Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 1

1 Okwu nke Onye-nkpọkọta, bú nwa Devid, bú eze nime Jerusalem.

2 Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ihe nile bu ihe-efu.

3 Òle ihe fọduru madu nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu n’okpuru anyanwu?

4 Otù ọgbọ alá, ọb͕ọ ọzọ abia; ma uwa nēguzoru mb͕e ebighi-ebi.

5 Ọzọ, anyanwu awawo, anyanwu adawo kwa, ọ bu kwa ila n’ọnọdu-ya ka ọ nēkusi ume ike, bú ebe ọ nāwa.

6 Ifufe nēferu Ndida, we nēfe buruburu rue Ugwu; ọ nēfe buruburu mb͕e nile na nfeghari-ya, ọ bu kwa n’ife buruburu ya ka ifufe feghachiworo.

7 Osimiri nile nērùdaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughi eju, rue ebe osimiri nērùda, rue ebe ahu ka osimiri ahu nērùghachi ọzọ.

8 Ihe nile nādọb͕u onwe-ha n’ọlu; madu apughi ikwu ya: afọ adighi-eju anya n’ihu ihe, afọ adighi-eju kwa nti n’inu ihe.

9 Ihe ọ bula nke diworo, nke ahu bu ihe nke gādi; ọzọ, ihe ọ bula nke emeworo, nke ahu bu ihe nke agēme: ọ dighi kwa ihe ọhu di n’okpuru anyanwu.

10 Ọ̀ di ihe nke madu nāsi, Le nka, ihe ọhu ka ọ bu? na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo, na mb͕e nile ebighi-ebi nke buru ayi uzọ.

11 Ọ dighi ncheta diri ọb͕ọ mbu nile: ọzọ kwa, ọ dighi ncheta gādiri ọb͕ọ ikpe-azu nile nke gādi n’ọdi-n’iru, n’etiti ndi nādi mb͕e ha gasiri.

12 Mu onwem, bú Onye-nkpọkọta, abuwo eze Israel nime Jerusalem.

13 M’were kwa obim nye ichọ na iledo site n’amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n’okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n’ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n’ala.

14 Ahuwom ọlu nile nke aluworo n’okpuru anyanwu; ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

15 Ihe nke b͕agọrọ ab͕agọ, apughi ime ka ọ dizie: ọzọ, ihe-nkọnari, apughi iguta ya.

16 Mu onwem kpayere obim uka, si, Mu onwem, le, atukwasiwom n’onwem amam-ihe nke-uku kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: e, obim ahuwo amam-ihe na ihe-ọmuma ri nne.

17 M’we were obim nye ima amam-ihe, na ima iwi-ara na nzuzu: amawom na nka bu kwa ichọ ijide ifufe.

18 N’ihi na ọ bu n’ọtutu amam-ihe ka ọtutu nkpasu-iwe di: ọzọ, onye nātukwasi ihe-ọmuma nātukwasi ihe-nb͕u.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 2

1 Mu onwem siri n’obim, Biko, bia, m’gēji ọṅù nwa gi; gi lekwasi kwa ezi ihe anya: ma, le, nke ahu bu kwa ihe-efu.

2 Ekwurum okwu bayere ichì-ọchì, si, Ọ nāwi ara: m’kwu-kwa-ra okwu bayere ọṅù, si, Gini kwa ka ọ nēme?

3 Eledorom n’obim iji manya-vine me ka obi tọ anu-arum utọ, (ma obim nēdum n’amam-ihe), na ijide nzuzu, rue mb͕e m’gāhu ihe ezi ihe ahu bu nke diri umu madu, bú nke ha gēme n’okpuru elu-igwe ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ha.

4 Emerem ka ọlum nile di uku; ewurum onwem ulo di iche iche, kuara onwem ubi-vine di iche iche,

5 mere onwem ubi di iche iche ab͕ara ogige na ogige ọma di iche iche, m’we kua osisi nāmi nkpuru nile di iche iche nime ha:

6 emerem onwem ọdọ-miri, isite na ha de oké ọhia nēpu osisi:

7 ab͕ataram orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, umu-ulo di-kwa-ram; ọtutu ihe-nnweta, bú ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, di-kwa-ram, kari ndi nile burum uzọ nime Jerusalem:

8 achikọta-kwa-ram nye onwem ọla-ọcha na ọla-edo, na ihe nke aka ndi-eze na ala nile m’nāchi achi: edozi-kwa-ram nye onwem ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom, na ihe-utọ nile nke umu madu, ndi-iko nwayi bara uba nke-uku.

