Categories
AISAIA

AISAIA 11

1 Ome gēsi kwa n’ogwe-osisi Jesi puta, otù alaka nke sitere na nkpọrọgwu-ya gāmi kwa nkpuru:

2 Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n’aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova;

3 ọzọ, ihe nātọ ya utọ bu egwu Jehova: ọ bughi kwa dika anya-ya abua si ahu ka ọ gēkpe ikpe, ọ bughi kwa dika nti-ya abua si anu ka ọ gāba nba:

4 kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n’obi n’uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.

5 Ezi omume gābu kwa ihe-ọkiké ume-Ya, ikwesi-ntukwasi-obi gābu kwa ihe-ọkiké úkwù-Ya.

6 Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gānọ kwa, agu na nwa-ewu gāmakpukọ kwa; nwa-ehi na nwa-ọdum na nwa anu emere ka ọ ma abuba gādi kwa n’otù ebe; nwatakiri ganēdu kwa ha.

7 Nne-ehi na anu-ọhia bear gātakọ kwa nri; umu-ha gāmakpukọ: ọdum gāta kwa okporo-ọka dika ehi.

8 Nwa nāṅu ara gēgwuri kwa egwú n’elu ọnu aju-ala nọ, ọ bu kwa anya ubí ka nwa emere ka ọ rapu ara gātukwasi aka-ya.

9 Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n’ugwu nsọm nile: n’ihi na ihe-ọmuma Jehova gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri.

10 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.

11 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na Onye-nwe-ayi gēseti kwa aka-Ya ọzọ nke ub͕ò abua inweta ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n’Asiria, site kwa n’Ijipt, site kwa na Patros, site kwa na Kush, site kwa n’Ilam, site kwa na Shaina, site kwa na Hemat, site kwa n’agwe-etiti nile nke oké osimiri.

12 Ọ gēbuli-kwa-ra mba nile ọkọlọtọ, we chikọta ndi Israel achupuru achupu, ndi Juda b͕asara ab͕asa ka Ọ gēsi na nkuku anọ nke uwa kpọkọputa kwa.

13 Ekworo nke Efraim gēwezuga kwa onwe-ya, agēbipu kwa ndi nākpab͕u Juda: Efraim agaghi-ekwoso Juda ekworo, Juda agaghi-akpab͕u kwa Efraim.

14 Ha gēfedakwasi n’ubu ndi Filistia n’Ọdida-anyanwu; ha abua gādi n’otù luta ihe umu Iru-anyanwu n’agha: n’aru Edom na Moab ka ha ganēseti aka-ha; umu Amon ganānu kwa olu-ha.

15 Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n’elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n’akpukpọ-ukwu.

16 Uzọ atuliri atuli gādi-kwa-ra ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n’Asiria; dika o si diri Israel n’ubọchi o siri n’ala Ijipt rigoputa.

Categories
AISAIA

AISAIA 12

1 I gāsi kwa n’ubọchi ahu, M’gēkele Gi, Jehova; N’ihi na ọ bu ezie na I wesaram iwe, ma iwe-Gi alaghachiwo azu, I we kasiem obi.

2 Le, Chineke bu nzọputam; m’gātukwasi Ya obi, ghara itu egwu: n’ihi na ikem na abù ọmam ka Ja JEHOVA bu; O we ghọrọm nzọputa.

3 Unu gēji kwa obi-utọ seputa miri n’isi-iyi nile nke nzọputa.

4 Unu gāsi kwa n’ubọchi ahu, Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya, menu ka amara omume-Ya nile n’etiti ndi nile di iche iche, hotanu na emewo ka aha-Ya di elu.

