Categories
EMOS

EMOS 1

1 Okwu Emos, onye nọ n’etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n’ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n’ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.

2 Ọ we si, Jehova gēsi na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; ebe-ita-nri nile nke ndi-ọzùzù-aturu ewe ru újú, elu Kamel gākpọnwu kwa.

3 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Damaskọs, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na ha ewerewo ígwè eji azọcha ọka zọcha Gilead:

4 ma M’gēzite ọku n’ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.

5 M’gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n’ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n’aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n’ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.

6 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Geza, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na ha mere ka otù ndi je biri n’ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n’aka Edom:

7 ma M’gēzite ọku n’elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile:

8 M’gēsi kwa n’Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n’Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n’aka-eze; M’gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n’iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.

9 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Taia, e, n’ihi anọ ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na ha mechibidoro otù ndi emere ka ha nile je biri n’ala ọzọ nye n’aka Edom, ha echetaghi kwa ọb͕ub͕a-ndu nke umu-nne:

10 ma M’gēzite ọku n’elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.

11 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Edom, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi:

12 ma M’gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.

13 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n’ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara:

14 ma M’gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n’iti-nkpu agha n’ubọchi agha, n’oké ifufe n’ubọchi oké ikuku:

15 eze-ha gāla kwa n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ya onwe-ya na ndi-isi-ya n’otù; otú a ka Jehova siri.

Categories
EMOS

EMOS 2

1 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Moab, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na o surere ọkpukpu eze Edom me ka ha ghọ nzu:

2 ma M’gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n’iti-nkpu agha, na n’olu opì-ike:

3 M’gēbipu kwa onye-ikpe n’etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri.

4 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Juda, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha:

5 ma M’gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem.

6 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Israel, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na ha reworo onye ezi omume n’ọla-ọcha, re kwa ob͕eye n’ihi akpukpọ-ukwu abua:

7 ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n’isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n’obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:

8 ọ bu kwa n’elu uwe anaraworo n’ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n’akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n’ulo Chineke-ha.

9 Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n’iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n’elu na nkpọrọgwu-ya nile n’okpuru.

10 Ọ bu kwa Mu onwem mere ka unu si n’ala Ijipt rigoputa, M’me-kwa-ra ka unu je ije n’ọzara ọgu arọ abua, ka unu we nweta ala ndi-Amorait.

11 Eme-kwa-ram ka ufọdu nime umu-unu bilie ibu ndi-amuma, ufọdu nime umu-okorọbia-unu kwa, ibu ndi-Nazirait. Ọ̀ bughi nọ̄ ezie, bú nka, unu umu Israel? Ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 Unu we me ka ndi-Nazirait ṅua manya-vine; ọ bu kwa ndi-amuma ka unu nyere iwu, si, Unu ebula amuma.

13 Le, Mu onwem gābiada unu n’ọnọdu-unu, dika ub͕ọ-ala nke juputara n’ùkwù ọka si abiada.

14 Ebe-nb͕alaga gālanari kwa onye ukwu ọsọ n’iyì, onye di ike agaghi-ab͕a kwa ike-ya ume, dike agaghi-ewepuga onwe-ya:

15 onye nāchi uta agaghi-eguzo kwa; onye ukwu-ya abua di nfe n’ib͕a ọsọ agaghi-ewepuga kwa onwe-ya: onye nānọkwasi n’inyinya agaghi-ewepuga kwa onwe-ya:

16 onye obi-ya nwere ume n’etiti ndi-dike gāb͕a ọtọ b͕alaga n’ubọchi ahu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
EMOS

EMOS 3

1 Nurunu okwu a nke Jehova kwuworo megide unu, umu Israel, megide ab͕uru ahu nile nke M’mere ka ha si n’ala Ijipt rigoputa, si,

2 Nání unu ka M’maworo n’etiti ab͕uru nile nke uwa: n’ihi nka ka M’gēji ajọ omume nile unu leta unu.

3 Màdu abua gāyikọta je ije, ma ọ buru na ha ezuteghi?

4 Ọdum, ọ̀ gāb͕ọ uja n’oké ọhia, mb͕e ọ dighi anu ọ nādọb͕u? nwa-ọdum, ọ̀ gēme ka olu-ya si n’ebe-obibi-ya da, ma ọ buru na o nwudeghi ihe?

