Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 81

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Gittith. Abù Ọma nke Esaf.

1 Tikuenu Chineke, bú ike-ayi, nkpu ọṅụ:

Tikusienu Chineke nke Jekob nkpu ọṅụ ike.

2 Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti,

Na ubọ-akwara di utọ, ya na une.

3 Fùanu opì-ike n’ọnwa ọhu,

N’ọnwa ndọzu, n’ubọchi ememe-ayi.

4 N’ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu,

Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere.

5 Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya,

Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt:

Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m’nāmaghi ka m’nānu.

6 Ewezugaram ubu-ya n’ibu:

Ọbu-aka-ya abua nēsi n’abọ gabiga.

7 Na nkpab͕u i kpọkurum, M’we naputa gi;

Anamaza gi n’ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe;

Anamanwa gi n’akuku miri Meriba.Selah

8 Nuru, ndim, M’gāb͕a àmà megide gi:

Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti!

9 Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi;

I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ.

10 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi,

Nke nēme ka i si n’ala Ijipt rigoputa:

Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M’gēmeju kwa ya.

11 Ma ndim egeghi nti olum;

Israel ekweghikwam.

12 M’we zilaga ha n’isi-ike nke obi-ha,

Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha.

13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndim ganēgem nti,

Ma asi na Israel gēje ije n’uzọm nile!

14 Nwa mb͕e ka M’gēji me ka ndi-iro-ha ruru ala,

Ọ bu kwa imegide ndi nākpab͕u ha ka M’gēchighari akam.

15 Ndi nākpọ Jehova asi gērube isi aghughọ n’okpuru Ya:

Ma mb͕e-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi.

16 Ọ gēme kwa ka ha rie abuba ọka wheat:

Ọ bu kwa manu-aṅu nke sitere n’oké nkume ka M’gēji nyeju gi afọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 82

Abù Ọma Esaf.

1 Chineke nēguzo Onwe-ya nime nzukọ Chineke;

N’etiti chi nile ka Ọ nēkpe ikpe.

2 Rùe ole mb͕e ka unu gēkpe ikpe ajọ omume?

Rù kwa ole mb͕e ka unu gāhu ndi nēmebi iwu iru-ọma?

3 Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi:

Guanu onye ewedara n’ala na onye nọ na nkpà n’onye ezi omume.

4 Menu ka onye nēnweghi ike na ob͕eye b͕apu:

Naputanu ha n’aka ndi nēmebi iwu.

5 Ha amaghi, ha aghọtaghi kwa;

N’ọchichiri ka ha nējeghari:

Ewezugawo ntọ-ala nile nke uwa n’ọnọdu-ha.

6 Mu onwem siri, Chi ka unu bu,

Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu.

7 Otú ọ di, dika madu ka unu gānwu,

Ọ bu kwa dika otù nime ndi-isi ka unu gādà.

8 Bilie, Chineke, kpe uwa ikpe:

N’ihi na Gi onwe-gi gēketa ihe, bú mba nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 83

Abù, bú Abù Ọma Esaf.

1 Chineke, edebela ọnu-Gi du:

Ab͕ala nkiti, anọ-kwa-la jū, Chineke.

2 N’ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara:

Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha.

3 Ọ bu imegide ndi-Gi ka ha nāb͕a ìzù aghughọ,

Ha nāb͕a ìzù imegide ndi-Gi edebeworo na nzuzo.

4 Ha asiwo, Jenu, ka ayi zopu ha n’ibu mbe;

Agaghi-echeta kwa aha Israel ọzọ.

5 N’ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù;

Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu:

6 Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael;

Moab na ndi Haga;

7 Gebal, na Amon, na Amalek;

Filistia, ya na ndi bi na Taia:

8 Asiria araparawo kwa n’aru ha;

Ha aghọworo umu Lot ogwe aka.Selah

9 Me ha otú I mere Midian;

Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:

10 Ekpochapuru ha n’En-doa;

Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.

11 Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb, na dika Zeeb;

Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmuna:

12 Ndi siri, Ka ayi nwetara onwe-ayi

Ebe-obibi nile nke Chineke.

13 Chinekem, me ka ha di ka ihe nke ifufe nēfeghari buruburu,

Dika ahihia n’iru ifufe.

14 Dika ọku nke nēré oke ọhia,

Na dika ire-ọku nke nēme ka ugwu nile nwuru ọku;

15 Otú a were oké ifufe-Gi chua ha,

Were kwa oké ikuku-Gi me ka ha ma jijiji.

