Categories
AISAIA

AISAIA 41

1 B͕anu nkiti gem nti, unu agwe-etiti; ka ndi nile di iche iche b͕anwe kwa ike-ha: ka ha biarue nso; ka ha kwue okwu: ka ayi biarue onwe-ayi nso ikpe ikpe.

2 Ònye kpọteworo otù onye site n’ọwuwa-anyanwu, onye Ọ kpọrọ n’ezi-omume ibiarute ukwu-Ya? Ọ nēwere mba di iche iche nye n’iru ya, Ọ nēme kwa ya ka ọ nwe ike n’aru ndi-eze: O nēwere ha nye mma-agha-ya dika ájá, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke anēfepu efepu, otú a ka Ọ nēwere ha nye uta-ya.

3 Ọ nāchu ha, gabiga n’udo; o jighi ukwu-ya abà n’uzọ.

4 ònye luworo ya, me ya, nākpọ ọb͕ọ nile site na mb͕e mbu? Ọ bu Mu onwem, bú Jehova, Onye mbu, Nke nọye-kwa-ra ndi ikpe-azu, Mu onwem bu Onye ahu.

5 Agwe-etiti nile huru, we tua egwu; nsọtu nile nke uwa nāma jijiji: ha biaruru nso, we bia.

6 Ha yeritara onwe-ha aka n’otù n’otù; onye ọ bula nime ha nāsi nwa-nne-ya, Di ike.

7 Onye-ọ̀kà we me ka onye-nnucha-ọla di ike, onye ji otùtù akwọ ihe murumuru mere ka onye nētù osiama di ike, nēkwu okwu bayere nkpukọta, si, Nke ahu di nma: o were ǹtú kpọgidesi ya ike ka ewe ghara iwezuga ya n’ọnọdu-ya.

8 Ma gi onwe-gi, Israel, orùm, Jekob onye M’rọputara, nkpuru Abraham, bú onye nāhum n’anya;

9 gi onye M’jidesiworo ike site na nsọtu nile nke uwa, ọ bu kwa n’akuku-ya nile ka M’kpọputara gi, we si gi, Orùm ka i bu, arọputawom i, ajughm i aju:

10 atula egwu, gi ka M’nọyere: elela anya buruburu n’ujọ, n’ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M’gāb͕a gi ume; e, M’gēyere gi aka; e, M’gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.

11 Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n’aru gi, agētiye ha n’ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n’iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.

12 I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha.

13 N’ihi na Mu onwem, Jehova, Chineke-gi, nējidesi aka-nri-gi ike, bú Onye nāsi gi, Atula egwu, Mu onwem eyeworo gi aka.

14 Atula egwu, gi idide, bú Jekob, unu ndikom Israel; Mu onwem eyeworo gi aka, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, ọzọ, Onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel.

15 Le, emewom ka i ghọ ihe-nkpọre eji azọcha ọka, bú ihe di nkọ di ọhu nwere ezé: i gāzọcha ugwu, zọpia ha, i gēme kwa ugwu ntà ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka.

16 I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n’Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi.

17 Ndi ewedara n’ala na umu-ob͕eye nāchọ miri ma ọ dighi nke dinu, ire-ha kpọsiri nku n’ihi akpiri kpọrọ nku; Mu onwem, bú Jehova, gāza ha, Mu, bú Chineke Israel, M’gaghi-arapu ha.

18 M’gākwaghe osimiri n’elu ugwu di iche iche ọhia nādighi, na isi-iyi n’etiti ndagwurugwu di iche iche: M’gēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, me kwa ka ala ọkpọ-nku ghọ ebe miri nāsuputa.

19 M’gāku n’ọzara osisi cedar na osisi acacia na osisi myrtle na osisi manu; M’gāmakọta n’ala ihe nādighi osisi fir na osisi pine na osisi cypress:

20 ka ha we hu, mara, tukwasi obi, nwe uche ighọta n’otù, na aka Jehova mere nka, na Onye Nsọ nke Israel kère ya.

21 Wetanu okwu-ikpe-unu nso, ka Jehova nāsi; butenu ihe nile unu dabere nso, ka Eze Jekob nāsi.

22 Ka ha bute ha nso, gosi ayi ihe ahu nke gēme: gosinu ihe nile emere na mb͕e mbu, ihe ha bu, ka ayi we tukwasi ha obi-ayi, we mara ikpe-azu-ha; ma-ọbu menu ka ayi nuru ihe ahu nile nke nābia.

23 Gosinu ihe ahu nile gābia n’ọdi-n’iru, ka ayi we mara na chi ka unu bu: e, menu ezi ihe, ma-ọbu menu ihe ọjọ, ka ayi we lerita onwe-ayi anya gburugburu n’ujọ, hu ya n’otù.

24 Le, unu onwe-unu sitere n’ihe nābughi ihe, ọlu-unu site-kwa-ra n’ihe-efu: ihe-árú ka onye nārọputa unu bu.

25 Akpọtewom otù onye site n’Ugwu, o we bia, otù onye site n’ọwuwa-anyanwu nke gākpọku aham: ọ gābiakwasi kwa ndi nọchiri anya eze dika agāsi na ha bu urọ, na dika ọkpu-ite si azọ ájá.

26 Ònye gosiworo ya site na mbu, ka ayi we mara? na site na mb͕e gara aga, ka ayi we si, Ọ bu onye ezi omume? e, ọ dighi onye nēgosi, e, ọ dighi onye nēme ka ayi nuru, e, ọ dighi onye nānu okwu-ọnu-unu.

