Categories
AISAIA

AISAIA 31

1 Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n’Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n’ub͕ọ-ala, n’ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n’ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!

2 Ma Ya onwe-ya ma-kwa-ra ihe, we me ka ihe ọjọ bia, O wezugakwaghi okwu-Ya nile: ma O biliwo imegide ulo ndi nēme ihe ọjọ na imegide iye-aka nke ndi nālu ajọ ihe.

3 Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n’otù ka ha nile gāgwusi.

4 N’ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n’elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n’ala n’ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha.

5 Dika umu-nnunu nēfe efe, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi Jerusalem; nēb͕ochi nānaputa; nāgabiga nēme ya ka o wepuga onwe-ya.

6 Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n’aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku.

7 N’ihi na n’ubọchi ahu ha gāju, onye ọ bula ọ ju ihe-efu ọla-ọcha ya nile na ihe-efu ọla-edo ya nile, nke aka-unu mere nye onwe-unu, ibu nmehie.

8 Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n’iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè.

9 Nkume-ya nke di elu gāgabiga site n’ujọ, ndi-isi-ya gātu kwa ujọ ọkọlọtọ, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, Onye ìhè O nwere di na Zaion, ite-ọku uku O nwere di kwa na Jerusalem.

Categories
AISAIA

AISAIA 32

1 Le, n’ezi omume ka otù eze gābu eze, ndi-isi kwa, n’ikpé ziri ezi ka ha gābu ndi-isi.

2 Otù onye gādi kwa ka ebe izonari ifufe, na ebe-nzuzo ipu n’oké miri-ozuzo; dika ọtutu iyi juputara na miri n’ebe kpọrọ nku, dika ǹdò nke oké nkume di elu n’ala nke kpatara ike-ọgwugwu.

3 Agaghi-etechi kwa anya nke ndi nāhu uzọ, nti nke ndi nānu ihe gāṅa kwa nti.

4 Obi nke ndi nēme ngwa ngwa gāghọta kwa ihe-ọmuma, ire nke ndi-nsu gēkwuwa kwa okwu ngwa ngwa.

5 Agaghi-akpọ kwa onye-nzuzu onye amara aha-ya ọzọ, agaghi-asi kwa na onye-aghughọ bu ọgaranya.

6 N’ihi na onye-nzuzu gēkwu ihe-nzuzu, obi-ya gēme kwa ajọ ihe, ime ihe emeruru emeru, na ikwu okwu njehie megide Jehova, ime ka nkpuru-obi nke onye agu nāgu b͕ara aka, na ime ka ihe-ọṅuṅu nke onye akpiri nakpọ nku kọ ukọ.

7 Ihe-ọlu nile nke onye-aghughọ jọ-kwa-ra njọ: onye ahu ezubewo ihe-nzube ọjọ di iche iche iji okwu-ọnu nile nke bu okwu-ugha mebie ndi ewedara n’ala, ọbuná mb͕e ob͕eye nēkwu okwu ikpé ziri ezi.

8 Ma onye amara aha-ya ezubewo ihe amara aha-ha; onye ahu nēguzosi kwa ike n’ime ihe amara aha-ha.

9 Unu ndinyom ndi nọ jū, bilienu, nurunu olum; unu umu-ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi, gēnu nti okwu-ọnum.

10 Tukwasi ubọchi ufọdu n’otù nb͕a-arọ, unu ewe me nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: n’ihi na ọghughọ-nkpuru-vine agwusiwo, nchikọta-ihe agaghi-abia.

11 Manu jijiji, unu ndinyom ndi nọ jū; menu nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: yipunu uwe, b͕ara ọtọ, ke ákwà-nkpe n’úkwù-unu.

12 N’ihi ara nile ka ha ganēti aka n’obi, n’ihi ubi nile anāchọsi ike, n’ihi osisi vine nāmi nkpuru,

13 n’ihi ala ndim, nke ogwu n’uke nēpute nime ya, e, n’elu ulo nile nke obi-utọ n’obodo nāṅuri ọṅu-agha:

14 n’ihi na arapuwo ulo-elu; ab͕anariwo ìgwè obodo; Ofel na ulo nche anọchiwo n’ọnọdu ọb͕à rue mb͕e ebighi-ebi, ebe obi-utọ nke inyinya-ibu-ọhia, ebe-ita-nri nke ìgwè aturu di iche iche;

15 rue mb͕e agāwukwasi ayi Mọ site n’elu, ọzara ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n’oké ọhia.

