Categories
DANIEL

DANIEL 1

1 N’arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Jehoiakim, bú eze Juda, ka Nebukadneza, bú eze Babilon, biara na Jerusalem, nọchigide ya n’agha.

2 Onye-nwe-ayi we were Jehoiakim, bú eze Juda, na ihe ufọdu nke ulo Chineke, nye n’aka-ya; o we chiri ha bia n’ala Shaina n’ulo chi-ya: ọ bu kwa ihe ndia ka ọ chibatara n’ulo àkù nke chi-ya.

3 Eze ahu we si Ashpenaz, bú onye-isi ndi-onozi-ya, ka o me ka ufọdu n’umu Israel bata, bú ufọdu nime nkpuru ala-eze na nime ndi-isi;

4 bú umu-okoro nke ọ dighi ọlu ọ bula di ha n’aru, ndi mara nma n’ile anya, nwe uche n’amam-ihe nile, mara ihe-ọmuma, nāghọta ihe anāma ama, ndi nwe-kwa-ra ike iguzo n’ulo uku eze; ọ si-kwa-ra ya ka o me ka ha muta akwukwọ na asusu nke ndi Kaldea.

5 Eze we keputara ha òkè nke ubọchi ọ bula n’ubọchi-ya site n’ihe-oriri ọma nke eze, na site na manya-vine nke ọ nāṅu, si ka eme ka ha toputa arọ atọ, ka ha we guzo n’iru eze n’ọgwugwu arọ atọ ahu.

6 Ma n’etiti ha ka umu Juda ufọdu di, bú Daniel, na Hananaia, na Mishael, na Azaraia.

7 Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.

8 Daniel we tiye nka n’obi-ya na ọ gaghi-ewere ihe-oriri ọma eze ma-ọbu manya-vine ọ nāṅu me onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ: o we chọ n’aka onye-isi ndi-onozi ka ọ ghara ime onwe-ya onye nādighi nsọ.

9 Chineke we nye Daniel ka enwe ebere na obi-ebere nile n’aru ya n’iru onye-isi ndi-onozi.

10 Onye-isi ndi-onozi we si Daniel, Mu onwem nātu egwu onye-nwem, bú eze, onye keputaworo ihe-oriri-unu na ihe-ọṅuṅu-unu: n’ihi na ọ̀ bú n’ihi gini ka ọ gāhu iru-unu ka ha b͕aruru kari iru umu-okoro ndi-ọb͕ọ-unu? unu ewe me ka eze nara isim na nrà.

11 Daniel we si onye-nlekọta, nke onye-isi ndi-onozi mere ka ọ guru onye-isi Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia:

12 Biko, nānwa ndi-orù-gi ubọchi iri; ka ha nye kwa ayi akukú ufọdu, ayi ewe rie, ka ha nye kwa ayi miri, ayi ewe ṅua.

13 Ka ahú kwa otú ayi di n’iru gi n’ile ayi anya, na otú umu-okoro ndi nēri ihe-oriri ọma eze di n’ile ha anya; ma dika i si hu, meso ndi-orù-gi otú a.

14 O we ge ha nti n’okwu a, we nwa ha ubọchi iri.

15 N’ọgwugwu ubọchi iri ewe hu na ha di nma n’ile ha anya, ha ma-kwa-ra abuba n’anu-aru, kari umu-okoro ahu nile ndi nēri ihe-oriri ọma eze.

16 Onye-nlekọta ahu we nēwepu ihe-oriri ọma ha na manya-vine ha ganāṅu, o we nēnye ha akukú.

17 Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n’akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile.

18 Ma n’ọgwugwu ubọchi ndia nke eze siri ka eme ka ha bata, onye-isi ndi-onozi we me ka ha bata n’iru Nebukadneza.

19 Eze we kpayere ha uka; ma ahughi n’etiti ha nile onye ọ bula di ka Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia: ha we guzo n’iru eze.

20 Ma n’okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n’aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n’ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.

21 Daniel we nọgide rue arọ mbu nke Sairọs, bú eze.

Categories
DANIEL

DANIEL 2

1 Ma n’arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n’anya-ya.

2 Eze we si ka akpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi-mb͕asi na ndi Kaldea igosi eze nrọ-ya nile. Ha we bata guzo n’iru eze.

3 Eze we si ha, Nrọ ka m’rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu.

4 Ndi Kaldea we si eze n’asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa.

5 Eze we za, si ndi Kaldea, Okwu nke siworo n’ọnum puta nēguzosi ike: asi na unu emeghi ka m’mara nrọ a na isi-ya, agābọkasi unu, ọ bu kwa ulo nile unu ka agēme ebe-ikpofu-ahihia.

6 Ma asi na unu akọ nrọ a na isi-ya, onyinye di iche iche na ugwọ-ọlu na nsọpuru uku ka unu gānata n’akam: n’ihi nka kọrọnum nrọ a na isi-ya.

7 Ha zara nke ub͕ò abua, si, Ka eze zere ndi-orù-ya nrọ a, isi-ya ka ayi gākọ kwa.

8 Eze zara, si, Mu onwem amasiwo na mb͕e a ka unu onwe-unu nāzuchapu, n’ihi na unu ahuwo na o nēguzosi ike site n’ọnum, bú okwu a:

9 na asi na unu emeghi ka m’mara nrọ a, otù ka iwu enyere unu bu: n’ihi na okwu-ugha nke bibi-kwa-ra ebibi ka unu zubekọworo ikwu n’irum, rue mb͕e mb͕e a gērughari: n’ihi nka zerem nrọ a, m’we mara na unu gākọrọm isi-ya.

10 Ndi Kaldea zara n’iru eze, si, Ọ dighi onye ọ bula n’elu uwa nke puru ikọ isi okwu eze: n’ihi na ọ dighi eze ọ bula, ma-ọbu onye-isi, ma-ọbu onye nwere ike n’aru madu, juworo ode-akwukwọ di nsọ ọ bula, ma-ọbu dibia ọ bula, ma-ọbu onye Kaldea ọ bula, ajuju di otú a.

11 Ajuju a nke eze nāju di ike, ọ dighi kwa onye ọzọ nke gākọ ya n’iru eze, ma-ọbughi nání chi-ayi, ndi ebe-obibi-ha nādighi n’etiti anu-aru, bú madu.

12 N’ihi nka eze were iwe, iwe-ya we di ọku nke-uku, o we si ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon la n’iyi.

13 Iwu ahu we puta; ewe gaje ib͕u ndi ahu mara ihe; ha we chọ Daniel na ndi-ibe-ya ka ewe b͕ue ha.

14 Mb͕e ahu Daniel zaghachiri Ariok, bú onye-isi ndi-ob͕ū nke eze, nke puru ib͕u ndi-amam-ihe nke Babilon, okwu ndum-ọdu na ezi uche;

15 ọ zara, si Ariok, bú onye nke eze nke nwere ike n’aru madu, N’ihi gini ka iwu a di ọku ọku site n’iru eze? Mb͕e ahu ihe Ariok mere ka Daniel mara okwu a.

16 Daniel we bata, kpere eze ka o nye ya mb͕e akara àkà, ka o we kọrọ eze isi nrọ ahu.

17 Mb͕e ahu Daniel lara n’ulo-ya, me ka Hananaia na Mishael na Azaraia, bú ndi-ibe-ya, mara okwu ahu:

18 ka ha we riọ obi-ebere nile n’aka Chineke nke elu-igwe bayere ihe-nzuzo ahu; ka Daniel na ndi-ibe-ya we ghara isoro ndi-amam-ihe Babilon fọduru la n’iyì.