5 Bùkuenu Jehova abù ọma; n’ihi na ihe-ọkaka ka O meworo: emewo ka amara nka n’uwa nile.

6 Tisie nkpu ike, kpọ nkpu ọṅù, gi nwanyi bi na Zaion n’ihi na onye uku n’etiti gi ka Onye Nsọ nke Israel bu.

Categories
AISAIA

AISAIA 13

1 Ibu eboro Babilon, nke Aisaia nwa Emoz huru.

2 Bulienu ọkọlọtọ n’elu ugwu nke osisi nādighi, welierenu ha olu, fenu aka, ka ha we ba n’ọnu-uzọ nile nke ndi amara aha-ha.

3 Mu onwem enyewo ndim edoworo nsọ iwu, akpọwokwam ndi-dikem imezu ihe iwem chọrọ, bú ndim nāṅuri ọṅu-agha nime npako.

4 Nuru olu ìgwè n’ugwu nile, yiri nke ndi bara uba! nuru olu nkpotu ala-eze nile nke mba nile achikọtaworo! Jehova nke usu nile nke ndi-agha nāgukọta usu-ndi-agha ibu agha.

5 Ha nēsi n’ala di anya abia, na nsọtu elu-igwe, bú Jehova na ihe-agha nile nke oké iwe-Ya, emebi ala nka nile.

6 kwasienu ákwá ike; n’ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n’aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.

7 N’ihi nke a-aka nile gākuda, obi ọ bula nke madu gālọ kwa ya miri:

8 ha gāma kwa jijiji; aru-ufu na ihe-nb͕u ka ha gēnwezu; dika nwanyi ime nēme, otú a ka ha gāb͕ali: ọ gēju ha anya, otù n’ebe ibe-ya nọ; iru nke bu nání ire-ọku ka iru-ha gābu.

9 Le, ubọchi Jehova, bú ubọchi nēnweghi obi-ebere, nābia, ya na nrubiga-ókè nke iwe na iwe di ọku; ime ka ala nka ghọ ebe tọbọrọ n’efu na ikpochapu ndi-nmehie nime ya.

10 N’ihi na kpakpando nile nke elu-igwe na Oriọna-ha nile agaghi-eme ka ìhè-ha nwue: anyanwu gāb͕a ọchichiri n’ọwuwa-ya, ọzọ, ọnwa agaghi-eme ka ìhè-ya tie.

11 M’gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M’gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M’gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.

12 M’gēme ka madu di ukọ kari ọla-edo anuchara anucha, ọbuná madu efu kari ọla-edo ọma nke Ofia.

13 N’ihi ya ọbuná elu-igwe ka M’gēme ka ha ma jijiji, uwa gēme kwa nkpatu pua n’Ọnọdu-ya, nime nrubiga-ókè nke iwe Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na n’ubọchi iwe-Ya di ọku.

14 Ọ gēru kwa, na ha gēche iru, onye ọ bula n’ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula rue ala-ya, dika mb͕ada anāchu achu, na dika ìgwè ewu na aturu, nke ọ nādighi onye nāchikọta ha.

15 Onye ọ bula anāchọta, amapue ya; onye ọ bula anējide, ọ da site na mma-agha.

16 Agātupia kwa umu-ha nāṅu ara n’anya-ha; agāpunara ha ulo-ha, merua ndinyom-ha.

17 Le, M’nākpọte ndi Midia imegide ha, ndi nādighi-agu ọla ọcha n’ihe, ọla-edo kwa, ọ dighi-atọ ha utọ.

18 Uta-ha nātupia kwa umu-okorọbia; ha adighi-enwe kwa obi-ebere n’aru nkpuru nke afọ; anya-ha adighi-emekwara umu ebere.

19 Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.

20 Ọ gaghi-abu ebe-obibi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ebi kwa nime ya rue ọb͕ọ nile: onye Arebia agaghi-ama kwa ulo-ikwū-ya n’ebe ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-eme kwa ka aturu-ha makpue n’ebe ahu.

21 Ma anu-ọhia di iche iche bi n’ala kpọrọ nku gāmakpu n’ebe ahu; ulo-ha gējuputa kwa n’okwukwu; enyi-nnunu gēbi kwa n’ebe ahu, nkpi gāmali kwa elu n’ebe ahu.

