Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 11

1 Mọ Chineke we buliem, me ka m’biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n’Iru-anyanwu: ma, le, n’oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m’we hu n’etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel.

2 Ọ we sim, Nwa nke madu, ndia bu ndikom ahu ndi nēchè ajọ ihe, ndi nādu kwa ọdu ọjọ n’obodo a:

3 ndi nāsi, Mb͕e iwu ulo adighi nso: obodo nka bu ite, ayi onwe-ayi bu kwa anu.

4 N’ihi nka bue amuma megide ha, bue amuma, nwa nke madu.

5 Mọ nke Jehova we dakwasim, O we sim, Si, Otú a ka Jehova siri: Otú a ka unu siri, unu ulo Israel; ọbuná ihe nile nke nābata nime mọ-unu, Mu onwem mara ya.

6 Unu emewo ka ndi-unu eb͕uru eb͕u n’obodo a ba uba, unu emejuwo kwa èzí nile ya na ndi eb͕uru eb͕u.

7 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ndi-unu eb͕uru eb͕u ndi unu tọb͕ọworo n’etiti ya, ha onwe-ha bu anu, obodo nka bu kwa ite: ma unu ka M’gēme ka unu si nime ya puta.

8 Mma-agha ka unu tuworo egwu ya; ọ bu kwa mma-agha ka M’gēme ka ọ biakwasi unu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9 M’gēme kwa ka unu si n’etiti ya puta, M’gēnye kwa unu n’aka ndi ala ọzọ, me ihe nile ekpere n’ikpe n’etiti unu.

10 Site na mma-agha ka unu gāda; n’ókè-ala Israel ka M’gēkpe unu ikpe; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

11 Obodo nka agaghi-aghọrọ unu ite, unu onwe-unu agaghi-aghọ kwa anu n’etiti ya; n’ókè-ala Israel ka M’gekpe unu ikpe;

12 unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n’ihi na n’ukpurum nile ka unu nējegharighi, ọ bu kwa ihe nile nke M’kpere n’ikpe ka unu nēmeghi, kama ọ bu dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo.

13 O rue, mb͕e M’buru amuma, na Pelataia nwa Benaia nwuru. M’we da kpue irum n’ala, tie nkpu n’oké olu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ọ̀ bu ka ndi Israel fọduru gwusia ka Gi onwe-gi nēme?

14 Okwu Jehova we ruem nti, si,

15 Nwa nke madu, umu-nne-gi, ọbuná umu-nne-gi, bú ndi-nb͕aputa-gi, na ulo Israel nile, ha nile, ọ bu ha ka ndi bi na Jerusalem siri, Sinu n’ebe Jehova nọ je n’ebe di anya; ọ bu ayi ka enyeworo ala nka ka ọ buru ihe-nnweta:

16 n’ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ebe M’meworo ka ha je n’ebe di anya n’etiti mba nile, ebe M’chusawo-kwa-ra ha n’ala nile, M’gāghọ-kwa-ra ha ebe nsọ nwa mb͕e ntà n’ala nile ebe ha bàworo.

17 N’ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M’gāchikọputa unu nime ndi nile di iche iche, me kwa ka unu si n’ala nile ebe achusaworo unu zukọta, M’gēnye kwa unu ala Israel.

18 Ha gābà kwa n’ebe ahu, ha gēsi kwa na ya wezuga ihe-ya nile jọb͕uru onwe-ha, na ihe-árú-ya nile.

19 M’gēnye kwa ha otù obi, ọ bu kwa mọ ọhu ka M’gētiye nime unu; M’gēwezuga kwa obi nkume n’anu-aru-ha, nye ha obi anu-aru:

20 ka ha we jegharia n’ukpurum nile, debe kwa ikpém nile, me ha: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke.

21 Ma ndi obi-ha nējeso obi nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha na ihe-árú nile ha, uzọ-ha ka M’gātukwasi n’isi ha; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

22 Cherubim ahu we chilie nkù-ha, wheel nile ha di kwa n’akuku ha; ebube nke Chineke nke Israel di kwa n’elu ha n’elu.

23 Ebube Jehova we si n’etiti obodo ahu rigo, guzo n’elu ugwu ahu nke di n’akuku Iru-anyanwu nke obodo ahu.

24 Ma Mọ Chineke bulirim, me ka m’bata na Kaldea biakute ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, n’ọhuhu-ihe ahu nime Mọ Chineke. Ọhuhu-ihe ahu nke m’hururi we si n’ebe m’nọ rigo.

25 M’we gwa ndi ahu emere ka ha je biri n’ala ọzọ ihe nile nke Jehova mere ka m’hu.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 12

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, n’etiti ulo nnupu-isi ahu ka i bi, bú ndi nwere anya ihu uzọ, ma ha ahughi, ndi nwere nti inu ihe, ma ha anughi; n’ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

3 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi ihe di iche iche nke ndi anēme ka ha je biri n’ala ọzọ, je biri n’ala ọzọ n’ehihie n’anya-ha; i gēsi kwa n’ọnọdu-gi je biri n’ebe ọzọ n’anya-ha: eleghi anya ha gāhu, n’ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

4 I gēbuputa kwa ihe-gi nile n’ehihie n’anya-ha, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n’ala ọzọ: gi onwe-gi gāpu kwa n’anyasi n’anya-ha, dika ọpupu nke ndi anēme ka ha je biri n’ala ọzọ.

5 Gwupuere onwe-gi mb͕idi n’anya-ha, si n’ebe ahu bupu ihe.

6 N’anya-ha ka i gēbu ya n’ubu-gi, n’ọchichiri ka i gēbupu ya; iru-gi ka i gēkpuchi, ka i we ghara ihu ala: n’ihi na ewereworo gi nye ulo Israel ka i buru ihe-ebube.

7 M’we me otú a, dika enyerem iwu: ihem nile ka m’buputara n’ehihie, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n’ala ọzọ, n’anyasi m’we ji akam gwupuere onwem mb͕idi; n’ọchichiri ka m’bupuru ya, n’ubum ka m’buru ya n’anya-ha.

8 Okwu Jehova we ruem nti n’ututu, si,

9 Nwa nke madu, hà asighi gi, bú ulo Israel, ulo nke nnupu-isi ahu, Gini ka gi onwe-gi nēme?

10 Si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye-isi nke nọ na Jerusalem ka eboro ibu a, ya na ulo Israel nile nke ndi ahu nọ n’etiti ha.

11 Si, Mu onwem bu ihe-ebube-unu: dika m’meworo, otú a ka agēme ha: ọ bu n’ime ka ha je biri n’ala ọzọ, n’idọta ha n’agha, ka ha gāla.

12 Onye-isi ahu kwa nke nọ n’etiti ha, n’ubu-ya ka o gēbu ihe n’ọchichiri, we pua: mb͕idi ka ha gēgwupú isi na ya bupu ihe: iru-ya ka o gēkpuchi, n’ihi na ya onwe-ya agaghi-eji anya-ya hu ala ahu.

