Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 71

1 Nime Gi, Jehova, ka m’b͕abàworo:

Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi.

2 N’ezi omume-Gi naputam, me ka m’b͕apu:

Tọrọm nti-Gi n’ala, zọputam.

3 Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m’gābà nime ya mb͕e nile

I nyewo iwu izọputam;

N’ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.

4 Chinekem, me ka m’b͕apu n’aka onye nēmebi iwu,

N’ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike.

5 N’ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova:

Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.

6 N’elu Gi ka m’dabeworo site n’afọ nnem:

Gi onwe-gi bu onye weputaworom n’afọ nnem:

Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile.

7 Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube;

Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.

8 Ọnum gējuputa n’otuto-Gi,

Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n’ima-nma-Gi.

9 Etufulam na mb͕e agadi;

Mb͕e ikem gwusiri arapulam.

10 N’ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem;

Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù,

11 Si, Chineke arapuwo ya:

Chuanu ya, jide ya; n’ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.

12 Chineke, anọlam ebe di anya:

Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.

13 Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim;

Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

14 Ma mu onwem, mb͕e nile ka m’ganēche Gi,

We tukwasi otuto n’otuto-gi nile

15 Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi,

Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi;

N’ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha.

16 M’gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia:

M’gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi.

17 Chineke, I zíwom ihe site na nwata;

Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m’nēgosi oké ọlu-Gi nile.

18 Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke;

Rue mb͕e m’gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi

Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.

19 Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu;

Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi?

20 Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ,

I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ,

Me kwa ka ayi si n’ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ.

21 Me ka idi-ukum bakari uba,

Gi chighari kwa kasiem obi.

22 Mu onwem gēji kwa une kele Gi,

Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem:

M’gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma,

Gi Onye Nsọ nke Israel.

23 Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m’nābùku Gi abù ọma;

Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù.

24 Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile:

N’ihi na ihere emewo ha, n’ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 72

Abù Ọma nke Solomon.

1 Chineke, nye eze ikpé-Gi nile,

Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.

2 O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe,

O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n’ala.

3 Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo,

Ugwu ntà kwa, n’ezi omume.

4 Ọ gēkpe ndi ewedara n’ala n’etiti ndi-Gi ikpe,

Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa,

Zọpia kwa onye-nmeb͕u.

5 Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide,

Na n’iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile.

6 Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n’ọzara asuru asu:

Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.

7 Onye ezi omume gāma akwukwọ n’ubọchi nile ya dika osisi ndu;

Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.

8 Ya nwe kwa ike n’aru madu site n’otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ,

Site kwa n’Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.

9 Ndi bi n’ala kpọrọ nku gēruru ala n’iru ya;

Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.

10 Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma:

Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.

11 E, eze nile gākpọ isi ala nye ya:

Mba nile gēfè ya òfùfè.

12 N’ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya;

Ọ gānaputa kwa onye ewedara n’ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.

13 Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere,

Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.

14 Ọ gēsi n’aka nzọb͕u na n’aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha;

Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n’anya-ya.

15 Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n’ọla-edo Sheba:

Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile;

Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.

16 Ka ọtutu ọka di n’ala n’elu ugwu nile;

Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon:

Madu gēsi kwa n’obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n’ala.

17 Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi;

N’iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù:

Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya:

Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.

18 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel,

Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:

19 Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi;

Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya.

Amen, na Amen.

20 Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 73

Abù Ọma Esaf.

1 N’ezie Chineke di nma n’ebe Israel nọ,

Bú n’ebe ndi di ọcha n’obi nọ.

2 Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha;

Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu.

3 N’ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo,

Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m’nāhu.

4 N’ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n’ọnwu-ha:

Ma aru-ha mara abuba.

5 Ha anọghi n’ahuhu madu ọzọ;

Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n’etiti madu nile.

6 N’ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu;

Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe.

7 Anya-ha esiwo n’abuba-ha guzoputa:

Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.

8 Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n’ihe ọjọ:

Ha nēsi n’ebe di elu kwu okwu.