16 Mb͕e ahu ikpé ziri ezi gēnwe ebe-obibi-ya n’ọzara, ezi omume gēbi kwa n’ubi ọma ahu.

17 Ihe ezi omume ahu gāluputa bu udo; ihe nke gēsi n’òfùfè ezi omume ahu puta bu kwa inọ-jū na ntukwasi-obi rue mb͕e ebighi-ebi.

18 Ndim gānọ kwa n’ulo-obibi udo, na n’ebe-obibi di iche iche kwesiri ntukwasi-obi, na n’ebe-izu-ike di iche iche di jū.

19 Ma o gēzo ákú-miri-ígwé, n’ọdida nke oké ọhia; ọ bu kwa n’ọnọdu di ala ka agēme ka obodo a di ala.

20 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka unu ndi nāgha nkpuru n’akuku miri nile bu, ndi nēziputa ukwu ehi na inyinya-ibu.

Categories
AISAIA

AISAIA 33

1 Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.

2 Jehova, mere ayi amara; Gi ka ayi leworo anya: buru ogwe-aka-ha kwa-ututu, buru kwa nzọputa-ayi na mb͕e ahuhu.

3 Site n’olu ùzù ka ndi di iche iche b͕alagaworo; site na nbuli-Gi ka mba nile b͕asaworo.

4 Agāchikọta kwa ihe-unu akwatara n’agha dika nchikọta nke ọbubu: dika nb͕aghari nke igurube, otú a ka ọ nāb͕aghari n’elu ya.

5 Jehova di elu; n’ihi na O bi n’elu: O mejuwo Zaion n’ikpe ziri ezi na ezi omume.

6 Ikwesi-ntukwasi-obi gādi kwa na mb͕e-gi nile, iba-uba nke nzọputa na amam-ihe na ihe-ọmuma: egwu Jehova, nke ahu bu àkù-ya.

7 Le, dìnkpà-ha nile nēti nkpu n’èzì: ndi-ozi udo nākwakpọ anya.

8 Uzọ nile atuliri atuli tọb͕ọrọ n’efu, onye nāgabiga n’uzọ akwusiwo: o mebiwo ọb͕ub͕a-ndu, ju obodo nile, ọ gughi madu n’ihe.

9 Ala nēru újú, talata: Lebanon nwere iru-ihere, ọ janwuwo ajanwu: Sheron di ka ala ihe nādighi; Beshan na Kamel nārurupu kwa akwukwọ-ha.

10 Ub͕u a ka M’gēbili, ka Jehova nāsi; ub͕u a ka M’gēme onwem ka M’di elu; ub͕u a ka agēbulim.

11 Unu gātu ime ahihia kpọrọ nku, unu gāmu ahihia-ọka: nku-ume-unu bu ọku nke gērichapu unu.

12 Ndi di iche iche gādi kwa ka lime akpọrọ ọku: dika ogwu eb͕uturu eb͕utu, nke anēsure n’ọku.

13 Unu ndi nọ n’ebe di anya, nurunu ihe M’meworo; unu kwa ndi nọ nso, maranu idi-ikem.

14 Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n’etiti ayi gānọ dika ọbìa n’ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n’etiti ayi gānọ dika ọbìa n’ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?

15 Ọ bu onye nējeghari n’ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n’ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;

16 onye ahu gēbi n’ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi.

17 Eze n’ima-nma-ya ka anya-gi abua gāhu: ha gāhu ala nke ebe nile ọ sọturu di anya.

18 Obi-gi gēchè èchìchè oké ujọ ahu: òle ebe onye nāgu ọnu nọ? òle ebe onye nātù ego-utu nọ? òle ebe onye nāgu ulo-elu ọnu nọ?

