Categories
AISAIA

AISAIA 1

1 Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n’ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.

2 Nurunu, elu-igwe, gi uwa, ṅa kwa nti, n’ihi na Jehova ekwuwo okwu: umu ka M’meworo ka ha toputa, emewokwam ka ha di elu, ma umu ahu ejehiewo megidem.

3 Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche.

4 Ahuhu gādiri mba nmehie, ndi ajọ omume nānyib͕u, nkpuru nke bu ndi nēme ihe ọjọ, umu nke nēbibi onwe-ha: ha arapuwo Jehova, ha elelìwo Onye Nsọ nke Israel, ha aghọwo ndi ala ọzọ, laghachi azu.

5 N’ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.

6 Site n’ọbu-ukwu we rue isi ọ dighi izu-okè di nime ya; kama ob͕ub͕u-mma, na itiru-aru, na ọnyá etiputara ọhu: apikọtaghi ha, ekechighi kwa ha, ejighi kwa manu me ka ha di nrò.

7 Ala-unu bu ebe tọb͕ọrọ n’efu; obodo-unu, esurewo ha n’ọku; ala-ubi-unu, n’iru unu ka ndi ala ọzọ nēri ya, ọ bu kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu, dika nkwatu ndi ala ọzọ.

8 Ma ada Zaion fọduru dika ulo-ntu n’ubi-vine, dika ulo-ọnọdu-abali n’ubi cucumbei, dika obodo nke ndi-iro-ya nēche nche.

9 Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra.

10 Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n’iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra.

11 Jehova nāsi, N’ìhi gini ka unu nāchurum ọtutu àjà-unu? afọ ejuwom n’àjà-nsure-ọku nile eji ebulu chu, na abuba umu-ehi emere ka ha ma abuba; ọzọ, ọbara oke-ehi na nke umu-aturu na nke nkpi atọghm utọ.

12 Mb͕e unu nābia ka ahu unu n’irum, ònye chọworo nka n’aka-unu, ka unu zọtọ ogigem nile?

13 Unu ebubata-kwa-la onyinye-inata-iru-ọma ọzọ nke bu ihe-efu; ihe-nsure-ọku nke nēsì ísi utọ, ihe-árú ka ọ burum; ọnwa ọhu na ubọchi-izu-ike, ikpọ nkpọkọta — apughm inagide ajọ omume na ubọchi nb͕ochi.

14 Ọnwa ọhu nile unu na mb͕e nile unu akara àkà, nkpuru-obim akpọwo ha asì: ha aghọwo ibu di arọ̀ n’arum, ike ibūru ha agwuwom.

15 Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M’gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M’gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n’ọbara.

16 Sanu aru, menu onwe-unu ka unu di ọcha; wezuganu ihe ọjọ nke omume-unu nile n’iru anyam abua; rapunu ime ihe ọjọ:

17 mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.

18 Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.

19 Ọ buru na unu ekwe, we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri:

20 ma ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu: n’ihi na ọnu Jehova ekwuwo.

21 Ò si-kwa-ra aṅa ghọ nwanyi nākwa iko, bú obodo ahu kwesiri ntukwasi-obi? obodo ahu nke juputara n’ikpé ziri ezi! ezi omume nānọri ọnọdu-abali nime ya, ma ub͕u a ndi-ob͕u-madu.

22 Ọla-ọcha-gi aghọwo afuru-uzu; ihe-ọṅuṅu ọma gi, agwawo ya miri nke-uku.

23 Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n’ebe M’nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n’anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.

24 N’ihi nka, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye di ike nke Israel, puta,) A, M’ga-akasi Onwem obi site na ndi nēmegidem, M’gābọ-kwa-ra Onwem ọ́bọ̀ n’aru ndi-irom:

25 M’gēme kwa ka akam biaghachi n’aru gi, M’gānuchapu kwa afuru-uzu-gi, dika eji akanwu me, M’gēwezuga kwa ihe nile gwara agwa nime gi:

26 M’gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M’gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi.

27 Agēji ikpé b͕aputa Zaion, agēji kwa ezi omume b͕aputa ndi-ya nālata.

28 Ma ntipia nke ndi nēmebi iwu na ndi-nmehie gādi n’otù, agēme kwa ka ndi nārapu Jehova gwusia.

29 N’ihi na ha gēme ihere osisi terebinth nile nke unu chọsiworo ike, unu gēnwe kwa iru-ihere site n’ubi nile ab͕ara ogige nke unu rọputaworo.

30 N’ihi na unu gādi ka osisi terebinth nke akwukwọ-ya nākpọnwu akpọnwu, na dika ubi ab͕ara ogige nke nēnweghi miri.

31 Ọgaranya gāghọ kwa eriri-nzuzu, ọlu-ya gāghọ kwa icheke-ọku; ha abua gēre kwa ọku n’otù, ọ dighi kwa onye nēmenyu ha.