13 M’gāb͕asa kwa ub͕um n’aru ya, agāma kwa ya n’ọnyàm: M’gēme kwa ka ọ biarue Babilon, bú ala ndi Kaldea; ma ala ahu ka ọ nāgaghi-ahu, ma n’ebe ahu ka ọ gānwu.

14 Ọ bu kwa ndi nile ndi di ya buruburu iyere ya aka, na usu-ndi-agha-ya nile, ka M’gēfesara ifufe nile ọ bula; ọ bu kwa mma-agha ka M’gāmiputa n’azu ha.

15 Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’gāchusa ha n’etiti mba nile, fesa kwa ha n’ala nile.

16 Ma M’gēme ka ndikom ole-na-ole nime ha fọdu pua na mma-agha, na n’oké unwu, na n’ajọ ọria nēfe efe; ka ha we kọ akukọ ihe-árú nile ha n’etiti mba nile ebe ha gābiawori; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

17 Okwu Jehova we ruem nti, si,

18 Nwa nke madu, nri-gi ka i gēwere ime-nkpatu rie, miri-gi ka i gēwere kwa ọma-jijiji na ncheb͕u ṅua;

19 i gāsi kwa ndi ala nka, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere ndi bi na Jerusalem, baye-kwa-ra ala Israel, si: Nri-ha ka ha gēwere ncheb͕u rie, miri-ha ka ha gēwere kwa iju-anya ṅua, ka ala-ya we tọb͕ọrọ n’efu ghara inwe ùjú-ya, site n’ihe-ike nke ndi nile bi nime ya.

20 Agēme kwa ka obodo-ya nile ebi ebi ghọ nkpọnkpọ ebe, ala gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu, unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

21 Okwu Jehova we ruem nti, si,

22 Nwa nke madu, Gini bu ilu a unu nwere n’ala Israel, si, Ha di anya, bú ubọchi ahu, ọhù nile ọ bula alawo kwa n’iyì?

23 N’ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M’gēme ka ilu a kwusi, ha agaghi-atu kwa ya dika ilu n’Israel ọzọ; kama gwa ha okwu, si, Ha di nso, bú ubọchi ahu, ha na okwu ọhù ọ bula.

24 N’ihi na ọhù efu ọ bula, ma-ọbu iju-ase ire-utọ, agaghi-adi kwa n’etiti ulo Israel.

25 N’ihi na Mu onwem bu Jehova; M’gēkwu okwu, okwu nke M’gēkwu, agēme kwa ya; agaghi-eme kwa ya ka ọ di anya ọzọ: n’ihi na n’ubọchi-unu, unu ulo nke nnupu-isi, ka M’gēkwu okwu, me ya; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

26 Okwu Jehova we ruem nti, si,

27 Nwa nke madu, le, ulo Israel nāsi, Ọhù ahu nke ya onwe-ya nāhu diri ọtutu ubọchi di n’iru, ọ bu kwa mb͕e di anya ka ya onwe-ya nēburu amuma.

28 N’ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ dighi okwu ọ bula n’okwum nile agēme kwa ka ọ di anya ọzọ, ma okwu nke M’gēkwu, agēme kwa ya; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 13

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma, gi si ndi nēbu amuma si n’obi-ha puta, Nurunu okwu Jehova;

3 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndi-amuma nzuzu, ndi nējeso mọ nke ha, na ihe nke ha nāhughi!

4 Dika nkita-ọhia nime nkpọnkpọ ebe ka ndi-amuma-gi diworo, gi Israel.

5 Unu arigoghi na ntipú, unu ab͕aghi kwa ogige nye ulo Israel, iguzo n’agha n’ubọchi Jehova.

6 Ha ahuwo ọhù efu na iju-ase ugha, bú ndi nāsi, Ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; ma Jehova eziteghi ha: ha we le anya na ha gēme ka okwu guzosie ike.

7 Ọ̀ bughi ọhù efu ka unu huworo, ọ̀ bughi kwa okwu iju-ase ugha ka unu kwuworo, mb͕e unu nāsi, Ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; ma Mu onwem ekwughi okwu?

8 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N’ihi na unu ekwuwo okwu efu, hu ọhù ugha, n’ihi nka, le, Mu nēmegide unu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9 Akam gādi kwa imegide ndi-amuma ahu ndi nāhu ọhù efu, ndi nāju kwa ase ugha: ha agaghi-adi n’ìzù nzuzo nke ndim, agaghi-ede kwa ha n’odide-akwukwọ ulo Israel, ha agaghi-abà kwa n’ala Israel; unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

10 N’ihi na, ọ bu n’ihi na ha ewezugawo ndim, si, Udo; ma udo adighi; ndim ahu nālu kwa mb͕idi nādighi ike, ma, le, ha nēte ya nzu:

11 gi si ndi nēte ya nzu, na ọ gāda: oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo; unu onwe-unu kwa, oké ákú-miri-ígwé, gāda; oké ifufe gāb͕awa kwa ya.

12 Ma, le, mb͕idi ahu adawo, àgaghi-asi unu, Òle ebe otite ahu nke unu teworo?

13 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a; M’gēwere kwa oké ifufe b͕awa ya n’ọnumam; oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo kwa n’iwem, na oké ákú-miri-ígwé n’ọnumam ime ka ọ gwusia.

14 M’gākwatu kwa mb͕idi ahu nke unu teworo nzu, M’gēme kwa ka ọ darue ala, ewe kpughepu ntọ-ala-ya: ọ gāda kwa, agēme kwa ka unu gwusia n’etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

15 Otú a ka M’gēmezu ọnumam n’aru mb͕idi ahu na n’aru ndi teworo ya nzu; M’gāsi kwa unu, Mb͕idi ahu adighi, ndi nēte ya adighi kwa;

16 bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

17 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, do iru-gi imegide umu-ndinyom nke ndi-gi, ndi nēbu amuma si n’obi-ha puta; gi bue amuma megide ha,

18 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndinyom ndi nādukọta ohiri-isi n’elu nkwonkwo-aka nile, ndi nēme kwa ákwà-nb͕okwasi nye isi onye ọ bula ka ogologo-ya ra ichu ntá nkpuru-obi madu! ọ̀ bu nkpuru-obi nile nke ndim ka unu gāchu ntá, me kwa ka nkpuru-obi unu nwere di ndu?

19 Unu we me ka M’ghara idi nsọ n’etiti ndim n’ihi nju-aka ọka barley na n’ihi iberibe achicha, ime ka nkpuru-obi nwua, bú ndi nēkwesighi inwu anwu, na ime ka nkpuru-obi di ndu, bú ndi nēkwesighi idi ndu, site n’okwu-ugha unu nāgwa ndim ndi nānu okwu-ugha.