27 Abum onye mbu isi Zaion, Le, le ha: M’gēnye kwa Jerusalem onye nēzisa ozi ọma.

28 M’we le, ma ọ dighi onye M’huru; n’etiti ndia kwa, ma ọ dighi onye-ndum-ọdu di, ka M’we jua ha ajuju, ha we zaghachim okwu.

29 Le, ha nile bu ajọ ihe; ihe-efu ka ọlu nile ha bu: ifufe na ebe tọb͕ọrọ n’efu ka arusi nile ha awuru awu bu.

Categories
AISAIA

AISAIA 42

1 Le orùm, onye M’nējide aka; onye nkem M’rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o

2 Ọ gaghi-eti nkpu, ọ gaghi-eweli kwa olu-ya elu, Ọ gaghi-eme kwa ka anu olu-ya n’èzí.

3 Ọ gaghi-akpaji amì apiara apia, ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nēnwu inyoghi-inyogh: n’ezi-okwu ka ọ gēme ka ikpé puta.

4 Ọ gaghi-enwu inyoghi-inyoghi, agaghi-apia kwa ya apia n’obi, rue mb͕e o gēdowori ikpé n’uwa; ọ bu kwa iwu-ya ka agwe-etiti nile gēchere.

5 Otú a ka Chineke, bú Jehova, siri, bú Onye kèworo elu-igwe, seti kwa ha; Onye meworo uwa na ihe nile nke si nime ya aputa ka ọ sa mbara; Onye nēnye ndi bi n’elu ya ume ha nēku, Onye nēnye kwa ndi nējeghari nime ya mọ:

6 Mu onwem, bú Jehova, akpọwo gi n’ezi omume, M’gējide kwa aka-gi, chebe gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ka i buru kwa ìhè nke mba nile;

7 imeghe anya nile kpuru ìsì, ime ka onye-nkpọrọ si n’ebe emechibidoworo ya puta, ime ka ndi nānọdu n’ọchichiri si n’ulo-nkpọrọ puta.

8 Mu onwem bu Jehova; nke ahu bu aham: M’gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum, M’gaghi-enye kwa arusi di iche iche apiri api otutom.

9 Ihe mbu, le, ha abiawo, ọ bu kwa ihe ọhu di iche iche ka Mu onwem nēgosi: tutu ha epue anameme ka unu nuru ha.

10 Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n’oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.

11 Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n’elu ugwu nile tisie nkpu ike.

12 Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n’agwe-etiti nile.

13 Jehova gāputa dika dike; dika onye-agha ka Ọ gākpọte ekworo: Ọ gēti nkpu agha, e, Ọ gēti oké nkpu agha; n’imegide ndi-iro-Ya ka Ọ nēme Onwe-ya dike.

14 Edebewom ọnum du site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; anamab͕a nkiti, jisie onwem ike: dika nwanyi ime neme, otú a ka M’gāsu, udè, ku ume ngwa ngwa, Kusie ume ike n’otù.

15 M’gēme ugwu na ugwu ntà ka ha kọ akọ, ihe-ọkukú-ha nile ka M’gēme kwa ka ọ kpọnwua; M’gēme kwa osimiri ka ha ghọ agwe-etiti, me kwa ka ọ̀dọ-miri nile takọ.

16 M’ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n’uzọ ha nāmaghi; n’okporo-uzọ ha nāmaghi ka M’gēme ka ọchichiri buru ìhè n’iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M’gēme, M’gaghi-arapu kwa ha.

17 Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha nke-uku, bú ndi nātukwasi arusi nile apiri api obi, ndi nāsi arusi awuru awu, Unu onwe-unu bu chi-ayi.

18 Unu ndi nti chiri, nurunu; unu ndi-ìsì kwa legidenu anya, ka unu we hu uzọ.

19 Ònye kpuru ìsì, ma-ọbughi orùm, ma-ọbu ònye ka nti chiri, dika onye-ozim M’nēziga? ònye kpuru ìsì dika onye Mu na ya di n’udo, ma-ọbu ònye kpuru ìsì dika orù Jehova?

20 I huwo ọtutu ihe, ma i dighi-ariba ama; nti-ya abua ghere oghe, ma ọ dighi-anu ihe.

21 Ọ tọrọ Jehova utọ, n’ihi, ezi omume-Ya, ime ka iwu-Ya di uku, na ime ka ọ di ebube.

22 Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n’agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n’ib͕udu n’olùlù, ha nile, ọ bu kwa n’ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n’agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi.

23 Ònye n’etiti unu gēge nti na nka? ònye gāṅa nti, we nu ihe n’ọdi-n’iru?

24 Ònye were Jekob nye ka ọ ghọ ihe apunaraworo madu, were Israel nye ndi nāluta ihe n’agha? ọ̀ bughi Jehova? bú Onye ayi mehieworo megide, Onye ha nēkweghi kwa eje ije n’uzọ-Ya nile, ha egeghi kwa nti iwu-Ya.

25 O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.

Categories
AISAIA

AISAIA 43

1 Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n’ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n’aha-gi, nkem ka i bu.

2 Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M’gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n’ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku.

3 N’ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, na Onye Nsọ nke Israel, na onye-nzọputa-gi; enyewom Ijipt ka ọ buru ihe-nb͕aputa-gi, enyewom Etiopia na Seba n’ọnọdu gi.

4 Ebe i ghọworo ihe di oké ọnu-ahia n’anyam, ebe asọpuruwo-kwa-ra gi, ebe Mu onwem huwokwara gi n’anya; ya mere M’gēnye madu n’ọnọdu gi, nye kwa ndi di iche iche n’ọnọdu ndu-gi.

5 Atula egwu; n’ihi na gi ka M’nọyere: M’gēme ka nkpuru-gi si n’Ọwuwa-anyanwu bia, M’gēsi kwa n’Ọdida-anyanwu chikọta gi;

6 M’gāsi Ugwu, Nye; si kwa Ndida, Eb͕ochila: me ka umum ndikom si n’ebe di anya bia, gi me kwa ka umum ndinyom si na nsọtu uwa bia;

7 onye ọ bula nke anākpọ n’aham, nke M’kèwo-kwa-ra nye nsọpurum; akpuwom ya; e, emewom ya.

8 Me ka ndi kpuru ìsì nwere anya abua puta, ha na ndi nti chiri ma ha nwere nti.

9 Achikọtawo mba nile n’otù, kpọkọta kwa ndi nile di iche iche: ònye n’etiti ha gēgosi nka, me ka ayi nuru ihe mbu nile? Ka ha weputa ndi-àmà-ha, ka ewe gua ha na ndi ezi omume: ma-ọbu ka ha nuru, si, Ezi-okwu.

10 Unu onwe-unu bu ndi-àmàm, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, na orùm nke M’rọputara: ka unu we mara, kwerem, ghọta na Mu onwem bu Onye ahu: ọ dighi chi ọzọ eburu Mu onwem uzọ kpu, ma ọ bu nke gēsom n’azu.

11 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Jehova; ọ dighi kwa onye-nzọputa di ma-ọbughi náním.

12 Mu onwem egosiwo, zọputa kwa, me kwa ka anuru, ọ dighi kwa chi ala ọzọ di n’etiti unu: unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm, Ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, Mu onwem bu kwa Chineke.

13 Ọzọ, site n’ubọchi ta Mu onwem bu Ya; ọ dighi kwa onye nānaputa n’akam: anamalu ọlu, ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu?

14 Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n’ihi unu ka M’ga-eziga ozi na Babilon, M’gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n’ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.

15 Mu onwem bu Jehova, Onye Nsọ unu, na Onye kèworo Israel, na Eze-unu.

16 Otú a ka Jehova siri, bú Onye ahu Nke nākwa uzọ n’oké osimiri na okporo-uzọ nime miri di ike;

17 Nke nēme ka ub͕ọ-ala na inyinya na usu-ndi-agha na dìnkpà puta; n’otù ka ha nēdinakọta, ha agaghi-ebili; ha anyu a, dika ogho-oriọna ka emenyuworo ha emenyu:

18 Unu echetala ihe mbu nile, unu atughari-kwa-la ihe nile nke mb͕e ochie n’obi.

19 Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M’gēme ka uzọ di n’ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n’ala tọb͕ọrọ n’efu.

20 Anu ọhia gāsọpurum, bú nkita-ọhia na enyi-nnunu: n’ihi na enyewom miri n’ọzara na osimiri di iche iche n’ala tọb͕ọrọ n’efu, ime ka ndim ṅua, bú ndi M’rọputara:

21 ndi M’kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.

22 Ma ọ bughi Mu ka i kpọkuworo, Jekob; kama ikem agwuwo gi, Israel.

23 I kpughi aturu nke àjà-nsure-ọku-gi nile biakutem; i jighi kwa àjà-gi nile sọpurum. Ejighm onyinye-inata-iru-ọma me ka i fè òfùfè, ejighkwam frankincense me ka ike gwu gi.

24 I jighi ego zutaram uda calamus, i jighi kwa abuba nke àjà-gi nile me ka afọ jubigam ókè: kama i jiwo nmehie-gi nile me ka M’fè òfùfè, i jiwo ajọ omume-gi nile me ka ike gwum.

25 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n’ihi Mu onwem; M’gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.

26 Chetaram; ka ayi kpekọ ikpe: gi onwe-gi kọ akukọ-gi, ka ewe gua gi n’onye ezi omume.

27 Nna-gi mbu mehiere, ndi-nsughari-gi ejehiewo kwa megidem.

28 M’gēme kwa ndi-isi di nsọ ka ha ghara idi nsọ, nye kwa Jekob ka ọ buru ihe ewezugara ka ebibie ya, nye kwa Israel ka ọ buru ihe-nkwulu.

Categories
AISAIA

AISAIA 44

1 Ma ub͕u a, nuru, Jekob, bú orùm; nuru kwa, Israel, nke M’rọputara:

2 Otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Onye kpuwo-kwa-ra gi site n’afọ nne-gi, Nke nēyere gi aka; Atula egwu, gi orùm, bú Jekob; na gi, Jeshurum, nke M’rọputara.

3 N’ihi na M’gāwukwasi miri n’aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n’ala-akọrọ: M’gāwukwasi Mọm n’aru nkpuru-gi, na ngọzim n’aru umu i muru:

4 ha ewe pue n’etiti ahihia, dika osisi willow n’akuku iyi juputara na miri.

