Categories
NEHUM

NEHUM 1

1 Ibu eboro Nineve. Akwukwọ ọkù nke Nehum, bú onye Elkosh.

2 Chineke ekworo, Nke nābọ̀ kwa ọ́bọ̀, ka Jehova bu; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye-nwe ọnuma; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu n’aru ndi nēmegide Ya, onye nēdebere ndi-iro-Ya iwe ka Ọ bu.

3 Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n’ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n’oké ikuku na n’oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua.

4 Ọ nābasiri oké osimiri nba ike, me ka ọ ta, ọ bu kwa osimiri nile ka O meworo ka ha takọrọ: Beshan nātalata, ya na Kamel, ihe-opupú nke Lebanon nātalata kwa.

5 Ugwu nile emewo nkpatu site na Ya, ugwu ntà nile ab͕azewo kwa; ala we bulie onwe-ya site n’iru Ya, e, elu-uwa dum madu bi na ndi nile bi nime ya.

6 Ònye gēguzo n’iru oké iwe-Ya? ọ̀ bu kwa onye gēguzosi ike n’idi-ọku nke iwe-Ya? awusiwo ọnuma-Ya dika ọku, akwatuwo kwa oké nkume nile site na Ya.

7 Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n’ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya.

8 Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n’ọchichiri.

9 Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua.

10 N’ihi na ọ bu ezie na ha di ka ogwu tuhiri atuhi, buru kwa ndi ṅubigaworo manya ókè dika n’iṅubiga-manya-ókè-ha, ọku gēripia ha dika ahihia-ọka kpọnwusiri akpọnwu.

11 Nime gi ka otù onye siri puta, nke nēchè ihe ọjọ megide Jehova, nādu kwa ọdu ihe jọb͕uru onwe-ya.

12 Otú a ka Jehova siri: Ọ bu ezie na ha zuru okè, ba kwa uba otú a, ọbuná otú a ka agēb͕utu ha, ọ gāgabiga kwa. Ọ bu ezie na ewedawom i n’ala, ma M’agaghi-eweda kwa gi n’ala ọzọ.

13 Ma ub͕u a ka M’gāb͕ajipu nkpọrọ yoke-ya n’olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M’gētibi.

14 Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n’aha-gi: n’ulo chi-gi nile ka M’gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M’gēdo ílì-gi; n’ihi na elelìwo gi anya.

15 Le, n’elu ugwu ka ukwu nke onye n’ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n’ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.

Categories
NEHUM

NEHUM 2

1 Onye-nchusa arigotawo n’iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku.

2 N’ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n’ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo.

3 Ọta ndi-dike-ya bu ihe esijiri ọbara-ọbara, ndi-dìnkpà-ya yiri uwe nācha uhie uhie: ígwè nēb͕upu eb͕upu ka ub͕ọ-ala-ya nwere n’ubọchi ndozi-ya, emewo ka osisi fir nile me nkpatu nke-uku.

4 N’èzí nile ka ub͕ọ-ala nile kpọtuworo nkpọtu nke-uku, ha nāb͕aghari iru na azu n’amá nile: ha di ka ọwa nēnwu enwu n’ile ha anya, dika àmùmà ka ha nāb͕a ọsọ.

5 Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n’ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n’agha.

6 Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya.

7 Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka.

8 Ma Nineve di ka ọdọ-miri juputara na miri site n’ubọchi nile ya onwe-ya di: ma ndi ahu nāb͕alaga; Guzonu, guzonu, ka ha nāsi; ma ọ dighi onye nāgha anya n’azu.

9 Lutanu ọla-ọcha n’agha lutanu ọla-edo n’agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n’ihe nile anāchọsi ike.

10 Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n’efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n’úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa.

11 Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.

12 Ọdum nādọb͕u anu gēzuru umu-ya, ọ nātọb͕uta-kwa-ra nne-ọdum-ya nile anu, we kpojue ọb͕à-ya nile n’anu-ndọb͕u, kpoju kwa ebe-obibi-ya nile n’anu ọ dọb͕uworo.

