Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 141

Abù Ọma Devid.

1 Jehova, akpọkuwom I; biakutem ọsọsọ:

Ṅa nti olum, mb͕e m’kpọkuru Gi.

2 Ka edozie ekperem dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’iru Gi;

Ka nchili ọbu-akam buru onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.

3 Jehova, Do nche n’iru ọnum;

Chebe ọnu-uzọ eb͕ub͕ere-ọnum abua.

4 Ewezugala obim ime ihe ọjọ,

Iji nmebi-iwu nēme omume,

Mu na madu ndi nālu ajọ ihe:

Ekwe-kwa-la ka m’rie ihe ọ bula nihe-utọ n’ile ha.

5 Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere;

Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi;

Ekwela ka isim si, É-è:

N’ihi na m’nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile.

6 Atudawo ndi-ikpe-ha n’akuku nkume di elu;

Ha gānu kwa okwu-ọnum nile; n’ihi na ha di utọ.

7 Dika mb͕e madu nālu ọlu ubi we nēgwuwa ala,

Otú a ka esesaworo ọkpukpu-ayi n’ọnu ala-mọ.

8 N’ihi na ọ bu n’ebe I nọ, Jehova, Onye-nwe-ayi, ka anyam abua di:

Nime Gi ka m’b͕abàworo; ab͕apula nkpuru-obim dika miri.

9 Debem ka m’ghara idabà n’ib͕udu ha sirim,

Na n’ọnyà ndi nālu ajọ ihe.

10 Ka ndi nēmebi iwu dabà n’ub͕u nile nke aka ha n’otù n’otù,

Rue mb͕e mu onwem gāgabiga.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 142

Maschil Devid, mb͕e ọ nọ n’ọb͕a; ekpere.

1 Olum ka m’ji etiku Jehova;

Olum ka m’ji ariọ Jehova aririọ-amara.

2 Anamekwuwa okwu ntamum n’iru Ya;

Ahuhum ka m’nēgosi n’iru Ya.

3 Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm.

N’uzọ nke m’nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu.

4 Legide n’aka-nrim, hu kwa, n’ihi na ọ dighi onye m’nwere nke nāmatam:

Ebe-nb͕alaga alanariwom n’iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim.

5 Etikurum I, Jehova;

Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm,

Na òkèm n’ala ndi di ndu.

6 Ṅa nti n’iti-nkpum; n’ihi na enweghm ike ma-ọli:

Naputam n’aka ndi nēsob͕um; n’ihi na ha nwere ume karim.

7 Me ka nkpuru-obim si n’ebe emechibidoworo ya puta, ka m’we kele aha-Gi:

Mu ka ndi ezi omume gāb͕a buruburu;

N’ihi na I nēmesom nke-ọma.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 143

Abù Ọma Devid.

1 Jehova, nuru ekperem; ṅa nti n’aririọ-amaram nile:

N’ikwesi-ntukwasi-obi-Gi zam, na n’ezi omume-Gi.

2 Eji-kwa-la orù-Gi ba n’ikpé;

N’ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n’iru Gi.

3 N’ihi na onye-iro esob͕uwo nkpuru-obim;

Ọ zọpiawo ndum n’ala:

O mewom ka m’biri n’ebe di iche iche b͕ara ọchichri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

4 Mọm we ghara inwe ike nimem;

Ibobo nānwu obim nimem.

5 Echetawom ubọchi nile nke mb͕e ochie;

Atughariwom uche n’omume-Gi nile:

N’ọlu aka-Gi abua ka m’tughariworo obi.

6 Ab͕asawom akam abua n’ebe I nọ:

Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n’ebe I nọ.Selah

7 Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo:

Ezonarilam iru-Gi;

Ka m’we ghara iyi ndi nārida n’olùlù.

