Categories
ESTA

ESTA 1

1 O rue, n’ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n’India we rue Etiopia:)

2 na mb͕e ahu, mb͕e eze, bú Ahasuerọs, nọkwasiri n’oche-eze ala-eze-ya, nke di na Shushan, bú ulo uku eze,

3 n’arọ nke-atọ nke ọbubu-eze-ya, na o mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi-isi-ya na ndi-orù-ya; ndi bu dìnkpà nke Peasia na Midia, bú ndi-eze na ndi-isi nke ala nile anāchi achi, nọ n’iru ya:

4 mb͕e o mere ka ahú àkù nke nsọpuru ala-eze-ya na ọkaka nke ima-nma nke idi-uku-ya ọtutu ubọchi, bú ọgu ubọchi iteghete.

5 Ma mb͕e emezuru ubọchi ndia, eze mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi nile ndi ahuru na Shushan, bú ulo uku eze, site n’onye uku we rue onye ntà, ubọchi asa, n’ogige nke ubi ab͕ara ogige nke ulo eze;

6 ihe-nkwuba di nke ezi ákwà ọcha na ogho ọcha na ogho anunu, nke eji udọ̀ nke ezi ákwà ọcha na ogho ododo kekọta ha na nb͕a-aka ọla-ọcha na ogidi marble: ihe-ndina bu ọla-edo na ọla-ọcha, n’elu pavement eji marble uhie, na nke ọcha, na nke edo, na nke oji, me.

7 Ha me-kwa-ra ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu n’ihe ọla-edo, (ihe nile di kwa iche iche,) manya-vine nke ala-eze ba-kwa-ra uba, dika aka eze ruru.

8 Ọṅuṅu-ihe ahu di ka iwu si di; ọ dighi onye nērugide erugide: n’ihi na otú a ka eze nyere onye uku ọ bula nke ulo-ya iwu, ime dika ọ tọrọ nwoke ọ bula utọ.

9 Vashti, bú nwunye eze, me-kwa-ra ọṅuṅu-manya-vine nye ndinyom n’ulo ala-eze nke eze, bú Ahasuerọs, nwere.

10 N’ubọchi nke-asa, mb͕e obi eze di nma site na manya-vine, ọ siri Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, bú ndi-onozi asa ndi nēje ozi n’iru eze, bú Ahasuerọs,

11 ka ha me ka Vashti, bú nwunye eze, bia n’iru eze nēkpu okpu-eze nke ala-eze, ime ka ndi di iche iche na ndi-isi hu nma-ya: n’ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu.

12 Nwunye eze, bú Vashti, we ju ibia n’okwu eze nke sitere n’aka ndi-onozi: eze we we iwe nke-uku, ọnuma-ya nēre ọku nime ya.

13 Eze we si ndi mara ihe, bú ndi mara mb͕e di iche iche, (n’ihi na otú a ka okwu eze di n’iru ndi nile mara iwu na ikpé;

14 ma onye nọ nso ya bu Kashena, ya na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan, bú ndi-isi asa nke Peasia na Midia, ndi nāhu iru eze, ndi nānọ n’isi n’ala-eze:)

15 Dika iwu si di, gini ka agēme nwunye eze, bú Vashti, n’ihi na o meghi ihe eze, bú Ahasuerọs, siri ya site n’aka ndi-onozi?

16 Memukan we kwue n’iru eze na ndi-isi, si, Ọ bughi eze, nání ya, ka Vashti, bú nwunye eze, mere ajọ omume megide, kama megide ndi-isi nile, megide kwa ndi di iche iche nile ndi nọ n’ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs.

17 N’ihi na okwu a bayere nwunye eze gāpu rue nti ndinyom nile, ime ka di-ha buru ihe anēleda eleda n’anya-ha, mb͕e ha nāsi, Eze, bú Ahasuerọs, siri ka eme Vashti, bú nwunye eze, ka ọ bia n’iru ya, ma ọ biaghi.

18 Ubọchi ta ka ndinyom ndi-isi nke Peasia na Midia, bú ndi nuworo okwu a bayere nwunye eze, gāsi kwa ndi-isi nile nke eze otú a, nleda-anya na iwe nke zuru ezu gāputa kwa.

19 Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n’iru ya pua, ka ede kwa ya n’akwukwọ n’etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n’iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya.

20 Agēme kwa ka anu iwu eze, bú nke ọ nēme, n’ala-eze-ya nile, (n’ihi na ihe bara uba ka ọ bu,) ndinyom nile gēnye di-ha nsọpuru, site n’onye uku we rue onye ntà.

21 Okwu ahu we di nma n’anya eze na ndi-isi-ya; eze we me dika okwu Memukan si di:

22 o we ziga akwukwọ n’ala nile anāchi achi nke eze, n’ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n’ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.

Categories
ESTA

ESTA 2

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, mb͕e ọnuma eze, bú Ahasuerọs, bìri, ọ chetara Vashti, na ihe o mere, na ihe ekwubìri megide ya.

2 Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si ya, Ka ha chọrọ eze umu-ab͕ọghọ ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya:

3 ka eze me kwa ndi-nlekọta n’ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:

4 ka nwa-ab͕ọghọ nke di nma n’anya eze buru nwunye eze n’ọnọdu Vashti. Ihe ahu we di nma n’anya eze; o we me otú a.

5 Otù nwoke, bú onye-Ju, nọ na Shushan, bú ulo uku eze, aha-ya bu Mọdekai, nwa Jaia, nwa Shimai, nwa Kish, bú onye Benjamin;

6 onye emere ka o si na Jerusalem je biri n’ala ọzọ n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi emere ha na Jekonaia, bú eze Juda, ka ha je biri n’ala ọzọ, onye Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ọ je biri n’ala ọzọ.

7 O we nāzùlite Hadasa, nke ahu bu Esta, nwa-nwayi nwa-nne nna-ya: n’ihi na o nweghi nna ma-ọbu nne, ma nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma n’aru, di kwa nma ile anya; mb͕e nna-ya na nne-ya nwuru, Mọdekai we kuru ya onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi.

8 O rue, mb͕e anuru okwu eze na iwu-ya, mb͕e achikọbata-kwa-ra ọtutu umu-ab͕ọghọ nime Shushan, bú ulo uku eze, rue aka Hegai, na ekubatara Esta n’ulo eze, rue aka Hegai, onye nēdebe ndinyom.

9 Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n’anya-ya, ewe mere ya ebere n’iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n’ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n’ulo kachasi nma nke ndinyom.

10 Esta egosighi ndi-ya ma-ọbu umu-nna-ya: n’ihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara igosi ha.

11 Mọdekai we nējeghari n’iru ogige ulo ndinyom n’ubọchi nile ọ bula, imara udo Esta, na ihe agēme ya.

12 Ma mb͕e orúrú nwa-ab͕ọghọ ọ bula biaruru nso ibakuru eze, bú Ahasuerọs, mb͕e ọnwa iri na abua gwusiri ya, dika iwu ndinyom si di, (n’ihi na otú a ka anēmezu ubọchi nsacha-ha, bú ọnwa isi iji manu myrrh, na ọnwa isi iji uda di iche iche na iji ihe-nsacha ndinyom,)

13 nwa-ab͕ọghọ ahu we biakute eze n’uzọ di otú a, anēnye ya ihe ọ bula ọ nāsi ha nye, iso ya si n’ulo ndinyom biarue ulo eze.

14 N’anyasi ka nwayi ahu batara, n’ututu ka nwayi ahu laghachi-kwa-ra n’ulo nke-abua nke ndinyom, rue aka Shaashgaz, bú onozi eze, onye nēdebe ndi-iko-nwayi: ọ dighi-abiakute eze ọzọ, ma-ọbughi na ihe-ya tọrọ eze utọ, ewe kpọ ya n’aha.

15 Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n’onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n’anya ndi nile nāhu ya anya.

16 Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n’ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n’arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya.

17 Eze we hu Esta n’anya kari ndinyom ahu nile, o we nata amara na ebere n’iru ya kari umu-ab͕ọghọ ahu nile ndi nāmaghi nwoke; o we tukwasi okpu-eze ala-eze n’isi-ya, me ya nwunye eze n’ọnọdu Vashti.