20 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide ohiri-isi nile unu, nke unu onwe-unu ji achu ntá nkpuru-obi madu n’ebe ahu dika anu-ufe, M’gādọwapu kwa ha n’ogwe-aka-unu; M’gēzilaga kwa nkpuru-obi nile, bú nkpuru-obi unu onwe-unu nāchu ntá dika anu-ufe.

21 M’gādọwa kwa ákwà-nb͕okwasi nile unu, naputa ndim n’aka-unu, ha agaghi-adi kwa n’aka-unu ọzọ ichu ntá ha; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

22 N’ihi na unu ji okwu-ugha mebie obi onye ezi omume, ma Mu onwem emeghi ka o b͕ue ya nb͕u; na n’ihi na unu mere ka aka abua nke onye nēmebi iwu di ike, ka o we ghara isi n’uzọ ọjọ ya lata, ime ka ọ di ndu:

23 n’ihi nka unu agaghi-ahu kwa ọhù efu ọzọ, unu agaghi-aju kwa ase ọzọ: M’gānaputa kwa ndim n’aka-unu; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 14

1 Ufọdu nime ndi-okenye Israel we biakutem, nọdu ala n’irum.

2 Okwu Jehova we ruem nti, si,

3 Nwa nke madu, ndikom ndia emewo ka arusi nile ha ba n’obi-ha, ọ bu kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ha tiyere na ncherita-iru ha: #M’gēkwe ka ha juam ase ma-ọli?

4 N’ihi nka gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye ọ bula n’ulo Israel nke nēme ka arusi nile ya ba n’obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya dika o si di, ya bu dika iba-uba nke arusi-ya nile si di;

5 ka M’we jide ulo Israel n’obi-ha, n’ihi na ha esiwo n’ebe M’nọ ghọ ndi ala ọzọ site n’arusi nile ha.

6 N’ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Latanu, sinu n’arusi nile unu chigharia; si-kwa-nu n’ihe-árú nile unu chigharia iru-unu.

7 N’ihi na onye ọ bula n’ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n’Israel, nke nēkewapu onwe-ya n’isom, we me ka arusi nile ya ba n’obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n’aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n’Onwem:

8 M’gēdo kwa irum megide onye ahu, me ya ka ọ buru ihe-iju-anya, ka ọ ghọ ihe-iriba-ama na ilu, M’gēbipu kwa ya n’etiti ndim; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

9 Ma onye-amuma ahu, mb͕e agārafu ya, o we kwue okwu, Mu onwem, bú Jehova, arafuwo onye-amuma ahu, M’gēsetipu kwa akam n’aru ya, kpochapu ya n’etiti ndim, bú Israel.

10 Ha gēbu kwa ajọ omume-ha: dika ajọ omume nke onye nāju ase, otú a ka ajọ omume nke onye-amuma gādi;

11 ka ulo Israel we ghara ikpafu kwa ọzọ n’isom, ghara kwa iwere njehie nile ha merua onwe-ha ọzọ; ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

12 Okwu Jehova we ruem nti, si,

13 Nwa nke madu, mb͕e ala ọ bula nēmehie megidem n’imekpu ihe-nmekpu, M’we setipu akam imegide ya, b͕ajiere ya nkpa-n’aka, bú achicha, zite oké unwu nime ya, bipu madu na anumanu nime ya;

14 asi na ndikom atọ ndia, bú Noa na Daniel na Job, nọ n’etiti ya, ha onwe-ha gēji ezi omume-ha naputa nání nkpuru-obi-ha; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15 Asi na emem ka ajọ anu-ọhia gabiga n’ala ahu, ha we b͕aba ya aka, o we ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ghara inwe onye ọ bula nāgabiga ya n’ihi anu-ọhia ahu;

16 asi na ndikom atọ ndia nọ n’etiti ya, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ dighi umu-ndikom ọ dighi kwa umu-ndinyom ha gānaputa ma-ọli; ha onwe-ha, nání ha, ka agānaputa, ma ala ahu gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu.

17 Ma-ọbu, asi na ọ bu mma-agha ka M’nēme ka ọ biakwasi ala ahu, M’we si, Ka mma-agha gabiga n’ala nka; M’we bipu madu na anumanu nime ya;

18 asi na ndikom atọ ndia nọ n’etiti ya, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ha agaghi-anaputa umu-ndikom na umu-ndinyom, kama ha onwe-ha, nání ha, ka agānaputa.

19 Ma-ọbu asi na ọ bu ajọ ọria nēfe efe ka M’nēziga n’ala ahu, M’we wukwasi ya ọnumam n’ọbara, ibipu madu na anumanu nime ya:

20 asi na Noa na Daniel na Job nọ n’etiti ya, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi ha gānaputa ma-ọli; ha onwe-ha gēji ezi omume-ha naputa nání nkpuru-obi-ha.

21 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Àgēsi kwa aṅa naputa ya ma-ọli mb͕e ọ bu ikpém anọ jọrọ njọ, bú mma-agha na oké unwu na ajọ anu-ọhia na ajọ ọria nēfe efe, ka M’zigara na Jerusalem, ibipu madu na anumanu nime ya?

22 Ma, le, ndi b͕apuru ab͕apu gāfọdu nime ya, ndi anēme ka ha puta, bú umu-ndikom na umu-ndinyom: le, ha nāpukute unu, unu gāhu kwa uzọ-ha na omume nile ha: ewe kasie unu obi bayere ihe ọjọ ahu nke M’meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, bú ihe ahu nile nke M’meworo Ka ọ biakwasi ya.

23 Ha gākasi kwa unu obi, mb͕e unu nāhu uzọ-ha na omume nile ha: unu ewe mara na ọ bughi n’efu ka M’meworo ihe ahu nile nke M’meworo nime ya; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 15

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, gini ka osisi vine bu kari osisi ọ bula, bú alaka vine nke diworo n’etiti osisi nile nke oké ọhia?

3 Àgēsi nime ya were osisi ime ihe ije ozi? ma-ọbu àgēsi nime ya were nkpukpọ ikokwasi ihe ọ bula n’elu ya?

4 Le, n’ọku ka atubàworo ya ibu nri-ya: isi-ya abua ka ọku ripiaworo, etiti-ya anujiwo kwa; ọ̀ gābà n’ije-ozi ọ bula?

5 Le, mb͕e o zuru okè, adighi-ewere ya me ihe ije ozi: àgēsi kwa aṅa were ya me ihe ije ozi ọzọ, mb͕e ọku ripiaworo ya, o we nujie?

6 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: dika osisi vine si di n’etiti osisi oké ọhia, nke M’nyeworo ọku ibu nri-ya, otú a ka M’nyeworo ndi bi na Jerusalem.