5 Nnunu, ọ̀ gādabà n’ib͕udu di n’ala, ebe ọ nādighi ọnyà esiri ya? ib͕udu, ò gēsi n’ala kpọhiepu, ma o jideghi ihe ọ bula?

6 Àgāfù opì-ike n’obodo, ndi-ya aghara ima jijiji? ihe ọjọ, ọ̀ gādi n’obodo, ma Jehova emeghi ya?

7 N’ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.

8 Ọdum ab͕ọwo uja, ọ̀ bu onye nāgaghi-atu egwu? Onye-nwe-ayi Jehova ekwuwo, ọ̀ bu onye nāgaghi-ebu amuma?

9 Menu ka anuru ya n’elu ulo-elu nile n’Ashdod, na n’elu ulo-elu nile n’ala Ijipt, si, Zukọtanu n’elu ugwu nile nke Sameria, hu ọb͕ub͕a-aghara di ọtutu nke di n’etiti ya, na nmeb͕u di iche iche nke di nime ya.

10 N’ihi na ha amaghi ime ihe ziri ezi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), bú ndi nākpakọba ihe-ike na ipunara-madu-ihe n’ulo-elu nile ha.

11 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Onye-nkpab͕u gādi, ọbuná buruburu ala-gi: ọ gēme kwa ka ike-gi danari gi, agāluta kwa ulo-elu gi nile n’agha.

12 Otú a ka Jehova siri: Dika onye-ọzùzù-aturu si anaputa ọlu-ukwu abua, ma-ọbu iberibe nti, n’ọnu ọdum; otú a ka agānaputa umu Israel ndi nānọdu ala nime Sameria na nkuku ihe-ndina, na n’elu nkisi ọma nke ebe anēdina.

13 Nurunu, b͕anu àmà imegide ulo Jekob; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta.

14 N’ihi na n’ubọchi M’gēji njehie nile nke Israel leta ya, n’ubọchi ahu ka M’gēji kwa nmehie ebe-ichu-àjà nke Bet-el leta ha, agēbipu kwa mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu, ha ewe da n’ala.

15 M’gēti kwa ma ulo mb͕e oyi ma ulo mb͕e okpom-ọku ihe; ulo nile nke ejiri ọdu wu gāla kwa n’iyì, ọtutu ulo gāgwusi kwa; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
EMOS

EMOS 4

1 Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n’ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.

2 Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo idi-nsọ-Ya ṅua iyi, si, na le, ubọchi nābiakwasi unu, mb͕e agāchiri nkò bupu unu, chiri kwa nkò azù bupu ndi-unu fọduru.

3 Ọ bu kwa ntipú-mb͕idi di iche iche ka unu gēsi pua, nwanyi ọ bula na ncherita-iru ya; unu gātubà onwe-unu na Hamon; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

4 Bianu na Bet-el, jehie; bianu na Gilgal, me ka njehie ba uba; chibata-kwa-nu ihe-àjà-unu kwa-ututu, chibata ihe nile bu otù uzọ n’uzọ iri unu kwa ubọchi atọ;

5 sure-kwa-nu àjà-ekele dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ site n’achicha ekoro eko, kpọsa-kwa-nu onyinye-afọ-ofufo di iche iche, me ka anuru ihe bayere ha: n’ihi na ihe di otú a ka unu huworo n’anya, umu Israel; ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

6 Mu onwem kwa, enyewom unu ezé nwuru enwu n’obodo nile unu, na ukọ nri n’ebe nile unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n’ọnu jehova puta.