18 Eze we mere ndi-isi-ya na ndi-orù-ya nile oké ọṅuṅu-manya-vine, bú ọṅuṅu-manya-vine, Esta; o me-kwa-ra ka ala nile anāchi achi zuru ike n’itu utu, o we nye onyinye, dika aka eze ruru.

19 Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n’ọnu-uzọ-ama eze.

20 Esta adighi-egosi umu-nna-ya ma-ọbu ndi-ya; dika Mọdekai nyere ya iwu: n’ihi na ihe Mọdekai siri, nke ahu ka Esta nēme, dika mb͕e anāzùlite ya n’aka-ya.

21 Na mb͕e ahu, mb͕e Mọdekai nānọdu n’ọnu-uzọ-ama eze, Bigtan na Teresh, bú ndi-nchedo abua nke eze, nime ndi nēche nbata-uzọ, were iwe, chọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.

22 Mọdekai we mata ihe ahu, o we gosi Esta, bú nwunye eze; Esta we gwa eze n’aha Mọdekai.

23 Ewe jua ase okwu ahu, chọputa ya, ewe kwuba ha abua n’osisi: ewe de ya n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi ahu n’iru eze.

Categories
ESTA

ESTA 3

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n’ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ.

2 Ndi-orù nile nke eze, ndi nọ n’ọnu-uzọ-ama eze, we nēruru ala, nākpọ kwa isi ala nye Heman: n’ihi na otú a ka eze nyere iwu bayere ya. Ma Mọdekai adighi-eruru ala, ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya.

3 Ndi-orù eze, ndi nọ n’ọnu-uzọ-ama eze, we si Mọdekai, Gini mere gi onwe-gi nāgabiga ihe eze nyere n’iwu?

4 O rue, mb͕e ha nāgwa ya okwu kwa-ubọchi, ma ọ geghi nti ha, na ha gosiri Heman, ihu ma okwu Mọdekai gēguzo: n’ihi na o gosiri ha na ya onwe-ya bu onye-Ju.

5 Heman we hu na Mọdekai adighi-eruru ala, na ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya, Heman we juputa n’ọnuma.

6 O we buru ihe-nleda-anya n’anya-ya iseti aka megide Mọdekai, nání ya; n’ihi na ha gosiri ya ndi Mọdekai: Heman we chọ ikpochapu ndi-Ju nile ndi nọ n’ala-eze nile nke Ahasuerọs, bú ndi Mọdekai.

7 N’ọnwa mbu, nke ahu bu ọnwa Nisan, n’arọ nke-iri-na-abua nke eze, bú Ahasuerọs, ka ha fere Pua, nke ahu bu nzà, n’iru Heman, site n’otù ubọchi rue ubọchi ọzọ, site kwa n’otù ọnwa ọzọ, rue ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.

8 Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n’etiti ndi di iche iche n’ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n’iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha.

9 Ọ buru na ọ di eze nma, ka ede ya n’akwukwọ ime ka ha la n’iyì: m’gātù kwa orú nnù talent ọla-ọcha na nnù ise nye n’aka ndi nēje ozi a, iwebata ya n’ulo-àkù eze.

10 Eze we si n’aka-ya wezuga nb͕a-aka-akàrà-ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju.

11 Eze we si Heman, Enyewo gi ọla-ọcha, ya na ndi ahu, ime ha dika ihe ahu si di nke di nma n’anya-gi.

12 Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n’ọnwa mbu, n’ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n’akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n’iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n’aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.

13 Ewe site n’aka ndi-ọb͕a-ọsọ ziga akwukwọ n’ala nile anāchi achi nke eze, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ndi-Ju nile la n’iyì, site na nwata we rue okenye, ma umu-ntakiri ma ndinyom, n’otù ubọchi, n’ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, na iluta ihe-nkwata-ha n’agha.

14 Ndeputa odide-akwukwọ ahu, nke agēnye dika iwu n’ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ha nọ na njikere bayere ubọchi a.

15 Ndi-ọb͕a-ọsọ puru, ebe ewere okwu eze me ka ha me ngwa, enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze: ma eze na Heman nọduru iṅu ihe-ọṅuṅu; ma ọ b͕ara obodo ahu, bú Shushan, ghari.

