Categories
AISAIA

AISAIA 51

1 Genum nti, unu ndi nāb͕aso ezi omume, ndi nāchọ Jehova: legidenu oké nkume anya nke esiri waputa unu, legide-kwa-nu ọnu olùlù nke esiri gwuputa unu.

2 Legidenu Abraham, bú nna-unu, legide kwa Sera nke muputara unu: n’ihi na -o bu mb͕e ọ bu nání otù onye ka M’kpọrọ ya, M’we gọzie ya, me ka ọ ba uba.

3 N’ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma.

4 Ṅanum nti, unu ndim; unu kwa mba nkem, gēnum nti: n’ihi na otù iwu gēsi n’ọnum puta, M’gēme kwa ka ikpém nwe ọnọdu ka ọ buru ìhè nke ndi nile.

5 Ezi omumem di nso, nzọputam aputawo, ogwe-akam abua gēkpe ndi nile ikpe; agwe-etiti nile gēle anyam, ọ bu ogwe-akam ka ha gēchere.

6 Welienu anya-unu le elu-igwe, legide-kwa-nu uwa di n’okpuru: n’ihi na elu-igwe gāpu n’anya dika anwuru-ọku, uwa gāka kwa nká dika uwe, ndi bi ya gānwu kwa dika anwu ntà: ma nzọputam gādiru mb͕e ebighi-ebi, agaghi-ebibi kwa ezi omumem.

7 Genum nti, unu ndi mara ezi omume, bú ndi ahu nke iwum di n’obi-ha; unu atula egwu ita-uta madu, unu atu-kwa-la ujọ nkwulu nile ha.

8 N’ihi na nla gērichapu ha dika uwe, aruru gērichapu kwa ha dika aji-anu: ma ezi omumem gādiru mb͕e ebighi-ebi, nzọputam gādiru kwa ọb͕ọ nile.

9 Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n’ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri?

10 Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke meworo ka oké osimiri tasia, bú miri nke ob͕u-miri riri nne; nke meworo ebe nile miri emi nke oké osimiri ka ọ ghọ uzọ ndi emeworo ka ha nwere onwe-ha gēsi gabiga?

11 Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n’isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.

12 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;

13 i we chezọ Jehova Onye meworo gi, Onye nēseti elu-igwe, tọ kwa ntọ-ala uwa: i we tua oké egwu mb͕e nile ogologo ubọchi nile n’ihi ọnuma nke onye-nkpab͕u, mb͕e o doziri àkú ibibi? ma òle ebe ọnuma nke onye-nkpab͕u ahu di?

14 Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n’olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ.

15 Mu onwem bu kwa Jehova Chineke-gi, Onye nēme ka oké osimiri dere du, mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

16 M’we tiye okwum nile n’ọnu-gi, ọ bu kwa na ǹdò akam ka M’kpuchiworo gi, iku elu-igwe dika ihe-ọkukú, na itọ ntọ-ala nke uwa, na isi Zaion, Ndim ka i bu.

17 Teta, teta, bilie Jerusalem, nke siworo n’aka Jehova ṅua iko nke ọnuma-Ya; ọkwa ahu, bú iko nke isu-ngọngọ, ka i ṅuworo, ṅusia.

18 Ọ dighi onye-ndú o nwere n’etiti umu-ndikom nile ọ muworo: ọ dighi kwa onye nējide aka-ya n’etiti umu-ndikom nile o meworo ka ha tozue okè.

19 Ihe abua ndia adakwasiwo gi; ebere o nwere n’aru gi? nbibi na ntikpọ na oké unwu na mma-agha: M’gēsi aṅa kasie gi obi?

20 Umu-gi ndikom atubọwo atubọ, dina ala n’isi èzí nile, dika anigọ mara n’ọnyà; ha bu ndi juputara n’ọnuma Jehova, na ibasi-nba-ike Chineke-gi.

21 N’ihi nka, biko, nuru nka, gi nwanyi ewedara n’ala, nke ihe nēb͕u kwa, ma ọ bughi manya-vine:

22 otu a ka Onye-nwe-gi siri, bú Jehova, na Chineke-gi Nke nēkpe ọnu ndi-Ya n’ikpe, Le, ewepuwom n’aka-gi iko nke isu-ngọngọ, bú ọkwa ahu nke bu iko nke ọnumam; i gaghi-aṅu kwa ya ọzọ:

23 ma M’gētiye ya n’aka ndi nēmekpa gi aru; ndi siri nkpuru-obi-gi, Ruda n’ala, ka ayi we gabiga: i we me ka azu-gi di ka ala na dika èzí nye ndi nāgabiga.