5 Otù onye gāsi, Onye Jehova nwere ka m’bu; onye ọzọ gākpọ onwe-ya n’aha Jekob; onye ọzọ gēdekwasi n’aka-ya, Onye Jehova nwere, ọ gēji kwa aha Israel tue onwe-ya aha.

6 Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.

7 Ọ̀ bu kwa onye, dika Mu onwem, nākpọ, nēgosi ya, nēdorom ya n’usoro, site na mb͕e M’doro ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga? ihe nile nke gādi n’iru, na nke gābia, ka ha gosi ha.

8 Unu atula oké egwu, unu ama-kwa-la jijiji: ọ̀ bughi site na mb͕e gara aga ka M’meworo ka i nuru, gosi kwa gi ya? unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm. Ọ̀ di Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem? é-è, ọ dighi Oké Nkume ọ bula di; ọ dighi otù efu M’mara.

9 Ndi n-akpu arusi apiri api, ha nile bu ihe tọb͕ọrọ n’efu; ihe nile anāchọsi nke ha agaghi-aba urù: ndi-àmà-ha kwa, ha onwe-ha adighi-ahu uzọ, ha adighi-ama kwa; ka ihere we me ha.

10 Ònye kpuworo chi, ma-ọbu wua arusi apiri api nke nābaghi urù ma-ọli?

11 Le, ihere gēme ndi ejikọtara ya na ha; ndi-ọ̀kà kwa, ha onwe-ha bu ihe zara madu: ka ha chikọta onwe-ha, ha nile, ka ha ọtọ; ha gātu oké egwu, ihere gēme ha n’otù.

12 Uzú nākpu ihe-ọlu, o were icheku alu, were kwa otùtù-ya nile akpu ya, were kwa ogwe-aka-ya di ike alu ya: ọzọ, agu nāgu ya, ike we ghara idi; ọ ṅughi miri, o we da #mbà.

13 Onye-ọ̀kà n’osisi nēseti eriri; ọ nēwere pencil kà ya; o were nkpu-ya nile akpucha ya, were kwa compass-ya kà ya, o we me ya ka ọ di ka ihe-atù nwoke, dika ima-nma nke madu, ibi n’ulo.

14 Ọ nēb͕uturu onwe-ya osisi cedar di iche iche, were kwa osisi holm na osisi oak, ọ nēme-kwa-ra onwe-ya otù osisi nētiti osisi nile nke oké ọhia ka o nwe ume: ọ kuwo osisi fir, miri-ozuzo nēme kwa ka o bùe ibù.

15 Ọ gābu-kwa-ra madu ihe isure ọku; o we were ufọdu nime ha, nya ọku; e, ọ funwue ya, we sie achicha: e, ọ nāpi chi, we kpọ isi ala nye ya; o mewo ya arusi apiri api, we da kpue iru n’ala n’iru ya.

16 Nkera-ya ka o sureworo n’ọku; o ji nkera-ya eri anu; ọ nāru anu-ọruru, we rijue afọ: e, ọ nānya ọku we si, Ehe, aru ekpowom ọku, ahuwom ọku:

17 ma nke fọduru nime ya ka o meworo ka ọ ghọ chi, ọbuná arusi ya-akiri-api: ọ nāda kpu iru n’ala n’iru ya, nākpọ kwa isi ala, nēkpere ya, si Naputam; n’ihi na chim ka i bu.

18 Ha amaghi, ha adighi-aghọta kwa: n’ihi na O techiwo anya-ha, ha we ghara ihu uzọ; O techiwo obi-ha, ha we ghara inwe uche.

19 Ọ dighi kwa onye nēchetara obi-ya, ọ dighi kwa ihe-ọmuma maọbu nghọta di isi, Nkera-ya ka m’sureworo n’ọku; ọzọ kwa, esiwom achicha n’elu icheku-ọku-ya nēre ere; anamaru anu rie: #m’gēme kwa nke fọduru nime ya ka ọ ghọ ihe-árú? ọ̀ bu n’iru ogwe osisi ka m’gāda kpue iru n’ala?

20 Ọ bu onye ji ntu azù onwe-ya: obi akwara emò ewezugawo ya, o we ghara inaputa nkpuru-obi-ya, ma ọbu isi, Ọ̀ bughi okwu-ugha, bú ihe di n’aka-nrim?

21 Cheta ihe ndia, Jekob; gi Israel kwa, n’ihi na orùm ka i bu: akpuwom i; orù M’nwere ka i bu: Israel, M’gaghi-echezọ gi.

22 Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n’ihi na ab͕aputawom i.

23 Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n’ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n’ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n’Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma.

24 Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye kpuworo gi site n’afọ nne-gi: Mu onwem bú Jehova, Onye nēme ihe nile; Onye náním nēseti elu-igwe; Onye nāb͕asa uwa; ọ̀ bu onye ka Mu na ya nọ?

25 abum Onye nēmebi ihe-iriba-ama nile nke ndi-ekwukwu, M’nēme kwa ka ndi nāju ase wi ara; abum Onye nēme ka ndi mara ihe laghachi azu, M’nēme kwa ka ihe-ọmuma-ha ghọ ihe-nzuzu:

26 abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M’gēwuli kwa:

27 Onye ahu Nke nāsi ob͕u-miri, Takọ; osimiri-gi nile ka M’gēme kwa ka ha tachasia:

28 Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n’ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n’isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.

Categories
AISAIA

AISAIA 45

1 Otú a ka Jehova siri onye-Ya etere manu, bú Sairọs, onye M’jideworo aka-nri-ya, izọda mba di iche iche n’iru ya, ọ bu kwa úkwù ndi-eze ka M’gēkepu; imeghe uzọ n’iru ya, agaghi-emechibido kwa ọnu-uzọ-ama;

2 Mu onwem gāga n’iru-gi, me ka nkputankpu ebe nile guzozie: ibo-ọnu-uzọ ọla nile ka M’gētiwa, ihe-ntuchi ígwè nile ka M’gēb͕ujipu kwa:

3 M’gēnye kwa gi àkù nke ọchichiri, na àkù zoro ezo nke ebe nzuzo di iche iche, ka i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye ahu Nke nākpọ gi n’aha-gi, ọbuná Chineke Israel.

4 N’ihi orùm, bú Jekob, na Israel nke M’rọputara, ka M’nākpọ gi n’aha-gi: anametu gi aha, ọ bu ezie na i maghm.

5 Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di; ma ewezuga náním ọ dighi Chineke ọ bula di: M’nēke gi ihe-ọkiké n’úkwù, ọ bu ezie na i maghm:

6 ka ha we mara site n’ọwuwa anyanwu, site kwa n’Ọdida-anyanwu, na ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli ma ewezuga náním: Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di.

7 Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.

8 Unu elu-igwe, nātasinu ezi omume site n’elu, ka mbara-ígwé nile nēzoda kwa ezi omume dika miri: ka ala meghe onwe-ya, ka ha we mia nzọputa dika nkpuru, ka o me kwa ezi omume ka ọ pukọ n’otù; Mu onwem, bú Jehova, ekèwo ya.

9 Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?

10 Ahuhu gādiri onye nāsi nna-ya, Gini ka i nāmu? nke nāsi kwa nwanyi, Ìme gini nēme gi?

11 Otú a ka Jehova siri, bú Onye Nsọ nke Israel na Onye kpuworo ya: Juanum ajuju bayere ihe nile nābia; nyenum iwu bayere umum, ma-ọbu bayere ọlu akam abua.

12 Mu onwem emewo uwa, kè kwa madu n’elu ya: Mu onwem, akam abua setiri elu-igwe, ọ bu usu nile nke ihe-ha M’nyeworo iwu.

13 Mu onwem akpọtewo ya n’ezi omume, ọ bu kwa uzọ-ya nile ka M’gēme ka ha guzozie: onye ahu gēwu obodom, zilaga ndim emereri ka ha je biri n’ala ọzọ, ọ bughi n’ihi ọnu-ahia, ọ bughi kwa n’ihi iri-ngo, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

14 Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n’azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N’ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.

15 N’ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa.

16 Ihere emewo ha, e, etiyewo kwa ha n’ọnọdu-ihere, ha nile: n’otù ka ha lakọworo n’ọnọdu-ihere, bú ndi-ọ̀kà nēb͕u arusi eb͕uru eb͕ubu.

17 Jehova ejiwo nzọputa ebighi-ebi zọputa Israel: ihere agaghi-eme unu, agaghi-etiye kwa unu n’ọnọdu-ihere rue mb͕e nile ebighi-ebi.

18 N’ihi na otú a ka Jehova Nke kèworo elu-igwe siri; Ya onwe-ya bu Chineke: Onye kpuworo uwa, me ya; Ya onwe-ya mere ka o guzosie ike, ọ bughi ihe tọb͕ọrọ n’efu ka Ọ kère ya, ọ bu ka ewe biri nime ya ka Ọ kpuru ya: Mu onwem bu Jehova; ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.

19 Ọ bughi na nzuzo ka M’kwuworo okwu, n’otù ebe nke ala ọchichiri; asighm nkpuru Jekob, Chọnum n’ebe tọb͕ọrọ n’efu: Mu onwem bu Jehova, Onye nēkwu ezi omume, Onye nēgosi ihe di iche iche ziri ezi.

20 Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n’otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.

21 Gosinu, weta-kwa-nu ha nso; e, ka ha b͕akọ ìzù n’otù: ònye mere ka anu ihe a site na mb͕e gara aga? onye sitere na mb͕e ochie gosi ya? ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? ọ dighi kwa Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem; Chineke Nke nēme ezi omume na onye-nzọputa adighi ma ewezuga nání Mu onwem.

22 Chenum iru, ewe zọputa unu, unu nsọtu nile nke uwa: n’ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.

23 Ejiwom Onwem ṅua iyi, otù okwu esiwo n’ọnum puta n’ezi omume, ọ gaghi-alaghachi kwa, si, na Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Mu ka ire nile ọ bula gāṅuru iyi.

24 Nání na Jehova ka ezi omume nile na ike di, (mu ka agwara okwu a): Ya ka madu gābiakute, ihere gēme kwa ndi ahu nile iwe-ha di ọku megide Ya.

25 Na Jehova ka agāgu nkpuru nile nke Israel na ndi ezi omume, ọ bu kwa na Ya ka ha gānya isi.

Categories
AISAIA

AISAIA 46

1 Bel eruruwo ala, Nebo amakpuwo amakpu; arusi nile ha di n’elu anumanu na n’elu anu-ulo: ihe nile unu nēbughariri bu ibu eboro ebo, ha bu ibu eboro anu nāda #mbà.