13 Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M’gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n’anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M’gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n’uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.

Categories
NEHUM

NEHUM 3

1 Ahuhu diri obodo ọbara! o juputasiri n’okwu-ugha na ndọka; ndọb͕u-anu adighi-apu na ya.

2 Ge nti olu utali, na olu nke ùzù wheel; na inyinya nāwuli awuli, na ub͕ọ-ala nāmali amali;

3 na onye-inyinya nēme ka inyinya-ya rigo, na mma-agha nēb͕upu eb͕upu, na ube nēb͕u àmùmà; na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u, na oké obo ozu; ọ dighi kwa ọgwugwu diri ozu-ha; ha nāsu ngọngọ n’ozu-ha:

4 n’ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n’ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile.

5 Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M’gēkpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi n’iru-gi, me ka mba nile hu ọtọ-gi, na ala-eze nile ka ha hu ihere-gi.

6 M’gātukwasi kwa gi ihe-árú di iche iche, M’gākpọ kwa gi ihe-nzuzu, do gi ka ihe ile anya.

7 O gēru kwa, na ndi nile ndi nāhu gi gāb͕anari gi, si, Ebibiwo Nineve: ònye gēgosi ya ebere o ji n’aru ya? Òle ebe M’gāchọputara gi ndi-nkasi-obi?

8 Ì di nma kari No-amon, nke bi n’etiti osimiri Nail nile, nke miri di ya buruburu; nke ékpè-ya bu oké osimiri, oké osimiri ka mb͕idi-ya sitere?

9 Etiopia bu ume-ya, ya na Ijipt, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ya; Put na Lubim buri ndi-iye-aka-gi.

10 Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n’ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n’agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n’isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ.

11 Gi onwe-gi gāṅubiga kwa manya ókè, i gābu onye zoro ezo; gi onwe-gi gāchọ kwa ebe siri ike, n’ihi onye-iro.

12 Ebe-gi nile ewusiri ike gādi ka osisi fig nwere nkpuru-osisi fig buru uzọ cha: ọ buru na arùru ha arù, ha adabá n’ọnu onye nēri ha.

13 Le, ndi-gi bu ndinyom n’etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile.

14 Sere onwe-gi miri nke nnọchigide-n’agha, me ka ebe-gi nile ewusiri ike sie ike: ba n’urọ, zọta ájá, jide ihe eji akpu brick.

15 N’ebe ahu ka ọku gēripia gi; mma-agha gēbipu gi, ọ gēripia gi dika ukpala: me onwe-gi ka i rie nne dika ukpala, me onwe-gi ka i rie nne dika igurube.

16 I mewo ka ndi-ahia-gi ba uba kari kpakpando nke elu-igwe: ukpala enwopuwo iwere-ya, felaga.

17 Ndi-gi ekpubeworo okpu-eze di ka igurube, ndi-ọchi-agha-gi di kwa ka ìgwè igurube, ndi nēbe n’ogige ab͕ara ab͕a n’ubọchi juru oyi, ma mb͕e anyanwu wara ha felaga, amaghi kwa ọnọdu-ha ebe ha nọ.

18 Ndi-ọzùzù-aturu-gi atuwo òrù-ura, gi eze Asiria: ndi-ebube-gi nwere ebe-obibi-ha n’ájá: ndi-gi ab͕asawo n’elu ugwu nile, ọ dighi kwa onye-nchikọta ha nwere.

19 Ọ dighi nbilata nb͕aji ab͕ajiri gi nwere; ntiputa-ọnyá-gi jọrọ njọ: ndi nile ndi nānu ihe-ọnunu bayere gi gākukpo gi aka-ha; n’ihi na ònye ka ihe ọjọ gi nāgabigaghi n’isi-ya mb͕e dum?