19 Mb͕e ahu Daniel ka ekpughere ihe-nzuzo ahu nye n’ọhù nke abali. Mb͕e ahu Daniel gọziri Chineke nke elu-igwe.

20 Daniel zara, si, Ka aha nke Chineke buru ihe agọziri agọzi site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi: n’ihi na amam-ihe na idi-ike, nke Ya ka ha bu:

21 ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma:

22 Ya onwe-ya nēkpughe ihe nile di omimi di kwa nzuzo: Ọ mawo ihe di n’ọchichiri, ìhè nēbi kwa n’ebe Ọ nọ.

23 Gi, Chineke nke nnam-hà, ka mu onwem nēkele, nāja kwa, n’ihi na amam-ihe na idi-ike ka I nyeworom, ub͕u a ka I mewo-kwa-ra ka m’mara ihe ayi riọrọ n’aka Gi: n’ihi na okwu eze ka I meworo ka ayi mara.

24 N’ihi nka Daniel bàkuru Ariok, onye eze doro onye-isi ime ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n’iyì: o jere, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya; Emela ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n’iyì: me ka m’bata guzo n’iru eze, ọ bu kwa isi nrọ ahu ka m’gākọrọ eze.

25 Mb͕e ahu Ariok were ọsọ me ka Daniel bata n’iru eze, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya, Achọputawom otù nwoke nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n’ala ọzọ, onye gēme ka eze mara isi nrọ ahu.

26 Eze zara, si Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, Ọ̀ gābu na i puru ime ka m’mara nrọ a nke m’huworo, na isi-ya?

27 Daniel zara n’iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya;

28 ma Chineke di, Onye nọ n’elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n’ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n’elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu:

29 gi onwe-gi, eze, èchìchè-gi nile rigotara n’uche-gi n’elu ihe-ndina-gi, ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: Onye ahu nke nēkpughe ihe-nzuzo nile emewo kwa ka i mara ihe aghaghi idi.

30 Ma mu onwem, ọ bughi n’ihi amam-ihe ọ bula nke di nimem kari n’ihe ọ bula di ndu ka ekpugheworo ihe-nzuzo a nyem, kama ọ bu ka ewe me ka eze mara isi-ya, ọ bu kwa ka i we mara èchìchè nke obi-gi.

31 Gi onwe-gi, eze, nọ nāhu, ma le, otù onyinyo madu nke di uku. Onyinyo a, nke riri nne, nke ib͕u-maramara-ya kachasi ihe nile, nēguzo n’iru gi; ọ di egwu n’ile ya anya.

32 Onyinyo ahu, isi-ya bu ezi ọla-edo, obi-ya na ogwe-aka-ya abua bu ọla-ọcha, afọ-ya na apata-ukwu-ya abua bu ọla,

33 ogwe-ukwu-ya abua bu ígwè, ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè ma ufọdu nime ha bu urọ.

34 I nọ nāhu rue mb͕e awaputara otù nkume nke anējighi aka wa, o we tie onyinyo ahu n’ukwu-ya abua nke bu ígwè na urọ, tipia ha.

35 Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n’otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n’ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.

36 Nka bu nrọ ahu: isi-ya ka ayi gākọ kwa n’iru eze.

37 Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;

38 ọzọ, n’ebe ọ bula umu nke madu di, anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe ka O nyeworo n’aka-gi, me ka i nwe ike n’aru ha nile: gi onwe-gi bu isi ọla-edo ahu.

39 Ma n’ọnọdu gi ka ala-eze ọzọ gēbili nke gādi ala kari gi; na ala-eze ọzọ nke mere ha atọ, nke bu ọla, nke gēnwe ike n’aru uwa nka nile.

40 Ma ala-eze nke-anọ gādi ike ka ígwè: n’ihi na ígwè nētipia tida kwa ihe nile: na dika ígwè nke nētijisi ihe ndia nile, otú a ka ọ gētipia, tijisia.

41 Ma ebe i huru ukwu-ya abua na nkpisi-ukwu-ya nile, na ufọdu nime ha bu urọ ọkpu-ite, ma ufọdu nime ha bu ígwè, ala-eze ekewara ekewa ka ọ gābu; ma nguzosi-ike ufọdu nke ígwè ahu aghaghi idi nime ya, n’ihi na i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti.

42 Ma nkpisi-ukwu nile nke ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè, ma ufọdu nime ha bu urọ, otú a ufọdu nime akuku ala-eze ahu gādi ike, ma ufọdu nime ya gābu ihe nādighi ike ntiwa.

43 Ma ebe i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti, ha ganēji nkpuru ndi ọzọ gwakọta onwe-ha; ma ha agaghi-adi nārapara n’aru ibe-ha n’otù n’otù, ọbuná otú ígwè na urọ nādighi-agwakọta.

44 Ma n’ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.

45 N’ihi na i huru na awaputara otù nkume n’ugwu ahu nke anējighi aka wa, na o tipiara ígwè ahu na ọla ahu na urọ ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu; Chineke di uku emewo ka eze mara ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: nrọ a nēguzosi kwa ike, ọ bu kwa ihe kwesiri ntukwasi-obi ka akukọ-isi-ya bu.

46 Mb͕e ahu ka eze, bú Nebukadneza, ji da kpue iru-ya n’ala, ọ bu kwa Daniel ka ọ kpọrọ isi ala nye, si ka awusiri ya onyinye-inata-iru-ọma na ihe ísì utọ di iche iche.

47 Eze zara Daniel, si, N’ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.

48 Mb͕e ahu eze mere ka Daniel di uku, ọ di kwa ọtutu onyinye di uku ka o nyere ya, o me-kwa-ra ya ka ọ buru onye nāchi ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, na onye-isi ndi nọchiri anya eze n’ichi ndi-amam-ihe nile nke Babilon.

49 Daniel we riọ eze, o we do Shedrak na Mishak na Abed-nego ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon: ma Daniel nọ n’ọnu-uzọ-ama eze.

Categories
DANIEL

DANIEL 3

1 Nebukadneza, bú eze, mere onyinyo ọla-edo, idi-elu-ya bu ọgu cubit atọ, obosara-ya bu cubit isi: ọ guzobere ya ọtọ na ndagwurugwu Dura n’ala-ọchichi Babilon.

2 Nebukadneza, bú eze, zi-kwa-ra ka achikọta ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpé, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, ibia n’irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ.

3 Mb͕e ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpe, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, nēzukọta n’irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ; ha we nēguzo ọtọ n’iru onyinyo ahu nke Nebukadneza guzobere.

4 Onye-nkwusa nākpọsi kwa nkpu ike, si, Ọ bu unu ka anāgwa okwu, unu ndi di iche iche, na unu mba di iche iche, na unu ndi nāsu asusu di iche iche, si,

5 Na mb͕e ahu mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n’ala, kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ:

6 ma onye ọ bula nke nāgaghi-ada n’ala kpọ isi ala, n’otù mb͕e ahu ka agātubà ya n’etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu.

7 N’ihi nka, n’otù mb͕e ahu, mb͕e ndi nile di iche nuru olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke ubọ na opì nile di iche iche, ha we nāda n’ala, bú ndi nile di iche iche, na mba nile di iche iche, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ha we nākpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ.

8 N’ihi nka ka ndi Kaldea ufọdu biaruru nso n’otù mb͕e ahu, bo ndi-Ju ebubo.

9 Ha zara, si Nebukadneza, bú eze, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

10 Gi onwe-gi, eze, enyewo iwu, si, na onye ọ bula nke gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, gāda n’ala kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu:

11 ma onye ọ bula nke nādaghi n’ala kpọ isi ala, agātubà ya n’etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu.

12 Ndi-Ju ufọdu di ndi i doworo ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon, ha bu Shedrak na Mishak na Abed-nego; ndikom ndia anughi olu-gi, eze: chi-gi nile ka ha nādighi-efè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo nke i guzobeworo ọtọ ka ha nādighi-akpọ isi ala nye.

13 Mb͕e ahu Nebukadneza n’oké iwe na ọnuma-ya siri ka eme Shedrak na Mishak na Abed-nego ka ha bia. Mb͕e ahu ha mere ka ndikom ndia bia n’iru eze.

14 Nebukadneza zara, si ha, Ọ̀ bu ihe unu zubeworo, unu Shedrak, na Mishak, na Abed-nego, na chim ka unu nādighi-efè, ọ̀ bu kwa onyinyo ọla-edo nke m’guzobeworo ọtọ ka unu nādighi-akpọ isi ala nye?