7 M’gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’doro irum imegide ha.

8 M’gēme kwa ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, n’ihi na ha emekpuwo ihe-nmekpu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 16

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, me ka Jerusalem mara ihe-árú-ya nile,

3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Jerusalem: Nputa-uwa-gi na ọmumu-gi sitere n’ala ndi Kenean; nna-gi ka onye-Amorait bu, ọ bu kwa nne-gi ka onye Het bu.

4 Ma ọmumu-gi, n’ubọchi amuru gi ebìghi otubo-gi, ejighi kwa miri sa gi aru isacha gi; eteghi i nnú ma-ọli, ekeghi kwa gi ákwà-ọkiké ma-ọli.

5 Ọ dighi anya mere gi ebere, imere gi otù ihe n’ihe ndia, inwe ọmiko n’aru gi; ma atufuru gi n’ọhia, n’ihi na asọwo gi onwe-gi oyi n’ubọchi amuru gi.

6 M’we gabiga n’akuku gi, hu gi ka anāzọtọ gi n’ọbara-gi, M’we si gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu; e, asirim gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu.

7 Ihe bara uba dika ihe-opupú nke ọhia ka M’meworo gi, i we ba uba, bùe ibù, biarue n’ihe-ichọ-nma kachasi ihe-ichọ-nma nile; i kpuru ara, agiri-isi-gi puchi-kwa-ra epuchi; ma gi onwe-gi b͕asiri ọtọ.

8 M’we gabiga n’akuku gi, hu gi, ma, le, mb͕e-gi bu mb͕e ihe-gi nātọ utọ; M’we b͕asa ọnu-ọnu-ala uwe-nwudam n’aru gi, kpuchie ọtọ-gi, ṅuara gi iyi, Mu na i we b͕a ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), i we ghọ onye nkem.

9 M’we sa gi miri, sachapu ọbara-gi n’aru gi, te gi manu.

10 M’we yibe gi uwe akpara nke-ọma, yibe gi akpukpọ seal n’ukwu, chiri ezi ákwà ọcha ke gi n’úkwù, b͕okwasi gi nkisi.

11 M’we ke gi ihe-ichọ-nma, tiye ọla-aka n’aka-gi abua, na iyab͕a n’olu-gi.

12 M’we tiye nb͕a-aka n’imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n’isi-gi.

13 Ewe ke gi ihe-ichọ-nma nke ọla-edo na ọla-ọcha; uwe-oyiyi-gi bu kwa ezi ákwà ọcha na nkisi na uwe akpara nke-ọma; utu ọka flour na manu-aṅu na manu ka i riri: i we mab͕ue onwe-gi na nma, o we gara gi nke-ọma, i we rue ala-eze.

14 Aha i nwere we pua ba n’etiti mba nile n’ihi nma-gi; n’ihi na ihe zuru okè ka ọ bu, n’ihi ima-nmam nke M’tukwasiri gi; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15 I we tukwasi nma-gi obi, kwa iko n’ihi aha-gi, wukwasi ikwa-iko-gi nile n’aru onye ọ bula nāgabiga; nke ya ka ọ bu.

16 I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n’elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a.

17 I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n’ọla-edom na n’ọla-ọcham, nke M’nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko,

18 chiri uwe-gi nke akpara nke-ọma, kpuchie ha, ọ bu kwa manum na ihe-nsure-ọkum nēsì ísì utọ ka i chere n’iru ha.

19 Nrim kwa nke M’nyere gi, bú utu ọka flour na manu na manu-aṅu, nke M’mere ka i rie, i che-kwa-ra ya n’iru ha ibu ísì utọ, o we di otú a; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

20 I we chiri umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi i muworom, i we chiri ha chuara ha àjà, ka ewe ripia ha. Ọ̀ bu ihe ntà, bú okwu ikwa-iko-gi nile,

21 na i b͕uworo umum, rara ha nye, n’ime ka ha gabigakuru ha n’ọku?

22 Ma n’ihe-árú-gi nile na ikwa-iko-gi nile i chetaghi ubọchi nile mb͕e i di na nwata, mb͕e i b͕asiri ọtọ, onye anāzọtọ n’ọbara-gi ka i bu kwa.

23 O rue, mb͕e ihe ọjọ gi nile gasiri, (ahuhu, ahuhu diri gi! ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta,)

24 na i wuworo onwe-gi ulo ikwa iko, me-kwa-ra onwe-gi ebe di elu n’amá nile ọ bula.

25 N’isi-uzọ nile ọ bula ka i wuworo ebe-gi di elu, i we me ka nma-gi ghọ ihe-árú, i we ghebere onye-ngabiga ọ bula ukwu-gi abua, me ka ikwa-iko-gi ba uba.

26 I we kwaso umu Ijipt, bú ndi-ab͕ata-obi-gi, ndi anu-aru-ha di uku, iko, me ka ikwa-iko-gi ba uba, ikpasum iwe.

27 Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M’we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n’aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere.

28 I we kwaso umu Asiria iko, n’ihi na afọ ejughi gi; e, i kwasoro ha iko, ma afọ ejughi kwa gi.

29 I we me ka ikwa-iko-gi ba uba n’ebe ala ndi-ahia di, rue Kaldea; ma ọbuná na nka ka afọ nējughi gi.

30 Le, ka obi-gi si ata aru nke-uku! (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ bu na i nēme ihe ndia nile, bú ọlu nwanyi nākwa iko nke nēme ka o si tọ ya;

31 ọ bu na i nēwu ulo ikwa-iko gi n’isi uzọ nile ọ bula, ebe-gi di elu ka i mewo-kwa-ra n’amá nile ọ bula; ma i dighi ka nwanyi nākwa iko n’ichì onyinye ọchì.

32 Le nwanyi nākwa iko! mb͕e ọ nọ n’okpuru di-ya ọ nēwere ndi nābughi di-ya!

33 Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n’anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n’ebe nile di buruburu biakute gi n’ihi ikwa-iko-gi nile.

34 Gi na ndinyom ọzọ we di iche n’ikwa-iko-gi nile otú a, na ọ dighi onye nākwaso gi iko: na ebe i nēnye onyinye, ma ọ dighi onyinye enyeworo gi, i we ghọ onye di iche.

35 N’ihi nka, gi nwanyi nākwa iko, nuru okwu Jehova:

36 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, N’ihi na awusiwo ọla-gi, na n’ihi na ekpughepuru ọtọ-gi site n’ikwa-iko-gi nile i nākwaso ndi nāhu gi n’anya; na n’ihi arusi nile nke ihe-árú-gi nile, na dika ọbara umu-gi si di, nke i nyere ha;

37 n’ihi nka, le, M’gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n’anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n’anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M’gāchikọta ha imegide gi buruburu, M’gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile.

38 M’gēkpe kwa gi ikpe nile nke ndi bu nwunye nākwa iko, ndi nāwusi kwa ọbara; M’gēwere kwa gi nye ka i buru ọbara nke ọnuma na nke ekworo.