Categories
AISAIA

AISAIA 52

1 Teta, teta, yiri ike-gi dika uwe, gi Zaion; yiri uwe-gi nile mara nma, gi Jerusalem, bú obodo nsọ: n’ihi na onye nēbighi úgwù na onye ruru árú agaghi-abata kwa nime gi ọzọ site n’ub͕u a.

2 Rurupu onwe-gi, si n’ájá puta; bilie, nọdu ala, Jerusalem; tọpu onwe-gi ab͕u di n’olu-gi, gi ada Zaion adọtara n’agha.

3 N’ihi na otú a ka Jehova siri, N’efu ka erere unu; ọ bughi kwa ego ka agēji b͕aputa unu.

4 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ bu Ijipt ka ndim ridaruru na mbu inọ n’ebe ahu dika ọbìa: Asiria kwa, n’efu ka ọ meb͕uru ha.

5 Ma ub͕u a, gini ka M’nwere ebe a, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ewepuwo ndim n’efu? ndi nāchi ha nākwasi ákwá ike, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ọ bu kwa mb͕e nile n’ogologo ubọchi nile ka anēlelì aham.

6 N’ihi nka ka ndim gāmara aham: n’ihi nka ka ha gāmara n’ubọchi ahu na Mu onwem bu Onye ahu Nke nēkwu okwu; lekwam.

7 Le, ka ha si ma nma nke-uku n’elu ugwu, bú ukwu nke onye nēzisa ozi ọma, bú onye nēme ka anuru okwu udo, onye nēzisa ozi ọma nke ezi ihe, onye nēme ka anuru okwu nzọputa; onye nāsi Zaion, Chineke-gi bu eze!

8 Nuru olu ndi-nche-gi! ha eweliwo olu-ha, n’otù ka ha nētikọ nkpu ọṅù; n’ihi na anya na anya ka ha gāhu mb͕e Jehova nālaghachikute Zaion.

9 Tiwanu nkpu ọṅù, tienu nkpu ọṅù n’ọtù, unu nkpọnkpọ ebe nke Jerusalem: n’ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ b͕aputawo Jerusalem.

10 Jehova ab͕abawo ogwe-aka-Ya di nsọ ọtọ n’anya mba nile; nsọtu nile nke uwa we hu nzọputa nke Chineke-ayi.

11 Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n’ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n’etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova.

12 N’ihi na ọ bughi na ngwa ka unu gāpu, ọ bughi kwa na nb͕alaga ka unu gēje: n’ihi na Onye nāga n’iru unu bu Jehova; ọzọ, Onye nāga n’azu unu bu Chineke Israel.

13 Le, orùm gēnwe uche, ọ gādi elu, agēbuli kwa ya, o we di elu nke-uku.

14 Dika ibobo gi si anwu ọtutu madu n’aru, (le ka iru-ya si buru ihe bibiri ebibi nke-uku kari onye ọ bula, udi-aru-ya kwa kari umu madu!)

15 otú a ka ọ gēfesa ọtutu mba ọbara; n’ihi ya ka ndi-eze gēkpuchi ọnu-ha: n’ihi na ihe nke anākọghi nye ha ka ha huworo; ọ bu kwa ihe nke ha nāhughi ka ha ghọtaworo.

Categories
AISAIA

AISAIA 53

1 Ònye kwere ihe ayi nuworo? ogwe-aka Jehova kwa, n’àru onye ka ekpugheworo ya?

2 N’ihi na o tolitere n’iru Ya dika ome, na dika nkpọrọgwu nke putara n’ala kpọrọ nku: ọ dighi udi-aru oma ọ nwere, ọ dighi kwa ima-nma; ayi we hu ya, ma ọ maghi nma n’ile ya anya nke ayi gēji chọsie ya ike.

3 Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n’ihe.

4 N’ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n’onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n’ala.

5 Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n’ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n’aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike.

6 Ayi nile kpafuru akpafu dika ìgwè aturu: ayi chere iru, onye ọ bula n’uzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya.

7 Achiri ya n’ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n’ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n’ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n’iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.

8 Site na nmeb͕u, site kwa n’ikpé, ka ewepuru ya: ma ndi ọb͕ọ-ya, ònye n’etiti ha nātughari n’obi na ebipuru ya n’ala ndi di ndu? site na njehie nke ndim ka ihe-otiti diri ya.

