Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 41

Abù Ọma nke diri Onye-sisi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n’imeso onye nēnweghi ike:

N’ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.

2 Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n’uwa;

Enye-kwa-la ya n’aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya.

3 Jehova gākwagide ya n’elu ihe o ji edina mb͕e aru nādighi ya ike:

Ihe-ndina-ya nile ka I b͕anweworo n’ọria ya.

4 Mu onwem siri, Jehova, merem amara:

Me ka nkpuru-obim diri ndu; n’ihi na emehiewom megide Gi.

5 Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si.

Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n’iyì?

6 Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu;

Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe:

Ọ nāpu n’èzí nēkwu ya.

7 Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem:

N’imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ.

8 Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru:

E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ.

9 Ọbuná nwoke nke mu na ya di n’udo, onye m’tukwasiri obi, onye nēri nrim,

Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.

10 Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m’bilie,

Ka m’we kwughachi ha ugwọ.

11 Nka ka m’ji mara na ihem nātọ Gi utọ,

N’ihi na onye-irom adighi-eti nkpu nmeri n’arum.

12 Ma mu onwem, n’izu-okèm ka I jideworom,

We me ka m’guzosie ike n’iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

13 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu,

Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

Amen, na Amen.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 42

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Maschil nke umu Kora.

1 Dika agu iyi miri si agu nne-ele,

Otú a ka agu Gi nāgu nkpuru-obim, Chineke.

2 Akpiri Chineke, bú Chineke di ndu, akpọwo nkpuru-obim nku:

Òle mb͕e m’gābia, ewe hum n’iru Chineke?

3 Anya-mirim aghọworom nri ehihie na abali,

Mb͕e ha nāsim ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?

4 Ihe ndia ka m’gēcheta, wusi kwa nkpu tu-obim nimem dika miri,

Otú m’nāgabiga n’etiti ìgwè madu, nējere ha nwayọ dika onye-ndú-ha rue ulo Chineke,

N’olu iti-nkpu-ọṅù na nke ekele, bú ìgwè madu nēme ememe.

5 Gini mere i ji ruda n’ala, nkpuru-obim?

Gini mere i ji su ude nke-uku nimem?

Chere Chineke: n’ihi na m’gēkele kwa Ya ọzọ

N’ihi nzọputa nile nke iru-Ya.

6 Chinekem, nimem ka nkpuru-obim nēruda n’ala:

N’ihi ya anamecheta Gi site n’ala Jọdan,

Site kwa na Heamon, site n’ugwu Miza.

7 Ob͕u-miri nākpọ ob͕u-miri òkù n’olu nrùda-miri nile nke Gi:

Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile agabigawo n’isim.

8 N’ehihie Jehova gēnye ebere-Ya iwu,

N’abali kwa ka abù-Ya gādi n’onum,

Bú ekpere m’nēkpere Chineke nke ndum.

9 Ka m’si Chineke, bú nkumem di elu, N’ìhi gini ka I chezọworom?

N’ìhi gini ka m’nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro?

10 Dika asi na eji ihe gwepia ọkpukpum nile, ndi nākpab͕um nātam uta;

Mb͕e ha nāsin ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?

11 Gini mere i ji ruda n’ala, nkpuru-obim?

Gini mere i ji su ude nke-uku nimem?

Chere Chineke: n’ihi na m’agēkele kwa Ya ọzọ,

Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 43

1 Kpem ikpe, Chineke, kpe kwa ọnum n’ikpe, me ka m’pua n’aka mba nādighi-eme ebere:

Me ka m’si n’aka nwoke bu onye-aghughọ na onye ajọ omume b͕apu.

2 N’ihi na Gi onwe-gi bu Chineke Nke bu ebem siri ike; n’ìhi gini ka I juworom aju?

N’ihi gini ka m’nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro?

3 Ziputa ìhè-Gi na ezi-okwu-Gi; ka ha onwe-ha nēdum:

Ka ha me ka m’biarue ugwu nsọ Gi,

Biaru kwa ebe-obibi-Gi nile.

4 M’gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke,

Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm:

M’gēkele kwa Gi n’ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem.

5 Gini mere i ji ruda n’ala, nkpuru-obim?

Gini mere i ji su ude nke-uku nimem?

Chere Chineke: n’ihi na m’gēkele kwa Ya ọzọ,

Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 44

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma nke umu Kora. Maschil.

1 Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi,

Ọlu I luru n’ubọchi-ha, n’ubọchi mb͕e ochie.

2 Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya;

I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka.

3 N’ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu,

Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha:

Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi,

N’ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.

4 Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke:

Nye nzọputa nile nke Jekob iwu.

5 Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi:

Site n’aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu.

6 N’ihi na ọ bughi utam ka m’nātukwasi obi,

Mma-agham adighi-azọputakwam.

7 Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n’aka ndi nākpab͕u ayi,

I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì.

8 Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile,

Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi.Selah

9 Ma ub͕u a I juwo ayi aju, we tiye ayi n’ọnọdu-ihere;

I dighi-eso kwa usu-ndi-agha-ayi pua ije agha.

10 I nēme ka ayi si n’iru onye-nkpab͕u laghachi azu:

Ọzọ, ndi nākpọ ayi asì nāpunara ayì ihe nye onwe-ha.

11 I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri;

N’etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi.

12 I nēre ndi-Gi ma I naraghi ihe-ọnu-ahia,

I meghi ka àkù-Gi ba uba site n’ọnu-ahia-ha.

13 I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,

Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò.

14 I nēme ayi ilu n’etiti mba nile,

Nfufe-isi n’etiti ndi nile di iche iche.

15 Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n’irum,

Ihere irum ekpuchiwokwam,

16 N’ihi olu ita-uta na onye-nkwulu;

N’ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀.

17 Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi,

Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n’ọb͕ub͕a-ndu-Gi

18 Obi-ayi alaghachighi azu,

Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n’uzọ-Gi wezuga onwe-ha;

19 Na I gwepiawo ayi n’ọnọdu nkita-ọhia,

Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.

20 Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi,

We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi;

21 Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a?

N’ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.

22 N’ezie n’ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile;

Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.

23 Teta, n’ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi?

Teta n’ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi.

24 N’ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi?

N’ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n’ala-ayi na nmeb͕u-ayi?

25 N’ihi na nkpuru-obi-ayi erudawo n’ala rue ájá:

Afọ-ayi araparawo n’ala.

26 Bilie iyere ayi aka,

B͕aputa kwa ayi n’ihi ebere-Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 45

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Shoshannim; Abù Ọma nke Umu Kora. Maschil. Abù ihe-utọ.

1 Obim ab͕ọputawo okwu di nma:

Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze:

Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa.

2 Emewo gi ka i ma nma kari umu madu;

Awukwasiwo amara n’eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua:

N’ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.

3 Ke mma-agha-gi n’úkwù-gi, gi dike,

Ebube-gi na ima-nma-gi.

4 N’ima-nma-gi nọkwasi n’elu inyinya ga nke-ọma,

N’ihi ezi-okwu na ume-ala-n’obi na ezi omume:

Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu.

5 Àkú-gi nile bu ihe di nkọ;

Ndi nile di iche iche nāda n’okpuru gi;

Àkú-gi di n’obi ndi-iro eze.

6 Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi:

Nkpa-n’aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n’aka-eze nke ala-eze-Gi bu.

7 I huwo ezi omume n’anya, we kpọ nmebi-iwu asì:

N’ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere gi

Manu obi-utọ n’isi kari ndi-ibe-gi.

8 Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile;

Site n’ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu.

9 Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n’etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia:

Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n’aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.

10 Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n’ala;

Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi;

11 Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike:

N’ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya.

12 Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia;

Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua.

13 Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru:

Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu.

14 N’uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze:

Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n’azu, bú ndi-ibe-ya,

Anēme ha ka ha biakute gi.

15 Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha:

Ha gābà n’ulo uku eze.

16 Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà,

I gēdo ha ndi-isi n’uwa nile.

17 M’gēme ka echeta aha-gi n’ọb͕ọ nile:

N’ihi nka ndi nile di iche iche gēkele gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 46

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma nke umu Kora; n’elu Alamoth. Abù.

1 Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike,

O mewo ka achọta Ya n’iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.

2 N’ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe,

Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n’ọnọdu-ha ga n’etiti oké osimiri;

3 Mb͕e miri-ya nāb͕a aghara nāsu kwa ufufu,

Mb͕e ugwu nile nēme nkpatu site na nbili-elu ya.Selah

4 Otù osimiri di, miri-iyi-ya nile nēme ka obodo Chineke ṅuria ọṅu,

Bú ebe nsọ nke ebe-obibi nile nke Onye kachasi ihe nile elu.

5 Chineke nọ n’etiti ya; agaghi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya:

Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ.

6 Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha:

O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze.

7 Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi;

Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu.Selah

8 Jenu, hu ọlu nile nke Jehova,

Onye doworo ihe-iju-anya di iche iche n’uwa,

9 Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa;

Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube;

Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n’oku.

10 Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke:

Agēbulim n’etiti mba nile, agēbulim n’uwa.

11 Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi;

Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu.Selah

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 47

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma umu Kora.

1 Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka;

Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke.

2 N’ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu;

Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.

3 Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n’okpuru ayi,

Ọ nēdu kwa mba nile bia n’okpuru ukwu-ayi.

4 Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi,

Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n’anya.Selah

5 Chineke ewerewo iti-nkpu rigo,

Jehova ewerewo olu opì-ike rigo.

6 Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma:

Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma.

7 N’ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu:

Bùkuenu Ya abù ọma, maschil.

8 Chineke aghọwo eze mba nile:

Chineke anọkwasiwo n’oche-eze nsọ Ya.

9 Ndi amara aha-ha nke ndi nile di iche iche achikọtawo onwe-ha

Ibu ndi Chineke nke Abraham:

N’ihi na Chineke nwe ọta nile nke uwa;

Emewo ka Ọ di elu nke-uku.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 48

Abù; Abù Ọma umu Kora.