22 Anu-ọhia nēbe ebe gāzarita kwa onwe-ha n’ulo ọma ya nile, nkita-ọhia kwa n’ulo uku nile nke ihe-utọ: mb͕e-ya di kwa nso ibia, agaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo.

Categories
AISAIA

AISAIA 14

1 N’ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n’aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n’ala-ha: ọbìa gārapara kwa n’aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n’otù.

2 Ndi nile di iche iche gēkuru kwa ha, me ka ha biarue ọnọdu-ha: ulo Israel gēketa kwa ha n’ala Jehova ibu ndi-orù na ibu ndinyom nēje ozi: ha gāghọ kwa ndi nādọta ndi nādọta ha-ri n’agha n’agha; ha gēnwe kwa ike n’aru ndi nāchi ha-ri n’ihe-ike.

3 Ọ gēru kwa, n’ubọchi Jehova gēme ka i zu ike pua n’ihe-nb͕u-gi, na n’ihe-nwute-gi, na n’òfùfè ahu siri ike nke emere ka i fè nime ya,

4 na i gātu ilu a megide eze Babilon, si, Le, otú onye nāchi n’ihe-ike kwusiworo! le, otú obodo ọla-edo kwusiworo!

5 Jehova anyajiwo nkpa-n’aka nke ndi nēmebi iwu, ndele nke ndi nāchi achi;

6 nke were ntib͕u nēwezugaghi onwe-ya etib͕u ndi nile di iche iche nime nrubiga-ókè nke iwe, nke were nzogbu anēb͕ochighi azọb͕u mba nile n’iwe.

7 Uwa nile ezuwo ike, di jū: ha etiwawo nkpu ọṅù.

8 Ọbuná osisi fir aṅuriwo ọṅu megide gi, ha na osisi cedar nke Lebanon, si, Site na mb͕e i dinaworo, onye-nb͕utu adighi-arigota megide ayi.

9 Ala-mọ site n’okpuru emeworo gi nkpatu izute gi n’ọbibia-gi: ọ nākpọtere gi ndi nādighi ndu, bú nkpi nile nke uwa; o mewo ka eze nile nke mba nile si n’oche-eze-ha bilie.

10 Ha nile gāza, si gi, Gi onwe-gi kwa, èmewo ka i ghara ídi ike dika ayi? ì ghọwo onye yiri ayi?

11 Emewo ka nbili-elu-gi ridarue ala-mọ, ya na olu une-gi nile: n’okpuru gi ka ab͕asaworo ikpuru, ihe-nkpuchi-gi bu kwa ikpuru.

12 Le, otú i siworo n’elu-igwe da, gi Lusifa, nwa chi-ọbubọ! le, otú eb͕utuworo gi n’ala, gi onye nēme ka ike gwu mba nile!

13 Gi onwe-gi we si n’obi-gi, N’elu-igwe ka m’gārigo, n’elu kpakpando nile nke Chineke ka m’gēbuli oche-ezem; m’gānọkwasi kwa n’ugwu nzukọ, na nsọtu nile nke Ugwu:

14 m’gārigo n’elu ebe nile di elu nke igwe-oji; m’gēyi Onye kachasi ihe nile elu.

15 Otú ọ di, rue ala-mọ ka agēme ka i rida, rue nsọtu nile nke olùlù.

16 Ndi nāhu gi gēlegide gi anya, lekwasi gi anya, si Ọ̀ bu nka bu nwoke ahu nke nēme ka uwa ma jijiji, nke nēme ka ala-eze di iche iche me nkpatu;

17 nke mere elu-uwa dum madu bi ka ọ di ka ọzara, nke kwada-kwa-ra obodo-ya nile; nke nātọpughi ndi-nkpọrọ-ya ka ha la?