9 Ewe me ka ílì-ya di n’etiti ndi nēmebi iwu, ya na ọgaranya nọ kwa n’ọnwu-ya; ọ bu ezie na ọ dighi ihe-ike o mereri, ọ dighi kwa aghughọ di n’ọnu-ya.

10 Ma ọ tọrọ Jehova utọ izọpia ya; O mewo ka ọ ria ọria: ọ buru na nkpuru-obi-ya achu àjà-ikpe-ọmuma, ọ gahu nkpuru-ya, me ka ubọchi-ya nile di ogologo, ihe nke nātọ Jehova utọ gāga kwa nke-ọma n’aka-ya.

11 Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n’ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa.

12 N’ihi nka ka M’gēkère ya òkè n’etiti ndi bara uba, o gēso kwa ndi nwere ume kèsa ihe ọ kwatara n’agha; n’ihi na ọ b͕apuru nkpuru-obi-ya dika miri nye ọnwu, ọ bu kwa na ndi-njehie ka aguru ya: ma ya onwe-ya bupuru nmehie ọtutu madu, ọ bu kwa ndi-njehie ka ọ nāriọrọ aririọ.

Categories
AISAIA

AISAIA 54

1 Tie nkpu ọṅù, gi nwayi-àgà, bú nwayi nāmughi nwa; tiwa nkpu ọṅù, tisi kwa nkpu ike, gi onye ime nwa nēmegh: n’ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi aluru na nwunye, ka Jehova siri.

2 Me ka ebe ulo-ikwū-gi sa mbara, ka ha seti kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibi-gi nile; eb͕ochila: me ka udọ̀-gi nile di ogologo, me kwa ka ǹtú-gi nile di ike.

3 N’ihi na n’aka-nri na n’aka-ekpe ka i gāb͕asa; nkpuru-gi gēnweta kwa mba di iche iche, ọ bu kwa obodo di iche iche nke tọb͕ọrọ n’efu ka ha gēme ka madu biri nime ha.

4 Atula egwu; n’ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n’ọnọdu-ihere; n’ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n’ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ.

5 N’ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya.

6 N’ihi na Jehova akpọwo gi dika nwanyi arapuru arapu nke o nēwuta kwa ya nime mọ-ya, bú nwunye alutara na nwata, mb͕e ajuru ya, ka Chineke-gi siri.

7 N’otù ntabi-anya di ntà ka M’rapuworo gi arapu; ma obi-ebere nile di uku ka M’gēji chikọta gi.

8 Na nrubiga-ókè nke iwe ka M’zonariri gi irum otù ntabi-anya; ma ebere ebighi-ebi ka M’gēji nwe obi-ebere n’aru gi, ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa-gi, siri.

9 N’ihi na otú miri nke Noa ka nka dirim: n’ihi na dika M’ṅuru iyi, si na miri nke Noa agaghi-erubiga kwa uwa ọzọ, otú a ka M’ṅuworo iyi, si na M’gaghi-ewesa gi iwe, na M’gaghi-abasiri gi nba ike.

10 N’ihi na ugwu nile gāpu n’ọnọdu-ha, agēwezuga kwa ugwu ntà nile n’ọnọdu-ha; ma eberem agaghi-esi n’ebe i nọ pua, agaghi-ewezuga kwa ọb͕ub͕a-ndu nke udo nkem n’ọnọdu-ya, ka Onye nwere obi-ebere n’aru gi siri, bú Jehova.

11 Gi nwanyi ewedara n’ala, nke oké ifufe nēfeghari, nke anākasighi obi, le, Mu onwem gēdo nkume-gi nile n’ihe-ichọ-nma, were nkume sapphire tọ ntọ-ala-gi.

12 M’gēme kwa ka elu akuku ulo-gi nile ghọ nkume ruby, me kwa ka ọnu-uzọ-ama-gi nile ghọ nkume carbuncle, me kwa ka ókè-ala-gi nile ghọ nkume di iche iche anāchọsi ike.

13 Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.

14 N’ezi omume ka agēme ka i guzosie ike: gi nọpu nmeb͕u n’ebe di anya, n’ihi na i gaghi-atu egwu; nọpu kwa ihe-ujọ n’ebe di anya, n’ihi na ọ gaghi-abiaru gi nso.

15 Le, ọ buru na onye ọ bula akpalie ise-okwu megide gi, o siteghi na Mu: onye ọ bula nke kpaliworo ise-okwu n’ebe i nọ gāda ada n’ihi gi.

