Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 1

1 Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya!

Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru!

Obodo nke riri nne n’etiti mba nile, nke bu isi n’etiti ala nile anāchi achi,

Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.

2 Ọ nākwasi ákwá ike n’abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua;

Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n’etiti ndi nile nāhu ya n’anya:

Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya,

Ha aghọworo ya ndi-iro.

3 Juda ejewo ibiri n’ala ọzọ site na nweda-n’ala, na site n’iba-uba nke ọbubu-orù;

Ya onwe-ya ebiriwo n’etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike:

Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n’ebe di nkpà.

4 Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n’ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà;

Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n’efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:

5 Ndi nākpab͕u ya aghọwo ndi-isi, ndi-iro-ya nọ n’udo;

N’ihi na Jehova emekpawo ya aru n’ihi iba-uba nke njehie-ya nile:

Umu-ntakiri-ya alawo dika ndi adọtara n’agha n’iru onye-nkpab͕u.

6 Ima-nma-ya nile esiwo kwa n’aru ada Zaion pua:

Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri,

Ha we je ije nēnweghi ike n’iru onye nāchu ha.

7 Jerusalem echetawo n’ubọchi nile nke nweda-n’ala-ya na nke nwaghari-ya nile

Ihe nile ya anāchọsi ike nke diri site n’ubọchi nile nke mb͕e ochie:

Mb͕e ndi-ya dabàra n’aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka,

Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.

8 Jerusalem emehiewo nke-uku; n’ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú:

Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n’ihi na ha ahuwo ọtọ-ya:

E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.

9 Ọrurú-ya di n’ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya;

O we rida n’uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere:

Jehova, le nweda-n’alam; n’ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.

10 Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n’elu ihe-utọ nile nke Jerusalem:

N’ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n’ebe nsọ ya,

Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.

11 Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri;

Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n’ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi:

Le, Jehova, legide anya; n’ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.

12 Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n’uzọ?

Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu,

Onye Jehova mekpaworo aru n’ubọchi iwe-Ya di ọku.

13 N’elu ka O siri zite ọku n’ọkpukpum nile, o we nwe ike n’aru ha:

Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m’laghachi azu;

O mewom ka m’ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.

14 Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile;

Akpakọwo ha n’otù, ha arigotawo n’olum; O mewo ka ikem su ngọngọ:

Onye-nwe-ayi enyewom n’aka-ha, bú ndi m’nāpughi iguzosi ike megide.

15 Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n’etitim:

Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam:

Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke.

16 N’ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri;

N’ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n’ebe m’nọ;

Umum tọb͕ọrọ n’efu, n’ihi na onye-iro di ike.

17 Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere;

Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya:

Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n’etiti ha.

18 Onye ezi omume ka Jehova bu; n’ihi na okwu-ọnu-Ya ka m’nupuworo isi megide:

Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um:

Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n’etiti ndi adọtara n’agha.

19 Akpọkurum ndi nāhum n’anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum:

Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n’obodom,

Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha.

20 Le, Jehova; n’ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku;

Obim nātughari nimem; n’ihi na enupuwom isi nke-uku:

N’èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n’ulo ihe dika ọnwu di.

21 Ha anuwo na onye nēze ume ka m’bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m’nwere;

Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya:

I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.

22 Ka ihe ọjọ nile ha bia n’iru Gi;

Gi me kwa ha, dika I meworom n’ihi njehiem nile:

N’ihi na ize-umem di ọtutu, aru adighi kwa obim ike.

Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 2

1 Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n’iwe-Ya!

O siwo n’elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n’ala,

Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n’ubọchi iwe-Ya.

2 Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n’aru ha;

Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya:

O tidaruwo ha ala:

O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ.

3 O bipuwo mpi nile ọ bula nke Israel n’iwe di ọku;

O seghachiwo aka-nri-Ya azu site n’iru onye-iro:

O rechapuwo kwa Jekob dika ọku nēnwu enwu, nke nēripia buruburu.

4 Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya dika onye-iro, O werewo aka-iri-Ya guzo Onwe-ya dika onye-nkpab͕u,

We b͕ue ndi nile anya nāchosi ike:

N’ulo-ikwū nke ada Zaion ka Ọ wusiworo ọnuma-Ya dika ọku.

5 Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel;

O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike:

O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n’ada Juda.

6 Ọ napuwo kwa ulo-ntu-Ya n’ike, dika agāsi na ọ bu nke ubi ab͕ara ogige;

O bibiwo mb͕e-Ya akara àkà:

Jehova emewo ka echezọ mb͕e akara àkà na ubọchi-izu-ike nime Zaion,

O we ju eze na onye-nchu-àjà n’ọmuma nke iwe-Ya.

7 Onye-nwe-ayi ajusiwo ebe-ichu-àjà-Ya, Ọ sọwo ebe nsọ Ya oyi,

O mechibidowo mb͕idi nile nke ulo-elu-ya nile nye n’aka onye-iro:

Ha emewo ka olu-ha da udà n’ulo Jehova, dika n’ubọchi nke mb͕e akara àkà.