Categories
AISAIA

AISAIA 2

1 Okwu nke Aisaia nwa Emoz huru bayere Juda na Jerusalem.

2 O gēru kwa n’ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n’elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri.

3 Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, rue ulo Chineke nke Jekob; O gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n’okporo-uzọ-Ya nile: n’ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta.

4 Ọ gēkpe kwa ikpe n’etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.

5 Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n’ìhè Jehova.

6 N’ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n’ihi na ha juputara n’ome-n’ala site n’Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka.

7 Ala-ha juputa-kwa-ra n’ọla-ọcha na ọla-edo, ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù-ha; ala-ha juputa-kwa-ra n’inyinya, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ub͕ọ-ala-ha.

8 Ala-ha juputa-kwa-ra n’ihe-efu; ọlu nke aka-ha ka ha nākpọ isi ala nye, bú ihe nke nkpisi-aka-ha mere.

9 Madu we ruda n’ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala: ebupu-kwa-la nmehie-ha.

10 Ba n’oké nkume, zobe kwa onwe-gi n’ájá, ipu n’iru oké egwu Jehova, na ipu n’ima-nma nke idi-elu-Ya.

11 Aghaghi ime anya npako nke madu ka ha di ala, aghaghi kwa iruda nbuli-elu nke ndi nile n’ala, aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n’ubọchi ahu.

12 N’ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala:

13 ọ gādakwasi kwa osisi cedar nile nke Lebanon nke di elu nke ebuliwo-kwa-ra ha elu, ọ gādakwasi kwa osisi oak nile nke Beshan;

14 ọ gādakwasi kwa ugwu nile nke di elu, ọ gādakwasi kwa ugwu ntà nile nke ebuliworo elu;

15 ọ gādakwasi kwa ulo-elu ọ bula di elu, ọ gādakwasi kwa mb͕idi ọ bula ewusiri ike;

16 ọ gādakwasi kwa ub͕ọ nile nke Tashish, ọ gādakwasi kwa ihe-ile-anya nile anāchọsi ike.

17 Aghaghi kwa iruda npako madu, aghaghi kwa ime nbuli-elu nke ndi nile ka ọ di ala: aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n’ubọchi ahu.

18 Ma ihe-efu-ha, ha nile aghaghi igasi.

19 Madu gābà kwa n’ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n’olùlù nile nke ájá, ipu n’iru oké egwu Jehova, na ipu n’ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.

20 N’ubọchi ahu madu gētufu ihe-efu-ya nile nke ọla-ọcha, na ihe-efu-ya nile nke ọla-edo, nke ha mere ka ọ we kpọ isi ala nye ha, ọ gētufu ha nye anu mole na usu;

21 ka o we ba n’oghere nile nke oké nkume nile, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, ipu n’iru oké egwu Jehova, na ipu n’ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.

22 Rapunu madu, onye otù nku-ume di n’imi-ya: n’ihi na nìme gini ka aganāgu ya?

Categories
AISAIA

AISAIA 3

1 N’ihi na, le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēsi na Jerusalem, si kwa na Juda, wezuga ihe-ndabere na nkpa-n’aka, ihe-ndabere nile, bú nri, na ihe-ndabere nile, bú miri;

2 dike, na onye-agha; na onye-ikpe, na onye-amuma, na onye nāju ase, na okenye;

3 onye-isi nke ọgu ndi-agha abua na iri, na onye anāhu iru-ọma, na onye-ndum-ọdu, na onye mara ihe n’etiti ndi-ọ̀kà, na onye-nghọta n’irà urà.

4 M’gēwere kwa umu-okoro nye ka ha buru ndi-isi-ha, umu nāṅu ara gāchi kwa ha.

5 Ndi ahu gāchirita onwe-ha n’ihe-ike, otù onye megide onye ọzọ, na otù onye megide ibe-ya: ha gēbulite onwe-ha, nwa-okoro megide okenye, na onye anēlilì megide onye anāsọpuru.

6 Mb͕e otù onye gējide nwa-nne-ya n’ulo nna-ya, si, I nwere uwe-nb͕okwasi, onye-ikpe ka i gāburu ayi, ka ihe-isu-ngọngọ a di kwa n’okpuru aka-gi:

7 ọ gēweli olu-ya n’ubọchi ahu, si, M’gaghi-abu onye-nkechi; n’ihi na ọ dighi nri di n’ulom, ọ dighi kwa uwe-nb͕okwasi: unu agaghi-edom onye-ikpe ndi-ayi.

8 N’ihi na Jerusalem asuwo ngọngọ, Juda adawo kwa: n’ihi na ire-ha na omume-ha nile nēmegide Jehova, inupu isi n’okpuru anya abua nke ebube-Ya.

9 Nmata ha nāmata iru madu n’ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n’ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ.

10 Sinu onye ezi omume, na ọ gādiri ya nma: n’ihi na nkpuru omume-ha nile ka ha gēri.

11 Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n’ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.