16 Le, Mu onwem ekèwo uzú nke nāfù ọku icheku, nākpu ihe-ọlu iji lu ọlu nke aka ya; Mu onwem ekèwo kwa onye-nbibi imebi emebi.

17 Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n’ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
AISAIA

AISAIA 55

1 Ge nti, onye ọ bula nke akpiri nākpọ nku, bianu na miri, onye ahu kwa nke nēnweghi ego; bianu, zuru ọka, rie; e, bianu, zuru kwa manya-vine na miri-ara-ehi nējighi ego nārùghi ọnu-ahia.

2 N’ìhi gini ka unu nātù ego inye n’ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n’ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ.

3 Tọnu nti-unu n’ala, biakutem; nurunu, nkpuru-obi-unu ewe di ndu: Mu na unu gāb͕a kwa ndu, bú ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, bú ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid.

4 Le, enyewom ya ka ọ buru onye-àmà nye ndi nile di iche iche, ka ọ buru onye-ndú na onye-iwu nye ndi nile di iche iche.

5 Le, mba nke i nāmaghi ka i gākpọ, mba nke nāmaghi gi gāb͕akute kwa gi, n’ihi Jehova, bú Chineke-gi, ọbuná n’ihi Onye Nsọ nke Israel; n’ihi na O mewo ka i ma nma.

6 Chọnu Jehova mb͕e anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mb͕e Ọ nọ nso:

7 onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu èchìchè-ya nile: ya laghachikute kwa Jehova, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n’aru ya; ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n’ihi na Ọ gāb͕aghara ya nmehie-ya n’uba.

8 N’ihi na èchìchè nkem, ha abughi èchìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abughi uzọm; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

9 N’ihi na dika elu-igwe si di elu kari uwa, otú a ka uzọm nile di elu kari uzọ nile unu, ọ bu kwa otú a ka èchìchèm nile di elu kari èchìchè nile unu.

10 N’ihi na dika oké miri-ozuzọ na snow si esi n’elu-igwe ezo, ma ọ bughi n’ebe ahu ka ọ nālaghachi, ma ọ buru na o bughi uzọ desia ala, we me ka o me ihe-omume, ka o pu kwa ihe-opupú; o we were nkpuru nye ọgha-nkpuru, were kwa nri nye onye nēri ihe;

11 otú a ka okwum di nke nēsi n’ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n’efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n’ihe M’zigara ya.

12 N’ihi na ọṅù ka unu gēji puta, udo ka agēji kwa duru unu: ugwu nile na ugwu ntà nile gētiwa nkpu ọṅù, n’iru unu, osisi nile nke ọhia gāku kwa aka-ha.

13 Nọnọdu ogwu osisi fir gētolite, ọ bu kwa n’ọnọdu nke ka osisi myrtle gētolite: o we ghọrọ Jehova aha, ghọ-kwa-ra Ya ihe-iriba-ama ebighi-ebi nke anāgaghi-ebipu ya.

Categories
AISAIA

AISAIA 56

1 Otú a ka Jehova siri, Debenu ikpé ziri ezi, me-kwa-nu ezi omume: n’ihi na nzọputam di nso ibia, ezi omumem di kwa nso ka ekpughe ya.

2 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye nēme nka na nwa madu nke nējidesi ya ike bu; onye nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nēdebe kwa aka-ya ghara ime ihe ọjọ ọ bula.

3 Ka nwa ala ọzọ nke raparaworo na Jehova ghara ikwu okwu, si, Jehova aghaghi ikewapum na ndi-Ya: ka onozi ghara kwa isi, Le, mu onwem bu osisi kpọnwuru akponwu.

4 N’ihi na otú a ka Jehova siri ndi-onozi ndi nēdebe ubọchi-izu-ikem nile, ndi rọputawo-kwa-ra ihe tọrọm utọ, ndi nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike:

5 M’gēnye, ha n’ulom na nime mb͕idim nile ihe-ncheta na aha di nma kari umu-ndikom, kari kwa umu-ndinyom; aha ebighi-ebi ka M’gēnye ha n’otù n’otù, nke anāgaghi-ebipu.

6 Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n’anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike;

7 M’gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M’gēme kwa ka ha ṅuria n’ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n’elu ebe-ichu-àjàm: n’ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche.

8 Ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi puta, bú Jehova Nke nāchikọta ndi Israel achupuru achupu, Ọ si, Ndi ọzọ di kwa M’gāchikọtara ya, chikọtara ndi-ya achikọtara achikọta.

9 Unu anu ọhia nile, bianu iri ihe, unu anu nile di n’oké ọhia.

10 Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n’anya.

11 Nkita-ya nile nēribiga ihe ókè, ha amaghi afọ-ojuju; ndi ahu bu kwa ndi-ọzùzù-aturu nāmaghi ighọta ihe: ha nile echewo uzọ nke aka ha iru, onye ọ bula ọ che urù-ya iru site n’akuku nile ọ bula.

12 Ha si, Bianu, ka m’weta manya-vine, ka ayi ṅubiga kwa ihe-ọṅuṅu nābà n’anya ókè; echi gādi kwa ka ta, ubọchi di uku gabiga ókè nke-uku.

Categories
AISAIA

AISAIA 57

1 Onye ezi omume nāla n’iyì, ma ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n’obi-ya; anēkpochapu kwa ndi-ebere, mb͕e ọ nādighi onye nāghọta na ekpochapuworo onye ezi omume n’iru ihe ọjọ.

2 Ọ nābà n’udo; ha nēzu ike n’elu ihe-ndina-ya, onye ọ bula nke nāgazi agazi.

3 Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.

4 Ònye ka ọ nātọ unu utọ imegide? ònye ka unu nāsaghepu ọnu mbara, riputasi kwa ire, imegide? ùnu onwe-unu abughi umu njehie, nkpuru okwu-ugha,

5 unu ndi nēme onwe-unu ka unu di ọku n’etiti osisi terebinth, n’okpuru osisi ndu ọ bula; ndi nēb͕u umu-unu na ndagwurugwu nile n’okpuru nb͕awa nke nkume nile di elu?

6 N’etiti nkume kwọrọ murumuru nke miri-iyi ka òkè-gi di; ha onwe-ha, ha onwe-ha bu ihe ruru gi n’ife-nzà: ọ bu kwa ha ka i wusiworo àjà-ihe-ọṅuṅu nye, sure kwa àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma. Àgākasim obi bayere ihe ndia?

7 N’elu ugwu di elu, nke eme-kwa-ra ka ọ di elu, ka i doworo ihe-ndina-gi: ọ bu kwa n’ebe ahu ka i rigoro ichu àjà.

8 Ọ bu kwa n’azu ọnu-uzọ-gi na akuku-ọnu-uzọ-gi ka i doworo ihe-ncheta-gi: n’ihi na mb͕e M’nānọghi ka i kpupuru ihe-ndina-gi, we rigo: i mere ka ihe-ndina-gi sa mbara, we soro ha b͕ara onwe-gi ndu; i huru ihe-ndina-ha n’anya; aka-ha ka i huru.

9 I we were manu jegharikuru eze ahu, i me-kwa-ra manu-otite-gi nēsì ísì utọ ka ha ba uba, i zi-kwa-ra ndi-ukọ-gi n’ebe di anya, i we me onwe-gi ka i di ala rue ala-mọ.

10 N’iba-uba nke uzọ-gi ka ike gwusiri gi; i sighi, Ntukwasi-obi adigh: ndu aka-gi ka i chọtara; n’ihi ya i riaghi ọria.

11 Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n’obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum?

12 Mu onwem gēgosi ezi omume-gi; ma ọlu-gi nile, ha agaghi-abara gi urù.

13 Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm.

14 Ọ gāsi kwa, Tulienu, tulienu, dozienu uzọ, bupunu ihe-isu-ngọngọ n’uzọ ndim.

15 N’ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N’ebe di elu di kwa nsọ ka M’bi, M’biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n’obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.

16 N’ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M’gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M’ganēwe iwe: n’ihi na mọ gāda #mbà n’irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo.

17 N’ihi ajọ omume nke urù-ya ka M’were iwe, we tie ya ihe, nēzobe irum nēwe kwa iwe: o we nāga nēchighari azu n’uzọ nke obi-ya.

18 Uzọ-ya nile ka M’huworo, M’gēme kwa ka aru di ya ike: M’gēdu kwa ya, nyeghachi ya nkasi-obi nile, nyeghachi kwa ndi-ya nēru újú.

19 Anamekè nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu abua: Udo, udo, diri onye nọ n’ebe di anya, di-kwa-ra onye nọ nso, ka Jehova siri; M’gēme kwa ka aru di ya ike.

20 Ma ndi nēmebi iwu di ka oké osimiri nke nāmaghari amaghari: n’ihi na ọ pughi idi jū, miri-ya nāmaputa kwa urọ na apiti.

21 Ọ dighi udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chinekem siri.

Categories
AISAIA

AISAIA 58

1 Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha.

2 Ma Mu ka ha nāchọ kwa-ubọchi, imara uzọm nile nātọ kwa ha utọ: dika mba nke mere ezi omume, nke nārapughi kwa ikpé nke Chineke-ha, ha nāriọm ikpé nile nke ezi omume, ibiaru Chineke nso nātọ ha utọ.

3 Ha si, N’ìhi gini ka ayi būworo ọnu, ma I hughi? n’ìhi gini ka ayi wedaworo nkpuru-obi-ayi n’ala, ma I dighi-ama? Le, n’ubọchi obubu-ọnu-unu unu nāchọputa ihe nātọ unu utọ, ọ bu kwa ihe nile nke putara na ndọb͕u ndi-ọlu-unu nādọb͕u onwe-ha n’ọlu ka unu nānara n’ihe-ike.

4 Le, ọ bu n’ihi ise-okwu na ilu-ọ̀gù ka unu nēbu ọnu, ya na iwere ọkpọ nke nmebi-iwu tib͕ue: unu adighi-ebu ọnu dika ta ime ka anuru olu-unu n’elu.

5 Ọ̀ bu dika nka ka obubu-ọnu nke M’nārọputa bu? bú ubọchi madu gēweda nkpuru-obi-ya n’ala? Ọ̀ bu iruda isi-ya n’ala dika amì, na ib͕asa-ákwà-nkpe na ntu n’okpuru ya? ọ̀ bu nka ka i gākpọ obubu-ọnu na ubọchi nātọ Jehova utọ?

6 Ọ̀ bughi nka bu obubu-ọnu M’nārọputa? itọpu ab͕u nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-ọkiké nile nke yoke, na izilaga ndi anēmeb͕u emeb͕u ka ha nwere onwe-ha, ka unu tiji kwa yoke ọ bula?

7 Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n’ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n’ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?

8 Mb͕e ahu ka ìhè-gi gāwaputa dika ututu, anu-aru ọhu gēpuchi kwa n’aru-gi ngwa ngwa: ezi omume-gi gāga kwa n’iru gi: nsọpuru Jehova gāga n’azu gi.

9 Mb͕e ahu ka i gākpọ òkù, Jehova gāza kwa; i gētiku Ya, Ọ gāsi kwa, Lekwam. Ọ buru na i si n’etiti gi wezuga yoke ahu, na nsetipu nkpisi-aka, na ikwu ajọ ihe;

10 ọ buru kwa na i weputara onye agu nāgu ihe nkpuru-obi-gi chọrọ, ọ buru na i me ka afọ ju nkpuru-obi ewedara n’ala; ìhè-gi gāwa nime ọchichiri, oké ọchichiri-gi gādi kwa ka etiti-ehihie:

11 Jehova ganēdu kwa gi mb͕e nile, me ka afọ ju nkpuru-obi-gi n’ebe nile nkpọrọ nku, Ọ gēme kwa ka ọkpukpu-gi nile di ike; i gādi kwa ha ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma, di kwa ka ebe miri nāsuputa nke miri-ya nādighi-ata ata.

12 Ndi gēsi n’aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi.

13 Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n’ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n’ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi:

14 mb͕e ahu ihe Jehova gātọ gi utọ; M’gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M’gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n’ihi na ọnu Jehova ekwuwo.

Categories
AISAIA

AISAIA 59

1 Le, aka Jehova adighi nkpunkpu kari izọputa; nti-Ya adighi kwa arọ́ kari inu ihe:

2 kama ajọ omume nile unu aghọwo ihe nākpa ókè n’etiti unu na Chineke-unu, nmehie nile unu ezonariwo kwa unu iru-Ya, O we ghara inu.

3 N’ihi na ejiwo ọbara meru aka-unu, ejiwo kwa ajọ omume meru nkpisi-aka-unu; eb͕ub͕ere-ọnu-unu ekwuwo okwu-ugha, ire-unu nātamu ajọ ihe.

4 Ọ dighi onye nākpọ madu eje ikpé n’ezi omume, ọ dighi kwa onye nēji ikwesi-ntukwasi-obi eje ikpé: ha nātukwasi obi n’ihe tọb͕ọrọ n’efu, ha nēkwu kwa okwu-ugha; ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe.

5 Àkwá ubí ka ha buworo, ọ bu kwa ulo ududo ka ha nātu: onye ahu nke nēri àkwá-ha gānwu, ọzọ, nke anāzọpia gāb͕awaputa aju-ala.