1 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku,

N’obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya.

2 Ihe mara nma n’idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile,

Ka ugwu Zaion bu, n’akuku nile nke Ugwu,

Bú obodo Eze ukwu.

3 Chineke Nke nọ n’ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.

4 N’ihi na, le, ndi-eze zukọro,

Ha gabigara n’otù.

5 Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n’aru;

Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.

6 Ọma-jijiji jidere ha n’ebe ahu;

Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.

7 I ji ifufe Iru-anyanwu

Tiwa ub͕ọ nile nke Tashish.

8 Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworo

N’obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n’obodo Chineke-ayi:

Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.Selah

9 Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke,

N’etiti ulo uku Gi.

10 Dika aha-Gi si di, Chineke,

Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa:

Ezi omume juputara aka-nri-Gi.

11 Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu,

Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù,

N’ihi ikpé-Gi nile.

12 Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu:

Guanu ulo-elu-ya nile ọnu.

13 Tukwasinu obi-unu n’ékpè-ya,

Tulenu ulo nile ya di elu;

Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n’azu.

14 N’ihi na Nka bu Chineke, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi;

Ya onwe-ya ganēdu ayi rue n’inwu-ọnwu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 49

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma Umu Kora.

1 Nurunu nka, ndi nile di iche iche;

Ṅanu nti, ndi nile bi n’uwa nka:

2 Ma ndi di ala ma ndi di elu,

Ọgaranya na ob͕eye n’otù.

3 Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile;

Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile.

4 M’gātọ ntim n’ala n’ilu:

M’gēkpughepu okwu-omimim n’ubọ-akwara.

5 N’ìhi gini ka m’gātu egwu n’ubọchi ihe ọjọ,

Mb͕e ajọ omume nke ndi nējidem n’ikiri-ukwu dim buruburu,

6 Bú ndi nātukwasi obi n’àkù-ha,

Nānya kwa isi n’iba-uba nke ọgaranya ha bu?

7 Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli,

Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya:

8 (N’ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia,

Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi:)

9 Ka o we digide ndu rue mb͕e ebighi-ebi,

Ghara ihu nbibi anya.

10 N’ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu,

N’otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n’iyì,

We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.

11 Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi,

Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile;

Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.

12 Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru:

O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n’ọnwu.

13 Uzọ-ha nka buru ha nzuzu:

Ma mb͕e ha gasiri okwu-ọnu-ha nātọ madu utọ.Selah

14 Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye;

Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu:

Ndi ziri ezi gēnwe ike n’aru ha n’ututu;

Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.

15 Otú ọ di, Chineke gāb͕aputa nkpuru-obim n’aka ala-mọ:

N’ihi na Ọ gēkurum la.Selah

16 Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya,

Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba:

17 N’ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la;

Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.

18 N’ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya,

Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe.

19 Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà;

Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.

20 Madu nke nọ na nsọpuru, ma ọ dighi-aghọta ihe,

Yiri anu emeworo ka ha debe ọnu-ha du n’ọnwu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 50

Abù Ọma Esaf.

1 Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo,

We kpọ uwa site n’ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.

2 Site na Zaion, bú ebe mazuru nma,

Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.

3 Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti:

Ọku nēripia n’iru Ya,

Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.

4 Ọ nākpọ elu-igwe nke di n’elu òkù,

Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe:

5 Chikọtaranum ndi-eberem;

Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n’elu àjà.

6 Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya;

N’ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe.Selah

7 Nuru, ndim, M’gēkwu kwa;

Nuru, Israel, M’gāb͕a kwa àmà megide gi:

Chineke, bú Chineke-gi, ka M’bu.

8 Ọ bughi n’ihi àjà-gi nile ka M’nābara gi nba;

Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n’irum mb͕e nile.

9 M’gaghi-anara oke-ehi n’ulo-gi,

M’gaghi-anara nkpi ọ bula n’ogige-ewu-na-aturu-gi.

10 N’ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia,

Ya na anu nile n’elu nnù ugwu abua na ọgu iri.

11 Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile:

Anu nile nke nēnughari n’ọhia di kwa n’akam.

12 Ọ buru na agu aguam, M’gaghi-agwa gi:

N’ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.

13 M’gēri anu oke-ehi?

Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m’gāṅu?

14 Chuara Chineke ekele dika àjà;

Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:

15 Kpọkukwam n’ubọchi nkpab͕u;

M’gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.

16 Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si,

Òle ọlu-gi di ya n’ikọ ukpurum nile?

Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n’ọnu-gi?

17 Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì,

We tufue okwum nile n’azu gi.

18 Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ,

Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.

19 I rarawo ọnu-gi nye n’ikwu ihe ọjọ,

Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.

20 I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide;

Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.

21 Ihe ndia ka i meworo, M’we b͕a nkiti;

I chère na adizum ka i di:

M’gābara gi nba, do kwa ya n’usoro n’anya-gi.

22 Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke,

Ka m’we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:

23 Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum;

Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya

Ka m’gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.