9 Ha edowo ọnu-ha n’elu-igwe,

Ire-ha nējeghari kwa n’uwa.

10 N’ihi nka ndi-Ya nālata n’ebe a,

Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ.

11 Ha we si, Chìneke si aṅa mara?

Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n’Onye kachasi ihe nile elu?

12 Le, ndia bu ndi nēmebi iwu;

Ọzọ, ebe ha nānọgide n’udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù.

13 Ọ bu nání n’efu ka m’meworo ka obim di ọcha,

N’efu ka m’kwọworo ọbu-akam abua n’emeghi-ihe-ọjọ;

14 Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile,

Onye iba-nbam di kwa-n’ututu.

15 Ọ buru na asiwom, M’gākọ akukọ otú a;

Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m’gāghọb͕uwori.

16 M’we chè èchìchè imata nka,

Ndọb͕u-onwem-n’ọlu ka ọ bu n’anyam;

17 Rue mb͕e m’nābà n’ebe nsọ nile nke Chineke,

Ghọta ikpe-azu-ha.

18 N’ezie ọ bu n’ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha:

I mewo ka ha darue ntikpọ.

19 Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu n’otù ntabi-anya?

Ha agwuwo gwusia site n’ihe-egwu di iche iche.

20 Dika nrọ mb͕e madu nēteta n’ura;

Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.

21 N’ihi na obim nāb͕ari uka,

Ọ nādutukwam ogwu n’akurum abua.

22 Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe;

Nání anu ka m’buworo n’iru Gi.

23 Ma mu onwem nọ n’aka-Gi mb͕e nile:

I jidewo aka-nrim.

24 I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum,

Emesia I gēji kwa nsọpuru naram.

25 Ọ̀nye k m’nwere n’elu-igwe ma-ọbughi Gi?

Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n’uwa.

26 Anu-arum na obim agwusiwo:

Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.

27 N’ihi na, le, ndi nọ gi n’ebe di anya gāla n’iyì:

I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n’aka-Gi akwa iko.

28 Ma mu onwem, ibiaru Chineke nso dim nma:

Edowom ebe-nb͕abàm n’Onye-nwe-ayi, bú Jehova,

Ka m’we kọ akukọ bayere ije-ozi-Gi nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 74

Maschil Esaf.

1 Chineke, n’ìhi gini ka I juworo ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi?

N’ìhi gini ka iwe Gi nākwu anwuru imegide ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Gi?

2 Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie,

Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi;

Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo.

3 Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi;

Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n’ebe nsọ.

4 Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n’etiti ebe-nzute-Gi;

Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama,

5 Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-uku

N’alùghi-ulù nke osisi.

6 Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u,

Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n’otù.

7 Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku;

Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ.

8 Ha siri n’obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n’otù:

Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n’ala.

9 Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi:

Ọ dighi onye-amuma di ọzọ;

Ọ dighi kwa onye nọ n’etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.

10 Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta?

Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi?

11 N’ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi?

Seputa ya n’obi-Gi me ka ha gwusia.

12 Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie,

Nke nālu ọlu nzọputa n’etiti uwa

13 Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri:

I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n’elu miri.

14 Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi,

I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n’ala kpọrọ nku.

15 Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi:

Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.

16 Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali:

Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.

17 Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ:

Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha.

18 Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta,

Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi.

19 Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi:

Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n’ala rue mb͕e ebighi-ebi.

20 Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi:

N’ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n’ebe-obibi nile nke ihe-ike.

21 Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n’ihere:

Me ka onye ewedara n’ala na ob͕eye to aha-Gi.

22 Bilie, Chineke, kpe ọnu-Gi n’ikpe:

Cheta uta anāta Gi site n’ọnu onye-nsọkwu ogologo ubọchi nile.

23 Echezọla olu ndi nākpab͕u Gi:

Nkpọtu nke ndi nēbili imegide Gi nāla elu mb͕e nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 75

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Al-tashheth. Abù Ọma Esaf, Abù.

1 Ayi ekelewo Gi, Chineke;

Ayi ekelewo ekele, aha-Gi di kwa nso:

Ha akọwọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

2 Mb͕e m’gānara mb͕e akara àkà,

Mu onwem gēkpe ikpe ziri ezi.

3 Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu:

Mu onwem atùwo ogidi nile ya.Selah

4 Asirim ndi nānya isi, Unu anyala isi:

Asi-kwa-ram ndi nēmebi iwu, Unu ebulila mpi elu:

5 Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu;

Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu.

6 N’ihi na ọ bughi n’Ọwuwa-anyanwu, ma-ọbu n’Ọdida-anyanwu,

Ọ bughi kwa n’ọzara, ka nbuli-elu nēsi bia.

7 Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu.

8 N’ihi na iko di n’aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu;

O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya:

N’ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n’uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua.

9 Ma mu onwem, m’gēgosi oké ọlu-Gi rue mb͕e ebighi-ebi,

M’gābùku Chineke nke Jekob abù ọma.

10 Ọzọ, mpi nile nke ndi nēmebi iwu ka m’gēbipu;

Ma agēbuli mpi nile nke onye ezi omume.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 76

Abu Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’ubọ-akwara. Abù Ọma Esaf, Abù.

1 Onye amaworo na Juda ka Chineke bu:

N’Israel ka aha-Ya di uku.

2 Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.

3 N’ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta;

Na ọta, na mma āgha, na agha.Selah

4 Onye juputara n’ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n’ugwu nile nke anu adọb͕uru.

5 Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n’agha, ha atuwo òrù-ura-ha;

Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.

6 Site n’ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob,

Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n’oké ura.

7 Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu:

Ọzọ, ònye gēguzo n’iru Gi site na mb͕e I were iwe?

8 I siri n’elu-igwe me ka anuru okwu ikpé;

Uwa turu egwu, we di jū,

9 Mb͕e Chineke biliri ikpe ikpe,

Izọputa ndi nile di ume-ala n’obi nke uwa.Selah

10 N’ihi na ọnuma madu gēkele Gi:

I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n’úkwù.

11 Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu:

Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu.

12 Ọ nēb͕ochi mọ ndi-ndú:

Ọ bu onye anātu egwu n’ebe ndi-eze uwa nọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 77

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; dika Jeduthun si abù abù. Abù Ọma Esaf.

1 Olum ka m’nēji etiku Chineke, m’gēti kwa nkpu;

Olum ka m’nēji etiku Chineke, Ọ gāṅakwam nti.

2 N’ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m’chọrọ:

Akam setiri eseti n’abali, o sinwukwaghi;

Nkpuru-obim juru ka akasie ya.

3 M’gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku:

M’gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike.Selah

4 I jidere ndi-nche nke anyam abua:

Ọ b͕aram ghari, m’we ghara ikwu okwu.

5 Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie,

Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si,

6 M’gēcheta abù m’nābù n’ikpọ ubọ-akwara n’abali:

M’gēso obim tughari uche;

Mọm we chọsie ike, si,

7 Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju?

Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ?

8 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo?

Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?

9 Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke?

Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n’iwe?Selah

10 M’we si, Ọriam ka nka bu;

Ma m’gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.

11 M’gēhota omume nile nke Ja;

N’ihi na m’gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie.

12 M’gātughari kwa uche n’ọlu-Gi nile,

Ọ bu kwa n’omume-Gi nile ka m’gātughari obi.

13 Chineke, n’idi-nsọ ka uzọ-Gi di:

Ònye bu chi uku dika Chineke?

14 Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu:

I mewo ka amara ike-Gi n’etiti ndi nile di iche iche.

15 I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi,

Bú umu Jekob na Josef.Selah

16 Miri huru Gi, Chineke;

Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u:

Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji.

17 Igwe-oji nile wupuru miri;

Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà:

Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari.

18 Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n’ifufe nēfeghari buruburu;

Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:

Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.

19 N’oké osimiri ka uzọ-Gi di,

Uzọ-ije-Gi nile di kwa n’ọtutu miri,

Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile.

20 I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu,

Site n’aka Moses na Eron.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 78

Maschil Esaf.

1 Ndim, ǹanu nti n’iwum:

Tọnu nti n’ala inu okwu nile nke ọnum.

2 M’gāsaghe ọnum n’itu ilu:

M’gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n’uba, bú nke sitere na mb͕e ochie:

3 Nke ayi nuworo mara kwa,

Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi.

4 Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha,

Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n’iru akukọ otuto nile nke Jehova,

Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo.

5 O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob,

O do-kwa-ra iwu n’Israel,

Nke O nyere nna-ayi-hà n’iwu,

Ime ka umu-ha mara ha:

6 Ka ọb͕ọ nke gādi n’iru we mara, bú umu agāmu;

Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu:

7 Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke,

Ghara ichezọ omume nile nke Chineke,

Ma debe ihe nile O nyere n’iwu:

8 Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha,

Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi;

Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha,

Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n’ebe Chineke nọ.

9 Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta,

Ma ha chighariri n’ubọchi agha.

10 Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke,

Ma ha juru ijeghari n’iwu-Ya;

11 Ha we chezọ omume-Ya nile,

Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.

12 N’iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu,

N’ala Ijipt, n’ọhia Zoan.

13 O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga;

O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.

14 O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n’ehihie,

Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.

15 Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n’ọzara,

We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.

16 O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta,

O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.

17 Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya,

Inupu isi n’okpuru Onye kachasi ihe nile elu n’ala kpọro nku.

18 Ha we nwa Chineke n’obi-ha

N’iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.

19 Ha we kwue okwu megide Chineke;

Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n’usoro n’ọzara?

20 Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù,

Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè;

Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye?

Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu?

21 N’ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè:

Ewe kponwue ọku megide Jekob,

Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel;

22 N’ihi na ha ekweghi na Chineke,

Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya.

23 O we nye mbara-ígwé nile n’elu iwu,

Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe;

24 O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie,

Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha.

25 Nri nke ndi di ike ka madu riri:

O zitere ha ihe ha gēriju afọ.

26 O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n’elu-igwe:

O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.

27 O we me ka anu zokwasi ha dika ájá,

Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:

28 O we me ka ọ da n’etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha,

Buruburu ebe-obibi-ha nile.

29 Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku;

Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.

30 Ha abughi ndi ala ọzọ n’ebe ihe ha nāchọsi ike di,

Ihe-oriri-ha nādi ha n’ọnu,

31 Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha,

We b͕ue ufọdu n’etiti ndi-ha nke mara abuba,

Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.

32 N’ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ,

Ha ekweghi kwa n’oké ọlu-Ya nile.

33 O we me ka ubọchi nile ha gwusia n’otù nku-ume,

O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n’obi-ọlulọ-miri.

34 Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya:

Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.

35 Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha,

Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha.

36 Ha we ji ọnu-ha nārà Ya,

Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.

37 Obi-ha eguzosighi kwa ike n’ebe Ọ nọ,

Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n’ọb͕ub͕a-ndu-Ya.

38 Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha:

E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu,

Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.

39 O we cheta na anu-aru ka ha bu;

Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.

40 Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n’okpuru Ya n’ọzara?

Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n’ala tọb͕ọrọ n’efu?

41 Ha we chigharia, we nwa Chineke,

Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe.

42 Ha echetaghi aka-Ya,

Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n’aka onye-nkpab͕u.

43 Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n’Ijipt,

Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n’ọhia Zoan;

44 O we b͕anwe osimiri Nail nile ha ka ha ghọ ọbara,

Ha adighi-aṅu kwa miri-ha nērù erù.

45 Ọ nēzite odudu n’etiti ha, nke nātab͕u ha;

Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha.

