Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 1

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu,

Nke nēguzoghi kwa n’uzọ ndi nmehie,

Nke nānọghi kwa n’ọnọdu ndi nākwa emò.

2 Kama n’iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di;

Ọ bu kwa n’iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali.

3 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n’akuku iyi juputara na miri,

Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya,

Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu;

Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.

4 Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di;

Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.

5 N’ihi nka ndi nēmebi iwu agaghi-eguzosi ike n’ikpé,

Ndi-nmehie agaghi-eguzosi kwa ike na nzukọ ndi ezi omume.

6 N’ihi na Jehova mara uzọ ndi ezi omume:

Ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n’iyì.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 2

1 N’ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu?

N’ìhi gini ka ndi nile di n’uwa nātughari ihe-efu n’uche?

2 Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha,

Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù,

Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,

3 Ka ayi tijie ab͕u nile ha,

Tufue udọ̀ nile ha n’aru ayi.

4 Onye nānọdu n’elu-igwe nāchi ọchì:

Onye-nwe-ayi nākwa ha emò.

5 Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n’iwe-Ya,

Ọ bu kwa n’iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji:

6 Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike

N’elu Zaion, bú ugwu nsọm.

7 M’gākọ akukọ bayere ukpuru:

Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu;

Mu onwem amuwo gi ta.

8 Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi,

Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi.

9 I gēji nkpa-n’aka ígwè tijisi ha;

Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.

10 Ma ub͕u a, ndi-eze, nwenu uche:

Ka adọ unu aka na nti, ndi-ikpe nke uwa.

11 Werenu egwu fè Jehova òfùfè,

Were-kwa-nu ọma-jijiji tegharia egwú ọṅù.

12 Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n’iyì n’uzo,

N’ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà.

Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 3

Abù Ọma Devid, mb͕e o siri n’iru Absalom nwa-ya b͕alaga.

1 Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba!

Ọtutu madu nēbili imegidem.

2 Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si,

Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke.

3 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum,

Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu.

4 Ejim olum kpọkue Jehova,

O we zam site n’ugwu nsọ Ya.

5 Mu onwem dinara ala, raru ura;

Etetaram; n’ihi na Jehova nākwagidem.

6 M’gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta,

Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu.

7 Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem:

N’ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì;

I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.

8 Jehova nwe nzọputa:

Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi.Selah

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 4

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’ubọ-akwara. Abù Ọma Devid.

1 Mb͕e m’kpọrọ, Gi zam, Chineke nke ezi omumem;

I nyewom ebe sara mbara mb͕e m’nọ na nkpà:

Merem amara, nuru ekperem.

2 Umu madu, rùe ole mb͕e ka nsọpurum gāghọ itiye n’ọnọdu-ihere?

Unu nāhu ihe-efu n’anya, nāchọ okwu-ugha.

3 Ma maranu na Jehova ekewaputaworo Onwe-ya onye-ebere:

Jehova nānu mb͕e m’kpọkuru Ya.

4 Manu jijiji, emehie-kwa-la:

Sinu otú a n’obi-unu n’elu ihe-ndina-unu, we dere du.Selah

5 Chuanu àjà ezi omume,

Tukwasi-kwa-nu obi na Jehova.

6 Ọtutu madu nāsi, Ònye gēme ka ayi hu ọdi-nma?

Jehova, bulie ìhè iru-Gi ka ọ mukwasi ayi.

7 I tiyewo ọṅù n’obim,

Kari nke ha nwere na mb͕e ọka-ha na manya-vine ọhu ha ji aba uba.

8 N’udo ka m’gēji otù mb͕e ahu dina ala, raru ura:

N’ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi, nēme ka m’biri na ntukwasi-obi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 5

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; nke agābù n’ib͕u Ọjà. Abù Ọma Devid.

1 Ge nti n’okwu-ọnum, Jehova,

Ghọta ntughari-uchem.

2 Ṅa nti n’olu ntiku m’nētiku Gi, Ezem, na Chinekem:

N’ihi na ọ bu Gi ka m’nēkpere.

