Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 4

1 Le, ka ọla-edo si echu echu nke-uku! le, ka ọla-edo nke makarisiri nma si ab͕anwe!

Anāwusi nkume nile nke ebe nsọ n’isi èzí nile ọ bula.

2 Umu Zaion nke di oké ọnu-ahia, ndi eji turu ọla-edo anuchara anucha,

Le otú aguworo ha n’ite urọ, bú ọlu aka ọkpu-ite!

3 Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara:

Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n’ọzara.

4 Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n’okpo-ọnu-ya site n’akpiri-ikpọ-nku:

Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha.

5 Ndi nēri nání ihe utọ di iche iche tọb͕ọrọ n’efu n’èzí nile:

Ndi azùputaworo n’uwe uhie amakuwo ebe-ikpofu-ahihia.

6 Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm,

Nke akwaturu dika n’otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.

7 Ndi-Nazirait-ya di ọcha kari snow, ha nwuru enwu kari miri-ara-ehi,

Ha chara ọbara-ọbara n’aru kari ruby, dika sapphire ka udi-ha di.

8 Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n’èzí:

Akpukpọ-ha araparawo n’ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi.

9 Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo;

N’ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.

10 Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n’ite;

Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.

11 Jehova emezuwo ọmuma-Ya, Ọ wupuwo iwe-Ya di ọku;

O we suye ọku nime Zaion, o we ripia ntọ-ala-ya nile.

12 Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n’elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa,

Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n’ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.

13 O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya,

Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n’etiti ya.

14 Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n’èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,

Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.

15 Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:

Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n’etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n’ebe a.

16 Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ:

Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.

17 Anya-ayi nādala n’isi rue ub͕u a n’ile anya iye-aka efu ayi:

N’iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.

18 Ha achuwo ntá nzọ-ukwu nile ayi, ayi we ghara ijeghari n’amá nile ayi;

Ọgwugwu-ayi di nso, ubọchi nile ayi eruzuwo; n’ihi na ọgwugwu-ayi abiawo.

19 Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe:

N’elu ugwu nile ka ha churu ayi n’ọku ọku, n’ọzara ka ha chere ayi anwu.

20 Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n’olùlù-ha;

Onye ayi siri, N’okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n’etiti mba nile.

21 Ka obi nātọ gi utọ, ṅuria ọṅu, gi ada Edom, nke bi n’ala Uz:

Ọbuná gi ka iko gāgabigaru: i gāṅubiga manya ókè, b͕aba onwe-gi ọtọ.

22 Ajọ omume-gi agwusiwo, gi ada Zaion;

Ọ gaghi-eme kwa ọzọ ka i je biri n’ala ọzọ:

Ọ gēleta ajọ omume-gi, gi ada Edom;

Ọ gēkpughe nmehie-gi nile.

Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 5

1 Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru:

Legide anya, hu ita-uta-ayi.

2 Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ,

Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.

3 Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna,

Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.

4 Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua;

Nkú-ayi nābiara ayi n’ọnu-ahia.

5 Ọ bu inọkwasi n’olu-ayi ka achuworo ayi:

Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n’ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.

6 Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye,

Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.

7 Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;

Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.

8 Ndi-orù achiwo ayi:

Ọ dighi onye nānaputa ayi n’aka-ha.

9 Ayi ji ndu-ayi n’aka weta nri-ayi

N’ihi mma-agha nke ọzara.

10 Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku uku

Site n’ifufe di ọku nke oké ugwu.

11 Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n’ala,

Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n’obodo nile nke Juda.

12 Ekobere ndi-isi n’aka-ha:

Asọpughi iru ndi-okenye.

13 Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri,

Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n’okpuru nkú.

14 Ndi-okenye akwusiwo inọ n’ọnu-uzọ-ama,

Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.

15 Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo;

Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n’ib͕a-nkpe.

16 Okpu-eze nke isi-ayi adawo n’ala:

Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n’ihi na ayi emehiewo.

