Categories
ABÙ NKE ABÙ

ABÙ NKE ABÙ 1

1 Abù nke abù, nke diri Solomon.

2 Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum:

N’ihi na ihu-n’anya-gi nile di nma kari manya-vine.

3 Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma;

Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu;

N’ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n’anya.

4 Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso:

Eze emewo ka m’ba n’ime-ulo-ya:

Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi,

Ayi gēhota ihu-n’anya-gi nile kari manya-vine:

N’izi-ezi nile ka ha huworo gi n’anya.

5 Onye oji ka m’bu, ma amaram nma,

Unu umu-ndinyom Jerusalem,

Dika ulo-ikwū nile nke Kida,

Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.

6 Elelam anya, n’ihi na mu onwem nēji nji,

N’ihi na anyanwu achawom.

Umu nke nnem wesaram iwe di ọku,

Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile;

Ma ubi-vine nkem, nke m’nwere, ka m’nēcheghi.

7 Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n’anya,

Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n’etiti-ehihie:

N’ihi na ọ̀ bu n’ihi gini ka m’gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi,

N’akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?

8 Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n’etiti ndinyom,

Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu,

Zù kwa umu-ewu-gi n’akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu.

9 Inyinyam nke di n’ub͕ọ-ala Fero

Ka m’wereworo gi tuara, gi eyìm.

10 Ntì-gi abua mara nma n’agiri-isi akpara akpa,

Olu-gi mara nma n’ihe di oké ọnu-ahia agara aga.

11 Ihe-ọkpukpa di iche iche nke ọla-edo ka ayi gēmere gi,

Ya na nkpọchi ọla-ọcha.

12 Mb͕e eze nọ n’oche-ya di buruburu,

Manu nard nkem sìpuru ísì utọ ya.

13 Ùkwù myrrh ka onye ihe-ya nātọm utọ burum,

N’etiti aram abua ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

14 Uyọkọ nke okoko henna ka onye ihe-ya nātọm utọ burum

N’ubi-vine nke En-gedi.

15 Le, i mara nma, eyìm; le, i mara nma;

Anya-gi abua di ka nduru.

16 Le, i mara nma, gi onye ihe-gi nātọm utọ, e, i di utọ:

Ọzọ, ebe ayi nēdina nācha akwukwọ ndu.

17 Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar,

Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.

Categories
ABÙ NKE ABÙ

ABÙ NKE ABÙ 2

1 Mu onwem bu rose nke Sheron,

Abum urodi nke ndagwurugwu.

2 Dika urodi n’etiti ogwu,

Otú a ka eyìm di n’etiti umu-ndinyom.

3 Dika osisi apple n’etiti osisi oké ọhia,

Otú a ka onye ihe-ya nātọm utọ di n’etiti umu-ndikom.

Ǹdò-ya ka m’chọsiworo ike, m’we nọdu ala,

Nkpuru-ya tọ-kwa-ra okpo-ọnum utọ.

4 O mere ka m’bata n’ulo manya-vine,

Ọkọlọtọ-ya n’elum bu kwa ihu-n’anya.

5 Werenu mbadamba nkpuru-vine amiri ami b͕am ume, werenu nkpuru-osisi apple me ka arum di ike:

N’ihi na onye nāria ọria ihu-n’anya ka m’bu.

6 Aka-ekpe-ya di n’okpuru isim,

Aka-nri-ya nāb͕akum.

7 Unu umu-ndinyom Jerusalem,

Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi,

Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n’anya teta, ma ọli,

Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

8 Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia,

Nāmali elu n’elu ugwu nile, nāwuli elu n’elu ugwu ntà nile.

9 Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele:

Le kwa, ọ nēguzo n’azu mb͕idi-ayi,

Ọ nēsi na window nile lebata anya,

Anya-ya nēsi n’oghere-inara-ifufe nwubata.

10 Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim,

Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

11 N’ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo,

Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;

12 Ahuwo okoko-ọhia anya n’ala;

Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo,

Anuwo kwa olu nduru n’ala-ayi;

13 Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha,

Osisi vine nile nāb͕awa okoko,

Ha esìpuwo ísì utọ ha.

Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

14 Gi ndurum, nke di na nb͕awa nkume di elu, n’ebe-nzuzo nke ebe di nkputankpu,

Me ka m’hu iru-gi, me ka m’nu olu-gi;

N’ihi na olu-gi nātọ utọ, iru-gi ma-kwa-ra nma.

15 Nwuderenu ayi nkita-ọhia nile, bú nkita-ọhia di ntà, ndi nēmebi ubi-vine nile;

N’ihi na ubi-vine-ayi nāb͕awa okoko.

16 Onye ihe-ya nātọm utọ bu nkem, mu onwem bu kwa nke ya:

Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n’etiti urodi.

17 Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n’ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa,

Chigharia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, me onwe-gi ka i yie mb͕ada ma-ọbu nwa-ele

N’elu ugwu nile nke Beta.

Categories
ABÙ NKE ABÙ

ABÙ NKE ABÙ 3

1 N’elu ihe-ndinam n’abali ka m’chọrọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n’anya:

Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.

2 M’siri, Biko, ka m’bilie, jegharia n’obodo buruburu,

N’amá nile na n’ebe nile sara mbara,

Ka m’chọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n’anya:

Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.

3 Ndi-nche ndi nējeghari n’obodo buruburu hurum:

M’we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n’anya?

4 Ọ bu nání nwantī ka m’siri n’ebe ha nọ gabiga,

Mb͕e m’chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n’anya:

Ejiderem ya, arakwaghm ya aka,

Rue mb͕e m’mere ka ọ ba n’ulo nnem,

Na n’ime-ulo nke nwayi turu imem.

5 Unu umu-ndinyom Jerusalem,

Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi,

Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n’anya teta, ma-ọli,

Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

6 Ọnye bu nka nke nēsi n’ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku,

Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense,

Site n’ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?

7 Le, ọ bu ihe-ndina-ya, bú nke Solomon nwere;

Ọgu ndi-dike atọ di ya buruburu,

Site na ndi-dike nke Israel.

8 Ha nile ji mma-agha, ha bu ndi emeworo ka ha muta ibu agha:

Onye ọ bula, mma-agha-ya di n’úkwù-ya,

N’ihi egwu n’abali.

9 Eze, bú Solomon, emeworo onwe-ya otù palanquin

Site n’osisi Lebanon.

10 Ogidi-ya nile ka o jiri ọla-ọcha me,

Ala-ya ka o jiri ọla-edo me, ebe-ọnọdu-ya ka o jiri ogho ododo me,

Etiti-ya, eji ihu-n’anya me ka ọ buru pavement ọma,

Site n’aka umu-ndinyom Jerusalem.

11 Puanu, umu-ndinyom Zaion, lekwasi Solomon, bú eze, anya,

Ka o kpuru okpu-eze nke nne-ya kpubeworo ya n’ubọchi ọlulu-nwunye-ya,

Na n’ubọchi ọṅù nke obi-ya.

Categories
ABÙ NKE ABÙ

ABÙ NKE ABÙ 4

1 Le, i mara nma, eyìm, le, i mara nma;

Anya-gi abua di ka nduru n’azu ákwà-nkpuchi-gi:

Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,

Nke nēdina ala n’akuku ugwu Gilead.

2 Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu nke akpachaworo aji-ha ọhu,

Nke siworo n’isa-aru rigota;

Nke ha nile chi umu abua umu abua,

Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n’etiti ha.

3 Dika ogho uhie ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua bu,

Okwu-ọnu-gi ma-kwa-ra nma:

Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi bu

N’azu ákwà-nkpuchi-gi.

4 Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di,

Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri,

Bú ọta ntà nile nke ndi-dike.

5 Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru,

Nke nāta nri n’etiti urodi.

6 Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n’ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa,

Mu onwem gēje n’ugwu myrrh,

Na n’ugwu ntà frankincense.

7 I mazuru nma, eyìm;

Ọ dighi kwa ntupọ di n’aru-gi.

8 Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem,

Si na Lebanon som:

Site n’elu Amana le anya,

Site n’elu Senia na Heamon,

Site n’ebe-obibi nile nke ọdum.

Site n’ugwu nile nke agu.

9 I riwo obim, nwa-nnem nwayi;

I werewo otù nime anya-gi abua,

I werewo kwa otù ihe-inya-n’olu site n’olu-gi, rie obim.

10 Le ka ihu-n’anya-gi nile si ma nma nke-uku, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem!

Le ka ihu-n’anya-gi nile si di nma nke-uku kari manya-vine!

Le kwa ka ísì utọ nke manu-gi nile di nma nke-uku kari uda nile!

11 Manu-aṅu nke si n’ub͕ub͕ọ-manu-aṅu abusi ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nābusi, nwunye ọhu nkem:

Manu-aṅu na miri-ara-ehi di n’okpuru ire-gi;

Ísì utọ nke uwe-gi nile di kwa ka ísì utọ Lebanon.

12 Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu;

Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi.

13 Ome-gi nile bu ogige ọma nke pome-granate, nwere nkpuru di iche iche di oké ọnu-ahia;

Henna, ya na osisi manu nard nile,

14 Manu nard na saffron,

Calamus na cinnamon, ha na osisi nile nke frankincense;

Myrrh na aloes, ha na isi uda nile.

15 Isi-iyi nke ubi nile ab͕ara ogige ka i bu,

Olùlù-miri nke juputara na miri di ndu,

Na miri-iyi di iche iche nke nērù erù site na Lebanon.

16 Teta, gi ifufe Ugwu; bia kwa, gi ifufe Ndida;

Fekwasi ubim ab͕ara ogige, ka uda-ya di iche iche we rùpu.

Ka onye ihe-ya nātọm utọ bata n’ubi-ya ab͕ara ogige,

We rie nkpuru-ya di iche iche nke di oké ọnu-ahia.

Categories
ABÙ NKE ABÙ

ABÙ NKE ABÙ 5

1 Abatawom n’ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem:

Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam;

Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum;

Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim.

Rienu ihe, ndi-eyim;

Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.

2 Mu onwem nāraru ura, ma obim nēteta:

Ọ bu olu nke onye ihe-ya nātọm utọ nāku aka n’uzọ, si,

Megherem uzọ, nwa-nnem nwayi, eyìm, ndurum, onye nkem nke zuru okè:

N’ihi na isim juputara n’igirigi,

Agiri-isim juputara n’ọbubu-miri nke abali.

3 Eyipuwom uwem; #m’gēsi aṅa yiri ya?

Asawom ukwum abua; #m’gēsi aṅa me ka ha rue inyi?

4 Onye ihe-ya nātọm utọ setipuru aka-ya tiye n’oghere uzọ,

Afọm we me nkpatu n’ihi ya.

5 Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;

Akam abua nābusi kwa na myrrh,

Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù,

N’elu nkpisi nile nke ugodi.

6 Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;

Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga.

Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu:

Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya;

Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm.

7 Ndi-nche ndi nējeghari n’obodo buruburu hurum,

Ha tirim ihe, b͕uem mma;

Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n’arum.

8 Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ,

Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n’anya nāria ka m’bu.

9 Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,

Gi onye mara nma n’etiti ndinyom?

Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,

Na i b͕awo ayi iyi otú a?

10 Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie,

Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise.

11 Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha,

Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma.

12 Anya-ya abua di ka nduru n’akuku miri-iyi;

Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n’akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri.

13 Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ:

Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù.

14 Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha:

Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya.

15 Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n’elu ukwu ọla-edo anuchara anucha:

Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar.

16 Okpu-ọnu-ya tọkarisiri utọ: e, aru-ya nile bu ihe anāchọsi ike.

Nka bu onye ihe-ya nātọm utọ, nka bu kwa eyìm,

Unu umu-ndinyom Jerusalem.

Categories
ABÙ NKE ABÙ

ABÙ NKE ABÙ 6

1 Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ jeworo,

Gi onye mara nma n’etiti ndinyom?

Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ cheworo iru,

Ka ayi we soro gi chọ ya?

2 Onye ihe-ya nātọm utọ aridaruwo ubi-ya ab͕ara ogige, rue nkpuru nile nke uda,

Izù ìgwè aturu-ya n’ubi-ya nile ab͕ara ogige, na ichikọta urodi.

3 Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, onye ihe-ya nātọm utọ bu kwa nkem:

Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n’etiti urodi.

4 Onye mara nma ka i bu, eyìm, dika Tiaza,

I mara nma nke-uku dika Jerusalem,

I bu onye anātu ujọ dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ.

5 Wepu anya-gi abua n’irum,

N’ihi na ha onwe-ha akpaliwom elu.

Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,

Nke nēdina ala n’akuku ugwu Gilead.

6 Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu,

Nke siworo n’isa-aru rigota;

Nke ha nile chi umu abua umu abua,

Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n’etiti ha.

7 Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi bu

N’azu ákwà-nkpuchi-gi.

8 Ọgu eze-nwanyi atọ di, ọgu ndinyom anọ, nke bu iko, di kwa,

Na umu-ab͕ọghọ nādighi ọnu-ọgugu.

9 Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè;

Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu;

Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu.

Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma;

E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya.

10 Ònye bu nwanyi a nke nēlepu anya dika ututu,

Nke mara nma dika ọnwa,

Nēnwu ka anyanwu,

Onye anātu ujo dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ?

11 Rue ubi walnut ab͕ara ogige ka m’ridara,

Ilekwasi akwukwọ ndu nke ndagwurugwu anya,

Ihu ma osisi vine amawo ifuru,

Na ihu ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko.

12 Mb͕e m’kāmaghi, nkpuru-obim dorom

N’etiti ub͕ọ-ala nke ndim amara aha-ya.

13 Lata, lata, gi nwanyi Shulam;

Lata, lata, ka ayi we lekwasi gi anya.

Gini mere unu gēji lekwasi nwanyi Shulam anya,

Dika ilekwasi otite-egwú nke Mahanaim?

Categories
ABÙ NKE ABÙ

ABÙ NKE ABÙ 7

1 Le ka nzọ-ukwu-gi nile si ma nma n’akpukpọ-ukwu sandal, gi nwa-nwanyi nke onye amara aha-ya!

Apata-ukwu-gi abua nke di buruburu di ka ihe-ichọ-nma,

Ọlu aka onye-ǹkà.

2 Otubo-gi di ka ọkwa di buruburu,

Ka manya-vine agwara agwa ghara ikọ nime ya:

Afọ-gi di ka obo ọka wheat

Nke eji urodi b͕a ya buruburu.

3 Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua

Nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru.

4 Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú;

Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n’akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim;

Imi-gi di ka ulo-elu Lebanon

Nke chere Damaskọs iru.

5 Isi-gi nke di n’elu gi di ka Kamel,

Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo;

Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile.

6 Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku,

Gi ihu-n’anya, n’ihe-utọ nile!

7 Ogologo-gi nka yiri nkwu,

Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine.

8 M’siri, M’gārigo elu nkwu,

M’gējide igu-ya aka:

Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine,

Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple;

9 Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma,

Nke nāsughari n’iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ,

Nke nērùbà nwayọ n’eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura.

10 Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ,

N’arum ka ọchichọ-ya di kwa.

11 Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n’ọhia;

Ka ayi nọ ọnọdu-abali n’obodo ntà.

12 Ka ayi bilie n’isi-ututu je rue ubi-vine nile;

Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru,

Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko:

N’ebe ahu ka m’gēnye gi ihu-n’anyam.

13 Mandrake nile nēsì ísì utọ,

Ọzọ, n’elu ọnu-uzọ-ayi nile ka nkpuru-osisi nile di oké ọnu-ahia di, nke-ọhu na nke-ochie,

Nke m’kpakọbaworo gi, onye ihe-gi nātọm utọ.

Categories
ABÙ NKE ABÙ

ABÙ NKE ABÙ 8

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i dirim ka nwa-nnem nwoke,

Nke miworo ara abua nke nnem!

Mb͕e m’huru gi n’èzí, m’gēsutu gi ọnu;

Ma ọ dighi onye gēledam anya.

2 M’gēduru gi, me ka i ba n’ulo nnem,

I gēzím ihe;

M’gēme ka i ṅua manya-vine ufọdu etiyere ihe-ísì-utọ,

Ka i ṅu kwa manya pomegranate nkem ufọdu.

3 Aka-ekpe-ya gādi n’okpuru isim,

Aka-nri-ya gāb͕akum.

4 Unu umu-ndinyom Jerusalem, ab͕am unu iyi,

Gini mere unu ji akpọte ihu-n’anya? ma-ọbu gini mere unu ji eme ka ọ teta?

Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

5 Ònye bu nwayi a nke nēsi n’ọzara arigota,

Dabere n’aru onye ihe-ya nātọ ya utọ?

N’okpuru osisi apple ka m’kpọtere gi:

N’ebe ahu ka ime gi nēme nne-gi,

N’ebe ahu ka ime nēme ya, o we muputa gi.

6 Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n’obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n’ogwe-aka-gi:

N’ihi na ihu-n’anya di ike dika ọnwu;

Ekworo siri ike dika ala-mọ:

Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku,

Ire-ọku nke Ja onwe-ya.

7 Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n’anya,

Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya:

Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n’ihi ihu-n’anya,

Agēleda ya anya nke-uku.

8 Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà,

Ma ọ dighi ara ọ kpuru:

Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayi

N’ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?

9 Ọ buru na ọ bu mb͕idi,

Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha:

Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ,

Ayi gēji ibo cedar mechibido ya.

10 Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya:

Mb͕e ahu adim n’anya-ya dika onye nāchọta udo.

11 Solomon nwere ubi-vine nime Beal-hamon;

Ọ nyere ubi-vine ahu n’aka ndi-nche;

Onye ọ bula n’ọnọdu nkpuru-ya gēweta nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri.

12 Ubi-vine nkem, nke m’nwere, di n’irum:

Nnù abua na ọgu iri ahu gādiri gi, Solomon,

Ọgu iri gādi-kwa-ra ndi nēche nkpuru-ya.

13 Gi onye bi n’ubi ab͕ara ogige,

Ndi ejikọtara gi na ha nāṅa nti olu-gi:

Mem ka m’nuru ya.

14 B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ,

Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-ele

N’elu ugwu nile nke uda di iche iche.