Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 21

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, n’ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu;

Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi!

2 Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya,

I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya.Selah

3 N’ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya:

I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n’isi-ya.

4 Ndu ka Ọ riọrọ n’aka-Gi, I nyewo ya ndu ahu,

Bú ubọchi ndu di ogologo rue mb͕e nile ebighi-ebi.

5 Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi:

Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya.

6 N’ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi:

I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n’iru Gi.

7 N’ihi na eze nātukwasi Jehova obi,

Site kwa n’ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n’ọnọdu-ya.

8 Aka-Gi gāchọputa ndi-iro-Gi nile:

Aka-nri-Gi gāchọputa ndi nākpọ Gi asì.

9 I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi:

Jehova gēloda ha n’iwe-Ya,

Ọku gēripia kwa ha.

10 I gēme ka nkpuru-ha si n’uwa la n’iyì,

Umu-ha kwa, site n’etiti umu madu.

11 N’ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi:

Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime.

12 N’ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu,

I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n’iru.

13 Jehova, me Onwe-gi ka I di elu n’ike-Gi:

Ayi gābù abù, bùku kwa idi-ike-Gi abù ọma.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 22

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; nelu Aijeleth hash-Shahar. Abù Ọma Devid.

1 Chinekem, Chinekem, n’ìhi gini ka I rapurum?

N’ìhi gini ka I nọ m n’ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya?

2 Chinekem, anamakpọ òkù n’ehihie, ma I dighi-aza;

N’abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m’nwere.

3 Ma Gi onwe-gi di nsọ,

Gi Onye nānọkwasi n’otuto nile nke Israel dika oche-eze.

4 Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi:

Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu.

5 Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha:

Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha.

6 Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m’bu;

Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya.

7 Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi:

Ha na-enu ọnu, fufè isi, si,

8 Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu:

Ya naputa ya, n’ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ.

9 Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m’waputa n’afọ nnem:

I nēme ka m’tukwasi obi mb͕e m’nọ nara nnem.

10 Na Gi ka atukwasirim site n’àkpà-nwa:

Site n’afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem.

11 Anọlam n’ebe dí anya; n’ihi na nkpab͕u di nso;

N’ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.

12 Ọtutu oke-ehi dim buruburu:

Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.

13 Ha asaghepuwo ọnu-ha n’arum,

Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja.

14 Dika miri ka awusiworom,

Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha:

Obim aghọwo ihe dika wax;

Ọ lọwo miri n’etiti afọm.

15 Ikem akpọwo nku di ka osisi;

Irem nārapara kwa n’ab͕am;

Ọ bu kwa n’ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.

16 N’ihi na nkita dim buruburu:

Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu;

Ha nādupú akam abua na ukwum abua.

17 Anamagu ọkpukpum nile ọnu;

Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:

18 Ha nēkère onwe-ha uwem,

N’elu ihe m’nēyi n’aru ka ha nēfe kwa nzà.

19 Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n’ebe di anya:

Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.

20 Naputa nkpuru-obim na mma-agha;

Naputa nkpuru-obi m’nwere nání ya náka nkita.

21 Zọputam n’ọnu ọdum;

Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.

22 Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi:

N’etiti nkpọkọta-Gi ka m’gēto Gi.

23 Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya;

Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya;

Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel.

24 N’ihi na O ledaghi nweda-n’ala nke onye ewedara n’ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú;

O zonarighi kwa ya iru-Ya;

Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.

25 N’ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba:

M’gākwughachi nkwam nile n’iru ndi nātu egwu Ya.

26 Ndi di ume-ala n’obi gēri ihe, riju kwa afọ:

Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya:

Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

27 Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova:

Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n’iru Gi.

28 N’ihi na ọ bu Jehova nwe ala-eze:

Ọ nāchi kwa mba nile.

29 Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala:

N’iru Ya ka ndi nile ndi nārida n’ájá gēruru ala,

Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu.

30 Otù nkpuru gēfè Ya òfùfè;

Agākọrọ ọb͕ọ ọzọ akukọ a bayere Onye-nwe-ayi.

31 Ha gābia gosi otù ndi agàmuputa n’iru ezi omume-Ya,

Na O mewo ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 23

Abù Ọma Devid.

1 Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm.

2 N’ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m’makpu:

N’akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo.

3 Ọ nēweghachi nkpuru-obim:

Ọ nēdum n’uzọ nile nke ezi omume n’ihi aha-Ya.