15 Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n’ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m’meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n’otù mb͕e ahu ka agātubà unu n’etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n’akam?

16 Shedrak na Mishak na Abed-nego zara, si eze, Nebukadneza, ọ dighi ayi onwe-ayi nkpà izaghachi gi okwu bayere nka.

17 Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n’oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n’aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi.

18 Ma asi na Ọ pughi inaputa ayi, ka i mara, eze, na chi-gi nile ka ayi nāgaghi-adi nēfè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo ahu nke i guzobeworo ọtọ ka ayi nāgaghi-akpọ isi ala nye.

19 Mb͕e ahu Nebukadneza juputara n’ọnuma, udi iru-ya we b͕anwe imegide Shedrak na Mishak na Abed-nego: ya mere ọ zara, si ka ha me oké ọku ahu ka ọ di ọku ub͕ò asa kari otú anēmeri ka ọ di ọku.

20 Ọ si-kwa-ra ndi-dike ufọdu bu dìnkpà, ndi di n’usu-ndi-agha-ya, ka ha ke Shedrak na Mishak na Abed-nego ab͕u, tubà ha n’oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

21 Mb͕e ahu ekere ndikom ndia ab͕u n’uwe-ukwu-ha, na ákwà-nkechi-isi-ha, na uwe-nwuda-ha, na uwe nile ha, ewe tubà ha n’etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

22 N’ihi nka, n’ihi na okwu eze di ọku ọku, na n’ihi na oké ọku ahu bu ihe emeworo ka ọ dikari ọku ókè, ọbuná ndikom ahu ka ire ọku b͕uru, bú ndi meworo ka Shedrak na Mishak na Abed-nego rigota.

23 Ndikom atọ ndia, bú Shedrak na Mishak na Abed-nego, we da n’ala n’ab͕u n’etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

24 Mb͕e ahu o juru Nebukadneza, bú eze, anya, o we were ọsọ bilie: ọ zara, si ndi-ndum-ọdu-ya, Ọ bughi ndikom atọ ekere ab͕u ayi tubàra n’etiti ọku ahu? Ha zara, si eze, Ọ bu ezie, eze.

25 Ọ zara, si, Le, mu onwem nāhu ndikom anọ atọpuru ab͕u, nējeghari n’etiti ọku ahu, ma emerughi ha ahu; onye ahu nke mere ha anọ yiri nwa nke ndi bu chi n’ile ya anya.

26 Mb͕e ahu Nebukadneza biaruru nso ọnu-uzọ oké ọku ahu nke nēnwu ajọ onwunwu: ọ kwuru, si, Shedrak na Mishak na Abed-nego, unu ndi-orù nke Chineke Nke kachasi ihe nile elu, putanu, bia. Mb͕e ahu Shedrak na Mishak na Abed-nego siri n’etiti ọku ahu puta.

27 Ndi ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi ahu, na ndi ahu nāchi achi, na ndi-ndum-ọdu eze, ebe ha zukọtaworo, ha hu-kwa-ra ndikom ndia, na ọku ahu enweghi ike n’aru-ha, ọku aṅachaghi kwa agiri-isi nke isi-ha, uwe-ukwu-ha ab͕anweghi kwa, ísì ọku agabigaghi kwa n’aru ha.

28 Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha.

29 N’ihi ya anēsite n’akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n’ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a.

30 Mb͕e ahu eze mere ka ihe gara Shedrak na Mishak na Abednego nke-ọma n’ala ahu anāchi achi, bú Babilon.

Categories
DANIEL

DANIEL 4

1 Nebukadneza, bú eze, nēzigara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ozi, bú ndi bi n’uwa nka nile; ka udo bara unu uba.

2 Ihe-iriba-ama nile na ihe-iju-anya nile nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu meworo n’imesom, ọ dim nma n’anya ikọ akukọ ha.

3 Ihe-iriba-ama-Ya nile, le ka ha si di uku ri nne! ihe-iju-anya-Ya nile kwa, le ka ha si di ike nke-uku! ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi-Ya nādigide kwa n’ọb͕ọ nile.

4 Mu onwem, bú Nebukadneza, nọ n’udo n’ulom, nọ kwa ka osisi nwezuru akwukwọ ndu ya n’ulo ukum.

5 Nrọ ka m’huru, o we me ka m’tua egwu; èchìchè nile m’nēchè n’elu ihe-ndinam na ọhù nile nke isim we me ka m’ma jijiji.

6 N’ihi ya anēsite n’akam nye iwu, si, ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon bata n’irum, ka ha we me ka m’mara isi nrọ ahu.

7 Mb͕e ahu ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe batara: mu onwem we ze nrọ ahu n’iru ha; ma ha emeghi ka m’mara isi-ya.

8 Ma n’ikpe-azu Daniel batara n’irum, onye aha-ya bu Belteshaza, dika aha chim si di, onye mọ nke chi nsọ nile di kwa nime ya: ọ bu kwa n’iru ya ka m’zere nrọ ahu, si,

9 Belteshaza, onye-isi ndi-ode-akwukwọ di nsọ, n’ihi na mu onwem mara na mọ nke chi nsọ nile di nime gi, na ọ dighi ihe-nzuzo ọ bula nēsob͕u gi, kọrọm ọhù nile nke nrọm nke m’huworo, na isi-ya.

10 Ma ọhù nile nke isim n’elu ihe-ndinam di otú a: anọm nāhu, ma le, otù osisi n’etiti uwa, idi-elu-ya di kwa uku.

11 Osisi ahu b͕ara ab͕a, di ike, idi-elu-ya rute-kwa-ra n’elu-igwe, apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile.

12 Akwukwọ-ya mara nma, nkpuru-ya ri-kwa-ra nne, ihe-oriri izùru ihe nile di kwa ya: n’okpuru ya ka anu ọhia nēze ǹdò, ọ bu kwa n’alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nēbi, esite kwa na ya zù anu-aru nile, bú madu.

13 Anọm nāhu n’ọhù nile nke isim n’elu ihe-ndinam, ma, le, otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, nēsi n’elu-igwe rida.

14 Ọ nākpọsi nkpu ike, ọ bu kwa otú a ka ọ nāsi, B͕utuenu osisi ahu, b͕ukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru-ya: ka anu-ọhia si n’okpuru ya b͕apu, ka nnunu nile si kwa n’alaka-ya fepu.

15 Ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n’ala, ọbuná n’ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n’ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n’etiti anu-ọhia n’ihe-ọkukú nke uwa:

16 ka obi-ya b͕anwe ghara ibu obi madu, ka enye kwa ya obi anu-ọhia; ka oge asa gabiga kwa ya n’isi.

17 N’iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n’okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n’ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.

18 Nrọ a ka mu onwem, bú eze, bú Nebukadneza, huworo: ma gi onwe-gi, Belteshaza, kọ akukọ-isi-ya, n’ihi na ndi-amam-ihe nile nke ala-ezem apughi ime ka m’mara isi-ya; ma gi onwe-gi puru, n’ihi na mọ nke chi nsọ nile di nime gi.

19 Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi.

20 Osisi ahu nke i huru, nke b͕ara ab͕a, nke di ike, nke idi-elu-ya rutere n’elu-igwe, nke apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile;

21 nke akwukwọ-ya mara nma, nke nkpuru-ya riri nne, nke ihe-oriri izuru ihe nile di ya; nke n’okpuru ya ka anu ọhia nēbi, nke ọ bu n’alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nwere ebe-obibi-ha:

22 gi onwe-gi ka ọ bu, eze, n’ihi na i bawo uba, di ike: idi-uku-gi abawo kwa uba, rute n’elu-igwe, ebe i nāchi erutewo kwa na nsọtu uwa.

23 Ma ebe eze huru otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, ka o nēsi n’elu-igwe ridata, si, B͕utuenu osisi ahu, mebie ya; ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n’ala, ọbuná n’ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n’ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n’etiti anu ọhia, rue mb͕e oge asa gāgabiga n’isi ya;

24 nka bu akukọ-isi-ya, eze, iwu nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ bu kwa, nke ruteworo onye-nwem, bú eze, aru:

25 ọ bu kwa gi ka agāchupu n’ebe madu bi, ọ bu kwa n’etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe ganēde kwa gi, oge asa gāgabiga n’isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n’ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ inye ya ka Ọ gēnye ya.

26 Ma ebe ha siri ka arapu ogwe nkpọrọgwu nke osisi ahu; ala-eze-gi gēguzosiri gi ike, site na mb͕e i gāma na elu-igwe nāchi achi.

27 N’ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n’anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n’ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi.

28 Ihe a nile rutere Nebukadneza, bú eze, aru.

29 N’ọgwugwu ọnwa iri na abua, n’elu ulo uku ala-eze ahu nke Babilon ka ọ nọ nējeghari.

30 Eze zara, si, Ọ̀ bughi nka bu Babilon uku a, nke mu onwem wuworo ibu ulo ala-eze, site n’ike nke àkùm na n’ihi ebube nke ima-nmam?

31 Mb͕e eze kpu okwu a n’ọnu, otù olu siri n’elu-igwe da, si, Gi ka anāgwa okwu, Nebukadneza, bú eze, si: Ala-eze apuwo n’aka-gi.

32 Aganēsi kwa n’ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n’etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n’isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n’ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya.

33 N’otù oge hour ahu ka okwu a rère n’aru Nebukadneza: ewe si n’ebe madu bi chupu ya, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka ọ nāta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya, rue mb͕e agiri-isi-ya toputara dika ábúbà ugo, mbọ-aka-ya kwa dika mbọ nnunu.

34 Ma n’ọgwugwu ubọchi ahu nile mu onwem, bú Nebukadneza, weliri anyam abua lekwasi elu-igwe, ihe-ọmumam we laghachikutem, ọ bu kwa Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka m’gọziri, ọ bu kwa Onye ahu nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi ka m’jara sọpuru kwa, Onye ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, ala-eze-Ya nādigide kwa n’ọb͕ọ nile:

35 ọ bu kwa ndi nile bi n’uwa ka anāgu n’ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n’usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n’etiti ndi bi n’uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo?

36 N’otù mb͕e ahu ka ihe-ọmumam nālaghachikutem; ọzọ, n’ihi ebube nke ala-ezem, ima-nmam na ib͕u-maramaram nālaghachikutem; ọ bu kwa mu ka ndi-ndum-ọdum na ndi-isim nēkpere; ọzọ, n’elu ala-ezem ka emerem ka m’nọzie, ọ bu kwa idi-uku nke kachasi ka atukwasirim.

37 Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n’ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.

Categories
DANIEL

DANIEL 5

1 Belshaza, bú eze, mere oké oriri nye nnù ndi-isi-ya abua na ọgu iri, ọ bu kwa n’iru nnù abua na ọgu iri ahu ka ọ nāṅu manya-vine.

2 Belshaza, mb͕e ọ nēdetu manya-vine ahu ire, ọ siri ka achita iko ọla-edo na ọla-ọcha nke Nebukadneza, bú nna-ya, chiputarari n’ulo uku Chineke nke di na Jerusalem; ka eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-enyi-ya nwanyi we ṅua manya-vine nime ha.

3 Mb͕e ahu ha chitara iko ọla-edo nke achiputarari n’ulo uku nke ulo Chineke nke di na Jerusalem; eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-iko-ya nwan yi we ṅua manya-vine nime ha.

4 Ha ṅuru manya-vine, we ja chi nile nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume.

5 N’otù oge hour ahu ka nkpisi-aka ufọdu nke aka madu putara, de ihe na ncherita-iru ihe-idọba-oriọna n’elu nzu etere na mb͕idi ulo uku eze: eze nāhu kwa ọbu-aka ahu nēde ihe.

6 Mb͕e ahu ib͕u-maramara nke iru eze b͕anwere, èchìchè-ya nile nēme kwa ka ọ ma jijij; nkwonkwo úkwù-ya nātọpusi kwa, ikperè-ya abua nākukọrita kwa onwe-ha.

7 Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n’olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n’ala-eze a ka ọ gāchi achi.

8 Mb͕e ahu ndi-amam-ihe nile nke eze batara: ma ha apughi igu ihe ahu edere, ma-ọbu ime ka eze mara isi-ya.

9 Mb͕e ahu eze, bú Belshaza, mara jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke iru-ya b͕anwe-kwa-ra n’aru ya, ọ nāb͕a kwa ndi-isi-ya ghari.

10 Ma eze-nwanyi were n’ihi okwu nile nke eze na ndi-isi-ya bata n’ulo oké oriri ahu: eze-nwanyi zara, si, Eze, di ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi; ka èchìchè-gi nile ghara ime ka i ma jijiji, ka ib͕u-maramara nke iru-gi ghara kwa ib͕anwe:

11 otù nwoke di n’ala-eze-gi, onye mọ nke chi nsọ nile di nime ya; ọzọ, n’ubọchi nna-gi ìhè na uche na amam-ihe, dika amam-ihe nke chi nile, ka ahuru nime ya: ọzọ, eze ahu, bú Nebukadneza, bú nna-gi, onye-isi nke ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe ka o doro ya, bú nna-gi, eze;

12 n’ihi na mọ nke kachasi, na ihe-ọmuma, na uche, na ikọ isi nrọ di iche iche, na ikọ isi okwu-omimi di iche iche, na itọsi okwu nke nāb͕a ghari, ka ahuru nime ya, bú Daniel, onye eze ahu guru aha-ya Belteshaza. Ub͕u a, ka akpọta Daniel, ọ gākọ kwa isi ihe a edere.

13 Mb͕e ahu emere ka Daniel ba n’iru eze. Eze zara, si Daniel, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu Daniel ahu, onye bu otù nime umu ndi nke Juda emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ndi eze ahu, bú nnam, chiputara na Juda?

14 Ọzọ, anuwom ihe bayere gi, si na mọ nke chi nile di nime gi, na ahuwo kwa ìhè na uche na amam-ihe nke kachasi nime gi.

15 Ma ub͕u a emewo ka ndi mara ihe, bú ndi-dibia, bata n’irum, ka ha we gua ihe a edere, me ka m’mara isi-ya: ma ha apughi ikọ isi ihe a.

16 Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m’mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n’olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n’ala-eze a ka i gāchi achi.

17 Daniel zara, si n’iru eze, Ka onyinye-gi diri gi onwe-gi, gi nye kwa onye ọzọ ugwọ-ọlu-gi; ma m’gāguru eze ihe a edere, me ka ọ mara isi-ya.

18 Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma:

19 ọ bu kwa n’ihi idi-uku ahu nke O nyere ya ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nāsu asusu nile di iche iche nọ nāma jijiji nātu egwu n’iru ya: onye ọ nāchọ ib͕u ọ nēb͕u ya, onye ọ nāchọ idebe ndu ọ nēdebe ya ndu; onye ọ nāchọ ibuli ọ nēbuli ya, onye ọ nāchọ ime ka ọ di ala, ọ nēme ka ọ di ala.

20 Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n’oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n’ebe ọ nọ:

21 esi-kwa-ra n’ebe umu nke madu bi chupu ya, eme-kwa-ra obi-ya ka ọ di ka nke anu-ọhia, ọ bu kwa n’etiti inyinya-ibu-ọhia ka ebe-obibi-ya di; ihe-ọkukú ka anēme ka ọ ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya: rue mb͕e ọ mara na Chineke Nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n’ala-eze nke madu, na ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ido onye-isi-ya ka Ọ nēdo.

22 Ma gi onwe-gi, bú nwa-ya, Belshaza, i meghi ka obi-gi di ala, ọ bu ezie na i mara ihe a nile;

23 ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n’iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n’aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:

24 mb͕e ahu ka esiri n’iru ya zilaga ọbu-aka ahu; ọ bu kwa ihe a nke edere ka akaworori.

25 Ma nka bu ihe-odide ahu nke akarari, MENE, MENE, TEKEL, UFASIN.

26 Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue.