Categories
ESTA

ESTA 4

1 Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n’aru-ya, pua je n’etiti obodo, tie oké nkpu di ilu:

2 o we bia rue n’iru ọnu-uzọ-ama eze: n’ihi na ọ dighi onye gābà n’ọnu-uzọ-ama eze n’uwe nke ákwà-nkpe.

3 Ọzọ, n’ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n’obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n’okpuru ọtutu madu.

4 Umu-ab͕ọghọ Esta na ndi-onozi-ya we bia gosi ya; o we nēb͕u nwunye eze ahu nb͕u n’obi nke-uku; o we zìe uwe iyikwasi Mọdekai, na iwezuga ákwà-nkpe-ya n’aru-ya: ma ọ naraghi ha.

5 Esta we kpọ Hatak, bú otù onye nime ndi-onozi eze, onye eze mere ka o guzo n’iru ya, o we nye ya iwu ijekuru Mọdekai, imara ihe nka bu, na ihe kpatara nka.

6 Hatak we pukuru Mọdekai rue amá obodo ahu, nke di n’iru ọnu-uzọ-ama eze.

7 Mọdekai we gosi ya ihe nile mere ya, kọ-kwa-ra ya isi ego ahu nke Heman siri na ọ gātù nye n’ulo-àkù eze n’ihi ndi-Ju, ime ka ha la n’iyì.

8 Ọzọ, ndeputa odide-akwukwọ iwu ahu nke enyere nime Shushan ikpochapu ha, o nyere ya ya, ime ka Esta hu ya, na igosi ya; na inye ya iwu ibakuru eze, iriọ ya aririọ-amara, na ichọrọ ndi-ya ihe n’iru ya.

9 Hatak we bia gosi Esta okwu Mọdekai nile.

10 Esta we gwa Hatak okwu, nye ya iwu inye Mọdekai, si:

11 Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n’aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia.

12 Ha we gosi Mọdekai okwu Esta nile.

13 Mọdekai we si ha zaghachi Esta, si, Ekwula na nkpuru-obi-gi na i gēwepuga onwe-gi n’ulo eze, kari ndi-Ju nile.

14 N’ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n’ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n’iyì: ma ònye mara ma ọ bu n’ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze?

15 Esta we si ha zaghachi Mọdekai okwu, si,

16 Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n’uzọ di otú a ka m’gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n’iyì, alawom n’iyì.

17 Mọdekai we gabiga, me dika ihe nile si di nke Esta nyere ya n’iwu.

Categories
ESTA

ESTA 5

1 O rue, n’ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n’ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n’oche-eze ala-eze ya n’ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu.

2 O rue, mb͕e eze huru Esta, bú nwunye eze, ka o nēguzo n’ogige, na ọ natara amara n’anya-ya: eze we setipuru Esta nkpa-n’aka ọla-edo nke di n’aka-ya. Esta we biarue nso, metu isi nkpa-n’aka ahu.

3 Eze we si ya, Gini ka i nāchọ, Esta, nwunye eze? gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēnye kwa gi.

4 Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka eze na Heman bia ta n’ọṅuṅu-manya-vine ahu nke m’meworo ya.

5 Eze we si, Menu ka Heman me ngwa ime ihe Esta kwuru. Eze na Heman we bia n’ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.

6 Eze we si Esta n’ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme ya.

7 Esta we za, si, Aririọm na ọchichọm bu;

8 ọ buru na ahutawom amara n’iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m’nāriọ, na ime ihe m’nāchọ, ka eze na Heman bia n’ọṅuṅu-manya-vine nke m’gēmere ha, echi ka m’gēme kwa dika okwu eze si di.

9 Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n’obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n’ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n’iru ya, Heman juputara n’ọnuma megide Mọdekai.

10 Ma Heman jisiri onwe-ya ike, ba n’ulo-ya; o we ziga, me ka ndi nāhu ya n’anya bia, ha na Zeresh, bú nwunye-ya.

11 Heman we kọrọ ha akukọ bayere nsọpuru nke àkù-ya, na iba-uba nke umu-ya ndikom, na ihe nile nke eze ji me ka ọ di uku, nke o ji buli kwa ya ibu onye-isi nke ndi-isi na ndi-orù eze.