6 Ulo-ududo-ha agaghi-aghọ uwe, ha agaghi-eji kwa ọlu di iche iche ha kpuchie onwe-ha: ọlu nile ha bu ọlu ajọ ihe, omume nke ihe-ike di kwa n’aka-ha.

7 Ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: èchìchè nile ha bu èchìchè ajọ ihe; nbibi na ntipia di n’okporo-uzọ nile nke ha.

8 Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n’uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo.

9 N’ihi ya ikpé nke ziri ezi adiwo anya n’ebe ayi nọ, ezi omume adighi-eru kwa ayi aru: ayi nēle anya ìhè, ma le, ọ bu ọchichiri; ayi nēle anya onwunwu-ọku, ma ọ bu n’oké ọchichiri ka ayi nējeghari.

10 Ayi nāsọghari ìsì na mb͕idi dika ndi-ìsì, e, ayi nāsọghari ìsì dika ndi nēnweghi anya: ayi asuwo ngọngọ n’etiti-ehihie dika ọ bu chi-ojiji; n’etiti ndi nwere ezi ndu ayi nọ ka ndi nwuru anwu.

11 Ayi nāb͕ọ uja dika bear, ayi nile, ọ bu kwa dika nduru ka ayi nēkwosi ákwá ike: ayi nēle anya ikpé ziri ezi, ma ọ digh: ayi nēle anya nzọputa, ma ọ di anya n’ebe ayi nọ.

12 N’ihi na njehie-ayi bara uba n’iru Gi, nmehie nile nke ayi azawo kwa megide ayi: n’ihi na ayi na njehie nile ayi nọkọ n’otù; ọzọ, ajọ omume nile ayi, ayi mara ha:

13 njehie, na igọnari Jehova, na isi n’iso Chineke-ayi laghachi azu, na ikwu okwu nmeb͕u na nwezuga, na ime okwu-ugha nile site n’obi-ayi, na ikwuputa ha.

14 Emewo kwa ka ikpe ziri ezi laghachi azu, ezi omume nēguzo kwa n’ebe di anya: n’ihi na ezi-okwu asuwo ngọngọ n’amá, izi-ezi apughi kwa ibata.

15 E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n’ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n’anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi.

16 O we hu na ọ dighi onye ọ bula di; ibobo we nwua Ya n’aru na ọ dighi onye nāriọrọ ayi aririọ: ogwe-aka-Ya we wetara Ya nzọputa; ezi omume-Ya kwa, nke ahu nākwagide Ya.

17 O we yiri ezi omume dika uwe-agha, kpu kwa okpu-agha nzọputa n’isi-Ya; O yiri kwa uwe nile nke ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ha buru uwe-oyiyi-Ya, O were ekworo kpuchie Onwe-ya dika uwe-nwuda.

18 Dika nmeso nile ha si di, otú a ka Ọ gākwughachi, ọnuma ka Ọ gākwughachi ndi nēmegide Ya, nmeso-ha ka Ọ gākwughachi ndi-iro-Ya; Ọ gākwughachi agwe-etiti nile nmeso-ha.

19 Ha gātu kwa egwu aha Jehova site n’Ọdida-anyanwu, tu kwa egwu ebube-Ya site n’ọwuwa anyanwu: mb͕e onye-nkpab͕u gābata dika miri-iyi, Mọ nke Jehova ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya.

20 Otù onye-nb͕aputa gābiaru kwa Zaion, biakute ndi nēsi na njehie chigharia nime Jekob; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

21 Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n’etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n’aru gi, na okwum nile nke M’tiyeworo n’ọnu-gi, agaghi-apu n’ọnu-gi, na n’ọnu nkpuru-gi, na n’ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n’ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
AISAIA

AISAIA 60

1 Bilie, nwue; n’ihi na ìhè-gi abiawo, ebube Jehova awawo kwa n’aru gi dika anyanwu.

2 N’ihi na, le, ọchichiri nēkpuchi kwa ndi nile di iche iche: ma n’aru gi ka Jehova gāwa dika anyanwu, ebube-Ya ka agāhu kwa n’aru gi.

3 Mba nile gējeru kwa ìhè-gi, ndi-eze ejerue onwu-maramara nke ọwuwa-gi.

4 Welie anya-gi abua le buruburu, hu: ha nile achikọtawo onwe-ha, ha abiakutewo gi: umu-gi ndikom gēsi n’ebe di anya bia, agēku kwa umu-gi ndinyom n’akuku-gi.