8 Mem ka m’nuru ebere-Gi n’ututu;

N’ihi na Gi ka m’tukwasiworo obi:

Mem ka m’mara uzọ nke m’gēje ije nime ya;

N’ihi na Gi ka m’buliworo nkpuru-obim nye.

9 Naputam n’aka ndi-irom, Jehova:

N’ebe I nọ ka m’kpuchiworo onwem.

10 Zím ime ihe di Gi utọ; n’ihi na Gi onwe-gi bu Chinekem:

Mọ-Gi di nma; durum n’ala di lari.

11 N’ihi aha-Gi, Jehova, me ka m’di ndu:

N’ezi omume-Gi me ka nkpuru-obim puta n’ahuhu.

12 Ọzọ, n’ebere-Gi kpochapu ndi-irom,

Me kwa ka ndi nile ndi nākpab͕u nkpuru-obim la n’iyì;

N’ihi na mu onwem bu orù-Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 144

Abù Ọma nke Devid.

1 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu,

Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù:

Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha:

2 Eberem, na ebem ewusiri ike,

Na ulo-elum, na onye m’nwere ime ka m’b͕apu;

Na ọtam, na onye m’b͕abàworo nime ya;

Onye nāzọda ndim n’okpurum.

3 Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya?

Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?

4 Madu yiri otù nku-ume

Ubọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.

5 Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida:

Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.

6 Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa;

B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha.

7 Si n’elu setipu aka-Gi;

Dọputam, naputakwam n’ọtutu miri,

N’aka ndi ala ọzọ;

8 Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,

Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

9 Chineke, abù ọhu ka m’gābùku Gi:

Une nke akwara iri ka m’gēji bùkue Gi abù ọma.

10 Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa:

Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n’ọnu mma-agha jọrọ njọ.

11 Dọputam, nāputakwam n’aka ndi ala ọzọ,

Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,

Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

12 Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n’ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata;

Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku;

13 Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche;

Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n’èzí nile ayi;

14 Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma;

Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di,

Ọ dighi kwa iti-nkpu di n’amá nile ayi;

15 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke di otú a:

Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke Jehova bu Chineke-ha.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 145

Abù Ọma otuto; nke Devid.

1 M’gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze;

M’gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

2 Kwa-ubọchi ka m’gāgọzi Gi;

M’gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

3 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku;

Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya.

4 Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ,

We gosi idi-ike-Gi nile.

5 N’ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi,

Na n’oké ọlu-Gi nile, ka m’gātughari uche.

6 Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa;

Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m’gākọ akukọ-ya.

7 Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa,

Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.

8 Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu;

Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n’ebere.

9 Jehova di nma n’ebe ihe nile ekère èkè di;

Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n’ọlu-Ya nile.

10 Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova;

Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi.

11 Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa,

Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya;

12 Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile,

Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.

13 Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi,

Ọchichi-Gi di kwa n’ọb͕ọ nile.

14 Jehova nākwagide ndi nile nāda ada,

O nēkuli kwa ndi nile nēruda n’ala.

15 Anya ihe nile nēle anya Gi;

Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

16 I nāsaghe aka-Gi,

I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.

17 Onye ezi omume ka Jehova bu n’uzọ-Ya nile,

Ọ di kwa ebere n’ọlu-Ya nile.

18 Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya,

Bú ndi nile nākpọku Ya n’ezi-okwu.

19 Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme;

Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha.

20 Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n’anya;

Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.

21 Otuto Jehova ka ọnum gēkwu;

Ka anu-aru nile gọzi kwa aha nsọ Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 146

1 Tonu Ja.

Nkpuru-obim, to Jehova.

2 M’gēto Jehova n’ogologo ndum nile:

M’gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m’nọ nādi ndu.

3 Unu atukwasila obi n’aru ndi amara aha-ha,

Ma-ọbu n’aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.

4 Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n’ala o si puta;

N’ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n’iyì.

5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka,

Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya:

6 Onye meworo elu-igwe na uwa,

Na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha;

Onye nēdebe ezi-okwu rue mb͕e ebighi-ebi:

7 Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n’ikpe;

Onye nēnye ndi agu nāgu nri:

Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ;

8 Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì;

Jehova nēkuli ndi nēruda n’ala;

Jehova n’ahu ndi ezi omume n’anya;

9 Jehova nēdebe ndi ala ọzọ;

Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ;

Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.

10 Jehova gābu eze rue mb͕e ebighi-ebi,

Chineke-gi, Zaion, gābu eze rue ọb͕ọ nile.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 147

1 Tonu Ja;

N’ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma;

N’ihi na ọ di utọ, otuto mara nma.

2 Jehova nēwuli Jerausalem elu;

Ndi adọtara n’agha nke Israel ka Ọ nāchikọta.

3 Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu,

Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.

4 Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando;

Ha nile ka Ọ nākpọ aha.

5 Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne;

Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu.

6 Jehova nēme ka ndi di ume-ala n’obi guzo ọtọ:

Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala.

7 Werenu ekele za Jehova,

Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:

8 Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe,

Onye nēdoziri ala miri-ozuzo,

Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.

9 Ọ nēnye anumanu nri-ya,

Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya.

10 Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ:

Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.

11 Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya,

Ndi nēchere ebere-Ya.

12 Gi Jerusalem, nāja Jehova;

To Chineke-gi, Zaion.

13 N’ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;

Ọ gọziwo umu-gi n’etiti gi.

14 Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;

Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.

15 Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n’uwa;

Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.

16 Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;

Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.

17 Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha:

Ònye gēguzo n’iru oyi-Ya?

18 Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha:

Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.

19 Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya,

Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.

20 O mesoghi mba ọ bula otú a:

Ma ikpé-Ya nile, ha amaghi ha.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 148

1 Tonu Ja.

Tonu Jehova site n’elu-igwe:

Tonu Ya n’ebe di elu.

2 Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile:

Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.

3 Tonu Ya, anyanwu na ọnwa:

Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.

4 Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe,

Na miri nke di n’elu elu-igwe.

5 Ka ha to aha Jehova:

N’ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.

6 O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi:

Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.

7 Tonu Jehova site n’uwa,

Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:

8 Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu:

Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:

9 Ugwu nile na ugwu ntà nile;

Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:

10 Anu-ọhia na anu-ulo nile;

Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:

11 Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche;

Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa:

12 Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ;

Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:

13 Ka ha too aha Jehova;

N’ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya:

Ebube-Ya di n’elu uwa na elu-igwe.

14 O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu,

Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto;

Bú umu Israel, ndi di nso Ya.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 149

1 Tonu Ja.

Bùkuenu Jehova abù ọhu,

Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya.

2 Ka Israel ṅuria n’Onye meworo ya:

Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n’Eze-ha.

3 Ka ha to aha-Ya n’ite-egwú:

Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.

4 N’ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ:

Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n’obi nma.

5 Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru:

Ka ha tie nkpu ọṅò n’elu ihe-ndina-ha.

6 Ka nbuli-elu Chineke di n’olu abu ha,

Ka mma-agha nke iru abua di kwa n’aka-ha;

7 Ibọ̀ ọ́bọ̀ n’aru mba nile,

Ibara ndi nile di iche iche nba;

8 Iji nkpọrọ ke ndi-eze-ha,

Na iji nkpọro-ukwu ígwè ke ndi-ha anāsọpuru;

9 Ime n’aru ha ikpé edere n’akwukwọ:

Ihe mara nma ka ọ bu nke ndi-ebere-Ya nile nwere.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 150

1 Tonu Ja.

Tonu Chineke n’ebe nsọ Ya:

Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya.

2 Tonu Ya n’ihi idi-ike-Ya nile:

Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di.

3 Werenu ọfufù opì-ike to Ya:

Chirinu une na ubọ-akwara to Ya.

4 Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya:

Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya:

5 Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya:

Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya.

6 Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja.

Tonu Ja.