12 Heman we si, Ọzọ, Esta, bú nwunye eze, emeghi onye ọ bula ka o so eze bata n’ọṅuṅu-manya-vine nke o mere, ọ bu nání mu onwem; ọzọ kwa, echi ka akpọworo mu onwem jekuru ya, mu na eze.

13 Ma ihe a nile adighi-ezurum, na mb͕e nile mu onwem nāhu Mọdekai, bú onye-Ju, ka ọ nānọdu n’ọnu-uzọ-ama eze.

14 Zeresh, bú nwunye-ya, na ndi nile nāhu ya n’anya, we si ya, Ka ha me osisi nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, ma n’ututu gi si eze ka akwuba Mọdekai n’elu-ya: gi so kwa eze ba n’ọṅuṅu-manya-vine ahu nāṅuri ọṅu. Okwu ahu we di nma n’anya Heman; o we me osisi ahu.

Categories
ESTA

ESTA 6

1 N’abali ahu urá eze fepuru n’anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n’ubọchi ahu, ewe nāgu ha n’iru eze.

2 Ewe hu ihe a nke edere n’akwukwọ, bú na Mọdekai gosiri ihe bayere Bignata na Teresh, bú ndi-onozi abua nke eze, nime ndi nēche ngata-uzọ, ndi chọrọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.

3 Eze we si, Nsọpuru na idi-uku gini ka emere Mọdekai n’ihi ihe a? Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si, Ọ dighi ihe emere ya.

4 Eze we si, Ònye nọ n’ogige? Ma Heman abatawo n’ogige ulo eze nke di n’èzí, isi eze ka ọ kwuba Mọdekai n’osisi nke o doziri nye ya.

5 Ndi nējere eze ozi we si ya, Le, Heman nēguzo n’ogige. Eze we si, Ya bata.

6 Heman we bata. Eze we si ya, Gini ka agēme nwoke ahu, bú onye nsọpuru-ya tọworo eze utọ? Heman we si n’obi-ya, Ònye ka ọ nātọ eze utọ inye nsọpuru karim?

7 Heman we si eze, Nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ,

8 ka achita uwe ala-eze nke eze yiriworo, na inyinya nke eze nọkwasiworo, na okpu-eze nke ala-eze nke ekpukwasiworo ya n’isi:

9 ka enye kwa uwe ahu na inyinya ahu n’aka otù nwoke nime ndi-isi eze, ndi bu eze, ka ha yikwasi kwa nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, ka ha me kwa ka inyinya būru ya ga n’amá obodo, ka ha kpọ kwa n’iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.

10 Eze we si Heman, Me ngwa, chiri uwe ahu na inyinya ahu, dika i si kwu, me-kwa-ra Mọdekai otú a, bú onye-Ju, nke nānọdu n’ọnu-uzọ-ama eze: ka okwu ọ bula ghara idapu n’ihe nile nke i kwuworo.

11 Heman we chiri uwe ahu na inyinya ahu, yikwasi Mọdekai, me ka inyinya būru ya ga n’amá obodo, ọ kpọ-kwa-ra n’iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.

12 Mọdekai we laghachi n’ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n’ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.

13 Heman we kọrọ Zeresh, bú nwunye-ya, kọ-kwa-ra ndi nile nāhu ya n’anya, ihe nile nke mere ya. Ndi-ya mara ihe na Zeresh, bú nwunye-ya, we si ya, Ọ buru na Mọdekai sitere na nkpuru ndi-Ju, bú onye i maliteworo ida n’iru ya, i gaghi-enwe ike imegide ya, kama i ghaghi ida n’iru ya.

14 Mb͕e ha na ya nọ nēkwurita okwu, ndi-onozí eze biaruru nso, we me ngwa ime ka Heman bata n’ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.

Categories
ESTA

ESTA 7

1 Eze na Heman we bata iso Esta, bú nwunye eze, ṅu manya-vine.

2 Eze we si kwa Esta n’ubọchi nke-abua, n’ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi, Esta, nwunye eze? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme kwa ya.