27 TEKEL; atùwo gi n’ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi.

28 PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia.

29 Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n’olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n’ala-eze ahu.

30 N’abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea.

31 Ma Daraiọs, bú onye Midia, natara ala-eze ahu mb͕e ọ b͕ara ihe ra ka ọgu arọ atọ na abua.

Categories
DANIEL

DANIEL 6

1 Ọ di Daraiọs nma n’anya ido ọgu madu isi, bú ndi nọchiri anya eze, ka ha buru ndi-isi ala-eze-ya, ndi gānọ n’ala-eze ahu nile;

2 na ido ndi-isi atọ ndi-isi-ha, ndi Daniel bu otù nime ha; ka ndi ahu ndi nọchiri anya eze we nākọrọ ha akukọ ihe nile ha nēme, ka o we ghara kwa idi ihe nēfunari eze.

3 Mb͕e ahu Daniel nka ghọrọ ọkaka n’elu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze, n’ihi na mọ nke kachasi di nime ya; eze we zube ido ya onye-isi ala-eze-ya nile.

4 Mb͕e ahu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze nọ nāchọ ichọputa ihe-ebubo iji bo Daniel bayere ala-eze; ma ọ dighi ihe-ebubo maọbu omume bibiri ebibi ọ bula ha puru ichọputa; n’ihi na onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu, ọ dighi kwa nmehie ma-ọbu omume bibiri ebibi ọ bula achọputara n’aru ya.

5 Mb͕e ahu ndikom ndia nāsi, Ayi agaghi-achọputa ihe-ebubo iji bo Daniel nka, ma isi na ayi achọputaghi ya n’aru ya n’iwu nke Chineke-ya.

6 Mb͕e ahu ndi-isi ndia na ndi nọchiri anya eze ndia were oké nkpọtu b͕akọta n’ebe eze nọ, ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Daraiọs, bú eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

7 Ndi-isi ala-eze nile, na ndi-isi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ndum-ọdu, na ndi nāchi achi, ab͕awo ìzù ime ka otù ukpuru eze guzosie ike, na ime ka otù isọ-nsọ di ike, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n’olùlù ọdum.

8 Ub͕u a, eze, me ka isọ-nsọ a guzosie ike, kaye aha-gi n’ihe a edere n’akwukwọ, ka ewe ghara ib͕anwe ya, dika iwu nke Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga.

9 N’ihi nka ka eze, bú Daraiọs, kayere aha-ya n’ihe ahu edere n’akwukwọ, na n’isọ-nsọ ahu.

10 Ma Daniel, mb͕e ọ mara na akayewo aha n’ihe ahu edere n’akwukwọ, o we bata n’ulo-ya: (ma o nwere window ufọdu ghere oghe n’ime-ulo-elu-ya chere iru na Jerusalem;) ọ bu kwa ub͕ò atọ n’ubọchi ka ya onwe-ya nēb͕u ikperè-ya n’ala nēkpe ekpere, nēkele ekele n’iru Chineke-ya, n’ihi na otú a ka ọ nēmeri site na mb͕e gara aga.

11 Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta, chọputa Daniel ka ọ nāriọ aririọ, nāriọ kwa aririọ-amara n’iru Chineke-ya.

12 Mb͕e ahu ha biaruru nso, kwue okwu n’iru eze bayere isọ-nsọ eze, si: Ọ̀ dighi isọ-nsọ i kayere aha, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n’olùlù ọdum? Eze zara, si, Ihe nke nēguzosi ike ka ihe a bu, dika iwu Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga.

13 Mb͕e ahu ha zara, si n’iru eze, Daniel, onye bu otù nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ọ nughi olu-gi, eze, ma-ọbu isọ-nsọ ahu nke i kayeworo aha-gi, kama ub͕ò atọ n’ubọchi ka ọ nāriọ aririọ-ya.

14 Mb͕e ahu eze, mb͕e ọ nuru okwu a, ọ jọrọ njọ n’anya-ya nke-uku, ọ bu kwa Daniel ka ọ tukwasiri obi-ya idọputa ya: we rue ọdida anyanwu ka ọ nọ nējisi ike inaputa ya.

15 Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta n’ebe eze nọ, ha we si eze, Mara, gi eze, na iwu nke diri Midia na Peasia bu, na ọ dighi isọ-nsọ ọ bula ma-ọbu ukpuru ọ bula nke eze nēme ka o guzosie ike agāb͕anwe.

16 Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n’olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi.

17 Ewe bute otù nkume, tukwasi ya n’ọnu olùlù ahu; eze we were nb͕a-aka-akàrà-ya na nb͕a-aka-akàrà ndi-isi-ya ka ya; ka ewe ghara ib͕anwe ihe ezubere bayere Daniel.

18 Mb͕e ahu eze lara n’ulo uku ya, nọ ọnọdu-abali nēbu ọnu: achibatakwaghi ubọ egwú n’iru ya: ura-ya fepu-kwa-ra n’anya-ya.

19 Mb͕e ahu eze biliri n’isi-ututu, mb͕e chi bọrọ, o we were ọsọ garue olùlù ọdum.

20 Mb͕e ọ nābiaru nso olùlù ahu n’ijekuru Daniel, ọ bu olu dika nke onye ihe nēwuta ka o jiri ti nkpu: eze zara, si Daniel, Daniel, gi orù nke Chineke di ndu, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ọ̀ puru idọputa gi n’aka ọdum?

21 Mb͕e ahu Daniel gwara eze okwu, si, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

22 Chinekem ezitewo mọ-ozi-Ya, we kpuchita ọnu ọdum ndia, ha emerughkwam aru: n’ihi na n’iru Ya ọ bu emeghi-ihe-ọjọ ka ahuru nimem; ọzọ kwa, n’iru gi, eze, ọ dighi ihe-imeru-aru m’meworo.

23 Mb͕e ahu ọ di eze nma n’anya nke-uku, o we si ka ha me ka Daniel rigoputa n’olùlù ahu. Ewe me ka Daniel si n’olùlù ahu rigota, ọ dighi kwa imeru-aru ọ bula ahuru n’aru-ya, n’ihi na ọ tukwasiri Chineke-ya obi.

24 Eze we kwue, ha we me ka ndikom ahu bia, bú ndi borori Daniel ebubo, ọ bu kwa n’olùlù ọdum ka ha tubàra ha na umu-ha na ndi bu nwunye-ha; ha akēruteghi kwa ala olùlù ahu tutu ọdum enwe ike n’aru ha, tapia ọkpukpu-ha nile.

25 Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, degara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nāsu asusu nile di iche iche, ndi bi n’uwa nka nile, akwukwọ-ozi, si; Ka udo-unu di uku.

26 Anēsite n’irum nye iwu, si, n’ebe nile ọ bula anāchi n’ala-ezem, ka madu nāma jijiji nātu egwu n’iru Chineke nke Daniel: N’ihi na Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, Ọ nēguzosi kwa ike rue mb͕e nile ebighi-ebi, ala-eze-Ya bu kwa nke anāgaghi-emebi, ọchichi-Ya gādigide kwa rue ọgwugwu ihe nile:

27 Ọ bu Onye-ndọputa, na Onye-nnaputa, na Onye nēme ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-iju-anya di iche iche n’elu-igwe na n’uwa; Onye dọputaworo Daniel n’aka ọdum.

28 Ihe ga-kwa-ra Daniel nka nke-ọma n’ọbubu-eze Daraiọs na n’ọbubu-eze Sairọs, bú onye Peasia.

Categories
DANIEL

DANIEL 7

1 N’arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n’elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n’akwukwọ, ọ bu isi ihe n’ihe nile ọ huru ka o kwuru.

2 Daniel zara, si, Anọm nāhu n’ọhùm n’abali, ma, le, ifufe anọ nke elu-igwe nēfekwasi oké osimiri uku si-ike.

3 Anu anọ nke di uku we nēsi n’oké osimiri rigoputa, ha di iche otù n’ibe-ya.

4 Nke-mbu di ka ọdum, ọ nwe-kwa-ra nkù abua nke ugo: anọm nēle rue mb͕e ekwopuru nkù-ya abua, ewe si n’ala bulie ya elu, ọ bu kwa n’ukwu abua ka eguzobere ya ọtọ dika madu, ọ bu kwa obi madu ka enyere ya.

