Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 10

1 Riọnu Jehova miri-ozuzo n’oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n’ubi-ya.

2 N’ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n’efu ka ha nākasi madu obi: n’ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n’ala, n’ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere.

3 N’aru ndi-ọzùzù-aturu ka iwem di ọku, ọ bu kwa nkpi nile ka M’gēji nmehie-ha leta: n’ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha eletawo ìgwè ewu na aturu-Ya, bú ulo Juda, Ọ gēme kwa ha ka ha di ka inyinya-Ya di ebube n’agha.

4 N’aka-Ya ka nkume nkuku gēsi puta, n’aka-Ya ka ǹtú gēsi puta, n’aka-Ya ka uta agha gēsi puta, n’aka-Ya ka onye ọ bula nāchi n’ihe-ike gēsi puta n’otù.

5 Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n’apiti èzí nile n’agha; ha gēbu kwa agha, n’ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya.

6 M’gēme kwa ka ulo Juda di ike, M’gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n’ihi na enwerem obi-ebere n’aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n’ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M’gāza kwa ha.

7 Ndi Efraim gādi kwa ka dike, obi-ha gāṅuri kwa ọṅu dika site na manya-vine: e, umu-ha gāhu ya, we ṅuria; obi-ha gēteghari egwú ọṅù nime Jehova.

8 M’gākpọkọta kwa ha òkù, chikọta ha; n’ihi na ab͕aputawom ha: ha gāba kwa uba otú ha baworo uba.

9 M’gāgha kwa ha dika nkpuru n’etiti ndi nile di iche iche; ọ bu kwa n’ebe nile di anya ka ha gēchetam: ha gādi kwa ndu, ha na umu-ha, we lata.

10 M’gēme kwa ka ha si n’ala Ijipt lata, ọ bu kwa n’Asiria ka M’gāchikọputa ha; ọ bu kwa ala Gilead na Lebanon ka M’gēme ka ha bata; agaghi-ahu-kwa-ra ha ọnọdu.

11 Ọ gāgabiga kwa n’oké osimiri nke nkpab͕u, tie oké osimiri nke ọtutu nmali-miri, ebe di omimi nile nke Nail gātakọrọ kwa: agēbuda kwa npako Asiria n’ala, nkpa-n’aka Ijipt gēwezuga kwa onwe-ya.

12 M’gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n’aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 11

1 Meghe uzọ-gi nile, gi Lebanon, ka ọku we ripia osisi cedar gi nile.

2 Kwasie ákwá ike, gi osisi fir, n’ihi na osisi cedar adawo, n’ihi na emebiwo osisi nke mab͕uru onwe-ha: kwasienu ákwá ike, unu osisi oak nke Beshan, n’ihi na oké ọhia alùgh-alù adawo.

3 Ge nti, ọ bu olu nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi-ọzùzù-aturu! n’ihi na emebiwo ebube-ha: ge nti, ọ bu olu ib͕ọ-uja nke umu-ọdum! n’ihi na emebiwo nbili-elu nke Jọdan.

4 Otú a ka Jehova, bú Chinekem, siri: Nāzù ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u;

5 nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n’ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n’aru ha.

6 N’ihi na M’gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n’aru ndi bi n’ala nka, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n’aka ibe-ya na n’aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M’gaghi-anaputa kwa ha n’aka-ha.

7 M’we zùa ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, n’ezie ọ bu ndi ewedara n’ala nke ìgwè ewu na aturu ahu. M’we chiri n’onwem nkpa-n’aka abua; otù ka m’kpọrọ Idi-utọ, nke-ọzọ ka m’kpọrọ Ndi-ọ̀tú-udọ̀, m’we zùa ìgwè ewu na aturu.

8 M’we bipu ndi-ọzùzù-aturu atọ ahu n’otù ọnwa; nkpuru-obim enweghi kwa ntachi-obi n’aru ha, ọzọ, nkpuru-obi-ha asọwokwam oyi.