17 N’ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma;

N’ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.

18 N’ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n’efu;

Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.

19 Gi onwe-gi, Jehova, ọ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I nānọdu dika eze;

Oche-eze-Gi nādiru ọb͕ọ nile.

20 N’ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi?

N’ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?

21 Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa;

Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.

22 Ma-ọbughi na I jusiwo ayi,

Wesa ayi iwe nke-uku.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 1

1 O rue, n’arọ nke-orú-na-iri, n’ọnwa nke-anọ, n’ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nọ n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ n’akuku osimiri Keba, na emeghere elu-igwe, m’we hu ọhù di iche iche nke Chineke.

2 N’ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-ise nke emere ka Jehoiakim je biri n’ala ọzọ,

3 okwu Jehova ruru Ezikiel nwa Buzi, bú onye-nchu-àjà, nti n’ezie n’ala ndi Kaldea, n’akuku osimiri Keba; aka Jehova we di ya n’aru n’ebe ahu.

4 M’we hu, ma, le, oké ifufe nēsi n’Ugwu bia, oké igwe-oji, na ọku nke nānwude onwe-ya mb͕e nile, onwunwu di-kwa-ra ya buruburu, ọ bu kwa n’etiti ya, bú n’etiti ọku ahu, ka ihe dika amber n’ile ya anya nēb͕upu.

5 Ọzọ, n’etiti ya ka oyiyi nke ihe anọ di ndu si puta. Ma nka bu ka ha si di n’ile ha anya; oyiyi madu ka ha nwere.

6 Ọzọ, iru anọ ka onye ọ bula nime ha nwere, ọ bu kwa nkù anọ ka onye ọ bula nime ha nwere.

7 Ọzọ, ukwu nile ha bu ukwu guzoziri eguzozi; ọzọ, ọbu-ukwu nke ukwu nile ha di ka ọbu-ukwu nwa-ehi: ha neb͕u kwa maramara dika ib͕u-maramara ọla akwọchara akwọcha.

8 Ha nwe-kwa-ra aka madu n’okpuru nkù-ha n’akuku anọ ha: ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha diri ha anọ otú a;

9 ihe ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ka nkù nile ha bu; ha adighi-agha anya n’azu mb͕e ha nāga; ha nāga n’iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya.

10 Ma oyiyi iru nile ha, iru madu ka ha nwere; iru ọdum ka ha anọ nwe-kwa-ra n’aka-nri; iru ehi ka ha anọ nwe-kwa-ra n’aka-ekpe; iru ugo ka ha anọ nwe-kwa-ra.

11 Ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha kewara ekewa site n’elu; onye ọ bula nwere nkù abua ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ma nkù abua nēkpuchi aru-ha.

12 Ọzọ, ha nāga n’iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya: ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; ha adighi-agha anya n’azu mb͕e ha nāga.

13 Ma oyiyi nke ihe anọ ahu di ndu, ka ha si di n’ile ha anya, ha di ka icheku ọku nēre ọku, dika ọwa n’ile ha anya; ọku ahu nāga iru na azu n’etiti ihe anọ ahu di ndu: onwunwu di-kwa-ra ọku ahu, àmùmà nēsi kwa n’ọku ahu b͕uputa.

14 Ihe anọ ahu di ndu nāb͕a ọsọ nālaghachi kwa dika ob͕ub͕u-àmùmà si di n’ile ya anya.

15 M’we hu ihe anọ ahu di ndu, ma, le, otù wheel di n’ala n’akuku ihe ọ bula n’ihe anọ ahu di ndu, diri iru anọ ya n’otù n’otù.

16 Ka wheel nile ahu na otú emere ha si di n’ile ha anya, ha di ka ib͕u-maramara nkume beryl: ọ bu kwa otù oyiyi ka ha anọ nwere: ka ha na otú emere ha si di n’ile ha anya, ha di ka agāsi na ọ bu wheel n’etiti wheel.