Categories
HABAKUK

HABAKUK 1

1 Ọhu nke Habakuk, bú onye-amuma, huru.

2 Jehova, rùe ole mb͕e ka m’ganētiku Gi, ma I dighi-anu? m’nētiku Gi nkpu, si, Ihe-ike! ma I dighi-azọputa.

3 N’ìhi gini ka I nēme ka m’hu ajọ ihe? n’ìhi gini ka I nēlegide nmeb͕u? ma ipunara-madu-ihe ma ihe-ike di n’irum: ilu-ọ̀gù we di, esem-okwu nēbuli kwa onwe-ya.

4 N’ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n’ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n’ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ.

5 Hunu n’etiti mba nile, legide-kwa-nu, ka o ju kwa unu anya nke-uku nke-uku: n’ihi na ọlu ka M’nālu n’ubọchi-unu, nke unu nāgaghi-ekwe, mb͕e agākọrọ unu ya.

6 N’ihi na, le, M’gaje ime ka ndi Kaldea bilie, bú mba ahu di ilu nke nēme kwa ngwa ngwa; ndi nējeghari na mbara uwa, inweta ebe-obibi di iche iche nke nābughi nke ha.

7 Ndi anātu ujọ, ndi dikwa egwu, ka ha bu: n’aka ha onwe-ha ka ikpé-ha na nbuli-elu-ha si aputa.

8 Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n’ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe.

9 Ha nile nābia ime ihe-ike; edosiri iru-ha ike dika ifufe Iru-anyanwu; ha we chikọta ndi adọtara n’agha dika ájá.

10 E, mba ahu nākwa ndi-eze emò, ndi-isi bu-kwa-ra ya ihe-ichì-ọchì: mba ahu nāchì ebe ọ bula ewusiri ike ọchì; n’ihi na o nēkpokọba ájá, we were ya.

11 Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya.

12 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi siteworo na mb͕e ochie, Jehova, bú Chinekem, Onye Nsọm? ayi agaghi-anwu. Jehova, ọ bu ikpe ikpe ka I doworo ya; Gi Oké Nkume, ọ bu kwa iba nba ka I tọworo ya ntọ-ala.

13 Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n’ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n’ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;

14 I we me madu ka ha di ka azù nke oké osimiri, dika ihe nākpu akpu, nke nēnweghi onye nāchi ha?

15 Ha nile ka o ji nkò-azù dọkpuru, o nēkpochapu ha n’eriri-ya, chikọta ha n’ub͕u-ya: n’ihi nka ka ọ nāṅuri, tegharia egwú ọṅù.

16 N’ihi nka ka ọ nāchuru eriri-ya àjà, nēsurere ub͕u-ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; n’ihi na site na ha ka òkè-ya nwere urù, ihe-oriri-ya ma-kwa-ra abuba.

17 Ọ̀ gēwere n’ihi nka nāwupu eriri-ya, ghara inwe ọmiko n’ib͕u mba di iche iche mb͕e dum?

Categories
HABAKUK

HABAKUK 2

1 N’elu ebe m’nēche ka m’gēguzo, guzo kwa onwem n’elu ebe ewusiri ike, m’gēche kwa ihu ihe Ọ gēkwu megidem, na ihe m’gāzaghachi bayere iba-nbam.

2 Jehova we zam, si, De ọhù ahu n’elu mbadamba-ihe di iche iche, tu ya akika, ka onye nāgu ya we b͕a ọsọ.

3 N’ihi na ọhù ahu nādiru mb͕e akara àkà, ọ nēkusi-kwa-ra ọgwugwu-ya ume ike, ọ gaghi-ekwu kwa okwu-ugha: ọ buru na ọ la azu, chere ya; n’ihi na ọ ghaghi ibia, ọ gaghi-anọ ọdù.

4 Le, nkpuru-obi-ya afuliwo onwe-ya, o zighi ezi nime ya: ma onye ezi omume gēji okwukwe-ya di ndu.

5 E, ọzọ kwa, n’ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n’ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n’ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n’ebe ọ nọ.