9 M’we si, M’gaghi-azù unu: nke nānwu anwu, ya nwua; nke anēbipu ebipu, ka ebipu ya; ka ndi fọduru rie, aturu ọ bula anu-aru ibe-ya.

10 M’we were nkpa-n’akam, bú Idi-utọ, b͕ujira ya abua, imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi nile di iche iche b͕ara.

11 Ewe nyajie ya n’ubọchi ahu: otú a ndi ewedara n’ala nke ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi nāribam ama, we mara na okwu Jehova ka ọ bu.

12 M’we si ha, Ọ buru na ọ di nma n’anya-unu, nyenum ugwọ-ọlum; ma ọ dighi, gharanu. Ha we tùa ugwọ-ọlum, bú orú ego ọla-ọcha na iri.

13 Jehova we sim, Tufue ya nye ọkpu-ite, bú ọnu-ahia mab͕uru onwe-ya nke ha rùrum. M’we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, tufue ha nye ọkpu-ite, n’ulo Jehova.

14 M’we b͕ujira nkpa-n’akam nke-abua, bú Ndi-ọ̀tú-udọ̀, imebi nwa-nne Juda na Israel bu.

15 Jehova we sim, Were kwa n’onwe-gi ọzọ ihe nke onye-ọzùzù-aturu nke b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya.

16 N’ihi na, le, Mu onwem gaje ime ka otù onye-ọzùzù-aturu bilie n’ala nka, ọ gaghi-elekọta ndi ebipuru ebipu, ọ gaghi-achọ nke achusara achusa, ọ gaghi-agwọ nke ab͕ajiri ukwu na aka; ọ gaghi-azù nke nēguzo eguzo, ma anu nke aturu mara abuba ka ọ gēri, ukwu nile ha ka ọ gānyajisi.

17 Ahuhu diri onye-ọzùzù-aturu efu nke nārapu ìgwè ewu na aturu! mma-agha gādakwasi n’ogwe-aka-ya na n’anya-ya nke aka-nri: ogwe-aka-ya gākpọsi nku, anya aka-nri ya gāhu kwa inyoghi-inyoghi nke-uku.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 12

1 Ibu okwu Jehova eboro Israel. Ihe si n’ọnu Jehova puta, bú Onye nēseti elu-igwe, nātọ kwa ntọ-ala uwa, nākpu kwa mọ madu nime ya:

2 Le, Mu onwem gaje ime Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche ndi di ya buruburu ọkwa nṅaghari, ọ bu kwa n’aru Juda ka ọ gādi nime nnọchigide-n’agha ahu agānọchigide Jerusalem.

3 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na M’gēme Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche nkume ebubo; ndi nile ndi ji ya ebo onwe-ha gākọwaputa onwe-ha ọnyá nke-uku; mba nile nke uwa gāchikọta kwa onwe-ha imegide ya.

4 N’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gēji ibobo tib͕ue inyinya ọ bula, ji kwa ara-ọwiwi tib͕ue onye nānọkwasi ya: ọ bu kwa ulo Juda ka M’gāsaghe anyam abua lekwasi, ọ bu inyinya nile ọ bula nke ndi nile di iche iche ka M’gēji ikpu-ìsì tib͕ue.

5 Ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda gāsi kwa n’obi-ha, Ume m’nwere ka ndi bi na Jerusalem gābu nime Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha.

6 N’ubọchi ahu ka M’gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n’etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n’etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n’aka-nri na n’aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n’onodu-ya, obuná nime Jerusalem.

7 Jehova gēbu kwa uzọ zọputa ulo-ikwū nile nke Juda, ka ima-nma nke ulo Devid na ima-nma nke ndi bi na Jerusalem we ghara idi uku n’elu Juda.

8 N’ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n’etiti ha n’ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n’iru ha.

9 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na M’gāchọ ikpochapu mba nile ndi nābia imegide Jerusalem.

10 M’gāwukwasi kwa n’ulo Devid na n’aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n’obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n’obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.

11 N’ubọchi ahu oké otiti-aka-n’obi gādi na Jerusalem, dika otiti-aka-n’obi nke Hedad-rimon nime ndagwurugwu Megidon.

12 Ala nka gēti kwa aka n’obi, ab͕uru ọ bula iche; ab͕uru ulo Devid iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ulo Netan iche, na ndinyom-ha iche;

13 ab͕uru ulo Livai iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ndi Shimai iche, na ndinyom-ha iche;

14 ab͕uru nile ndi fọduru, ab͕uru ọ bula iche, na ndinyom-ha iche.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 13

1 N’ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.

2 Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M’gēbipu aha nile nke arusi nile n’ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M’gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n’ala nka gabiga.

3 Ọ gēru kwa, mb͕e onye ọ bula gēbu kwa amuma ọzọ, na nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāsi ya, I gaghi-adi ndu; n’ihi na okwu-ugha ka i kwuworo n’aha Jehova: nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāmapú ya mb͕e o nēbu amuma.

4 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na ihere gēme ndi-amuma, onye ọ bula n’ọhù-ya, mb͕e o nēbu amuma; ha agaghi-eyiri kwa uwe-nwuda nke aji-anu ka ha we ghọ aghughọ:

5 ma ọ gāsi, Ọ dighi onye-amuma m’bu, onye-ọlu-ubi ka m’bu; n’ihi na madu mere ka ab͕atam site na mb͕e m’di na nwata.

6 Agāsi kwa ya, Gini bu ntiputa-ọnyá ndia n’etiti aka-gi abua? Ọ gāsi kwa, Ha bu ọnyá etiputaram n’ulo ndi nāhum n’anya.

7 Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M’gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.

8 Ọ gēru kwa, n’ala nka nile, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na uzọ abua nime ya ka agēbipu, ha kubìe ume; ma uzọ nke-atọ gāfọdu nime ya.

9 M’gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n’ọku, M’gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M’gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 14

1 Le, otù ubọchi nābiara Jehova, mb͕e agēkesa ihe-nkwata-gi n’etiti gi.

2 M’gāchikọta kwa mba nile ibuso Jerusalem agha; agēwere kwa obodo a, punara ya ulo-ya nile, merua ndinyom-ya: nkera obodo a gāpu buru ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ma agaghi-ebipu ndi nka fọduru n’obodo a.

3 Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n’ubọchi O buru agha n’ubọchi ilu-ọ̀gù.

4 Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n’ubọchi ahu n’elu ugwu Olive, nke di n’iru Jerusalem n’Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n’etiti abua ya n’akuku Ọwuwa-anyanwu na n’akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n’akuku Ugwu, nkera-ya n’akuku Ndida.

5 Unu gēsi kwa na ndagwurugwu ugwum nile b͕alaga; n’ihi na ndagwurugwu ugwu ahu gēru Eze: e, unu gāb͕alaga, dika unu siri n’iru ala-ọma-jijiji b͕alaga n’ubọchi Uzaia, bú eze Juda: Jehova, bú Chinekem, gābia kwa, ndi nsọ nile gēsoro Gi.

6 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na ìhè agaghi-adi, ìhè nēnwu enwu gāb͕achi:

7 ma ọ gābu otù ubọchi nke Jehova mara: ọ bughi ehihie, ọ bughi kwa abali: ma o gēru, na ìhè gādi na mb͕e anyasi.

8 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na miri nēnye ndu gēsi na Jerusalem rùputa; nkera-ha gērùga n’oké osimiri Iru-anyanwu, nkera-ha gērùga kwa n’oké osimiri Ọdida-anyanwu: na mb͕e okpom-ọku na na mb͕e oyi ka ọ gadi.

9 Jehova gāghọ kwa eze elu-uwa nile: n’ubọchi ahu ka Jehova gādi otù, aha-Ya gādi kwa otù.

10 Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n’ọnọdu-ya, site n’ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n’ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.

11 Agēbi kwa nime ya, nwezuga ka ebibie ya agaghi-adi kwa ọzọ; Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi.

12 Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n’otù n’otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n’ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n’oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n’ọnu-ha.