17 Ọ bu n’akuku anọ ha ka ha nāga mb͕e ha nāga: ha adighi-agha anya n’azu mb͕e ha nāga.

18 Ma azu wheel nile ha, ha di elu, ha di kwa egwu; azu wheel nile ha juputara n’anya anya buruburu ha anọ.

19 Ma mb͕e ihe anọ ahu di ndu nāga, wheel-ha nāga n’akuku ha: ọzọ, mb͕e anēsi n’elu uwa buli ihe anọ ahu di ndu, anēbuli wheel-ha.

20 Ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; n’ebe ahu ka Mọ Chineke nwere ije: anēbuli kwa wheel-ha n’akuku ha: n’ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha.

21 Mb͕e ihe anọ ahu nāga, wheel nāga; ọ bu kwa mb͕e ihe anọ ahu nēguzo ka wheel nēguzo; ọ bu kwa mb͕e anēsi n’elu uwa bulie ihe anọ ahu ka anēbuli wheel-ha n’akuku ha: n’ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha.

22 Ọzọ, oyiyi nke mbara-ígwé di n’elu isi ihe ahu di ndu, dika ib͕u-maramara crystal di egwu si di, nke esetiri eseti n’elu isi-ha n’elu.

23 Ọzọ, n’okpuru mbara-ígwé ahu nkù nile ha guzoziri eguzozi, otù n’ebe ibe-ya di: ha nile n’otù n’otù nwere nkù abua nke nēkpuchi aru-ha n’otù akuku, ha nile n’otù n’otù nwe-kwa-ra nkù abua nke nēkpuchi aru-ha n’akuku ọzọ.

24 Mb͕e ha nāga m’we nu olu nkù nile ha, dika olu ọtutu miri, dika olu nke Onye puru ime ihe nile, olu nkpọtu dika olu ọmuma-ulo-ikwū: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha.

25 Olu we di n’elu mbara-ígwé ahu nke di n’elu isi-ha: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha.

26 Ọzọ, n’elu mbara-ígwé ahu nke di n’elu isi-ha oyiyi nke oche-eze di, dika nkume sapphire si di n’ile ya anya: ọzọ, n’elu oyiyi oche-eze ahu otù oyiyi di, nke di ka madu si di n’ile ya anya, n’elu oche-eze ahu n’elu.

27 M’we hu ihe di ka ib͕u-maramara amber, ihe di ka ọku si di n’ile ya anya nke di nime ya buruburu, site n’ihe bu úkwù-ya n’ile ya anya we rigo elu; ọzọ, site n’ihe bu úkwù-ya n’ile ya anya we ridata ahurum ihe nke di ka ọku si di n’ile ya anya, onwunwu-ọku di-kwa-ra ya buruburu.

28 Dika eke-na-ogwurugwu si di n’ile ya anya, bú nke di n’igwe-oji n’ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n’ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n’ile ya anya. M’we hu ya, da kpue irum n’ala, m’we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 2

1 Ọ we sim, Nwa nke madu, guzo n’ukwu-gi abua, M’gāgwa kwa gi okwu.

2 Mọ Chineke we bata nimem mb͕e Ọ gwaram okwu, we me ka m’guzo n’ukwum abua; m’we nu otù Onye nāgwam okwu.

3 O we sim, Nwa nke madu, Mu onwem nēziga gi jekuru umu Israel, jekuru mba di iche iche ndi nānupu isi, ndi nupuworo isi n’okpurum: ha onwe-ha na ndi bu nna-ha ejehiewo megidem, rue n’ubọchi nke ta.

4 Umu-ha bu kwa ndi nēnweghi ihere n’iru, ndi obi-ha di ike; Mu onwem nēziga gi jekuru ha: i gāsi kwa ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri.