9 M’we di uku, ba kwa uba kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: amam-ihem guzo-kwa-ra n’ebe m’nọ.

10 Ma ihe ọ bula anyam abua riọrọ, anapughm ha ihe ahu: eb͕ochighm obim n’ọǹù ọ bula, n’ihi na obim ṅuriri ọṅu site na ndọb͕u nile m’dọb͕uru onwem n’ọlu; nka bu kwa òkèm nke sitere na ndọb͕u nile m’dọb͕uru onwem n’ọlu.

11 Mu onwem we che ọlum nile nke akam abua luru iru, eche-kwa-ram ndọb͕u nke m’dọb͕uru onwem n’ọlu ime iru: ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe, ọ dighi kwa ihe fọduru madu n’okpuru anyanwu.

12 Mu onwem we che iru ihu amam-ihe, na iwi-ara na nzuzu: n’ihi na gini ka madu nke nēso eze n’azu gēme? ọ bu ihe nke ha meworo na mb͕e di anya gara aga.

13 Mu onwem we hu na amam-ihe kariri nzuzu, dika ìhè si kari ọchichiri.

14 Onye mara ihe, anya-ya abua di n’isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n’ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile.

15 Mu onwem we si n’obim, Dika o si dabàra onye-nzuzu, otú a ka ọ nādabàram, ọbuná mu onwem; ma n’ìhi gini kwa ka mu onwem mara ihe kari? M’we kwue okwu n’obim, si, na nka bu kwa ihe-efu.

16 N’ihi na ọ dighi ncheta diri onye mara ihe, dika ọ nēsighi adiri onye-nzuzu, rue mb͕e ebighi-ebi; n’ihi na ihe nke di na mb͕e di anya gara aga, n’ubọchi nke nābia ha nile gābu ihe echezọrọ echezọ. Ònye mara ihe si kwa aṅa nwua dika onye-nzuzu?

17 M’we kpọ ndu asì; n’ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n’okpuru anyanwu: n’ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

18 Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọb͕um nile asì, bú nke mu onwem nādọb͕u onwem n’ọlu n’okpuru anyanwu: n’ihi na m’gārapuru ya madu nke gānọ mb͕e m’gasiri.

19 Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbu onye-nzuzu? ma ọ gāchi ndọb͕um nile nke m’dọb͕uworo onwem n’ọlu, na nke m’meworo n’amam-ihe n’okpuru anyanwu. Nka bu kwa ihe-efu.

20 Mu onwem we chigharia ime ka obim ghara inwe ntukwasi-obi bayere ndọb͕u nile nke m’dọb͕ururi onwem n’ọlu n’okpuru anyanwu.

21 N’ihi na madu di nke ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu di n’amam-ihe, na n’ihe-ọmuma, na n’izi-ezi; ma ọ bu madu nke nādọb͕ughi onwe-ya n’ọlu nime ya ka ọ gēnye ya ka ọ buru òkè-ya. Nka bu kwa ihe-efu na ihe ọjọ nke riri nne.

22 N’ihi na gini ka madu nwere na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, na nime ncheb͕u nke obi-ya, nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n’ọlu nime ya n’okpuru anyanwu?

23 N’ihi na ubọchi-ya nile bu nání ihe-nb͕u, nkpasu-iwe ka nweda-n’ala-ya bu kwa; ọbuná n’abali obi-ya edinaghi iraru ura. Nka bu kwa ihe-efu.

24 Ọ dighi ezi ihe di nime madu nke nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ka nkpuru-obi-ya hu ezi ihe nime ndọb͕u nke ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu. Nka ka mu onwem hu-kwa-ra, na ọ bu n’aka Chineke ka o sitere.

25 N’ihi na ònye nēri ihe, ma-ọbu ònye nēme ngwa iri ihe karim?

26 N’ihi na ọ bu madu nke di nma n’iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n’ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n’iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 3

1 Ihe ọ bula nwere oge, mb͕e di-kwa-ra ihe ọ bula anēme n’okpuru elu-igwe:

2 mb͕e imu nwa, na mb͕e inwu anwu; mb͕e iku ihe n’ubi, na mb͕e iropu ihe akuru;

3 mb͕e ib͕u eb͕u, na mb͕e igwọ ọria; mb͕e itikpọ etikpọ, na mb͕e iwu ulo;

4 mb͕e ikwa ákwá, na mb͕e ichì ọchì; mb͕e iru újú, na mb͕e ite egwú;

5 mb͕e itufu nkume, na mb͕e itukọba nkume; mb͕e ib͕aku, na mb͕e inọrọ nb͕aku n’ebe di anya;

6 mb͕e ichọ achọ, na mb͕e ime ka ihe la n’iyì; mb͕e idebe edebe, na mb͕e itufu etufu;

7 mb͕e idọwa adọwa, na mb͕e idukọta adukọta; mb͕e ib͕a nkiti, na mb͕e ikwu okwu;

8 mb͕e ihu n’anya, na mb͕e ikpọ asì; mb͕e agha, na mb͕e udo.