18 Eze nile nke mba nile, ọbuná ha nile, edinawo n’ala nime nsọpuru, onye ọ bula n’ulo-ya.

19 Ma gi onwe-gi, esiwo n’ílì-gi tupu gi dika alaka nke bu ihe-árú, yiri ndi eb͕uru eb͕u dika uwe, bú ndi ejiworo mma-agha dupú, ndi nāridaru nkume nke olùlù; dika ozu azọrọ ukwu.

20 Gi na ha agaghi-abu otù n’olìlì, n’ihi na ala-gi ka i bibiworo, ndi-gi ka i b͕uworo; nkpuru nke ndi nēme ihe ọjọ, agaghi-akpọ aha-ha rue mb͕e ebighi-ebi.

21 Dozierenu umu-ya ebe-ob͕ub͕u n’ihi ajọ omume nke ndi bu nna-ha; ka ha we ghara ibili, nweta uwa, me ka elu-uwa dum madu bi juputa n’obodo.

22 M’gēbili kwa megide ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M’gēbipu kwa na Babilon aha na ndi fọduru, na umu na umu umu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

23 M’gēme kwa ya ka ọ ghọ ihe-nnweta nke ebinta, na ọdọ-miri ọdọ-miri; M’gewere kwa aziza, bú nkpochapu, zachapu ya; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

24 Jehova nke usu nile nke ndi-agha aṅuwo iyi, si, N’ezie dika M’chèworo, otú a ka ọ gādi; na dika M’zubeworo, nke ahu gēguzosi ike:

25 na M’gētipia Asiria n’alam, ọ bu kwa n’elu ugwum nile ka M’gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n’olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n’elu ubu-ha wezuga onwe-ya.

26 Nka bu nzube ahu nke anēzube n’elu uwa nile: nka bu kwa aka ahu nke anēseti n’aru mba nile.

27 N’ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo; ònye gēmebi kwa ya? aka-Ya esetiwo kwa; ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu.

28 N’arọ ọnwu eze, bú Ehaz, ka ibu a di.

29 Aṅurila ọṅu, gi Filistia, ka i ra, n’ihi na anyajiwo ndele nke nēti gi-ri: n’ihi na ihe nke gēsi na nkpọrọgwu agwọ puta bu ubí, nkpuru-ya gābu kwa agwọ yiri ọku nēfe efe.

30 Ndi bu ọkpara nke ndi nēnweghi ike gāzù kwa onwe-ha dika aturu, ndi-ob͕eye gāmakpu kwa na ntukwasi-obi: ma M’gēme ka nkpọrọgwu-gi nwua site n’oké unwu, ọ bu kwa ndi-gi fọduru ka o gēb͕u.

31 Kwasie ákwá ike, gi ọnu-uzọ-ama; tie nkpu, gi obodo; i b͕azewo, Filistia, ka i ra; n’ihi na n’Ugwu ka anwuru-ọku si bia, ọ dighi kwa onye ọ bula nēguzo iche na mb͕e-ya nile akara àkà.

32 Gini kwa ka madu gāza ndi-ozi nke mba? Na Jehova atọwo ntọ-ala Zaion, ọ bu kwa nime ya ka ndi ewedara n’ala nke ndi-Ya gāb͕abà.

Categories
AISAIA

AISAIA 15

1 Ibu ebero Moab.

N’ihi na n’otù abali ka ebibiworo Ai nke Moab, me ka ọ la n’iyì; n’ihi na n’otù abali ka ebibiworo Kia nke Moab, me ka ọ la n’iyì.

2 Ọ rigowo n’ulo, ọbuná Dibon, n’ebe-ya di elu, ikwa ákwá: n’aru Nebo na n’aru Medeba ka Moab nākwasi ákwá ike: n’isi-ha nile ka nkwọcha-isi di, afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo.

3 N’èzí-ya nile ka ha keworo ákwà-nkpe: n’elu ulo-ya nile na n’amá-ya nile ka onye ọ bula nākwasi ákwá ike, nākwab͕u onwe-ya.