7 Ọzọ kwa, Mu onwem eb͕ochiworo unu oké miri-ozuzo, mb͕e ọnwa atọ fọduru iru mb͕e owuwe-ihe-ubi: eme-kwa-ram ka o zokwasi otù obodo, ma adighm-eme ka o zokwasi obodo ọzọ: otù òkè ala-ubi ka o nēzokwasi, ma òkè ala-ubi ahu nke ọ nādighi-ezokwasi nākpọnwu akpọnwu.

8 Obodo abua ma-ọbu atọ ewe ṅagharia rue otù obodo iṅu miri, ma ha adighi-aṅuju afọ: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

9 Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, tib͕ue unu: ka ha rà, bú ubi-unu ab͕ara ogige, na ubi-vine-unu, na osisi fig unu, na osisi olive unu, palmer-worm nērichapu ha: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

10 Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n’etiti unu n’uzọ o si eme n’Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n’agha; M’we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n’imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

11 Akwatuwom ufọdu n’etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n’orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 N’ihi nka ka M’gēme gi otú a, gi Israel: ebe ọ bu nka ka M’gēme gi, jikere izute Chineke-gi, gi Israel.

13 N’ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.

Categories
EMOS

EMOS 5

1 Nurunu okwu a nke Mu onwem nēbuli n’isi unu ka ọ buru abù-ákwá, unu ulo Israel.

2 Nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke adawo; ọ gaghi-ebili ọzọ: atusawo ya n’ala-ya; ọ dighi onye nēme ka o bilie.

3 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Obodo ahu nke chiri nnù ndi-agha abua na ọgu iri apu gēnwe ọgu ise fọduru, nke chiri ọgu ise apu gēnwe kwa iri fọduru ulo Israel.

4 N’ihi na otú a ka Jehova siri ulo Israel, Chọnum, we di ndu:

5 ma unu achọla Bet-el, unu abà-kwa-la na Gilgal, unu agabiga-kwa-la ijeru Bia-sheba: n’ihi na aghaghi ime ka Gilgal je biri n’ala ọzọ, Bet-el gāghọ kwa ajọ ihe.

6 Chọnu Jehova, we di ndu; ka O we ghara ibia ike ike dika ọku n’ulo Josef, o we ripia, ọ gaghi-adi kwa onye nēmenyu ya nime Bet-el:

7 unu ndi nāb͕anwe ikpé ziri ezi ka ọ ghọ wormwood, ndi nātọb͕ọ kwa ezi omume n’ala;

8 chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya;

9 Onye ahu Nke nēme ka nbibi b͕ukwasi onye di ike dika àmùmà, nbibi ewe biakwasi ebe ewusiri ike.

10 Ha nākpọ onye nāba nba n’ọnu-uzọ-ama asì, ọ bu kwa onye nēkwu okwu n’izu-okè ka ha nākpọ onye-árú.

11 N’ihi nka, ebe unu nāzọb͕u onye nēnweghi ike, ebe unu nānara kwa ya ọka wheat n’ùtú: ulo nkume awara awa ka unu wuworo, ma unu agaghi-ebi nime ha; ubi-vine anāchọsi ike ka unu meworo, ma unu agaghi-aṅu manya-vine-ha.

12 N’ihi na amawom na ihe bara uba ka njehie-unu bu, na ihe di ike ka nmehie nile unu bu; unu ndi nākpab͕u onye ezi omume, ndi nānara ihe-nb͕aputa, ma ọ bu umu-ob͕eye di n’ọnu-uzọ-ama-unu ka unu nēwezuga n’ikpe-ha.

13 N’ihi nka onye nwere uche gēdere du n’oge ahu; n’ihi na oge ọjọ ka ọ bu.

14 Chọnu ezi ihe, achọ-kwa-la ihe ọjọ, ka unu we di ndu: Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ewe si otú a nọnyere unu, otú unu siri.

15 Kpọnu ihe ọjọ asì, hunu ezi ihe n’anya, menu ikpé ziri ezi ka o guzosie ike n’ọnu-uzọ-ama: eleghi anya Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, gēmere ndi Josef fọduru amara.