9 Òle ihe fọduru onye nālu ọlu n’ihe nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n’ọlu nime ya?

10 Ahuwom nweda-n’ala nke Chineke nyeworo umu madu iweda ha n’ala nime ya.

11 Ihe nile ọ bula ka O meworo ka ọ ma nma na mb͕e-ya: ọzọ, mb͕e ebighi-ebi ka O tiyeworo n’obi-ha, ma ka O si tiye ya madu agaghi-achọputa ọlu ahu nke Chineke luworo site na nmalite we rue na nsọtu.

12 Amawom na ọ dighi ezi ihe diri ha, ma-ọbughi ka madu ṅuria ọṅu, me kwa ezi ihe n’ogologo ndu-ya.

13 Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu.

14 Amawom na ihe ọ bula Chineke nēme, nke ahu gādiru mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi ihe agātukwasi ya, ọ dighi kwa ihe agēbìlata nime ya: Chineke emewo kwa ya, ka madu we tua egwu n’iru Ya.

15 Ihe ọ bula nke diworo, na mb͕e di anya gara aga ka ọ di; ọzọ, ihe ọ bula nke gādi adi, na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo: Chineke nāchọ kwa ihe achupuru achupu.

16 Ọzọ kwa, m’huru n’okpuru anyanwu ebe ikpé, na ọ bu n’ebe ahu ka nmebi-iwu di; m’hu-kwa-ra ebe ezi omume, na ọ bu n’ebe ahu ka nmebi-iwu di.

17 Mu onwem siri n’obim, Onye ezi omume na onye nēmebi iwu ka Chineke gēkpe: n’ihi na mb͕e diri ihe ọ bula anēme na n’ihi ọlu ọ bula n’ebe ahu.

18 Mu onwem siri n’obim, Ọ bu n’ihi umu madu, ka Chineke we meme ka ha puta ìhè, ka ha we hu kwa, na ha onwe-ha bu anumanu, ha n’onwe-ha.

19 N’ihi na ihe nādabàra umu madu, ihe nādabà-kwa-ra anumanu; ọbuná otù ihe ahu nādabàra ha: dika ọnwu nke anumanu si di, otú a ka ọnwu nke madu di; e, otù mọ ka ha nile nwere; ọ dighi kwa ọkaka madu nwere kari anumanu: n’ihi na ha nile bu ihe-efu.

20 Ha nile nāla n’otù ebe; ha nile siri n’ájá puta, ha nile nālaghachi kwa n’ájá.

21 Ònye mara mọ nke umu madu, ma nke ahu nārigo arigo, na mọ nke anumanu, ma nke ahu nārida n’okpuru rue ala?

22 M’we hu na ọ dighi ihe di ṅma kari ka madu nāṅuri n’ọlu-ya; n’ihi na nke ahu bu òkè-ya: n’ihi na ònye gēme ka ọ biaghachi ilekwasi ihe gādi mb͕e ọ gasiri?

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 4

1 Mu onwem we legharia anya bu nmeb͕u nile anēmeb͕u n’okpuru anyanwu: ma, le, anya-miri nke ndi anēmeb͕u, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere; ma n’akuku ndi nēmeb͕u ha ka ike di, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere.

2 Mu onwem we ja ndi nwuru anwu, bú ndi nwuru anwu na mb͕e di anya gara aga, kari ndi di ndu, bú ndi ahu nke nọ na ndu rue ub͕u a;

3 e, ọ di nma kari ha abua, bú onye akādighi, nke nāhughi ọlu ọjọ nke aluworo n’okpuru anyanwu.

4 Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n’ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n’ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

5 Onye-nzuzu nākpakọba aka-ya abua, nēri kwa anu-aru onwe-ya.

6 Ọ di nma, bú otù nju-aka n’izu-ike, kari nju-aka abua n’idọb͕u onwe-gi n’ọlu na ichọ ijide ifufe.

7 Mu onwem we laghachi, hu ihe-efu n’okpuru anyanwu.

8 Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n’àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n’ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n’ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n’ala jọrọ njọ ka ọ bu.

9 Abua di nma kari otù; n’ihi na ha nwere ezi ugwọ-ọlu nime ndọb͕u ha nādọb͕u onwe-ha n’ọlu.

10 N’ihi na ọ buru na ha ada, otù nime ha gēme ka ibe-ya bilie: ma ahuhu gādiri onye ahu nke nání ya di mb͕e ọ nāda, ọ dighi kwa onye abua o nwere ime ka o bilie.

11 Ọzọ, ọ buru na madu abua edinakọ, aru gēkpo kwa ha ọku: ma àru otù onye nke nání ya dina gēsi aṅa kpo ọku?

12 Ọ buru kwa na madu enwe ike n’aru otù onye nání ya di, ma otú ọ di, madu abua gēguzo imegide ya; ọzọ, udọ̀ atọ nke atukọtara n’otù, adighi-adọbì ya ngwa ngwa.

13 Ọ di nma, bú nwata nke bu ob͕eye ma ọ mara ihe, kari eze nke bu okenye ma ọ bu onye-nzuzu, onye nāmaghi inara nmata-ihe ọzọ.

14 N’ihi na n’ulo-nkpọrọ ka o siri puta ibu eze; n’ihi na ọbuná n’ala-eze-ya ka amuru ya ob͕eye.

15 Ahurum ihe nile di ndu nke nējeghari n’okpuru anyanwu, na ha di n’akuku nwata, bú nke-abua ahu, nke nēguzo n’ọnọdu ya.

16 Ọ dighi nguta diri ndi-ya nile, bú ndi nile ọ di n’iru ha: ma ndi gādi n’ọdi-n’iru agaghi-aṅuri nime ya. N’ezie nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 5

1 Debe ukwu-gi mb͕e i nējeru ulo Chineke; n’ihi na ibiaru nso inu anu di nma kari ichu àjà ndi-nzuzu: n’ihi na ha adighi-ama na ha nēme ihe ọjọ.

2 Ekwela ka ọnu-gi kwue okwu ọsọsọ, eme-kwa-la ka obi-gi me ngwa iweputa okwu n’iru Chineke; n’ihi na Chineke nọ n’elu-igwe, ma gi onwe-gi nọ n’elu-uwa: n’ihi nka me ka okwu-gi di ole-na-ole.

3 N’ihi na nrọ abiawo n’ọtutu ije-ozi, olu onye-nzuzu kwa n’ọtutu okwu.

4 Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n’ikwughachi ya; n’ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya.

5 Ọ di nma ka i ghara ikwe nkwa, kari ikwe nkwa ma i dighi-akwughachi.

6 Ekwela ka ọnu-gi me anu-aru-gi ka o mehie; asi-kwa-la n’iru onye-ozi Chineke, na ọ bu n’amaghi-ama ka emere ya: n’ìhi gini ka Chineke gēwe iwe megide olu-gi, we mebie ọlu nke aka-gi abua?

7 N’ihi na n’ọtutu nrọ na ihe-efu ka ọtutu okwu di kwa: ma tua egwu Chineke.

8 Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n’ike n’ala anāchi achi, ibobo anwula gi n’ihe ahu anēme: n’ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n’elu ha.

9 Ọzọ, njubiga-ókè nke ala, ọra madu ka ọ diri: ọbuná eze ka ubi nēfè òfùfè.

10 Onye nāhu ego n’anya, ego agaghi-eju ya afọ; ọzọ, onye nāhu inwe ihe bara uba n’anya, ihe onwunwe agaghi-eju ya afọ: nka bu kwa ihe-efu.

11 Mb͕e ezi ihe nāba uba, ndi nēri ya abawo kwa uba: òle ngazi ọ nāgaziri onye-nwe-ya, ma-ọbughi iji anya-ya abua hu ya?

12 Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura.

13 Ihe ọjọ nke nēb͕u di nke m’huworo n’okpuru anyanwu, bú àkù nke onye-nwe-ya nēdebe imejọ onwe-ya:

14 àkù ahu we la n’iyì site na nweda-n’ala ọjọ; ọ buru kwa na ọ muwo nwa-nwoke, ọ dighi ihe ọ bula di ya n’aka.

15 Dika o siri n’afọ nne-ya puta, puta n’ọtọ, out a ka ogālaghachi di ka ila dika o siri bia, ma ọ dighi ihe ọ bula o gēburu site na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, nke ọ gēwere n’aka-ya la.

16 Nka bu kwa ihe ọjọ nēb͕u nb͕u, na n’ihe nile dika o siri bia, otú a ka ọ gāla: ọ̀ bu kwa ole ihe fọduru ya na ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu inwe ifufe?