16 Me ka nlelì che ha iru;

Ka ha we chọ aha-Gi, Jehova.

17 Ka ihere me ha, ka ha ma kwa jijiji rue mb͕e ebighi-ebi;

E, ka ha nwe iru-ihere, la n’iyì:

18 Ka ha we mara na Gi onwe-gi, Onye aha-Gi bu Jehova, nání Gi,

Bu Onye kachasi ihe nile elu n’elu uwa nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 84

Abù Ọma nke diri Onye-isi Aba: n’elu Gittith. Abù Ọma umu Kora.

1 Le ka ebe-obibi-Gi nile si buru eba ahuru n’anya nke-uku,

Jehova nke usu nile nke ndi-agha!

2 Agu agusiwo nkpuru-obim ike, e, ọ gwusiwo kwa n’ichọ ogige nile nke Jehova;

Obim na anu-arum nētiku Chineke di ndu nkpu ọṅù.

3 Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo,

Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-ya

Bú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha,

Ezem na Chinekem.

4 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi bi n’ulo-Gi bu:

Ha gānọ nēto Gi.Selah

5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi;

Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n’obi.

6 Mb͕e ha nāgabiga ndagwurugwu Baka ha nēme ya ka ọ buru ebe isi-iyi di iche iche;

Ọzọ, miri-ozuzo mbu nēwere ngọzi nile kpuchie ya.

7 Ha nēsi n’ike jerue ike,

Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion.

8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nu ekperem:

Ṅa nti, Gi Chineke nke Jekob.Selah

9 Le ọta-ayi, Chineke,

Legide kwa iru onye-Gi etere manu.

10 N’ihi na otù ubọchi n’ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n’ebe ọzọ.

Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n’ulo Chinekem,

Kari ibi n’ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu.

11 N’ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu:

Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye:

Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n’ebe ndi nējeghari n’izu-okè nọ.

12 Jehova nke usu nile nke ndi-agha,

Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātukwasi obi na Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 85

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma umu Kora.

1 Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ:

I mewo ndi Jekob adọtara n’agha ka ha lata.

2 I bupuwo ajọ omume ndi-Gi,

I kpuchiwo nmehie-ha nile.Selah

3 I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi:

I siwo n’di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.

4 Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi,

Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi.

5 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe?

Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?

6 Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ:

Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?

7 Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi,

Nye kwa ayi nzọputa-Gi.

8 M’gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu:

N’ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo:

Ma ka ha ghara ilaghachi ba n’ihe-nzuzu.

9 Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya;

Ka nsọpuru we biri n’ala-ayi.

10 Ebere na ezi-okwu ezutewo;

Ezi omume na udo esutuwo ọnu.

11 Ezi-okwu nēpú epú n’ala;

Ezi omume esiwo kwa n’elu-igwe lepu anya.

12 Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe;

Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya.

13 Ezi omume gāga n’iru Ya;

Ọ gēme kwa ka nzọ-ukwu-Ya nile ghọ uzọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 86

Ekpere Devid.

1 Jehova, tọ nti-Gi n’ala, zam;

N’ihi na onye ewedara n’ala na ob͕eye ka m’bu.

2 Debe nkpuru-obim; n’ihi na onye-ebere ka m’bu:

Gi onwe-gi Chinekem, zọputa orù-Gi nke nātukwasi obi na Gi.

3 Merem amara, Onye-nwe-ayi;

N’ihi na Gi ka m’nākpọku ogologo ubọchi nile.

4 Me ka nkpuru-obi orù-Gi ṅuria;

N’ihi na ọ bu Gi, Onye-nwe-ayi, ka m’nēbuli nkpuru-obim nye.

5 N’ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie,

I nāba kwa uba n’ebere n’aru ndì nile nākpọku Gi.

6 Jehova, ge nti n’ekperem;

Ṅa kwa nti n’olu arirọ-amaram nile.

7 N’ubọchi nkpàm m’gākpọku Gi;

N’ihi na I gāzam.

8 Ọ dighi onye di ka Gi n’etiti chi nile, Onye-nwe-ayi;

Ọ dighi kwa ọlu di ka ọlu-Gi nile.

9 Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n’iru Gi, Onye-nwe-ayi;

Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.

10 N’ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche:

Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.

11 Zim uzọ-Gi Jehova; m’gējeghari n’ezi-okwu-Gi:

Me ka obim di n’otù itu egwu aha-Gi.

12 M’gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke;

M’gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

13 N’ihi na ebere-Gi di uku n’arum;

I siwo n’ala-mọ nke dichasi ala naputa nkpuru-obim.

14 Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem,

Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim,

Ha edoghi kwa Gi n’iru ha.

15 Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara,

Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n’ebere na ezi-okwu.

16 Chem iru, me-kwa-ram amara

Nye orù-Gi ike-Gi,

Zọputa kwa nwa-nwoke nke orù-Gi nwayi.

17 Merem ihe-iriba-ama bayere ezi ihe I gēmerem;

Ka ndi nākpọm asì we hu ya, ka ihere we me ha,

N’ihi na Gi onwe-gi, Jehova, eyeworom aka, kasikwam obi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 87

Abù Ọma umu Kora; Abù.

1 Ntọ-ala-Ya di n’ugwu nsọ nile.

2 Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion

Kari ebe-obibi nile nke Jekob.

3 Ihe di iche iche nke di nsọpuru ka anēkwu bayere gi,

Obodo Chineke.Selah

4 M’gēhota Rehab na Babilon, na ha di n’etiti ndi maram:

Le Filistia na Taia, ha na Etiopia;

Nka ka amuru n’ebe ahu.

5 Ọ bu kwa Zaion ka agēkwu okwu bayere ya, si, Onye na onye ọ bula ka amuru nime ya;

Ọzọ, Ya onwe-ya, bú Onye kachasi ihe nile elu, gēme ka o guzosie ike.

6 Jehova gāgu, mb͕e O ji de ndi nile di iche iche n’akwukwọ, si,

Nka ka amuru n’ebe ahu.Selah

7 Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi,

Isi-iyim nile di na Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 88

Abù, bú Abù Ọma Umu Kora; nke diri Onye-isi Abù; n’elu Mahalath Leannoth. Maschil Himan, bú onye-Ezrahait.

1 Jehova, Chineke nke nzọputam,

N’ehihie ka m’tiworo nkpu, n’abali kwa, n’iru Gi:

2 Kwe ka ekperem bata n’iru Gi;

Tọ nti-Gi n’ala n’iti-nkpum:

3 N’ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim,

Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ.

4 Aguwom na ndi nārida n’olùlù;

Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:

5 Anọm n’etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya,

Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n’ílì,

Ndi I nēchetaghi ọzọ;

Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n’aka-Gi.

6 I tọb͕ọwom n’olùlù dichasi ala,

N’ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi.

7 Ọnuma-Gi akwagidewom,

I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n’ala.Selah

8 I mewo ka ndi m’mara nke-ọma nọm n’ebe di anya;

I mewom ka m’ghọrọ ha ihe-árú:

Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n’èzí.

9 Anyam adalawo n’isi site na nweda-n’ala:

Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi,

Ab͕asawom ọbu-akam abua n’ebe I nọ.

10 Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu?

Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi?Selah

11 Àgākọ akukọ ebere-Gi n’ílì?

Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n’ebe-ila-n’iyì?

12 Àgāmara oké ọlu-Gi n’ọchichiri?

Àgāma kwa ezi omume-Gi n’ala nchezọ-ihe?

13 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m’tikuworo, Jehova,

Ọ bu kwa n’ututu ka ekperem gēje izute Gi.

14 Jehova, n’ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim?

N’ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi?

15 Onye ewedara n’ala na onye nēkubi ume ka m’bu site na nwata:

Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri.

16 Iwe-Gi di ọku agabigawo n’isim;

Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom.

17 Ha dim buruburu dika miri ogologo ubọchi nile;

Ha ab͕awom buruburu n’otù.

18 I mewo ka onye nāhum n’anya na eyìm nọm n’ebe di anya,

Ndi m’mara nke-ọma ka ọchichiri bu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 89

Maschil Itan, bú onye-Ezrahait.

1 Ebere nile nke jehova ka m’gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi:

Ọb͕ọ nile ka m’gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi.

2 N’ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo;

Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha.

3 Mu na onye M’rọputara ab͕awo ndu,

Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi;

4 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M’gēme ka nkpuru-gi guzosie ike,

M’gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile.Selah

5 Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova;

Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ.

6 N’ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova?

Ònye yiri Jehova n’etiti umu Chineke?

7 Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n’ìzù nzuzo nke ndi nsọ,

Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu.

8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,

Ònye di ike dika Gi, Ja?

Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.

9 Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri:

Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua.

10 Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u;

I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi.

11 Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa:

Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha.

12 Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha:

Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n’aha-gi.

13 Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya:

Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.

14 Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi:

Ebere na ezi-okwu nāga n’iru Gi.

15 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu:

Jehova, n’ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije.

16 N’aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile:

Ọ bu kwa n’ezi omume-Gi ka ha nādi elu.

17 N’ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu:

Ọ bu kwa n’utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.

18 N’ihi na Jehova nwe ọta-ayi;

Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi.

19 Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n’ọhù,

Si, Atukwasiwom iye-aka n’aru dike;

Emewom ka otù onye arọputaworo n’etiti ndim di elu.

20 Achọtawom Devid, bú orùm;

Ewerewom manu nsọm te ya:

21 Onye akam gēguzosi ike n’ebe ọ nọ;

Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.

22 Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;

Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n’ala.

23 M’gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n’iru ya,

Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.

24 Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n’aru ya:

Ọ bu kwa n’aham ka mpi-ya gādi elu.

25 M’gēdo kwa aka-ya n’oké osimiri,

Do kwa aka-nri-ya n’osimiri nile.

26 Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu,

Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.

27 Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,

Onye kachasi ihe nile elu n’ebe ndi-eze nke uwa nọ.

28 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M’gēdebere ya eberem,

Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.

29 M’gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi,

Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.

30 Ọ buru na umu-ya arapu iwum,

Ghara kwa ijeghari n’ikpém nile;

31 Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,

Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M’nyere n’iwu;

32 M’gēwere kwa nkpa-n’aka leta njehie-ha,

Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.

33 Ma M’gaghi-esi n’ebe ọ nọ mebie eberem,

M’gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.

34 M’gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ,

Ọzọ, M’gagh-agbanwe ihe siworo n’eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.

35 Otù ub͕ò ka M’jiworo idi-nsọm ṅua iyi;

M’gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;

36 Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi,

Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n’irum.

37 Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi;

Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi.Selah

38 Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju.

I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè.

39 I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi:

I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala.

40 I tiwawo ogige-ya nile;

I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.

41 Ndi nile nke nāgabiga n’uzọ apunarawo ya ihe:

Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.

42 I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu;

I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.

43 Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu,

I meghi kwa ka o guzosie ike n’agha.

44 I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi,

I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.

45 I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia:

I werewo ihere kpuchie ya n’aru.Selah

46 Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi?

Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku?

47 Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu:

Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?

48 Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya,

Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n’aka ala-mọ?Selah

49 Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi,

Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n’ikwesi-ntukwasi-obi-Gi?

50 Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi;

Eburuwom n’obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba;

51 Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova,

Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta.

52 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu rue mb͕e ebighi-ebi.

Amen, na Amen.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 90

Ekpere Moses, Bú onye nke Chineke.

1 Onye-nwe-ayi, ebe-obibi ka Gi onwe-gi buworo ayi

N’ọb͕ọ nile.

2 Tutu amuputa ugwu,

Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi,

Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke.

3 I nēme ka madu laghachi n’ájá;

I we si, Laghachinu, umu madu.

4 N’ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n’anya-Gi

Di ka nnyahuru mb͕e ọ nāga,

Na dika otù nche n’abali.

5 I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu:

N’ututu ha di ka ahihia nētó etó.

6 N’ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó;

N’anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua.

7 N’ihi na emewo ka ayi gwusia n’iwe-Gi,

Ọ bu kwa n’ọnuma-Gi ka emeworo ka ayi ma jijiji.

8 I dowo ajọ omume nile ayi n’iru Gi,

I dowo nmehie-ayi zoro ezo n’ìhè nke iru-Gi.

9 N’ihi na ubọchi-ayi nile agawo nime nrubiga-ókè nke iwe-Gi:

Ayi emewo ka arọ nile ayi gwusia dika otù nze-ume.

10 Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri;

Ma ọ buru na ha esite n’idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ,

Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n’ọlu na ajọ ihe;

N’ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.

11 Ònye mara ike nke iwe-Gi,

Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?

12 Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi,

Ka ayi we me ka obi amam-ihe bia.

13 Lata, Jehova; rùe ole mb͕e?

Chèghari kwa obi-Gi bayere ndi-orù-Gi.

14 Were ebere-Gi me ka afọ ju ayi n’ututu;

Ka ayi we tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa, ubọchi-ayi nile.

15 Me ka ayi ṅuria dika ubọchi nile si di I wedaworo ayi n’ala nime ha,

Na dika arọ si di nke ayi huworo ihe ọjọ nime ha.

16 Kwe ka ndi-orù-Gi hu ọlu-Gi,

Kwe kwa ka ahu ima-nma-Gi n’aru umu-ha.

17 Ka idi-utọ nke Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, dikwasi ayi:

Gi me kwa ka ọlu aka-ayi guzosie ike n’aru ayi;

E, ọlu aka-ayi, me ka o guzosie ike.