6 Ndia, hà nile agaghi-atu ilu megide ya, na okwu miri emi, ọbuná okwu omimi di iche iche, bayere ya, si, Ahuhu diri onye ahu nke nēme ka ihe nābughi nke ya ba uba! rùe ole mb͕e? onye ji ihe-ibe ebob͕u onwe-ya!

7 Ọ̀ bughi n’otù ntabi-anya ka ha gēbili, bú ndi nāta gi aru, ka ha gēteta, bú ndi nēme ka i ma jijiji, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-npunara?

8 N’ihi na i kwatawo ọtutu mba, ya ka ndi nile fọduru nime ndi nile di iche iche gākwata gi; n’ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.

9 Ahuhu diri onye nēritara ulo-ya urù ọjọ, ido akwu-ya n’elu, ka ewe naputa ya n’ọbu-aka ihe ọjọ!

10 I duworo ulo-gi ọdu ihere, ibipu ọtutu ndi di iche iche, i we nēmehie megide nkpuru-obi-gi.

11 N’ihi na nkume gēsi na mb͕idi tie nkpu, ntuhie gēsi kwa n’osisi di n’ulo za ya.

12 Ahuhu diri onye ji ọbara ewu obodo, onye ji kwa ajọ omume me ka obodo guzosie ike!

13 Le, ò siteghi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha na ndi di iche iche nādọb͕u onwe-ha n’ọlu nye ọku, na ike nāgwu kwa mba nile n’efu?

14 N’ihi na uwa gējuputa n’ọmuma ebube Jehova, dika miri si ekpuchi oké osimiri.

15 Ahuhu diri onye nēme ka madu-ibe-ya ṅua ihe, onye nāgwakọta ya na ọnuma-gi, ọzọ, i nēme kwa ka ọ ṅubiga manya ókè, ka i we legide ọtọ-ha anya!

16 Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n’elu ebube-gi.

17 N’ihi na ihe-ike emere Lebanon gēkpuchi gi, na nbibi nke anumanu di iche iche, nke mere ka ha tua ujọ; n’ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.

18 Ùrù gini ka arusi apiri api bara, na onye nēme ya apiwo ya? ùrù gini ka arusi awuru awu na onye-ozízí okwu-ugha bara, na onye nākpu ihe-ya akpuru akpu atukwasiwo ya obi, ime arusi dara ob͕i di iche iche?

19 Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya.

20 Ma Jehova nọ n’ulo uku Ya di nsọ: dere du n’iru Ya, gi uwa nile.

Categories
HABAKUK

HABAKUK 3

1 Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n’elu Shigionoth.

2 Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m’tua egwu:

Jehova, tute ọlu-Gi n’etiti arọ nile,

N’etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya;

N’oké iwe cheta obi-ebere.

3 Chineke si na Timan nābia,

Onye Nsọ si kwa n’ugwu Peran.Selah

Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile,

Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.

4 Onwunwu-Ya di ka ìhè;

Ìhè nēnwuputa n’aka-Ya:

Ọ bu kwa n’ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.

5 N’iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga,

Anwuru-ọku si kwa n’ukwu-Ya abua nāputa.

6 O guzoro, we tùa uwa;

O lere anya, we me ka mba nile kuja:

Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi,

Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala;

Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya.

7 N’okpuru ajọ ihe ka m’huworo ulo-ikwū nile nke Kushan:

Ákwà-nkwuba nile nke ala Midian nāma jijiji.

8 Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide?

Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide?

Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide?

Na I nānọkwasi n’inyinya-Gi nile,

N’ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.

9 Ab͕abasiri uta-Gi ọtọ;

Iyi nile aṅuru ebo-Gi nile bu okwu-ọnu kwesiri ntukwasi-obi.Selah

I nēji osimiri b͕awa ala.