16 N’ihi nka ka Jehova bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye-nwe-ayi, jiri si otú a: N’amá nile ka otiti-aka-n’obi gādi; ọ bu kwa n’èzí nile ka ha gāsi, Éwù! éwù! ha gākpọ kwa onye-ubi ibia iru-újú, kpọsa-kwa-ra ndi mara igu awa otiti-aka-n’obi.

17 Ọ bu kwa n’ubi-vine nile ka otiti-aka-n’obi gādi: n’ihi na M’gāgabiga n’etiti gi; otú a ka Jehova siri.

18 Ahuhu diri unu ndi nāchọsi ubọchi Jehova ike! ùrù gini ka ubọchi Jehova gābara unu? ubọchi ahu bu ọchichiri, ọ bughi ìhè.

19 Dika agāsi na otù onye nāb͕apu n’iru ọdum, anu-ọhia bear we zute ya; o we ba n’ulo-ya dabere aka-ya na mb͕idi, agwọ we ta ya.

20 Ọ̀ bughi ọchichiri ka ubọchi Jehova gābu, nke nābughi ìhè? ọ̀ gaghi-ab͕a kwa oké ọchichiri, nke onwunwu ọ bula nādighi ya?

21 Akpọwom ememe nile unu asì, ju ha, M’gaghi-anu kwa ísì utọ n’ubọchi-nb͕ochi nile unu.

22 N’ihi na ọ buru na unu esurerem àjà-nsure-ọku nile na onyinye-inata-iru-ọma nile unu, ha agaghi-atọm utọ: ọ bu kwa àjà-udo nke anu mara abuba nile unu ka M’nāgaghi-elegide.

23 Wezuga n’arum ùzù abù-gi nile; ọ bu kwa ọkpukpọ une-gi nile ka M’nāgaghi-anu.

24 Ma ka ikpé ziri ezi nērùdasi ike dika miri, ezi omume kwa dika miri-iyi nke nērù mb͕e dum.

25 Ọ̀ di àjà di iche iche na onyinye-inata-iru-ọma unu wetaram n’ọzara ọgu arọ abua, unu ulo Israel?

26 É-è, kama unu eburuwo ulo-ikwū nke eze-unu na Kaiun, bú onyinyo-unu, bú kpakpando nke chi-unu, nke unu mere onwe-unu.

27 M’gēme kwa ka unu je biri n’ala ọzọ n’ofè Damaskọs, ka Jehova, Onye aha-Ya bu Chineke nke usu nile nke ndi-agha, siri.

Categories
EMOS

EMOS 6

1 Ahuhu diri ndi nọ jū na Zaion, na ndi nwere ntukwasi-obi n’ugwu Sameria, ndi akpọrọ n’aha n’aha n’etiti isi mba nke mba nile, ndi ulo Israel biakuteworo!

2 Gabiganu rue Kalne, hu; si-kwa-nu n’ebe ahu jerue Hemat nke bara uba: rida-kwa-nu rue Gat nke ndi Filistia: hà di nma kari ala-eze ndia? ma-ọbu ókè-ala-ha, ò riri nne kari ókè-ala-unu?

3 Unu ndi nāchupu ubọchi ọjọ, ma unu nēme ka ọnọdu ihe-ike bia nso:

4 ndi nēdina n’elu ihe-ndina ọdú, nēseti kwa onwe-ha n’elu ebe-ndina-ha, nēri kwa umu-aturu ọma sitere n’ìgwè ewu na aturu, na umu-ehi site n’etiti ulo ebe anēme ka anu ma abuba;

5 ndi nābùso olu une abù efu; dika Devid ka ha zuputaworo onwe-ha ubọ-abù di iche iche;

6 ndi nāṅu manya-vine n’ọkwa-nwusa, ọ bu kwa manu kachasi nma ka ha ji ete onwe-ha; ma ha ariaghi ọria n’ihi nkpaji akpajiri Josef.

