Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 11

1 Zipu nri-gi n’elu miri: n’ihi na mb͕e ọtutu ubọchi gasiri i gāhu ya.

2 Nye asa òkè, e, nye kwa asatọ; n’ihi na i maghi ihe ọjọ di aṅa gādi n’uwa.

3 Ọ buru na igwe-oji ejuputa na miri-ozuzo, n’ala ka ha nāwusa onwe-ha: ọ buru kwa na osisi ada na Ndida, ma-ọbu n’Ugwu, n’ebe osisi ahu nāda, n’ebe ahu ka ọ gādigide.

4 Onye nāriba ifufe ama agaghi-agha nkpuru; ọzọ, onye nēlekwasi igwe-oji anya agaghi-ewe ihe-ubi.

5 Dika i nēsighi ma ihe bu uzọ ifufe, ma-ọbu otú ọkpukpu nile si etó n’afọ nwanyi di ime; ọbuná otú a i dighi-ama ọlu Chineke Nke nēme ha nile.

6 Gha nkpuru-gi n’ututu, ewepu-kwa-la aka-gi n’anyasi: n’ihi na i dighi-ama nke gāgazi agazi, ma ọ bu nka ma-ọbu nke-ọzọ, ma-ọbu na ha abua gādi nma otù aka ahu.

7 Ọzọ, ìhè di utọ, ọ di-kwa-ra anya abua nma ihu anyanwu.

8 E, ọ buru na madu adi ndu ọtutu arọ, ya ṅuria nime ha nile; ma ya cheta ubọchi nile nke ọchichiri, n’ihi na ha gāba uba. Ihe nile nke nābia bu ihe-efu.

9 Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n’ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n’uzọ nile nke obi-gi, na n’ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n’ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n’ikpé.

10 Ma wezuga nkpasu-iwe n’obi-gi, me kwa ka ihe ọjọ si n’anu-aru-gi gabiga: n’ihi na okorọbia na mb͕e-dìnkpà bu ihe-efu.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 12

1 Cheta kwa Onye kèworo gi n’ubọchi nile i di n’okorọbia, mb͕e ubọchi ihe ọjọ akābiaghi, na mb͕e arọ akābiarughi nso, mb͕e i gāsi, Ha atọghim utọ;

2 mb͕e anyanwu na ìhè na ọnwa na kpakpando nile akāb͕achighi, igwe-oji we lata mb͕e oké miri zosiri:

3 n’ubọchi ahu mb͕e ndi nēdebe ulo gāma jijiji, mb͕e ndi bu dìnkpà gērulata onwe-ha, mb͕e ndinyom nke nēgwe nri gākwusi n’ihi na ha di ole-na-ole, mb͕e agēme ka anya b͕achie ndinyom nēsi na window elepu anya,

4 mb͕e agēmechi uzọ n’amá; mb͕e olu ogwugwe-nri gāla ala, mb͕e madu gēbili n’urá n’olu nnunu, mb͕e ndinyom nile nke nābù abù gādi ala ala;

5 ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n’uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n’ihi na madu nāla n’ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n’obi ewe jegharia n’amá buruburu:

6 mb͕e akātọpughi udọ̀ ọla-ọcha, mb͕e akētiwaghi kwa ọkwa ọla-edo, mb͕e ite akādawaghi kwa n’isi-iyi, mb͕e akētiwaghi kwa wheel n’olùlù-miri;

7 ájá ewe laghachi n’ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.

8 Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ha nile bu ihe-efu.

9 Ma tukwasi nka, n’ihi na Onye-nkpọkọta mara ihe, ọ nọ nēzí ndi-ya ihe-ọmuma; ọ ṅa-kwa-ra nti, we gwuputa, me ka ọtutu ilu dizie.

10 Onye-nkpọkọta chọrọ ichọputa okwu nile nātọ utọ, na ihe edeziri edezi, bú okwu nile nke ezi-okwu.

11 Okwu nile nke ndi mara ihe di ka ndudu eji achu ehi, ọzọ, dika ǹtú akumiri nke-ọma ka okwu nke ndi-nwe nzukọ di, bú okwu enyere site n’aka otù onye-ọzùzù-aturu.

12 Tukwasi kwa n’ihe ndia, nwam, nara ndum-ọdu: ime ọtutu akwukwọ enweghi ọgwugwu; ọtutu nmuta bu kwa ike-ọgwugwu nke anu-aru.

13 Ka ayi nuru nkwubì okwu a nile: tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile Ọ nyere n’iwu; n’ihi na nka bu ọlu madu nile.

14 N’ihi na ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n’ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ.