Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 51

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid: mb͕e Netan, bú onye-amuma, biakutere ya, mb͕e ọ bakusiri Bat-sheba.

1 Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di:

Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile.

2 Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem,

Me kwa ka m’si na nmehiem di ọcha.

3 N’ihi na mu onwem mara njehiem nile:

Nmehiem di kwa n’irum mb͕e nile.

4 Megide Gi, nání Gi, ka m’mehieworo,

Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n’anya-Gi ka m’meworo:

Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu,

Di kwa ọcha n’obi mb͕e I nēkpe ikpe.

5 Le, n’ajọ omume ka amuputaram;

Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.

6 Le, ezi-okwu n’akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ:

Ọ bu kwa n’akuku zoro ezo ka i nēme ka m’mara amam-ihe.

7 I gēwere hyssop wepu nmehiem, m’gādi kwa ọcha:

I gāsucham dika ákwà, m’gādi kwa ọcha kari snow.

8 I gēme ka m’nuru olu obi-utọ na ọṅù;

Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù.

9 Zopu iru-Gi na nmehiem nile,

Hichapu kwa ajọ omumem nile.

10 Kèrem obi di ọcha, Chineke;

Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.

11 Atupulam n’iru Gi;

Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi.

12 Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi:

Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem.

13 M’gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile;

Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi.

14 Naputam n’aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam;

Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi.

15 Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua;

Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi.

16 N’ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m’we nye ya:

Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ.

17 Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa:

Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya.

18 Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ:

I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem.

19 Mb͕e ahu ka àjà nile nke ezi omume, bú àjà-nsure-ọku na àjà-nsuresi-ọku, gātọ Gi utọ:

Mb͕e ahu ka ha gāchu ọtutu oke-ehi n’elu ebe-ichu-àjà-Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 52

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Maschil Devid: mb͕e Doeg, bú onye Edom, biara gosi Sọl, si ya, Devid bara n’ulo Ahimelek.

1 Gini mere i nēto onwe-gi n’ihe ọjọ, gi dike?

Ebere Chineke nādigide ogologo ubọchi nile.

2 Ihe-ila-n’iyì di iche iche ka ire-gi nēchè;

Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ.

3 I huwo ihe ọjọ n’anya kari ezi ihe;

Na okwu-ugha kari ikwu okwu ezi omume.Selah

4 I huwo okwu nile nēloda eloda n’anya,

Gi ire aghughọ.

5 Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi,

Ọ gējide gi, dọkpupu gi n’ulu-ikwū-gi,

Ropu kwa gi n’ala ndi di ndu.Selah

6 Ndi ezi omume gāhu kwa ya we tua egwu,

Chì kwa ya ọchi, si,

7 Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike;

Kama ọ tukwasiri obi n’uba nke àkù-ya,

Ọ di ike n’ọchichọ ọjọ ya.

8 Ma mu onwem, adim ka osisi olive nwere akwukwọ ndu n’ulo Chineke:

Atukwasiwom obi n’ebere Chineke rue mb͕e nile ebighi-ebi.

9 M’gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi, n’ihi na I meworo ya:

M’gēle kwa anya aha-Gi, n’ihi na ọ di nma, niru ndi-ebere-Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 53

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Mahalath. Maschil Devid.

1 Onye-nzuzu asiwo n’obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di.

Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka ajọ omume-ha buru ihe-árú;

Ọ dighi onye nēme ezi ihe.

2 Chineke siri n’elu-igwe lekwasi umu madu anya,

Ihu ma ọ di onye nwere uche,

Nke nāchọ Chineke.

3 Ha nile n’otù n’otù alaghachiwo azu; ha ab͕aruwo n’otù dika miri;

Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.

4 Ndi nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe?

Bú ndi riworo nri site n’iri ndim,

Ma ha akpọkughi Chineke.

5 N’ebe ahu ka ha turu oké egwu, n’ebe oké egwu nādigh:

N’ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi;

I mewo ka ihere me ha, n’ihi na Chineke ajuwo ha.

6 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta!

Mb͕e Chineke gēji me ka ndọta-n’agha ndi-Ya lata,

Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọǹu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 54

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’ubọ-akwara. Maschil Devid: mb͕e ndi Zif biara, si Sọl, Devid, ọ̄ dighi-ezo onwe-ya n’etiti ayi?

1 Chineke, were aha-Gi zọputam,

Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe.

2 Chineke, nuru ekperem;

Ṅa nti n’okwu nile nke ọnum.

3 N’ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem,

Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim:

Ha edoghi Chineke n’iru ha.Selah

4 Le, Chineke bu onye nēyerem aka:

Onye-nwe-ayi nọ n’etiti ndi nākwagide nkpuru-obim.

5 Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha:

Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha.

6 M’gēji onyinye-afọ-ofufo churu Gi àjà:

M’gēkele aha-Gi, Jehova, n’ihi na ọ di nma.

7 N’ihi na ọ bu na nkpab͕u nile ka Ọ naputaworom;

Anyam elekwasiwo kwa ndi-irom.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 55

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’ubọ-akwara. Maschil Devid.

1 Ge nti n’ekperem, Chineke;

Ezonari-kwa-la Onwe-gi n’aririọ-amaram.

2 Ṅam nti, zam:

Anamalù ulù na ntughari-obim, nāsu kwa oké ude;

3 N’ihi olu onye-iro,

N’ihi nkpab͕u nke onye nēmebi iwu;

N’ihi na ha nēme ka ajọ ihe me nkpatu megidem,

Ọ bu kwa n’iwe ka ha nākpọm asì.

4 O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem:

Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam.

5 Egwu na ima-jijiji nābiarum aru,

Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam.

6 M’we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru!

M’gēfela, we nọdu du.

7 Le, m’gēferu ebe di anya,

Nọ ọnọdu-abali n’ọzara.Selah

8 M’gēwere ọsọsọ si n’ifufe siri ike na n’oké ifufe

Biarue ebe-nb͕apu dirim.

9 Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha:

N’ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n’obodo.

10 N’ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n’elu mb͕idi-ya nile:

Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n’etiti ya.

11 Ihe-ila-n’iyì di iche iche di n’etiti ya:

Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n’amá-ya nile.

12 N’ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta;

M’gānagide kwa ya:

Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem;

M’gēzonari kwa ya onwem:

13 Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra,

Eyìm, na onye m’mara nke-ọma.

14 Ayi nāb͕akọri ìzù utọ,

N’ulo Chineke ka ayi nējeghari n’etiti ìgwè madu.

15 Ka ọnwu biakwasi ha na mberede,

Ka ha ridarue ala-mọ na ndu:

N’ihi na ihe ọjọ nile di n’ebe ha nọ dika ọbìa, n’etiti ha.

16 Ma mu onwem, Chineke ka m’gākpọku;

Jehova gāzọputakwam.

17 Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m’gātughari uche, su kwa oké ude:

Ọ gānu kwa olum.

18 Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n’udo, ka ha ghara ibiarum nso:

N’ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù.

19 Chineke gānu olum, weda kwa ha n’ala,

Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie.Selah

Ha bu ndi nēnweghi nb͕anwe,

Ha adighi-atu kwa egwu Chineke.

20 O setiwo aka-ya abua imegide ndi ya na ha nọ n’udo:

O mewo ọb͕ub͕a-ndu-ya ka ọ ghara idi nsọ.

21 Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru,

Ma nání agha ka obi-ya bu:

Okwu-ya nile di nrò kari manu,

Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.

22 Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi:

Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n’ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi

23 Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n’olùlù nbibi:

Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha;

Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 56

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Jonath elem rehokim. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e ndi Filistia jidere ya na Gat.

1 Merem amara, Chineke; n’ihi na madu ekusiwo ume ike ilom:

Ogologo ubọchi nile ka o nēbu agha nēmeb͕um.

2 Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile:

N’ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n’ibuli onwe-ha elu.

3 N’ubọchi m’nātu egwu,

Mu onwem, ọ bu Gi ka m’gātukwasi obi.

4 Nime Chineke ka m’gēto okwu-Ya:

Ọ bu Chineke ka m’tukwasiworo obi, m’gaghi-atu egwu;

Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?

5 Ogologo ubọchi nile ka ha nāhighari okwum nile:

N’imegidem èchìchè nile ha bu ime ihe ọjọ.

6 Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha,

Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya,

Dika ha leworo anya nkpuru-obim.

7 Ọ̀ bu n’ihi ajọ ihe ka ha nāb͕apu?

N’iwu-Gi me ka ndi nile di iche iche rida, Chineke.

8 Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu:

Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi;

Hà adighi n’akwukwọ-Gi:

9 Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n’ubọchi m’gākpọku Gi:

Nka ka m’mara, na Chineke dirim.

10 Nime Chineke ka m’gēto okwu-Ya:

Nime Jehova ka m’gēto okwu-Ya.

11 Ọ bu Chineke ka m’tukwasiworo obi, m’gaghi-atu egwu;

Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?

12 N’isim, Chineke, ka nkwa nile m’kwere Gi di:

M’gākwughachi Gi ekele nile.

13 N’ihi na I naputawo nkpuru-obim n’ọnwu:

Ì naputaghi ukwum abua na nnuda anēnudam?

Ka m’we nējeghari n’iru Chineke

N’ihè ndi ndu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 57

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù: Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e ọ b͕apuru n’iru Sọl ba n’ọb͕à.

1 Merem amara, Chineke, merem amara;

N’ihi na nime Gi ka nkpuru-obim b͕abàworo:

Ọ bu kwa na ǹdò nke nkù-Gi abua ka m’gāb͕abà,

Rue mb͕e ihe-ila-n’iyì ndia gāgabiga.

2 M’gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu;

M’gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe.

3 O gēsi n’elu-igwe zìe, zọputam,

Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta;Selah

Chineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya.

4 Nkpuru-obim nọ n’etiti ọdum;

M’gēdina n’etiti ndi nēre ọku,

Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú,

Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.

5 Me Onwe-gi ka I di elu n’elu elu-igwe nile, Chineke;

Ka ebube-Gi di elu n’elu uwa nile.

6 Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile;

Nkpuru-obim erudawo n’ala:

Ha egwuwo olùlù n’irum;

Ha adabàwo n’etiti ya.Selah

7 Edoziwo obim Chineke, edoziwo obim:

M’gābù abù, e, m’gābù abù ọma.

8 Teta, nsọpurum; teta, une na ubọ-akwara:

M’gākpọte chi-ọbubọ.

9 M’gēkeli gi n’etiti ndi nile di iche iche, Onye-nwe-ayi:

M’gābùku Gi abù ọma n’etiti mba nile.

10 N’ihi na ebere-Gi di uku rue elu-igwe,

Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.

11 Me Onwe-gi ka I di elu n’elu elu-igwe nile, Chineke;

Ka ebube-Gi di n’elu uwa nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 58

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam.

1 Ọ̀ bu ezie na ezi omume nke kwesiri ka unu kwue bu ob͕i?

Ùnu ji izi-ezi kpe ikpe, unu umu madu?

2 É-è, kama ọ bu nime obi ka unu nēme ajọ omume nile;

Unu nātùzi ihe-ike nke aka-unu n’uwa.

3 Emewo ka ndi nēmebi iwu buru ndi ala ọzọ site n’àkpà-nwa:

Ha akpafuwo site n’afọ nne-ha, nēkwu okwu-ugha.

4 Edide ha nwere yiri edide agwọ:

Ha di ka aju-ala nke nti chiri nke nākpọchi nti-ya;

5 Nke nādighi-ege nti olu nke ndi nārà agwọ,

Ma-ọbu nke dibia nārafu arafu, bú onye emeworo ka ọ mara ihe.

6 Chineke, tijie ezé nile ha n’ọnu-ha:

Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova.

7 Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya:

Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha.

8 Ka ha di ka ejula nāga nāb͕aze,

Dika nwa nwanyi mukworo amukwo, dika ndi ọ dighi mb͕e ha huru anyanwu.

9 Tutu ite-unu amata ọku ogwu,

Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe.

10 Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu:

Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n’ọbara onye nēmebi iwu.

11 Madu gāsi kwa, N’ezie nkpuru diri onye ezi omume:

N’ezie Chineke di Nke nēkpe ikpe n’uwa.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 59

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e Sọl ziri ozi, ha we che ulo ime ka ọ nwua.

1 Naputam n’aka ndi-irom, Chinekem:

Me ka m’si n’aka ndi nēbili imegidem nọ n’ebe di elu.

2 Naputam n’aka ndi nālu ajọ ihe,

Zọputakwam n’aka ndi-ọbara.

3 N’ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu;

Ndi di ike nēzukọ imegidem:

Ọ bughi n’ihi njehiem, ọ bughi kwa n’ihi nmehiem, Jehova.

4 Mb͕e ọ nādighi ajọ omume m’mere ha nāb͕a ọsọ, dozie onwe-ha:

Kpọte Onwe-gi izutem, hu kwa.

5 Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel,

Teta ileta mba nile:

Emelera ndi nāghọ aghughọ n’ajọ ihe amara.Selah

6 Ha nālaghachi n’anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,

Nāga obodo buruburu.

7 Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu;

Mma-agha di n’eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

N’ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.

8 Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì;

I gākwa mba nile emò.

9 Ikem, Gi ka m’gēlezi anya:

N’ihi na Chineke bu ulo-elum.

10 Chineke nke eberem gābia izutem:

Chineke gēme ka m’lekwasi ndi nēchem anwu anya.

11 Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ:

Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida,

Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi.

12 Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu;

Ka anwude kwa ha nime npako-ha,

Na n’ihi ọb͕ub͕a-iyi na n’ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.

13 Me ka ha gwusia n’ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ:

Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob,

Rue nsọtu nile nke uwa.Selah

14 Ha nālaghachi kwa n’anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,

Nāga obodo buruburu.

15 Ndi ahu nāṅaghari iri ihe,

Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali.

16 Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi;

E, m’gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n’ututu:

N’ihi na I buruworom ulo-elu,

Na ebe-nb͕alaga n’ubọchi nkpab͕u dirim.

17 Ikem, Gi ka m’gābùku abù ọma:

N’ihi na Chineke bu ulo-elum, bú Chineke nke eberem.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 60

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Shushan Eduth: Michtam Devid, izí ihe: mb͕e ọ lusoro Eram-naharaim, luso kwa Eram-zoba, ọ̀gù, Joab we laghachi, tib͕ue Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù madu na nnù iri.

1 Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi,

I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.

2 I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya:

Mezie ntiwa-ya nile; n’ihi na o mewo nkpatu.

3 I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike:

I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.

4 I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ,

Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n’ihi ezi-okwu.Selah

5 Ka ewe dọputa ndi I huru n’anya,

Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.

6 Chineke ekwuwo okwu n’di-nsọ-Ya; ka m’ṅuria ọṅu-agha:

M’gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.

7 Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase;

Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;

Juda bu nkpa-n’aka-ezem.

8 Moab bu ite ọsisa-arum;

N’elu Edom ka m’gātu akpukpọ-ukwum:

Filistia, tie nkpu n’ihim.

9 Ònye gēdubàm nke-ọma n’obodo ewusiri ike?

Ònye duruworom rue Edom?

10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju?

I dighi-apu kwa ije agha n’etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke.

11 Yere ayi aka ka ayi pua n’aka onye-nkpab͕u:

N’ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.

12 Nime Chineke ayi ga-eme ihe dìnkpà:

Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpab͕u ayi