Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 121

Abú Nrigo.

1 M’gēweli anyam abua le ugwu nile:

Òle ebe iye-akam gēsi bia?

2 Iye-akam nēsi n’aka Jehova bia,

Onye meworo elu-igwe na uwa.

3 Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n’ọnọdu-ya:

Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura.

4 Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura,

Bú Onye nēdebe Israel.

5 Jehova bu Onye nēdebe gi:

Jehova bu ǹdò-gi n’aka-nri-gi.

6 Anyanwu agaghi-etib͕u gi n’ehihie,

Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n’abali.

7 Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi;

Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi.

8 Jehova gēdebe ọpupu-gi na nbata-gi,

Site n’ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 122

Abú Nrigo; nke Devid.

1 Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim,

Ka ayi je n’ulo Jehova.

2 Ukwu-ayi eguzowo

N’ọnu-uzọ-ama-gi nile, Jerusalem;

3 Jerusalem, nke ewuworo

Dika obodo nke ejikọtara n’otù nke-ọma:

4 Ebe ebo nile rigoworo, bú ebo nile nke Ja,

Iburu Israel ihe-àmà,

Ikele aha Jehova.

5 N’ihi na n’ebe ahu ka edoworo oche-eze nile ikpe ikpe,

Bú oche-eze nile ulo Devid nwere.

6 Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem:

Ndi nāhu gi n’anya gānọ n’udo.

7 Ka udo di n’ékpè-gi nile,

Ka inọ-n’udo di kwa n’ulo-gi nile di elu.

8 N’ihi umu-nnem na ndi-eyìm,

Biko, ka m’kwue okwu, si, Ka udo di nime gi.

9 N’ihi ulo Jehova, bú Chineke-ayi,

M’gāchọrọ gi ọdi-nma.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 123

Abù Nrigo.

1 Gi ka m’gēweli anyam abua le,

Gi Onye nānọdu ala n’elu-igwe.

2 Le, dika anya ndi-orù si elekwasi aka ndi-nwe-ha,

Dika anya abua nke nwayi nēje ozi si elekwasi aka nwayi nwere ike n’aru ya;

Otú a ka anya-ayi nēlekwasi Jehova, bú Chineke-ayi,

Rue mb͕e Ọ gēmere ayi amara.

3 Mere ayi amara, Jehova, mere ayi amara:

N’ihi na nleda ejuwo ayi afọ ri nne.

4 Afọ ejuwo nkpuru-obi-ayi ri nne

N’ichì-ọchì nke ndi nọ jū,

Na nleda nke ndi-npako.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 124

Abú Nrigo; nke Devid.

1 Asi na ọ bughi Jehova Nke diri ayi,

Biko, ka Israel kwue otú a, si;

2 Asi na ọ bughi jehova Nke diri ayi,

Mb͕e madu biliri imegide ayi:

3 Mb͕e ahu ha gēlowori ayi na ndu,

Mb͕e iwe-ha di ọku n’aru ayi:

4 Mb͕e ahu miri gēruchapuwori ayi,

Miri-iyi gāgabigawori n’elu nkpuru-obi-ayi.

5 Mb͕e ahu miri di nganga gāgabigawori n’elu nkpuru-obi-ayi.

6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu,

Onye nēnyeghi ayi iburu ezé-ha anu-ndọb͕u.

7 Nkpuru-obi-ayi ewepugawo onwe-ya dika nnunu n’ib͕udu ndi-osi-ọnyà:

Ib͕udu ahu kpajiri akpaji, ayi onwe-ayi we wepuga onwe-ayi.

8 Iye-aka-ayi di n’aha Jehova,

Onye meworo elu-igwe na uwa.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 125

Abú Nrigo.

1 Ndi nātukwasi Jehova obi

Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.

2 Jerusalem, ugwu-ya nile di ya buruburu:

Otú a ka Jehova di ndi-Ya buruburu.

Site n’ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

3 N’ihi na nkpa-n’aka-eze nke nmebi-iwu agaghi-adigide n’elu ihe ruru ndi ezi omume n’ife-nzà;

Ka ndi ezi omume we ghara isetipu aka-ha tiye n’ajọ omume.