19 Ndi ahu nke nwere anya-ike, i gaghi-ahu ya, bú ndi asusu-ya miri emi kari ọnunu; nke ire-ya nāsu nsu nādighi nghọta.

20 Lekwasi Zaion anya, bú obodo nke mb͕e nile ayi akara àkà: anya-gi abua gāhu Jerusalem na ọ bu ulo-obibi di jū, ulo-ikwū nke anāgaghi-ebupu ebupu, nke anāgaghi-eropu ǹtú-ya ọ bula rue ebighi-ebi, nke anāgaghi-adọbi kwa udọ̀-ya ọ bula.

21 Kama n’ebe ahu ka Onye di ebube, bú Jehova, gānọduru ayi, dika ebe ọtutu osimiri na uzọ di iche iche miri si erù nke sara mbara n’aka abua; ub͕ọ-umara agaghi-aga nime ya, ub͕ọ di ebube agaghi-agabiga kwa n’elu ya.

22 N’ihi na Jehova bu onye-ikpe-ayi, Jehova bu onye nēnye ayi iwu, Jehova bu eze-ayi; Ya onwe-ya gāzoputa ayi.

23 Atọsawo udọ̀-gi nile; ha adighi-ejisi ukwu akpu-ha ike, ha ab͕asaghi ọkọlọtọ-ha: mb͕e ahu ekesara ihe alutara n’agha, bú ihe akwatara n’uba; ndi-ngwurọ lutara ihe-nluta-n’agha.

24 Onye-obibi-ya agaghi-asi, Anamaria ọria: agēbupu ajọ omume nke ndi bi nime ya.

Categories
AISAIA

AISAIA 34

1 Bianu nso, unu mba, inu ihe; unu ndi di iche iche kwa, ṅanu nti: ka uwa nu, ya na ùjú-ya; elu-uwa dum madu bi, na ihe nile si nime ya aputa.

2 N’ihi na iwe ka Jehova nēwesa mba nile, O wezugawo ha ka ebibie ha, O were ha nye ka eb͕ue ha.

3 Agētufu kwa ndi-ha eb͕uru eb͕u, ma ozu-ha, ísì ọjọ ha gārigo n’elu, agāb͕aze kwa ugwu site n’ọbara-ha.

4 Usu nile nke ihe elu-igwe gēdè kwa, agāpiakọta kwa elu-igwe dika akwukwọ-odide: usu-ha nile gākpọnwu kwa, dika akwukwọ si akpọnwu dapu n’osisi vine, na dika akwukwọ nke nākpọnwu akpọnwu si adapu n’osisi fig.

5 N’ihi na mma-agham aṅujuwo afọ n’elu-igwe: le, Edom ka ọ gāridakwasi, ridakwasi kwa ndi M’wezugara ka ebibie ha, ikpe ikpe.

6 Mma-agha Jehova juputara n’ọbara, emewo ka ọ ma abuba site n’abuba, site n’ọbara umu-aturu na nkpi, site n’abuba nke akuru ebulu: n’ihi na àjà di Jehova nwere na Bọzra, O nwe-kwa-ra oké ob͕ub͕u n’ala Edom.

7 Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n’abuba.

8 N’ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di Jehova nwere, arọ nkwughachi diri ise-okwu Zaion.

9 Iyi-ya nile gāb͕anwe pitch, ájá-ya gāb͕anwe kwa brimstone, ala-ya gāghọ kwa pitch nēre ọku.

10 N’abali ma-ọbu n’ehihie ọ gaghi-anyu anyu; rue mb͕e ebighi-ebi ka anwuru-ọku-ya gākwugo: site n’otù ọb͕ọ rue ọb͕ọ ọzọ ọ gātọb͕ọrọ n’efu; rue mb͕e nile ebighi-ebi ọ dighi onye nāgabiga nime ya.

11 Ma okwolo na ebinta gēnweta ya; okwukwu na ugolo-ọma gēbi nime ya: Ọ gēseti kwa eriri nke itọb͕ọrọ-n’efu na nkume-ọtùtù nke itọb͕ọrọ-nkiti n’elu ya.

12 Ndi-ya amara aha-ha ka ha gākpọ inwe ala-eze, ma ọ dighi onye nọ n’ebe ahu; ndi-isi-ya nile gāghọ kwa ihe-efu.

13 Ogwu gēpú kwa n’ulo-elu-ya nile, akuba na ọhia-ogwu n’ebe-ya nile ewusiri ike: o we ghọ ebe-obibi nkita-ọhia, ogige nke diri enyi-nnunu.