4 Heshbon nēti kwa nkpu, ya na Eleale: rue Jehaz ka anānu olu-ha: n’ihi nka ndi ejikere ibu agha nke Moab nētisi nkpu ike; nkpuru-obi-ya nāma jijiji nime ya.

5 Obim nētiri Moab nkpu; ndi-ọ̀sọ́-ya, nāb͕a ọsọ rue Zoa, rue Eglat-shelishiya: n’ihi na nrigo Luhit, o ji ikwa-ákwá arigo na ya; n’ihi na n’uzọ Horonaim ka ha nētisi nkpu ntikpọ ike.

6 N’ihi na miri Nimrim gābu nání ebe tọb͕ọrọ n’efu: n’ihi na ahihia akpọnwuwo, ahihia ndu agwusiwo, akwukwọ ndu adighi.

7 N’ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara, na ihe ha kpakọbaworo, n’ofè iyi osisi willow ka ha gēbulaga ha.

8 N’ihi na iti-nkpu adazuwo udà n’ókè-ala Moab buruburu; n’Eglaim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo, ọ bu kwa na Bia-ilim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo.

9 N’ihi na miri Dimon juputara n’ọbara: n’ihi na M’gātukwasi kwa n’aru Dimon ihe ọzọ, ndi Moab nke b͕apuru ab͕apu ka M’gātukwasiri ọdum, tukwasi-kwa-ra ndi ala-ha fọduru.

Categories
AISAIA

AISAIA 16

1 Sinu na Sela n’uzọ ọzara zigara onye nāchi ala umu-aturu, rue ugwu ada Zaion.

2 O gēru kwa na, dika anu-ufe nke nēfefu efefu, dika akwu-nnunu achusara achusa, otú a ka umu-ndinyom Moab gādi na ngabiga-miri diri Anon.

3 Dua ọdu, menu ihe ekpere n’ikpe; me ka ǹdò-gi di ka abali n’etiti oké ehihie: zobe ndi achupuru achupu; ekpughela onye nāwaghari.

4 Ka ndim achupuru achupu nọ dika ọbìa n’etiti gi; Moab, ghọrọ ya ebe nzuzo izopu ya n’iru onye nāpunara ya ihe: n’ihi na onye-nkpab͕u nwere ọgwugwu, ihe-ike agwusiwo, ndi nāzọda madu agwuchapuwo n’ala.

5 Agēme kwa ka otù oche-eze guzosie ike n’ebere, otù onye gānọkwasi kwa ya n’ezi-okwu, n’ulo-ikwū Devid; bú onye nēkpe ikpe, nāchọ kwa ikpé ziri ezi, nēme kwa ngwa ime ezi omume.

6 Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu.

7 N’ihi nka ka Moab gākwasiri Moab ákwá ike, ọ gākwasi ákwá ike, ka ọ ra: iri mbadamba nkpuru-vine nke Kia-hareset ka unu gātamu ntamu, ebe unu bu nání ndi apiaworo ihe.

8 N’ihi na ubi nile nke Heshbon nātalata, ha na osisi vine nke Sibma; ndi-nwe mba nile ka osisi vine ya kachasi nma tib͕uworo; ọbumá na Jeza ka ha ruru, ha waghariri n’ọzara; alaka-ya wasara awasa, ha gabigara oké osimiri.

9 N’ihi nka m’gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m’gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n’ihi na n’elu nghọkọta-nkpuru-gi na n’elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo.

10 Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọǹù n’ubi ọma; agaghi-eti kwa nkpu ọṅù tisie ya ike n’ubi-vine nile: onye-nzọcha agaghi-azọchaputa manya-vine n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile; emewom ka iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine kwusi.

11 N’ihi nka ngiri-afọm nādara Moab udà dika ubọ-akwara, ime-afọm nāda-kwa-ra Kia-heres.

12 O gēru kwa, mb͕e o mere ka ahu ya, mb͕e ike gwuru ya, bú Moab, n’elu ebe-ya di elu, mb͕e ọ gābiaru ebe nsọ ya ikpe ekpere, na ọ gaghi-enwe ike.

13 Nka bu okwu ahu nke Jehova kwuru bayere Moab na mb͕e gara aga.

14 Ma ub͕u a Jehova ekwuwo, si, N’arọ atọ, dika arọ onye egoro ọlu, ka agēlelì nsọpuru Moab, ya na ìgwè madu-ya nile bara uba; ndi fọduru gādi kwa ntà nke-uku, nādighi ike.

Categories
AISAIA

AISAIA 17

1 Ibu eboro Damaskọs.

Le, ewezugawo Damaskọs n’ibu obodo, o we ghọ obo-ihe dara ada.

2 Arapuwo obodo nile nke Aroea, ìgwè di iche iche aturu ka ha gādiri, nke gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.

3 Ebe ewusiri ike gāgwupu n’Efraim, ala-eze gāgwupu kwa na Damaskọs, ya na ndi Siria fọduru; dika nsọpuru umu Israel ka ha gādi, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

4 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na agēme ka nsọpuru Jekob ghara inwe ike, ima-abuba nke anu-aru-ya gāta kwa ata.

5 Ọ gādi kwa ka mb͕e onye nēwe ihe ubi nēkpokọta ọka guzo ọtọ, ogwe-aka-ya anēwe oko ọka; ọ gādi kwa ka mb͕e anāchikọta oko ọka dara ada na ndagwurugwu Refaim.

6 Ma nkpuru nke fọduru itutukọ gāfọdu nime ya, dika ntisisi nke osisi olive, nkpuru abua ma-ọbu atọ n’elu ngalaba osisi kachasi elu, anọ ma ọbu ise n’alaka-ya nile, bú nke osisi nāmi nkpuru, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta.

7 N’ubọchi ahu ka madu gēle Onye kèworo ya anya ọma, anya-ya abua gēlekwasi kwa Onye Nsọ nke Israel.

8 Ma ọ gaghi-ele ebe-ichu-àjà ahu nile anya ọma, bú ọlu aka-ya, ọ bughi kwa ihe nkpisi-aka-ya meworo ka ọ gēle anya, ma ọ bu Asherim, ma-ọbu arusi-anyanwu-ya nile.

9 N’ubọchi ahu obodo-ya nile nke siri ike gādi ka ebe arapuru arapu nke oké ọhia na nke elu ugwu, nke ha rapuru n’iru umu Israel: ọ gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu.

10 N’ihi na i chezọwo Chineke nke nzọputa-gi, na n’ihi na i chetaghi oké nkume ahu, bú ebe-gi siri ike; n’ihi nka ka i nāku ihe-ọkuku di iche iche nke di utọ, ọ bu kwa alaka osisi vine nke ala ọzọ ka i nāma nime ya:

11 n’ubọchi ọkukú-gi i nāb͕a ya ogige buruburu, ọ bu kwa n’ututu ka i nēme ka nkpuru-gi ma ifuru: ma obo-ihe ka owuwe-ihe-ubi gābu n’ubọchi ọria na ihe-nb͕u nādighi-agwọta.

12 Ahuhu! ọ bu ùzù ọtutu ndi, dika ùzù nke oké osimiri ka ha nātu ùzù; ọ bu kwa nkpọtu nke mba di iche iche, dika nkpọtu nke ọtutu miri ka ha nākpọtu.

13 Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n’ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n’iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n’iru oké ifufe.

14 Na mb͕e anyasi le, oké egwu di: tutu ututu erue ọ dighi. Nka bu òkè nke ndi nāpunara ayi ihe; na ihe ruru ha n’ife-nzà, bú ndi nāluta ihe-ayi n’agha.

Categories
AISAIA

AISAIA 18

1 Ahuhu gādiri ala ùzù nke ọtutu nkù, nke di n’ofè osimiri nile nke Etiopia:

2 nke nēziga ndi-ukọ̀ n’oké osimiri, ọbuná n’ub͕ọ papyrus di iche iche n’elu miri! Unu ndi-ozi nkọ, jekurunu otù mba ndi di ogologo di kwa lari n’aru, rue otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n’iru; bú mba nātùta atùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya!

3 Unu ndi nile nēbi n’elu-uwa dum madu bi, na unu ndi nwere ebe-obibi-unu n’uwa, mb͕e anēbuli ọkọlọtọ n’elu ugwu nile, hunu; ọzọ mb͕e anāfù opi-ike, nurunu,

4 N’ihi na otú a ka Jehova siworom, M’gānọ jū, M’gēlegíde kwa anya n’ebem guzosiri ike; dika okpom-ọku nēnwu enwu n’ìhè anyanwu, dika alulu igirigi n’okpom-ọku nke owuwe-ihe-ubi.

5 N’ihi na tutu owuwe-ihe-ubi erue, mb͕e ifuru zusiri okè, na mb͕e okoko nāghọ nkpuru-vine nāchaghi acha, O gēji mma-nkwacha bipu umu-alaka-ya, ọ bu kwa alaka-ya nile ka Ọ gēwezuga b͕uchapu.

6 Agārapu ha n’otù nye udele nke ugwu, nye kwa anu-ọhia nke uwa: udele gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e okpom-ọku, anu-ọhia nke uwa gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e oyi.

7 Na mb͕e ahu ka agēdukuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha ùtú, nke bu otù ndi di ogologo di kwa lari n’aru, nke site-kwa-ra n’otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n’iru; bú mba nātùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya, rue ọnọdu aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ugwu Zaion.

Categories
AISAIA

AISAIA 19

1 Ibu eboro Ijipt.

Le, n’igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n’iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n’etiti ya.

2 M’gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.

3 Ewe wusi mọ Ijipt n’etiti ya; ndum-ọdu-ya ka M’gēloda kwa: ha gāju kwa ihe-efu nile ha ase, ju kwa ndi-ntamu-ha, ju kwa ndi nāju mọ ihe, ju kwa ndi-dibia-afa.

4 M’gēmechibido Ijipt n’aka onye-nwe-ha nēme ihe-ike; eze di ike gāchi kwa ha, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.

5 Ọzọ, miri gātada n’oké osimiri, osimiri gātasia takọrọ.

6 Osimiri-ya nile gēsì kwa ísì; osimiri Nail nile nke Ijipt gātalata we tasia: amì na achara gājanwu.

7 Ala ahihia ndu n’akuku Nail, n’usọ Nail, na ebe ọ bula anāgha nkpuru n’akuku Nail, gātakọrọ, efesa ha, ha we ghara idi.

8 Ndi-ọkù gēze kwa ume, ndi nile ndi nātubà nko-azù nime Nail gēru kwa újú, ndi nāb͕asa ub͕u n’elu miri gāta kwa aru.

9 Ọzọ, ihere gēme ndi nālu ọlu flax etiri eti na ndi nākpa ákwà ọcha.

10 Ide-ya nile gāghọ ihe etipiara etipia, ndi nile nke nālu ọlu inara ugwọ-ọlu gābu ndi erudara eruda na nkpuru-obí.

11 Nání ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha ka ndi-isi Zoan bu; ndum-ọdu nke ndi mara ihe nime ndi-ndum-ọdu Fero aghọwo ndum-ọdu anu-ọhia: ùnu si aṅa si Fero, Nwa ndi mara ihe ka m’bu, nwa ndi-eze nke mb͕e ochie?

12 Òle ebe ha nọ kwa, bú ndi-gi ndi mara ihe? biko, ka ha gosi kwa gi; ka ha mara kwa ihe Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubeworo bayere Ijipt.

13 Ndi-isi Zoan aghọwo ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha, arafuwo ndi-isi Nof; ha edufuwo Ijipt, bú ndi ahu nke bu nkume nkuku nke ebo-ya nile.