13 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na oké ọb͕ub͕a-aghara nke Jehova gādi n’etiti ha; ha gējide kwa, onye ọ bula o jide ibe-ya aka, aka-ya gēbili kwa imegide aka madu-ibe-ya.

14 Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku.

15 Otú a ka ihe-otiti nke inyinya na inyinya mule na camel na inyinya-ibu na anumanu ọ bula nke gādi n’ulo-ikwū ndia gādi, dika ihe-otiti a.

16 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n’etiti mba nile ndi nābia imegide Jerusalem gārigo kwa-arọ ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na ime ememe ulo-ntu.

17 Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n’etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha.

18 Ọ buru kwa na ab͕uru Ijipt adighi-arigobata, ọ̀ gaghi-adi n’aru ha, bú ihe-otiti, nke Jehova gēji ti mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu?

19 Nka gābu ahuhu-nmehie nke Ijipt, na ahuhu-nmehie nke mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu.

20 N’ubọchi ahu ka IHE NSỌ JEHOVA NWERE gādi n’elu ataṅu nile nke inyinya; ite nile n’ulo Jehova gādi kwa ka ọkwa-nwusa di n’iru ebe-ichu-àjà.

21 E, ite ọ bula nke di na Jerusalem, ma-ọbu nke di na Juda, gābu ihe nsọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere: ndi nile ndi nāchu àjà gābia kwa chiri ufọdu nime ha, sie ihe nime ha: ọ dighi kwa onye Kenean gādi ọzọ n’ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha n’ubọchi ahu.

Categories
MALAKAI

MALAKAI 1

1 Ibu okwu Jehova eboro Israel site n’aka Malakai.

2 Ahuwom unu n’anya, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka I huworo ayi n’anya? Isọ, ọ̀ bughi nwa-nne Jekob? (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): otú ọ di, anamahu Jekob n’anya;

3 ma Isọ ka M’kpọworo asì, me ugwu-ya nile ka ha ghọ ebe tọḅọrọ n’efu, M’were ihe-nketa-ya nye nkita-ọhia nile nke ọzara.

4 Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.

5 Anya-unu gāhu kwa, unu onwe-unu gāsi kwa, Jehova di uku rue ofè ókè-ala Israel.

6 Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M’bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M’bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?

7 Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n’elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N’isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu.

8 Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

9 Ma uḅu a, biko, menu ka iru Chineke dajua, ka O we mere ayi amara: ọ bu site n’aka-unu ka nka diworo: Ọ̀ gāhu onye ọ bula nime unu iru-ọma? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri:

10 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n’etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n’efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M’gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n’aka-unu nke-ọma.

11 N’ihi na site n’ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n’etiti mba nile; ọ bu kwa n’ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n’ihi na aham di uku n’etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

12 Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n’isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì.

13 Unu asiwo kwa, Le, ka o si buru oké ike-ọgwugwu! unu afùwo kwa ya na nlelì, ka Jehova nke ndi-agha siri; unu ewebatawo kwa ihe anapuru n’ike, na ihe gwọrọ ngwuro, na nāria ọria; otú a ka unu webataworo onyinye-inata-iru-ọma: #M’gānara nka nke-ọma nāka-unu? ka Jehova siri.

14 Ma onye anābu ọnu ka onye-nghọḅu ahu bu, nke oké di n’ìgwè aturu-ya, ma ọ nēkwe nkwa, we chuara Onye-nwe-ayi àjà ihe biriri ebibi: n’ihi na eze uku ka M’bu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, aham di kwa egwu n’etiti mba nile.

Categories
MALAKAI

MALAKAI 2

1 Ma uḅu a, unu ka ihe a enyere n’iwu diri, unu ndi-nchu-àjà.

2 Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n’obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M’gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n’aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n’ihi na unu adighi-etiye ya n’obi.

3 Le, M’gaje ibasiri nkpuru-ọghigha nba ike n’ihi unu, fesa unu ǹsí-anu n’iru, bú ǹsí-anu nke anu ememe nile unu; agēbupu unu je n’ebe ọ di.

4 Unu ewe mara na eziteworom unu ihe a enyere n’iwu, ka ọḅuḅa-ndum we diyere Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

5 Ọgbugha-ndum diyere ya, bú ndu na udo; M’we nye ya ha dika ihe-egwu, o we tua egwum, ọ bu kwa aham ka ya onwe-ya turu ujọ ya.

6 Iwu nke ezi-okwu di n’ọnu-ya, ahughi kwa ajọ omume n’eḅuḅere-ọnu-ya: n’udo na n’izi-ezi ka o sorom je ije, ọ di kwa ọtutu madu o mere ka ha si n’ajọ omume chigharia.

7 N’ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n’ọnu-ya: n’ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.

8 Ma unu onwe-unu ewezugawo onwe-unu n’uzọ Chineke; unu emewo ka ọtutu madu su ngọngọ n’iwu; unu ebibiwo ọḅuḅa-ndu Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

9 Ma Mu onwem emewo kwa ka unu buru ndi anēlelì na ndi di ala n’iru ndim nile, dika unu nādighi-esi edebe uzọm nile, kama unu nāhu madu iru-ọma n’iwu.

10 Ọ̀ bughi otù Nna ka ayi nile nwere? ọ̀ bughi otù Chineke keworo ayi? gini mere ayi nāghọḅu, onye ọ bula ọ ghọḅu ibe-ya, nēme ka ọḅuḅa-ndu nna-ayi-hà ghara idi nsọ?

11 Juda aghọḅuwo nghọḅu, ọ bu kwa ihe-árú ka emeworo n’Israel na nime Jerusalem; n’ihi na Juda emewo ka idi-nsọ Jehova nke Ọ huworo n’anya ghara idi nsọ, ọ luwo kwa nwa-nwan yi nke chi ala ọzọ.

12 Jehova gēbipuru onye ahu nke nēme nka onye nēteta eteta na onye nāza aza, n’ulo-ikwū nile nke Jekob, ya na onye nēwetara Jehova nke usu nile nke ndi-agha nso onyinye-inata-iru ọma.

13 Ọ bu kwa nka nke mere ya abua ka unu nēme: unu ji anya-miri na ikwa-ákwá na isu-udè ekpuchi ebe-ichu-àjà Jehova, O we ghara iche kwa onyinye-inata-iru-ọma ọzọ, ọ tọghi kwa Ya utọ inara ya n’aka-unu.

14 Ma unu asiwo, N’ìhi gini? N’ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n’etiti gi na nwunye i lutara n’okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi.

15 Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N’ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n’okorọbia.

16 N’ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n’ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.

17 Unu ejiwo okwu nile unu me ka ike gwu Jehova. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi meworo ka ike gwu Ya? N’isi, Onye ọ bula nke nēme ihe ọjọ di nma n’anya Jehova, ọ bu kwa ihe-ha nātọ Ya onwe-ya utọ; ma-ọbu òle ebe Chineke nke ikpé nọ?

Categories
MALAKAI

MALAKAI 3

1 Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n’irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

2 Ma ònye gānagide ubọchi ọbibia-Ya? ọ̀ bu kwa onye ganēguzogide mḅe anāhu Ya anya? n’ihi na Ya onwe-ya di ka ọku onye-nnucha-ihe na dika nchà nke ọsu-ákwà:

3 Ọ gānọdu kwa ala dika onye-nnucha ọla-ọcha nke nēme ka ọ di ọcha, Ọ gēme kwa ka umu Livai di ọcha, sicha kwa ha dika ọla-edo na ọla-ọcha; ha ganēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma n’ezi omume.

4 Onyinye-inata-iru-ọma nke Juda na Jerusalem gātọ kwa Jehova utọ, dika n’ubọchi mḅe ebighi-ebi gara aga, na dika n’arọ nile gara aga.