39 M’gēnye kwa gi n’aka-ha, ha ewe kwatue ulo ikwa-iko gi, tikpọ ebe-gi nile di elu, yipu uwe-gi nile n’aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma: ha gārapu gi i b͕arasia ọtọ.

40 Ha gēme kwa ka nkpọkọta rigota imegide gi, ha gēwere kwa nkume tub͕ue gi, were mma-agha-ha dupue gi.

41 Ha gēsure kwa ulo-gi nile n’ọku, meso gi ihe nile ekpere n’ikpe n’anya ọtutu ndinyom; M’gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ.

42 M’gēme kwa ka ọnumam zuru ike n’aru gi, ekworom gēsi kwa n’aru gi wezuga onwe-ya, M’gānọ kwa jū, ghara iwe iwe ọzọ.

43 N’ihi na i chetaghi ubọchi nile nke mb͕e i di na nwata, i we mekpam aru n’ihe ndia nile; n’ihi ya, le, Mu onwem gētiyekwasi kwa uzọ-gi n’isi-gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ì meghi kwa ajọ ihe-nzube a tukwasi n’ihe-árú-gi nile?

44 Le, onye ọ bula nātu ilu gātu ilu bayere gi, si, Dika nne si di, otú a ka nwa-ya nwanyi di.

45 Nwa-nwanyi nke nne-gi ka i bu, nke nāsọ di-ya na umu-ya oyi; ọ bu kwa nwa-nne nke umu-nne-gi ndinyom ka i bu, ndi sọrọ di-ha na umu-ha oyi: nne-unu bu onye Het, nna-unu bu kwa onye-Amorait.

46 Nwa-nne-gi nwanyi nke-okenye bu Sameria, nke bi n’aka-ekpe-gi, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom: nwa-nne-gi nwanyi nke-ntà, nke bi n’aka-nri-gi, bu Sọdọm na umu-ya ndinyom.

47 Ma ọ bughi n’uzọ di iche iche ha ka i jeworo ije, ọ bughi kwa dika ihe-árú nile ha si di ka i meworo; kama, dika agāsi na nke ahu bu nọ̄ ihe ntà, i we bibie onwe-gi kari ha n’uzọ-gi nile.

48 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, emeghi, ya onwe-ya ma-ọbu umu-ya ndinyom, otú i meworo, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom.

49 Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n’ala na ob͕eye di ike.

50 Ha we di elu n’obi, me ihe-árú n’irum: M’we wezuga ha mb͕e M’huru ya.

51 Sameria kwa, ọ bughi ka nkera nke nmehie-gi nile ra ka o meworo; i we me ka ihe-árú-gi ba uba kari nke ha, i we gua umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume site n’ihe-árú-gi nile nke i meworo.

52 Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n’ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume.

53 M’gēme kwa ka ndọta-n’agha-ha chigharia, bú ndọta-n’agha nke Sọdọm na umu-ya ndinyom, na ndọta-n’agha nke Sameria na umu-ya ndinyom, na ndọta-n’agha nke ndi-gi adọtara n’agha n’etiti ha:

54 Ka i we būru ọnọdu-ihere-gi, ka ihere we me kwa gi n’ihi ihe nile nke i meworo, n’ikasi ha obi.

55 Umu-nne-gi ndinyom, bú Sọdọm na umu-ya ndinyom, gēchighata n’ọnọdu mb͕e ochie ha, Sameria na umu-ya ndinyom gēchighata kwa n’ọnọdu mb͕e ochie ha, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom gēchighata kwa n’ọnọdu mb͕e ochie unu.

56 Ma Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, abughi aha anuru n’ọnu-gi n’ubọchi npako-gi;

57 tutu ekpughe ihe ọjọ gi, dika na mb͕e ita-uta nke umu-ndinyom Siria, na nke ndi nile nọ ya buruburu, bú umu-ndinyom nke ndi Filistia, ndi nāzọpia gi buruburu.

58 Ajọ ihe-nzube-gi na ihe-árú-gi nile ka gi onwe-gi buruworo; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

59 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Emesowom i ọbuná otú i meworo, gi onye ledaworo ọb͕ub͕a-iyi anya n’imebi ọb͕ub͕a-ndu.

60 Ma Mu onwem gēcheta ọb͕ub͕a-ndu Mu na gi b͕ara n’ubọchi mb͕e i di na nwata, M’gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi guzosiere gi ike.

61 I gēcheta kwa uzọ-gi nile, ewe tiye gi n’ọnọdu-ihere, mb͕e i nara umu-nne-gi ndinyom, bú umu-nne-gi ndinyom nke-okenye na umu-nne-gi ndinyom nke-ntà: M’gēwere kwa ha nye gi ibu umu-gi ndinyom, ma ọ bughi site n’ọb͕ub͕a-ndu-gi.

62 Mu onwem gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na i b͕ara guzosie ike; i we mara na Mu onwem bu Jehova:

63 ka i we cheta, ihere ewe me gi, i we ghara isaghe kwa ọnu-gi ọzọ ma-ọli, n’ihi ihere-gi; mb͕e M’gēkpuchiworo gi-ri ihe nile i meworo; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 17

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, tua otù ilu, tu-kwa-ra ulo Israel otù ilu;

3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n’uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:

4 ọnu nke alaka-ya nile wara ọhu ka ọ kubipuru, būru ba n’ala izu-ahia; n’obodo ndi-ahia ka o doro ya.

5 O we chiri ufọdu na nkpuru ala ahu, kua ya n’ubi di nma iku nkpuru; ọ kuru ya n’akuku ọtutu miri; dika osisi willow ka o tiyere ya.

6 O we pue, ghọ osisi vine nāwasa awasa nke di nkpunkpu, nke alaka-ya nile chere ya iru, nkpọrọgwu-ya nile di kwa n’okpuru ya: o we ghọ osisi vine, waputa ngalaba, wa alaka mara nma.

7 Ugo uku ọzọ di kwa, nke nkù-ya abua di uku, uruma-ya di kwa ọtutu: ma, le, osisi vine a rubere nkpọrọgwu-ya nile n’ebe ọ nọ, ọ bu kwa alaka-ya nile ka ọ wara n’ebe ọ nọ site na nkpuru nile nke ebe akuru ya, ka o we b͕a ya miri.

8 N’ubi ọma n’akuku ọtutu miri ka akuru ya, ka o we waputa ngalaba, mia nkpuru, ghọ osisi vine mara nma.

9 Si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ bughi nkpọrọgwu-ya nile ka ọ gēropu, bipu kwa nkpuru-ya, ka o we kpọnwua; ka akwukwọ ndu nile nke npute-ya we kpọnwua; ọ̀ gaghi-eji kwa ogwe-aka uku ma-ọbu ndi bara uba iropu ya site na nkpọrọgwu-ya nile?