5 Ma le, anu ọzọ, nke mere ha abua, nke yiri bear, ma n’otù akuku ka emere ya ka o bilie, ọgiriga atọ di kwa n’ọnu-ya n’etiti ezé-ya: ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Bilie, rie ọtutu anu.

6 Mb͕e nka gasiri, anọm nāhu, ma, le, anu ọzọ, dika agu, ma o nwere nkù anọ nke anu-ufe n’azu-ya; ọ bu kwa isi anọ ka anu a nwere; anēnye kwa ya ọchichi.

7 Mb͕e nka gasiri m’nọ nāhu n’ọhù nile nke abali, ma le, otù anu, nke mere ha anọ, nke di egwu, nwe ume, dikarisiri ike; ọ nwe-kwa-ra ezé di uku nke ígwè: o ripiara ihe tapia kwa, ma nke fọduru, o jiri ukwu-ya zọtọ ya: anu ahu di kwa iche n’anu nile buru ya uzọ; o nwe-kwa-ra mpi iri.

8 Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n’etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n’iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche.

9 Anọm nāhu rue mb͕e atudasari oche-eze di iche iche, otù Onye ochie we nọdu ala: uwe-Ya di ọcha dika snow, agiri-isi nke isi-Ya di kwa ka aji-anu nwupuru enwupu; oche-eze-Ya bu ire ọku ire ọku, wheel-Ya nile bu ọku nēre ere.

10 Osimiri nke bu ọku nērùputa n’iru ya: orú nnù ndi-ozi ọgu uzọ isi na uzọ ise nējere Ya ozi, orú nnù orú nnù uzọ, na orú nnù nnù uzọ iri-na-otù, na orú nnù ọgu uzọ ise, nēguzo kwa ọtọ n’iru Ya: Onye-ikpe ahu nọduru ala, asaghe-kwa-ra akwukwọ di iche iche.

11 Anọm nāhu na mb͕e ahu n’ihi olu nke oké okwu nile nke mpi nēkwu: anọm nāhu rue mb͕e eb͕uru anu ahu, la aru-ya n’iyì, rara ya nye nsure-ọku.

12 Ma anu atọ nke fọduru, emere ka ọchichi-ha gabiga: ma ogologo mb͕e na ndu-ha ka enyere ha rue mb͕e akara àkà na mb͕e.

13 Anọm nāhu n’ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n’igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n’iru Ya.

14 Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, nke nāgaghi-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgaghi-emebi.

15 Ma mu onwem, bú Daniel, o wutara mọm nime ọbọ́-ya, ọhù nile nke isim nēme kwa ka m’ma jijiji.

16 Abiarurum nso otù onye nime ndi ahu nēguzo ọtọ n’ebe ahu, ọ bu kwa ihe bu ezi okwu bayere ihe a nile ka m’riọrọ n’aka ya. O we gwam okwu, ọ bu kwa isi ọhù ndia ka o mere ka m’mara, si:

17 Anu uku ndia, nke di anọ, bu eze anọ, ndi gēsi n’ala bilie ọtọ.

18 Ma ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu gānata ala-eze ahu, nwe ala-eze ahu rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná rue mb͕e nile ebighi-ebi.

19 Mb͕e ahu ka m’chọrọ ima ihe bu ezi-okwu bayere anu nke-anọ ahu nke puru iche nime ha nile, nke dikarisiri egwu, nke ezé-ya nile bu ígwè, mbọ-ya nile buru ọla; nke ripiara, tapia, were ukwu-ya nile zọtọ nke fọduru;

20 achọ-kwa-ram ima ihe bu ezi-okwu bayere mpi iri ahu nke di n’isi-ya, na mpi ọzọ ahu nke rigotara, nke mpi atọ da-kwa-ra n’ala n’iru ya; ọbuná mpi ahu nke nwere anya di iche iche na ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche, nke di uku kari ibe-ya nile n’ile ya anya.

21 Anọm nāhu, mpi ahu we nēbuso ndi nsọ agha, nwe ike imegide ha;

22 rue mb͕e Onye ochie ahu biara, mb͕e ọ di kwa ikpé enyere ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: mb͕e ahu akara àkà rute-kwa-ra na ndi nsọ nwere ala-eze ahu.

23 Otú a ka ọ siri, Anu nke-anọ gābu ala-eze nke-anọ n’uwa, nke gāpu iche n’ala-eze nile, ọ gēripia kwa uwa nka nile, zọpia ya, tapia ya.

24 Ma mpi iri ndia, ọ bu n’ala-eze ahu ka eze iri gēsi bilie: eze ọzọ gēbili kwa n’azu ha; ma ya onwe-ya gāpu iche n’aru ndi buru ya uzọ, eze atọ ka ọ gēme kwa ka ha di ala.

25 Ọzọ, okwu di iche iche megide Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka o gēkwu, ọ bu kwa ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ gēme ka ha ka nká: ọ gēle kwa anya ib͕anwe mb͕e di iche iche akara àkà na iwu; agēnye kwa ha n’aka-ya rue otù oge na oge abua na nkera oge.

26 Ma Onye-ikpe ahu gānọdu ala, ọ bu kwa ọchichi-ya ka agēme ka ọ gabiga, ikpochapu ya na ila ya n’iyì rue ọgwugwu ihe nile.

27 Ma ala-eze ahu, na ọchichi ahu, na idi-uku nke ala-eze nile n’okpuru elu-igwe nile, ka agēnye ndi ahu, bú ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi nile gēfè kwa Ya, nu olu-Ya.

28 N’ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m’ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n’arum: ma okwu ahu ka m’debere n’obim.

Categories
DANIEL

DANIEL 8

1 N’arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Belshaza, bú eze, emere ka m’hu ọhù, bú mu onwem Daniel, mb͕e ọhù ahu nke emere ka m’hu ya n’isi-nmalite gasiri.

2 M’we hu n’ọhù ahu; o we rue, mb͕e m’nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n’Ilam, bú ala anāchi achi; m’we hu n’ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n’akuku osimiri Ulai.

3 M’we welie anyam, hu, ma, le, otù ebulu nēguzo n’iru osimiri ahu nke nwere mpi abua: mpi abua ahu di kwa elu, ma otù di elu kari ibe-ya: ma nke ka elu kpe azu pute.

4 Ahurum ebulu ahu ka ọ nāsọ mpi n’akuku Ọdida-anyanwu, na n’akuku Ugwu, na n’akuku Ndida; ma ọ dighi anu ọ bula nēguzo n’iru ya, ọ dighi kwa onye nānaputa ihe n’aka-ya; ma ọ neme dika ọ tọrọ ya utọ, me onwe-ya uku.

5 Ma mu onwem nọ nāchighari uchem, ma, le, otù nkpi siri n’Ọdida-anyanwu bia n’elu uwa nile, ma ọ dighi-emetu ala ma-ọli: nkpi ahu nwe-kwa-ra mpi juru anya n’olile n’etiti anya-ya abua.

6 O we biakute ebulu ahu nke nwere mpi abua, nke m’huru ka ọ nēguzo n’iru osimiri ahu, o we b͕akwasi ya ọsọ n’ọnuma nke ike-ya.

7 M’we hu ya ka ọ nābiarutu ebulu ahu nso, o we wesa ya iwe di ilu, tib͕ue ebulu ahu, sọjie mpi-ya abua; ike adighi kwa ebulu ahu iguzo n’iru ya, o we tuda ya n’ala, zọda ya ukwu; ọ dighi kwa onye nānaputa ebulu n’aka-ya.

8 Nkpi ahu we me onwe-ya uku ri nne: ma mb͕e o nwere ume, ab͕ajiri mpi uku ya; mpi anọ nke juru anya n’olile we pute n’ọnọdu ya chere iru n’ifufe anọ nke elu-igwe.