3 Esta, bú nwunye eze we za, si, Ọ buru na ahutawom amara n’iru gi, eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma, ka enyem ndum n’aririọm, na ndim n’ọchichọm:

4 n’ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n’iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m’gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n’ihe gēfunari eze.

5 Eze, bú Ahasuerọs, we za, si Esta, bú nwunye eze, Ònye ka ọ bu, bú onye a? òle ebe onye a nọ kwa, bú onye ahu nke obi-ya mere ka o zue ime otú a?

6 Esta we si, Otù onye-nkpab͕u na onye-iro, bú Heman ọjọ a. Heman we tua egwu nke-uku n’iru eze na nwunye eze.

7 Eze we si n’ọṅuṅu manya-vine bilie n’ọnuma-ya je n’ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n’aka Esta, bú nwunye eze; n’ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.

8 Eze we si n’ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya biaghachi n’ulo ọṅuṅu manya-vine ahu; ma Heman adawo n’elu ihe-ndina nke Esta nọ n’elu ya. Eze we si, Ọ̀ gēweda kwa nwunye eze n’ala n’irum n’ulom? Mb͕e okwu ahu putara n’ọnu eze, ha kpuchiri iru Heman.

9 Habona, bú otù onye nime ndi-onozi ndi nọ n’iru eze, we si, Le kwa, osisi ahu nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, nke Heman mere nye Mọdekai, bú onye kwuru ezi ihe bayere eze, o nēguzo n’ulo Heman. Eze we si, Kwubanu ya n’elu ya.

10 Ha we kwuba Heman n’elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.

Categories
ESTA

ESTA 8

1 N’ubọchi ahu eze, bú Ahasuerọs, nyere Esta, bú nwunye eze, ulo Heman, bú onye nākpab͕u ndi-Ju. Ma Mọdekai biara n’iru eze; n’ihi na Esta gosiri ka ya na ya si di.

2 Eze we wezuga nb͕a-aka-ya, nke o mere ka ọ ghara idi n’aka Heman, o we nye ya Mọdekai. Esta we do Mọdekai onye-isi ulo Heman.

3 Esta we kwu kwa ọzọ n’iru eze, da n’ala n’iru ukwu-ya abua, kwa ákwá, riọ ya aririọ-amara, bú ka o me ka ihe ọjọ Heman, bú onye Egag, na èchìchè-ya nke o chère megide ndi-Ju gabiga.

4 Eze we setipuru Esta nkpa-n’aka ọla-edo ya. Esta we bilie, guzo n’iru eze,

5 si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n’iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n’iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n’anya-ya, ka ede ya n’akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n’iyì, bú ndi nọ n’ala nile anāchi achi nke eze.

6 N’ihi na #m’gēsi aṅa pu inagide ya mb͕e m’huru ihe ọjọ nke nābiakwasi ndim? #m’gēsi kwa aṅa pu inagide ya mb͕e m’huru ila-n’iyì umu-nnam?

7 Eze, bú Ahasuerọs, we si Esta, bú nwunye eze, si kwa Mọdekai, bú onye-Ju, Le, ulo Heman ka m’nyere Esta, nwoke ahu ka ha kwuba-kwa-ra n’elu osisi, n’ihi na o setiri aka-ya megide ndi-Ju.

8 Unu onwe-unu kwa, denu akwukwọ bayere ndi-Ju, dika o si di nma n’anya-unu, n’aha eze, were-kwa-nu nb͕a-aka-akàrà eze kà ya: n’ihi na odide-akwukwọ nke edeworo n’aha eze, nke ewerewo-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, ọ dighi onye puru ichighari ya.

9 Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n’ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n’ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n’India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.

10 O we de akwukwọ n’aha eze, bú Ahasuerọs, were nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, zìga akwukwọ n’aka ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya nēbu, bú ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule na umu-inyinya nēbu:

11 bú akwukwọ nke eze kwere nime ha ka ndi-Ju ndi nọ n’obodo nile ọ bula kpọkọta onwe-ha, guzo kwa n’ihi ndu-ha, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ha la n’iyì, bú usu-ndi-agha nile nke ndi ahu na ala ahu anāchi achi ndi nākpab͕u ha, ma umu-ntakiri-ha, ma ndinyom-ha, na iluta ihe-nkwata-ha n’agha,

12 n’ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, n’otù ubọchi, bú n’ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.

13 Ndeputa odide-akwukwọ, nke agēnye dika iwu n’ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ndi-Ju nọ na njikere bayere ubọchi a, ibọrọ onwe-ha ọ́bọ̀ n’iru ndi-iro-ha.

14 Ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule nēbu puru, ebe ewere okwu eze kwalie ha, me ka ha me ngwa; enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze.

15 Mọdekai we si n’iru eze pua n’uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu.

16 Ndi-Ju nwere ìhè, na ọṅù, na obi-utọ na nsọpuru.

17 N’ala nile ọ bula anāchi achi, na n’obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n’ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.

Categories
ESTA

ESTA 9

1 Ma n’ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, n’ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, mb͕e okwu eze na iwu-ya biaruru nso ka eme ya, n’ubọchi mb͕e ndi-iro ndi-Ju lere anya ibu ndi-isi-ha; ma ab͕anwere ya, ndi-Ju onwe-ha we ghọ ndi-isi nke ndi nākpọ ha asì;

2 ndi-Ju kpọkọtara onwe-ha n’obodo nile ha n’ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, iseti aka megide ndi nāchọ ọdi-njọ-ha: ọ dighi kwa nwoke ọ bula guzoro n’iru ha; n’ihi na oké egwu-ha dakwasiri ndi nile di iche iche.

3 Ndi-isi nile nke ala nile anāchi achi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi nāchi ala, na ndi nēje ozi eze nwere, ha nēye-kwa-ra ndi-Ju aka; n’ihi na oké egwu Mọdekai dakwasiri ha.

4 N’ihi na Mọdekai di uku n’ulo eze, akukọ-ya we nējezu n’ala nile anāchi achi: n’ihi na nwoke ahu, bú Mọdekai, nāga n’iru n’idi uku.

5 Ndi-Ju we were ntib͕u mma-agha na ob͕ub͕u na ila-n’iyì tib͕ue n’etiti ndi-iro-ha nile, me ndi nākpọ ha asì dika ọ tọrọ ha.

6 Ma nime Shushan, bú ulo uku eze, ndi-Ju b͕uru nnù ndikom na ọgu ise, me ka ha la n’iyì.

7 Ha b͕u-kwa-ra Pashandata, na Dalfon, na Aspata,

8 na Porata, na Adalia, na Aridata,

9 na Pamashta, na Arisai, na Aridai, na Vaizata,

10 bú umu-ndikom iri nke Heman nwa Hamedata, bú onye nākpab͕u ndi-Ju; ma ha esetighi aka-ha n’ihe-nluta-n’agha-ha.

11 N’ubọchi ahu ọnu-ọgugu ndi eb͕uru eb͕u na Shushan, bú ulo uku eze, biaruru n’iru eze.

12 Eze we si Esta, bú nwunye eze, Nime Shushan, bú ulo uku eze, ka ndi-Ju b͕uworo nnù ndikom na ọgu ise, na umu-ndikom iri Heman, me ka ha la n’iyì; gini kwa ka ha meworo n’ala anāchi achi nke fọduru nke eze? Ma gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi ọzọ? agēme kwa ya.

13 Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enye kwa ndi-Ju ike echi, bú ndi nọ na Shushan, ime dika iwu ta si di, ka akwuba kwa umu-ndikom iri Heman n’elu osisi.

14 Eze we si ka eme ya otú a: ewe nye iwu nime Shushan; ha we kwuba umu-ndikom iri nke Heman.

15 Ndi-Ju ndi nọ na Shushan we kpọkọta kwa onwe-ha n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, b͕ue ọgu ndikom iri-na-ise nime Shushan; ma ha esetighi aka-ha n’ihe-nluta-n’agha-ha.

16 Ndi-Ju fọduru ndi nọ n’ala nile anāchi achi nke eze kpọkọta-kwa-ra onwe-ha, we guzo n’ihi ndu-ha, zuru ike pua n’aka ndi-iro-ha, b͕ue orú nnù ndikom uzọ iteghete na nnù asa na ọgu iri n’etiti ndi nākpọ ha asì; ma ha esetighi aka-ha n’ihe-nluta-n’agha-ha.

17 N’ubọchi nke-iri-na-atọ n’ọnwa Ada ka ha mere nka; ha we zuru ike n’ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.

18 Ma ndi-Ju ndi nọ na Shushan kpọkọtara onwe-ha n’ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, na n’ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya; ha we zuru ike n’ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.

19 N’ihi nka ndi-Ju nke obodo nile nēnweghi mb͕idi, bú ndi bi n’obodo nēnweghi mb͕idi, nēme ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada ka ọ buru ubọchi ọṅù na ọṅuṅu-manya-vine, na ezi ubọchi, na ubọchi izigaritara onwe-ha òkè.

20 Mọdekai we de ihe ndia n’akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n’ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n’ebe di anya,

21 ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n’ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n’arọ nile ọ bula,

22 dika ubọchi nke ndi-Ju zuru ike nime ha pua n’aka ndi-iro-ha, na ọnwa ahu nke b͕anwere n’ebe ha nọ, isi n’ihe-nwuta ghọ ọṅù, isi kwa n’iru-újú ghọ ezi ubọchi: na ha ganēme ha ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na nke ọṅù, na nke izigaritara onwe-ha òkè, na nke inye ndi-ob͕eye onyinye.

23 Ndi-Ju we nara ihe ahu nke ha malitere ime, na nke Mọdekai degara ha n’akwukwọ;

24 n’ihi na Heman nwa Hamedata, onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju nile, chère èchìchè megide ndi-Ju ime ka ha la n’iyì, o we fe Pua, nke ahu bu nzà, ichusa ha, na ime ka ha la n’iyì;

25 ma mb͕e Esta batara n’iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n’isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n’elu osisi.

26 N’ihi nka ka ha kpọrọ ubọchi ndia Purim, n’aha Pua ahu. N’ihi nka, bú n’ihi okwu nile nke akwukwọ a, na ihe ha huru bayere nka, na ihe biaruru ha aru,

27 n’ihi nka ka ndi-Ju mere ka o guzosie ike, ha we nara ihe a bayere onwe-ha, baye-kwa-ra nkpuru-ha, baye-kwa-ra ndi nile ndi nārapara n’aru-ha, ka o we ghara igabiga, bú na ha ganēme ememe n’ubọchi abua ndia dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika mb͕e-ha ezubere ezube si di, n’arọ nile ọ bula;

28 na aganēcheta kwa ubọchi ndia me kwa ememe nime ha n’ọb͕ọ nile ọ bula, na ab͕uru ọ bula, na ala ọ bula anāchi achi, na obodo ọ bula; na ubọchi ndia nke Purim agaghi-esi kwa n’etiti ndi-Ju gabiga, na ncheta-ha agaghi-agwu kwa site na nkpuru-ha.

29 Esta, bú nwunye eze, nwa-nwayi Abihail, na Mọdekai, bú onye-Ju, we were ike nile de akwukwọ ime ka akwukwọ-ozi a nke-abua nke Purim guzosie ike.

30 O we zigara ndi-Ju nile akwukwọ, nke okwu udo na nke ezi-okwu di nime ha, rue ọgu ala anāchi achi isi na asa, bú nke ala-eze Ahasuerọs,

31 ime ka ubọchi ndia nke Purim guzosie ike nime mb͕e-ha ezubere ezube, dika Mọdekai, bú onye-Ju, na Esta, bú nwunye eze, mere ka ha guzosiere ha ike, na dika ha mere ka ha guzosiere onwe-ha, guzosi-kwa-ra nkpuru-ha, ike, bú okwu obubu-ọnu na ikwa-ákwá-ha.

32 Okwu-ọnu Esta we me ka okwu ndia nke Purim guzosie ike; ewe de ya n’akwukwọ.

Categories
ESTA

ESTA 10

1 Eze, bú Ahasuerọs, we me ka ala ahu na ala nile nke di oké osimiri buruburu tua utu.

2 Ma ọlu nile nke ike-ya na nke idi-ike-ya, na ọkukọ-isi nke idi-uku nke Mọdekai, bú nke eze mere ya ka ọ di uku, èdeghi ihe ndia n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Midia na Peasia?

3 N’ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n’etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.