Categories
AISAIA

AISAIA 21

1 Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n’ọzara ka o siworo bia, site n’ala di egwu.

2 Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n’agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M’meworo ka ọ kwusi.

3 N’ihi nka ka úkwùm juputara na nb͕ali; aru-ufu ka m’nwezuru, dika aru-ufu nile nke nwayi ime nēme: ab͕agọrọm ab͕agọ, m’we ghara inu ihe; amaram jijiji, m’we ghara ihu uzọ.

4 Obim akpafuwo, oké ọma-jijiji emewo ka m’tua egwu nke-uku: chi-ojiji nke dim ezi nma ka o meworo ka ọ ghọrọm ima-jijiji.

5 Ha nēdozi table, che nche, rie ihe, ṅua ihe-ọṅuṅu: bilienu, ndi-isi, tenu ọta manu.

6 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Je, guzo onye-nche: ihe ọ gāhu ka ọ gēgosi:

7 ma ọ buru na ọ hu usu madu, ndi-inyinya nēje abua abua, usu inyinya-ibu, usu camel, ọ gāṅa nti nāṅasi nti ike nke-uku.

8 O we kpọ dika ọdum: si, Onye-nwe-ayi, n’elu ulo-nche ka mu onwem nēguzo mb͕e nile n’ehihie, na nchem ka anēme ka mu onwem guzo n’abali nile:

9 ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala.

10 Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m’nuworo n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m’gosiworo unu.

11 Ibu eboro Duma.

Mu ka otù onye nākpọ òkù site na Sia, si, Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n’abali? Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n’abali?

12 Onye-nche siri, Ututu abiawo, ma abali abiawo kwa: ọ buru na unu gāju ase, juanu ase: laghachinu, bia.

13 Ibu ebero Arebia.

N’oké ọhia di n’Arebia ka unu gānọ ọnọdu-abali, unu usu-ije nile nke ndi Dedan.

14 Izute onye akpiri nākpọ nku kutanu miri; unu ndi bi n’ala Tima, werenu nri kwesiri ya zute onye nāwaghari.

15 N’ihi na n’iru ọtutu mma-agha ka ha siri wagharia, n’iru mma-agha amiputara amiputa, na n’iru uta azọrọ ukwu ikwe ya, na n’iru ibu di arọ́ agha bu.

16 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi:

17 ndi fọduru n’ọnu-ọgugu ndi-uta, bú ndi-dike nke umu Kida, ewe di ole-na-ole: n’ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, ekwuwo ya.

Categories
AISAIA

AISAIA 22

1 Ibu eboro ndagwurugwu nke ọhù.

Ọ bu kwa gini nēme gi, na i rigoworo n’elu ulo nile, ka i ra?

2 Gi nke juputara na nbib͕ọ, obodo nke nātu ùzù, obodo nāṅuri ọṅu-agha; ndi-gi eb͕uru eb͕u abughi ndi eji mma-agha b͕ue, ha abughi kwa ndi nwuru anwu n’agha.

3 Ndi-ọchi-agha-gi nile ab͕apuwo n’otù, ekere ha ab͕u n’enweghi uta: ndi-gi nile achọtaworo, ekere ha ab͕u n’otù, rue ebe di anya ka ha b͕alagara.

4 N’ihi nka ka m’siri, Lepunum anya, m’gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n’ihi nbibi ada nke ndim.

5 N’ihi na otù ubọchi nke ọb͕ub͕a-aghara, na nke nzọda, na nke ib͕a madu ghari, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere, nime ndagwurugwu nke ọhù; ngwuda nke mb͕idi, na ntiku anētiku ugwu.

6 Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta.

7 O rue, na ndagwurugwu-gi nile arọputara arọputa juputara n’ub͕ọ-ala, ndi-inyinya do-kwa-ra onwe-ha n’usoro n’iru ọnu-uzọ-ama.

8 O we kpughepu ihe-nkwuchi nke Juda; i we legide ihe-agha di n’ulo oké ọhia anya n’ubọchi ahu.

9 Nb͕awa nile nke obodo Devid ka unu hu-kwa-ra, na ha di ọtutu: unu wukọba-kwa-ra miri nke ọdọ-miri di n’okpuru.

10 Ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem ka unu guru ọnu, unu we kwatue ulo nile ilusi mb͕idi ike.

11 Ebe-nchikọta-miri ka unu me-kwa-ra n’etiti mb͕idi-unu abua inagide miri nke ọdọ-miri ochie: ma unu elegideghi Onye nēme nka anya, ọ bu kwa Onye nākpu ya-ri site n’ebe di anya ka unu nēlekwasighi anya.

12 Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, we kpọsa ikwa ákwá, na iti aka n’obi n’újú, na ime isi-nkwọcha, na ike ákwà-nkpe n’úkwù n’ubọchi ahu:

13 ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n’ihi na echi ka ayi gānwu.

14 Jehova nke usu nile nke ndi-agha we kpughepu Onwe-ya na ntim abua, si, N’ezie agaghi-ekpuchiri unu ajọ omume a rue mb͕e unu gānwu, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri.

15 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Je, bakuru odozi-àkù a, bú Shebna, nke bu onye-isi ulo, si,

16 Gini ka i nwere n’ebe a? ma-ọbu ònye ka i nwere n’ebe a, na i gwuwaworo ílì nye onwe-gi n’ebe a? ọ nēgwuwa ílì-ya n’elu, ọ nākàra onwe-ya ebe-obibi nime nkume di elu!