8 Jehova echèwo ibibi mb͕idi ada Zaion;

O setiwo eriri, O sepughi aka-Ya n’olulo:

O we me ka ékpè na mb͕idi rue újú; n’otù ka ha talatakọworo.

9 Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n’ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n’iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha:

Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n’etiti mba nile ebe iwu nādighi;

Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.

10 Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du;

Ha ekpokwasiwo ájá n’isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n’úkwù-ha:

Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n’ala.

11 Anyam abua adalawo n’isi site n’anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku,

Awusiwo umejum n’ala dika miri, n’ihi ntipia nke ada ndim;

N’ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n’amá nile nke obodo.

12 Ha nāsi nne-ha, Òle ebe ọka na manya-vine di?

Mb͕e ha nāda #mbà dika onye emeruru aru n’amá nile nke obodo,

Mb͕e nkpuru-obi-ha nāwusi onwe-ya dika miri n’obi ndi bu nne-ha.

13 Gini, bu àmà M’gāb͕ara gi? gini ka M’gēji tuyere gi, gi ada Jerusalem?

Gini ka M’gēme ka gi na ya rata, ka M’we kasie gi obi, gi ada Zaion nāmaghi nwoke?

N’ihi na ihe di uku dika oké osimiri ka nb͕awa-gi bu: ònye gāgwọta gi?

14 Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu;

Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n’agha lata:

Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche.

15 Ndi nile ndi nāgabiga n’uzọ akuwo aka megide gi;

Ha amawo ọsọ̀ fufere ada Jerusalem isi, si:

Ọ̀ bu nka bu obodo ahu nke anākpọ Ebe mazuru nma, Ihe-obi-utọ nke uwa nile?

16 Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi;

Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya;

N’ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.

17 Jehova emewo ihe nke O zubere;

O mezuwo okwu-ọnu-Ya nke O nyere n’iwu site n’ubọchi nile nke mb͕e ochie;

Ọ kwadawo, ghara inwe ọmiko:

O we me ka onye-iro ṅuria ọṅu n’aru gi,

O mewo ka mpi nke ndi nākpab͕u gi di elu.

18 Obi-ha tikuru Onye-nwe-ayi nkpu:

Gi mb͕idi ada Zaion, me ka anya-miri rùda dika osimiri ehihie na abali;

Enyela onwe-gi izu-ike; ka nwa-anya-gi ghara ikwusi akwusi.

19 Bilie, tie nkpu n’abali, na nmalite nche di iche iche;

Wusi obi-gi dika miri na ncherita-iru Onye-nwe-ayi:

Chilie aka-gi n’ebe Ọ nọ n’ihi ndu umu-ntakiri-gi,

Ndi nāda #mbà n’agu n’isi èsí nile.

20 Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya!

Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n’aka?

Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n’ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi?

21 Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n’èzí nile;

Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha:

I b͕uwo ha n’ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko.

22 I nākpọ, dika n’ubọchi nke mb͕e akara àkà, ujọm nile di buruburu,

Ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu n’ubọchi nke iwe Jehova:

Umum ndi m’tughariworo n’aka zulite, onye-irom emewo ka ha gwusia.

Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 3

1 Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n’ala site na nkpa-n’aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

2 Mu ka O duworo me ka m’jegharia n’ọchichiri ghara inwe ìhè.

3 N’ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile.

4 O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile.

5 O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu.

6 N’ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m’biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

7 Ọ b͕achiwom ogige, m’we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́.

8 Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ.

9 O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ.

10 Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n’ebe-nzuzo di iche iche.

11 Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m’tọb͕ọrọ n’efu.

12 Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú.

13 O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n’akurum abua.

14 Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n’ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile.

15 O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m’ṅujue wormwood afọ.

16 O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.

17 I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n’udo; echezọwom ọdi-nma.

18 M’we si, Ikem alawo n’iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.

19 Cheta nweda-n’alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.

20 Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n’ala nimem.

21 Nka ka m’nēweghachi n’obim, n’ihi nka ka m’nēchere.

22 O sitere n’ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n’ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.

23 Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.

24 Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n’ihi nka ka m’gēchere Ya.

25 Jehova di nma n’ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n’ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.

26 Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n’ichere ya.

27 Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.

28 Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n’ihi na Ọ tukwasiwo ya n’olu-ya.

29 Ya tiye ọnu-ya n’ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi.

30 Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.

31 N’ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi.

32 N’ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

33 N’ihi na Ọ dighi-esite n’obi-Ya weda umu madu n’ala, mekpa ha aru.

34 Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n’okpuru ukwu,

35 Iwezuga ikpé ọ bula n’iru Onye kachasi ihe nile elu,

36 Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n’okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma.

37 Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?

38 Ọ̀ bughi n’ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?

39 Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?

40 Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.

41 Ka ayi weliere Chineke Nke bi n’elu-igwe obi-ayi n’ọbu-aka-ayi abua.

42 Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.

43 I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.

44 I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.

45 Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n’etiti ndi nile di iche iche.

46 Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.

47 Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n’efu na ntipia.

48 Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n’ihi ntipia nke ada ndim.

49 Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,

50 Rue mb͕e Jehova gēsi n’elu-igwe lepu anya, hu.

51 Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n’ihi umu-ndinyom nile nke obodom.

52 Ndi bu ndi-irom n’efu achusiwo ntám ike dika nnunu.

53 Ha ekpochapuwo ndum n’olùlù, we tuam nkume.

54 Miri rubigaram n’isi; asirim, Ebipuwom.

55 Esirim n’olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova.

56 Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n’iku-umem, na ntikum.

57 I biaruru nso n’ubọchi m’kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.

58 Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.

59 Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem.

60 I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n’arum.

61 I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;

62 Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile.

63 Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n’ikpọ ubọ-akwara.

64 I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di.

65 I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha.

66 I gāchu ha n’iwe, kpochapu ha n’okpuru elu-igwe nke Jehova.

Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 4

1 Le, ka ọla-edo si echu echu nke-uku! le, ka ọla-edo nke makarisiri nma si ab͕anwe!

Anāwusi nkume nile nke ebe nsọ n’isi èzí nile ọ bula.

2 Umu Zaion nke di oké ọnu-ahia, ndi eji turu ọla-edo anuchara anucha,

Le otú aguworo ha n’ite urọ, bú ọlu aka ọkpu-ite!

3 Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara:

Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n’ọzara.

4 Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n’okpo-ọnu-ya site n’akpiri-ikpọ-nku:

Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha.

5 Ndi nēri nání ihe utọ di iche iche tọb͕ọrọ n’efu n’èzí nile:

Ndi azùputaworo n’uwe uhie amakuwo ebe-ikpofu-ahihia.

6 Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm,

Nke akwaturu dika n’otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.

7 Ndi-Nazirait-ya di ọcha kari snow, ha nwuru enwu kari miri-ara-ehi,

Ha chara ọbara-ọbara n’aru kari ruby, dika sapphire ka udi-ha di.

8 Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n’èzí:

Akpukpọ-ha araparawo n’ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi.

9 Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo;

N’ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.

10 Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n’ite;

Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.

11 Jehova emezuwo ọmuma-Ya, Ọ wupuwo iwe-Ya di ọku;

O we suye ọku nime Zaion, o we ripia ntọ-ala-ya nile.

12 Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n’elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa,

Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n’ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.

13 O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya,

Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n’etiti ya.

14 Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n’èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,

Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.

15 Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:

Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n’etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n’ebe a.

16 Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ:

Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.

17 Anya-ayi nādala n’isi rue ub͕u a n’ile anya iye-aka efu ayi:

N’iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.

18 Ha achuwo ntá nzọ-ukwu nile ayi, ayi we ghara ijeghari n’amá nile ayi;

Ọgwugwu-ayi di nso, ubọchi nile ayi eruzuwo; n’ihi na ọgwugwu-ayi abiawo.

19 Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe:

N’elu ugwu nile ka ha churu ayi n’ọku ọku, n’ọzara ka ha chere ayi anwu.

20 Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n’olùlù-ha;

Onye ayi siri, N’okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n’etiti mba nile.

21 Ka obi nātọ gi utọ, ṅuria ọṅu, gi ada Edom, nke bi n’ala Uz:

Ọbuná gi ka iko gāgabigaru: i gāṅubiga manya ókè, b͕aba onwe-gi ọtọ.

22 Ajọ omume-gi agwusiwo, gi ada Zaion;

Ọ gaghi-eme kwa ọzọ ka i je biri n’ala ọzọ:

Ọ gēleta ajọ omume-gi, gi ada Edom;

Ọ gēkpughe nmehie-gi nile.

Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 5

1 Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru:

Legide anya, hu ita-uta-ayi.

2 Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ,

Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.

3 Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna,

Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.

4 Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua;

Nkú-ayi nābiara ayi n’ọnu-ahia.

5 Ọ bu inọkwasi n’olu-ayi ka achuworo ayi:

Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n’ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.

6 Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye,

Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.

7 Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;

Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.

8 Ndi-orù achiwo ayi:

Ọ dighi onye nānaputa ayi n’aka-ha.

9 Ayi ji ndu-ayi n’aka weta nri-ayi

N’ihi mma-agha nke ọzara.

10 Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku uku

Site n’ifufe di ọku nke oké ugwu.

11 Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n’ala,

Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n’obodo nile nke Juda.

12 Ekobere ndi-isi n’aka-ha:

Asọpughi iru ndi-okenye.

13 Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri,

Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n’okpuru nkú.

14 Ndi-okenye akwusiwo inọ n’ọnu-uzọ-ama,

Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.

15 Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo;

Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n’ib͕a-nkpe.

16 Okpu-eze nke isi-ayi adawo n’ala:

Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n’ihi na ayi emehiewo.

17 N’ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma;

N’ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.

18 N’ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n’efu;

Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.

19 Gi onwe-gi, Jehova, ọ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I nānọdu dika eze;

Oche-eze-Gi nādiru ọb͕ọ nile.

20 N’ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi?

N’ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?

21 Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa;

Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.

22 Ma-ọbughi na I jusiwo ayi,

Wesa ayi iwe nke-uku.