10 Ma, le, ebe akuworo ya, ìhe gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gaghi-akpọnwusi, mb͕e ifufe Iru-anyanwu nēfetu ya? nime nkpuru ebe o puru epu ka ọ gākpọnwu.

11 Okwu Jehova we ruem nti, si,

12 Biko, si ulo nnupu-isi ahu, Ùnu amaghi ihe ihe ndia bu? si, Le, eze Babilon biaruru Jerusalem, were eze-ya, na ndi-isi-ya, me ka ha biakute ya rue Babilon;

13 o we were otù onye sitere na nkpuru ala-eze ahu, ya na ya we b͕a ndu; o we me ka ọ ba n’ọb͕ub͕a-iyi, ọ bu kwa ndi nile di ike nke ala-ya ka ọ chiri:

14 ka ala-eze ahu we di ala, ghara ibuli onwe-ya elu, kama ka o we debe ọb͕ub͕a-ndu-ya we guzo.

15 O we nupu isi n’okpuru ya n’iziga ndi-ozi-ya n’Ijipt ka ha we nye ya inyinya na ndi bara uba. Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gēwepuga onwe-ya, bú onye nēme ihe ndia? ọ̀ gēmebi ọb͕ub͕a-ndu, we wepuga onwe-ya?

16 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n’ezie n’ebe eze ahu bi nke meworo ya eze, bú onye o ledara ọb͕ub͕a-iyi-ya, onye o mebi-kwa-ra ọb͕ub͕a-ndu-ya, n’ebe ọ nọ n’etiti Babilon ka ọ gānwu.

17 Fero agaghi-achiri kwa oké usu-ndi-agha-ya na nkpọkọta-madu-ya bara uba me ya ihe ọ bula n’agha ahu, mb͕e ha gāwukọta obo-ihe, wue ulo-agha, ibipu ọtutu madu.

18 Ebe o ledara ọb͕ub͕a-iyi n’imebi ọb͕ub͕a-ndu, ma, le, o nyereri aka-ya n’ikweye, ma ọ bu ihe ndia nile ka o mere; ọ gaghi-ewepuga onwe-ya.

19 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem nādi ndu, n’ezie ọb͕ub͕a-iyim nke o ledaworo, na ọb͕ub͕a-ndum nke o mebiworo, M’gātukwasi kwa ya n’isi-ya.

20 M’gāb͕asa ub͕um n’aru ya, agāma kwa ya n’ọnyàm, M’gēme kwa ka ọ biarue Babilon, Mu na ya gēkpe kwa ikpe n’ebe ahu bayere nmekpu-ya nke o mekpuru megidem.

21 Ma ndi-ya nile ndi b͕alagara ab͕alaga n’usu-ndi-agha-ya nile gāda site na mma-agha, ndi fọduru gāb͕asa-kwa-ra ifufe nile ọ bula: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

22 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem gēwere kwa ufọdu n’ọnu-ọnu osisi cedar di elu, kua ya; n’ọnu alaka-ya nke wara ọhu ka M’gākubipu alaka di nrò, Mu onwem gāku kwa ya n’elu ugwu di elu nke atuliri elu:

23 n’ugwu nke ebe di elu nke Israel ka M’gāku ya: ọ gāwaputa kwa ngalaba, mia nkpuru, ghọ osisi cedar mab͕uru onwe-ya: n’okpuru ya ka nnunu nile di iche iche gēbi; na ǹdò alaka-ya nile ka ha gēbi.

24 Osisi nile nke ọhia ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, emewo ka osisi nke di elu di ala, emewom ka osisi nke di ala di elu, emewom ka osisi nke di ndu kpọnwua, emewom ka osisi nke kpọnwuru akpọnwu ma ifuru: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo me kwa ya.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 18

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Gini ka unu nēkwu, na unu onwe-unu nātu ilu a bayere ala Israel, si, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì?

3 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ay Jehova puta), n’ezie ọ gaghi-abu kwa ọlu-unu ọzọ itu ilu a n’Israel.

4 Le, nkpuru-obi nile, Mu nwe ha; dika nkpuru-obi nna si di, otú a ka nkpuru-obi nwa-ya di kwa, Mu nwe ha; nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu.

5 Ma onye ọ bula, mb͕e ọ bu onye ezi omume, nke nēme ihe ekpere n’ikpe na ezi omume,

6 asi na ọ bu onye nērighi ihe n’ugwu, nke nēwelighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, nke nēmerughi nwunye madu-ibe-ya, nke nādighi-abia nso nwanyi di na nsọ;

7 nke nādighi-eme onye ọ bula ihe-ike, nke nēnyeghachi onye-ugwọ ihe-ibe-ya, nke nādighi-apunara madu ihe n’ike, nke nēnye onye-agu nri-ya, nke nēkpuchi onye-ọtọ uwe;

8 nke nādighēnye ego ka ọ nara uma, nke nādighi-anara ọmuru-nwa, nke nēsi n’ajọ omume seghachi aka-ya, nke nēme ihe ekpere n’ezi-okwu n’etiti madu na madu,

9 nke nējeghari n’ukpurum nile, nke debeworo ikpém nile, ime ihe n’ezi-okwu; onye ezi omume ka onye ahu bu, ọ ghaghi idi ndu; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

10 Asi na ọ muwo nwa nke bu onye nke nēme ihe-ike, onye nāwusi ọbara, nke nēme otù ihe ọ bula n’ihe ndia,

11 ma ezi ihe ndia nile ka ọ nēmeghi, n’ihi na ọbuná n’ugwu ka o riworo ihe, ọ bu kwa nwunye madu-ibe-ya ka o meruworo,

12 onye ewedara n’ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n’ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo,

13 n’uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n’isi.

14 Ma, le, asi na ọ muwo nwa, o we hu nmehie nile nke nna-ya, nke o meworo, o we tua egwu, ghara ime ihe dika ihe ndia,

15 o righi ihe n’elu ugwu, o welighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, o merughi nwunye madu-ibe-ya,

16 o meghi onye ọ bula ihe-ike, ọ naraghi ihe-ibe, ọ punaraghi madu ihe n’ike, nri-ya ka o nyeworo onye-agu, onye-ọtọ ka o kpuchiworo uwe,

17 o siwo n’aru onye ewedara n’ala seghachi aka-ya, uma na ọmuru-nwa ka ọ nānaraghi, ikpém nile ka o meworo, n’ukpurum nile ka o jeghariworo; onye ahu agaghi-anwu n’ihi ajọ omume nke nna-ya, ọ ghaghi idi ndu.

18 Ma nna-ya, n’ihi na ọ meb͕uru nke-uku, punara nwa-nne-ya ihe n’ike, me ihe nke nādighi nma n’etiti ndi-ya, le, ọ gānwu kwa n’ajọ omume-ya.

19 Ma unu asiwo, Gini mere nwa nējighi ebu ufọdu n’ajọ omume nna-ya? Mb͕e nwa ahu meworo ihe ekpere n’ikpe na ezi omume, debe ukpurum nile, me ha, ọ ghaghi idi ndu.

20 Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n’ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n’ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n’isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n’isi ya.

21 Ma onye nēmebi iwu, mb͕e ọ gēsi na nmehie-ya nile nke o meworo chigharia, debe ukpurum nile, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume, ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.

22 Njehie-ya nile nke o meworo, agaghi-echeta ha megide ya: n’ezi omume-ya nke o meworo ka ọ gādi ndu.

23 Ọ̀ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu? (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ̀ dighi-atọm utọ mb͕e o si n’uzọ-ya chigharia, we di ndu?

24 ma mb͕e onye ezi omume si n’ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n’ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.

25 Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Biko nurunu, ulo Israel: Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule?

26 Mb͕e onye ezi omume si n’ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, nwua n’ihi ha, n’ajọ omume-ya nke o meworo ka ọ gānwu.

27 Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya nke o meworo chigharia, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu.

28 O we hu, si na njehie-ya nile o meworo; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.

29 Ma ulo Israel asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule, ulo Israel? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule?

30 N’ihi nka ka M’gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Latanu, sinu na njehie nile unu chigharia; ajọ omume ewe ghara ighọrọ unu ihe-isu-ngọngọ.

31 Tupunu n’aru unu njehie nile unu nke unu jehieworo nime ha; mere onwe-unu obi ọhu na mọ ọhu: ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?

32 N’ihi na ọnwu nke onye nānwu anwu adighi-atọm utọ, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ya bu chigharianu, we di ndu.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 19

1 Ma gi onwe-gi, buliere ndi-isi Israel abù-ákwá,

2 si, Gini ka nne-gi bu? Ọ bu nne-ọdum: n’etiti ọdum ka ọ makpuru, n’etiti umu-ọdum ka o mere ka umu-ya ba uba.

3 O we zùputa otù n’umu-ya; nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.

4 Mba di iche iche we nu ihe bayere ya; n’olùlù-ha ka anwudere ya: ha ji nb͕a-aka-imi me ka ọ biarue ala Ijipt.

5 Nne-ọdum ahu we hu na o chereri, ma na olile-anya-ya alawo n’iyì, o we were otù ọzọ n’umu-ya, me ya nwa-ọdum.

6 Nwa-ọdum ahu we jegharia n’etiti ọdum, nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.

7 O we mata ulo ọma nile nke ala ahu, ọ bu kwa obodo nile ha ka o mere nkpọnkpọ ebe; ala ahu na ùjú-ya we tọb͕ọrọ n’efu, site n’olu nke nbib͕ọ-ya.

8 Mba nile we si n’ala nile anāchi achi megide ya buruburu: ha we b͕asa ub͕u-ha n’aru ya; n’olùlù-ha ka anwudere ya.

9 Ha we tiye ya n’ulo-nmechibido na nb͕a-aka-imi, me ka ọ biakute eze Babilon; ha nēme ka ọ ba n’ebe ewusiri ike, ka ewe ghara inu kwa olu-ya ọzọ n’ugwu nile nke Israel.

10 Nne-gi di ka osisi vine, n’ọbara-gi, n’akuku miri ka akuworo ya: osisi nke nāmi nkpuru nke juputa-kwa-ra na ngalaba ka ọ bu site n’ọtutu miri.

11 O we nwe nkpa-n’aka di ike ibu nkpa-n’aka-eze nke ndi nāchi achi, ogologo-ya we di elu rue n’etiti alaka b͕ara ọhia, ewe hu ya n’idi-elu-ya n’iba-uba nke alaka-ya nile.

12 Ewe ropu ya n’ọnuma, n’ala ka atudara ya, ifufe Iru-anyanwu we me ka nkpuru-ya kpọnwua: ab͕ajipuru nkpa-n’aka-ya nile di ike, ha we kpọnwua; ọku ripiara ha.

13 Ma ub͕u a akuwo ya n’ọzara, n’ala kpọrọ nku nke miri nādighi.

14 Ọku we si na nkpa-n’aka nke alaka-ya nile pua, nkpuru-ya ka o ripiaworo, nkpa-n’aka ọ bula nke di ike we ghara idi nime ya ibu nkpa-n’aka-eze ichi achi. Abù-ákwá ka nka bu, o we ghọ abù-ákwá.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 20

1 O rue n’arọ nke-asa, n’ọnwa nke-ise, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na ufọdu nime ndi-okenye Israel biara iju Jehova ase, ha we nọdu ala n’irum.

2 Okwu Jehova we ruem nti, si,

3 Nwa nke madu, gwa ndi-okenye Israel okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ọ̀ bu ijum ase ka unu onwe-unu nābia? Mu onwem nādi ndu, M’gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

4 Ì gēkpe ha ikpe, nwa nke madu, ì gēkpe ha ikpe? me ka ha mara ihe-árú nile nke ndi bu nna-ha;

5 si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N’ubọchi M’rọputara Israel, M’we weliere nkpuru ulo Jekob akam, me ka ha maram n’ala Ijipt, M’we weliere ha akam, si, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu;

6 n’ubọchi ahu ka M’weliri akam nye ha, ime ka ha si n’ala Ijipt puta ba n’ala nke M’ledoro nye ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, nke bu ima-nma nke ala nile:

7 M’we si ha, Tufuenu, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, unu eji-kwa-la arusi nile nke Ijipt merua onwe-unu; Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

8 Ha we nupu isi n’okpurum, ha ekweghi kwa igem nti; ha etufughi, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, ha arapughi kwa arusi nile nke Ijipt: M’we si na M’gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n’etiti ala Ijipt.

9 Ma alurum ọlu n’ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n’anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n’etiti ha, ndi M’mere ka ha maram n’anya-ha, n’ime ka ha si n’ala Ijipt puta.

10 M’we me ka ha si n’ala Ijipt puta, M’we me ka ha ba n’ọzara.

11 M’we nye ha ukpurum nile, me ka ha mara ikpém nile, nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha.

12 Ọzọ, ubọchi-izu-ikem nile ka M’nye-kwa-ra ha, ighọ ihe-iriba-ama n’etiti Mu na ha, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova, Nke nēdo ha nsọ.

13 Ulo Israel we nupu isi n’okpurum n’ọzara: ọ bughi n’ukpurum nile ka ha jeghariri, ikpém nile ka ha ju-kwa-ra, bú nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ ma-ọli: M’we si na M’gāwukwasi ha ọnumam n’ọzara, ime ka ha gwusia.

14 M’we lua ọlu n’ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n’anya mba nile, ndi M’mere ka ha si n’ala Ijipt puta n’anya-ha.