5 Ma ha onwe-ha, ma ha gānu, ma ha gāghara, (n’ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu,) ha gāmara na onye-amuma anọwo n’etiti ha.

6 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, atula egwu ha, atu-kwa-la egwu okwu nile ha, asi na ogwu na uke di n’ebe i nọ, asi kwa na ọ bu n’etiti akpi ka i bi: atula egwu okwu nile ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n’ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

7 I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n’ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu.

8 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, nu ihe Mu onwem nāgwa gi; abula onye nānupu isi dika ulo ahu nke nānupu isi: saghepu ọnu-gi, rie ihe ahu nke Mu onwem nēnye gi.

9 M’we hu, ma, le, otù aka nke esetipuru nyem; ma, le, nime ya ka akwukwọ-npiakọta di;

10 O we b͕asa ya n’irum; ma edere ya-ri ihe n’iru na azu: ma ihe edere ya-ri nime ya bu abù-ákwá di iche iche, na isu-udè, na ahuhu.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 3

1 O we sim, Nwa nke madu, ihe ahu nke i nāhu, rie ya; rie akwukwọ-npiakọta ahu, je, gwa ulo Israel okwu.

2 M’we saghepu ọnum, O we me ka m’rie akwukwọ-npiakọta ahu.

3 O we sim, Nwa nke madu, me ka afọ-gi rie, ọ bu kwa ngiri-afọ-gi nile ka i gēmeju n’akwukwọ-npiakọta nka nke Mu onwem nēnye gi. M’we rie; o we di n’ọnum dika manu-aṅu n’utọ.

4 O we sim, Nwa nke madu, je, ba n’ulo Israel, were okwum nile gwa ha.

5 N’ihi na ọ bughi ijekuru ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́ ka ezigaworo gi onwe-gi, ma ọ bu ijekuru ulo Israel;

6 ọ bughi ijekuru ọtutu ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́, ndi i dighi-anu okwu-ha. N’ezie, ọ buru na ọ bu ha ka M’zigara gi jekuru, ha onwe-ha gēge gi nti.

7 Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n’ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n’ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu.

8 Le, emewom iru-gi ka ọ di ike megide iru-ha, ọ bu kwa egedege-iru-gi ka M’meworo ka ọ di ike megide egedege-iru-ha.

9 Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M’meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n’ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

10 O we sim, Nwa nke madu, okwum nile nke M’gāgwa gi, nara ha n’obi-gi, nuru kwa ha na nti-gi abua.

11 Je kwa, bakuru ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bakuru umu ndi-gi, gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; ma ha gānu, ma ha gāghara.

12 Mọ Chineke we buliem, m’we nu olu nke oké ùzù n’azum, si, Ihe agọziworo agọzi ka ebube Jehova bu site n’ọnọdu-Ya.

13 M’we nu olu nke nkù nile nke ihe anọ ahu di ndu ka ha nēmeturita ibe-ha, na olu wheel nile nke di n’akuku ha, ọbuná olu nke oké ùzù.

14 Mọ Chineke we buliem, bupum: m’we jegharia n’ilu obi, n’ọnuma nke mọm, ọzọ, aka Jehova nke di n’arum di ike.

15 M’we biakute ndi ahu emere ka ha je biri n’ala ọzọ, na Tel-abib, bú ndi bi n’akuku osimiri Keba, m’we biarue ebe ha onwe-ha bi; m’we nọdu n’ebe ahu ubọchi asa n’anya o nējum n’etiti ha.

16 O rue, n’ọgwugwu ubọchi asa, na okwu Jehova rurum nti, si,

17 Nwa nke madu, Onye-nche ka M’doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n’ọnum, dọ ha aka na nti site nam.

18 Mb͕e M’nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; ma i dọghi ya aka na nti, i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n’uzọ nmebi-iwu ya puta, ime ka ọ di ndu; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n’ajọ omume-ya; ma n’aka-gi ka M’gājuta ọbara-ya.