17 Le, Jehova gaje itudasi gi ike, gi nwoke; e, Ọ gaje ipiakọta gi apiakọta.

18 Ọ gāfukọtasi gi ike dika ihe-ọtutú tua gi n’ala sara mbara n’aka abua; n’ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ub͕ọ-ala nile nke nsọpuru-gi gādi, gi ihe-nlelì nke ulo onye-nwe-gi!

19 M’gākwapu kwa gi n’ebe-nguzo-gi siri ike, o gēsi kwa n’ọnọdu-gi dọda gi.

20 Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu, na M’gākpọ orùm. bú Elaiakim nwa Hilkaia:

21 M’gēyikwasi ya uwe-gi, were ihe ahu anēke gi n’úkwù kesie ya ike, ọ bu kwa ọchichi-gi ka M’gēnye ya n’aka: ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem na ndi ulo Juda nna.

22 M’gātukwasi kwa nkpisi-ugodi ulo Devid n’ubu-ya; o we meghe, ọ dighi kwa onye nēmechi; o we mechie, ọ dighi kwa onye nēmeghe.

23 M’gākpọgide kwa ya dika ǹtú n’ebe kwesiri ntukwasi-obi; ọ gāghọ-kwa-ra ulo nna-ya oche-eze nsọpuru.

24 Ha gēkokwasi kwa ya nsọpuru nile nke ulo nna-ya, umu-ya na umu-nna-ya, ihe nile nke di ntà, site n’ihe nile bu ọkwa we rue ihe nile bu karama.

25 N’ubọchi ahu (ọ bu ihe si n’ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta) ka ǹtú nke akpọgideworo n’ebe kwesiri ntukwasi-obi gāpu n’ọnọdu-ya; ewe b͕utue ya, o we da, ewe bipu ibu di n’elu ya; n’ihi na Jehova ekwuwo ya.

Categories
AISAIA

AISAIA 23

1 Ibu eboro Taia.

Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n’ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n’ala Kitim kpughere ha ya.

2 Derenu du, unu ndi bi n’ala di oké osimiri buruburu; gi onye ndi-ahia Zaidon, bú ndi nāgabiga oké osimiri, mejuworo ihe.

3 N’elu ọtutu miri ka nkpuru-ọghigha Shaihoa, nke bu owuwe-ihe-ubi nke Nail, bu ihe-omume-ya; o we ghọ urù-ahia nke mba di iche iche.

4 Ka ihere me gi, Zaidon: n’ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè.

5 Mb͕e anuru ihe a n’Ijipt, ihe anuru bayere Taia gēme ka ha b͕alie.

6 Gabiganu rue Tashish; kwasienu ákwá ike, unu ndi bi n’ala di oké osimiri buruburu.

7 Ọ̀ bu nka ka anēme unu, gi obodo nāṅuri ọṅu, nke mb͕e gara aga ya sitere n’ubọchi nile nke mb͕e ochie, onye ukwu-ya abua nēdu ya-ri je n’ebe di anya inọ dika ọbìa?

8 Ònye zubeworo nka megide Taia, bú obodo nke nēkpube ndi ọzọ okpu-eze, nke ndi-ahia-ya bu ndi-isi, nke ndi-ọzu-ahia-ya bu ndi-nsọpuru nke uwa?

9 Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo ya, ime ka npako nke ima-nma nile ghara idi nsọ, ime ka elelìa ndi-nsọpuru nile nke uwa.

10 Rùbiga n’etiti ala-gi dika Nail, gi ada Tashish; ihe-ike-n’úkwù adighi kwa ọzọ.

11 Aka-Ya ka O setiworo n’elu oké osimiri, O mewo ka ala-eze di iche iche ma jijiji: Jehova enyewo iwu bayere Kenean, ikpochapu ebe siri ike ya nile.

12 O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n’ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe.

13 Le, ala ndi Kaldea; ndi nka adighi; Asiria edoziworo ya anu-ọhia nile nke biri n’ala kpọrọ nku: ha mere ka ulo-nche-ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ulo-elu-ya nile; o mere ya ka ọ ghọ ebe dara ada.

14 Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish: n’ihi na ebibiwo ebe siri ike unu.

15 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na agēchezọ Taia ọgu arọ atọ na iri, dika ubọchi nile nke otù eze si di: mb͕e ọgu arọ atọ na iri ahu gwusiri ọ gādiri Taia dika abù nwanyi nākwa iko.

16 Were ubọ-akwara, jegharia n’obodo buruburu, gi nwanyi nākwa iko nke echezọrọ echezọ; kpọ ya nke-ọma, bùa ọtutu abù, ka ewe cheta gi.

17 Ọ gēru kwa, mb͕e ọgu arọ atọ na iri gwusiri, na Jehova gēleta Taia, o we lata n’onyinye-ikwa-iko-ya, ya na ala-eze nile nke uwa nke di n’elu uwa ewe kwa iko.

18 Urù-ahia-ya na onyinye-ikwa-iko-ya gāghọ kwa ihe nsọ Jehova nwere: agaghi-edebe ya n’ulo-àkù, agaghi-ebukọba kwa ya; n’ihi na ndi bi n’iru Jehova gēnwe urù-ahia-ya, iriju afọ, na inwe ákwà-nb͕okwasi nādigide adigide.

Categories
AISAIA

AISAIA 24

1 Le, Jehova nāb͕aba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n’efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya b͕asa.

2 O gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà; dika o si diri orù, otú a ka ọ gādiri onye-nwe-ya; dika o si diri nwanyi nēje ozi, otú a ka ọ gādiri nwanyi-nwe-ya; dika o si diri onye nēgo ego, otú a ka ọ gādiri onye nēre ere; dika o si diri onye-nbinye, otú a ka ọ gādiri onye-nbite; dika o si diri onye nānara uma, otú a ka ọ gādiri onye nēnye ya uma.

3 Agāb͕abasi uwa ọtọ, lutasia ya n’agha; n’ihi na Jehova ekwuwo okwu a.

4 Uwa eruwo újú kpọnwua, elu-uwa dum madu bi atalatawo kpọnwu kwa, ndi di elu nke ndi uwa atalatawo.

5 Emeruwo kwa uwa n’okpuru ndi bi ya; n’ihi na ha agabigawo iwu nile, b͕anwe ukpuru, mebie ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.

6 N’ihi nka ka ọb͕ub͕a-iyi ripiaworo uwa, ewe ma ndi bi nime ya ikpe: n’ihi nka ka ndi bi n’uwa reworo ọku, madu ole-na-ole we fọdu.

7 Manya-vine ọhu eruwo újú, osisi vine atalatawo, ndi nile nke nāṅuri ọṅu n’obi ezewo ume.

8 Obi-utọ nke egwú-otiti nile akwusiwo, nkpọtu nke ndi nāṅuri ọṅu-agha agwuwo obi-utọ nke ubọ-akwara akwusiwo.

9 Ha agaghi-eji abù ṅu manya-vine; ihe-ọṅuṅu nke nābà n’anya gādi ndi nāṅu ya ilu.

10 Etipiawo obodo nke ihe tọb͕ọrọ n’efu: emechiwo ulo nile ọ bula, ka madu we ghara ibata.

11 Iti-nkpu di n’èzí nile n’ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n’ala ọzọ.

12 Nke fọduru n’obodo bu ebe tọb͕ọrọ n’efu, ọ bu kwa ntikpọ ka eji tie ọnu-uzọ-ama.

13 N’ihi na otú a ka ọ gādi n’etiti uwa n’etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo.

14 Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n’ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n’oké osimiri tisie nkpu ike.

15 N’ihi nka sọpurunu Jehova n’ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n’ala nile nke di oké osimiri buruburu.

16 Site na nsọtu uwa ka ayi nuworo abù ọma di iche iche, ima-nma diri onye ezi omume. M’we si, Ọtita-aru dirim, ọtita-aru dirim, ahuhu dirim! ndi-nghọb͕u aghọb͕uwo; e, ihe-nghọb͕u ka ndi-nghọb͕u jiworo ighọb͕u.

17 Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi n’uwa.

18 Ọ gēru kwa, na onye ahu nke nāb͕anari olu oké egwu ahu gādabà n’olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n’etiti olùlù ahu, agējide ya n’ib͕udu ahu: n’ihi na window nile nke di n’elu ka emegheworo, ntọ-ala nile nke uwa ewe me nkpatu.

19 Anyajisiwo uwa, emebisiwo uwa, ewezugasiwo uwa n’ọnọdu-ya.

20 Uwa gāṅaghari nke-uku dika onye ṅubigaworo manya ókè, ọ gādaghari dika ulo-ọnọdu-abali; njehie-ya gādi kwa arọ́ n’aru ya, o we da, ghara ibili kwa ọzọ.

21 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na Jehova gēwere nmehie nke usu-ndi-agha nke ebe di elu leta ha n’ebe di elu, Ọ gēwere kwa nmehie nke ndi-eze nke uwa leta ha n’elu uwa.

22 Ewe chikọta ha, dika esi achikọta ndi-nkpọrọ n’olùlù, agēmechibido kwa ha n’ulo-nkpọrọ, mb͕e ubọchi gasiri agēleta ha.

23 Ọnwa gēnwe kwa iru-ihere, ihere gēme kwa anyanwu; n’ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha aghọwo eze n’ugwu Zaion, na nime Jerusalem, ọ bu kwa n’iru ndi-okenye-Ya ka nsọpuru gādi.

Categories
AISAIA

AISAIA 25

1 Jehova, Chinekem ka I bu; m’gēme ka I di elu, m’gēkele aha-Gi; n’ihi na I mewo ihe-ebube, bú ndum-ọdu di iche iche site na mb͕e di anya gara aga, n’ikwesi-ntukwasi-obi na ezi-okwu.

2 N’ihi na I mewo ka obodo ghọ obo-ihe; I mewo ka obodo ewusiri ike ghọ ebe dara ada: I mewo ka ulo-elu nke ndi ala ọzọ ghara ibu obodo; rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewu ya.

3 N’ihi nka ka ndi di ike gāsọpuru Gi, obodo nke ndi-mba ndi nēme ka madu ma jijiji gātu egwu Gi.

4 N’ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n’oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n’okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.

5 Dika okpom-ọku n’ebe kpọrọ nku, otú a ka I gēme ka nkpọtu nke ndi ala ọzọ darue ala; dika okpom-ọku site na ǹdò nke igwe-oji, otú a ka agēweda abú ọma nke ndi nēme ka madu ma jijiji.

6 Ọ bu kwa n’ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n’umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma.

7 Ọzọ, n’ugwu a ka Ọ gēloda iru ihe-nfuchi ahu eji afuchi ndi nile di iche iche, na ihe-nkpuchi ahu eji ekpuchi mba nile.

8 O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n’iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n’elu uwa nile: n’ihi na Jehova ekwuwo ya.

9 Agāsi kwa n’ubọchi ahu, Le, Chineke-ayi ka Nka bu; ayi elewo anya Ya, Ọ gāzọputa kwa ayi: Nka bu Jehova; ayi elewo anya Ya, ka ayi tegharia egwú ọṅù ṅuri kwa na nzọputa-Ya.

10 N’ihi na aka Jehova gānọgide n’ugwu a, ewe zọda Moab n’ọnọdu-ya, dika esi azọda okporo-ọka nime miri nke olùlù ikpo ǹsí-anu.

11 Ọ gāb͕asa kwa aka-ya abua n’etiti ya, dika onye nēgwu miri si ab͕asa aka-ya igwu miri: ma Ọ gēme ka npako-ya di ala, ya na ọlu-aghughọ nile nke aka-ya abua.

12 Ọzọ, ebe ewusiri ike nke ulo-elu nke mb͕idi-gi nile ka O budaworo, me ka ọ di ala, me ka ọ darue ala, ọbuná rue ájá.

Categories
AISAIA

AISAIA 26

1 N’ubọchi ahu ka agābù abù a n’ala Juda: Obodo siri ike ka ayi nwere; nzọputa ka O gēdo ka ọ buru mb͕idi-ya nile na ékpè-ya.

2 Meghenu ọnu-uzọ-ama nile, ka mba nke nēme ezi omume nke nēdebe ikwesi-ntukwasi-obi nile we ba nime.

3 I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n’udo: n’ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.

4 Tukwasinu obi na Jehova rue mb͕e nile ebighi-ebi: n’ihi na Ja Jehova bu oké nkume nke mb͕e nile ebighi-ebi.

5 N’ihi na O budawo ndi bi n’elu, bú obodo di elu: Ọ nēme ka ọ di ala, Ọ nēme ka ọ di ala ọbuná rue ala: Ọ nēme ka ọ darue ájá.

6 Ukwu gāzọda ya; bú ukwu abua nke onye ewedara n’ala, ha na nzọ-ukwu nke ndi nēnweghi ike.

7 Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari.

8 Ọzọ, n’uzọ nke ikpé-Gi nile, Jehova, ka ayi leworo anya Gi: aha-Gi na ncheta-Gi nāti nkpuru-obi-ayi akpiri.

9 Na nkpuru-obim ka akpiri Gi nātim n’abali; e, mọm nke di nimem ka m’gēji chọsie Gi ike: n’ihi na mb͕e ikpé-Gi nile nādakwasi uwa, ezi omume ka ndi bi n’elu-uwa dum madu bi mutaworo.

10 Asi na emere onye nēmebi iwu amara, ọ gaghi-amuta ezi omume; n’ala nke izi-ezi nile ọ gēme ajọ omume, ma ọ gaghi-ahu idi-elu nke Jehova.

11 Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.

12 Jehova, I gēdoro ayi udo: n’ihi na ọ bu kwa ọlu nile nke ayi ka I luworo ayi.

13 Jehova, Chineke-ayi, ndi nwenu ọzọ enwewo ayi, ọ bughi nání Gi; ma ọ bu nání site na Gi ka ayi gēhota aha-Gi.

14 Ndi nwuru anwu adighi-adi ndu; ndi nādighi ndu adighi-ebili: n’ihi nka ka I letaworo ha we kpochapu ha, me ka ncheta nile nke diri ha la n’iyì.

15 I tukwasiwo madu na mba nka, Jehova, I tukwasiwo madu na mba nka; I natawo nsọpuru: I mewo ka nsọtu nile nke ala di anya.

16 Jehova, n’ahuhu ka ha letaworo Gi, ha takwuru ntakwu n’ekpere nke-uku mb͕e idọ-aka-na-nti-Gi ruru ha aru.

17 Dika nwayi nke di ime, nke gaje imu nwa, si ab͕ali nb͕ali, tie nkpu n’aru-ufu-ya nile; otú a ka ayi diworo n’iru Gi, Jehova.

18 Ayi adiwo ime, ayi ab͕aliwo nb͕ali, ayi amuwo dika agāsi na ọ bu ifufe; ọ bughi ebe nzọputa ka ayi nēme ala; adighi-amuputa kwa ndi ganēbi n’elu-uwa dum madu bi.

19 Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọṅù, unu ndi bi n’ájá: n’ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādighi ndu.

20 Bia, ndim, bata n’ime-ulo-gí nile, mechibido uzọ-gi nile n’azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mb͕e oké iwe gāgabiga.

21 N’ihi na, le, Jehova nēsi n’ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n’uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.

Categories
AISAIA

AISAIA 27

1 N’ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n’oké osimiri.

2 N’ubọchi ahu: Otù ubi-vine nke manya-vine nāsu ufufu, tienu nkpu ọṅù bayere ya.

3 Mu onwem, Jehova, bu onye-nche-ya; na mb͕e nile ọ bula dikasiri ntà ka M’nēdè ya miri: ka onye ọ bula we ghara iji ihe ọjọ leta ya, abali na ehihie ka M’nēche ya.

4 Ọnuma adighi nimem: ọ gādim nọ̄ nma ma ogwu na uke gēmegidem n’agha! M’gāwaku ha, M’gēsurekọta ha n’otù.

5 Ma-ọbu, ya jide ebem siri ike, ọ gēme ka Mu na ya di n’udo; e, ọ gēme ka Mu na ya di n’udo.

6 N’ọdi-n’iru Jekob gāb͕a nkpọrọgwu: Israel gāb͕awa okoko dika osisi, ma ifuru: ha we mejue iru elu-uwa dum madu bi n’ihe-omume.

7 Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya?

8 N’ọtùtù, mb͕e I nēzilaga ya, ka Gi na ya nēse okwu: O jiwo ifufe-Ya siri ike wepu ya n’ubọchi ifufe Iru-anyanwu.

9 N’ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ.

10 N’ihi na obodo ewusiri ike nọ nání ya, ebe-obibi ajuru aju na nke arapuru arapu, dika ọzara: n’ebe ahu ka nwa-ehi gāta nri, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ọ gāmakpu, richapu alaka-ya nile.

11 Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n’ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n’ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n’aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.

12 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na Jehova gētichapu nkpuru-ọka-Ya, site na miri nērù ọku ọku nke Osimiri rue miri-iyi Ijipt, ewe chikọta unu onwe-unu n’otù n’otù, unu umu Israel.

13 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na agāfù opì-ike uku; ha gābia kwa, bú ndi nāla n’iyì n’ala Asiria, na ndi achusara achusa n’ala Ijipt; ha gākpọkwa isi ala nye Jehova n’ugwu nsọ ahu nime Jerusalem.

Categories
AISAIA

AISAIA 28

1 Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n’isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u!

2 Le, otù onye di ike nke nwere ume ka Onye-nwe-ayi nwere; dika oké miri-ozuzo nke ákú-miri-ígwé, dika oké ifufe nke nēfechapu efechapu, dika oké miri-ozuzo nke miri di ike nērubiga ókè, otú a ka o jiworo ihe-ike tọb͕o ihe n’ala.

3 N’okpuru ukwu ka agāzọda okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè:

4 okoko-ọhia nke nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n’isi nke ndagwurugwu di urù, gādi kwa ka nkpuru-fig buru uzọ cha tutu mb͕e okpom-ọku erue; nke mb͕e onye ọ bula nke nāhu ya anya nāhu, mb͕e ọ nādi n’ọbu-aka-ya o lo ya.

5 N’ubọchi ahu Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāghọrọ ndi-Ya fọduru okpu-eze nke mara nma, na okpu ọma nke ima-nma:

6 Ọ gāghọ-kwa-ra onye nānọkwasi n’oche ikpé mọ nke ikpé, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi nāchughachi ndi nēbu agha rue ọnu-uzọ-ama idi-ike.

7 Ma ọbuná ndia adaghariwo site na manya-vine, ọ bu kwa site n’ihe-ọṅuṅu nābà n’anya ka ha ṅaghariworo; onye-nchu-àjà na onye-amuma adaghariwo site n’ihe-ọṅuṅu nābà n’anya, manya-vine elodawo ha, ha aṅaghariwo site n’ihe-ọṅuṅu nābà n’anya; ha adaghariwo n’ọhuhu, ha asuwo ngọngọ n’ihe nile ekpere n’ikpe.

8 N’ihi na table nile juputara n’ihe-ọb͕ub͕ọ ruru inyi, ọ dighi ebe di ọcha.

9 Ònye ka ọ gēzí ihe-ọmuma? ọ̀ bu kwa onye ka ọ gēme ka ọ ghọta ihe anuru? ọ̀ bu ndi emeworo ka ha rapu iṅu miri-ara, ndi anapuru ara?

10 N’ihi na ọ bu ihe enyere n’iwu tukwasi ihe enyere n’iwu, ihe enyere n’iwu tukwasi ihe enyere n’iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī n’ebe a, nwantī n’ebe ahu.

11 N’ezie site n’isu-nsu nke eb͕ub͕ere-ọnu na site n’ire di iche ka Ọ gāgwa ndi nka okwu:

12 bú Onye siri ha, Nka bu izu-ike ahu, menu ka onye ike gwuru zuru ike; nka bu kwa igba ume ahu: ma ha ekweghi inu.

13 Okwu Jehova gābu-kwa-ra ha ihe enyere n’iwu tukwasi ihe enyere n’iwu, ihe enyere n’iwu tukwasi ihe enyere n’iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī ebe a, nwantī ebe ahu; ka ha we je, su ngọngọ da n’azu, ewe tijie ha, ha ama n’ọnyà, ejide ha.

14 N’ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi nākwa emò, ndi nāchi ndi nka bi na Jerusalem:

15 N’ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n’ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n’okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:

16 n’ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, abum onye tọworo ntọ-ala na Zaion, bú otù nkume, nkume nke ọnwunwa, nkume-nkuku di oké ọnu-ahia nke bu ntọ-ala siri ike: onye nēkwere agaghi-ewere ọsọsọ b͕alaga.

17 M’gēme kwa ka ikpé buru eriri, me kwa ka ezi omume buru ihe-ọtùtù: ákú-miri-ígwé ewe kpochapu ebe-nb͕abà nke okwu-agha, miri gēruchapu kwa ebe-nzuzo.

18 Agēhichapu kwa ọb͕ub͕a-ndu unu na ọnwu b͕ara, nkwa unu na ala-mọ kweritara agaghi-eguzosi kwa ike; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, unu gāghọ-kwa-ra ya ebe-nzọda.

19 Mb͕e ọ bula ọ nāgabiga ọ gējide unu; n’ihi na kwa-ututu ka ọ gāgabiga, n’ehihie na n’abali: o we buru nání ọma-jijiji ighọta ihe anuru.

20 N’ihi na ihe-ndina di nkpunkpu kari nke madu gēsetipusi onwe-ya n’elu ya; ákwà-nkpuchi di kwa warara kari nke madu gāfuchi onwe-ya.

21 N’ihi na dika n’ugwu Perazim, otú a ka Jehova gēbili; dika na ndagwurugwu Gibeon, otú a ka Ọ gēwe oké iwe; ilu ọlu-Ya – nke onye ala ọzọ ka ọlu-Ya bu; na ifè òfùfè-Ya – nke onye ala ọzọ ka òfùfè-Ya bu.

22 Ma ub͕u a, unu aghọla ndi nākwa emò, ka ab͕u-unu we ghara isi ike: n’ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka m’nuworo n’ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n’elu uwa nile.

23 Genu nti, nu kwa olum; ṅanu nti, nu kwa okwu-ọnum.

24 Ọ̀ bu ubọchi nile ka onye-plough nēgwu ala igha nkpuru? ọ̀ bu ubọchi nile ka ọ nēgwughe nēme ka ala-ubi-ya di lari?

25 Ọ buru na o mewo ka iru-ya di lari, ọ̀ dighi-aghasa fitch, gha cummin, kua ọka wheat n’ahiri, gha ọka barley n’ebe akara àkà, gha ọka spelt n’ókè-ala-ya?

26 N’ihi na Chineke-ya nādọ ya aka na nti iluzi aluzi, O nēzí ya ihe.

27 N’ihi na ejighi ihe di nkọ zọcha fitch, adigh-akpore kwa wheel nke ub͕ọ-ala buruburu n’elu cummin; kama ọ bu nkpa-n’aka ka eji ticha fitch, ọ bu kwa ndele ka eji ticha cummin.

28 Ànāsupia ọka eji eme achicha? é-è, n’ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ ganāzọchasi ya ike, me ka wheel nke ub͕ọ-ala-ya na inyinya-ya nile gagharia n’elu-ya; ọ dighi-asupia ya.

29 Nka site-kwa-ra n’aka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, O mewo ka ndum-ọdu di ebube, O mewo ka nzube-ihe di uku.

Categories
AISAIA

AISAIA 29

1 Ahuhu gādiri Eriel, Eriel, bú obodo ebe Devid mara ulo-ikwū-ya! Tukwasinu arọ n’arọ; ka ememe nile b͕agharute na mb͕e-ha:

2 M’gākpab͕u kwa Eriel, ize-ume na isu-ude gādi kwa: o we dirim ka Eriel.

3 M’gāma kwa ulo-ikwūm buruburu megide gi, were ulo-agha nọchigide gi, wulie ihe-nnọchigide-n’agha imegide gi.

4 Ewe me ka i di ala, site n’ala ka i gēkwu, ọ bu kwa n’ájá ka okwu-ọnu-gi gēsi puta, di ala; olu-gi gādi kwa ka onye nāju mọ ihe, ọ gēsi n’ala puta, okwu-ọnu-gi gēsi kwa n’ájá be ka umu-nnunu.

5 Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n’otù ntabi-anya na mberede.

6 Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēji éb͕è-elu-igwe, ji kwa ala-ọma-jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku uku, na ire-ọku nke -ọku nērichapu erichapu, leta ya.

7 Dika nrọ, bú ọhù nke abali, otú a ka ha gādi kwa, bú ìgwè mba nile ndi nēbuso Eriel agha, bú ndi nile nēbuso ya na ebe-ya ewusiri ike agha, nākpab͕u kwa ya.

8 Ọ gādi kwa ka mb͕e onye agu nāgu nārọ nrọ, ma, le, ọ nēri ihe; o we teta, ma nkpuru-obi-ya b͕ara aka: ma-ọbu dika mb͕e onye akpiri nākpọ nku nārọ nrọ, ma, le, ọ nāṅu miri; ọ we teta, ma, le, ọ dawo #mbà, nkpuru-obi-ya nāchọsi kwa ihe ike: otú a ka ìgwè mba nile gādi, ndi nēbuso ugwu Zaion agha.

9 Ka ọ b͕agwoju unu anya, ka o ju kwa unu anya; techienu anya-unu, ka etechi kwa anya-unu: ha aṅubigawo manya ókè, ma ọ bughi manya ka ha ṅubigara ókè; ha aṅaghariwo, ma ọ bughi ihe-ọṅuṅu nke nābà n’anya.

10 N’ihi na Jehova awukwasiwo unu mọ nke oké ura, we mechisie anya-unu ike, bú ndi-amuma; isi-unu, bú ndi-ọhù, ka O kpuchiwo-kwa-ra.

11 Ọhù a nile we diri unu ka okwu nke akwukwọ akasiri akàrà ike, nke anēnye onye mara akwukwọ, si, Biko, gua nka: o we si, Apughm, n’ihi na ihe akasiworo akàrà ike ka ọ bu:

12 ewe were akwukwọ ahu nye onye nāmaghi akwukwọ, si, Biko, gua nka: o we si, Amaghm akwukwọ.

13 Onye-nwe-ayi we si, N’ihi na ndi nka abiaruwo nso n’ọnu-ha, were kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ha sọpurum, ma ha emewo ka obi-ha di anya n’ebe M’nọ, egwu ha nāturum ewe buru ihe madu nyere n’iwu nke emere ka ha muta:

14 n’ihi nka, le, M’gaje ilu kwa oké ọlu ọzọ n’etiti ndi nka, bú oké ọlu na ọlu ebube: amam-ihe nke ndi-ha mara ihe gāla kwa n’iyì, nghọta nke ndi-nghọta-ha gēzobe kwa onwe-ya.

15 Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n’ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n’ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?

16 Le, ka unu si ekpù ihe iru nke-uku! Ọ̀ bu n’urọ ka agāgu ọkpu-ite? na ihe emere eme gēkwu okwu bayere onye meworo ya, si, O meghm; ma-ọbu na ihe akpuru akpu gēkwu okwu bayere onye kpuworo ya, si, Ọ ghọtaghi.

17 Ọ̀ bughi nwa mb͕e ntà fọduru, Lebanon ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n’oké ọhia?

18 Ndi nti chiri gānu kwa okwu nile nke akwukwọ n’ubọchi ahu, ọ bu kwa n’oké ọchichiri na n’ọchichiri ka anya ndi-ìsì gēsi hu uzọ.

19 Ndi di ume-ala n’obi gātukwasi kwa ihe n’ọṅù-ha nime Jehova, ndi-obeye n’etiti madu gēteghari kwa egwú ọṅù n’Onye Nsọ nke Israel.

20 N’ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya:

21 bú ndi nēme ka madu mehie site n’okwu-ha, ndi nēsi-kwa-ra onye nāba nba n’ọnu-uzọ-ama ọnyà, we were ihe tọb͕ọrọ n’efu wezuga onye ezi omume.

22 N’ihi nka ka Jehova, bú Onye b͕aputara Abraham, kwuru okwu bayere ulo Jekob otú a, si, Ihere agaghi-eme Jekob ub͕u a, iru-ya agaghi-ab͕aru kwa ub͕u a.

23 Ma mb͕e ọ nāhu umu-ya, bú ọlu akam abua, n’etiti ya, ha gēdo aham nsọ; e, ha gēdo Onye Nsọ nke Jekob nsọ, ọ bu kwa n’iru Chineke nke Israel ka ha gāma jijiji.

24 Ndi nākpafu na mọ-ha gāma kwa nghọta, ndi-ntamu gāmuta kwa ihe-nmuta.

Categories
AISAIA

AISAIA 30

1 Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n’akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie:

2 ndi nēje irida n’Ijipt, ma ha ajughi ase n’ọnum; ib͕alaga ọsọsọ n’ebe siri ike nke Fero, na ib͕abà na ǹdò Ijipt!

3 Ma ebe siri ike nke Fero gāghọrọ unu ihere, nb͕abà na ǹdò Ijipt gāghọ-kwa-ra unu itiye n’ọnọdu-ihere.

4 N’ihi na ndi-isi-ya anọwo na Zoan, ndi-ozi-ya nābiaru Hanes.

5 Ha nile gēme ihere otù ndi nādighi-abara ha urù, ndi nābughi ihe iye aka, nābughi kwa ihe iba urù, kama ha bu ihe-ihere, ọzọ kwa, ha bu ihe-ita-uta.

6 Ibu eboro anumanu nile nke Negeb.

N’ala ahuhu na nkpà, ebe nne-ọdum na oke-ọdum na aju-ala na agwọ yiri ọku nēfe efe si abia, ka ha nēbu àkù-ha nile n’ubu umu-inyinya-ibu, na ihe-ha nile di oké ọnu-ahia n’okpu-azu camel, ijekuru otù ndi nāgaghi-abara ha urù.

7 Ma Ijipt, nání otù nku-ume na ihe-efu ka iye-aka-ha bu: n’ihi nka ka M’kpọworo ala nka Rehab, ndi ahu bu nkwusi.

8 Ub͕u a, bata, dekwasi ya na mbadamba íhe n’etiti ha, kà kwa ya n’akwukwọ, ka o we diri ubọchi ọdi-n’iru rue mb͕e nile ebighi-ebi.

9 N’ihi na ndi nke nānupu isi ka ọ bu, umu nēkwu okwu-ugha, umu nēkweghi inu iwu Jehova:

10 ndi siworo ndi-ọhu-uzọ, Unu agaghi-ahu uzọ; ndi siwo-kwa-ra ndi-ọhù, Unu agaghi-ahuru ayi ihe ziri ezi n’ọhù-unu, gwanu ayi okwu ire-utọ nile, hunu ihe-ikwa-emò n’ọhù-unu:

11 Wezuganu onwe-unu n’uzọ, sinu n’okporo-uzọ wezuga onwe-unu, menu ka Onye Nsọ nke Israel kwusi iguzo n’iru ayi.

12 N’ihi nka ka Onye Nsọ nke Israel ji si otú a, N’ihi na unu juru okwu a, tukwasi obi na nmeb͕u na nsihie-uzọ, we nādabere ya;

13 n’ihi nka ajọ omume a gādiri unu ka nb͕awa nāda ada, nke nākwọputa akwọputa na mb͕idi di elu, nke ọ bu na mberede n’otù ntabi-anya ka ntipia-ya nābia.