14 Anu-ọhia bi n’ala kpọrọ nku gēzute kwa anu-ọhia nēbe ebe, nkpi-ọhia gākpọ kwa ibe-ya; ọzọ, n’ebe ahu ka lilith gānọdu, chọtara onwe-ya ebe-izu-ike.

15 N’ebe ahu ka agwọ di ngwa gēme akwu-ya, yie àkwá, bua umu, kpokọba ha n’okpuru ǹdò-ya: ọzọ, n’ebe ahu ka ndab͕u gēzukọta, otù na ibe-ya.

16 Chọputanu n’akwukwọ Jehova, gua: ọ dighi otù nime ndia fọduru inọ ya, otù eleghi anya ibe-ya ma ọ biagh: n’ihi na ọnum, nke ahu nyere iwu, Mọ-Ya kwa, Ya onwe-ya chikọtara ha.

17 Ya onwe-ya efewo-kwa-ra ha nzà, aka-Ya ewerewo kwa ya kère ha n’eriri-ọtùtù: rue mb͕e nile ka ha gēnweta ya, rue ọb͕ọ nile ka ha gēnwe ebe-obibi-ha nime ya.

Categories
AISAIA

AISAIA 35

1 Obi gātọ ọzara na ala kpọrọ nku utọ; ala ihe nādighi gēteghari kwa egwú ọṅù, b͕awa okoko-ọhia, dika rose.

2 Ọ gāb͕awa nke-uku, teghari kwa egwú ọṅù, e, n’iteghari-egwú-ọṅù na n’iti-nkpu-ọṅù; nsọpuru Lebanon ka agēnye ya, e, ima-nma nke Kamel na Sheron: ndia gāhu ebube Jehova, bú ima-nma nke Chineke-ayi.

3 Menu aka kudara akuda ka ha di ike, b͕a-kwa-nu ikperè nāsu ngọngọ ume.

4 Sinu ndi obi-ha nēme ngwa, Dinu ike, unu atula egwu: le, Chineke-unu! ibọ̀-ọ́bọ̀ nābia, bú nkwughachi nke Chineke; Ya onwe-ya gābia zọputa unu.

5 Mb͕e ahu ka agēmeghe anya ndi-ìsì, ọ bu kwa nti nke ndi nti chiri ka agēmeghe.

6 Mb͕e ahu ka onye-ngwurọ gāmali dika ele, ire onye-ob͕i gēti kwa nkpu ọṅù: n’ihi na n’ọzara ka miri nāb͕awaputa, miri-iyi kwa n’ala ihe nādighi.

7 Mirage gāghọ kwa ọdọ-miri, ala miri nādighi gāghọ kwa isi-iyi juputara na miri: n’ebe-obibi nkita-ọhia, ebe ha nāmakpu amakpu, ogige nke diri amì na papyrus.

8 Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n’ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n’uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.

9 Ọ dighi ọdum gādi n’ebe ahu, ọ dighi kwa anu-ọhia nke di irè gārigo n’elu ya, agaghi-ahu ya n’ebe ahu; ma ndi emeworo ka ha nwe onwe-ha nēje ije n’ebe ahu:

10 ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n’isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.

Categories
AISAIA

AISAIA 36

1 O rue, n’arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, na Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha.

2 Eze Asiria we si na Lekish ziga Rabshake rue Jerusalem jekuru Hezekaia, ya na oké usu-ndi-agha. O we guzo n’akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n’elu, n’uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.

3 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ya.

4 Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi?

5 Asim, Ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu, na ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha: ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n’okpurum?

6 Le, i tukwasiwo obi n’aru nkpa-n’aka amì a piara apia, bú n’aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n’ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n’ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.

7 Ma ọ buru na i sim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu Onye Hezekaia wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N’iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala?

8 Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m’nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha.

9 Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n’aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?

10 Ma ub͕u a ọ̀ bu n’ejighi Jehova ka m’rigoro imegide ala nka ibibi ya? Jehova sirim, Rigo imegide ala nka, bibie ya.

11 Elaiakim na Shebna na Joa we si Rabshake, Biko, gwa ndi-orù-gi okwu n’asusu Siria; n’ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: agwa-kwa-la ayi okwu n’asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n’elu mb͕idi.