7 N’ihi nka ub͕u a ka agēme ka ha je biri n’ala ọzọ buru ndi-obu-uzọ nke ndi anēme ka ha je biri n’ala ọzọ, oriri ọkwukwa-ozu nke ndi nēseti onwe-ha gēwezuga kwa onwe-ya.

8 Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo Onwe-ya ṅua iyi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta), si: Mu onwem nākpọ npako Jekob ihe-árú, ọ bu kwa ulo-elu-ya nile ka M’kpọworo asì: M’gēmechibido kwa obodo na ùjú-ya nye n’aka onye-iro.

9 Ọ gēru kwa, na ọ buru na ndikom iri fọduru n’otù ulo, na ha gānwu.

10 Ma mb͕e nwa-nne nna madu, bú onye-nsure-ọku-ya, gēburu ya ichipu ọkpukpu n’ulo, si onye nke nọ n’ime-ime-ulo nke ulo ahu, Ọ̀ di onye ọzọ gi na ya nọ? ọ gāsi, É-è; si kwa, Nọdu du; n’ihi na ayi agaghi-ehota aha Jehova.

11 N’ihi na, le, Jehova nēnye iwu, Ọ gētipiasi kwa ulo uku, ọ bu kwa ulo ntà ka Ọ gētiwasi.

12 Inyinya, hà nāb͕a ọsọ n’elu nkume di elu? àgēji ehi dọ ihe eji gwu ala-ubi n’ebe ahu? na unu ab͕anwewo ikpé ka ọ ghọ ńsí, b͕anwe kwa nkpuru ezi omume ka ọ ghọ wormwood:

13 unu ndi nāṅuri n’ihe nābughi ihe, ndi nāsi, Ọ̀ bughi ike nke aka ayi ka ayi jiworo natara onwe-ayi mpi di iche iche?

14 N’ihi na, le, M’gaje ime ka otù mba bilie imegide unu, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta; ha gēmeb͕u kwa unu site na nbata Hemat rue iyi Araba.

Categories
EMOS

EMOS 7

1 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m’hu: ma, le, Ọ nākpu igurube n’isi-nmalite nke opupú ahihia nke miri-ozuzo ikpe-azu; ma, le, ọ bu ahihia nke miri-ozuzo ikpe-azu mb͕e ebìsiri ahihia eze.

2 O rue, mb͕e ha ripiasiri ihe-ọkukú nile nke ala, na m’siri, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, b͕aghara: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n’ihi na onye ntà ka ọ bu.

3 Jehova chèghariri uche bayere nka: Ọ gaghi-adi, ka Jehova siri.

4 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m’hu: ma, le, Jehova nākpọ òkù ka Ya na ndi-Ya kpe ikpe site n’ọku; o we ripia oké ob͕u-miri, we nēripia òkè a, bú ala Israel.

5 M’we si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, rapu: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n’ihi na onye ntà ka ọ bu.

6 Jehova chèghariri uche bayere nka: Nka agaghi-adi kwa, ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.

7 Otú a ka O mere ka m’hu: ma, le, Onye-nwe-ayi nēguzo Onwe-ya n’akuku mb͕idi ejiri opù eji atù mb͕idi lua, ọ bu kwa n’aka-Ya ka opù eji atù mb͕idi di.

8 Jehova we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M’we si, Opù eji atù mb͕idi; Onye-nwe-ayi we si, Le, M’gaje ido opù eji atù nb͕idi n’etiti ndim, bú Israel; M’gaghi-agabiga kwa nmehie-ha ọzọ:

9 ebe nile di elu nke Aisak gātọb͕ọ kwa n’efu, ebe nsọ nile nke Israel gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe; M’gēji kwa mma-agha bilie imegide ulo Jeroboam.

10 Amazaia, bú onye-nchu-àjà Bet-el, we zigara Jeroboam, bú eze Israel, ozi, si, Emos ekekọtawo madu imegide gi n’etiti ulo Israel: ala apughi inagide okwu-ya nile.