5 Mb͕e ahu i gāhu we nwue enwu, obi-gi gātu kwa oké egwu, sa mbara; n’ihi na agēchigharikute gi ihe bara uba nke oké osimiri, àkù nke mba di iche iche gābiakute gi.

6 Ìgwè camel gēkpuchi gi, umu-camel nke Midian na Ifa: ha nile gēsi na Sheba bia: ọla-edo na frankincense ka ha gēbute, ọ bu kwa ozi ọma otuto Jehova ka ha gēzisa.

7 Ìgwè ewu na aturu nile nke Kida ka agāchikọtara gi, ebulu nile nke Nebaiot gējere gi ozi: ha gārigota n’ebe-ichu-àjàm dika ihe nātọ utọ, M’gēme kwa ulo nke ima-nmam ka ọ ma nma.

8 Òle ndi bu ndia nke nēfe efe dika igwe-oji, ndi nēfe kwa dika nduru si eferue window-ha?

9 N’ezie Mu ka agwe-etiti nile gēchere, ub͕ọ nile nke Tashish gēbu kwa uzọ, ime ka umu-gi ndikom si n’ebe di anya bia, ha na ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha, ibiakute aha Jehova, bú Chineke-gi, na ibiakute Onye Nsọ nke Israel, n’ihi na O mewo ka i ma nma.

10 Umu ala ọzọ gēwu kwa mb͕idi-gi nile, ndi-eze-ha gēje-kwa-ra gi ozi: n’ihi na n’iwem ka M’tiworo gi ihe, ma na mb͕e ihe-gi nātọm utọ ka M’nweworo obi-ebere n’aru gi.

11 Ọnu-uzọ-ama-gi nile gēghe kwa oghe mb͕e nile; agaghi-emechi ha n’ehihie ma-ọbu n’abali; ka madu we bubatara gi àkù nke mba di iche iche, ndi-eze-ha aburu kwa ndi anēdu edu.

12 N’ihi na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè gi gāla n’iyì; e, aghaghi ime ka mba ahu nile tọb͕ọrọ n’efu.

13 Ebube Lebanon gābiakute gi, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n’otù; ime ka ọnọdu ebe nsọm ma nma, M’gēme kwa ka ọnọdu ukwum abua nwe nsọpuru.

14 Ọzọ, umu nke ndi nēweda gi n’ala gējekuru gi nēruda n’ala; ndi nile nke nēlelì gi anya gākpọ kwa isi ala n’ọbu-ukwu nke ukwu-gi abua; ha gākpọ kwa gi, Obodo Jehova, Zaion nke Onye Nsọ nke Israel.

15 N’onọdu ibu onye arapuru arapu na onye anākpọ asì nke i buworo, nke ọ nādighi onye nāgabiga n’etiti gi, M’gēme gi ka i ghọ nbili-elu ebighi-ebi, na ihe obi-utọ nke ọtutu ọb͕ọ.

16 I gāṅu kwa miri-ara nke mba di iche iche, ọ bu kwa ara ndi-eze ka i gāmi: i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.

17 N’ọnọdu ọla M’gēweta ọla-edo, n’ọnọdu ígwè M’gēweta ọla-ọcha, n’ọnọdu osisi M’gēweta ọla, n’ọnọdu nkume M’gēweta ígwè: M’gēme kwa ka ndi-nlekọta-gi ghọ udo, M’gēme kwa ka ndi nāchi gi n’ihe-ike ghọ ezi omume.

18 Agaghi-anu kwa ihe-ike ọzọ n’ala-gi, agaghi-anu nbibi na ntipia n’ókè-ala-gi nile; ma i gākpọ mb͕idi-gi nile Nzọputa, kpọ kwa ọnu-uzọ-ama-gi nile Otuto.

19 Anyanwu agaghi-abū-kwa-ra gi ìhè ọzọ n’ehihie; ma n’onwu-maramara ọnwa agaghi-enye gi ìhè: ma Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, Chineke-gi gāghọ-kwa-ra gi ima-nma-gi.

20 Anyanwu-gi agaghi-ada kwa ọzọ, ọnwa-gi agaghi-ewepu kwa onwe-ya: n’ihi na Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, ubọchi nile nke iru-újú-gi ewe zue ezu.

21 Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M’ma nma.

22 Onye ntà n’etiti ha gāghọ nnù abua na ọgu iri, onye dikarisiri ntà gāghọ kwa mba nwere ume: Mu onwem, Jehova, gēme ka ọ bia ọsọsọ na mb͕e-ya.