12 Ndim, ndi nāchi ha n’ihe-ike bu nwatakiri, ndinyom achiwo kwa ha. Gi ndim, ndi-nduzi-gi nēme ka i wagharia, ha elodawo kwa uzọ nke okporo-uzọ-gi nile.

13 Jehova nēguzo Onwe-ya ikpe ọnu-Ya, Ọ nēguzo kwa ikpe ndi nile di iche iche.

14 Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n’ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n’ala n’ike di n’ulo-unu nile:

15 gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n’ala? ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.

16 Jehova we si, N’ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:

17 n’ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n’opu-n’isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.

18 N’ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēwezuga ima-nma nke ọla-ukwu-ha nile, na ihe-ichọ-nma nile ha nēyi n’egedege-iru, na ihe-ichọ-nma nile nke yiri ọnwa ọhu;

19 na ihe nile anākwuba na nti, na ọla-aka nile, na ákwà nb͕ochi-iru nile;

20 na ihe ọma nile ike n’isi, na iyab͕a-ukwu nile, na ihe nile ike n’úkwù, na karama ihe ísì ọma nile, na ọgwù di iche iche iyi n’aru;

21 na nb͕a-aka-akàrà nile, na nb͕a-aka imi nile;

22 na uwe ememe nile, na uwe-nwuda nile, na ákwà-nb͕okwasi nile, na akpa nile;

23 na enyo-aka nile, na ezi ákwà ọcha nile, na ákwà ọma nile ikuku n’isi, na ákwà-nb͕ochi nile.

24 Ọ gēru kwa, na n’ọnọdu uda ọma ire-ure gādi; n’ọnọdu ihe ike n’úkwù udọ̀ gādi; n’ọnọdu agiri-isi akpara nke-ọma nkwọcha-isi gādi; n’ọnọdu ákwà ọma ihe-ọkiké nke ákwà-nkpe gādi: eb͕ub͕u-ọku gādi n’ọnọdu ima-nma.

25 Ndikom-i gāda site na mma-agha, idi-ike-gi nile gāda kwa n’agha.

26 Ọnu-uzọ-ya nile gēze ume, ru kwa újú; agēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n’efu, ọ gānọdu n’ala.

Categories
AISAIA

AISAIA 4

1 Ọzọ, ndinyom asa gējide otù nwoke n’ubọchi ahu, si Nri nke aka ayi ka ayi gēri, uwe nke aka ayi ka ayi gēyi kwa: ọ bu nání na agākpọkwasi ayi aha-gi; gi wepu ita-uta-ayi.

2 N’ubọchi ahu ka ihe-opupú nke Jehova gāghọ ihe mara nma na ihe-nsọpuru, nkpuru nke ala gāghọ-kwa-ra ndi Israel b͕apuru ab͕apu nbili-elu na ima-nma.

3 O gēru kwa, na onye emeworo ka ọ fọdu na Zaion, na onye fọduru na Jeruzalem, onye nsọ ka agākpọ ya, bú onye ọ bula nke edeworo ya n’akwukwọ idi ndu nime Jerusalem:

4 mb͕e Onye-nwe-ayi gāsachapuwori inyi umu-ndinyom Zaion, ṅachapu kwa ọbara Jerusalem n’etiti ya, site na Mọ nke ikpé, na site na Mọ nke nkpochapu.

5 Jehova gēkè kwa n’elu ebe ahu nile guzosiri ike nke ugwu Zaion, na n’elu nkpọkọta-ya nile, igwe-oji na anwuru-ọku n’ehihie, na onwunwu nke ọku nēre ere n’abali: n’ihi na n’elu ebube nile ka agāb͕asa ihe-nkpuchi.

6 Ulo-ntu gādi kwa ibu ǹdò n’ehihie ipu n’okpom-ọku, na ibu ebe-nb͕abà, na ibu ebe-nzuzo ipu n’oké miri-ozuzo na ipu na miri-ozuzo nile.

Categories
AISAIA

AISAIA 5

1 Biko, ka m’bùara onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku abù nke onye ihe-ya nātọm utọ bayere ubi-vine-ya. Onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere ubi-vine n’ugwu ntà nke bu ezi oké ala:

2 o we gwue ya, tutupu nkume-ya nile, kua osisi vine kachasi nma nime ya, wue ulo-elu n’etiti ya, waputa kwa ebe-inara-manya-vine nime ya: o we le anya na ọ gāmi nkpuru-vine, ma ọ miri nkpuru-vine ọhia.

3 Ma ub͕u a, unu ndi bi na Jerusalem na ndi Juda, biko, kpenu ikpe n’etiti mu na ubi-vine nkem.

4 Gini ka agēme ubi-vine nkem ọzọ, nke m’nēmeghi nime ya? gini mere, mb͕e m’lere anya na ọ gāmi nkpuru-vine, o ji mia nkpuru-vine ọhia?