4 Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu,

M’gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n’ihi na Gi onwe-gi nọyerem:

Ndele-Gi na nkpa-n’aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.

5 I nēdo table n’usoro n’irum n’anya ndi nākpab͕um:

I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè.

6 Nání idi-nma na ebere gāb͕asom ubọchi nile nke ndum:

M’gēbi kwa n’ulo Jehova rue ogologo ubọchi nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 24

Abù Ọma Devid.

1 Jehova nwe uwa na ùjú-ya;

Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.

2 N’ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n’elu oké osimiri nile,

Me kwa ka o guzosie ike n’elu osimiri nile.

3 Ònye gārigo n’ugwu Jehova?

Ònye gēguzosi kwa ike n’ebe nsọ Ya?

4 Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha;

Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu,

Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.

5 Ọ gānata ngọzi n’aka Jehova,

Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.

6 Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya,

Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob.Selah

7 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;

Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:

Eze ebube gābata kwa.

8 Ònye kwa bu Eze ebube a?

Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike,

Ọ bu Jehova, Nke bu dike n’agha.

9 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;

Buli-kwa-nu ha elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:

Eze ebube gābata kwa.

10 Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a?

Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha,

Ya onwe-ya bu Eze ebube a.Selah

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 25

Abù Ọma nke Devid.

1 Gi, Jehova, ka m’nēbuliri nkpuru-obim.

2 Chinekem, na Gi ka m’tukwasiworo obi,

Ekwela ka ihere mem;

Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n’arum.

3 Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha:

Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n’efu.

4 Jehova, me ka m’mara uzọ-gi nile;

Zím okporo-uzọ-Gi nile.

5 Mem ka m’zọ ije n’ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe;

N’ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam;

Gi ka m’nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.

6 Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile;

N’ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo.

7 Echetala nmehie nile m’mehiere n’okorọbiam, ha na njehiem nile:

Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam,

N’ihi idi-nma-Gi, Jehova.

8 Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu:

Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n’uzọ.

9 Ọ nēme ka ndi di ume-ala n’obi zọ ije n’ikpé:

Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n’obi uzọ-Ya.

10 Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu

N’ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.

11 N’ihi aha-Gi, Jehova,

B͕aghara ajọ omumem, n’ihi na o riri nne.

12 Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova?

O gēzi ya ihe n’uzọ ọ nārọputa.

13 Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n’ọdi-nma,

Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.

14 Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;

Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.

15 Anyam abua di n’ebe Jehova nọ mb͕e nile;

N’ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n’ub͕u puta.

16 Chem iru, me-kwa-ram amara;

N’ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n’ala ka m’bu.

17 Ahuhu nile nke obim sara mbara:

Me ka m’si na nkpàm nile puta.

18 Hu nweda-n’alam na ọnọdu ọjọm;

Bupu kwa nmehiem nile.

19 Hu ndi-irom, n’ihi na ha di ọtutu;

Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.

20 Debe nkpuru-obim, naputakwam:

Ekwela ka ihere mem, n’ihi na ab͕abàwom nime Gi.

21 Ka izu-okè na izi-ezi chezim,

N’ihi na elewom anya Gi.

22 Chineke, b͕aputa Israel

Na nkpà-ya nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 26

Abù Ọma nke Devid.

1 Kpem ikpe, Jehova, n’ihi na mu onwem ejewo ije n’izu-okèm:

Ọ bu kwa na Jehova ka m’tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.

2 Nwà m, Jehova, nwaputakwam;

Nucha akurum abua na obim.

3 N’ihi na ebere-Gi di n’iru anyam;

Ejeghariwokwam n’ezi-okwu-Gi.

4 Mu na madu efu anọkọghi;

Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.

5 Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì,

Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.

6 Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ;

We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:

7 Ime ka ege nti olu ekele,

Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

8 Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n’anya,

Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.

9 Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n’otù,

Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n’otù:

10 Ndi nzube ọjọ di n’ka-ha,

Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n’iri-ngo.

11 Ma mu onwem, n’izu-okèm ka m’gēje ije:

B͕aputam, me-kwa-ram amara.

12 Ukwum eguzowo n’ala di lari:

Nime nkpọkọta madu nile ka m’gāgọzi Jehova.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 27

Abù Ọma nke Devid.

1 Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m’gātu egwu?

Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m’gātu oké egwu?