11 N’ihi na otú a ka Emos siri, Site na mma-agha ka Jeroboam gānwu, aghaghi ime kwa ka Israel si n’ala-ya je biri n’ala ọzọ.

12 Amazaia we si Emos, Gi onye-ọhu-uzọ, je b͕alaga n’ala Juda, rie nri n’ebe ahu, ọ bu kwa n’ebe ahu ka i gēbu amuma:

13 ma ebu-kwa-la amuma ọzọ nime Bet-el: n’ihi na ebe nsọ nke eze ka ọ bu; ọzọ, ulo ala-eze ka ọ bu.

14 Emos we za, si Amazaia, Ọ dighi onye-amuma m’bu, ọ dighi kwa nwa onye-amuma m’bu; kama onye-nche-ehi ka m’bu, ya na onye nēdozi nkpuru osisi sycomore:

15 Jehova we wepum n’iso ìgwè ewu na aturu, O we sim, bú Jehova, Je, buere ndim, bú Israel, amuma.

16 Ma ub͕u a nuru okwu Jehova: Gi onwe-gi nāsi, Ebula amuma megide Israel, abusa-kwa-la okwu-gi dika miri-ozuzo megide ulo Aisak:

17 n’ihi nka ka Jehova siri otú a: Nwunye-gi ganākwa iko n’obodo, umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom gāda kwa site na mma-agha, agēji kwa eriri kèsa ala-gi; gi onwe-gi gānwu kwa n’ala ruru árú, aghaghi ime kwa ka Israel si n’ala-ya je biri n’ala ọzọ.

Categories
EMOS

EMOS 8

1 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m’hu: ma le, otù nkata nkpuru-osisi nke mb͕e nghọkọta-nkpuru.

2 O we si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M’we si, Otù nkata nke nkpuru-osisi nke mb͕e nghọkọta-nkpuru. Jehova we sim, Ọgwugwu abiaruwo ndim, bú Israel, aru; M’gaghi-agabiga kwa nmehie-ya ọzọ.

3 Abù nile nke ulo uku Chineke gāghọ kwa ikwasi-ákwá-ike n’ubọchi ahu; (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọtutu ka ozu di; n’ebe nile ọ bula ka etufuworo ha: nọdu du!

4 Nurunu nka, unu ndi nēkusi ume ike ilo ob͕eye, ndi nāchọ kwa ime ka ndi ala-unu ewedara n’ala kwusi,

5 si, Òle mb͕e ọnwa ọhu gāgabiga, ka ayi we re ọka? na ubọchi-izu-ike, ka ayi we cho ọka wheat? n’ime ka ọtùtù ephah di ntà, na ime ka ego shekel di uku, na ime ka ihe-ọtùtù aghughọ b͕agọrọ;

6 ib͕a ndi nēnweghi ike n’ọla-ọcha, na ib͕a ob͕eye n’ihi akpukpọ-ukwu abua, ọ bu kwa ọka wheat afuchapuru ka ayi gēre.

7 Jehova ejiwo npako Jekob ṅua iyi, si, Agaghm-echezọ ọlu nile ha ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.

8 Ala, ọ̀ gaghi-ama jijiji n’ihi nka? onye ọ bula nke bi nime ya, ọ̀ gaghi-eru kwa újú? e, ọ gērujucha dika osimiri Nail; ọ gāmaghari amaghari kwa, tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt.

9 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na M’gēme ka anyanwu da n’etiti-ehihie, M’gēme kwa ka uwa b͕a ọchichiri mb͕e chi bọchara abọcha.

10 M’gāb͕anwe kwa ememe nile unu ka ha ghọ iru-újú, na abù nile unu, ka ha ghọ abù-ákwá; M’gēme kwa ka ákwà-nkpe biakwasi n’úkwù nile, na isi-nkwọcha n’isi nile ọ bula; M’gēme kwa ya ka ọ di ka újú anēruru nwa-nwoke amuru nání ya, M’gēme kwa ka mb͕e ikpe-azu ya di ka ubọchi nēlu ilu.