5 Ma ub͕u a, biko, ka m’me ka unu mara ihe mu onwem gaje ime ubi-vine nkem: m’gēwezuga ogige-ya, o we ghọ ebe anu-ulo nāta nri; m’gētipia mb͕idi-ya, o we ghọ ebe anāzọtọ:

6 m’gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m’gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri.

7 N’ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.

8 Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n’ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n’etiti ala!

9 Na ntim abua ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, N’ezie ọtutu ulo gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ọbuná ulo uku nke bu kwa ezi ulo, nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha.

10 N’ihi na ala ubi-vine nke madu gēji ehi abua alu n’ubọchi iri gēweputa nání otù ihe-ọtùtù bath nke manya-vine, ọzọ, otù ihe-ọtùtù homer nke nkpuru-ọghigha gāmi nání otù ihe-ọtùtù ephah.

11 Ahuhu gādiri ndi nēbili n’isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n’anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n’anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.

12 Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n’ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.

13 N’ihi nka ndim ejewo biri n’ala ọzọ, site n’amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike.

14 N’ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n’etiti ya, gārida kwa nime ya.

15 Onye di ala we ruda n’ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala, anēme kwa anya abua nke ndi di elu ka ha di ala:

16 ma Jehova nke usu nile nke ndi-agha di elu n’ikpé, edowo kwa Chineke, bú Onye Nsọ ahu, nsọ n’ezi omume.

17 Umu-aturu gāta kwa nri dika ọ bu n’ọzara-ha, ndi-ọbìa gērichapu kwa nkpọnkpọ-ebe nile nke ndi ahu mara abuba.

18 Ahuhu gādiri ndi chiri udọ̀ ihe-efu adọkpu ajọ omume, ndi ji kwa dika agāsi na ọ bu udọ̀ ub͕ọ-ala adọkpu nmehie:

19 ndi nāsi; Ya me ngwa, Ya lua ọlu-Ya ọsọsọ, ka ayi we hu: ka ndum-ọdu nke Onye Nsọ nke Israel bia rue ayi nso bia, ka ayi we mara.

20 Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, ndi nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nētiye ọchichiri n’ọnọdu ìhè, na ìhè n’ọnọdu ọchichiri; ndi nētiye ihe ilu n’ọnọdu ihe utọ, na ihe utọ n’ọnọdu ihe ilu!

21 Ahuhu gādiri ndi mara ihe n’anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta!

22 Ahuhu gādiri ndi-dike n’iṅu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n’itigwa ihe-ọṅuṅu n’anya:

23 ndi nāgu onye nēmebi iwu n’onye ezi omume n’ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n’aru ya!

24 N’ihi nka dika ire ọku si erichapu ahihia-ọka, na dika ahihia nke kpọrọ nku si ada n’ọku nēnwu enwu, otú a nkpọrọgwu-ha gādi ka ihe nēre ure, ifuru-ha gāla kwa elu dika uzuzu: n’ihi na ha ajuwo iwu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu kwa okwu-ọnu nke Onye Nsọ nke Israel ka ha lelìworo.

25 N’ihi nka ka iwe Jehova di ọku n’aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n’etiti èzí nile. N’ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

26 O we weliere mba ndi sitere n’ebe di anya ọkọlọtọ, kpọkọta ya òkù site na nsọtu uwa: ma, le, ọ nēme ngwa bia ọsọsọ:

27 ọ dighi onye nāda #mbà, ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ, n’etiti mba ahu; ọ dighi onye nātu òrù-ura, ọ dighi kwa onye nāraru ura; agaghi-atọpu kwa ihe-ọkiké úkwù-ha, agaghi-etibi kwa eriri akpukpọ-ukwu-ha abua:

28 ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe:

29 uja ha nāb͕ọ di ka nke nne-ọdum, ha nāb͕ọ uja dika umu-ọdum; e, ha nēbib͕ọ, jide anu-ndọb͕u, buru ya la, ma onye-nnaputa adighi.

30 Ha gēbib͕ọ kwa megide ya n’ubọchi ahu dika nbib͕ọ nke oké osimiri: asi kwa na madu elegide ala anya, le, ọchichiri di; nkpà na ìhè; ọ b͕awo ọchichiri n’igwe-oji-ya nile.

Categories
AISAIA

AISAIA 6

1 N’arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m’we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n’oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke.

2 Ndi-seraph nēguzo n’elu ya: nkù isi nkù isi ka seraph ọ bula nime ha nwere; abua ka o ji ekpuchi iru-ya, abua ka o ji ekpuchi ukwu-ya abua, abua ka o ji efe efe.

3 Otù we kpọ ibe-ya òkù, si, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya.

4 Ntọ-ala nile nke nbata-uzọ nile we me nkpatu site n’olu onye ahu nke nākpọ òkù, ulo we juputa n’anwuru-ọku.

5 M’we si, Ahuhu nādirim, n’ihi na alawom n’iyì; n’ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m’bu, ọ bu kwa n’etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m’nēbi: n’ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.

6 Otù nime ndi-seraph we fekutem, jide otù nkume di ọku n’aka-ya, nke o ji nkpa weputa n’elu ebe-ichu-àjà:

7 o we were ya metu ọnum, si, Le, nka emetuwo eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua; ewe wezuga ajọ omume-gi, kpuchi kwa nmehie-gi.

8 M’we nu olu Onye-nwe-ayi, ka ọ nāsi, Ònye ka M’gēziga, ònye gēje-kwa-ra ayi? M’we si, Lem; zigam.

9 O we si, Je, si ndi nka, Nānunu, ma unu aghọtala; nāhunu, ma unu amatala.

10 Me ka obi ndi nka ma abuba, me kwa ka nti-ha di arọ́, techi kwa anya-ha; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka aghara kwa ime ka aru di ha ike.

11 M’we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n’efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n’efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n’efu,

12 rue mb͕e Jehova meworo ka madu je n’ebe di anya, o we rie nne, bú ebe arapuru arapu n’etiti ala ahu.

13 Ma ọ buru na otù uzọ n’uzọ iri afọdu nime ya, aghaghi irechapu kwa ya ọzọ: dika osisi terebinth, na dika osisi oak, nke ogwe fọduru ha mb͕e eb͕utusiri ha; nkpuru nsọ bu ogwe-ya.

Categories
AISAIA

AISAIA 7

1 O rue, n’ubọchi Ehaz nwa Jotam, nwa Uzaia, bú eze Juda, na Rezin, bú eze Siria, rigoro, ya na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rue Jerusalem, ibu agha megide ya; ma ọ pughi ibu agha megide ya.

2 Ewe gosi ulo Devid, si, Siria nēzu ike n’elu Efraim. Obi-ya na obi ndi-ya we me nkpatu, dika osisi nile nke oké ọhia si eme nkpatu n’iru ifufe.

3 Jehova we si Aisaia, Biko, pua izute Ehaz, gi onwe-gi, na Shea-jashub nwa-gi, rue nsọtu uzọ-miri nke ọdọ-miri di n’elu, rue uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà;

4 si ya, Lezie anya, nọ kwa jū; atula egwu, ka obi-gi ghara kwa itu ujọ, site n’ọdudù abua ndia nke ọlọkọ-ọku nākwu anwuru-ọku, n’ihi iwe di ọku nke Rezin na Siria, na nke nwa Remalaia.

5 N’ihi na Siria aduwo ọdu imegide gi ihe ọjọ, Efraim kwa, na nwa Remalaia, si,

6 Ka ayi rigo imegide Juda, ka ayi me kwa ka ike gwusia ya, ka ayi wapuere onwe-ayi ya, me ka otù onye buru eze n’etiti ya, bú nwa Tabeel.

7 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ gaghi-eguzosi ike, ọ gaghi-adi kwa.

8 N’ihi na isi Siria bu Damaskọs, isi Damaskọs bu kwa Rezin: ma tutu ọgu arọ atọ na ise eruzue agētipia Efraim, ka ọ ghara ibu otù ndi:

9 ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n’ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi.

10 Jehova we gwa kwa Ehaz okwu ọzọ, si,

11 Riọrọ onwe-gi ihe-iriba-ama n’aka Jehova, bú Chineke-gi; riọ ya n’ebe miri emi, ma-ọbu n’ebe di elu nke di n’elu.

12 Ehaz we si, M’gaghi-ariọ, m’gaghi-anwa kwa Jehova.

13 O we si, Biko, nurunu, ulo Devid; ọ̀ bu ihe ntà na unu nēme ka ike gwu madu, na unu gēme kwa ka ike gwu Chinekem?

14 N’ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.

15 Miri-ara-ehi raruru araru na manu-aṅu ka nwa-okoro ahu gēri, mb͕e ọ mara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe.

16 N’ihi na tutu nwa-okoro ahu amara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe, agārapu ala ahu nke ike eze-ha abua gwuworo gi onwe-gi.

17 Jehova gēme ka ubọchi biakwasi n’aru gi na n’aru ndi-gi, na n’aru ulo nna-gi, bú ubọchi nke nābiaghi site n’ubọchi Efraim wezugara onwe-ya n’aru Juda; ọbuná eze Asiria.

18 O gēru kwa, n’ubọchi ahu, na Jehova gākpọkọta ijiji nke di na nsọtu osimiri Nail nile nke Ijipt òkù, kpọ kwa aṅu nke di n’ala Asiria.

19 Ha gābia kwa, ha nile gēbekwasi kwa na ndagwurugwu nile nke ebe di nkputankpu, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, na n’ogwu nile, na n’ọzara nile.

20 N’ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēji aguba nke egotara egota n’ofè nile nke Osimiri, bú eze Asiria, kọpu isi na aji ukwu: ọbuná afu-ọnu ka ọ gākọchapu kwa.