14 Jehova agwakọtawo mọ nke nb͕agọ n’etiti ya: ha we dufue Ijipt n’ọlu-ya nile ọ bula, dika onye ṅubigaworo manya ókè si akpafu n’ihe ọ b͕ọrọ.

15 Ọ dighi kwa ọlu ọ bula Ijipt gēnwe, nke isi ma-ọbu ọdudù, ma-ọbu igu-nkwu ma-ọbu amì, gālu.

16 N’ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n’ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n’elu ya.

17 Ala Juda gāghọ-kwa-ra Ijipt anya-ajù, onye ọ bula nke anēhotara ya Ijipt gātu oké egwu, n’ihi nzube nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēzube megide ya.

18 N’ubọchi ahu obodo ise gādi n’ala Ijipt ndi nāsu asusu Kenean, ndi nāṅuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha iyi; Obodo nkwada ka agākpọ otù nime ha.

19 N’ubọchi ahu ebe-ichu-àjà gādiri Jehova n’etiti ala Ijipt, otù ogidi n’akuku ókè-ala-ya gādi-kwa-ra Jehova.

20 Ọ gābu-kwa-ra Jehova nke usu nile nke ndi-agha ihe-iriba-ama na ihe-àmà n’ala Ijipt: n’ihi na ha gētiku Jehova n’ihi ndi-nmeb͕u, O gēzite-kwa-ra ha onye-nzọputa na onye gāluru ha ọ̀gù, O we naputa ha.

21 Jehova gēme kwa ka Ijipt mara Ya, ndi Ijipt ewe mara Jehova n’ubọchi ahu; ha gēji kwa àjà na onyinye-inata-iru-ọma fè Ya, ha gēkwe kwa Jehova nkwa, kwughachi kwa ya.

22 Jehova gēti kwa Ijipt ihe, nēti, nāgwọ kwa; ha gālaghachikute kwa Jehova, O we kwe ka ha riọta ihe ha nāriọ, Ọ gēme kwa ka aru di ha nma.

23 N’ubọchi ahu uzọ atuliri atuli gādi site n’Ijipt we rue Asiria, Asiria ewe ba n’Ijipt, Ijipt gābà kwa n’Asiria: ndi Ijipt gēsoro ndi Asiria fè òfùfè.

24 N’ubọchi ahu ka Israel gēme Ijipt na Asiria atọ, ọ gābu ngọzi n’etiti uwa:

25 n’ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha agọziwo ya, si, Onye agọziri agọzi ka ọ bu, bú Ijipt nke ndim, na Asiria nke bu ọlu akam abua, na Israel nke bu ihe-nketam.

Categories
AISAIA

AISAIA 20

1 N’arọ Tatan biaruru Ashdod, mb͕e Sagon, bú eze Asiria, zitere ya, o we buso Ashdod agha, were ya;

2 na mb͕e ahu Jehova kwuru okwu site n’aka Aisaia nwa Emoz, si, Je, tọpu ákwà-nkpe n’úkwù-gi, yipu kwa akpukpọ-ukwu-gi n’ukwu-gi. O we me otú a, b͕ara ọtọ nējeghari n’ukwu efu.

3 Jehova we si, Dika orùm, bú Aisaia, si b͕ara ọtọ nējeghari n’ukwu efu arọ atọ ibu ihe-iriba-ama na ihe-ebube megide Ijipt megide kwa Etiopia;

4 otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n’agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n’otule, ib͕aba Ijipt ọtọ.

5 Ha ewe tua ujọ, ihere gēme kwa ha, n’ihi Etiopia, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, na n’ihi Ijipt, bú ima-nma-ha.

6 Onye bi n’akuku oké osimiri nka gāsi kwa n’ubọchi ahu, Le, otú a ka ihe-ntukwasi-obi-ayi di, ebe ayi b͕alagaworo ka ewe yere ayi aka inaputa ayi n’aka eze Asiria: òle ebe kwa ka ayi onwe-ayi gēwepuga onwe-ayi?