10 Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali;

Okè miri-ozuzo gabigara:

Ob͕u-miri mere ka olu-ya da,

Chilie aka-ya elu.

11 Anyanwu na ọnwa guzoro n’ebe-obibi-ha;

N’ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga,

N’onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà.

12 N’oké iwe ka I nāzọ ije n’ala,

N’iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.

13 I putawo ìhè izọputa ndi-Gi,

Izọputa onye-Gi etere manu;

I mabipuwo isi n’ulo ndi nēmebi iwu,

B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu.Selah

14 I jiwo nkpa-n’aka-ya dupue ndi-agha-ya isi:

Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam:

Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n’ala n’ebe-nzuzo.

15 I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n’oké osimiri,

Bú obo nke ọtutu miri.

16 Anurum, afọm we ma jijiji,

N’olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta;

Ire-ure nābà n’ọkpukpum nile, ọ bu kwa n’ọnọdum ka m’nāma jijiji:

Ka m’we zue ike rue ubọchi ahuhu,

Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n’usu ndi nāpunara madu ihe.

17 Asi na osisi fig adighi-ama ifuru,

Na ọ dighi ihe-ọmume di n’osisi vine;

Na ihe aluputara n’osisi olive ebilatawo,

Na ubi nile emeghi ihe-oriri;

Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n’ogige ewu na aturu,

Na ọ dighi ìgwè ehi di n’ulo ehi:

18 Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova,

M’gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.

19 Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem,

Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele,

Ọ bu kwa n’ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M’zọ ije.

Ọ diri Onye-isi Abù, n’ubọ-akwaram nile.

Categories
ZEFANAIA

ZEFANAIA 1

1 Okwu Jehova nke ruru Zefanaia nwa Kushi, nwa Gedalaia, nwa Amaraia, nwa Hezekaia, nti, n’ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda.

2 M’gēkpochapusi ihe nile n’elu uwa; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

3 M’gēkpochapu madu na anumanu; M’gēkpochapu anu-ufe nke elu-igwe, na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ nile, ha na ndi nēmebi iwu; M’gēbipu kwa madu n’elu uwa; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

4 M’gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M’gēbipu kwa ndi Beal fọduru n’ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile;

5 na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n’elu-igwe n’elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi;

6 na ndi si n’iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.

7 Dere du n’iru Onye-nwe-ayi Jehova: n’ihi na ubọchi Jehova di nso: n’ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ.

8 Ọ gēru kwa, n’ubọchi àjà Jehova, na M’gēji nmehie ndi-isi, ji kwa nmehie umu eze, ji kwa nmehie ndi nile nēyi uwe ala ọzọ, leta ha.

9 M’gēji kwa nmehie onye ọ bula nke nāmabiga nbata-uzọ leta ya n’ubọchi ahu, bú ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n’ihe-ike na aghughọ.

10 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n’ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n’obodo nke-abua, na oké ntiwa site n’ugwu ntà nile.

11 Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n’ihi na ndi Kenean nile alawo n’iyì: ebipuwo ndi nile eboro ọla-ọcha.

12 Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M’gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M’gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n’idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n’obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ.

13 Àkù-ha gāghọ kwa ihe apunaraworo ha, ulo nile ha gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu: e, ha gēwu ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ma ha agaghi-aṅu manya-vine-ha.

14 Oké ubọchi Jehova di nso, ọ di nso, ọ nēme kwa ngwa nke-uku: ge nti olu ubọchi Jehova; dike nēti nkpu di ilu n’ebe ahu.

15 Ubọchi nrubiga-ókè nke iwe ka ubọchi ahu bu, ubọchi ahuhu na nkpab͕u, ubọchi nke ime nkpọnkpọ-ebe na itọb͕ọrọ n’efu, ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri,

16 ubọchi opì-ike na iti-nkpu agha, imegide obodo nile ewusiri ike, na imegide ulo-nkuku nile di elu.