46 Ọ nye-kwa-ra ọbubu ihe-omume-ha,

Nye kwa igurube ihe ha dọb͕uru onwe-ha n’ọlu inweta.

47 O nēji ákú-miri-ígwé b͕u osisi vine nile ha,

Ji kwa frost b͕u osisi sycomore nile ha.

48 O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé,

Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku.

49 Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n’etiti ha,

Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u,

Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ.

50 Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya;

O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n’inwu ọnwu,

Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe;

51 O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n’Ijipt,

Bú nkpuru mbu nke ume-ha n’ulo-ikwū nile nke Ham:

52 O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu,

Ọ nēdu kwa ha n’ozara dika ìgwè aturu.

53 O we nēdu ha n’ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu:

Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.

54 O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya,

Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.

55 Ọ chupu-kwa-ra mba nile n’iru ha,

We me ka ala ha barue ndi ya aka n’ala nketa e ji údò tua,

O we me ka ebo nile nke Israel biri n’ulo-ikwū-ha.

56 Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n’okpuru Ya,

Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;

57 Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha:

Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ.

58 Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe,

Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.

59 Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè,

Jusie Israel ike:

60 O we rapu ebe-obibi nke Shailo,

Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n’etiti madu;

61 O we were ike-Ya nye ka adọta ya n’agha,

Were kwa ima-nma-Ya nye n’aka onye-nkpab͕u.

62 O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n’aka mma-agha;

Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.

63 Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;

Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n’abù ọlulu-di.

64 Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;

Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.

65 Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura,

Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.

66 O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n’azu:

Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.

67 Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef,

Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;

68 Kama Ọ rọputara ebo Juda,

Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n’anya.

69 O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu,

Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

70 Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya,

O we si n’ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya:

71 O mere ka o si n’iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia,

Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu.

72 O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di;

Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 79

Abù Ọma Esaf.

1 Chineke, mba di iche iche abatawo n’ihe-nketa-Gi;

Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ;

Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.

2 Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri,

Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.

3 Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem;

Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.

4 Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,

Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.

5 Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi?

Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku?

6 Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi,

Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.

7 N’ihi na ha eripiawo Jekob,

Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n’efu.

8 Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:

Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:

N’ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.

9 Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n’ihi nsọpuru aha-Gi:

Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n’ihi aha-Gi.

10 N’ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ?

Ka amara ya n’etiti mba nile n’anya-ayi,

Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.

11 Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n’iru Gi;

Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu;

12 Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa,

Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi.

13 Ayi onwe-ayi, bú ndi-Gi na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-gi,

Gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi;

Ọb͕ọ nile ka ayi gākọrọ akukọ otuto-Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 80

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Shoshannim Eduth. Abù Ọma nke Esaf.

1 Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti,

Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu;

Gi Onye bi n’etiti cherubim, nwuputa ka ìhè.

2 N’iru Efraim na Benjamin na Manase, kpọte idi-ike-Gi,

Je izọputa ayi.

3 Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.

4 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,

Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi?

5 I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri,

I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku.

6 I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù:

Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n’etiti onwe-ha.

7 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;

Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.

8 I si n’Ijipt ropu osisi vine:

I nāchupu mba di iche iche, we kua ya.

9 I doziri ọnọdu n’iru ya,

O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu.

10 Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile,

Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke.

11 Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri,

Wasa kwa ome-ya rue Osimiri.

12 N’ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile,

Ndi nile nke nāgabiga n’uzọ we ghọrọ nkpuru-ya?

13 Ezì nke si n’oké ọhia puta nātakwosi ya,

Anu nke nēnughari n’ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya.

14 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi:

Si n’elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a,

15 Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo,

Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume.

16 Esurewo ya n’oku, eb͕utuwo ya:

Site n’ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n’iyì.

17 Ka aka-Gi di n’aru nwoke nke aka-nri-Gi,

N’aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume.

18 Ayi agaghi-esi kwa n’ebe I nọ laghachi azu:

Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku.

19 Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;

Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi.