Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 31

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Nime Gi, Jehova, ka m’b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi:

N’ezi omume-gi me ka m’b͕apu.

2 Tọrọm nti-Gi n’ala; naputam ngwa ngwa:

Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam.

3 N’ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu;

Ọzọ, n’ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo.

4 I gēme ka m’si n’ub͕u nke ha zoberem puta;

N’ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike.

5 N’aka-Gi ka m’nēnye mọm idebe:

I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.

6 Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama:

Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.

7 Ka m’tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n’ebere-Gi:

N’ihi na I huwo nweda-n’alam;

I mawo nkpuru-obim n’ahuhu di iche iche:

8 I mechibidoghkwam nye n’aka onye-iro;

I mewo ka ukwum abua guzo n’ebe sara mbara.

9 Merem amara, Jehova, n’ihi na anọm na nkpab͕u:

Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.

10 N’ihi na ndum agwusiwo n’iru-újú, na arọm nile n’ize-ume:

Ikem asuwo ngọngọ site n’ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri.

11 N’ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku,

Ọbuná n’ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m’mara oké egwu:

Ndi nāhum n’èzí ab͕anariwom.

12 Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n’obi madu:

Aghọwom ihe nāla n’iyì.

13 N’ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu,

Ujọ dim buruburu:

Mb͕e ha nāb͕a ìzù n’otù imegidem,

Ha zubere iwepu ndum.

14 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m’tukwasiworo obi, Jehova:

Asiwom, Chinekem ka I bu.

15 N’aka-Gi ka mb͕em nile di:

Naputam n’aka ndi-irom, na n’aka ndi nēsob͕um.

16 Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè:

Zọputam n’ihi ebere-Gi.

17 Jehova, ekwela ka ihere mem; n’ihi na akpọkuwom I:

Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n’ala-mọ.

18 Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i;

Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume,

Nime npako na nleda-anya.

19 Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi,

Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n’iru umu madu!

20 I nēzobe ha n’ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n’aka nkekọta nile nke madu:

I nēdebe ha na nzuzo n’ulo-ntu ka ha pua n’ise-okwu nke ire di iche iche.

21 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu:

N’ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n’ebe m’nọ n’obodo ewusiri ike.

22 Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n’anya-Gi:

Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m’tikuru Gi.

23 Hunu Jehova n’anya, ndi-ebere-Ya nile:

Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi,

Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè.

24 Dinu ike, ka obi-unu nwe kwa ume, Unu nile ndi nēchere Jehova.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 32

Abù Ọma nke Devid. Maschil.

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye ebupuworo njehie-ya, onye ekpuchiworo nmehie-ya.

2 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú madu nke Jehova nādighi-aguru ya ajọ omume,

Bú onye ọ dighi aghughọ ọ bula di na mọ-ya.

3 Mb͕e m’b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nká

Site n’ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile.

4 N’ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n’arum:

Umem b͕anwere n’ihe-ikpọ-nku nke uguru.Selah

5 Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem:

M’siri, M’gēkwuputara Jehova njehiem nile;

Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem.Selah

6 N’ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi:

N’ezie n’iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru.

7 Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m’pua n’ahuhu;

Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu.Selah

8 M’gēme ka i nwe uche, M’gēzi kwa gi ihe n’uzọ nke i gēje ije nime ya:

M’gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n’aru.

9 Unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule, nke ọ dighi nghọta ha nwere:

Agēji kwa bit na bridle, dika ihe-ekike, ijide ha,

Ma emeghi otú a ha agaghi-abiaru nso gi.

10 Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu:

Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu.

11 Ṅurianu ọṅu na Jehova, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, unu ndi ezi omume:

Ti-kwa-nu nkpu ọṅù, unu nile ndi ziri ezi n’obi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 33

1 Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume:

N’ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma.

2 Werenu ubọ-akwara kele Jehova:

Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.

3 Bùkueune Ya abù ọhu;

Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma.

4 N’ihi na okwu Jehova ziri ezi;

Anālu kwa ọlu-Ya nile n’ikwesi-ntukwasi-obi.

5 Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n’anya:

Uwa juputara n’ebere jehova.

6 Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe;

Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.

7 Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe:

Ọ nētiye ob͕u-miri n’ulo-àkù di iche iche.

8 Ka uwa nile tua egwu Jehova:

Ka ndi nile ndi bi n’elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya.

9 N’ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di;

Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.

10 Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile:

Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.

11 Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi,

Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.

12 Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya;

Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa.

13 Jehova siri n’elu-igwe legide anya;

Ọ huwo umu madu nile;

14 Ọ siwo n’ọnọdu ebe-obibi-Ya

Lekwasi ndi nile bi n’uwa anya;

15 Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n’otù,

Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile.

16 Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa:

Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.

17 Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu:

Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.

18 Le, anya Jehova di n’aru ndi nātu egwu Ya,

Bú n’aru ndi nēchere ebere-Ya;

19 Inaputa nkpuru-obi-ha n’ọnwu,

Na idebe ha ndu n’oké unwu.

20 Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova:

Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu.

21 N’ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu,

N’ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi.

22 Jehova, ka ebere-Gi dikwasi ayi,

Dika ayi chereworo Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 34

Abù Ọma nke Devid; mb͕e ọ b͕anwere omume-ya n’iru Abimelek, o we chupu ya, o we la.

1 M’gāgọzi Jehova na mb͕e nile:

Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n’ọnum.

2 Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi:

Ndi di ume-ala n’obi gānu ya, we ṅuria ọṅu.

3 Sonum me ka Jehova di uku,

Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n’otù.

4 Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram,

We naputam n’ujọm nile.

5 Ha legidere Ya anya, we nwue enwu:

Ka ihere ghara ime kwa ha n’iru.

6 Onye a ewedara n’ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya,

We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya.

7 Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya,

Ọ we dọputa ha.

8 Detunu ire, hu na Jehova di nma:

Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.

9 Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya:

N’ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya.

10 Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha:

Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.

11 Bianu, umum, gem nti:

Egwu Jehova ka m’gēzi unu.

12 Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ,

Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n’anya, ka o we hu ọdi-nma?

13 Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ,

chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ.

14 Si n’ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;

Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.

15 Anya abua nke Jehova di n’aru ndi ezi omume,

Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.

16 Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ,

Ibipu ncheta-ha n’uwa.

17 Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru,

We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.

18 Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa,

Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.

19 Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume:

Ma n’aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.

20 Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile:

Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji.

21 Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua:

Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe.

22 Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya:

Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 35

Abù Ọma nke Devid.

1 Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù:

Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.

2 Jide ọta na ọta uku,

Bilie iyerem aka.

3 Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum:

Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M’bu.

4 Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n’ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike:

Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.

5 Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n’iru ifufe,

Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.

6 Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ,

Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha.

7 N’ihi na ọ bu mb͕e m’nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha,

Ọ bu mb͕e m’nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.

8 Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi;

Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya:

Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.

9 Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:

Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.

10 Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi?

Gi Onye nānaputa onye ewedara n’ala n’aka onye di ike kari ya,

I nānaputa onye ewedara n’ala na ob͕eye n’aka onye nānapu ya ihe n’ike.

11 Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili;

Ihe nke m’nāmaghi ka ha nājum.

12 Ha nākwughachim ihe ọjọ n’ọnọdu ezi ihe,

Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.

13 Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe:

Ewedaram nkpuru-obim n’ala site n’obubu-ọnu;

Ekperem nālaghachikute kwa obim.

14 Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m’jeghariri:

Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m’rudara n’ala nēyi uwe-nkpe.

15 Ma mb͕e m’nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha:

Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m’nāmaghi;

Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:

16 Dika ndi emeruru emeru n’etiti ndi nāchì ọchì n’ihi ob͕e-achicha,

Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.

17 Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya?

Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim,

Si n’aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m’nwere nání ya.

18 M’gēkele Gi n’etiti nkpọkọta bara uba:

N’etiti otù ndi nwere ume ka m’gēto Gi.

19 Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu:

Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m’nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.

20 N’ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu:

Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n’ala.

21 Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem;

Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.

22 I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti:

Onye-nwe-ayi, anọlam n’ebe di anya.

23 Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m,

Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.

24 Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem;

Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.

25 Ekwela ka ha si n’obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi:

Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.

26 Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n’otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n’ihe ọjọ nādakwasim:

Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.

27 Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ:

Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ.

28 Irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi,

Baye-kwa-ra otuto-Gi ogologo ubọchi nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 36

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke orù Jehova, bú Devid.

1 Ihe nke nāputa n’ọnu njehie nke onye nēmebi iwu nāsi n’etiti obim

Ọ dighi oké egwu Chineke di n’anya-ya abua.

2 N’ihi na ọ nāgwa onwe-ya okwu ire-utọ n’anya onwe-ya,

Bayere ichọputa ajọ omume-ya na ikpọ ya asì.

3 Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ:

Ọ rapuwo inwe uche na ime nma.

4 Ajọ ihe ka ọ nēchè n’elu ihe-ndina-ya;

Ọ nēguzo onwe-ya n’uzọ nke nādighi nma;

Ọ dighi-aju ihe ọjọ.

5 Jehova, n’elu-igwe ka ebere-Gi di;

Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé.

6 Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke;

Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne:

Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova.

7 Le ka ebere-Gi si di oké ọnu-ahia, Chineke!

Umu madu nāb͕abá kwa n’okpuru ǹdò nkù-Gi abua.

