Categories
AISAIA

AISAIA 61

1 Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n’arum; n’ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n’ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n’agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;

2 ikpọsa arọ mb͕e ihe madu nātọ Jehova utọ, na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ Chineke-ayi nwere; ikasi ndi nile nēru újú obi;

3 idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n’isi n’ọnọdu ntu, manu obi-utọ n’ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n’ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.

4 Ha gēwu kwa ebe nile nke bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; ebe nile nke tọb͕ọrọ n’efu nke ndi mbu ka ha gēwuli, me kwa ka nkpọnkpọ obodo nile di ọhu, bú ebe tọb͕ọrọ n’efu nke ọtutu ọb͕ọ gara aga.

5 Ndi ala ọzọ gēguzo nāzù ìgwè ewu na aturu-unu, umu ala ọzọ gābu kwa ndi-ọlu-ubi-unu na ndi-ọlu-ubi-vine-unu.

6 Ma agākpọ unu onwe-unu ndi-nchu-àjà nke Jehova: ndi nējere Chineke-ayi ozi ka agāsi na unu bu: àkù nke mba di iche iche ka unu gēri, ọ bu kwa na nsọpuru-ha ka unu gānya isi.

7 N’ọnọdu ihere-unu unu gēnwe okpukpu: n’ọnọdu-ihere ha gēti nkpu ọṅù n’òkè-ha: n’ihi ya n’ala-ha okpukpu ka ha gēnweta: ọṅù ebighi-ebi gādiri ha.

8 N’ihi na Mu onwem, Jehova, nāhu ikpé ziri ezi n’anya, anamakpọ nnapu-n’ihe-ike n’ajọ omume asì; M’gēnye kwa ha ugwọ-ọlu-ha n’ezi-okwu, ọ bu kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Mu na ha gāb͕a.

9 Agāma kwa nkpuru-ha n’etiti mba nile, na umu nke putara n’aru ha n’etiti ndi nile di iche iche: ndi nile ndi nāhu ha anya gāmata ha, na ha onwe-ha bu nkpuru nke Jehova gọziworo.

10 Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n’ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n’isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.

11 N’ihi na dika ala si eme ka ihe-opupú-ya puta, na dika ubi ab͕ara ogige si eme ka ihe aghaworo nime ya pue; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova gēme ka ezi omume na otuto pute n’iru mba nile.

Categories
AISAIA

AISAIA 62

1 N’ihi Zaion m’gaghi-edebe ọnum du, na n’ihi Jerusalem m’gaghi-anọ jū, rue mb͕e ezi omume-ya gāputa ihè dika onwu-maramara, nzọputa-ya kwa dika ọwa nke nēnwu enwu.

2 Mba di iche iche gāhu kwa ezi omume-gi, eze nile gāhu nsọpuru-gi: agākpọ kwa gi aha ọhu nke ọnu Jehova gāgu.

3 I gāghọ kwa okpu-eze nke ima-nma n’aka Jehova, na ákwà-ike-n’isi nke ala-eze n’ọbu-aka Chineke-gi.

4 Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n’efu ọzọ: n’ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n’ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.

5 N’ihi na dika nwa-okorọbia si aluru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, otú a ka umu-gi ndikom gālu gi: ọzọ, dika obi-utọ nke onye nālu nwunye ọhu nwere n’aru nwunye ọhu ya, otú a ka obi gātọ Chineke utọ n’aru gi.

6 N’elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M’doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du,

7 unu ekwe-kwa-la ka O dere du, rue mb͕e Ọ gēme ka Jerusalem guzosie ike, ru kwa mb͕e Ọ gēme ya ka ọ buru otuto n’uwa.

8 Jehova ewerewo aka-nri-Ya, were kwa ogwe-aka-Ya di ike, ṅua iyi, si, N’ezie M’gaghi-enye kwa ọka-gi ọzọ iburu ndi-iro-gi ihe-oriri ma-ọli; n’ezie umu ala ọzọ agaghi-aṅu kwa manya-vine ọhu gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n’ọlu bayere ya:

9 kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n’ogige nsọm nile.

10 Gabiganu, gabiganu n’ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n’elu ndi nile di iche iche.

11 Le, Jehova emewo ka anuru ya rue nsọtu uwa, si, Sinu ada Zaion, Le, nzọputa-gi abiawo; le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n’aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n’iru Ya.

12 Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.

Categories
AISAIA

AISAIA 63

1 Ònye bu nka nēsi n’Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n’uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n’iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n’ezi omume, di ike izọputa.

2 Gini mere ọ nācha uhie uhie n’uwe-oyiyi-Gi? gini mere uwe-Gi ji di ka onye nāzọ ukwu n’ebe-inara-manya-vine?

3 Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka M’zọchara, náním; ma nime ndi nile di iche iche ọ dighi onye ọ bula Mu na ya nọ: M’we zọcha ha n’iwem, zọda ha n’ọnumam; ọbara-ndu-ha we fesa n’uwem nile, ọ bu kwa uwe-oyiyim nile ka M’meruru emeru.

4 N’ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di n’obim, arọ nke ndi M’b͕aputaworo abiawo kwa.

5 M’we legide anya, ma ọ dighi onye nēne aka; ibobo we nwuam n’aru na ọ̀ dighi onye nākwagide: ogwe-akam we wetaram nzọputa; ọnumam kwa, ya kwagiderem.

6 M’we zọda ndi di iche iche n’iwem, me ka ha ṅubiga ihe-ọṅuṅu nābà n’anya n’ọnumam, M’we me ka ọbara-ndu-ha ruda n’ala.

7 Ebere nile nke Jehova ka M’gēhota, ha na otuto nile nke Jehova, dika ihe nile si di nke Jehova mesoworo ayi; na iba-uba nke ezi ihe emere ulo Israel, nke O mesoworo ha dika obi-ebere-Ya nile si di, na dika iba-uba nke ebere-Ya si di.

8 O we si, N’ezie, ndim ka ha bu, umu ndi nādighi-ekwu okwu-ugha: O we ghọrọ ha onye-nzọputa.

9 Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n’ihu-n’anya-Ya na n’ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.

10 Ma ndi ahu nupuru isi, me ka o wuta Mọ Nsọ Ya: O we chigharia ghọrọ ha onye-iro, Ya onwe-ya busoro ha agha.

11 Ndi-Ya we cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga nke Moses, si, Òle ebe Onye ahu nọ nke mere ka ha si n’oké osimiri rigoputa n’aka onye nāzù ìgwè ewu na aturu-Ya? òle ebe Onye ahu nọ nke tiyere Mọ Nsọ Ya n’etiti ha?

12 Nke nēme ka ogwe-aka-Ya mara nma je ije n’aka-nri Moses? Nke nēkewa miri n’iru ha, imere Onwe-ya aha ebighi-ebi?

13 Nke nēme ka ha je ije n’ob͕u-miri dika inyinya n’ọzara, ha we ghara isu ngọngọ?

14 Dika anu-ulo nke nārida na ndagwurugwu, otú a ka Mọ nke Jehova nēme ka ha zuru ike: otú a ka I duru ndi-Gi, imere Onwe-gi aha mara nma.

15 Si n’elu-igwe legide anya, si kwa n’ebe-obibi nke idi-nsọ-Gi na nke ima-nma-Gi le: òle ebe ekworo-Gi na idi-ike-Gi nile di? idà-udà nke ngiri-afọ-Gi na obi-ebere-Gi nile n’ebe m’nọ jisiri onwe-ha ike.

16 N’ihi na Gi onwe-gi bu Nna-ayi; n’ihi na Abraham amaghi ayi, Israel adighi-amata kwa ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu Nna-ayi; Onye-nb͕aputa-ayi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka aha-Gi bu.

17 Jehova, n’ìhi gini ka I nēme ka ayi si n’uzọ-Gi nile kpafue? n’ìhi gini ka I nēme ka obi-ayi si n’egwu-Gi sie ike? Lata n’ihi ndi-orù-Gi, bú ebo nile nke ihe-nketa-Gi.

18 Ọ bu nání mb͕e ntà ka ndi nsọ Gi nwetara ya: ndi nākpab͕u ayi azọdawo ebe nsọ Gi.

19 Ayi aghọwo ndi I nāchighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi anākpọkwasighi ha aha-Gi.

Categories
AISAIA

AISAIA 64

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n’iru Gi rùda dika miri;

2 dika mb͕e ọku nāb͕a umu osisi, dika mb͕e ọku nēme ka miri b͕ọ: ime ka ndi nēmegide Gi mara aha-Gi, ka mba di iche iche we si n’iru Gi ma jijiji.

3 Mb͕e I mere ihe di egwu nke ayi nēleghi anya ha, I ridatara, ugwu nile siri n’iru-Gi rùda dika miri.

4 Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga madu anughi, ha anutaghi kwa na nti, anya ahughi kwa otù Chineke, ma ewezuga nání Gi, Nke nāluru onye nēchere Ya ọlu.

5 I zutewo onye nēwere obi-utọ alu ezi omume, bú ndi nēcheta Gi n’uzọ-Gi nile: le, Gi onwe-gi were iwe, ayi we mehie: nime ha ka ayi nọworo mb͕e ebighi-ebi, àgāzọputa kwa ayi?

6 Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di: ayi we kpọnwua dika akwukwọ osisi, ayi nile; ajọ omume-ayi nēfepu kwa ayi, dika ifufe.

7 Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n’ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n’aka ajọ omume nile nke ayi.

8 Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu.

9 Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu.

10 Obodo nsọ Gi nile aghọwo ọzara, Zaion aghọwo ọzara, Jerusalem aghọwo ebe tọb͕ọrọ n’efu.

11 Ulo-ayi nke di nsọ nke ma-kwa-ra nma, ebe nna-ayi-hà toro Gi, aghọwo ihe nsure-ọku: ihe nile ayi anāchọsi ike aghọwo kwa nkpọnkpọ ihe.

12 Mb͕e anēme ihe ndia, Ì gējisi Onwe-gi ike, Jehova? Ì gāb͕a nkiti, we weda ayi n’ala nke-uku?

Categories
AISAIA

AISAIA 65

1 Ekwerem ka ndi nājughi ajuju chọm; ekwerem ka ndi nāchọsighm ike chọtam: asirim otù mba nke nākpọkughi aham, Lekwam.

2 Ab͕asawom akam abua ogologo ubọchi nile nye otù ndi nke nēwezuga onwe-ha, ndi nēje ije n’uzọ nādighi nma, nēso èchìchè nile nke aka ha;

3 bú ndi ahu nke nākpasum iwe n’irum mb͕e nile, nāchu àjà n’ubi nile agbara-ogige, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu brick nile;

4 ndi nānọdu n’etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n’ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n’ihe-isi-ite nile ha;

5 ndi nāsi, Guzoro onwe-gi iche, abiarula nsom, n’ihi na edowom i ihe nsọ: ndia bu anwuru-ọku n’imim, ọku nke nēre ogologo ubọchi nile.

6 Le, ọ bu ihe edeworo n’akwukwọ n’irum: M’gaghi-agba nkiti, kama M’gākwughachi, e, M’gākwughachi n’obi-ha,

7 ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n’otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu ugwu nile, takwam uta n’elu ugwu ntà nile: M’gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n’obi-ha.

8 Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n’uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n’ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M’gēme N’ihi ndi-orùm, ka M’we ghara ibibi ha nile.

9 M’gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M’rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n’ebe ahu.

10 Sheron gāghọ kwa ebe-ita-nri nke ìgwè ewu na aturu, ndagwurugwu Ekoa gāghọ kwa ebe ìgwè ehi nāmakpu amakpu. diri ndim chọworom.

11 Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n’usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa;

12 M’gāgukọta unu nye mma-agha, unu nile gēruru kwa ala ka ewe b͕ue unu; n’ihi na akpọrọm unu òkù, ma unu azaghm; ekwurum okwu, ma unu anughi; unu we me ihe jọrọ njọ n’anyam abua, ọ bu kwa ihe nke nātọghm utọ ka unu rọputara.

13 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji kwue otú a, si, Le, ndi-orùm gēri ihe, ma agu gāgu unu onwe-unu: le, ndi-orùm gāṅu, ihe-ọṅuṅu, ma akpiri gākpọ unu onwe-unu nku: le, ndi-orùm gāṅuri ọṅu, ma ihere gēme unu onwe-unu:

14 le, ndi-orùm gēti nkpu ọṅù site n’obi di nma, ma unu onwe-unu gēti nkpu site n’ihe-nb͕u nke obi, unu gēsite kwa na ntiwa nke mọ-unu kwasi ákwá ike.

15 Unu gārapu aha-unu n’azu ighọrọ ndi M’rọputaworo ihe-ọb͕ub͕a-iyi, Onye-nwe-ayi Jehova gēme kwa ka i nwua; ma Ọ gākpọ ndi-orù-Ya aha ọzọ:

16 onye ahu nke nāgọzi onwe-ya n’uwa ewe gọzie onwe-ya nime Chineke nke ezi-okwu; onye ahu kwa nke nāṅu iyi n’uwa gēji Chineke nke ezi-okwu ṅua; n’ihi na echezọwo ahuhu mbu nile, na n’ihi na ezonariwo ha n’anyam abua.

17 N’ihi na, le, M’gaje ikè elu-igwe ọhu na uwa ọhu: agaghi-echeta kwa ihe mbu nile, ha agaghi-abata kwa n’obi.

18 Ma otú ọ di, ka obi tọ unu utọ, teghari-kwa-nu egwú ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi n’ihi ihe nke Mu onwem nēkè: n’ihi na, le, M’nēkè Jerusalem ibu ihe nteghari-egwú-ọṅù, ndi-ya kwa, ibu ihe obi-utọ.

19 M’gēteghari kwa egwú ọṅù n’aru Jerusalem, obi gātọkwam utọ n’aru ndim: agaghi-anu kwa olu ikwa-ákwá nime ya ọzọ, ma-ọbu olu iti-nkpu.

20 Ọ dighi nwa ọhu nwuchuru anwuchu gēsite kwa n’ebe ahu ọzọ, ma-ọbu agadi nke nānọzughi ubọchi ndu-ya: n’ihi na nwata gānwu mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise, agākọcha kwa onye-nmehie mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise.

21 Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha.

22 Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n’ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M’rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku.

23 Ha agaghi-adọb͕u onwe-ha n’ọlu n’efu, ha agaghi-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n’ihi na nkpuru nke ndi Jehova gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi n’aru-ha puta.

24 O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.

25 Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n’otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n’ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.

Categories
AISAIA

AISAIA 66

1 Otú a ka jehova siri, Elu-igwe bu oche-ezem, uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwum: àha ulo gini ka unu gēwurum? ma-ọbu àha ebe gini gābu ebe-izu-ikem?

2 N’ihi na ihe nile ndia ka akam meworo, ihe ndia nile ewe di, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: ma onye a ka M’gēlegide, ọbuná onye ewedara n’ala nke etib͕u-kwa-ra mọ-ya etib͕u, onye nāma kwa jijiji n’okwum.

3 Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ;

4 Mu onwem gārọputa kwa ichì-ọchì nile ha, me kwa ka ihe-ujọ nile ha biakwasi ha; n’ihi na M’kpọrọ òkù, ma ọ dighi onye nāza; ekwurum okwu, ma ha anugh: ha we me ihe jọrọ njọ n’anyam, ọ bu kwa ihe ahu nke nātọghm utọ ka ha rọputara.

5 Nurunu okwu Jehova, unu ndi nama jijiji n’okwu-Ya: Umu-nne-unu ndi nakpọ unu asì, ndi nāchupu unu n’ihi aham, asiwo, Ka asọpuru Jehova, ka ayi we lekwasi ọṅù-unu anya: ma ihere gēme ndi ahu.

6 Ge nti, olu nkpọtu nēsite n’obodo, olu nēsite n’ulo uku Chineke, bú olu Jehova Onye nākwughachi ndi-iro-Ya nmeso-ha.

7 Tutu ime eme ya, ọ muru nwa; tutu ihe-nb͕u nke diri ya abia, ọ muputara nwa-nwoke.

8 Ònye nuworo ihe dika nka? ònye huworo ihe dika ndia? Ìme ala gēme ya n’otù ubọchi? àgāmu mba n’otù mb͕e? n’ihi na ime mere Zaion, ọ mu-kwa-ra umu-ya.

9 Mù onwem gēme ka nwa rue ọmumu, ghara ime ka amua ya? ka Jehova siri: ma-ọbu Mu onwem nke nēme ka amua, M’gēmechi àkpà-nwa? ka Chineke-gi siri.

10 Soronu Jerusalem ṅuria, teghari-kwa-nu egwú ọṅù n’ihi ya, unu ndi nile nāhu ya n’anya: ka obi tọ unu utọ n’ebe ọ nọ site n’obi-utọ, unu ndi nile nēru újú bayere ya:

11 ka unu we ṅujue ara nkasi-obi-ya nile afọ; ka unu we miputa ara, njubiga-ókè nke nsọpuru-ya ewe tọ unu utọ.

12 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M’nēsetiru ya udo dika osimiri, na nsọpuru nke mba di iche iche dika iyi nke nērubiga ókè, unu gāmiputa nime ha; n’akuku ka agēkuru unu, ọ bu kwa n’ikperè ka agātughari unu.

13 Dika onye nke nne-ya nākasi obi, otú a ka Mu onwem gākasi unu obi; ọ bu kwa nime Jerusalem ka agākasi unu obi.

14 Unu gāhu kwa ya, o we tọ obi-unu utọ, ọkpukpu nile unu gējuputa na ndu dika ahihia ndu: agāma kwa aka Jehova n’ebe ndi-orù-Ya nọ, Ọ gēwesa kwa ndi-iro-Ya iwe.

15 N’ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya.

16 N’ihi na ọku ka Jehova gēji soro anu-aru nile, bú madu, je ikpé, Ọ gēji kwa mma-agha-Ya: ndi Jehova b͕uworo gaba uba.

17 Ndi nēdo onwe-ha nsọ ndi nēme onwe-ha ka ha di ọcha ibà n’ubi nile ab͕ara ogige, n’azu otù onye di n’etiti, ndi nēri anu ezì, na ihe-árú ahu, na òké; n’otù ka ha gāgwusi, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

18 Ma Mu onwem, amaram ọlu nile ha na èchìchè nile ha: mb͕e nābia ijikọta mba nile na asusu nile; ha gābia kwa, hu ebubem.

19 M’gēdo kwa ihe-iriba-ama n’etiti ha, si kwa n’etiti ha ziga ndi b͕aputara ab͕aputa ka ha jekuru mba nile, bú Tashish, na Pul, na Lud, ndi nādọ uta, jekuru Tubal na Jevan, jekuru agwe-etiti nile di anya, ndi nānughi ihe bayerem, ndi nāhughi kwa ebubem: ha gēgosi ebubem n’etiti mba nile.

20 Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n’elu inyinya, na n’ub͕ọ-ala, na n’ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n’elu inyinya mule, na n’elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n’ulo Jehova n’ihe di ọcha.

21 Ọ bu kwa ufọdu nime ha ka M’gēwere ibu ndi-nchu-àjà na ibu ndi Livai, ka Jehova siri.

22 N’ihi na dika elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke Mu onwem nēme, ganēguzo n’irum, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), otú a ka nkpuru-unu na aha-unu gēguzo.

23 Ọ gēru kwa, na site n’otù ọnwa ọhu rue ọnwa ọhu ọzọ, na site n’otù ubọchi-izu-ike rue ubọchi-izu-ike ọzọ, anu-aru nile, bú madu, gābia ikpọ isi ala n’irum, ka Jehova siri.

24 Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n’ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.