Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 11

1 I gāhu kwa Jehova, bú Chineke-gi, n’anya, debe ihe-ndebe-Ya, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, na ihe nile Ọ nyere n’iwu, ubọchi-gi nile.

2 Ma unu amawo ta: n’ihi na ọ bughi umu-unu ka m’nāgwa okwu, bú ndi nāmaghi, ndi nāhughi kwa idọ-aka-na-nti nke Jehova, bú Chineke-unu, na idi-uku-Ya, na aka-Ya di ike, na ogwe-aka-Ya esetiri eseti,

3 na ihe-iriba-ama-Ya nile, na omume-Ya nile, nke Ọ mere Fero eze Ijipt, me kwa ala-ya nile, n’etiti Ijipt;

4 na ihe O mere usu-ndi-agha Ijipt, me kwa inyinya-ha, me kwa ub͕ọ-ala-ha; mb͕e O mere ka miri Oké Osimiri Uhie rukpuchie iru-ha mb͕e ha nāchu unu n’azu, Jehova we me ka ha la n’iyì rue ta;

5 na ihe O mere unu n’ọzara, rue mb͕e unu biaruru ebe a;

6 na ihe O mere Detan na Abairam, umu Eliab, nwa Reuben; mb͕e ala saghepuru ọnu-ya, loda ha, na ezi-na-ulo nile ha, na ulo-ikwū nile ha, na ihe ọ bula di ndu nke di n’ukwu-ha, n’etiti Israel nile:

7 ma ọ bu anya-unu nāhu omume uku nile nke Jehova, nke O meworo.

8 Unu gēdebe kwa ihe nile enyere n’iwu nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, ka unu we di ike, ba nime, nweta ala ahu, ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;

9 ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n’elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, inye kwa nkpuru-ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù erù nime ya.

10 N’ihi na ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, ọ bughi dika ala Ijipt ka ọ bu, ebe unu si puta, ebe i nāgha nkpuru-gi, were ukwu-gi nāb͕a ya miri, dika akwukwọ nri ubi ab͕ara ogige:

11 ma ala ahu, ebe unu nāgabiga inweta ya, bu ala ugwu na ndagwurugwu; site na miri-ozuzo nke elu-igwe ka ọ nāṅu miri:

12 ọ bu ala nke di Jehova, bú Chineke-gi, n’obi; mb͕e nile ka anya Jehova, bú Chineke-gi, nādikwasi ya, site na mb͕e mbu nke arọ we rue mb͕e ikpe-azu nke arọ.

13 O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n’iwu, nke Mu onwem nēnye unu n’iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n’anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,

14 na m’gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.

15 M’gēnye kwa anu-ulo-gi ihe-ọkuku n’ubi-gi, i gēri kwa, afọ gēju kwa gi.

16 Lezienu onwe-unu anya, ka ewe ghara irafu obi-unu, unu ewe wezuga onwe-unu, fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha;

17 iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n’ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n’iyì ngwa ngwa.

18 Unu gēdo kwa okwu ndia n’obi-unu na nime nkpuru-obi-unu; unu gēke kwa ha n’elu aka-unu ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n’iru n’etiti anya-unu.

19 Unu gēzí umu-unu ha, n’ikwu okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n’ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n’uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.

20 I gēdekwasi kwa ha n’awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n’ọnu-uzọ-ama-gi nile:

21 ka ubọchi-unu we ba uba, ha na ubọchi umu-unu, n’elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, dika ubọchi elu-igwe nke di n’elu uwa.

22 N’ihi na ọ buru na unu ejisie ike idebe ihe nile a enyere n’iwu nke mu onwem nēnye unu n’iwu, ka unu we me ya; ihu Jehova, bú Chineke-unu, n’anya, ije ije n’uzọ-Ya nile, na irapara n’aru Ya;

23 Jehova gānapu kwa mba ndia nile ala-ha n’iru unu, unu gēnweta kwa mba di iche iche di uku di kwa ike kari unu.

24 Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n’ọzara, na Lebanon, site n’osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n’azu, gābu ókè-ala unu.

25 Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n’iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n’iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu.

26 Le, mu onwem nētiye n’iru unu ta ngọzi na nkọcha;

27 ngọzi ahu, ma asi na unu ege nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n’iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n’iwu ta:

28 ma nkọcha ahu, ma ọ buru na unu egeghi nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n’iwu, ma unu ewezuga onwe-unu n’uzọ ahu nke Mu onwem nēnye unu n’iwu ta, ka unu we jeso chi di iche iche ọzọ, nke unu nāmaghi.

29 Ọ gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n’ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, na i gētiye ngọzi ahu n’elu ugwu Geraizim, tiye kwa nkọcha ahu n’elu ugwu Ibal.

30 Ugwu ndia, hà adighi n’ofè Jọdan, n’azu uzọ ọdida-anyanwu, n’ala ndi Kenean ndi bi n’Araba, na ncherita-iru Gilgal, n’akuku osisi terebinth nke More?

31 N’ihi na unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu, unu gēnweta kwa ya, biri nime ya.

32 Unu gēlezi kwa anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke mu onwem nētiye n’iru unu ta.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 12

1 Ndia bu ukpuru ahu na ikpé ahu, nke unu gēlezi anya ime n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, nyeworo gi ka i nweta ya, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n’elu ala ahu.

2 Unu aghaghi ime ka ebe ahu nile la n’iyì, bú ebe mba nile unu nēnweta fère chi nile ha òfùfè, n’elu ugwu nile ha di elu, na n’elu ugwu ntà nile ha, na n’okpuru osisi ndu ọ bula:

3 unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n’ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n’iyì n’ebe ahu.

4 Unu emerela Jehova, bú Chineke-unu, otú a.

5 Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n’ebo-unu nile, itiye aha-Ya n’ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n’ebe ahu:

6 ọ bu kwa n’ebe ahu ka unu gēweta àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n’uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-unu na ìgwè ewu na aturu-unu:

7 unu gēri kwa ihe n’ebe ahu n’iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n’ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha.

8 Unu emela dika ihe nile si di nke ayi onwe-ayi nēme n’ebe a ta, nwoke ọ bula ọ nēme ihe ziri ezi n’anya-ya:

9 n’ihi na unu akābaghi rue ub͕u a n’izu-ike ahu, na n’ihe-nketa ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

10 Ma mb͕e unu gabigara Jọdan, biri n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu keta, mb͕e O mesi-kwa-ra ka unu zuru ike pua n’aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi;

11 ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n’ebe ahu, n’ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m’nēnye unu n’iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n’uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:

12 unu gāṅuri kwa ọṅu n’iru Jehova, bú Chineke-unu, unu onwe-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na orù-unu ndikom, na orù-unu ndinyom, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-unu ọ bula; n’ihi na o soghi unu nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa.

13 Lezie onwe-gi anya ka i ghara isure àjà-nsure-ọku-gi n’ebe ọ bula i gāhu:

14 kama n’ebe nke Jehova gārọputa n’otù nime ebo-gi, n’ebe ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku-gi nile, ọ bu kwa n’ebe ahu ka i gēme ihe nile nke mu onwem nēnye gi n’iwu.

15 Otú ọ di, n’agu nile nke nkpuru-obi-gi ka i gēb͕u, ri kwa anu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika ngọzi nke Jehova, bú Chineke-gi, nke O nyeworo gi, si di: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ya: dika mb͕ada, na dika ele.

16 Nání na unu agaghi-eri ọbara; i gāwusi ya n’ala dika miri.

17 I pughi iri n’ọnu-uzọ-ama-gi nile otù uzọ n’uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, ma-ọbu umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi, ma-ọbu ihe ọ bula nke nkwa-gi nile nke i nēkwe, ma-ọbu onyinye-afọ-ofufo-gi nile, ma-ọbu àjà-nbuli nke aka-gi:

18 kama ọ bu n’iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ha, n’ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: i gāṅuri kwa ọṅu n’iru Jehova, bú Chineke-gi, na nseti aka-gi ọ bula.

19 Lezie onwe-gi anya ka i ghara irapu onye Livai ubọchi-gi nile n’elu ala-gi.

20 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ókè-ala-gi sa mbara, dika Ọ gwara gi, i we si, Ka m’rie anu, n’ihi na agu nāgu nkpuru-obi-gi iri anu; n’agu nile nke nkpuru-obi-gi i gēri anu.

21 Mb͕e ọ gādikari gi anya, bú ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n’ebe ahu, i gēb͕u kwa ufọdu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, nke Jehova nyeworo gi, dika m’nyeworo gi iwu, i gēri kwa n’ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, n’agu nile nke nkpuru-obi-gi.

22 Nání, dika anēri mb͕ada na ele, otú a ka i gēri ha: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ha n’otù uzọ ahu.

23 Nání, di ike ka i ghara iri ọbara: n’ihi na ọbara bu ndu; eri-kwa-la ndu tiyere anu.

24 Erila ya; i gāwusi ya n’ala dika miri.

25 Erila ya; ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n’anya Jehova.

26 Nání ihe nsọ gi nile nke i nwere, na ihe-nkwa-gi nile, ka i gēbuli, biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa:

27 i gāchu kwa aja-nsure-ọku-gi nile, anu na ọbara, n’elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: agāwukwasi kwa ọbara nke àjà-gi nile n’ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, ma i gēri anu-ha.

28 Riba okwu ndia nile ama, nu kwa ha, bú nke mu onwem nēnye gi n’iwu, ka ọ we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi rue mb͕e ebighi-ebi, mb͕e i nēme ihe di nma nke ziri ezi n’anya Jehova, bú Chineke-gi.

29 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba nile n’iru gi, ebe i nābà nime inweta ha, i we nweta ha, biri n’ala-ha;

30 gi lezie onwe-gi anya ka aghara ima gi n’ọnyà iso ha n’azu, mb͕e ekpochapusiri ha n’iru gi; ka i ghara kwa iju ajuju bayere chi nile ha, si, Mba ndia si aṅa nēfè chi nile ha òfùfè? m’gēme kwa otú a, ọbuná mu onwem.

31 Emerela Jehova, bú Chineke-gi, otú a: n’ihi na ihe-árú nile nke Jehova, nke Ọ nākpọ asì, ka ha meworo chi-ha; n’ihi na ọbuná umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha nēsurere chi-ha n’ọku.

32 Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n’iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n’elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 13

1 Mb͕e onye-amuma ma-ọbu ọrọ-nrọ gēbili n’etiti gi, nye gi ihe-iriba-ama ma-ọbu ihe-ebube,

2 ihe-iriba-ama ahu ma-ọbu ihe-ebube ahu we me, nke ọ gwara gi okwu bayere ya, si, Ka ayi jeso chi ọzọ n’azu, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha), ka ayi fè kwa ha òfùfè;

3 egela nti okwu onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu: n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nānwà unu, ima ma unu nēwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile hu Jehova, bú Chineke-unu, n’anya.

4 Jehova, bú Chineke-unu, ka unu ganējeso n’azu, Ya ka unu gātu egwu, ihe nile O nyere n’iwu ka unu gēdebe, olu-Ya ka unu gēge nti, Ya ka unu gēfè òfùfè, Ya ka unu gārapara n’aru.

5 Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n’ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n’ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n’ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n’uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n’iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n’etiti gi.

6 Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà;

7 ndi sitere na chi nile nke ndi nile nọ unu buruburu, ndi nọ nso gi, ma-ọbu ndi nọpuru gi n’ebe di anya, site n’otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa);

8 ekwela ya, ege-kwa-la ya nti; anya-gi agaghi-emere ya ebere, enwe-kwa-la ọmiko n’aru ya, ekpuchi-kwa-la ya:

9 kama i ghaghi ib͕u ya; aka-gi gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n’ikpe-azu.

10 I gēwere nkume tub͕ue ya, ka o we nwua; n’ihi na ọ chọwo iduhie gi n’akuku Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n’ala Ijipt, si kwa n’ulo ndi-orù, puta.

11 Israel nile gānu kwa, we tua egwu, ha agaghi-eme kwa ọzọ dika ihe ọjọ a si di n’etiti gi.

12 Mb͕e i gānu okwu n’otù nime obodo-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibi n’ebe ahu, si,

13 Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n’etiti gi pua, we duhie ndi bi n’obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);

14 i gāju kwa ase, gwu ala-ya, juta nke-ọma; ma, le, asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n’etiti gi;

15 i ghaghi iwere ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi n’obodo ahu, were mma-agha wezuga ya, na ihe nile di nime ya, na anu-ulo-ya, ka ebibie ya.

16 I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n’etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n’ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.

17 Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n’ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n’aka-gi: ka Jehova we si n’idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n’aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;

18 mb͕e i gēge kwa olu Jehova, bú Chineke-gi, nti, idebe ihe nile Ọ nyere n’iwu nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, ka i we me ihe ziri ezi n’anya Jehova, bú Chineke-gi.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 14

1 Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n’etiti anya-unu abua n’ihi onye nwuru anwu.

2 N’ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi, ọ bu kwa gi ka Jehova rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n’elu ala.

3 Erila ihe-árú ọ bula.

4 Ndia bu anumanu nke unu gēri: ehi, na aturu, na ewu,

5 na ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ewu ọhia, na atu, na anigọ, na uturu.

6 Anumanu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara abua, nke nātaghari kwa ọnu, n’etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.

7 Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n’etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n’etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, na hare, na coney, n’ihi na ihe nātaghari ọnu ka ha bu, ma ha abughi ihe ukwu wara njakpa, ihe ruru árú ka ha buru unu:

8 ezì kwa, n’ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa ka ọ bu, ma ọ bughi ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu: unu erila ihe sitere n’anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka.

9 Ndia ka unu gēri n’etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa ka unu gēri:

10 ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa, unu erila ya; ihe-árú ka ọ buru unu.

11 Nnunu ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.

12 Ma ndia bu nnunu unu agaghi-eri ihe sitere n’anu-ha: ugo, na ugo-agwọ, na ugo-azù;

13 na udele, na agu-nkwọ, na ndab͕u di iche iche;

14 na ugolo-ọma ọ bula di iche iche;

15 na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;

16 na okwukwu ntà, na okwukwu uku, na okwukwu nwere mpi;

17 na okwolo, na udele, na cormorant;

18 na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.

19 Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, ihe-árú ka ọ buru unu; agaghi-eri ha.

20 Anu-ufe ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.

21 Unu erila ihe nwuru onwe-ya: ọ bu ọbìa nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula ka i gēnye ya, ka ọ we rie ya; ma-ọbu i gērenye ya onye ala ọzọ: n’ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.

22 I ghaghi inye otù uzọ n’uzọ iri nke ihe-ọmume nile nke nkpuru-gi, bú ihe nke nēsi n’ubi-gi puta kwa-arọ.

23 I gēri kwa ihe n’iru Jehova, bú Chineke-gi, n’ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n’ebe ahu, bú otù uzọ n’uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile.

24 Ma mb͕e uzọ ahu gādikari gi anya, i we ghara ipu ibū ya, n’ihi na ebe ahu dipuru anya n’ebe i nọ, bú ebe nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n’ebe ahu, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi:

25 i gēnye kwa ya n’ego, ke ego ahu n’aka-gi, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa:

26 i gēnye kwa ego ahu n’ihe ọ bula nke agu ya nāgu nkpuru-obi-gi, n’ìgwè ehi, ma-ọbu n’ìgwè ewu na aturu, ma-ọbu na manya-vine, ma-ọbu n’ihe-ọṅuṅu nābà n’anya, ma-ọbu n’ihe ọ bula nkpuru-obi-gi nāriọ n’aka-gi: i gēri kwa ihe n’ebe ahu n’iru Jehova, bú Chineke-gi, ṅuri kwa ọṅu, gi onwe-gi na ulo-gi:

27 ma onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, arapula ya; n’ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe.

28 N’ọgwugwu arọ atọ i gēweputa otù uzọ n’uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n’otù arọ ahu, dọba kwa ya nime ọnu-uzọ-ama-gi nile:

29 onye Livai gābia kwa, (n’ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n’omume nile nke aka-gi nke i nēme.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 15

1 N’ọgwugwu arọ asa i gēme nrapu.

2 Nka bu kwa okwu nrapu ahu: onye-nbinye ọ bula gārapu ihe nke o nēbinye ab͕ata-obi-ya; ọ gaghi-eji ab͕ata-obi-ya na nwa-nne-ya n’ihe-ike; n’ihi na akpọsara nrapu nye Jehova.

3 Onye ala ọzọ ka i gēji n’ihe-ike: ma ihe ọ bula i nwere nke di n’aka nwa-nne-gi, aka-gi gārapu ya;

4 ma-ọbughi mb͕e ob͕eye nādighi n’etiti gi; (n’ihi na Jehova aghaghi igọzi gi n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi dika ihe-nketa ka i we nweta ya;)

5 nání ọ buru na i ge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, nke-ọma, ilezi anya ime ihe nile a enyere n’iwu nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta.

6 N’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi, dika Ọ gwara gi okwu: i gānara kwa ọtutu mba ihe-ibe, ma gi onwe-gi agaghi-ab͕a ihe n’ibe; i gāchi kwa ọtutu mba, ma ha agaghi-achi gi.

7 Mb͕e ob͕eye di n’etiti gi, bú otù onye n’etiti umu-nne-gi, n’otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n’ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n’ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ:

8 kama i ghaghi isaghere ya aka-gi, i ghaghi kwa inye ya ihe gēzuru ukọ-ya nke kọrọ ya n’ọnọdu ihe-ibe-ya.

9 Lezie onwe-gi anya ka okwu nke jọb͕uru onwe-ya ghara idi n’obi-gi, si, Arọ nke-asa, bú arọ nrapu, di nso; anya-gi we jọ njọ n’aru nwa-nne-gi, bú ob͕eye, i we ghara inye ya ihe; o we kpọkue Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.

10 I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n’ihi na ọ bu n’ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n’omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile.

11 N’ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n’etiti ala: n’ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n’ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n’ala-gi.

12 Mb͕e agērenye gi nwa-nne-gi, bú nwoke Hibru, ma-ọbu nwayi Hibru, o we fè gi òfùfè arọ isi; n’arọ nke-asa i gēzipu ya n’ebe i nọ ka o nwere onwe-ya.

13 Ma mb͕e i nēzipu ya n’ebe i nọ ka o nwere onwe-ya, ezipula ya n’aka efu:

14 i gēsi n’ìgwè ewu na aturu-gi, si kwa n’ebe-nzọcha-ọka-gi, si kwa n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi, nyebiga ya okè; ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, ji gọzie gi ka i gēnye ya.

15 I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n’ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, b͕aputara gi: n’ihi ya ka mu onwem nēnye gi ihe a n’iwu ta.

16 Ọ gēru kwa, mb͕e ọ gāsi gi, M’gaghi-apu n’ebe i nọ; n’ihi na ọ nāhu gi na ulo-gi n’anya, n’ihi na ọ diri ya nma n’ebe i nọ;

17 i gēwere kwa arà, rapue nti-ya na ọnu-uzọ, ọ gābu-kwa-ra gi orù mb͕e ebighi-ebi. Ọ bu kwa otú a ka i gēmere orù-gi nwayi.

18 Ọ gaghi-adi ike n’anya-gi, mb͕e i nēzipu ya n’ebe i nọ ka o nwere onwe-ya; n’ihi na okpukpu ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu ka o fèworo gi òfùfè arọ isi: Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi kwa gi n’ihe nile nke i nēme.

19 Nwa ọ bula, bú oké, nke eburu uzọ mu, nke agāmu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, i gēdoro ya Jehova, bú Chineke-gi, nsọ: ejila nwa nke ehi-gi buru uzọ mu lu ọlu-ubi, akpacha-kwa-la aji nke nwa eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu-gi.

20 N’iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ya kwa-arọ n’ebe ahu nke Jehova gārọputa, gi onwe-gi na ulo-gi.

21 Ma mb͕e ọlu di n’aru-ya, dika ngwurọ ma-ọbu ìsì, ọlu ọ bula nke jọrọ njọ, achurula ya Jehova, bú Chineke-gi.

22 Nime ọnu-uzọ-ama-gi nile ka i gēri ya: onye ruru árú na onye di ọcha n’otù uzọ ahu, dika mb͕ada, na dika ele.

23 Nání na i gaghi-eri ọbara-ya; i gāwusi ya n’ala dika miri.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 16

1 Debe ọnwa Ebib, me-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe ngabiga: n’ihi na ọ bu n’ọnwa Ebib ka Jehova, bú Chineke-gi, mere ka i si n’Ijipt puta n’abali.

2 I gāchu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà ngabiga, nke ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n’ebe ahu nke Jehova gārọputa ime ka aha-Ya biri n’ebe ahu.

3 Erila achicha koro eko tiyere ya; ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko tiyere ya, bú achicha nweda-n’ala; n’ihi na i mere ngwa ngwa si n’ala Ijipt puta: ka i we nēcheta ubọchi ahu mb͕e i siri n’ala Ijipt puta ubọchi nile nke ndu-gi.

4 Agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n’aka-gi n’ókè-ala-gi nile ubọchi asa; ọ dighi kwa ihe ọ bula nime anu ahu, nke i nāchu n’àjà n’anyasi n’ubọchi mbu, gādigide abali nile rue ututu.

5 I pughi ichu àjà ngabiga n’otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi:

6 kama n’ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri nime ya, n’ebe ahu ka i gāchu àjà ngabiga n’anyasi, mb͕e anyanwu nāda, na mb͕e akara àkà mb͕e i siri n’Ijipt puta.

7 I gēsi kwa ya rie ya n’ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa: i gēchighari kwa n’ututu, je n’ulo-ikwu-gi nile.

8 Ubọchi isi ka i gēri achicha ekoghi-eko: n’ubọchi nke-asa ubọchi nb͕ochi gādiri Jehova, bú Chineke-gi; ejela ozi nime ya.

9 Izù asa nke ubọchi asa ka i gāguru onwe-gi: site na mb͕e i nāmalite itiye mma-iwe-ihe-ubi nime ọka guzoro eguzo ka i gāmalite igu izù asa nke ubọchi asa.

10 I gēme-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe nke izù asa nke ubọchi asa, dika ọtùtù nke onyinye-afọ-ofufo nke aka-gi si di, nke i gēnye, dika Jehova, bú Chineke-gi, nāgọzi gi:

11 i gāṅuri kwa ọṅu n’iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n’etiti gi, n’ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n’ebe ahu.

12 I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n’Ijipt: i gēdebe kwa me kwa ukpuru ndia.

13 I gēmere onwe-gi ememe ulo-ntu ubọchi asa, mb͕e i chikọtasiri ihe sitere n’ebe-nzọcha-ọka-gi na n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi:

14 i gāṅuri kwa ọṅu n’ememe-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n’ọnu-uzọ-ama-gi nile.

15 Ubọchi asa ka i gēmere Jehova, bú Chineke-gi, ememe n’ebe ahu nke Jehova gārọputa: n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n’ihe-ọmume-gi nile, na n’omume nile nke aka-gi, i gābu kwa onye nāṅuri nání ọṅu.

16 Ub͕ò atọ n’arọ ka agāhu ndikom-i nile n’iru Jehova, bú Chineke-gi, n’ebe ahu nke Ọ gārọputa; n’ememe achicha ekoghi-eko, na n’ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n’ememe ulo-ntu: agaghi-ahu kwa ha n’iru Jehova n’aka efu:

17 nwoke ọ bula dika onyinye aka-ya si di, dika ngọzi Jehova, bú Chineke-gi, si di, nke O nyeworo gi.

18 I gēmere onwe-gi ndi-ikpé na ndi-odozi-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, dika ebo-gi nile si di: ha gēkpe kwa ndi Israel ikpe ezi omume.

19 Ewezugala ikpé; amatala iru madu n’ikpé: anara-kwa-la ihe-iri-ngo; n’ihi na ihe-iri-ngo nēme ka anya ndi mara ihe kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu nile nke ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.

20 Ezi omume, ezi omume ka i gāb͕aso, ka i we di ndu, we nweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

21 Akurula onwe-gi Ashera nke osisi ọ bula n’akuku ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, nke i gēmere onwe-gi.

22 Eguzoro-kwa-la onwe-gi ogidi; nke Jehova, bú Chineke-gi, nākpọ asì.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 17

1 Achurula Jehova, bú Chineke-gi, ehi, ma-ọbu aturu, nke ọlu di n’aru-ya, bú ihe ọjọ ọ bula: n’ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu.

2 Mb͕e agāhuta n’etiti gi, n’otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, nwoke ma-ọbu nwayi, nke nēme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, bú Chineke-gi, n’igabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya,

3 nke jewo-kwa-ra fè chi ọ bula ọzọ òfùfè, we kpọ isi ala nye ha, ma-ọbu inye anyanwu, ma-ọbu inye ọnwa, ma-ọbu inye ihe ọ bula nime usu ihe elu-igwe, nke m’nēnyeghi n’iwu;

4 ewe gosi gi ya, i we nu ya, i gāju kwa ase nke-ọma, ma, le asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n’Israel;

5 i gēme kwa ka nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu puta, bú ndi meworo ihe ọjọ a, rue ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, ọbuná nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu; i gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha nwua.

6 N’ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu ndi-àmà atọ, ka agēme ka ọ nwua, bú onye gānwu anwu; agaghi-eme ka ọ nwua n’ọnu otù onye-àmà.

7 Aka ndi-àmà gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n’ikpe-azu. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n’etiti gi.

8 Mb͕e okwu ọ bula gākari gi n’ikpé, n’etiti ọbara na ọbara, ma-ọbu n’etiti okwu-ikpé na okwu-ikpé, ma-ọbu n’etiti otiti-ihe na otiti-ihe, bú okwu nile nke ise-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile: i gēbili kwa, rigorue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa;

9 i gābiakute kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, biakute kwa onye-ikpe nke gānọ na mb͕e ahu: i gāju kwa ase; ha gēgosi kwa gi uzọ ikpe ikpe ahu:

10 i gēme kwa dika okwu ahu si di, nke ha gēgosi gi site n’ebe ahu nke Jehova gārọputa; i gēlezi kwa anya ime dika ihe nile si di nke ha gēzí gi:

11 dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n’okwu ahu ha gēgosi gi, n’aka-nri, ma-ọbu n’aka-ekpe.

12 Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n’egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n’ebe ahu n’iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n’egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n’Israel.

13 Ndi Israel nile gānu kwa, tu kwa egwu, we ghara ime nganga ọzọ.

14 Mb͕e i gābà n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, i we nweta ya, biri nime ya, si, M’gēdo eze ka ọ buru ezem, dika mba nile si eme ndi dim buruburu;

15 i ghaghi ido onye ahu, onye Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, ka ọ buru eze-gi: otù onye n’etiti umu-nne-gi ka i gēdo eze-gi: i pughi ido nwoke ala ọzọ eze-gi, nke nābughi nwa-nne-gi.

16 Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n’Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n’ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n’uzọ ahu ọzọ.

17 Ọ gaghi-eme kwa ka ndinyom bara ya uba, ka obi-ya we ghara iwezuga onwe-ya: ọ gaghi-eme kwa ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba nke-uku.

18 Ọ gēru kwa, mb͕e ọ nānọkwasi n’oche-eze nke ala-eze-ya, na ọ gēdeputara onwe-ya iwu a n’akwukwọ, site n’akwokwọ ahu nke di n’iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai:

19 ọ gādi kwa n’aka-ya, ọ gāgu kwa ihe di nime ya ubọchi nile nke ndu-ya: ka o we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-ya, idebe okwu nile nke iwu a na ukpuru ndia, ime ha:

20 ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n’ihe enyere n’iwu wezuga onwe-ya, n’aka-nri, ma-ọbu n’aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n’ala-eze-ya, ya onwe-ya na umu-ya, n’etiti Israel.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 18

1 Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bú ebo Livai nile, ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa ha gēsoro Israel nwe: àjà-ọku nile nke Jehova na ihe-nketa-Ya ka ha gēri.

2 Ọ dighi kwa ihe-nketa ha gēnwe n’etiti umu-nne-ha: Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwaworo ha.

3 Nka bu kwa ihe ekpeziri ka enye ndi-nchu-àjà site n’aka ndi Israel, bú site n’aka ndi nāchu àjà, ma ọ bu ehi-ma-ọbu aturu, na ha gēnye onye-nchu-àjà ọkwa-aka-ya, na ǹtì-ya abua, na okwurù-ya.

4 Ihe mbu nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na ihe mbu nke aji ìgwè ewu na aturu-gi, ka i gēnye ya.

5 N’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, arọputawo ya n’ebo-gi nile, iguzo ije ozi n’aha Jehova, ya onwe-ya na umu-ya ndikom ubọchi-gi nile.

6 Mb͕e onye Livai gābia site n’otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile site n’Israel nile, ebe ya onwe-ya nọ dika ọbìa, ọ we were agu nile nāgu nkpuru-obi-ya biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa;

7 ọ gēje kwa ozi n’aha Jehova, bú Chineke-ya, dika umu-nne-ya nile, bú ndi Livai, ndi nēguzo n’ebe ahu n’iru Jehova.

8 Òkè dika òkè-ya ka ha gēri, nāgughi ihe-ya nile erere nke o nwetara n’aka nna-ya-hà.

9 Mb͕e gi onwe-gi nābà n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, amutala ime dika ihe-árú nile nke mba ahu nile si di.

10 Agaghi-ahuta n’etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,

11 ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe.

12 N’ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n’ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n’iru gi.

13 Onye zuru okè ka i gābu n’ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ.

14 N’ihi na mba ndia, nke gi onwe-gi gēnweta, nēge nti ndi nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, na ndi nāju ase: ma gi onwe-gi, ọ bughi otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

15 Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka onye-amuma, nke di ka mu onwem, biliere gi site n’etiti gi, site n’umu-nne-gi; onye ahu ka unu gēge nti;

16 dika ihe nile si di nke i riọrọ n’aka Jehova, bú Chineke-gi, na Horeb n’ubọchi nkpọkọta ahu, si, Ka m’ghara inu kwa olu Jehova, bú Chinekem, ọzọ, ka m’ghara kwa ihu ọku uku a ọzọ, ka m’we ghara inwu.

17 Jehova we sim, Ha ekwuwo nke-ọma okwu nke ha kwuworo.

18 M’gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n’etiti umu-nne-ha; M’gētiye kwa okwum nile n’ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M’gēnye ya n’iwu.

19 O gēru kwa, na nwoke ọ bula nke nāgaghi-ege nti okwum nile nke ọ gēkwu n’aham, Mu onwem gājuta ya n’aka ya.

20 Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n’aham, nke M’nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n’aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa.

21 Mb͕e i gāsi n’obi-gi, Àyi gēsi aṅa mara okwu ahu nke Jehova nēkwughi?

22 Okwu nke onye-amuma nēkwu n’aha Jehova, ma okwu ahu emeghi, o reghi kwa; nke ahu bu okwu nke Jehova nēkwugh: na nganga ka onye-amuma ahu kwuworo ya, atula ujọ ya.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 19

1 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba ahu, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ala-ha, i we napu ha ala-ha, we biri n’obodo nile ha, na n’ulo nile ha;

2 i gākpaputara onwe-gi obodo atọ n’etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ka i we nweta ya.

3 I gēdoziri onwe-gi uzọ, kè kwa ókè-ala nke ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēme gi ka i keta, uzọ atọ, ka ob͕u-madu ọ bula we b͕alaga n’ebe ahu.

4 Nka bu kwa okwu bayere ob͕u-madu, nke gāb͕alaga n’ebe ahu, we di ndu: onye nēb͕u madu-ibe-ya n’amaghi-ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga;

5 dika mb͕e ya na ibe-ya nābà n’oké ọhia ikpọwa nkú, aka-ya we fé anyu-ike ib͕utu osisi, anyu-ike, bú ígwè, we b͕upu n’osisi ahu, we rue madu-ibe-ya aru, o we nwua; onye ahu gāb͕alaga n’otù nime obodo ndia, we di ndu:

6 ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n’azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n’ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n’ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.

7 N’ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I gākpaputara onwe-gi obodo atọ.

8 Ọ buru kwa na Jehova, bú Chineke-gi, eme ókè-ala-gi ka ọ sa mbara, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, O we nye gi ala ahu nile nke O kwuru, si na Ọ gēnye nna-gi-hà;

9 mb͕e i gēdebe ihe nile a enyere n’iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, ime ya, ihu Jehova, bú Chineke-gi, n’anya, na ije ije n’uzọ-Ya nile ubọchi-gi nile; i gātukwasi-kwa-ra onwe-gi obodo atọ ọzọ n’obodo atọ ndia:

10 ka ewe ghara iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n’etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa, ọbara we dikwasi gi n’isi.

11 Ma mb͕e nwoke ọ bula bu onye nākpọ madu-ibe-ya asì, o we che ya anwu, bilie megide ya, tipu ndu-ya, o we nwua; ob͕u-madu ahu we b͕alaga n’otù nime obodo ndia:

12 ndi-okenye obodo-ya gēzì kwa kpọputa ya n’ebe ahu, were ya nye n’aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, ka o we nwua.

13 Anya-gi agaghi-emere ya ebere, ma i gēkpochapu n’Israel ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ, ka o we diri gi nma.

14 Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n’ihe-nketa-gi nke i gēketa, n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya.

15 Nání otù onye-àmà agaghi-ebili imegide onye ọ bula bayere ajọ omume ọ bula, ma-ọbu bayere nmehie ọ bula, nime nmehie ọ bula nke ọ nēmehie: n’ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu n’ọnu ndi-àmà atọ, ka okwu gēguzosi ike.

16 Mb͕e onye-àmà nke ihe-ike gēbili megide onye ọ bula ib͕agide ya àmà bayere nwezuga;

17 ndikom abua ahu, ndi ise-okwu ahu diri, gēguzo n’iru Jehova, n’iru ndi-nchu-àjà na ndi-ikpé ndi gānọ na mb͕e ahu;

18 ndi-ikpé gaju kwa ase nke-ọma: ma, le, asi na onye-àmà ahu bu onye-àmà ugha, nke b͕agideworo nwa-nne-ya àmà ugha;

19 unu gēme kwa ya, dika o zubere ime nwa-nne-ya; i we kpochapu ihe ọjọ ahu n’etiti gi.

20 Ndi fọduru gānu kwa, tu kwa egwu, ha agaghi-eme kwa dika ihe ọjọ a si di ọzọ n’etiti gi.

21 Anya-gi agaghi-eme ebere; ndu lara ndu, anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 20

1 Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n’ala Ijipt rigoputa.

2 O gēru kwa, mb͕e unu nābiaru nso agha ahu, na onye-nchu-àjà gābiaru nso gwa ndi Israel okwu,

3 si ha, Nuru, Israel, unu onwe-unu nābiaru nso agha ta imegide ndi-iro-unu: ka obi-unu ghara ilọ unu miri; unu atula egwu, unu akuja-kwa-la akuja, unu ama-kwa-la jijiji n’iru ha;

4 n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.

5 Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n’ulo-ya, ka ọ ghara inwu n’agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke.

6 Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n’ulo-ya, ka ọ ghara inwu n’agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.

7 Ònye bu kwa nwoke nke kwere ilu nwayi, ma o kēkubataghi ya? ya je laghachi n’ulo-ya, ka ọ ghara inwu n’agha, nwoke ọzọ ewe kubata ya.

8 Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, Ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? ya je laghachi n’ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya.

9 O gēru kwa, mb͕e ndi-ọchi-agha gwabisiri ndi Israel okwu, na ha gēme ndi-isi nke usu nile nke ndi-agha ka ha buru ndi-nlekọta nēlekọta ndi Israel.

10 Mb͕e i nābiaru nso obodo ibuso ya agha, i gākpọ kwa ya òkù udo.

11 O gēru kwa, ọ buru na ọ za gi okwu udo, meghe-kwa-ra gi uzọ-ya, ọ gēru kwa, na ndi nile anāhuta nime ya gāghọrọ gi ndi nēfè òfùfè, ha gēfè kwa gi òfùfè.

12 Ma ọ buru na ọ kweghi ka gi na ya di n’udo, kama ọ nēbuso gi agha, i gānọchigide kwa ya n’agha:

13 Jehova, bú Chineke-gi, gēnye kwa ya n’aka-gi, i gēwere kwa ọnu mma-agha tib͕ue nwoke-ya ọ bula:

14 nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n’obodo ahu, n’agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

15 Otú a ka i gēme obodo nile nke dipuru gi anya nke-uku, nke nādighi nime obodo nile nke mba ndia.

16 Ma emela ka ihe ọ bula nke nēku ume di ndu site n’obodo nile nke ndi ndia nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ha buru ihe-nketa.

17 N’ihi na i ghaghi iwezuga ka ha ebibie ha; bú ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; dika Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi iwu:

18 ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.

19 Mb͕e i gānọchigide obodo n’agha ọtutu ubọchi, n’ibuso ya agha iwere ya, ebibila osisi-ya n’ifekwasi ha anyu-ike; n’ihi na ọ bu ihe sitere na ha ka i gēri, eb͕utu-kwa-la ha; n’ihi na osisi nke di n’ọhia, ọ̀ bu madu, ibà n’iru gi na nnọchigide-n’agha ahu?

20 Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n’agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.