21 O geru kwa, n’ubọchi ahu, na otù onye gēdebe otù nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi-ya, na nne-aturu abua nke ìgwè ewu na aturu-ya ndu;

22 ọ gēru kwa, site n’ọtutu miri-ara ha gāb͕a, na ọ gēri miri-ara raruru araru: n’ihi na miri-ara raruru araru na manu-aṅu ka onye ọ bula nke fọduru n’etiti ala nka gēri.

23 O gēru kwa, n’ubọchi ahu, na ebe ọ bula, nke nnù vine abua na ọgu iri di ya, nke ọnu-ahia-ha bu nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri, ọ gādiri ogwu, di-kwa-ra uke.

24 Agāchiri àkú, were kwa uta, bia n’ebe ahu; n’ihi na nání ogwu na uke ka ala nka nile gābu.

25 Ma ugwu nile nke anējiri ọ́gù bọ, i gaghi-abà n’ebe ahu n’ihi egwu ogwu na uke, kama ọ gābu ebe anēziga ehi, na ebe aturu nāzọ ukwu.

Categories
AISAIA

AISAIA 8

1 Jehova we sim, Were n’onwe-gi otù oké mbadamba ihe, ji kwa ihe madu ji ede ihe-odide dekwasi ya, Nka diri Maha-shalal-hash-baz;

2 M’gēme kwa ka ndi-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi nọrọm n’àmà, bú Uraia onye-nchu-àjà, na Zekaraia nwa Jeberekaia.

3 M’we bakuru nwunyem, bú amuma-nwanyi; o we turu ime, mua nwa-nwoke. Jehova we sim, Kpọ aha-ya Maha-shalal-hash-baz.

4 N’ihi na tutu nwata ahu amara ikpọ, si, Nnam, na, Nnem, agēbulaga àkù Damaskọs na ihe Sameria akwatara n’agha n’iru eze Asiria.

5 Jehova we gwakwam okwu ọzọ, si,

6 N’ihi na ndi nka ajuwo miri Shailoa nke nāga nwayọ, ma obi-utọ-ha di n’ebe Rezin na nwa Remalaia nọ;

7 ọbuná n’ihi nka, le, Onye-nwe-ayi nēme ka miri Osimiri rigokwasi ha, bú miri nke di ike di kwa ọtutu, ọbuná eze Asiria na ebube-ya nile: ọ gārigokwasi kwa ebe-ya nile miri si erù, rusa usọ-ya nile:

8 ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n’olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel.

9 Jọnu njọ, unu ndi di iche iche, ma agētipia unu; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile nọ n’ebe di anya nke uwa: kenu ihe n’úkwù-unu, ma agētipia unu; kenu ihe n’úkwù-unu, ma agētipia unu.

10 Duritanu onwe-unu ọdu, ma agēmebi ya; kwuenu okwu, ma ọ gaghi-eguzosi ike: n’ihi na Chineke nọyere ayi.

11 N’ihi na otú a ka Jehova sirim n’ike nke aka-Ya, O we dọm aka na nti ka m’ghara ije ije n’uzọ ndi nka, si,

12 Unu agaghi-asi, Nkekọta imegide eze, n’ihe nile nke ndi nka nāsi, Ọ bu nkekọta imegide eze; unu agaghi-atu kwa egwu ihe ha nātu egwu ya, unu agaghi-ama-kwa-ra ya jijiji.

13 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya ka unu gēdo nsọ; Ya onwe-ya buru kwa ihe unu nātu egwu, Ya onwe-ya buru kwa ihe nēme ka unu ma jijiji.

14 Ọ gāghọ kwa ebe nsọ; ma Ọ gāghọrọ ulo abua nke Israel nkume ikpọbì-ukwu na oké nkume isu-ngọngọ, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem ib͕udu na ọnyà.

15 Ọtutu nime ha gāsu kwa ngọngọ, we da, ewe tipia ha, ha gāma kwa n’ọnyà, ewe nwude ha.

16 Kechie ihe-àmà, kà iwu akàrà n’etiti ndi-nmutam.

17 M’gēchere kwa Jehova, Nke nēzonari ulo Jekob iru-Ya, m’gēle kwa anya Ya.

18 Le, mu onwem na umu nke Jehova nyeworom ibu ihe-iriba-ama na ibu ihe-ebube n’etiti Israel site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n’ugwu Zaion.

19 Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n’ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase?

20 Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adighi-ekwu dika okwu a si di, n’ezie ọ dighi chi-ọbubọ diri ha.

21 Ha gāgabiga kwa n’etiti ya, na nkpà na agu: ọ gēru kwa, mb͕e agu nāgu ha, na ha gākpasu onwe-ha iwe, ji eze-ha, ji kwa Chineke-ha, kọcha nkọcha, ha gēche iru n’elu:

22 ala ka ha gēlegide kwa anya, ma, le, ahuhu na ọchichiri, bú nb͕achi nke nkpà; ọ bu kwa oké ọchichiri ka aganēnupu ha bà.

Categories
AISAIA

AISAIA 9

1 N’ihi ha ọ dighi nb͕achi gādiri nwanyi nke nkpà kpara. Na mb͕e mbu O mere ka elelia ala Zebulun na ala Naftali, ma na mb͕e ikpe-azu ka O meworo ka asọpuru ya, n’uzọ oké osimiri, n’ofè Jọdan, Galili nke mba nile.

2 Ndi nējeghari n’ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n’ala onyinyo ọnwu, ìhè amukwasiwo ha.

3 I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n’iru Gi dika ọṅù nke di n’owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n’agha.

4 N’ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n’aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n’ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n’ubọchi nke Midian.

5 N’ihi na akpukpọ-ukwu ọ bula nke ndi-agha nēyi akpukpọ-ukwu n’ùzù agha, na uwe atururu n’ọbara, ha nile gābu ihe isure ọku, ọbuná nri ọku.

6 N’ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n’ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.

7 Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n’elu oche-eze Devid, na n’elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n’ikpé ziri ezi na n’ezi omume, site n’ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.

8 Onye-nwe-ayi zigara okwu ba nime Jekob, o we dabà n’Iarael.

9 Ndi ahu gāma kwa, ha nile, bú Efraim na onye bi na Sameria, ndi nēkwu okwu nime npako na n’oké obi, si,

10 Brick adazuwo, ma nkume awara awa ka ayi gēji wu: eb͕utuzuwo osisi sycomore, ma osisi cedar ka ayi gētiye n’ọnọdu ha.

11 Ma Jehova nēme ka ndi nākpab͕u Rezin nọ n’elu imegide ya, Ọ nākwali kwa ndi-iro-ya;

12 Siria site n’Iru-anyanwu, na ndi Filistia site n’Ọdida-anyanwu; ha nēwere kwa ọnu nile richapu Israel. N’ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

13 Ma ndi nka alaghachikuteghi Onye nētib͕u ha, ọ bughi kwa Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ha chọworo.

14 Jehova we nēbipu n’Israel isi na ọdudù, igu-nkwu na amì, n’otù ubọchi.

15 Okenye nke anāhu kwa iru-ọma, onye ahu bu isi; onye-amuma kwa nke nēzí okwu-ugha, onye ahu bu ọdudù.

16 Ndi-nduzi nke ndi nka we ghọ ndi nēme ka ha wagharia; ọzọ, ndi-ha anēduzi eduzi bu ndi anēloda eloda.

17 N’ihi nka Onye-nwe-ayi agaghi-aṅuri ọṅu n’aru umu-okorọbia-ha, Ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere n’aru umu-nb͕ei-ha na ndinyom-ha di-ha nwuru: n’ihi na onye ọ bula nime ha bu onye emeruru emeru na onye nēme ihe ọjọ, ọnu ọ bula nēkwu kwa ihe-nzuzu. N’ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

18 N’ihi na nmebi-iwu erewo dika ọku; ogwu na uke ka o nērichapu: ọ nēnwu kwa ọku n’alughi-ulù nile nke oké ọhia, ha we kwulie elu na nkwuli-elu nke anwuru-ọku.

19 Nime nrubiga-ókè-iwe nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka erechapuworo ala: ndi nka we di ka nri ọku; onye ọ bula adighi-enwe ọmiko n’aru nwa-nne-ya.

20 O we b͕utue n’aka-nri, ma agu nāgu ya: ọ we rie ihe n’aka-ekpe, ma afọ ejughi ha: ha gēri, onye ọ bula anu-aru nke ogwe-aka-ya:

21 Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N’ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

Categories
AISAIA

AISAIA 10

1 Ahuhu gādiri ndi nātọ ukpuru di iche iche nke ajọ ihe, na ndi-ode-akwukwọ nke deworo nmeb͕u n’akwukwọ:

2 iwezuga ndi nēnweghi ike n’ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n’ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n’agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n’agha!

3 Ọ̀ bu kwa gini ka unu gēme n’ubọchi nleta, na n’ila-n’iyì nke gēsi n’ebe di anya bia? Ònye ka unu gāb͕akuru ka o we yere unu aka? ọ̀ bu kwa ole ebe unu gārapu nsọpuru-unu?

4 Ọ bu nání na ọ makpuworo n’ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n’ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N’ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

5 Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n’aka ka ọ bu kwa n’aka-ha, bú oké iwem!

6 Imegide mba emeruru emeru ka M’nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M’nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n’agha, na iluta ihe-nluta n’agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.

7 Ma ya onwe-ya, ọ bughi otú a ka ọ nēzube, obi-ya kwa, ọ bughi otú a ka ọ nēchè; kama ikpochapu ekpochapu di n’obi-ya, ya na ibipu ọtutu mba.

8 N’ihi na ọ nāsi, Ndi-isim, hà nile abughi ndi-eze?

9 Kalno, ọ̀ dighi ka Kakemish? ma-ọbu Hemat, ọ̀ dighi ka Apad? ma-ọbu Sameria, ọ̀ dighi ka Damaskọs?

10 Dika akam chọtaworo ala-eze nile nke ihe-efu, ndi arusi-ha apiri api kariri nke Jerusalem, kari kwa nke Sameria;

11 dika m’meworo Sameria, me kwa ihe-efu-ya nile, ọ̀ bughi otú a ka m’gēme Jerusalem, me kwa ihe-efu-ya nile?

12 Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n’ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M’gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya.

13 N’ihi na ọ siwo, Site n’ike akam ka m’meworo ya, na site n’amam-ihem; n’ihi na enwerem nghọta: m’we wezuga ókè ndi nile di iche iche, ọzọ, ihe-ha nke ejikereworo ka m’punara ha, m’we buda, dika onye di ike, ndi nānọdu n’ọche-eze;

14 akam achọtawo kwa àkù ndi nile di che iche dika akwu; na dika madu si achikọta àkwá arapuru arapu, otú a uwa nile ka mu onwem chikọtaworo: ma ọ dighi nke nēmeghari nkù, ma-ọbu nke nāsaghe ọnu, ma-ọbu nke nēbe ebe.

15 Anyu-ike, ọ̀ ga-egbu onwe ya n’aru onye ji ya eb͕u ihe? ma-ọbu mma-nkwọ, ọ̀ gēme onwe-ya uku megide onye nākwọ ya? dika agāsi na ndele gēfeghari ndi nēbuli ya, dika agāsi na nkpa-n’aka gēbuli onye nābughi osisi.

16 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, gēziga ọtita-aru n’etiti ndi-ya mara abuba: ọ bu kwa n’okpuru nsọpuru-ya ka agāmuye nmuye dika nmuye nke ọku.

17 Ìhè Israel gāghọ kwa ọku, Onye Nsọ ya gāghọ kwa onwunwu-ọku, we re ọku richapu uke-ya na ogwu-ya n’otù ubọchi.

18 Ọ gēme kwa nsọpuru nke oké ọhia-ya na nke ubi ọma ya ka ọ gwusia, ma nkpuru-obi ma anu-aru: ọ gādi kwa ka ọtita-aru nke onye-ọria.

19 Ma osisi nke fọduru n’oké ọhia-ya gādi ole-na-ole n’ọnu-ọgugu, nwata gēdeta kwa ha n’akwukwọ.

20 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na ndi Israel fọduru, ha na ndi ulo Jekob ndi bapuru ab͕apu, agaghi-adabere kwa ọzọ n’aru onye nētib͕u ha; kama ha gādabere Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, n’ezi-okwu.

21 Ndi fọduru gālaghachikute Chineke Nke bu dike, bú ndi Jekob fọduru.

22 N’ihi na ọ buru na ndi-gi, Israel, adi ka ájá oké osimiri, nání ndi fọduru nime ha gālata: nkpochapu ka akaworo àkà, nke nērubiga ókè n’ezi omume.

23 N’ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēme n’etiti uwa nile.

24 N’ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Gi ndim nke bi na Zaion, atula egwu Asiria: ọ bu ezie na o ji ndele tie gi, weli kwa nkpa-n’aka-ya megide gi, otú Ijipt mere.

25 N’ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, oké iwe ewe gwusia, iwem gēme kwa ka ha ka nká.

26 Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēfeghari kwa utali n’elu ya, dika ntib͕u Midian n’oké nkume Oreb: nkpa-n’aka-Ya gādi kwa n’elu oké osimiri, Ọ gēweli kwa ya otú O mere n’Ijipt.

27 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na ibu arọ́ ya gēwezuga onwe-ya n’ubu-gi, yoke-ya gēwezuga kwa onwe-ya n’olu-gi, e, agēmebi yoke site na manu.

28 Ọ biakwasiwo Aiat, ọ gabigawo n’etiti Migron; na Mikmash ka ọ debeworo ihe-ya nile:

29 ha agabigawo uzọ-ngabiga; Geba bu ebe-inọ-ọnọdu-abali ayi gēnwe, ka ha kwuru: Rema nāma jijiji, Gibea nke Sọl ab͕alagawo.

30 Were olu-gi tisie nkpu ike, ada Galim! ṅa nti, gi Laisha! Éwù, Anatot nke ewedara n’ala!

31 Madmena awaghariwo; ndi bi na Gibim gēme ka ndi-ha laghachi n’ulo ọsọsọ.

32 Ubọchi nke ta ọ bu nime Nob ka o gēguzo: ọ nēfeghari aka-ya n’ebe ugwu ada Zaion di, bú ugwu ntà Jerusalem.

33 Le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēwere ihe nākpata ima-jijiji kwachapu ngalaba: anēb͕utu kwa ndi topuworo elu, anēme kwa ndi di elu ka ha di ala.

34 Ọ gēwere kwa ígwè b͕utusia alughi-ulù nile nke oké ọhia, Lebanon gēsite kwa n’aka onye di ike nke-uku da.