12 Rabshake we si, Ọ̀ bu ijekuru onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n’ihi ndikom ahu ndi nānọdu n’elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha, ṅu kwa ma-amiri?

13 Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n’asusu ndi-Ju, si, Nurunu okwu nile nke eze uku ahu, bú eze Asiria.

14 Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu: n’ihi na ọ pughi inaputa unu:

15 unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi; agaghi-enye obodo a n’aka eze Asiria.

16 Unu egela Hezekaia nti: n’ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya:

17 rue mb͕e m’biara chiri unu je n’ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine.

18 Lezienu anya ka Hezekaia we ghara irafu unu, si, Jehova gānaputa ayi. Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n’aka eze Asiria?

19 Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim di? hà anaputawo kwa Sameria n’akam?

20 Òle ndi n’etiti chi nile nke ala ndia ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n’-akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n’akam?

21 Ma ha b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n’ihi na ihe eze nyere n’iwu bu nka, si, Unu azala ya.

22 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.

Categories
AISAIA

AISAIA 37

1 O rue, mb͕e eze, bú Hezekaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n’ulo Jehova.

2 Ọ we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na ndi okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma.

3 Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n’ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha.

4 Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya Ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: gi buli kwa ekpere-gi n’ihi ndi fọduru ndi ahutaworo.

5 Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia.

6 Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n’ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum.

7 Le, M’nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n’ala-ya; m’gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n’ala-ya.

8 Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka ọ nēbuso Libna agha: n’ihi na O nuru na o siwo na Lekish bulie ije.

9 Ọ we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Ọ putawo ibuso gi agha. O we nu, zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia, si,

10 Otú a ka unu gāgwa Hezekaia bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si, Agaghi-enye Jerusalem n’aka eze Asiria.

11 Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n’iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi?

12 chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Eden, ndi nọ na Telasa?

13 Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?

14 Hezekaia we nata akwukwọ n’aka ndi-ozi ahu, gua ya: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n’iru Jehova.

15 Hezekaia we kpe ekpere n’iru Jehova, si,

16 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Onye nēbi n’etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.

17 Jehova, tọ nti-Gi n’ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke zitere madu ita Chineke di ndu uta.

18 N’ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka ala nile na ala-ha tọb͕ọrọ n’efu,

19 ha etiyewo kwa chi nile ha n’ọku: n’ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n’iyì.

20 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, zọputa ayi n’aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi.

21 Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya.

22 Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n’iru; ada Jerusalem efufewo isi n’azu gi.

23 Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.

24 I siri n’aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m’gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m’gābà kwa n’ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.

25 Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri, m’gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.

26 Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M’meworo ya, na ọ bu site n’ubọchi mb͕e ochie ka M’kpuworo ya? ugbu a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n’efu.

27 Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ, ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ubi ọka tutu o tolite.

28 Ma amowom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem.

29 N’ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n’ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M’gētiye kwa nb͕a-aka-imim n’imi-gi, na bridle nkem n’eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n’uzọ ahu nke i siri bia.

30 Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n’arọ a ihe nēpú n’onwe-ya, na n’arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n’arọ nke-otọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n’ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha.

31 Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n’ala n’okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n’elu.

32 N’ihi na ọ bu na Jerusalem ka ndi fọduru afọdu gēsi puta, ndi b͕apuru ab͕apu gāputa kwa n’ugwu Zaion: ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.

33 N’ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n’obodo a, ọ gaghi-ab͕a otù àkú n’ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n’iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya.

34 N’uzọ o siri bia, n’uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n’obodo a, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

35 M’gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n’ihi Onwem, na n’ihi Devid, bú orùm.

36 Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n’ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n’isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.

37 Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.

38 O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n’ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n’ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
AISAIA

AISAIA 38

1 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n’ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.

2 Hezekaia we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova,

3 si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m’jeghariworo n’iru Gi n’ezi-okwu na n’obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n’anya-Gi ka m’meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.

4 Okwu Jehova we rue Aisaia nti, si,

5 Je, si Hezekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M’nātukwasi arọ iri na ise n’ubọchi-gi.

6 M’gānaputa kwa gi na obodo a n’ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a.

7 Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama sitere n’aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru:

8 le, M’nēme ka onyinyo nke di n’ebe-nrigo, nke ridaworo n’ebe-nrigo Ehaz site n’anyanwu, ka ọ la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Anyanwu we la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri n’ebe-nrigo ahu nke ọ ridaworo n’elu ya.

9 Odide-akwukwọ nke Hezekaia eze Juda, mb͕e ọ riara ọria, o we puta N’ọrìa-ya nwe aru-ike.

10 Mu onwem siri, Ọ bu n’idi-jū nke ubọchim nile ka m’ghaghi ila n’ọnu-uzọ-ama nke ala-mọ.

Anapuwom arọm fọduru afọdu.

11 Asirim, M’gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n’ala ndi di ndu:

M’gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n’etiti ndi bi n’ala ọgwugwu-ndu.

12 Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n’ebe m’nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu:

Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum:

Site n’ehihie rue abali I gēme ka m’gwusia.

13 Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile:

Site n’ehihie rue abali I gēme ka m’gwusia.

14 Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m’nēbe ebe;

Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n’ile anya n’elu;

Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.

15 Gini ka m’gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya:

M’ganēje nwayọ arọm nile n’ihi idi-ilu nke nkpuru-obim.

16 Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu,

Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi:

I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m’di ndu.

17 Le, ihe m’ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m’we nata udo:

Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n’anya si-ike, we si n’olùlù nke itọb͕orọ-n’efu dọputam:

N’ihi na I tufuru nmehiem nile n’azu Gi.

18 N’ihi na ala-mọ adighi-ekele Gi, ọnwu adighi-eto Gi:

Ndi nārida n’olùlù adighi-ele anya ezi-okwu-Gi.

19 Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m’si eme ta:

Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.

20 Jehova ejikerewo izọputam:

Ubọ-akwaram nile ka ayi ganākpọ

Ubọchi nile nke ndu-ayi n’ulo Jehova.

21 Aisaia we si, Ka ha were mbadamba fig, makwasi ya n’elu ihe-ofifi ahu, ọ gādiri ndu.

22 Hezekaia we si, Gini gābu ihe-iriba-ama na m’gārigoru ulo Jehova n’ubọchi nke-atọ?

Categories
AISAIA

AISAIA 39

1 Na mb͕e ahu Merodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: ọ nu-kwa-ra na Hezekaia riarari ọria, we nwe aru-ike.

2 Hezekaia we ṅuria ọṅu bayere ha, me ka ha hu ulo nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo nile nke ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n’àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n’ulo-ya, ma-ọbu n’ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.

3 Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n’ala di anya ka ha si biakutem, ọbuná na Babilon.

4 Ọ si, Gini ka ha huru n’ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n’ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n’àkùm nile nke m’nemeghi ka ha hu.

5 Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha.

6 Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n’ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n’ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri.

7 Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n’aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n’ulọ uku eze Babilon.

8 Hezekaia we si Aisaia, Ọ di nma, bú okwu Jehova nke i kwuworo. Ọ si kwa, N’ihi na udo na ezi-okwu gādi n’ubọchim nile.

Categories
AISAIA

AISAIA 40

1 Kasienu, kasienu ndim obi, ka Chineke-unu nāsi.

2 Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n’obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n’aka Jehova okpukpu abua n’ihi nmehie-ya nile.

3 Ọ bu olu nke onye nākpọ nkpu n’ọzara, si, Dozienu uzọ Jehova, menu ka uzọ atuliri atuli guzoziere Chineke-ayi n’ala ihe nādighi.

4 Agēme ndagwurugwu ọ bula ka ọ di elu, agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala: ebe di nkputankpu gāghọ kwa, ebe guzoziri eguzozi, nkume nile di elu gāghọ kwa ebe di lari:

5 agēkpughe kwa ebube Jehova, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n’otù: n’ihi na ọnu Jehova ekwuwo.

6 Ọ bu olu onye nāsi, Kpọ nkpu. Otù onye we si, Gini ka m’ganākpọ nkpu? Anu-aru nile bu ahihia, ima-nma-ya nile di kwa ka okoko ọhia:

7 ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo; n’ihi na iku-ume Jehova ekukwasiwo ya: n’ezie ahihia ka ndi ahu bu.

8 Ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo: ma okwu Chineke-ayi gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.

9 Rigo n’elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n’ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu!

10 Le, Ọnye-nwe-ayi Jehova gābia dika onye di ike, ogwe-aka-Ya ganāchi-kwa-ra Ya: le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n’aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n’iru Ya.

11 Dika onye-ọzùzù-aturu ka Ọ gāzù ìgwè aturu-Ya, n’ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n’obi-Ya ka O gēkuru ha, Ọ gēwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara.

12 Ònye tùworo miri nile n’ọbu-aka-Ya, were ntù-aka tùputa elu-igwe, nagidezue ájá nke uwa na mb͕é, sì ugwu nile n’ihe-osìsì, tùa ugwu ntà nile n’ihe-ọtùtù?

13 Ònye tùputaworo ma-obu nke Jehova, ma-ọbu, dika onye-ndum-ọdu-Ya, nēme ka Ọ mara ihe?

14 Yà na onye b͕ara ìzù? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye zíri Ya ihe n’okporo-uzọ ikpé, zí kwa Ya ihe-ọmuma, me kwa ka Ọ mara uzọ nghọta?

15 Le, aguwo mba nile n’otù ntu-miri nātupu n’ite-miri, na n’uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe.

16 Lebanon ezughi kwa isure ọku, anu-ọhia-ya ezughi kwa isure àjà-nsure-ọku.

17 Mba nile di ka ihe-efu n’iru Ya; dika ihe nērughi ihe-efu na ebe tọb͕ọrọ n’efu ka aguworo ha nye Ya.

18 Ònye kwa ka unu gāsi na Chineke yiri ya? ma-ọbu ìhe-oyiyi gini ka unu gēdo n’usoro n’ebe Ọ nọ?

19 Arusì apiri api, onye-ọ̀kà b͕azere ya, onye-nnucha-ọla nāmachita ya ọla-edo, ọ bu kwa iyab͕a ọla-ọcha ka ọ nākpuru ya.

20 Onye dara ob͕eye kari ichu àjà-nbuli di otú a nārọputa osisi nke nādighi-ere ure; onye-ọ̀kà nke mara ihe ka ọ nāchọputara onwe-ya idozi arusi apiri api nke anāgaghi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya.

21 Ùnu amaghi? ùnu anughi? ègosighi unu ya site na mb͕e mbu? ùnu aghọtaghi site na ntọ-ala nile nke uwa?

22 Ọ bu Onye ahu Nke nānọdu n’elu buruburu uwa, ndi bi nime ya ewe di ka ogugu; Nke nēseti elu-igwe dika ákwà di nfe, we b͕asa ha dika ulo-ikwū ibi ebi:

23 Nke nēme ndi-isi ka ha ghọ ihe-efu; Ọ mewo ndi-ikpe uwa ka ha di ka ebe tọb͕ọrọ n’efu.

24 E, akākughi ha dika osisi: e, akāghaghi ha dika nkpuru: e, ogwe-osisi-ha akāb͕aghi nkpọrọgwu n’ala: ọzọ kwa, O kukwasiwo ha ume, ha we kpọnwua, oké ifufe nēfepu kwa ha dika ahihia-ọka kpọrọ nku.

25 Ònye kwa ka unu gāsi na Mu yiri ya, M’we ra ka ya? ka Onye Nsọ nāsi.

26 Welienu anya-unu elu, hu: ọ̀ bu Onye kère ihe ndia? ọ bu Onye ahu Nke nēme ka usu-ha puta n’ọnu-ọgugu: ha nile n’aha-ha ka Ọ nākpọ; site n’iba-uba nke ike-Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dighi ihe fọduru nke anāgughi.

27 N’ìhi gini ka i nāsi, gi Jekob, ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka i nēkwu, gi Israel, si, Uzọm ezonariworo Jehova, ọzọ, ikpém esiwo n’ebe Chinekem nọ gabiga?

28 Ì maghi? ì nughi? Chineke nke mb͕e ebighi-ebi ka Jehova, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ dighi-ada #mbà, ike adighi-agwu kwa Ya; ọ dighi ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya.

29 Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n’uba.

30 Ọbuná umu-ckoro nāda #mbà, ike nāgwu kwa ha, ọbuná umu-okorọbia nāsu ngọngọ da:

31 ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.