11 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e M’gēzite oké unwu n’ala, ọ bughi oké unwu nke nri, ọ bughi kwa akpiri-ikpọ-nku miri, kama ọ bu nke inu okwu nile nke Jehova.

12 Ha gāṅaghari kwa site n’otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n’Ugwu we rue n’Ọwuwa-anyanwu; ha gāb͕aghari iru na azu ichọ okwu Jehova, ma ha agaghi-achọta ya.

13 N’ubọchi ahu ka umu-ab͕ọghọ mara nma ndi nāmaghi nwoke gāda #mbà, ha na umu-okorọbia, site n’akpiri-ikpọ-nku.

14 Ndi ji ikpe-ọmuma Sameria aṅu iyi, si, Chineke-gi nādi ndu, Dan; na, Uzọ Bia-sheba nādi ndu; ha gāda kwa, ghara ibili kwa ọzọ.

Categories
EMOS

EMOS 9

1 Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n’akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n’isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M’gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya.

2 Ọ buru na ha egwubà n’ala-mọ, site n’ebe ahu ka akam gēwere ha; ọ buru kwa na ha arigorue elu-igwe, M’gēme ka ha si n’ebe ahu ridata.

3 Ọ buru kwa na ha ezobe onwe-ha n’elu Kamel, n’ebe ahu ka M’gāchọputa ha were ha; ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n’ala oké osimiri, site n’ebe ahu ka M’gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha.

4 Ọ buru kwa na ha ala nime ndọta-n’agha n’iru ndi-iro-ha, site n’ebe ahu ka M’gēnye mma-agha iwu, o we b͕ue ha: M’gātukwasi kwa ha anyam abua ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha ezi ihe.

5 Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bu Onye nēmetu ala, o we b͕aze, ndi nile ndi bi nime ya ewe rue újú; ọ gērujucha kwa dika osimiri Nail, we tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt;

6 Onye nēwu ime-ulo-elu-Ya nile n’elu-igwe, ma mbara-ígwé-Ya, n’elu uwa ka Ọ tọworo ntọ-ala-ya; Onye nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha n’ala; Jehova bu aha-Ya.

7 Ọ̀ bughi ndi di ka umu ndi Etiopia ka unu burum, unu umu Israel? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi Israel ka M’meworo ka ha si n’ala Ijipt rigoputa, na ndi Filistia site na Kaftoa, na ndi Siria site na Kia?

8 Le, anya abua nke Onye-nwe-ayi Jehova di n’aru ala-eze a nke juputara na nmehie, M’gēkpochapu kwa ya n’elu uwa; nání na M’gaghi-ekpochapusi ulo Jekob; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

9 N’ihi na, le, Mu onwem gaje inye iwu, yọchaghari ulo Israel iru na azu n’etiti mba nile, dika esi ayọchaghari ọka nime nyọ, ma ọ dighi otù nkpuru-ọka gāda n’ala.

10 Site na mma-agha ka ndi-nmehie nile nke ndim gānwu, ndi nāsi, Ihe ọjọ ahu agaghi-erute ayi aru, ọ gaghi-abia kwa n’iru ayi n’akuku ọ bula.

11 N’ubọchi ahu ka M’gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M’gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M’gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n’ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga;

12 ka ha we nweta ndi Edom fọduru, na mba nile ndi akpọkwasiri aham; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, bú Onye nēme nka.

13 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e onye-plough gēkwudo onye nēbì ọka, onye-nzọcha-nkpuru-vine gēkwudo kwa onye nāgha nkpuru-ọghigha; ugwu nile gēme ka manya-vine utọ nābusa, ugwu ntà nile gāb͕aze kwa.

14 M’gēme kwa ka ndim adọtara n’agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n’efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.

15 M’gāku kwa ha n’elu ala-ha, agaghi-eropu kwa ha ọzọ n’ala-ha nke M’nyeworo ha; otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, siri.