2 Ha amakpuwo, ruru ala n’otù; ha apughi ime ka ibu wezuga onwe-ya, kama ha onwe-ha alawo na ndọta-agha.

3 Genum nti, unu uio Jekob, na ulo Israel nile fọduru afọdu, unu ndi bu ibu eboro ebo site n’afọ nne-unu, ndi eburu ebu site n’àkpà-nwa:

4 ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n’aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n’aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu.

5 Ònye ka unu gasi na M’yiri ya, na Mu na ya rara nrata, na Mu di ka ya, ka ayi we yie?

6 Ndi ahu ndi nāwufu ọla-edo n’akpa, ndi nātù kwa ọla-ọcha n’ihe-ọtùtù, ha nēgota onye-nnucha-ọla, o we me ya ka ọ buru chi: ha nāda kpu iru n’ala, e, ha nākpọ isi ala.

7 Ha nēbuli ya n’ubu, n’ebu ya, we dọba ya n’ọnọdu-ya, o we guzo; ọ gaghi-esi n’ebe-ya pua: e, madu gētiku ya nkpu, ma ọ gaghi-aza, ọ gaghi-azọputa ya n’ahuhu-ya.

8 Chetanu nka, jisi-kwa-nu ike: menu ka ọ biaghachi n’obi, unu ndi-njehie.

9 Chetanu ihe mbu nile site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: n’ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di; abum Chineke, ọ dighi kwa otù efu di ka Mu onwem;

10 nēgosi ikpe-azu site na mbu, nēgosi kwa ihe nke anēmeghi eme site na mb͕e ochie; nāsi, Ndum-ọdum gēguzosi ike, ọ bu kwa ihe nile nke nātọm utọ ka M’gēme:

11 nēsi n’ọwuwa-anyanwu kpọ udele, nēsi kwa n’ala di anya kpọ onye gēme ndum-ọdum: e, ekwuwom, M’gēme kwa ka o me; ezubewom, M’gēme kwa ya.

12 Genum nti, unu ndi di ike n’obi, ndi nọpuru ezi omume n’ebe di anya:

13 Ewetawom ezi omumem nso, ọ gaghi-adi n’ebe di anya, nzọputam agaghi-anọ kwa ọdù; M’we nye nzọputa nime Zaion, nye kwa Israel ima-nmam.

Categories
AISAIA

AISAIA 47

1 Rida, we nọdu n’ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n’ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n’ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke.

2 Were nkume-igwe-nri gwe utu ọka: kpupu ákwà-nkpuchi-gi, yipu uwe-nwuda-gi, kpughepu ogwe-ukwu-gi, gabiga osimiri di iche iche.

3 Agēkpughe ọtọ-gi, e, agāhu ita-uta-gi: ọ́bọ̀ ka M’gābọ̀, M’gaghi-ezute madu.

4 Onye-nb͕aputa-ayi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya, bú Onye Nsọ nke Israel.

5 Nọdu du, ba n’ọchichiri, gi ada ndi Kaldea: n’ihi na i gāghi-abu onye ha nākpọ, Nwanyi-nwe ala-eze di iche iche.

6 Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M’we nye ha n’aka-gi: i nweghi obi-ebere n’aru ha; n’aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku.

7 I we si, Rue mb͕e ebighi-ebi ka m’gabu nwanyi-nwenu: i we ghara itukwasi ihe ndia n’obi-gi, i chetaghi ikpe-azu-ya.

8 Ma ub͕u a nuru nka, gi nwanyi nēme ka o si tọ gi utọ, gi onye nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n’obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem; m’gaghi-anọ dika nwanyi di-ya nwuru, m’gaghi-ama kwa ọb͕ub͕a-aka-umu:

9 ma ihe abua ndia gābiakute gi n’otù ntabi-anya n’otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n’ọtutu mb͕asi-gi, na n’inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.

10 I we tukwasi obi n’ihe ọjọ gi; i siwo, Ọ dighi onye nāhum; amam-ihe-gi na ihe-ọmuma-gi, nke ahu emewo ka i laghachi azu: i we si n’obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem.

11 Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n’iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.

12 Biko, guzo n’ọlu dibia-nrafu nile i nālu, na n’ọtutu mb͕asi-gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n’ọlu nime ha site na mb͕e i nọ na nwata; eleghi anya i gēnwe ike ibà urù, eleghi anya i geme ka madu ma jijiji.

13 Ike agwuwo gi n’ọtutu ndum-ọdu-gi: biko, ka ha guzo ọtọ, we zọputa gi, bú ndi nēkè elu-igwe, ndi nēlegide kpakpando, ndi nēme ka amara kwa-ọnwa ihe gēme, n’ihe gābiakwasi gi.

14 Le, ha di ka ahihia-ọka kpọrọ nku; ọku erewo ha; ha agaghi-anaputa onwe-ha n’aka ire ọku: ọ bughi icheku-ọku nēre ere iji nya ọku, ọ bughi kwa ọku inọdu n’iru ya.

15 Otú a ka ha diri gi, bú ihe nke i dọb͕uworo onwe-gi n’ọlu nime ha: ndi gi na ha nāzu ahia site na mb͕e i di na nwata awaghariwo, onye ọ bula rue ofè nke ya; ọ dighi onye nāzọputa gi.

Categories
AISAIA

AISAIA 48

1 Nurunu nka, unu ulo Jekob, ndi anākpọ n’aha Israel, ndi siwo-kwa-ra na miri Juda puta; ndi ji aha Jehova aṅu iyi, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha nēhota, ma ọ bughi n’ezi-okwu, ọ bughi kwa n’ezi omume.