3 Jehova, n’ututu ka I gānu olum;

N’ututu ka m’gēdoro Gi ekperem n’usoro, che kwa nche.

4 N’ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu:

Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n’ebe I nọ.

5 Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n’anya-Gi:

I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì.

6 I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n’iyì:

Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú.

7 Ma mu onwem, n’uba nke ebere-Gi ka m’gābà n’ulo-Gi:

M’gākpọ isi ala n’ebe ulo uku nsọ Gi di n’egwu-Gi.

8 Jehova, dubem n’ezi omume-Gi n’ihi ndi nēchem anwu;

Me ka uzọ-Gi zie ezi n’irum.

9 N’ihi na ọ dighi ihe nke nēguzosi ike di n’ọnu-ya;

Ime-ha bu ila-n’iyì nile:

Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;

Ha nēkwu okwu ire-utọ.

10 Ma ha ikpe, Chineke;

Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha:

N’uba nke njehie nile ha nupu ha;

N’ihi na ha anupuwo isi imegide Gi.

11 Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria,

Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n’ihi na I nēkpuchi ha ǹdò:

Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n’anya tọ ha utọ nime Gi.

12 N’ihi na Gi onwe-gi nāgọzi onye ezi omume;

Jehova, I ji otú ihe-ya si atọ Gi utọ b͕a ya buruburu dika ọta uku.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 6

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’ubọ-akwara, n’elu Octave. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, Abalaram nba n’iwe-Gi,

Adọ-kwa-lam aka na nti n’ọnuma-Gi.

2 Merem amara, Jehova; n’ihi na onye taworo aru ka m’bu:

Mem ka m’diri ndu, Jehova; n’ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji.

3 Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku:

Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e?

4 Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim:

Zọputam n’ihi ebere-Gi.

5 N’ihi na ọ dighi ncheta-Gi di n’ọnwu:

Nime ala-mọ ònye gēkele Gi?

6 Adọb͕uwom onwem n’ọlu n’ize-umem;

Kwa-abali ka m’nēme ka ihe-ndinam se n’elu anya-mirim;

Ejim anya-mirim de ihe m’ji edina.

7 Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri;

Ọ kawo nká n’hi ndi-nkpab͕um nile.

8 Si n’ebe m’nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe;

N’ihi na Jehova anuwo olu ákwám.

9 Jehova anuwo arirọ-amaram;

Jehova gānara ekperem.

10 Ihere gēme ndi-irom nile, ha gāma kwa jijiji nke-uku:

Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha na mberede.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 7

Shiggaion nke Devid, nke ọ bùkuru Hehova, bayere okwu Kush, bú onye Benjamin.

1 Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m’b͕abàworo:

Zọputam n’aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n’aka-ha:

2 Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum,

Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.

3 Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka;

Ọ buru na ajọ omume di n’ọbu-akam abua;

4 Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n’udo ihe ọjọ;

(Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n’efu:)

5 Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru;

Ka ọ zọda kwa ndum n’ala,

Me ka nsọpurum biri n’ájá.Selah

6 Bilie, Jehova, n’iwe-Gi,

Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um:

Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.

7 Ka nzukọ nke ndi nile di n’uwa di kwa Gi buruburu:

Gi laghachi kwa n’ebe di elu n’elu ya.

8 Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe:

Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.

9 Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike:

N’ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.

10 Ọtam dikwasi na Chineke,

Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.

11 Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume,

Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.

12 Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ;

Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.

13 Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu;

Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.

14 Le, ime ajọ ihe nēme ya;

Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha.

15 Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya,

O we da n’ebe-nbibi nke ọ nēme.

16 Nmeb͕u-ya gābiaghachi n’isi-ya,

Ọ bu kwa n’opu-n’isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.

17 M’gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di:

M’gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 8

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Gittith. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, Onye-nwe-ayi,

Le otú aha-Gi di ebube n’uwa nile!

Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n’elu ígwé.

2 I siwo n’ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike,

N’ihi ndi-nkpab͕u-Gi,

Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.

3 Mb͕e m’huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi,

Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;

4 Gini ka madu bu, na I nēcheta ya;

Na nwa nke madu, na I nēleta ya?

5 I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke,

I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n’isi dika okpu-eze.

6 I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua;

Ihe nile ka I doro n’okpuru ukwu-ya abua:

7 Ewu na aturu na ehi, ha nile,

Ha na anu ọhia;

8 Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri,

Bú ihe nke nāgabiga n’uzọ nile nke oké osimiri nile.

9 Jehova, Onye-nwe-ayi,

Le otú aha-Gi di ebube n’uwa nile!

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 9

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Muth-labben. Abù Ọma Devid.

1 M’gēji obim nile kele Jehova;

M’gākọ kwa akukọ oké ọlu-Gi nile.

2 M’gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi:

M’gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu;

3 Mb͕e ndi-irom laghachiri azu,

Su ngọngọ, si kwa n’iru Gi la n’iyì.

4 N’ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem;

I nọduru n’oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume.

5 I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n’iyì,

I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6 Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi;

Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo,

Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n’yì.

7 Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi:

O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe.

8 Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n’ezi omume,

Ọ gēkpe ndi nile di n’uwa ikpe n’izi-ezi.

9 Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu,

Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;

10 Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi;

N’ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.

11 Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion:

Gosinu omume-Ya nile n’etiti ndi nile di iche iche.

12 N’ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha:

O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n’ala.

13 Merem amara, Jehova;

Hu nweda-n’alam nke sitere n’aka ndi nākpọm asì,

Gi Onye nēbulim elu site n’ọnu-uzọ-ama ọnwu;

14 Ka m’we kọ akukọ otuto-Gi nile:

N’ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion,

Ka m’ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.

15 Mba nile ọzọ emikpuwo n’olùlù ha mere:

N’ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.

16 Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo:

N’ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n’ọnyà.Higgaion. Selah

17 Ndi nēmebi iwu gālaghachi n’ala mọ,

Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.

18 N’ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye,

Olile-anya nke ndi di ume-ala n’obi agaghi-ala n’iyì rue mb͕e ebighi-ebi.

19 Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike:

Ka ekpe mba nile ikpe n’iru Gi.

20 Jehova, doro ha ihe-egwu:

Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu.Selah

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 10

1 Jehova, n’ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya?

N’ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà?

2 Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n’ala ọku ọku;

Anējide ha na nzube nile nke ha chère.

3 N’ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n’ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike,

Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova.

4 Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju.

Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.

5 Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile;

Ikpé-Gi nile di n’ebe di elu kari èbe anya-ya gēru:

Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.

6 o siwo n’obi-ya, Agaghi-ewezugam n’ọnọdum:

Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m’gānọ n’ọdi-njọ.

7 Ọnu-ya juputara n’ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu:

N’okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.

8 Ọ nānọdu n’ebe iche-anwu nke obodo ntà nile:

N’ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ:

Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.

9 Ọ neche anwu n’ebe-nzuzo dika ọdum n’okwu-ọhia-ya:

Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n’ala:

Ọ na-anwude onye ewedara n’ala, mb͕e ọ dọbatara ya n’ub͕u-ya.

10 Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu,

Ndi nāhuju anya adawo kwa n’ala site n’aka ndi-ya nwere ume.

11 Ọ siwo n’obi-ya, Chineke echezọwo:

O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.

12 Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu:

Echezọla ndi ewedara n’ala.

13 N’ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke?

Ọ siwo n’obi-ya, I gaghi-aju ajuju.

14 I huwo ya; n’ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n’aka-Gi:

N’aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya;

Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.

15 Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu;

Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.

16 Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi:

Mba nile ọzọ esiwo n’ala-Ya lapu n’iyì.

17 I nuwo ihe ndi di ume-ala n’obi nāchọsi ike, Jehova:

I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge:

18 Ikpe nwa-nb͕ei na onye anāzọpia azọpia ikpe,

Ka madu nke sitere n’uwa we ghara ime ka madu ma kwa jijiji ọzọ.