4 Jehova, me ndi di nma nma,

Me kwa ndi ziri ezi n’obi-ha nma.

5 Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n’uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ,

Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la.

Ka udo dikwasi Israel.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 126

Abú Nrigo.

1 Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata,

Ayi di ka ndi nārọ nrọ.

2 Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu,

Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire:

Mb͕e ahu ha nāsi n’etiti mba nile,

Jehova emeworo ndia ihe uku.

3 Jehova emeworo ayi ihe uku;

Ayi nāṅuri ọṅu.

4 Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n’agha lata,

Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb.

5 Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.

6 Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá;

Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 127

Abù Nrigo; nke Solomon.

1 Ọ buru na Jehova ewughi ulo,

N’efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n’ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya:

Ọ buru na Jehova echeghi obodo,

N’efu ka onye-nche muruworo anya.

2 Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n’isi-ututu, ndi nāla azu n’inọdu ala,

Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche:

Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n’anya ura.

3 Le, ihe-nketa nke nēsi n’aka Jehova bia ka umu bu:

Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.

4 Dika àkú n’aka dike,

Otú a ka umu amuru na mb͕e okorọbia di.

5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke chiriworo àkú ahu kpojue àkpà-àkú-ya:

Ihere agaghi-eme ha,

Mb͕e ha na ndi-iro-ha nēkwurita okwu n’ọnu-uzọ-ama.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 128

Abú Nrigo.

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ọ bula nke nātu egwu Jehova bu,

Nke nēje ije n’uzọ-Ya nile.

2 N’ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n’ọlu inwe ka i gēri:

Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma.

3 Nwunye-gi gādi ka osisi vine nāmi nkpuru n’ime-ime-ulo nke ulo-gi:

Umu-gi gādi ka ome osisi oluve buruburu table-gi.

4 Le, na otú a ka agāgọzi nwoke ahu

Nke nātu egwu Jehova.

5 Jehova gēsi na Zaion gọzie gi:

Gi lekwasi kwa ọdi-nma Jerusalem anya ubọchi nile nke ndu-gi,

6 Hu kwa umu nke umu-gi gāmu.

Ka udo dikwasi Israel.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 129

Abú Nrigo.

1 Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m’di na nwata,

Biko, ka Israel kwue otú a, si,

2 Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m’di na nwata:

Ma otú ọ di, ha apughi imegidem.

3 N’elu azum ka ndi-plough jiri plough gwu dika esi egwu ala-ubi;

Ha mere ka furrow nile ha di ogologo.

4 Jehova bu onye ezi omume:

O bipuwo udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu.

5 Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu,

Bú ndi nile nākpọ Zaion asì.

6 Ka ha di ka ahihia nēpú n’elu ulo,

Nke nākpọnwu mgbe o puputara:

7 Nke onye nēwe ihe-ubi nējighi kpojue ọbu-aka-ya,

Onye nēhie ùkwù-ọka nējighi kwa ya kpojue obi-ya.

8 Ọzọ, ndi nāgabiga asighi,

Ka ngọzi Jehova diri unu;

Ayi agọziwo unu n’aha Jehova.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 130

Abú Nrigo.

1 N’ob͕u-miri nile ka m’siworo kpọkue Gi, Jehova.

2 Onye-nwem, ge nti olum:

Ka nti-Gi nāṅa kwa nti

N’olu nke aririọ-amaram nile.

3 Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja,

Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo?

4 Ma n’aka-Gi ka nb͕aghara di,

Ka ewe tua egwu Gi.

5 Elewom anya Jehova, nkpuru-obim elewo anya,

Ọ bu kwa okwu-Ya ka m’chereworo.

6 Nkpuru-obim nēchere Jehova,

Karia ka ndi-nche si echere ututu;

E, karia ka ndi-nche si echere ututu.

7 Israel, chere Jehova:

N’ihi na n’aka Jehova ka ebere di,

Nb͕aputa riri nne di kwa n’aka-Ya.

8 Ya onwe-ya gāb͕aputa kwa Israel

N’ajọ omume-ya nile.