Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 11

Abù Oma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid.

1 Na Jehova ka m’b͕abàworo:

Ùnu si aṅa si nkpuru-obim,

Felaganu n’ugwu-unu dika nnunu?

2 N’ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya,

Ha edoziwo àkù-ha n’elu eriri-uta,

Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n’ochichiri.

3 N’ihi na anākwada ide nile;

Gini ka onye ezi omume meworo?

4 Jehova nọ n’ulo uku Ya di nsọ,

Jehova, n’elu-igwe ka oche-eze-Ya di;

Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.

5 Jehova n’anwa onye ezi omume:

Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n’anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì.

6 Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo;

Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha.

7 N’ihi na onye ezi omume ka Jehova bu; ezi omume ka Ọ huru n’anya:

Ndi ziri ezi gāhu iru-ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 12

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Octave. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, zọputa; n’ihi na onye-ebere agwusiwo;

N’ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n’etiti umu madu.

2 Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya:

Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.

3 Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ,

Na ire nke nēkwu oké ihe:

4 Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike;

Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n’akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi?

5 N’ihi ipunara ndi ewedara n’ala ihe, n’ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye,

Ub͕u a ka M’gēbili, ka Jehova kwuru;

M’gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.

6 Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha;

Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n’ite-nnucha nke nērusa n’ala,

Nke esichaworo ub͕ò asa.

7 Gi onwe-gi, Jehova, gēdebe ha,

I gēchezi ha ka ha pua n’aka ọb͕ọ a rue mb͕e ebighi-ebi.

8 Ndi nēmebi iwu nējeghari buruburu,

Mb͕e anēbuli ihe jọb͕uru onwe-ya elu n’ebe umu madu nọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 13

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi?

Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi?

2 Rùe ole mb͕e ka m’gēdo ndum-ọdu nile nime nkpuru-obim,

Nēru újú n’obim n’ehihie nile?

Rùe ole mb͕e ka agēbuli onye-irom elu ibu onye-isim?

3 Legide anya, zam, Jehova, Chinekem:

Nye anyam abua ìhè, ka m’we ghara iraru ura ọnwu;

4 Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n’ike;

Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n’ọnọdum.

5 Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi;

Ka obim tegharia egwú ọṅù na nzọputa-Gi:

6 Ka m’bùkue Jehova abù,

N’ihi na Ọ mesowom nke-ọma.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 14

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid.

1 Onye-nzuzu asiwo n’obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di.

Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú;

Ọ dighi onye nēme ezi ihe.

2 Jehova siri n’elu-igwe lekwasi umu madu anya,

Ihu ma ọ di onye nwere uche,

Nke nāchọ Chineke.

3 Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n’otù dika miri;

Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.

4 Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe?

Bú ndi riworo nri site na-iri ndi m,

Ma ha akpọkughi Jehova.

5 N’ebe ahu ka ha turu oké egwu;

N’hi na Chineke nọ n’ọb͕ọ onye ezi omume.

6 Unu nēme ndum-ọdu nke onye ewedara n’ala ka ọ buru ihe-ihere,

N’ihi na Jehova bu ebe-nb͕abà-ya.

7 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta!

Mb͕e Jehova gēji me ka ndọta-n’agha ndi-Ya lata,

Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọṅu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 15

Abù Ọma Devid.

1 Jehova, ònye gānọ dika ọbìa n’ulo-ikwu-Gi?

Ònye gēbi n’ugwu nsọ Gi?

2 Onye nēje ije n’izu-okè, nke nālu kwa ọlu ezi omume,

Nke nēkwu kwa ezi-okwu n’obi-ya.

3 O jighi ire-ya kwue okwu-azu,

Ọ meghi madu-ibe-ya ihe ọjọ,

O bulighi kwa ita-uta megide onye-ab͕ata-obi-ya.

4 Eledawo onye ajuru aju anya n’anya-ya,

Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu.

Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya.

5 Ọ nyeghi ego-ya inara uma,

Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ.

Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 16

Michtam nke Devid.

1 Debem, Chineke: n’ihi na ab͕abàwom nime Gi.

2 Asiwom Jehova, Onye-nwem ka I bu:

Ọdi-nmam adighi-eru Gi aru.