8 Afọ nējubiga ha ókè site n’abuba nke ulo-Gi;

Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua.

9 N’ihi na n’ebe I nọ ka isi-iyi ndu di:

N’ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè.

10 Me ka ebere-Gi digidere ndi mara Gi;

Me kwa ka ezi omume-Gi digidere ndi ziri ezi n’obi.

11 Ekwela ka ukwu npako biakwasim,

Ekwe-kwa-la ka aka nke ndi nēmebi iwu me ka m’wagharia.

12 N’ebe ahu ka ndi nālu ajọ ihe daworo:

Enudawo ha, ha apughi kwa ibili ọzọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 37

Abù Ọma nke Devid.

1 Emela ka iwe-gi di ọku n’ihi ndi nēme ihe ọjọ,

Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo.

2 N’ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa,

Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.

3 Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;

Biri n’ala, nāzù kwa onwe-gi n’ikwesi-ntukwasi-obi.

4 Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;

Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.

5 Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;

Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.

6 Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,

Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.

7 Nọ dū n’iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya:

Emela ka iwe-gi di ọku n’ihi onye ọ nāgara nke-ọme n’uzọ ya,

N’ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.

8 Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma:

Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n’ime ihe ọjọ.

9 N’ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:

Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.

10 Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:

I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.

11 Ma ndi di ume-ala n’obi gēnweta ala;

Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.

12 Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,

Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.

13 Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:

N’ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia

14 Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;

Ime ka onye ewedara n’ala na ob͕eye da,

Ib͕u ndi ziri ezi n’uzọ-ha:

15 Mma-agha-ha gābà n’obi onwe-ha,

Agāb͕aji kwa uta-ha.

16 Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma

Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.

17 N’ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:

Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.

18 Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:

Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.

19 Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:

Afọ gēju kwa ha n’ubọchi oké unwu.

20 N’ihi na ndi nēmebi iwu gāla n’iyì,

Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:

Ha gēdè; n’anwuru-ọku ka ha gēdè.

21 Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:

Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.

22 N’ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;

Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.

23 Site n’aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;

Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.

24 Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:

N’ihi na Jehova nākwagide aka-ya.

25 Nwata ka m’buworo, aghọwokwam okenye;

Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,

Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.

26 Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;

Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.

27 Si n’ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;

Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

28 N’ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n’anya,

Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya;

Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha:

Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.

29 Ndi ezi omume gēnweta ala,

Biri kwa n’elu ya rue mb͕e ebighi-ebi.

30 Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche,

Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé.

31 Iwu Chineke-ya di n’obi-ya;

Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa.

32 Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche,

Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.

33 Jehova agaghi-arapu ya n’aka-ya,

Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.

34 Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya,

Ọ gēbuli kwa gi inweta ala:

Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu.

35 Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji,

Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n’ala mara ya.

36 O we gabiga, ma, le, ọ nọgh:

M’we chọ ya, ma achọtaghi ya.

37 Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi:

N’ihi na ọdi-n’iru diri onye-udo.

38 Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n’otù:

Agēbipu ọdi-n’iru nke ndi nēmebi iwu.

39 Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n’aka Jehova bia:

Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.

40 Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu:

Ọ nēme ka ha si n’aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha,

N’ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 38

Abù Ọma Devid, ime ka echeta echeta.

1 Jehova, abalaram nba n’iwe-Gi:

Adọ-kwa-lam aka na nti n’ọnuma-Gi.

2 N’ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom,

Aka-Gi adakwasiwokwam.

3 Ọ dighi izu-okè ọ bula di n’anu-arum n’ihi iwe-Gi;

Ọ dighi kwa udo ọ bula di n’ọkpukpum nile n’ihi nmehiem.

4 N’ihi na ajọ omumem nile agabigawo n’elu isim:

Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.

5 Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri,

N’ihi uchem b͕agọro ab͕agọ.

6 Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku;

Ogologo ubọchi nile ka m’jeghariworo nēyi uwe-nkpe.

7 N’ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku;

Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n’anu-arum.

8 Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku:

Ab͕ọwom uja n’ihi isu-ude nke obim.

9 Onye-nwe-ayi, n’iru Gi ka ichọsi-ikem nile di;

Ize-umem ezonarighi kwa Gi.

10 Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:

Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n’arum.

11 Ndi nāhum n’anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;

Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n’ebe di anya.

12 Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà;

Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n’iyì di iche iche,

Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n’uche ogologo ubọchi nile.

13 Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe;

Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.

14 E, adim ka madu nke nādighi-anu ihe

Onye iba-nba ọ bula nādighi n’ọnu-ya.

15 N’ihi na Gi, Jehova, ka m’chereworo:

Gi onwe-gi gāza, Onye-nwe-ayi, Chinekem.

16 N’ihi na asirim, Ka ha ghara iṅuri ọṅu n’arum:

Mb͕e anēwezuga ukwum n’ọnọdu-ya, ha mere onwe-ha ka ha di uku imegidem.

17 N’ihi na mu owem gaje ije nsukwra-achi,

Ihe-nb͕um di kwa na ncherita-irum mb͕e nile.

18 N’ihi na m’gēgosi ajọ omumem;

M’gēcheb͕u onwem bayere nmehiem.

19 Ma ndi-irom nādi ndu, nwe ume:

Ha ba-kwa-ra uba, bú ndi nākpọm asì n’uzọ okwu-ugha.

20 Ndi ahu kwa nke nākwughachi ihe ọjọ n’ọnọdu ezi ihe

Nēmegidem, n’ihi na anamab͕aso ezi ihe.

21 Arapulam, Jehova:

Chinekem, anọlam n’ebe di anya.

22 Bia ọsọsọ iyerem ka,

Onye-nwe-ayi, bú nzọputam.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 39

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù, bú Jedutun. Abù Ọma Devid.

1 Asirim, Ka m’lezie uzọm nile anya,

Ka m’we ghara iwere irem mehie:

Ka m’debere ọnum ihe ikechi ọnu,

Mb͕e onye nēmebi iwu nọ n’irum.

2 Aghọrọm onye-ob͕i n’inọ-dū, ab͕aram nkiti, ọbuná ipu n’ikwu ezi ihe;

Ewe kpalie ihe-nb͕um.

3 Obim di ọku nimem;

Mb͕e m’nātughari uche ọku rebere:

M’we were irem kwue okwu:

4 Jehova, me ka m’mara ọgwugwum,

Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu;

Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi.

5 Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka;

Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n’iru Gi:

N’ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n’iguzosi-ike-ya.Selah

6 N’ezie ọ bu n’onyinyo ka madu nējeghari:

N’ezie n’otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara:

Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.

7 Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m’leworo anya gini?

Ncherem, n’ebe I nọ ka ọ di.

8 Naputam n’aka njehiem nile:

Emelam ka m’buru ihe-ita-uta nke onye-nzuzu.

9 Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum;

N’ihi na Gi onwe-gi mere ya.

10 Si n’arum wezuga ihe-otiti-Gi:

Emewo ka mu onwem gwusia site n’ilu-ọ̀gù nke aka-Gi.

11 I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n’ihi ajọ omume,

I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla:

N’ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu.Selah

12 Nuru ekperem, Jehova, ṅa kwa nti ntikum;

Ab͕ala nkiti n’anya-mirim:

N’ihi na ọbìa ka m’bu n’ebe I nọ,

Abum onye-nnọdu, dika nnam-hà nile.

13 Lepum anya, ka m’we b͕asa irum,

Tutu mu ala, ghara inọ kwa ọzọ n’uwa.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 40

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Elesirim anya Jehova ike;

Ọ we tọrọm nti-Ya n’ala, nu ntikum.

2 Ọ we me ka m’si n’olùlù nbibi, n’apiti nke ala urọ, rigoputa;

Ọ we me ka ukwum abua guzo n’elu nkume di elu, Ọ nēme ka nzọ-ukwum nile guzosie ike.

3 Ọ we tiye abù ọhu n’ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi:

Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi.

4 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya,

Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n’uzọ okwu-ugha.

5 Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile,

Na èchìchè-Gi nile n’ebe ayi nọ:

Apughi idoro Gi ha n’usoro;

Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha,

Ha kariri igu-ọnu.

6 Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ;

Nti abua ka I ràpúworom:

Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.

7 Mb͕e ahu ka M’siri, Le, abiawom;

N’akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem:

8 Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke;

Iwu-Gi di kwa nime obim.

9 Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba;

Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua,

Jehova, Gi onwe-gi amawo.

10 Ekpuchighm ezi omume-Gi nime obim;

Ekwusawom ikwesi-ntukwasi-obi-Gi na nzọputa-Gi:

Ezonarighm nkpọkọta-Gi bara uba ebere-Gi na ezi-okwu-Gi

11 Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile:

Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile.

12 N’ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu,

Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ;

Ha kariri agiri-isi nile nke isim n’uba, obim arapuwokwam.

13 Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam:

Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.

14 Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n’otù,

Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya:

Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n’ọnọdu-ihere,

Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.

15 Ka ha tọb͕ọrọ n’efu n’ihi ihere-ha,

Bú ndi nāsim, Ehe, ehe.

16 Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi:

Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n’anya nāsi mb͕e nile,

Ka Jehova di uku.

17 Ma mu onwem bu onye ewedara n’ala na ob͕eye;

Ma Onye-nwe-ayi nēchèrem èchìchè:

Onye-iye-akam na Onye nēme ka m’b͕apu ka I bu;

Chimekem, anọla ọdù.