2 Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum,

Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n’ala.

3 Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem,

Obim agaghi-atu egwu:

Ọ buru na agha ebilie imegidem,

Na nka ka mu onwem nātukwasi obi.

4 Otù ihe ka m’riọworo n’aka Jehova, nke ahu ka m’nāchọ;

Ọ bu ka m’biri n’ulo Jehova ubọchi nile nke ndum,

Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n’ulo uku Ya.

5 N’ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n’ulo-ntu-Ya n’ubọchi ihe ọjọ:

Ọ gēzobem n’ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya;

N’oké nkume ka Ọ gēbulim elu.

6 Ma ub͕u a agēbuli isim elu n’elu ndi-irom dim buruburu;

M’ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n’ulo-ikwū-Ya;

M’gābù abù, m’gābùku kwa Jehova abù ọma.

7 Jehova, nuru mb͕e m’were olum kpọ òkù:

Me-kwa-ram amara, zakwam.

8 Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum;

Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.

9 Ezonarilam iru-Gi;

Ejila iwe wezuga orù-Gi:

Iye-akam ka I buworo;

Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam.

10 N’ihi na nnam na nnem arapuwom,

Ma Jehova gēkubatam.

11 Jehova, zím uzọ-Gi;

Durukwam n’okporo-uzọ di lari,

N’ihi ndi nēchem anwu.

12 Enyelam n’aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um:

N’ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume.

13 M’gēme aṅa ma asi na ekweghm na m’gēle idi-nma Jehova

N’ala ndi di ndu?

14 Nēle anya Jehova:

Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume;

E, nēle anya Jehova.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 28

Abú Ọma nke Devid.

1 Gi, Jehova, ka m’nākpọku;

Oké nkumem, echila nti n’ebe m’nọ:

Ka I we ghara ib͕am nkiti,

M’we yie ndi nārida n’olùlù.

2 Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m’tikuru Gi,

Mb͕e m’chiliri akam abua n’ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di.

3 Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu,

Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe;

Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo,

Ma ihe ọjọ di n’obi-ha.

4 Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di:

Nye ha dika aka-ha si eme;

Nyeghachi ha ihe ha mere.

5 N’ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova,

Na n’ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo,

Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.

6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu,

N’ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile.

7 Jehova bu ikem na ọtam;

Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka:

Obim we nāwuli elu n’ọṅù;

M’gēsite kwa n’abùm kele Ya.

8 Jehova buru ya ike,

Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.

9 Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi:

Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n’aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 29

Abù Ọma Devid.

1 Nyenu Jehova, unu umu Chineke,

Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

2 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya;

Kpọnu isi ala nye Jehova n’ima-nma nke idi-nsọ.

3 Olu Jehova di n’elu miri:

Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe,

Jehova nọ n’elu ọtutu miri.

4 Olu Jehova nāda n’ike;

Olu Jehova nāda n’ima-nma.

5 Olu Jehova nētiwa osisi cedar;

Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.

6 Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi;

Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.

7 Olu Jehova nāwaputa ire ọku.

8 Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu;

Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.

9 Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele,

Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia:

Ọzọ n’ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube.

10 Jehova nọduru n’oche-eze n’Iju-miri ahu;

Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi.

11 Jehova gēnye ndi-Ya ike;

Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 30

Abù Ọma; Abù nke ira Ulo ahu nye Chineke; Abù Ọma nke Devid.

1 M’gēbuli Gi elu, Jehova; n’ihi na I dọgowom n’elu,

I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam.

2 Jehova, bú Chinekem,

Etikurum, I, I we me ka m’diri ndu.

3 Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n’ala-mọ rigoputa:

I mewo ka m’si n’etiti ndi nārida n’olùlù di ndu.

4 Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya,

Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

5 N’ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n’iwe-Ya;

Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ:

N’anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali,

Ma n’ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.

6 Ma mu onwem, asirim n’udom,

Agaghi-ewezugam n’ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi.

7 Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m:

I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji.

8 Gi, Jehova, ka m’nākpọku;

Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m’nāriọ aririọ-amara:

9 Ùrù gini di n’ọbaram, mb͕e m’na-arida n’olùlù?

Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi?

10 Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara:

Jehova, buru onye nēyerem aka.

11 I b͕anweworom iti-aka-n’obim ka ọ ghọ ite-egwú;

I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké:

12 Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du.

Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m’gēkele Gi.