3 Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n’uwa,

Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ:

4 Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n’ọnọdu Jehova:

M’gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara,

M’gaghi-eburu kwa aha-ha n’elu eb͕ub͕ere-ọnum.

5 Jehova bu òkè nke ihe m’ketara na ìkom:

Gi onwe-gi nējide ihe rurum n’ife-nzà.

6 Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n’ebe di utọ;

N’ezie ihe-nketam dim ezi nma.

7 M’gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu:

Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n’abali nile.

8 Edowom Jehova n’irum mb͕e nile:

N’hi na Ọ nọ n’aka-nrim, agaghi-ewzugam n’ọnọdum.

9 N’ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù:

Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi.

10 N’ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim;

I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi.

11 I gēme ka m’mara uzọ ndu:

Ojuju-afọ ọṅù di n’iru Gi;

E! utọ di iche iche di n’aka-nri-Gi ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 17

Ekpere Devid.

1 Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n’iti-nkpum;

Ge nti n’ekperem, nke m’nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe.

2 Ka ikpém si n’iru Gi puta;

Anya-Gi nāhu izi-ezi.

3 I nwawo obim; I letawom n’abali;

I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe;

Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè.

4 Ma ọlu madu, site n’okwu eb͕ub͕ere-onu-Gi

Ka mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya.

5 Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile,

Ewezugaghi ije-ukwum n’ọnọdu-ha.

6 Mu onwem akpọkuwo Gi, n’ihi na I nāzam, Chineke:

Tọrọm nti-Gi n’ala, nuru okwu-ọnum.

7 Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime Gi

Site n’iru ndi nēbili imegide ha.

8 Debem dika nwa-anya-Gi,

Zobem n’okpuru ǹdò nkù-Gi,

9 Site n’iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe,

Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu.

10 Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba:

Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako.

11 Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi:

Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala.

12 Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike,

Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n’ebe-nzuzo.

13 Bilie, Jehova,

Buru ya uzọ, me ka o ruru ala:

Me ka nkpuru-obim b͕apu n’aka ndi nēmebi iwu site na mma-agha-Gi;

14 N’aka madu site n’aka-Gi, Jehova,

N’aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a,

Ndi I nēmeju afọ-ha n’ihe-Gi atukọbara atukọba:

Afọ nēju ha n’umu,

Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru.

15 Mu onwem, n’ezi omume ka m’gāhu iru-Gi:

Ka afọ jum n’udi gi, mb͕e m’tetara.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 18

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke orù Jehova, bú Devid, onye gwara Jehova okwu nile nke abù a n’ubọchi Jehova naputara ya n’ọbu-aka ndi-iro-ya nile, na n’ọbu-aka Sol: o we si,

1 Anamahu Gi n’anya nke-uku, Jehova, bú ikem.

2 Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu;

Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;

Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.

3 Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova:

Ewe zọputam n’aka ndi-irom.

4 Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,

Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m’tua egwu.

5 Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu:

Ọnyà nile nke ọnwu biara n’irum.

6 Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,

Ọ bu Chinekem ka m’nētiku:

O nēsi n’ulo uku Ya nu olum,

Nkpu m’tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.

7 Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,

Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji,

Ewe me ka ha me nkpatu, n’ihi na iwe-Ya di ọku.

8 Anwuru-ọku rigoro n’imi-Ya,

Ọku nēsi kwa n’ọnu-Ya ripia:

Afunwuru icheku site na ya.

9 O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida;

Oké ọchichiri di kwa n’okpuru ukwu-Ya abua.

10 O we nọkwasi n’elu cherub dika inyinya, we felie:

O we fesie ike n’elu nkù ìfùfè.

11 Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu;

Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.

12 Site n’onwunwu nke nēnwu n’iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara,

Akú-miri-ígwé na icheku ọku.

13 Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n’elu-igwe,

Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da;

Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.

14 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;

Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.

15 Ewe hu ebe nile miri si erù,

Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,

Site n’ibasi-nba-ike-Gi, Jehova,

Site nume nke iku-ume nke imi-Gi.

16 O si n’elu zìe, kurum,

Dọputam n’ọtutu miri.

17 Ọ nānaputam n’aka onye-irom di ike,

Na n’aka ndi nākpọm asì, n’ihi na ha nwere ume karim.

18 Ha nābia n’irum n’ubọchi nhuju-anyam:

Ma Jehova burum ihe-ndabere.

19 O we me ka m’puta rue ebe sara mbara;

Ọ nādọputam, n’ihi na ihem tọrọ Ya utọ.

20 Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di;

Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ.

21 N’ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova,

Emebighikwa m iwu n’ipu n’aka Chinekem.

22 N’ihi na ikpé-Ya nile di n’irum,

Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n’ebe m’nọ.

23 M’we zue okè n’ebe Ọ nọ,

Edebe-kwa-ram onwem pua n’ajo omumem.

24 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di,

Dika idi-ọcha akam abua n’anya-Ya si di.

25 N’ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere;

N’ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;

26 N’ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;

Ma n’ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á.

27 N’ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n’ala;

Ma anya npako, I gēme ka ha di ala.

28 N’ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam:

Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.

29 N’ihi na m’nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe;

Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi.

30 Chineke, uzọ-Ya zuru okè:

Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;

Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.

31 N’ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?

Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?

32 Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké,

Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.

33 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:

N’elu ebem di elu ka O nēguzokwam.

34 O nēzi akam abua ibu agha;

Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.

35 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:

Aka-nri-Gi nākwagidekwam,

Ume-ala-n’obi nke Gi nēmekwam ka m’ba uba.

36 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n’okpurum,

Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.

37 Anamachu ndi-irom, we rue ha aru:

Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.

38 Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:

Ha nāda n’okpuru ukwum abua.

39 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:

I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n’okpurum.

40 Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha

Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

41 Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:

Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.

42 Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n’iru ifufe:

Dika apiti èzí ka m’nāwupu ha.

43 I nēme ka m’b͕apu n’ilu-ọ̀gù nile nke ndim;

I nēdom onye-isi mba nile ọzọ

Ndi m’nāmaghi gēfèm òfùfè.

44 Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:

Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n’okpurum.

45 Ndi ala ọzọ nāta aru,

Ma jijiji, si n’ebe-nmechibido-ha puta.

46 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;

Chineke nke nzọputam di kwa elu:

47 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,

We duru ndi di iche iche bia n’okpurum.

48 Ọ nēme ka m’baputa n’aka ndi-irom:

I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:

I nānaputam n’aka madu nēme ihe-ike.

49 N’ihi nka ka m’gēkele Gi, Jehova, n’etiti mba nile,

Aha-Gi ka m’gābùku kwa abù ọma.

50 Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku;

Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere,

Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere, rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 19

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke;

Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi.

2 Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba,

Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma.

3 Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di;

Anughi olu-ha.

4 N’uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue,

Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.

O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.

5 Anyanwu ahu di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n’ulo-ndina-ya puta,

Obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike ib͕aso uzọ-ya.

6 Site n’otù nsọtu elu-igwe ka nputa-ya di,

Ib͕a-buruburu-ya diru kwa nsọtu-ya nile:

Ọ dighi kwa ihe ezonarioworo okpom-ọku-ya.

7 Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi:

Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe.

8 Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu:

Ihe Jehova nyere n’iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè.

9 Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:

Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n’otù.

10 Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha:

Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n’ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.

11 Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti:

N’idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.

12 Nmehie emehieworo n’amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha?

Guam n’onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.

13 B͕ochi kwa orù-Gi na nmehie-nganga;

Ekwela ka ha nāchim: mb͕e ahu ka m’gēzu okè,

Agāgukwam n’onye ikpe njehie riri nne nāmaghi.

14 Ka okwu nile nke ọnum na ntughari nke obim buru ihe nātọ utọ n’iru Gi,

Jehova, bú oké nkumem, na onye-nb͕aputam.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 20

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Jehova za gi n’ubọchi nkpà,

Aha Chineke nke Jekob me ka i nọ n’elu;

2 Si n’ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi,

Si kwa na Zaion kwagide gi;

3 Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma,

Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba;Selah

4 Ya nye gi dika obi-gi si acho,

Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.

5 Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi,

Ọ bu kwa n’aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu:

Jehova mezue aririọ-gi nile.

6 Ub͕u a ka m’maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu;

O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-Ya

Za ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.

7 Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya:

Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.

8 Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada:

Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.

9 Jehova, zọputa eze:

Ya za ayi n’ubọchi ayi kpọkuru Ya.