17 M’gēme kwa ka nkpà kpa madu, ha ewe jegharia dika ndi-ìsì, n’ihi na ọ bu Jehova ka ha mehieworo megide: agāwusi kwa ọbara-ha dika ájá, wusi kwa anu-aru-ha dika ǹsí.

18 Ọla-ọcha-ha ma-ọbu ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha anaputa n’ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ma agēji ọku nke ekworo-Ya ripia ala-ha nile: n’ihi na ngwusi, nke bu nání obi-ọlulọ-miri, ka Ọ gēme ka ndi nile bi n’ala nka gwusia.

Categories
ZEFANAIA

ZEFANAIA 2

1 Chikọtanu onwe-unu, e, chikọta dika ahihia-ọka, unu mba nke nēnweghi ihere;

2 tutu ukpuru amuputa nwa, (ubọchi agabigawo dika ib͕ob͕o-ọka), mb͕e ọnuma nke iwe Jehova akābiakwasighi unu, mb͕e ubọchi iwe Jehova akābiakwasighi unu.

3 Chọnu Jehova, unu nile ndi di ume-ala n’obi bi n’uwa, ndi luworo ihe O kpere n’ikpe; chọnu ezi omume, chọnu ume-ala-n’obi: eleghi anya agēzobe unu n’ubọchi iwe Jehova.

4 N’ihi na Geza gābu ebe arapuru arapu, Ashkelon gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu: Ashdod, n’etiti-ehihie ka agāchupu ya, agēropu kwa Ekron.

5 Ahuhu diri ndi bi n’akuku oké osimiri, bú mba ndi Keret! Okwu Jehova nēmegide unu, Kenean, ala ndi Filistia; M’gēme kwa ka i la n’iyì ghara inwe onye-obibi.

6 Akuku oké osimiri gābu kwa ebe-obibi ebe-obibi, bú ulo ntà nke ndi-ọzùzù-aturu na ogige ìgwè ewu na aturu.

7 Akuku oké osimiri gābu-kwa-ra ndi ulo Juda fọduru; n’elu ha ka ha gāzù igwè ewu na aturu-ha: n’ulo nile nke Ashkelon ka ha gāmakpu amakpu n’anyasi; n’ihi na Jehova, bú Chineke-ha, gēleta ha, me ka ndi-ha adọtara n’agha lata.

8 Anuwom ita-uta Moab, na nkwulu nile nke umu Amon, nke ha jiworo ta ndim uta, me onwe-ha uku megide ókè-ala-ha.

9 N’ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, puta), n’ezie Moab gādi ka Sọdọm, umu Amon gādi kwa ka Gọmọra, ihe-onwunwe nke akuba, na olùlù-nnú, na ebe tọb͕ọrọ n’efu rue mb͕e ebighi-ebi: ndim fọduru gāluta ihe-ha n’agha, ndi mbam fọduru gēketa kwa ha.

10 Nka ka ha gēnwe n’ihi npako-ha, n’ihi na ha atawo ndi Jehova nke usu nile nke ndi-agha uta, me onwe-ha uku imegide ha.

11 Onye di egwu ka Jehova gābu n’imegide ha: n’ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n’ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.

12 Unu onwe-unu kwa, bú ndi Etiopia, ndi mma-agham b͕uru eb͕u ka ha bu.

13 Ọ gēseti kwa aka-Ya imegide Ugwu, me ka Asiria la n’iyì; Ọ gēme kwa ka Nineve ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ala kpọrọ nku dika ọzara.

14 Ìgwè anumanu di iche iche gāmakpu amakpu n’etiti ya, anu-ọhia nile nke mba nile: ma okwolo ma ebinta gānọ ọnọdu-abali n’isi-ogidi-ya nile: ge nti olu-ha nābù abù nime window; ime-nkpọtu na nbata-uzọ: n’ihi na ebe eji osisi cedar wu ka Ọ b͕abaworo ọtọ.

15 Nka bu obodo ahu nke nāṅuri ọṅu-agha, nke nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n’obi-ya, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem: le otú ọ ghọworo ebe tọb͕ọrọ n’efu, ebe-nmakpu diri anu-ọhia! onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku ya gāma ọsọ, fegharia aka-ya.

Categories
ZEFANAIA

ZEFANAIA 3

1 Ahuhu diri obodo nke nēnupu isi, nke ruwo-kwa-ra árú, obodo ahu nke nēme ihe-ike!

2 Ọ geghi nti olu Chineke; ọ naraghi idọ-aka-na-nti; Jehova ka ọ nātukwasighi obi; Chineke-ya ka ọ nābiakuteghi nso.

3 Ndi-isi-ya n’etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n’ututu.

4 Ndi-amuma-ya bu ndi obi-ha nādighi n’otù ebe, ndi-nghọb͕u: ndi-nchu-àjà-ya emewo ka ihe nsọ ghara idi nsọ, ha emewo iwu ihe-ike.

5 Jehova bu onye ezi omume n’etiti ya; Ọ dighi-eme ajọ omume; kwa-ututu ka Ọ nēme ka ikpé-Ya puta ìhè, ọ dighi mb͕e Ọ nādighi; ma onye ajọ omume adighi-ama ihere.

6 Ebipuwom mba di iche iche, ulo-nkuku nile ha tọb͕ọrọ n’efu; emewom ka èzí nile ha buru nkpọnkpọ-ebe, onye-ngabiga we ghara idi: emebisiwo obodo nile ha, onye ọ bula we ghara idi, ha we ghara inwe onye-obibi.

7 Asirim, N’ezie i gātu egwum, i gānara idọ-aka-na-nti; ewe ghara ibipu ebe-obibi-ya, dika ihe nile si di nke M’jiworo leta ya: ma otú ọ di, ha biliri n’isi-ututu, bibie omume nile ha.

8 N’ihi nka cherenum, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), cherenu ubọchi mb͕e M’gēbili ọtọ ikwata ihe: n’ihi na ikpém bu ime ka mba nile zukọta, ka M’we chikọta ala-eze nile, iwusa ha oké iwem, bú ọnuma nile nke iwem; n’ihi na agēji ọku nke ekworom ripia uwa nka nile.

9 N’ihi na mb͕e ahu ka M’gāb͕anwere ndi nile di iche iche eb͕ub͕ere-ọnu di ọcha, ka ha nile we kpọkue aha Jehova, ifè Ya n’otù ùbú.

10 Site n’ofè osimiri nile nke Etiopia ka ndi-aririọm, bú ada ndim achusara achusa, gēburu onyinye-inata-iru-ọmam.

11 N’ubọchi ahu ka ihere omume-gi nile nāgaghi-eme gi, bú nke i jiworo jehie megidem: n’ihi na mb͕e ahu ka M’gēwezuga n’etiti gi ndi-gi nāṅuri ọṅu-agha nime npakọ, i gaghi-adi kwa npako ọzọ n’ugwu nsọm.

12 M’gēme kwa ka otù ndi ewedara n’ala nke nēnweghi kwa ike fọdu n’etiti gi, ha gāb͕abà kwa n’aha Jehova.

13 Ndi Israel fọduru agaghi-eme ajọ omume, ha agaghi-ekwu kwa okwu-agha; agaghi-ahu kwa ire aghughọ n’ọnu-ha: n’ihi na ndi ahu gāzù onwe-ha makpu kwa amakpu dika aturu, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.

14 Tie nkpu ọṅù, gi ada Zaion; tie nkpu, gi Israel; ṅuria, were obi nile ṅuria ọṅu-agha, gi ada Jerusalem.

15 Jehova ewezugawo ikpé-gi nile, Ọ chughachiwo onye-iro-gi: Eze Israel, bú Jehova, nọ n’etiti gi: i gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọzọ.

16 N’ubọchi ahu ka agāsi Jerusalem, Atula egwu: gi Zaion, ekwela ka aka-gi abua kuda.

17 Jehova, bú Chineke-gi, nọ n’etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n’aru gi, Ọ gedere du n’ihu-n’anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n’aru gi.

18 Ndi ọ nēwuta n’ihi mb͕e akara àkà ka M’gēme ka ha zukọta, bú ndi sitere na gi: bú obodo nke ibu eboro ya bu ita-uta.

19 Le, M’ganēmeso ndi ahu nile, bú ndi nēweda gi n’ala, na mb͕e ahu: M’gāzọputa kwa nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi, ọ bu kwa nwanyi nke achupuru achupu ka M’gāchikọta; M’gēme kwa ka ha ghọ otuto, ghọ kwa aha, bú ndi ihere-ha di n’uwa nka nile.

20 Na mb͕e ahu ka M’gēme ka unu bata, ọ bu kwa na mb͕e ahu ka M’gāchikọta unu: n’ihi na M’gēme ka unu ghọ aha, ghọ kwa otuto n’etiti ndi nile di iche iche nke uwa, mb͕e M’gēme ka ndi-unu adọtara n’agha lata n’anya-unu, ka Jehova siri.

Categories
HAGAI

HAGAI 1

1 N’arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n’ọnwa nke-isi, n’ubọchi mbu n’ọnwa, ka okwu Jehova si n’aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,

2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Ndi nka siri, Oge ibia erughi, bú oge iwu ulo Jehova.

3 Okwu Jehova we si n’aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si,

4 Ọ̀ bu oge unu nwere, unu onwe-unu, ibi n’ulo-unu amachitara osisi, mb͕e ulo a bu nkpọnkpọ ebe?

5 Ma ub͕u a, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n’uzọ nile unu.

6 Unu aghawo ọtutu nkpuru, ma nke-ntà ka unu webatara; unu nēri ihe, ma ọ dighi afọ juworo unu; unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ma ọ dighi nṅuju-afọ unu ṅujuworo; unu yiri uwe, ma ọ dighi okpom-ọku nēkpo madu; ọzọ, onye nāluta ugwọ-ọlu nāluta ugwọ-ọlu itiye n’akpa puru epu.

7 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n’uzọ nile unu.

8 Rigonu n’ugwu, bute osisi, wue ulo a, ọ gātọkwam utọ, agāsọpu-kwa-ram, ka Jehova siri.

9 Unu lere anya ihe bara uba, ma, le, ọ ghọrọ ihe ntà; mb͕e unu bulatara ya ulo, M’we fùsasia ya, N’ìhi gini? (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). N’ihi ulom, nke bu nkpọnkpọ ebe; ma unu onwe-unu nāb͕a ọsọ, onye ọ bula ọ b͕akuru ulo nke aka ya.

10 N’ihi nka ka elu-igwe nke di n’elu unu b͕ochiworo igirigi, ala eb͕ochiwo kwa ihe-omume-ya.

11 M’we kpọ oge ọkpukpọ-nku ka ọ dakwasi ala nka na ugwu-ya nile na ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya na ihe nile nke ala nēpuputa na madu na anumanu na ihe nile unu dọb͕uru onwe-unu n’ọlu inweta.

12 Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi Israel nile fọduru, we ge nti olu Jehova, bú Chineke-ha, ge kwa nti okwu nile nke Hagai, bú onye-amuma, dika Jehova, bú Chineke-ha, zitere ya; ndi Israel we tua egwu n’iru Jehova.

13 Hagai, bú onye-ozi Jehova, we gwa ndi Israel okwu n’ozi Jehova, si, Mu onwem nọyere unu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 Jehova we kpọte mọ Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, na mọ Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na mọ nke ndi Israel nile fọduru; ha we bia je ozi n’ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha,

15 n’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, n’ọnwa nke-isi, n’arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze.