Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 91

1 Onye nēbi n’ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu,

Ọ bu n’okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

2 M’gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike;

I bu Chinekem, Onye m’nātukwasi obi.

3 N’ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n’ib͕udu nke osi-ọnyà,

Na n’aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n’iyì.

4 Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi,

Ọ bu kwa n’okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba:

Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.

5 I gaghi-atu egwu site n’oké egwu nke abali,

Ma-ọbu site n’àkú nke nēfeghari n’ehihie;

6 Ma-ọbu site n’ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n’ọchichiri,

Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n’etiti-ehihie.

7 Nnù madu abua na ọgu iri gāda n’akuku-gi;

Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n’aka-nri-gi;

Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.

8 Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide,

We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu.

9 N’ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm;

N’ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;

10 Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi,

Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.

11 N’ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi,

Idebe gi n’uzọ-gi nile.

12 N’elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi,

Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume.

13 Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu:

I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.

14 N’ihi na ọ huwom n’anya si-ike, M’gēme kwa ka ọ b͕aputa:

M’gēme ka ọ nọ n’ebe di elu, n’ihi na ọ mawo aham.

15 Ọ gākpọkum, M’gāza kwa ya;

Mu onwem gānọyere ya n’ahuhu:

M’gādọputa ya, sọpuru kwa ya.

16 Ubọchi ndu di ogologo ka M’gēji me ka afọ ju ya,

M’gēme kwa ka o lekwasi nzọputam anya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 92

Abù Ọma, bú Abù diri ubọchi-izu-ike.

1 Ọ bu ezi ihe ikele Jehova ekele,

Na ibùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu:

2 Igosi ebere-Gi n’ututu,

Igosi kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi kwa-abali,

3 Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une;

Nēji higgaion n’elu ubọ-akwara.

4 N’ihi na I mewo ka m’ṅuria site n’ọlu-Gi, Jehova:

Ọ bu n’ọlu nile nke aka-Gi ka m’gēti nkpu ọṅù.

5 Le ka ọlu-Gi nile si di uku, Jehova!

Èchìchè-Gi miri emi nke-uku.

6 Madu nke bu anu-ọhia adighi-ama ama;

Onye-nzuzu adighi-aghọta kwa nka:

7 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú,

Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi;

Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi:

8 Ma Gi onwe-gi nọ n’ebe di elu rue mb͕e ebighi-ebi, Jehova.

9 N’ihi na, le, ndi-iro-Gi, Jehova,

N’ihi na, le, ndi-iro-Gi gāla n’iyì;

Ndi nile nke nālu ajọ ihe gēkesa onwe-ha.

10 Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu:

Ejiwo manu ọhu wusam.

11 Anyam elekwasiwo kwa ndi nēchem anwu,

Ihe bayere ndi nēbili imegidem, bú ndi nēme ihe ọjọ, ka ntim abua nānu.

12 Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu:

Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.

13 Ndi akuworo n’ulo Jehova dika osisi

Gāma akwukwọ n’ogige nile nke Chineke-ayi.

14 Ha gānọ nāmi nkpuru n’isi-awọ;

Osisi nke miri di ha n’aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu.

15 Igosi na Jehova zirí ezi;

Ọ bu oké nkumem, ọ dighi kwa ajọ omume di nime Ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 93

1 Jehova bu eze; idi-elu ka O yiriworo dika uwe;

Jehova eyiriwo uwe, O werewo ike ke Onwe-ya n’úkwù:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya.

2 Oche-eze-Gi eguzosiwo ike site na mb͕e ochie:

Site na mb͕e ebighi-ebi ka I nọ.

3 Osimiri eweliwo olu-ha, Jehova,

Osimiri eweliwo olu-ha;

Osimiri nēweli ebili-miri nile ha elu.

4 Kari olu nile nke ọtutu miri,

Kari ebili-miri nile di ebube nke oké osimiri,

Jehova Nke nọ n’ebe di elu di ebube.

5 Ihe-àmà-Gi nile kwesiri ntukwasi-obi nke-uku:

N’ebe ulo-Gi di idi-nsọ mara nma,

Jehova, rue ubọchi nile nke ndu di ogologo.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 94

1 Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova,

Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.

2 Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa:

Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha.

3 Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu,

Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha?

4 Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu:

Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.

5 Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova,

Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n’ala.

6 Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa,

Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n’ọchu.

7 Ha we si, Ja agaghi-ahu,

Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.

8 Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n’etiti ndi Israel:

Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?

9 Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe?

Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?

10 Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba,

Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?

11 Jehova mara èchìchè madu,

Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.

12 Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja,

Onye I nēsi kwa n’iwu-Gi zí ihe;

13 Ime ka ọ nọ jū pua n’ubọchi nile nke ihe ọjọ,

Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.

14 N’ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka,

Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.

15 N’ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume:

Ndi nile ndi ziri ezi n’obi gēso kwa ya.

16 Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ?

Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe?

17 Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka,

Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n’ebe inọ-dū.

18 Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n’ọnọdu-ya;

Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.

19 Mb͕e ncheb͕um nāba uba n’imem,

Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.

20 Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n’iyì nile,

Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u?

21 Ha nēdo onwe-ha n’usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume,

Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.

22 Ma Jehova aburuworom ulo-elu;

Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm.

23 O mewo kwa ka ajọ ihe-ha laghachikute ha,

Ọ bu kwa ihe ọjọ ha ka Ọ gēji kpochapu ha;

Jehova, bú Chineke-ayi, gēkpochapu ha.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 95

1 Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù:

Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike.

2 Ka ayi were ekele bia n’iru Ya,

Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike.

3 N’ihi na Chineke uku ka Jehova bu,

Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.

4 Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n’aka-Ya:

Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya.

5 Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya;

Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.

6 Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala;

Ka ayi b͕ue ikperè n’ala n’iru Jehova Onye meworo ayi:

7 N’ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi:

Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya.

Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya,

8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba,

Dika n’ubọchi Masa n’ọzara:

9 Mb͕e nna-unu-hà nwaram,

Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum.

10 Ọgu arọ abua ka M’nāsọ ọb͕ọ ahu oyi,

M’we si, Ndi nke nākpafu n’obi-ha ka ha bu,

Ha onwe-ha amaghi kwa uzọm nile:

11 N’ihi ya aṅurum iyi n’iwem, si,

Ha agaghi-abà n’izu-ikem ma-ọli

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 96

1 Bùkuenu Jehova abù ọhu:

Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile.

2 Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya;

Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n’otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

3 Kọsanu akukọ ebube-Ya n’etiti mba nile,

Akukọ oké ọlu-Ya nile n’etiti ndi nile di iche iche.

4 N’ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:

Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n’elu chi nile.

5 N’ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:

Ma Jehova mere elu-igwe.

6 Ebube na ima-nma di n’iru Ya:

Ike na nma di n’ebe nsọ Ya.

7 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,

Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

8 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:

Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n’ogige-Ya nile.

9 Kpọnu isi ala nye Jehova n’ima-nma nke idi-nsọ:

Ka o nēb͕u unu nb͕u site n’iru Ya, unu elu-uwa nile.

10 Sinu n’etiti mba nile, Jehova bu eze:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya:

Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n’izi-ezi.

11 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;

Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya;

12 Ka ọhia ṅuria ọṅu-agha, ya na ihe nile nke di nime ya;

Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù;

13 N’iru Jehova, n’ihi na Ọ biawo;

N’ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe:

Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe,

Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 97

1 Jehova bu eze; ka uwa tegharia egwu ọṅù;

Ka ala bara uba nke di oké osimiri buruburu ṅuria.

2 Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu:

Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya.

3 Ọku nāga n’iru Ya,

Nēsure kwa ndi-nkpab͕u-Ya buruburu.

4 Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:

Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u.

5 Ugwu nile b͕azepuru dika wax n’iru Jehova,

N’iru Onye-nwe uwa nile.

6 Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya,

Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya.

7 Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè,

Ndi nānya isi n’ihe-efu di iche iche:

Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.

8 Zaion nuru, we ṅuria,

Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù;

N’ihi ikpé-Gi nile, Jehova.

9 N’ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n’elu uwa nile:

Emewo ka I di elu nke-uku n’elu chi nile.

10 Unu ndi nāhu Jehova n’anya, kpọnu ihe ọjọ asì:

Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya;

Ọ nānaputa ha n’aka ndi nēmebi iwu.

11 Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru,

Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n’obi ọṅù.

12 Ṅurianu na Jehova, unu ndi ezi omume;

Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 98

Abù Ọma.

1 Bùkuenu Jehova abù ọhu;

N’ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche;

Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.

2 Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya:

N’anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya.

3 O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n’ebe ulo Israel di:

Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.

4 Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile:

Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.

5 Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma;

Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.

6 Chirinu opì na olu opì-ike

Tisie nkpu ọṅù ike n’iru Eze, bù Jehova.

7 Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya;

Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya;

8 Ka osimiri nile kua aka-ha;

Ka ugwu tie nkpu ọṅù n’otù;

9 N’iru Jehova, n’ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe:

Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe,

Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 99

1 Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji:

Ọ nēbi n’etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.

2 Jehova di uku nime Zaion;

Onye di elu ka Ọ bu kwa n’elu ndi nile di iche iche.

3 Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya:

Onye nsọ ka Ọ bu.

4 Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n’anya;

Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike,

Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.

5 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu,

Kpọ-kwa-nu isi ala n’ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di:

Onye nsọ ka Ọ bu.

6 Moses na Eron n’etiti ndi-nchu-àjà-Ya,

Samuel kwa n’etiti ndi nākpọku aha-Ya;

Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.

7 N’ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu:

Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.

8 Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha:

Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha,

Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha,

9 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi,

Kpọ-kwa-nu isi ala n’ebe ugwu nsọ Ya di;

N’ihi na onye nsọ ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 100

Abù Ọma ikele ekele.

1 Tikusienu Johova nkpu ọṅù ike, uwa nile.

2 Werenu ọṅù fè Jehova òfùfè:

Werenu iti-nkpu ọṅù bia n’iru Ya.

3 Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke:

Ya onwe-ya emewo ayi, ọ bu kwa Ya nwe ayi;

Ayi bu ndi-Ya, na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Ya.

4 Werenu ekele ba n’ọnu-uzọ-ama-Ya nile,

Werenu otuto ba n’ogige-Ya nile:

Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya.

5 N’ihi na Jehova di nma; rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;

Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Ya di kwa.