19 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti, ma o sighi na nmebi-iwu-ya na n’uzọ nmebi-iwu ya chigharia, onye ahu gānwu n’ajọ omume-ya; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.

20 Ọzọ, mb͕e onye ezi omume si n’ezi omume-ya chigharia, we me ajọ omume, M’we tiye ihe-isu-ngọngọ n’iru ya, onye ahu gānwu; n’ihi na i dọghi ya aka na nti, ọ bu na nmehie-ya ka ọ gānwu, agaghi-echeta kwa ezi omume-ya nile nke o meworo; ma n’aka-gi ka M’gājuta ọbara-ya.

21 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ ya, bú onye ezi omume, aka na nti, ka onye ezi omume ghara imehie, onye ahu we ghara imehie, ọ ghaghi idi ndu, n’ihi na adọrọ ya aka na nti; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.

22 Aka Jehova we dim n’aru n’ebe ahu; O we sim, Bilie, pua, jerue ndagwurugwu, n’ebe ahu ka M’gākpayere gi uka.

23 M’we bilie, pua, jerue ndagwurugwu ahu: ma, le, n’ebe ahu ka ebube Jehova nēguzo, dika ebube nke m’huru n’akuku osimiri Keba: m’we da kpue irum n’ala.

24 Mọ Chineke we bata nimem, me ka m’guzo n’ukwum abua; O we kpayerem uka, sim, Bia, mechibido onwe-gi uzọ n’etiti ulo-gi.

25 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, le, ha gātukwasi gi udọ̀ n’aru, chiri ha ke gi ab͕u, i gaghi-apu kwa n’èzí n’etiti ha:

26 M’gēme kwa ka ire-gi rapara n’okpo-ọnu-gi, i we ghọ ob͕i, ghara iburu ha onye nādọ aka na nti: n’ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

27 Ma mb͕e M’nākpayere gi uka, M’gēmeghe ọnu-gi, i we si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye nānu anu, ya nu; onye nāghara aghara, ya ghara: n’ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 4

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n’onwe-gi otù brick, tọb͕ọ ya n’iru gi, kà otù obodo n’elu ya, bú Jerusalem:

2 tiye ihe-nnọchigide-n’agha imegide ya, wue ulo-agha imegide ya, wukọta obo-ihe imegide ya; tiye ọmuma-ulo-ikwū di iche iche imegide ya, do ihe di iche iche itipú mb͕idi imegide ya buruburu.

3 Gi onwe-gi were kwa n’onwe-gi ite ígwè ighe ihe, tiye ya ka ọ buru mb͕idi ígwè n’etiti gi na obodo ahu: che ya iru, ewe nānọchigide ya n’agha, i gānọchigide kwa ya n’agha. Ihe-iriba-ama ka ọ gāburu ulo Israel.

4 Ọzọ, gi onwe-gi were akuku aka-ekpe gi dina ala, tukwasi-ya ajọ omume ulo Israel: ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke i gēwere ya dina ala, i gēbu ajọ omume-ha.

5 Ma Mu onwem, edoworom i arọ nile nke ajọ omume-ha ibu ọnu-ọgugu ubọchi, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri: i gēbu kwa ajọ omume nke ulo Israel.

6 Ọzọ, mb͕e i dinazuworo ubọchi ndia, i gēwere kwa akuku aka-nri gi dina ala, we buru ajọ omume nke ulo Juda: ọgu ubọchi abua, otù ubọchi n’ọnọdu otù arọ, ka M’nyeworo gi.

7 Ọ bu kwa n’ebe nnọchigide Jerusalem n’agha ahu di ka i gēche iru-gi, ogwe-aka-gi ab͕awo kwa ọtọ; i gēbu kwa amuma megide ya.

8 Ma, le, atukwasim i udọ̀, i we ghara isi n’otù akuku-aru-gi chighari n’akuku-aru-gi ọzọ, rue mb͕e i dinazuworo ubọchi nile nke nnọchigide-n’agha-gi.

9 Ọzọ, gi onwe-gi were n’onwe-gi ọka wheat, na ọka barley, na akidi, na lentil, na ọka millet, na spelt, tiye ha n’otù ihe, were ha mere onwe-gi achicha; ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke gi onwe-gi were akuku-gi dina ala, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri, ka i gēri ya.

10 Ọzọ, ihe-oriri-gi nke i gēri, aganātù ya atù, orú shekel gādiri otù ubọchi: site n’otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gēri ya.

11 Ọ bu kwa miri nke anātù atù ka i gāṅu, otù uzọ n’uzọ iri nke otù hin: site n’otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gāṅu ya.

12 Ọzọ, dika ob͕e achicha barley ka i gēri ya, achicha ahu ka i gēji kwa ǹsí madu nyuru sie n’anya-ha.

13 Jehova we si, Ọbuná otú a ka umu Israel gēri nri-ha ruru árú, n’etiti mba nile ebe M’gāchuga ha.

14 M’we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: erighkwam ihe nwuru n’onwe-ya, ma-ọbu ihe anu dọb͕uru, site na mb͕e m’di na nwata we rue ub͕u a; ọ dighi kwa anu nke bu ihe-árú bàworo n’ọnum.

15 O we sim, Le, enyewom i ǹsí ehi n’ọnọdu ǹsí madu, i gēme kwa achicha-gi n’elu ya.

16 O we sim, Nwa nke madu, le, M’gaje ib͕aji nkpa-n’aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n’ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n’ọtùtù na n’anya ọ nēju ha:

17 ka nri na miri we kọ ha, ka o we ju kwa ha anya, otù onye n’aru ibe-ya, ha ewe ta aru n’ajọ omume-ha.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 5

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n’onwe-gi mma-agha di nkọ, dika aguba nke ndi nākọpu isi ka i gēwere ya n’onwe-gi, i gēme kwa ka ọ gabiga n’isi-gi na n’afu-ọnu-gi: i gēwere kwa n’onwe-gi ihe-ọtùtù itù atù, ke agiri-isi na afu-ọnu ahu.

2 Otù uzọ n’uzọ atọ ka i gēji ọku sure n’etiti obodo ahu, mb͕e ubọchi nile nke nnọchigide-n’agha ahu zuru ezu; i gēwere kwa otù uzọ n’uzọ atọ, were mma-agha ahu tie ya buruburu obodo ahu; otù uzọ n’uzọ atọ ka i gēfesara ifufe, ọ bu kwa mma-agha ka M’gāmiputa n’azu ha.

3 I gēweputa kwa n’ebe ahu agiri-isi di ole-na-ole n’ọnu-ọgugu, ke ha n’ọnu-ọnu-ala nke uwe-nwuda-gi.

4 Ọ bu kwa nime ndia ka i gēweputa kwa ufọdu ọzọ, tubà ha n’etiti ọku ahu, sure ha n’ọku; nime ya ka ọku gēsi pukuru ulo Israel nile.

5 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Nka bu Jerusalem: n’etiti mba nile ka M’doworo ya, ala di iche iche di kwa ya buruburu.

6 O we nupu isi n’okpuru ikpém nile n’imebi iwu kari mba nile, na n’okpuru ukpurum nile karia ala nile nke di ya buruburu: n’ihi na ikpém nile ka ha juworo, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha.

7 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, ji si otú a: N’ihi na unu nātu ùzù kari mba nile nke di unu buruburu, unu we ghara ijeghari n’ukpurum nile, ghara kwa ime ihe nile M’kpere n’ikpe, ọ bughi kwa dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo;

8 n’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, ọbuná Mu onwem; M’gēme kwa ihe nile nke ekpere n’ikpe n’etiti gi n’anya mba nile.

