Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 131

Abù Nrigo; nke Devid.

1 Jehova, nkpuru-obim adighi elu, anyam abua ebulighi kwa onwe-ha elu;

Ejegharighkwam n’ihe uku di iche iche,

Ma-ọbu n’oké ọlu di iche iche karirim.

2 N’ezie edoziwom nkpuru-obim me ka ọ dere du;

Dika nwata nke emere ka ọ rapu ara si di n’aru nne-ya,

Dika nwata nke emere ka ọ rapu ara, otú a ka nkpuru-obim di n’arum.

3 Israel, chere Jehova

Site n’ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 132

Abú Nrigo.

1 Jehova, chetara Devid

Nweda-n’ala-ya nile.

2 Otú ọ ṅuru Jehova iyi,

Kwe Dike nke Jekob nkwa:

3 N’ezie m’gaghi-abà n’ulo-ikwū nke ulom,

M’gaghi-arigo n’elu ihe-ndina nke utem;

4 M’gaghi-enye anyam abua ura,

M’gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura;

5 Rue mb͕e m’gāchọtara Jehova ọnọdu,

Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi.

6 Le, ayi nuru okwu bayere ya n’Efrata:

Ayi chọtara ya n’ọhia nke oké ọhia.

7 Ka ayi ba n’ebe-obibi-Ya nile;

Ka ayi kpọ isi ala n’ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di.

8 Bilie, Jehova, ba n’ebe-izu-ike-Gi;

Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.

9 Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe;

Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu.

10 N’ihi Devid, bú orù-Gi,

Atugharila iru onye-Gi etere manu.

11 Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu;

Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu:

Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M’gādọkwasi n’oche-eze i nwere.

12 Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndum

Na ihe-àmàm nke M’gēzí ha,

Umu-ha gānọkwasi kwa n’oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi.

13 N’ihi na Jehova arọputawo Zaion;

Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi.

14 Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi:

N’ebe a ka M’gēbi; n’ihi na achọsiwom ya ike.

15 Ihe-oriri-ya ka M’gāgọzi nke-uku:

Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M’gēji nri me ka afọ ju ha.

16 Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M’gēyikwasi nzọputa dika uwe:

Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike.

17 N’ebe ahu ka M’gēme ka mpi Devid nwere pue:

Edoworom onye nkem etere manu oriọna n’usoro.

18 Ndi-iro-ya ka M’gēyikwasi ihere dika uwe:

Ma n’isi-ya ka okpu-eze-ya gāb͕awa okoko.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 133

Abú Nrigo; nke Devid.

1 Le, ka o si di nma, ka o si di kwa utọ nke-uku,

Bú nbikọ nke umu-nne, ọbuná ibikọ n’otù!

2 Ọ di ka ezi manu ahu nke dikwasi n’isi,

Nke nērùda n’afu-ọnu,

Bú afu-ọnu Eron;

Nke nēruda n’ọnu uwe-nwuda-ya nile;

3 Dika igirigi Heamon,

Nke nādakwasi n’ugwu nile nke Zaion:

N’ihi na n’ebe ahu ka Jehova nyere ngọzi ahu iwu,

Bú ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 134

Abù Nrigo.

1 Le, gọzienu Jehova, unu ndi-orù nile nke Jehova,

Ndi nēguzo n’ulo Jehova n’abali nile.

2 Chilienu aka-unu elu n’idi-nsọ,

Gọzi kwa Jehova.

3 Ka Jehova si na Zaion gọzie gi,

Bú Onye keworo elu-igwe na uwa.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 135

1 Tonu Ja.

Tonu aha Jehova;

Tonu Ya, ndi-orù Jehova:

2 Ndi nēguzo n’ulo Jehova,

N’ogige nile nke ulo Chineke-ayi.

3 Tonu Ja; n’ihi na Jehova di nma:

Bùkuenu aha-Ya abù ọma; n’ihi na ọ di utọ.

4 N’ihi na Jekob ka Ja rọputaworo nye Onwe-ya,

Ọ rọputara Israel ka ọ buru ihe nke aka Ya.

5 N’ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku,

Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile.

6 Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo,

N’elu-igwe, na n’uwa, na n’oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile.

7 Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo;

O meworo miri-ozuzo àmùmà;

Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n’ulo-nkwakọba-Ya nile puta.

8 Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n’ala Ijipt,

Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo.

9 O zitere ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n’etiti gi, Ijipt,

N’aru Fero, na n’aru ndi-orù-ya nile.