14 Ọ gētiwa kwa ya dika esi etiwa ite ndi-ọkpu-ite nākpu, nke etipiara etipia, Ọ gaghi-enwe ọmiko: ewe ghara ichọta n’etiti ntipia-ya otù ejùjù iji guru ọku n’okpukpo-ntu, ma-ọbu iji kupu miri n’ọdọ-miri.

15 N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, siri, Nime nlata na izu-ike ka agāzọputa unu; n’inọ-jū na n’itukwasi-obi ka idi-ike-unu gādi: ma unu ekweghi.

16 Kama unu siri, É-è, n’ihi na inyinya ka ayi gānọkwasi b͕alaga; n’ihi nka unu gāb͕alaga: unu si-kwa-ra, Anu di ngwa ka ayi gānọkwasi; n’ihi nka ka ndi nāchu unu gādi ngwa.

17 Nnù abua na ọgu iri gēsi n’iru iba-nba nke otù onye b͕alaga; n’iru iba-nba nke madu ise ka unu gēsi b͕alaga: rue mb͕e unu gāfọdu dika otù osisi-ọkọlọtọ n’elu ugwu, na dika ọkọlọtọ n’elu ugwu ntà.

18 Ọ bu kwa n’ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n’ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n’aru unu: n’ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.

19 N’ihi na otù ndi gēbi na Zaion nime Jerusalem: i gaghi-akwa ákwá ọzọ ma-ọli: Ọ gēmere gi amara n’ezie n’olu iti-nkpu-gi; mb͕e Ọ nuru Ọ gāza gi otù mb͕e ahu.

20 Onye-nwe-ayi gēnye kwa unu nri ahuhu na miri nmeb͕u, ma ndi-ozizí-gi agaghi-ezobe onwe-ha ọzọ, kama anya-gi abua ganāhu ndi-ozizí-gi:

21 nti-gi abua gānu kwa okwu n’azu-gi, si, Nka bu uzọ, jenu ije nime ya; mb͕e unu nēche iru n’aka-nri, na mb͕e unu nēche iru n’aka-ekpe.

22 Unu gēmeru kwa ihe amachitara arusi ọla-ọcha gi nile apiri api, na ihe awuchitara arusi ọla-edo gi awuru awu: i gātusa ha dika ihe ruru inyi; i gāsi ya, Pua.

23 Ọ gēnye kwa míri-ozuzo nke nkpuru-ọghigha-gi, nke i gāgha n’ala-ubi-gi; na achicha nke ihe-omume nke ala-ubi, ọ gāma kwa abuba, ba uba: n’ubọchi ahu anu-ulo-gi nile gāta nri n’ebe-íta-nri sara mbara.

24 Ehi kwa na umu-inyinya-ibu nālu ubi gāta nri agwara agwa nke nnú di ya, nke ejiworo osekè na ihe-ifucha-ọka fucha ya.

25 N’elu ugwu ọ bula di elu na n’elu ugwu ntà ọ bula di elu ka iyi na ebe miri nērù gādi, n’ubọchi nke oké ob͕ub͕u, mb͕e ulo-elu nile gāda.

26 Ọzọ, ìhè ọnwa gādi ka ìhè anyanwu, ìhè anyanwu gādi kwa okpukpu asa, dika ìhè ubọchi asa, n’ubọchi Jehova gēkechi nkpaji akpajiri ndi-Ya, mb͕e Ọ gāgwọ kwa ọnyá etiputara n’otiti-ya.

27 Le, aha Jehova nēsi n’ebe di anya bia, nēre ọku n’iwe-Ya, nēwere kwa oké anwuru-ọku nākwugo akwugo: eb͕ub͕ere-ọnu-Ya juputara n’oké iwe, ire-Ya di kwa ọku nērichapu erichapu:

28 iku-ume-Ya di kwa ka iyi nērubiga ókè, rue olu ka ọ nēkewa, iji yọ nke ihe-efu yọcha mba nile: bridle nke nēdufu edufu gādi kwa n’àb͕à ndi di iche iche.

29 Abù ka unu gēnwe dika n’abali edoworo ememe nsọ; na ọṅù obi, dika nke onye ji ọ̀jà eje ibà n’ugwu Jehova, rue Oké Nkume nke Israel.

30 Jehova gēme kwa ka anu ebube nke olu-Ya, Ọ gēme kwa ka ahu ndakwasi nke ogwe-aka-Ya, n’ọnuma nke iwe-Ya, na ire-ọku nke ọku nērichapu erichapu, na ntupia, na oké miri-ozuzo, na ákú-miri-ígwé.

31 N’ihi na agēsite n’olu Jehova nyajisia Asiria, Ọ gēji ndele tib͕ue ya.

32 Ngabiga ọ bula nke nkpa-n’aka akara àkà, nke Jehova gēme ka ọ dakwasi ya, gādi kwa n’egwú-otiti na n’ubọ-akwara: ọ bu kwa n’agha di iche iche nke nfeghari ka Ọ gēbuso ha agha.

33 N’ihi na edowo otù Tofet n’usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.