15 Ọzọ kwa, Mu onwem weliri akam nye ha n’ọzara, si, na M’gaghi-eme ka ha ba n’ala ahu nke M’nyere ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, ima-nma ka ọ buru ala nile;

16 n’ihi na ikpém nile ka ha juru, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ: n’ihi na arusi nile ha ka obi-ha nējeso.

17 Anyam we mere ha ebere ka M’ghara ibibi ha, emeghkwam ka ha gwusia n’ọzara.

18 M’we si umu-ha n’ọzara, Unu ejegharila n’ukpuru nile nke nna-unu-hà, unu edebe-kwa-la ikpé nile ha, unu eji-kwa-la arusi nile ha meru onwe-unu:

19 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; jegharianu n’ukpurum nile, debe-kwa-nu ikpém nile, me ha:

20 donu ubọchi-izu-ikem nile nsọ; ha gāghọ kwa ihe-iriba-ama n’etiti Mu na unu, ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

21 Umu-ha we nupu isi n’okpurum; ha ejeghi ije n’ukpurum nile, ha edebeghi kwa ikpém nile ime ha, bú nke madu gādi ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ: M’we si na M’gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n’ọzara.

22 Ma eseghachirim akam, we lua ọlu n’ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n’anya mba nile, ndi M’mere ka ha puta n’anya-ha.

23 Mu onwem weli-kwa-ra ha akam n’ọzara, si, na M’gāchusa ha n’etiti mba nile, fesa ha n’ala nile;

24 n’ihi na ha emeghi ihem nile ekpere n’ikpe, ọ bu kwa ukpurum nile ka ha juru, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ, ọ bu kwa n’iso arusi nile nke ndi bu nna-ha ka anya-ha di.

25 Ọzọ, enye-kwa-ram ha ukpuru di iche iche nke nādighi nma, na ikpe di iche iche nke ha nāgaghi-adi ndu nime ha;

26 M’we merua ha n’onyinye nile ha, n’ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n’ọku, ka M’we me ka ha tọb͕ọrọ n’efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova.

27 N’ihi nka, gwa ulo Israel okwu, gi nwa nke madu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bu kwa na nka ka nna-unu-hà kwulurum, n’imekpu emekpu megidem.

28 N’ihi na mb͕e M’mere ka ha ba n’ala ahu, nke M’weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n’ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n’ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n’ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n’ebe ahu.

29 M’we si ha, Gini bu ebe a di elu ebe unu onwe-unu nābà? Ewe kpọ aha-ya Bama rue ta.

30 N’ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu n’uzọ nke nna-unu-hà ka unu onwe-unu nēmeru onwe-unu? ọ̀ bu kwa ihe-árú nile ha ka unu nākwaso iko?

31 ọzọ, mb͕e unu nēbuli onyinye nile unu, mb͕e unu nēme ka umu-unu gabiga n’ọku, ọ̀ bu na unu onwe-unu nēmeru onwe-unu n’arusi nile unu, rue ta? ma Mu onwem, #M’gēkwe ka unu juam ase, ulo Israel? Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M’gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli:

32 ma ihe ahu nke nābà nime mọ-unu, ọ gaghi-adi ma-ọli; ọ bu na unu onwe-unu nāsi, Ayi gādi ka mba nile, dika ab͕uru nile nke ala nile, ijere osisi na nkume ozi.

33 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n’ezie ọ bu aka di ike, ọ bu kwa ogwe-aka esetiri eseti, ọ bu kwa ọnuma awusiri awusi, ka M’gēji buru eze-unu:

34 M’gēji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka esetiri eseti, ji kwa ọnuma awusiri awusi, me ka unu si na ndi nile di iche iche puta, chikọputa kwa unu n’ala nile ebe unu b͕asaworo:

35 M’gēme kwa ka unu bata n’ọzara nke ndi nile di iche iche, Mu na unu gēkpe kwa ikpe n’ebe ahu iru na iru.

36 Dika Mu na nna-unu-hà kpere ikpe n’ọzara nke ala Ijipt, otú a ka Mu na unu gēkpe ikpe; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

37 M’gēme kwa ka unu gabiga n’okpuru nkpa-n’aka, M’gēme kwa ka unu ba n’ihe-nkegide nke ọb͕ub͕a-ndum;

38 M’gāsachapu kwa ndi nānupu isi na ndi nējehie megidem n’etiti unu; n’ala ebe ha nọ dika ọbìa ka M’gēme ka ha si puta, ma ọ bughi n’ala Israel ka ha gābà: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

39 Ma unu onwe-unu, ulo Israel, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Jenu, fè, onye ọ bula arusi-ya nile, ma emesia unu aghaghi igem nti: ma unu agaghi-eji onyinye nile unu na arusi nile unu me ka aha nsọm ghara idi nsọ ọzọ.

40 N’ihi na n’ugwu nsọm, n’ugwu nke ebe di elu nke Israel, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n’ebe ahu ka ulo Israel nile, ka ọ ra, gēfèm n’ala-ha: n’ebe ahu ka ihe-ha gātọm utọ, ọ bu kwa n’ebe ahu ka M’gāchọ àjà-nbuli nile unu na nkpuru mbu nke ùtú nile unu, ha na ihe nsọ nile unu.

41 N’ísì utọ ka ihe-unu gātọm utọ, mb͕e M’mere ka unu si na ndi nile di iche iche puta, mb͕e M’chikọputara unu n’ala nile nke unu b͕asaworo nime ha; agēdokwam nsọ nime unu n’anya mba nile.

42 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’gēme ka unu ba n’ala Israel, n’ala ahu nke M’weliri akam elu iwere ya nye nna-unu-hà.

43 Unu gēcheta kwa n’ebe ahu uzọ nile unu, na omume nile unu, nke unu meruru onwe-unu nime ha; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n’iru unu n’ihi ihe ọjọ nile unu nke unu meworo.

44 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’mesoworo unu n’ihi aham, ọ bughi dika uzọ ọjọ nile unu si di, ọ bughi kwa dika omume nile unu nke bibiri ebibi, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

45 Okwu Jehova we ruem nti, si,

46 Nwa nke madu, che iru-gi n’uzọ Ndida, me ka okwu-gi busa dika miri-ozuzo n’ebe Ndida di, bue amuma megide oké ọhia nke ọhia ahu di na Negeb;

47 si oké ọhia Negeb, Nuru okwu Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M’gaje isuye ọku nime gi, ọ gēripia kwa osisi ndu nile ọ bula na osisi nile ọ bula kpọrọ nku nke di nime gi: ire-ọku-ya nēnwu enwu, ọ gaghi-anyu anyu, ọ gāru kwa iru nile site na Negeb rue na Ugwu.

48 Anu-aru nile, bú madu, gāhu kwa na Mu onwem, bú Jehova, esuyewo ya: ọ gaghi-anyu anyu.

49 M’we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ha nēkwu okwu bayerem, si, Ọ̀ bughi onye nātu ilu ilu ka ọ bu?