2 N’ihi na ha akpọwo onwe-ha ndi sitere n’obodo nsọ, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha dabereworo; Jehova usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

3 Ihe mbu nile site na mb͕e ochie ka M’gosiworo; ọ bu kwa n’ọnum ka ha siri puta, M’we meka anu ha: na mberede ka M’mere ha, ha we me.

4 N’ihi na M’mara na onye siri ike ka i bu, na ọ bu akwara ígwè ka olu-gi bu, na egedege-iru-gi bu kwa ọla;

5 M’we gosi gi ya site na mb͕e ochie; tutu o me emerem ka i nuru: ka i we ghara isi, Arusim emewo ha, ọ bu kwa arusim apiri api na arusim awuru awu nyere ha iwu.

6 I nuwo ya; gi le ihe a nile; unu onwe-unu kwa, ùnu agaghi-egosi ya? Emewom ka i nuru ihe ọhu di iche site n’ub͕u a, bú ihe echebeworo na nzuzo, nke i nāmaghi.

7 Ub͕u a ka ekèworo ha, ọ bughi site na mb͕e ochie; ọzọ, tutu ubọchi ta erue i nughi kwa ha;ka i we ghara isi, Le, amaram ha.

8 Otú ọ di, i nughi; i maghi kwa; site kwa na mb͕e ochie nti-gi egheghi oghe: n’ihi na amaram na i nāghọb͕u nke-uku, ọzọ, Onye nējehie ejehie site n’afọ nne-ya, ka anākpọ gi.

9 N’ihi aham ka M’nēme ka iwem nọ ọdù, ọ bu kwa n’ihi otutom ka M’nēb͕ochi ya n’ebe i nọ, ka M’we ghara ibipu gi.

10 Le, anuchawom i, ma ọ bughi dika ọla-ọcha; arọputawom i n’oké ọku nke iweda-n’ala.

11 N’ihi Mu onwem, n’ihi Mu onwem, ka M’gēme ya; n’ihi na le ka esi me ka aham ghara idi nsọ nke-uku! M’gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum.

12 Gem nti, Jekob, na Israel, bú onye M’kpọworo: Mu onwem bu Onye ahu; Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu.

13 E, akam atọwo ntọ-ala uwa, ọ bu kwa aka-nrim setipuworo elu-igwe: ọ buru na Mu onwem akpọ ha gēguzo ọtọ n’otù.

14 Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n’etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n’anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.

15 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, ekwuwo okwu; e, akpọwom ya: emewom ka ọ bia, ọ gēme kwa ka ije-ya ga nke-ọma.

16 Biakutenum nso, nurunu nka; site na mb͕e mbu ọ bughi na nzuzo ka M’kwuworo okwu; site na mb͕e ọdidi-ya, n’ebe ahu ka M’nọ: ma ub͕u a Onye-nwe-ayi Jehova ezitewom, mu na Mọ-Ya.

17 Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye Nsọ Israel: Mu onwem bu Jehova, Chineke-gi, Onye nēzí gi ime ihe nābà úrù, Onye nēme ka i zọ ije n’uzọ i gējeso.

18 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i ṅarari nti n’ihe nile M’nyere n’iwu! udo-gi ewe diwori ka osimiri, ezi omume-gi adi kwa ka nmali-miri nile nke oké osimiri:

19 nkpuru-gi gādiwo-kwa-ri ka ájá, umu nke si n’afọ-gi puta di ka umu-ihe si n’afọ oké osimiri ahu puta: agaghi-ebipuwori aha-ya ma-ọbu kpochapu ya n’irum.

20 Sinu na Babilon pua, b͕anarinu ndi Kaldea; werenu olu nke iti-nkpu-ọṅù gosi, me ka anuru nka, menu ka ọ puta ìhè rue nsọtu uwa: sinu, Jehova ab͕aputawo orù-Ya, bú Jekob.

21 Akpiri akpọghi ha nku mb͕e O mere ka ha je ije n’ala kpọrọ nku: O mere ka miri si n’oké nkume rùputara ha: e, Ọ kpọwara oké nkume, miri we suputa.

22 Ọ dighi udo diri ndi nēmebi iwu, ka Jehova siri.

Categories
AISAIA

AISAIA 49

1 Genum nti, unu agwe-etiti; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi di iche iche, site n’ebe di anya: Jehova esitewo na mb͕e m’nọ n’afọ kpọm; site na mb͕e m’nọ n’afọ nnem ka O hotaworo aham:

2 O we me ka ọnum di ka mma-agha di nkọ, na ǹdò aka-Ya ka O zobeworom; O we me ka m’ghọ àmùmà, n’àkpà-àkú-Ya ka O zebeworom:

3 O we sim, Orùm ka i bu; gi Israel, onye ọ bu nime gi ka M’gēme Onwem ka M’ma nma.

4 Ma mu onwem siri, N’efu ka m’dọb͕uworo onwem n’ọlu, n’ihi ihe tọb͕ọrọ n’efu na otù nku-ume ka m’meworo ka ikem gwusia: n’ezie ikpém di n’aka Jehova, ugwọ-ọlum di kwa n’aka Chinekem.

5 Ma ub͕u a Jehova siri, bú Onye kpuworom site n’afọ nnem iburu Ya orù, ime ka Jekob laghachikute Ya, ka ewe chikọta-kwa-ra Ya Israel: (anāsọpu-kwa-ram n’anya Jehova, Chinekem aghọwo ikem:)

6 O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.

7 Otú a ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa Israel na Onye Nsọ ya, siri onye madu nēleda, onye bu ihe-árú nke mba nka, onye bu orù ndi nāchi achi: Ndi-eze gāhu, we kpọ isi ala; n’ihi Jehova Nke kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye Nsọ nke Israel, Nke rọputaworo gi.

8 Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M’zaworo gi, ọ bu kwa n’ubọchi nzọputa ka M’nyeworo gi aka: M’gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n’efu;

9 nāsi ndi ekere ab͕u, Puanu; nāsi ndi nọ n’ọchichiri, Putanu n’ìhè. N’uzọ nile ka ha gāzù onwe-ha, ọ bu kwa n’ugwu nile ọhia nādighi ka ebe-ita-nri-ha gādi.

10 Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n’ihi na Onye nwere obi-ebere n’aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n’akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.

11 M’gēme kwa ka ugwum nile ghọ uzọ, agēme kwa ka uzọm nile atuliri atuli di elu.

12 Le, ndia gēsi n’ebe di anya bia: le kwa, ndia gēsi n’Ugwu na n’Ọdida-anyanwu; ndia gēsi kwa n’ala Sainim.

13 Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n’ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n’aru ndi-Ya ewedara n’ala.

14 Ma Zaion siri, Jehova arapuwom, Onye-nwe-ayi echezọwokwam.

15 Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n’aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.

16 Le, n’ọbu-akam abua ka M’kàworo gi àkà; mb͕idi-gi nile di n’irum mb͕e nile.

17 Umu-gi emewo ngwa; ndi nākwada gi na ndi nēme ka i tọb͕ọrọ n’efu gēsi nime gi pua.

18 Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta,) n’ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu.

19 N’ihi na, nkpọnkpọ ebe-gi nile na ebe-gi nile tọb͕ọrọ n’efu na ala-gi akwadara akwada, n’ezie ub͕u a i gādikara ndi bi n’ala nkpà, ndi nēloda gi gānọ kwa n’ebe di anya.

20 Umu nke mb͕e ọb͕ub͕a-aka-umu-gi gāsi kwa na nti-gi abua ọzọ, Ebe a dim nkpà: nyem ọnọdu ka m’we biri.

21 I gāsi kwa n’obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n’ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?

22 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, M’gēweliri mba nile akam, ọ bu kwa ndi di iche iche ka m’gēbuliri ọkọlọtọm: ha gēkuta kwa umu-gi ndikom n’obi-ha, agēbu kwa umu-gi ndinyom n’ubu-ha.

23 Ndi-eze gābu kwa nna nāzù umu-gi, ndi-eze-nwanyi-ha gābu kwa ndinyom nēnye umu-gi ara: ha gākpọ isi ala nye gi, kpue iru-ha n’ala, racha ájá ukwu-gi abua; i we mara na Mu onwem bu Jehova, Onye ihere agaghi-eme ndi nēle anyam.

24 Àgānara dike ihe o wetara n’agha, ma-ọbu ndi onye ezi omume dọtara n’agha, àgēme ka ha wepuga onwe-ha?

25 Ma otú a ka Jehova siri, Ọbuná ndi dike dọtara n’agha ka agēwepu, ọzọ, ihe onye nēme ka madu ma jijiji wetara n’agha, agēme ya ka ọ wepuga onwe-ya; ọ bu kwa onye nāluso gi ọ̀gù, ọ bu kwa umu-gi ka Mu onwem gāzọputa.

26 M’gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.

Categories
AISAIA

AISAIA 50

1 Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M’ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M’nara ego n’ọmuru-nwa ka M’reworo unu n’aka ya? Le, ọ bu n’ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n’ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.

2 Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M’biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M’kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n’ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n’ihi na miri adighi, we nwua n’akpiri-ikpọ-nku.

3 Ejim iji-nji yikwasi elu-igwe dika uwe, ọ bu kwa akwà-nkpe ka M’nēme ka ọ buru ihe-nb͕okwasi-ha.

4 Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m’we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.

5 Onye-nwe-ayi Jehova emegheworom ntim, ma Mu onwem enupugh isi, alaghachighm azu.

6 Azum ka m’nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m’nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n’ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu.

7 Ma Onye-nwe-ayi Jehova nēyerem aka; n’ihi nka etiyeghm n’ọnọdu-ihere: n’ihi nka ka m’cheworo irum dika ọmú, ama-kwa-ram na ihere agaghi-emem.

8 Onye nāgum n’onye ezi omume di nso: ọdi onye mu na ya gēkpe? ka ayi guzo ọtọ n’otù: ònye bu onye ahu nwere okwu-ikpe ikwugidem? ya biakutem nso.

9 Le, Onye-nwe-ayi Jehova gēyerem aka: ònye bu onye ahu gāmam ikpe? le, ha nile gāka dika uwe; nla gērichapu ha.

10 Onye n’etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n’olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n’ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n’aha Jehova, dabere Chineke-ya.

11 Le, unu nile ndi nāmuye ọku, ndi ji àkú nēre ọku eke onwe-unu n’úkwù dika ihe-ọkiké: jegharinu n’ire ọku-unu, na n’etiti àkú nile nēre ọku unu funwuworo. Ihe a esitewo n’akam diri unu; n’ihe-nwuta ka unu gēdina ala.