17 Ọzọ, n’ubọchi-ya nile ọ bu n’ọchichiri ka o nēri ihe, anākpasu kwa ya iwe ri nne, o nwe-kwa-ra ọria na iwe.

18 Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu nime ya n’okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n’ihi na nka bu òkè-ya.

19 Ọzọ, madu ọ bula nke Chineke nyeworo àkù na ihe-nkpakọta, onye O mewo-kwa-ra ka o nwe ike iri nime ya, na ibūru òkè-ya, na iṅuri ọṅu nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu; nka bu onyinye Chineke.

20 N’ihi na ọ gaghi-echeta ubọchi nile nke ndu-ya ri nne; n’ihi na Chineke nāza ya n’ọṅù obi-ya.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 6

1 Ihe ọjọ di nke m’huworo n’okpuru anyanwu, ihe riri nne ka ọ bu kwa n’aru madu:

2 madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.

3 Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n’ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya:

4 N’ihi na n’ihe-efu ka ọ biara, ọ bu kwa n’ọchichiri ka ọ nāla, eji kwa ọchichiri kpuchi aha-ya;

5 ọzọ, ọ hughi anyanwu, ọ maghi kwa ihe ọ bula; izu-ike diri nka kari onye ahu:

6 e, ọ buru na ọ di ndu nnù arọ abua na ọgu iri okpukpu abua, ma ọ hughi ezi ihe: ọ̀ bughi n’otù ebe ka ha nile nāla?

7 Ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ya n’ọlu diri ọnu-ya, ma otú ọ di, ọchichọ nkpuru-obi adighi-eju eju.

8 N’ihi na gini ka onye mara ihe nwebigara ókè kari onye-nzuzu? ma-ọbu gini ka onye ewedara n’ala nwere, bú onye mara ijeghari n’iru ndi di ndu?

9 Ọ di nma, bú ihe-ọhuhu nke anya abua, kari njeghari nke nkpuru-obi: nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

10 Ihe nke diworo, ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka akpọrọ aha-ya, amawo kwa na nke ahu bu madu: ọ pughi kwa iluso onye ka ya ike ọ̀gù.

11 Ebe ọtutu okwu di nke nēme ka ihe-efu ba uba, gini ka madu nwebigara ókè?

12 N’ihi na ònye mara ihe diri madu nma na ndu-ya, ọnu-ọgugu ubọchi ndu efu ya nke ọ nēme dika onyinyo? n’ihi na ònye gēgosi madu ihe gādi n’okpuru anyanwu mb͕e ọ gasiri?

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 7

1 Ezi aha di nma kari ezi manu-otite nēsì ísì utọ; ọzọ, ubọchi ọnwu madu di nma kari ubọchi amuru ya.

2 Ọ di nma ije n’ulo oruru-újú, kari ije n’ulo ọṅuṅu-manya-vine: n’ihi na nke ahu bu nsọtu madu nile; onye di ndu gētiye kwa ya n’obi-ya.

3 Iru-újú di nma kari ichì-ọchì: n’ihi na esitere n’ijọ-njọ nke iru me ka obi di nma.

4 Obi ndi mara ihe di n’ulo oruru-újú; ma obi ndi-nzuzu di n’ulo ọṅù.

5 Ọ di nma inu ibasi-nba-ike nke onye mara ihe, karia mb͕e madu nānu abù ndi-nzuzu.

6 N’ihi na dika olu ogwu mb͕e ọ nēre ọku n’okpuru ite, otú a ka ichì-ọchì nke onye-nzuzu di: nka bu kwa ihe-efu.

7 N’ezie nmeb͕u nēme ka onye mara ihe ghọ onye-nzuzu; ọzọ, onyinye nēme ka obi amam-ihe la n’iyì.

8 Ikpe-azu ihe di nma kari nmalite-ya: ọ di nma, bú onye mọ-ya nwere ogologo-ntachi-obi, kari onye mọ-ya di elu.

9 Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n’ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n’obi ndi-nzuzu.

10 Asila, Gini kpatara ubọchi mbu ji di nma kari ubọchi ndia? n’ihi na i siteghi n’amam-ihe ju ajuju bayere nka.

11 Amam-ihe di nma dika ihe-nketa: e, ọ dikariri ndi nāhu anyanwu anya nma.

12 N’ihi na amam-ihe bu ǹdò, ego bu kwa ǹdò: ma ọkaka nke ihe-ọmuma bu, na amam-ihe nēme ka onye-nwe-ya di ndu.

13 Le ọlu Chineke: n’ihi na ònye puru ime ka ọ dizie, bú ihe O meworo ka ọ b͕agọ?

14 N’ubọchi ọdi-nma-gi nọ n’ọdi-nma, ma n’ubọchi ọdi-njọ le anya: ọbuná otù na nso ibe-ya ka Chineke meworo ha, ka madu we ghara ichọputa ihe ọ bula nke gādi mb͕e ọ gasiri.