9 Ma otù nime ha ka otù mpi ntà siri puta, o we dikarisiri uku, n’uzọ Ndida, na n’uzọ Ọwuwa-anyanwu, na n’uzọ ala ahu mara nma.

10 O we di uku rue usu ihe nile nke elu-igwe; o we me ka ufọdu nime usu ihe nile nke elu-igwe na nime kpakpando da n’ala, o we zọda ha ukwu.

11 Ọbuná rue Onye-isi nke usu ahu ka o mere onwe-ya uku;ọ bu kwa n’aka-Ya ka ọ napuru àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, atuba-kwa-ra ọnọdu nke ebe nsọ Ya.

12 Anēnye kwa ya usu-ndi-agha imegide àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum n’ihi nmehie; o we tuda ezi-okwu n’ala, me ihe, ihe ga-kwa-ra ya.

13 M’we nu otù onye nsọ ka ọ nēkwu, otù onye nsọ we si onye ahu nke nēkwu okwu, Rùe ole mb͕e ka ọhù a gādi, bú nke àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na njehie ahu nke nākpata itọb͕ọrọ-n’efu, inye ma ebe nsọ ma usu-ndi-agha ka azọda ha ukwu?

14 O we sim, Rue nnù anyasi na ututu ise na ọgu iri-na-ise; ewe gua ebe nsọ n’ebe ezi omume.

15 O rue, mb͕e m’huru ọhù ahu, ọbuná mu onwem, bú Daniel, na m’chọrọ nghọta; ma, le, ihe di ka nwoke di ike n’ile ya anya nēguzo n’irum.

16 M’we nu olu madu n’etiti Ulai, o we kpọ, si, Gebriel, me ka onye a ghọta ọhùa.

17 O we bia nso n’ebe m’nēguzo; ma mb͕e ọ biara, m’we tua egwu nke-uku, da kpue irum n’ala: o we sim, Ghọta, gi nwa nke madu; n’ihi na mb͕e nke ọgwugwu ihe nile ka ọhù a diri.

18 Mb͕e ọ kpayerem uka, m’we di n’oké ura da kpue irum n’ala: o we metum aka, me ka m’guzo ọtọ n’ebe m’nēguzo.

19 O we si, Le, m’gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n’ikpe-azu nke oké iwe a: n’ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile.

20 Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia.

21 Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n’etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.

22 Ma mpi ahu, nke b͕ajiri ab͕aji, nke mpi anọ guzoro n’ọnọdu-ya, ala-eze anọ gēsi na mba ahu guzo, ma ọ bughi n’ike-ya.

23 Ma na mb͕e ikpe-azu nke ala-eze-ha, mb͕e ndi-njehie gējehiezuwori, otù eze gēguzo ọtọ, nke nwere iru di ike, ọ bu kwa onye nāghọta okwu-omimi di iche iche.

24 Ike-ya gēsi kwa ike, ma ọ bughi n’ike nke aka ya; ọ gēbibi kwa n’uzọ di ebube, ihe gāga-kwa-ra ya nke-ọma, ọ gēme kwa ihe: ọ gēbibi kwa ndi nwere ume na ndi ahu, bú ndi nsọ.

25 Ọ gēsite kwa n’ezi uche-ya me ka aghughọ ga nke-ọma n’aka-ya; ọ bu kwa n’obi-ya ka ọ gēme onwe-ya uku; ọ bu kwa na mb͕e udo-ha ka ọ gēbibi ọtutu madu: ọ bu kwa imegide onye-isi nke ndi-isi ka ọ gēguzo; ma agāb͕aji ya nējighi aka.

26 Ma ọhù ahu nke anyasi na ututu nke ekwuworo, ezi-okwu ka ọ bu: ma gi onwe-gi zobe ọhù ahu; n’ihi na ọ diri ọtutu ubọchi di n’iru.

27 Ma mu onwem, bú Daniel, ike gwurum, m’we ria ọria ubọchi ufọdu; m’we bilie, je ozi eze: ọhù ahu ju-kwa-ram anya, ma ọ dighi onye nāghọta ya.

Categories
DANIEL

DANIEL 9

1 N’arọ mbu nke Daraiọs nwa Ahasuerọs, onye sitere na nkpuru ndi Midia, onye emere eze nke ala-eze ndi Kaldea;

2 n’arọ mbu nke ọbubu-eze-ya ka mu onwem, bú Daniel, jiri akwukwọ nile ayi ghọta ọnu-ọgugu arọ ahu, nke okwu Jehova ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ha, imezuru nkpọnkpọ ebe nile nke Jerusalem, bú ọgu arọ atọ na iri.

3 M’we che Onye-nwe-ayi Chineke irum, ichọ Ya n’ekpere na aririọ-amara di iche iche, n’obubu-ọnu na ákwà-nkpe na ntu.

4 M’we kpere Jehova, bú Chinekem, kwuputa, si, Biko, Onye-nwe-ayi, bú Chineke ahu Nke di uku di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n’anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n’iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya;

5 ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu, nupu isi, we si n’ihe nile I nyere n’iwu na n’ikpé-Gi nile wezuga onwe-ayi:

6 ayi egeghi kwa nti ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, ndi gwara ndi-eze-ayi na ndi-isi-ayi na nna-ayi-hà, gwa kwa ndi nile nke ala-ayi, okwu n’aha-Gi.

7 Onye-nwe-ayi, Gi ka ezi omume diri, ma ayi ka ihere iru diri, dika o si di ta; ọ diri ndi Juda, di-kwa-ra ndi bi na Jerusalem, di-kwa-ra Israel nile, ma ndi nọ nso, ma ndi nọ n’ebe di anya, n’ala nile ebe I chugaworo ha, n’ihi nmekpu-ha nke ha mekpuru Gi.

8 Onye-nwe-ayi, ayi ka ihere iru diri, ọ diri ndi-eze-ayi, di-kwa-ra ndi-isi-ayi, di-kwa-ra nna-ayi-hà, n’ihi na ayi emehiewo megide Gi.

9 Onye-nwe-ayi Chineke-ayi ka obi-ebere nile na nb͕aghara nile diri; n’ihi na ayi anupuwo isi n’okpuru Ya;

10 ayi egeghi kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, nti, ijeghari n’iwu-Ya nile, nke O tiyere n’iru ayi site n’aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.

11 E, Israel nile agabigawo iwu-Gi, we wezuga onwe-ha, ka ha we ghara ige olu-Gi nti: ewe wukwasi ayi ọb͕ub͕a-ayi ahu na ọṅuṅu-ayi ahu nke edeworo n’akwukwọ iwu Moses, bú orù Chineke; n’ihi na ayi emehiewo megide Ya.

12 O we me ka Okwu-Ya nile guzosie ike, bú nke O kwuru megide ayi, megide kwa ndi-ikpe-ayi ndi kpere ayi ikpe, n’ime ka ihe ọjọ uku biakwasi ayi: n’ihi na emeghi n’okpuru elu-igwe nile otú emeworo na Jerusalem.

13 Dika edeworo ya n’akwukwọ iwu Moses, ihe ọjọ a nile abiakwasiwo ayi: ma ayi emeghi ka iru Jehova, bú Chineke-ayi, dajua, ka ayi we si n’ajọ omume nile ayi chigharia, nwe uche n’ezi-okwu-Gi.

14 Jehova we mua anya n’ebe ihe ọjọ ahu di, me ka ọ biakwasi ayi: n’ihi na Onye ezi omume ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu bayere ọlu-Ya nile nke Ọ luworo, ma ayi egeghi olu-Ya nti.

15 Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye wereworo aka di ike me ka ndi-Gi si n’ala Ijipt puta, I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta; ayi emehiewo, ayi emebiwo iwu.

16 Onye-nwe-ayi, dika ezi omume-Gi nile si di, biko, ka iwe-Gi na ọnuma-Gi si n’obodo-Gi, bú Jerusalem, bú ugwu nsọ Gi, laghachi: n’ihi na ọ bu n’ihi nmehie nile ayi, na n’ihi ajọ omume nile nke nna-ayi-hà, ka Jerusalem na ndi-Gi ghọworo ihe-ita-uta nye ndi nile di ayi buruburu.

