etiti ihe-izu-ahia-gi.

20 Dedan bu onye-ahia-gi n’ákwà sara mbara iji nọkwasi inyinya.

21 Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n’umu-aturu na ebulu na ewu, n’ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.

22 Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.

23 Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.

24 Ndi ahu bu ndi-ahia-gi n’ihe di iche iche mazuru nma, n’ulo ákwà anunu na ákwà akpara nke-ọma, na n’ib͕e juputara n’uwe turu agwa nke-ọma, nke eji udọ̀ ke were kwa osisi cedar me ha, n’etiti ihe-ahia-gi.

25 Ub͕ọ nile nke Tashish bu usu-ndi-ahia-gi iweta ihe-izu-ahia-gi: i we ju eju, di nsọpuru nke-uku n’etiti oké osimiri nile.

26 Ọ bu ọtutu miri ka ndi nānyà gi meworo gi ka i ba: ifufe Iru-anyanwu etiwawo gi n’etiti oké osimiri nile.

27 Àkù-gi, na ihe-ahia-gi nile, na ihe-izu-ahia-gi, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi, na ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi, na ndi nāzu ahia-gi, na ndi-agha-gi nile, ndi nọ nime gi, na nime nkpọkọta-madu nile nke gi nke di n’etiti gi, gādabà n’etiti oké osimiri nile n’ubọchi ọdida-gi.

28 N’olu iti-nkpu nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi azu-obodo-gi nile gēme nkpatu.

29 Ndi nile ndi nānya umara, na ndi-ub͕ọ, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ nile nke oké osimiri, gēsi kwa n’ub͕ọ-ha ridata, n’elu ala ka ha gēguzo,

30 me ka anuru olu-ha n’elu gi, tie nkpu ilu, kpokwasi ájá n’isi-ha, na ntu ka ha gāturu onwe-ha:

31 ha gēme-kwa-ra onwe-ha isi-nkwọcha n’ihi gi, ke ákwà-nkpe n’úkwù, kwara gi ákwá n’idi-ilu nke nkpuru-obi n’iti-aka-n’obi di ilu.

32 Ha gēbuliri gi abù-ákwá n’igo-ákwá-ha, bùara gi abù-ákwá, si, Ònye di ka Taia, ònye di ka obodo ahu nke emere ka o dere du n’etiti oké osimiri?

33 Mb͕e ihe-ahia-gi nile siri n’oké osimiri nile puta, i mere ka afọ ju ọtutu ndi di iche iche; i jiri iba-uba nke àkù-gi na nke ihe-izu-ahia-gi nile me ndi-eze nke uwa ka ha buru ọgaranya.

34 Na mb͕e etiwara gi site n’oké osimiri nile n’ebe miri emi nke miri, ihe-izu-ahia-gi na nkpọkọta-madu nile nke gi dara ada n’etiti gi.

35 I juwo ndi nile bi n’agwe-etiti nile anya, ndi-eze-ha atuwo ujọ nke-uku, iru-ha ab͕arusiwo.

36 Ndi-ahia n’etiti ndi nile di iche iche amawo gi ọsọ; oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 28

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, si onye-ndú Taia, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ihi na obi-gi adiwo elu, i we si, Chi ka m’bu, n’ọnọdu Chineke ka m’nānọkwasi, n’etiti oké osimiri nile; ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, i we do obi-gi ka obi Chineke:

3 le, onye nke mara ihe ka i bu karia Daniel; ọ dighi ihe-nzuzo ha zonariworo gi:

4 i jiwo amam-ihe-gi, ji kwa nghọta-gi, lutara onwe-gi àkù, i we luta ọla-edo na ọla-ọcha n’àkù-gi nile:

5 i jiwo iba-uba nke amam-ihe-gi, ji kwa ọzuzu-ahia-gi, me ka àkù-gi ba uba, obi-gi we di elu n’ihi àkù-gi:

6 n’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N’ihi na i doworo obi-gi ka obi Chineke,

7 n’ihi nka, le, M’gēme ka ndi ala ọzọ biakwasi gi, bú ndi kachasi mba nile n’ime ka madu ma jijiji: ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide ima-nma nke amam-ihe-gi, me ka onwunwu-ìhè-gi ghara idi nsọ.

8 Rue olùlù ka ha gēme ka i rida; i gānwu kwa ọnwu nke ndi eb͕uru eb͕u, n’etiti oké osimiri nile.

9 Ì gāsi n’ezie, Chineke ka m’bu, n’iru onye nēb͕u gi? ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, n’aka onye nēme gi ka i ghara idi nsọ.

10 Ọnwu nke ndi anēbighi úgwù ka i gānwu site n’aka ndi ala ọzọ: n’ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

11 Okwu Jehova we ruem nti, si,

12 Nwa nke madu, buliere eze Taia abù-ákwá, si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Gi onwe-gi bu onye nākachi ọtùtù-ihe akàrà, nke juputara n’amam-ihe, mazu kwa nma.

13 N’Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n’ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.

14 Gi onwe-gi bu cherub ahu etere manu nke nēkpuchi ekpuchi: M’we do gi, n’ugwu nsọ nke Chineke ka i nọrọ; n’etiti nkume ọku ka i jeghariworo.

15 Onye zuru okè ka i bu n’uzọ-gi nile n’ubọchi ekère gi, rue mb͕e ahuru ajọ omume nime gi.

16 Ha ejiwo iba-uba nke ọzuzu-ahia-gi mejue etiti-gi n’ihe-ike, i we mehie: M’we me ka i si n’ugwu Chineke pua dika ihe nādighi nsọ; M’we me ka i la n’iyì, gi cherub nke nēkpuchi ekpuchi, pua n’etiti nkume ọku.

17 Obi-gi adiwo elu n’ihi ima-nma-gi, i bibiwo amam-ihe-gi n’ihi onwunwu-ìhè-gi: n’ala ka M’tudaworo gi, n’iru ndi-eze ka M’tọb͕ọworo gi n’ala, ka ha we lekwasi gi.

18 Site n’iba-uba nke ajọ omume-gi, n’ajọ omume nke ọzuzu-ahia-gi, ka i meworo ebe nsọ gi ka ha ghara idi nsọ: M’we me ka ọku si n’etiti gi puta, nke ahu eripiawo gi, M’we me ka i ghọ ntu n’elu ala n’anya ndi nile nāhu gi.

19 I juwo ndi nile mara gi n’etiti ndi nile di iche iche anya: oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

20 Okwu Jehova we ruem nti, si,

21 Nwa nke madu, che iru-gi n’ebe Zaidon di, bue amuma megide ya,

22 si, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Zaidon; ewe sọpurum n’etiti gi: ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’mesiri nime ya ihe nile ekpere n’ikpe, ewe dom nsọ nime ya.

23 N’ihi na Mu onwem gēzite ajọ ọria nēfe efe na ọbara nime ya n’èzí-ya nile; ndi eb͕uru eb͕u gāda kwa n’etiti ya mb͕e mma-agha di n’aru ya buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

24 Uke nke nādu adu agaghi-adi-kwa-ra ulo Israel ọzọ, ogwu nke nēb͕u nb͕u agaghi-adi kwa sitere na ndi nile nọ ha buruburu, ndi nēlelì ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

25 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M’gāchikọputawori ulo Israel n’etiti ndi nile di iche iche, bú ndi ha b͕asaworo n’etiti ha, mb͕e agēdoworim nsọ nime ha n’anya mba nile, ha gēbi kwa n’elu ala-ha, nke M’nyere orùm, bú Jekob.

26 Ha gēbi n’elu ya na ntukwasi-obi; ha gēwu kwa ulo, kua ubi-vine, biri na ntukwasi-obi; mb͕e M’mesiri ihe nile ekpere n’ikpe n’aru ndi nile nēlelì ha n’ebe nile di ha buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 29

1 N’arọ nke-iri, n’ọnwa nke-iri, n’ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa ahu, okwu Jehova rurum nti, si,

2 Nwa nke madu, che iru-gi imegide Fero, bú eze Ijipt, bue amuma megide ya, megide kwa Ijipt nile:

3 Kwue okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Fero, eze Ijipt, bú ogologo anu ahu nke nāmakpu n’etiti osimiri Nail-ya nile, nke siworo, Mu nwe Nail nkem, ọ bu kwa mu onwem mere ya n’onwem.

4 M’gētiye kwa nb͕a-aka-imi n’àb͕à-gi abua, me ka azù nke osimiri Nail i nile rapara n’akpirikpa-gi; M’gēme kwa ka i si n’etiti osimiri Nail i nile rigoputa, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile nke nārapara n’akpirikpa-gi.

5 M’gātusa kwa gi n’ọzara, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile: n’ọhia ka i gāda; agaghi – achikọta gi, agaghi-ekpokọta kwa gi: anu-ọhia nke uwa na anu-ufe nke elu-igwe ka M’wereworo gi nye ka i ghọ ihe-oriri.

6 Ndi nile bi n’Ijipt gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, n’ihi na ha aburuworo ulo Israel nkpa-n’aka nke bu nání amì.

7 Mb͕e ha jidere gi n’aka, i we nyajie, dọwara ha ubu nile: na mb͕e ha dabere gi, i we b͕ajie, me ka úkwù nile guzoro ha.

8 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M’gaje ime ka mma-agha biakwasi gi, M’gēbipu kwa madu na anumanu nime gi.

9 Ala Ijipt gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu na nkpọnkpọ ebe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n’ihi na ọ siwo, Mu nwe osimiri Nail, ọ bu kwa onwem mere ya.

10 N’ihi nka, le, Mu nēmegide gi, megide kwa osimiri Nail i nile, M’gēme kwa ka ala Ijipt ghọ nání nkpọnkpọ ebe nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n’efu, site na Migdol rue Sevene, ọbuná rue ókè-ala Etiopia.

11 Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua.

12 M’gēme kwa ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n’efu n’etiti ala nile tọb͕ọrọ n’efu, ọzọ, obodo-ya nile nke di n’etiti obodo nile nke emeworo nkpọnkpọ ebe gābu ebe tọb͕ọrọ n’efu ọgu arọ abua: M’gāchusa kwa ndi Ijipt n’etiti mba nile, fesa ha n’ala nile.

13 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ọgwugwu ọgu arọ abua ka M’gāchikọputa ndi Ijipt nime ndi nile di iche iche ebe achusara ha:

14 M’gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n’agha laghachi, M’gēme kwa ka ha laghachi n’ala Patros, n’ala nputa-n’uwa-ha; ha ewe nọ n’ebe ahu, buru ala-eze di ala.

15 Ọ gādi ala kari ala-eze nile; ọ gaghi-ebuli kwa onwe-ya ọzọ n’elu mba nile: M’gēme kwa ka ha di ole-na-ole, ka ha ghara inwe ike n’aru mba nile.

16 Ọ gaghi-abu-kwa-ra ulo Israel ihe-ntukwasi-obi nēme ka echeta ajọ omume, mb͕e ha nēche iru ile ha anya n’azu: ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.

17 O rue, n’arọ nke-oru-na-asa, n’ọnwa mbu, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

18 Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n’aka Taia, n’ihi òfùfè ahu o fère megide ya.

19 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M’gaje inye Nebukadreza, bú eze Babilon, ala Ijipt; ọ gāchilaga kwa ìgwè ndi-ya, kwata ihe-nkwata-ya, luta ihe-nluta-ya n’agha; o we buru ugwọ-ọlu agākwu usu-ndi-agha-ya.

20 Enyewom ya ala Ijipt ibu ihe ọ lutara n’ọlu, bú nke o fère òfùfè n’ihi ya, n’ihi na ha lurum ọlu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

21 N’ubọchi ahu ka M’gēme ka otù mpi puere ulo Israel, ọ bu kwa gi ka M’gēnye nsaghe-ọnu n’etiti ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 30

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Kwasienu ákwá ike, si, Azib͕a ub͕ochi ahu!

3 N’ihi na ubọchi di nso, ọ di nso, bú ubọchi Jehova nwere, ọ bu ubọchi igwe-oji; mb͕e nke mba di iche iche ka ọ gābu.

4 Mma-agha gābiakwasi kwa n’Ijipt, ihe-nb͕ali gādi kwa n’Etiopia, mb͕e ndi eb͕uru eb͕u gāda n’Ijipt; ha ewe chipu ìgwè ndi-ya, kwatue ntọ-ala-ya nile.