15 Ihe nile a ka m’huworo n’ubọchi nile nke ihe-efum: onye ezi omume di nke nāla n’iyì n’ezi omume-ya, onye nēmebi iwu di kwa nke nēme ka ndu-ya di ogologo n’ihe ọjọ ya.

16 Abubigala onye ezi omume ókè; eme-kwa-la onwe-gi onye mabigara ihe ókè: n’ìhi gini ka i gēmebi onwe-gi?

17 Emebibigala iwu ókè, abu-kwa-la onye-nzuzu: n’ìhi gini ka i gānwuchu anwuchu?

18 Ọ di nma ka i jide nka; ọzọ kwa, esepula aka-gi na nka: n’ihi na onye nātu egwu Chineke gāputa n’etiti ha nile.

19 Amam-ihe nēme ka onye mara ihe di ike kari madu iri ndi nāchi achi ndi nọ n’obodo.

20 N’ezie ọ dighi onye ezi omume n’uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.

21 Ọzọ, atukwasila obi-gi n’okwu nile anēkwu; ka i we ghara inu ka orù-gi nākọcha gi:

22 N’ihi na ọtutu mb͕e obi-gi maworo na gi onwe-gi akọchawo ndi ọzọ.

23 Ihe nile a ka m’nwaworo n’amam-ihe: m’siri, M’gāma ihe; ma nke ahu di anya n’ebe m’nọ.

24 Ọ di anya, bú ihe nke diworo, o mi-kwa-ra emi nke-uku; ònye gāchọputa ya?

25 M’chighariri, mu onwem na obim, ima na iledo, na ichọsi amam-ihe na ichè-èchìchè ike, na ima na nmebi-iwu bu nzuzu, ima kwa na nzuzu bu iwi-ara:

26 mu onwem achọtawo kwa ihe di ilu kari ọnwu, bú nwayi ahu nke obi-ya bu ọnyà ọnyà na ub͕u ub͕u, ab͕u ka aka-ya abua bu: onye di nma n’iru Chineke gēsi n’aka nwayi ahu wepuga onwe-ya; ma ọ gānwude onye-nmehie.

27 Le, nka ka m’chọtaworo, ka Onye-nkpọkọta siri, nātukwasi otù ihe n’ihe ọzọ, ichọta ichè-èchìchè:

28 nke nkpuru-obim nọ nāchọsi ike rue ub͕u a, ma achọputaghm ya: otù madu n’etiti nnù madu abua na ọgu iri ka m’chọtaworo; ma ọ dighi otù nwayi nime ndi ahu nile ka m’chọtaworo.

29 Le, nání nka ka m’chọtaworo, na Chineke mere madu ka o zie ezi; ma ha onwe-ha achọputawo ọtutu ihe echèputara.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 8

1 Ònye di ka onye mara ihe? ònye nāma kwa akukọ-isi okwu? Amam-ihe madu nēnye iru-ya ìhè, ike nke iru-ya nāb͕anwe kwa.

2 Mu onwem nādu gi ọdu, Debe okwu-ọnu eze, ọbuná n’ihi ọṅuṅu-iyi Chineke.

3 Esila n’iru ya pua ọsọsọ; eguzola n’ihe ọjọ: n’ihi na ihe ọ bula nke nātọ ya utọ ka ọ nēme.

4 N’ihi na okwu eze nwere ike; ònye gāsi kwa ya, Gini ka i nēme?

5 Onye nēdebe ihe enyere n’iwu agaghi-ama ihe ọjọ; ọzọ, mb͕e na ikpé ka obi onye mara ihe nāmata.

6 N’ihi na ihe ọ bula anēme eme nwere mb͕e na ikpé; n’ihi na ọnọdu ọjọ madu riri nne n’aru ya:

7 n’ihi na ọ dighi-ama ihe gādi adi; n’ihi na ònye gēgosi ya otú ọ gādi?

8 Ọ dighi madu ọ bula nwere ike n’aru mọ ib͕ochi mọ; ọ dighi kwa ike o nwere n’aru ubọchi ọnwu; ọ dighi kwa nzilaga di n’agha ahu: nmebi-iwu agaghi-eme ka onye-nwe-ya wepuga onwe-ya.

9 Ihe nile a ka m’huworo, m’we nye obim ilu ọlu ọ bula nke aluworo n’okpuru anyanwu: mb͕e di mb͕e otù madu nwere ike n’aru madu-ibe-ya imejọ ya.

10 N’uzọ di otú a m’hu-kwa-ra ndi nēmebi iwu ka elìri ha, ha we ba n’ílì; ha we si n’ebe nsọ la, ewe chezọ ha n’obodo ebe ha mere otú a: nka bu kwa ihe-efu.

11 N’ihi na emeghi ihe ekpere n’ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n’ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ.

12 Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n’ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n’iru Ya:

13 ma ọ gaghi-adiri onye nēmebi iwu nma, ọ gaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo, bú nke di ka onyinyo; n’ihi na ọ dighi-atu egwu n’iru Chineke.

14 Ihe-efu di nke anēme n’elu uwa; na ndi ezi omume di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi nēmebi iwu si di; ọzọ, ndi nēmebi iwu di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi ezi omume si di: m’siri na nka bu kwa ihe-efu.

15 Mu onwem we ja ọṅù, n’ihi na ọ dighi ezi ihe madu nwere n’okpuru anyanwu ma-ọbughi iri ihe, na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅuri ọṅu: n’ihi na nke ahu gārapara n’aru-ya nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu ubọchi nile nke ndu-ya nke Chineke nyeworo ya n’okpuru anyanwu.

16 Mb͕e m’were obim nye ima amam-ihe, na ihu nweda-n’ala nke anēme n’elu uwa: (n’ihi na madu di kwa nke nādighi-ahu urá n’anya-ya abua ma ọ bu n’ehihie ma-ọbu n’abali:)

17 m’we hu ọlu nile nke Chineke, na madu apughi ichọputa ọlu nke aluworo n’okpuru anyanwu: n’ihi na ọ buru na madu adọb͕u onwe-ya n’ọlu n’uzọ nile ichọ ya, ma ọ gaghi-achọputa ya; ọzọ kwa, ọ buru na onye mara ihe asi na ọ gāma ya, ọ pughi ichọputa ya.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 9

1 N’ihi na ihe nile a ka m’tiyere n’obim, ọbuná iledo ihe nile a; na ndi ezi omume, na ndi mara ihe, na òfùfè-ha nile, di n’aka Chineke: ma ọ bu ihu-n’anya ma-ọbu ikpọ-asì, madu adighi-ama ya; ihe nile di n’iru ha.

2 Ihe nile nādakwasi madu nile n’otù uzọ ahu: otù ndabà nādabàra onye ezi omume, dabà-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādighi ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādighi-achu àjà: dika ezi madu si di, otú a ka onye-nmehie di kwa; onye nāṅu iyi di ka onye nātu egwu ọṅuṅu-iyi.

3 Nka bu ihe ọjọ n’ihe nile anēme n’okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n’ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n’obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu.

4 N’ihi na onye ọ bula nke ejikọtaworo ya na ndi nile di ndu, o nwere ntukwasi-obi: n’ihi na ọ diri nkita di ndu nma kari ọdum nwuru anwu.

5 N’ihi na ndi di ndu mara na ha gānwu: ma ndi nwuru anwu adighi-ama ihe ọ bula, ọ dighi kwa ugwọ-ọlu ha nwere ọzọ; n’ihi na echezọwo ncheta-ha.

6 Ma ihu-n’anya-ha, ma ikpọ-asì-ha, ma ekworo-ha, na mb͕e di anya gara aga ka ọ laworo n’iyì; ọ dighi kwa òkè ha nwere ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi n’ihe ọ bula nke emeworo n’okpuru anyanwu.

7 Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n’ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.

8 Ka uwe-gi nile di ọcha mb͕e nile; ka manu-otite nke nēsi ísì utọ ghara kwa ikọnari isi-gi.

9 Di ndu ọṅù, gi na nwunye nke i huru n’anya, ubọchi nile nke ndu ihe-efu-gi, nke O nyeworo gi n’okpuru anyanwu, ubọchi nile nke ihe-efu-gi: n’ihi na nke ahu bu òkè-gi na ndu, na nime ndọb͕u-gi nke gi onwe-gi nādọb͕u onwe-gi n’ọlu n’okpuru anyanwu.

10 Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n’ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n’ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.

11 M’laghachiri, hu n’okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile.

12 N’ihi na ọbuná madu adighi-ama mb͕e-ya: dika azù nke anānwude n’ub͕u ọjọ, na dika umu nnunu nke nāma n’ọnyà, dika ndia ka umu madu nāma n’ọnyà na mb͕e ọjọ, mb͕e ọ nādakwasi ha na mberede.

13 Otú a kwa ka m’huworo amam-ihe n’okpuru anyanwu, ihe uku ka ọ burum:

14 otù obodo ntà di, ndikom di nime ya di kwa ole-na-ole; ma otù eze uku biara imegide ya, we b͕a ya buruburu, wu kwa ebe ewusiri ike imegide ya:

15 ma achọputara nime ya otù nwoke bu ob͕eye nke mara ihe, onye ahu we me ka obodo ahu wepuga onwe-ya site n’amam-ihe-ya; ma madu echetaghi nwoke ahu bu ob͕eye.

16 Mu onwem we si, Amam-ihe di nma kari idi-ike: ma amam-ihe nke ob͕eye ahu bu ihe anēleda anya, adighi-anu kwa okwu-ya nile.

17 Okwu nke ndi mara ihe anēkwu na nwayọ, anānu ha kari iti-nkpu nke onye nāchi achi n’etiti ndi-nzuzu.

18 Amam-ihe di nma kari ihe-agha nile: ma otù onye-nmehie nāla ọtutu ezi ihe n’iyì.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 10

1 Ijiji nwuru anwu nēme ka manu onye nāsugwa manu-otite nke nēsì ísì utọ sìe ísì ọjọ, re kwa ure: otú a ka nzuzu ntà di arọ́ kari amam-ihe, kari kwa nsọpuru.

2 Obi onye mara ihe di n’aka-nri-ya; ma obi onye-nzuzu di n’aka-ekpe-ya.

3 Ọzọ kwa, mb͕e onye-nzuzu nēje ije n’uzọ, obi-amam-ihe-ya nākọnari ya, ọ we si madu nile na onye-nzuzu ka ọ bu.

4 Ọ buru na mọ nke onye nāchi achi ebilie imegide gi, arapula ọnọdu-gi; n’ihi na ime-nwayọ nēme ka nmehie uku di iche iche kwusi.

5 Ihe ọjọ di nke m’huworo n’okpuru anyanwu, ọ di ka ihe emere n’amaghi-ama nke nēsi n’aka onye nāchi achi aputa:

6 etiyere nzuzu n’ebe di iche iche di elu ri nne, ma ndi-ọgaranya nānọdu n’ebe di ala.

7 Ahuwom ndi-orù ka ha nānọkwasi n’inyinya, ahuwokwam ndi-isi ka ha nējeghari dika ndi-orù n’elu uwa.

8 Onye nēgwu olulu, nime ya ka ọ gādabà; ọzọ, onye nētipú mb͕idi, agwọ gāta ya aru.

9 Onye nēbupu nkume, o gēb͕u ya nb͕u site na ha; onye nāwa osisi nọ n’ize-ndu site na ya.

10 Ọ buru na ígwè anyua nkọ, ma onye ahu amughi iru-ya amu, ọ gētiye kwa ike kari: ma amam-ihe nāba urù ime ka ihe nāgazi agazi.

11 Ọ buru na agwọ ata aru tutu arà ya urà, ọ dighi kwa urù ọ gābara onye-nwe ire-utọ.

12 Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.

13 Nmalite okwu nile nke ọnu-ya bu nzuzu: nkwubì okwu-ọnu-ya bu kwa iwi-ara ọjọ.

14 Onye-nzuzu nēme kwa ka okwu ba uba: madu adighi-ama ihe ọ bula nke gādi adi; ọzọ, ihe gādi mb͕e ọ gasiri, ònye gēgosi ya?

15 Ndọb͕u nke ndi-nzuzu nādọb͕u onwe-ha n’ọlu nāgwu onye ọ bula nime ha ike, n’ihi na ọ maghi ijeru obodo.

16 Ahuhu gādiri gi, ala, mb͕e eze-gi bu nwata, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe n’ututu!

17 Ihe nāgara gi nke-ọma, ala, mb͕e eze-gi bu nwa ndi amara aha-ha, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe na mb͕e oriri, n’ihi idi-ike, ọ bughi kwa n’ihi iṅubiga-manya-ókè!

18 Site n’okè ume-ngwu ka elu ulo nēze eze; site kwa n’ifanye aka n’ukwu ka ulo nēhi mmiri.

19 N’ihi ichì-ọchì ka anēsi nri, manya-vine nēme ka ndu ṅuria: ego nāza kwa ihe nile.

20 Ọbuná n’uche-gi akọchala eze; akọcha-kwa-la ọgaranya n’ime-ulo-ndina-gi: n’ihi na anu-ufe nke elu-igwe gēme ka olu-gi rue ya nti, ihe nwere nkù gēgosi kwa okwu ahu.