10 Onye tib͕uru ọtutu mba,

B͕u kwa ndi-eze di ike;

11 Bú Saihon eze ndi-Amorait,

Na Og eze Beshan,

Na ala-eze nile nke Kenean:

12 Ọ we nye ala-ha ibu ihe-nketa,

Iburu Israel, bú ndi-Ya, ihe-nketa.

13 Jehova, aha-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi;

Jehova, ncheta-Gi nādiru ọb͕ọ nile.

14 N’ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe,

Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya.

15 Arusi nile nke mba nile bu ọla-ọcha na ọla-edo,

Ọlu aka madu.

16 Ha nwere ọnu ma ha adighi-ekwu okwu;

Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;

17 Ha nwere nti abua, ma ha adighi-aṅa nti;

Ọ dighi kwa iku-ume di n’ọnu-ha.

18 Ndi nēme ha gādi ka ha;

E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.

19 Ulo Israel, gọzienu Jehova:

Ulo Eron, gọzienu Jehova:

20 Ulo Livai, gọzienu Jehova:

Unu ndi nātu egwu Jehova, gọzienu Jehova.

21 Onye agọziri agọzi ha Jehova bu site na Zaion,

Onye bi na Jerusalem. Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 136

1 Kelenu Jehova; n’ihi na Ọ di nma:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2 Kelenu Chineke kachasi chi nile:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

3 Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4 Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

5 Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

6 Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n’elu miri:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

7 Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

8 Bú anyuanwu ichi n’ehihie:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

9 Na ọnwa na kpakpando ichi n’abali:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

10 Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

11 O we me ka Israel si n’etiti ha puta:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

12 Site n’aka di ike na n’ogwe-aka esetiri eseti:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

13 Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

14 O we me ka Israel gabiga n’etiti ya:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

15 Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n’Oké Osimiri Uhie:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

16 Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n’ọzara:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.

17 Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

18 O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

19 Bú Saihon eze ndi-Amorait:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

20 Na Og eze Beshan:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

21 O we nye ala-ha ibu ihe-nketa:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

22 Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

23 Onye chetara ayi n’ọnọdu-ayi di ala:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

24 O we naputa ayi n’aka ndi nākpab͕u ayi.

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

25 Ọ nēnye anu-aru nile nri:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

26 Kelenu Chineke nke elu-igwe:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 137

1 N’akuku osimiri nile nke Babilon,

N’ebe ahu ka ayi nọduru ala, e, ayi kwara ákwá,

Mb͕e ayi chetara Zaion.

2 N’osisi willow di n’etiti ya

Ka ayi nēkokwasi ubọ-akwara nile ayi.

3 N’ihi na n’ebe ahu ka ndi nādọta ayi n’agha riọro n’aka-ayi okwu abù,

Ndi lutara ihe-ayi n’agha riọ-kwa-ra ayi ka ayi ṅuria ọṅu, si,

Bùaranu ayi otù nime abù Zaion.

4 Àyi gēsi aṅa bù abù Jehova

N’ala nke onye ala ọzọ?

5 Ọ buru na echezọm i, Jerusalem,

Ka aka-nrim chezọ ǹkà-ya.

6 Ka irem rapara n’okpo-ọnum,

Ma ọ buru na adighm-echeta gi;

Ma ọ buru na adighm-eme ka Jerusalem di elu

N’elu isi ọṅùm.

7 Jehova, cheta ubọchi Jerusalem

Megide umu Edom;

Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ,

Rue ntọ-ala di nime ya.

8 Gi ada Babilon, nke bu onye anāpunara ihe;

Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gākwughachi gi

Nmeso-gi nke i mesoworo ayi.

9 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gāchiri umu-gi nāṅu ara tupia ha

Na nkume di elu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 138

Abù Ọma nke Devid.

1 M’gēji obim nile kele Gi:

N’iru chi nile ka m’agābùku Gi abù ọma.

2 M’gākpọ isi ala n’ebe ulo uku nsọ Gi di,

M’gēkele kwa aha-Gi n’ihi ebere-Gi na n’ihi ezi-okwu-Gi:

N’ihi na I mewo ka okwu-ọnu-Gi di uku n’elu aha-Gi nile.

3 N’ubọchi m’kpọkuru Gi ka I zaram,

I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem.

4 Eze nile nke uwa gēkeli Gi, Jehova,

N’ihi na ha anuwo okwu nile nke ọnu-Gi.

5 Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova;

N’ihi na ebube Jehova di uku.

6 N’ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n’obi ka Ọ nāhu anya:

Ma onye-npako, Ọ nēsite n’ebe di anya mara ya.

7 Ọ buru na ejeghariam n’etiti ahuhu,

I gēme ka m’di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom,

Aka-nri-Gi gāzọputakwam.

8 Jehova gēmezurum ihe nile:

Jehova, ebere-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi;

Arala aka n’ọlu nile nke aka-gi abua.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 139

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram.

2 Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm,

I nāghọta èchìchèm nile site n’ebe di anya.

3 Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka,

Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma.

4 N’ihi na ọ dighi okwu di n’irem,

Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.

5 N’azu na n’iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n’arum.

6 Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube;

Ọ dika elu, apughm iru ya.

7 Òle ebe m’gālanari Mọ-Gi?

Ma-ọbu òle ebe m’gēsi n’iru Gi b͕alaga?

8 Ọ buru na arigom n’elu-igwe, n’ebe ahu ka I nọ:

Ọ buru kwa na ab͕asam utem n’ala-mọ, le, I nọ n’ebe ahu.

9 Ọ buru na achirim nkù nke ututu,

Biri n’akuku dikarisiri anya nke oké osimiri,

10 Ọbuná n’ebe ahu ka aka-Gi gēdurum,

Aka-nri-gi gējidekwam.

11 M’we si, N’ezie, ọchichiri gēkpuchim;

Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.

12 Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi;

Ma abali nēnye ìhè dika ehihie:

Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n’anya-Gi

13 N’ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua:

I nākpam n’afọ nnem dika esi ákpa ákwà.

14 M’gēkele Gi; n’ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m’buru oké ọlu:

Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di;

Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.

15 Ọkpukpum ezopughi n’anya-Gi,

Mb͕e emerem na nzuzo,

Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n’ebe nile di ala nke uwa.

16 Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè,

Ọ bu kwa n’akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n’aru,

Nke akpuru kwa-ubọchi,

Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.

17 Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n’anyam, Chineke!

Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne!

18 Ọ buru na aguam ha ọnu, ha bara uba kari ájá:

Mb͕e m’tetaworo, mu na I nānọgide.

19 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I b͕ue onye nēmebi iwu, Chineke:

Ya mere, unu ndi-ọbara, sinu n’ebe m’nọ wezuga onwe-unu.

20 Ha bu ndi nēkwu okwu megide Gi nime nzube ọjọ,

Ndi ebuliworo nye ihe-efu ka ndi-iro-Gi bu.

21 Ọ̀ bughi ndi nākpọ Gi asì, jehova, ka m’nākpọ asì?

Ọ̀ bughi kwa ndi nēbili imegide Gi ka m’nāsọ oyi?

22 Ọ bu ikpọ-asì nke zuru okè ka m’ji kpọ ha asì:

Ndi-iro ka ha burum.

23 Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim:

Nānwam, we mara iche-uchem nile:

24 Hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-nb͕u di nimem,

Durukwam n’uzọ ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 140

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, dọputam n’aka madu ọjọ;

Chebem ka m’ghara ida n’aka nwoke nēme ihe-ike di iche iche:

2 Ndi chèworo ihe ọjọ di iche iche n’obi-ha;

Ubọchi nile ọ bula ka ha nēzukọ ibu agha di iche iche.

3 Ha amuwo ire-ha dika agwọ;

Edide aju-ala di n’okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha.Selah

4 Debem, Jehova, ka m’ghara ida n’aka onye nēmebi iwu;

Chebem, ka m’ghara ida n’aka nwoke nēme ihe-ike:

Bú ndi chèworo inuda nzọ-ukwum nile.

5 Ndi-npako ezobeworom ib͕udu, na udọ̀ di iche iche;

Ha ab͕asowo ub͕u n’akuku uzọ;

Ọnyà di iche iche ka ha siworom.Selah

6 Asirim Jehova, Chinekem ka I bu:

Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova.

7 Jehova, Onye-nwe-ayi, ike nke nzọputam,

I kpuchiwo isim n’ubọchi ihe-agha nile.

8 Jehova, enyela ihe onye nēmebi iwu nāchọsi ike;

Emela ka nzube ọjọ ya gara ya; ha nēbuli onwe-ha elu.Selah

9 Ma isi ndi nọm buruburu,

Ka nmeb͕u nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha kpuchie ha.

10 Ka ha me ka icheku-ọku me nkpatu imegide ha:

Ya me ka ha dabà n’ọku;

N’ob͕u-miri, ka ha we ghara ibili ọzọ.

11 Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n’uwa:

Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya.

12 Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n’ala,

Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.

13 N’ezie ndi ezi omume gēkele aha-Gi:

Ndi ziri ezi gēbi n’iru Gi.