5 Etiopia, na Put, na Lud, na ndi nile gwara ọgwa, na Kub, na umu nke ala nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, gēso ha da site na mma-agha.

6 Otú a ka Jehova siri: Ndi nākwagide Ijipt gāda kwa, npako nke ike-ya gārida kwa: site na Migdol rue Sevene, ọ bu site na mma-agha ka ha gāda nime ya; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

7 Ha gātọb͕ọrọ kwa n’efu n’etiti ala nile nke tọb͕ọrọ n’efu, obodo-ya nile gādi kwa n’etiti obodo nile nke bu nkpọnkpọ.

8 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’tiyesiri ọku n’Ijipt, na mb͕e etijisiri ndi nile nēyere ya aka.

9 N’ubọchi ahu ndi-ozi gēsi n’irum pua je n’ub͕ọ di iche iche ime ka Etiopia ma jijiji, bú ndi nọ na ntukwasi-obi; ihe-nb͕ali gādi kwa n’aru ha, dika n’ubọchi Ijipt, n’ihi na, le, ọ nābia.

10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M’gēme kwa ka ìgwè ndi Ijipt kwusi, n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon.

11 Ya onwe-ya na ndi-ya so ya, bú ndi kachasi mba nile n’ime ka madu ma jijiji, agaje ime ka ha bata ibibi ala ahu; ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide Ijipt, ha gēmeju kwa ala ahu na ndi eb͕uru eb͕u.

12 M’gēme kwa ka osimiri Nail nile ghọ ebe kpọrọ nku, M’gēre kwa ala ahu n’aka ndi ọjọ, me ka ala ahu na ùjú-ya tọb͕ọrọ n’efu, site n’aka ndi ala ọzọ: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.

13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M’gēme kwa ka arusi nile la n’iyì, M’gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n’ala Ijipt puta ọzọ: M’gētiye kwa egwu n’ala Ijipt.

14 M’gēme kwa ka Patros tọb͕ọrọ n’efu, M’gētiye kwa ọku nime Zoan, me kwa ihe nile ekpere ikpe nime No.

15 M’gāwukwasi kwa ọnumam nime Sin, bú ebe siri ike nke Ijipt; M’gēbipu igwè ndi No.

16 M’gētiye kwa ọku n’Ijipt; Sin gāb͕ali nke-uku, No ka agētipu: Nof gēnwe kwa ndi-nkpab͕u ogologo ubọchi nile.

17 Umu-okorọbia nke Even na Pi-beset gāda site na mma-agha: obodo ndia gāla na ndọta-n’agha.

18 Ọ bu kwa na Tehafnehes ka ubọchi gāb͕a ọchichiri, mb͕e M’gāb͕aji yoke nile nke Ijipt n’ebe ahu, npako nke ike-ya gākwusi kwa nime ya: ya onwe-ya, igwe-oji gēkpuchi ya, umu-ya ndinyom gāla kwa na ndọta-n’agha.

19 M’gēme kwa ihe nile ekpere n’ikpe n’Ijipt: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

20 O rue, n’arọ nke iri-na-otù, n’ọnwa mbu, n’ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

21 Nwa nke madu, ogwe-aka nke Fero, bú eze Ijipt, ka m’b͕ajiworo; ma, le, ekegideghi ya itiye ọgwù-ọgwugwọ di iche iche, ido ákwà-ọkiké ikegide ya, ka o we sie ike ijide mma-agha.

22 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide Fero, bú eze Ijipt, M’gāb͕aji kwa ogwe-aka-ya abua, ma nke siri ike, ma nke b͕ajiri ab͕aji; M’gēme kwa ka mma-agha-ya si n’aka-ya da.

23 M’gāchusa kwa ndi Ijipt n’etiti mba nile, fesa kwa ha n’ala nile.

24 M’gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, M’gētiye kwa mma-agham n’aka-ya: ma M’gāb͕aji ogwe-aka abua nke Fero, ọ gāsu kwa ude nke onye emeruru aru nke-uku n’iru ya.

25 M’gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, ma ogwe-aka abua nke Fero gāda; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’gētiye mma-agham n’aka eze Babilon, ọ we setipu ya n’ebe ala Ijipt di.

26 M’gāchusa kwa ndi Ijipt n’etiti mba nile, fesa kwa ha n’ala nile; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.