17 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ge nti n’ekpere orù-Gi na n’aririọ-amara-ya nile, me iru-Gi ka ọ mukwasi ebe nsọ Gi nke tọb͕ọrọ n’efu, n’ihi Onye-nwe-ayi.

18 Chinekem, tọ nti-Gi n’ala, nu; saghe anya-Gi abua, hu ebe nile ayi nke tọb͕ọrọ n’efu, na obodo ahu nke akpọkwasiworo ya aha-Gi: n’ihi na ọ bughi n’ihi ezi omume nile ayi ka ayi onwe-ayi nēme ka aririọ-amara nile ayi da n’iru Gi, kama n’ihi ọtutu obi-ebere-Gi.

19 Onye-nwe-ayi, nuru: Onye-nwe-ayi, b͕aghara: Onye-nwe-ayi, ṅa nti me ihe: anọla ọdu: n’ihi Gi onwe-gi; Chinekem, n’ihi na aha-Gi ka akpọkwasiworo obodo-Gi na ndi-Gi.

20 Ma mb͕e mu onwem nọ nēkwu okwu, nēkpe ekpere, nēkwuputa nmehiem na nmehie ndim, bú Israel, nēme ka aririọ-amaram da n’iru Jehova, bú Chinekem, n’ihi ugwu nsọ nke Chinekem;

21 e, mb͕e mu onwem nọ nēkwu okwu n’ekpere, onye ahu, bú Gebriel, onye m’hururi n’ọhù n’isi-nmalite, ebe emere ka o feb͕ue onwe-ya n’ufe, o we nērutum aru n’ihe dika mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.

22 O we me ka m’ghọta, kpayerem uka, si, Daniel, ub͕u a ka m’putaworo ime ka i nwe uche ighọta ihe.

23 N’isi-nmalite aririọ-amara-gi nile ka okwu putara, mu onwem abiawo kwa igosi gi; n’ihi na ihe anāchọsi ike nke-uku ka i bu: ya mere tugharia uche n’okwu a, ghọta ọhù a.

24 Ọgu ízù atọ na iri, bú ízù ubọchi asa, ka ekpeworo n’ikpe bayere ndi-gi, baye-kwa-ra obodo nsọ gi, ime ka njehie bìe, na ime ka nmehie gwusia, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighi-ebi bata, na ikachita ọhù na omuma akàrà, na ite Onye nsọ ahu Nke kachasi ndi nsọ nile manu.

25 Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.

26 Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n’efu di iche iche.

27 Ọ gēme kwa ka otù ọb͕ub͕a-ndu siere ọtutu madu ike otù ízù: ọ bu kwa na nkera ízù ahu ka ọ gēme ka àjà na onyinye-inata-iru-ọma kwusi; ọ bu kwa n’elu nkù ihe-árú di iche iche ka otù onye nke nākpata itọb͕ọrọ-n’efu gābia: ọ bu kwa rue mb͕e agāwukwasi ngwusi na ihe akara àkà n’aru onye ahu nākpata itọb͕ọrọ-n’efu.

Categories
DANIEL

DANIEL 10

1 N’arọ nke-atọ nke Sairọs, bú eze Peasia, ekpughere Daniel, onye akpọrọ aha-ya Belteshaza, okwu; ọ bu kwa ezi-okwu ka okwu ahu bu, ọbuná obubu-agha uku: o we ghọta okwu ahu, nghọta di-kwa-ra ya n’ọhù ahu.

2 N’ubọchi ahu mu onwem, bú Daniel, nọ nēru újú ogologo ízù atọ.

3 Nri anāchọsi ike nke-uku ka m’nērighi, anu na manya-vine abàghi kwa n’ọnum, eteghkwam onwem manu maọli, rue mb͕e ogologo ízù atọ ruzuru.

4 Ma n’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa mbu, mb͕e mu onwem nọ n’akuku osimiri uku ahu, ya bu Hidekel,

5 m’we welie anyam abua, hu, ma, le, otù onye yiri uwe ọcha, onye ekere ihe-ọkiké ọla-edo ọma nke Ufaz n’úkwù-ya:

6 aru-ya di kwa ka beryl, iru-ya di kwa ka àmùmà si di n’ile ya anya, anya-ya abua di kwa ka ọwa nēnwu ọku, ogwe-aka-ya abua na ukwu-ya abua di kwa ka ib͕u-maramara nke ọla akwọchara akwọcha, olu okwu-ya nile di kwa ka olu ìgwè madu.

7 Mu onwem, bú Daniel, náním, huru ọhù ahu: ma ndikom ahu ndi mu na ha nọ ahughi ọhù ahu; ma otù ọ di, oké ọma-jijiji dakwasiri ha, ha we b͕alaga izobe onwe-ha.

8 Mu onwem we fọduru náním, m’we hu ọhù uku a, ike we ghara ifọdu nimem: n’ihi na ebubem b͕anwere ghọ ihe-nbibi n’arum, m’we ghara inagide ike ọ bula.

9 M’we nu olu okwu-ya nile: ma mb͕e m’nuru olu okwu-ya nile mu onwem adawori n’oké ura kpue irum n’ala, irum we che n’ala.

10 Ma, le, otù aka meturum, me ka m’guzo nāṅaghari n’elu ikperèm abua na ọbu-akam abua.

11 O we sim, Daniel, onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku, ghọta okwu nile nke mu onwem nāgwa gi, gi guzo kwa ọtọ n’ebe-nguzo-gi; n’ihi na ub͕u a ka ezìworom biakute gi: mb͕e ọ kpayerem uka nka, m’we guzo ọtọ nāma jijiji.

12 O we sim, Atula egwu, Daniel; n’ihi na site n’ubọchi mbu ahu mb͕e i nyere obi-gi ighọta ihe na iweda onwe-gi n’ala n’iru Chineke-gi, anuru okwu-gi nile: mu onwem abiawo kwa n’ihi okwu-gi nile.

13 Ma onye-isi ala-eze Peasia nēguzo na ncherita-irum orú ubọchi na otù; ma, le, Maikael, bú otù nime ndi-isi ndi bu isi, biara iyerem aka: mu onwem we fọdu n’ebe ahu n’akuku ndi-eze Peasia.

14 Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n’ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia.

15 Mb͕e ọ kpayerem uka dika okwu ndia si di, m’we che irum n’ala, da ob͕i.

16 Ma, le, otù onye nke di ka oyiyi umu nke madu nēmetu eb͕ub͕ere-ọnum abua aka: m’we saghe ọnum, kwue okwu, si onye ahu nke nēguzo na ncherita-irum, Onye-nwem, site n’ọhù a aru-ufum nile dakwasirim na mberede, m’we ghara inagide ike ọ bula.

17 Òrù nke onye-nwem nka gēsi kwa aṅa nwe ike ikpayere onye-nwem nka uka? ma mu onwem, site n’ub͕u a ike adighi-eguzogide kwa nimem, ume afọdughi kwa nimem.

18 Otù onye nke di ka madu n’ile ya anya we metukwam aka ọzọ, me ka m’di ike.

19 O we si, Atula egwu, gi onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku: udo diri gi, di ike, e, di ike. Mb͕e ọ kpayerem uka, m’we me onwem ka m’di ike, si, Ka onye-nwem kwue; n’ihi na i mewo ka m’di ike.

20 O we si, Ì mara ihe m’jiri biakute gi? ma ub͕u a m’gālaghachi ibuso onye-isi Peasia agha: ma mb͕e mu onwem nāpu, le, onye-isi Jevan gābata.

21 Ma otú ọ di, m’gēgosi gi ihe akara àkà n’ihe edere n’akwukwọ nke ezi-okwu: ma ọ dighi otù onye nēme onwe-ya ka ọ di ike n’akukum imegide ndia, ma-ọbughi nání Maikael, bú onye-isi ūnu.