5 M’gābiakute unu nso ikpe ikpé; M’gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n’ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n’ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

6 N’ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob.

7 Site n’ubọchi nile nke nna-unu-hà ka unu wezugaworo onwe-unu n’ukpurum nile, unu edebeghi kwa ha. Laghachikutenum, Mu onwem gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi gālaghachi?

8 Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N’otù uzọ n’uzọ iri nile na àjà-nbuli nile.

9 Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile.

10 Webatanu otù uzọ n’uzọ iri nile n’ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n’ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M’gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.

11 M’gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n’ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n’ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

12 Ọ bu kwa Ndi ihe nāgara nke-ọma ka mba nile gākpọ unu: n’ihi na unu onwe-unu gābu ala nke nātọ utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

13 Okwu nile unu adiwo ike imegidem, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Gini ka ayi kwuritaworo megide Gi?

14 Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n’uwe-iḅa-nkpe n’iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha?

15 Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha.

16 Mḅe ahu ndi nātu egwu Jehova nēkwurita okwu, otú onye na ibe-ya: Jehova we ṅa nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu Jehova, ndi nēchè kwa èchìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n’iru Ya.

17 Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n’ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M’gēnwe kwa ọmiko n’aru ha, dika madu si enwe ọmiko n’aru nwa-ya nke nēfè ya.

18 Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n’etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n’etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.

Categories
MALAKAI

MALAKAI 4

1 N’ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka.

2 Ma unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi emume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù; unu gāpu kwa, wulie elu dika umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba.

3 Unu gāzọda kwa ndi nēmebi iwu; n’ihi na ha gābu ntu n’okpuru ọbu-ukwu-unu n’ubọchi ahu mḅe M’gēme ihe, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

4 Chetanu iwu Moses, bú orùm, nke M’nyere ya n’iwu na Horeb inye Israel nile, bú ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche.

5 Le, Mu onwem nēzitere unu Elaija, bú onye-amuma, tutu oké ubọchi ahu di egwu nke Jehova abia.

6 Ọ gēme kwa ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ka obi umu chigharikute kwa ndi bu nna-ha; ka M’we ghara ibia were iwezuga-ka-ebibie-ya tiḅue uwa.

Categories
MATIU

MATIU 1

1 Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham.

2 Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya;

3 Juda we mua Perez na Zera site na Tema; Perez we mua Hezron; Hezron we mua Ram;

4 Ram we mua Aminadab; Aminadab we mua Nahshon; Nahshon we mua Salmon;

5 Salmon we mua Boaz site na Rehab; Boaz we mua Obed site na Rut; Obed we mua Jesi;

6 Jesi we mua Devid, bú eze.

Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia;

7 Solomon we mua Rehoboam; Rehoboam we mua Abaija; Abaija we mua Esa;

8 Esa we mua Jehoshafat; Jehoshafat we mua Joram; Joram we mua Uzaia;

9 Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia;

10 Hezekaia we mua Manase; Manase we mua Emon; Emon we mua Josaia;

11 Josaia we mua Jekonaia na umu-nne-ya, na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon.

12 Mb͕e emesiri ka ha je biri na Babilon, Jekonaia we mua Shealtiel; Shealtiel we mua Zerubabel;

13 Zerubabel we mua Abaiud; Abaiud we mua Elaiakim; Elaiakim we mua Ezoa;

14 Ezoa we mua Sedok; Sedok we mua Akim; Akim we mua Elaiud;

15 Elaiud we mua Eleeza; Eleeza we mua Matan; Matan we mua Jekob;

16 Jekob we mua Josef di Meri, nwanyi nke muru Jisus, Onye anākpọ Kraist.

17 Ya mere ọb͕ọ nile site n’Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ.

18 Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ.

19 Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n’iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo.

20 Ma mb͕e ihe ndia di ya n’obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n’ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n’aka Mọ Nsọ.

21 Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n’ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.

22 Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n’ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,

23 Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke,

Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel;

nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.

24 Josef we si n’ura-ya bilie, me dika mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nyere ya iwu, we kuru nwunye-ya;

25 ọ maghi kwa ya rue mb͕e ọ muputara Nwa-nwoke: o we kpọ aha-Ya Jisus.