9 M’gēme kwa nime gi ihe ahu nke M’nēmeghi na mb͕e gara aga, nke M’nāgaghi-eme kwa ihe di ka ya ọzọ, n’ihi ihe-árú-gi nile.

10 N’ihi nka ka ndi bu nna gēri umu-ha n’etiti gi, umu gēri kwa ndi bu nna-ha; M’gēme kwa ihe nile ekpere n’ikpe nime gi, M’gāb͕asa kwa ndi-gi nile fọduru nye ifufe nile.

11 N’ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), n’ihi na ebe nsọm ka i meruworo n’ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n’ihe-árú-gi nile, n’ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko.

12 Otù uzọ n’uzọ atọ nime gi gānwu site n’ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n’oké unwu ka ha gāgwusi n’etiti gi; otù uzọ n’uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n’uzọ atọ ka M’gāb͕asa nye ifufe nile, M’gāmiputa kwa mma-agha n’azu ha.

13 Ewe mezue iwem, M’gēme kwa ka ọnumam zuru ike n’aru ha, ewe kasiem obi: ha gāmara kwa na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu n’ekworom, mb͕e M’gēmezuwori ọnumam n’aru ha.

14 Ọzọ, M’gēme gi ka i ghọ nkpọnkpọ ebe na ihe-ita-uta, n’etiti mba nile nke di gi buruburu, n’anya onye ọ bula nke nāgabiga.

15 Ọ gābu-kwa-ra mba nile nke di gi buruburu ihe-ita-uta, na ihe-nkwulu, na ihe-idọ-aka-na-nti, na ihe-iju-anya, mb͕e M’gēme ihe nile ekpere n’ikpe nime gi n’iwe, na n’ọnuma, na n’iba-nba nile nke ọnuma: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo:

16 mb͕e M’gēziga àkú ọjọ nile nke oké unwu n’etiti ha, bú àkú nke diri nbibi, nke M’gēziga ibibi unu; ọ bu kwa oké unwu ka M’gātukwasiri unu, M’we b͕ajiere unu nkpa-n’aka, bú achicha;

17 M’gēzikwasi kwa unu oké unwu na ajọ anu-ọhia, ha gāb͕aba kwa unu aka nwa; ajọ ọria nēfe efe na ọbara gāgabiga kwa n’etiti gi; ọ bu kwa mma-agha ka M’gēme ka ọ biakwasi gi: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 6

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, che iru-gi n’ugwu nile nke Israel, bu amuma megide ha,

3 si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile: Le, Mu onwem nēme ka mma-agha biakwasi unu, M’gēme kwa ka ha la n’iyì, bú ebe nile unu nke di elu.

4 Agēme kwa ka ebe-ichu-àjà nile unu tọb͕ọrọ n’efu, agētipia kwa arusi-anyanwu nile unu: M’gēme kwa ka ndi-unu eb͕uru eb͕u da n’iru arusi nile unu.

5 M’gātọb͕ọ kwa ozu nile nke umu Israel n’iru arusi nile ha; M’gātusa kwa ọkpukpu-unu buruburu ebe-ichu-àjà nile unu.

6 N’ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n’efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n’efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu.

7 Onye eb͕uru eb͕u gāda kwa n’etiti unu, unu we mara na Mu onwem bu Jehova.

8 Ma M’gēme ka madu ufọdu fọdu, ọ bu na unu gēnwe ndi b͕apuru na mma-agha n’etiti mba nile, mb͕e unu gāb͕asa n’ala nile.

9 Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n’etiti mba nile ebe adọtara ha n’agha, mb͕e M’tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n’ebe M’nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n’iru ha n’ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n’ihe-árú nile ha.

10 Ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: ọ bughi n’efu ka M’kwuworo okwu, si na M’gēme ha ihe ọjọ a.

11 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Kua ọbu-aka-gi, zọ kwa ukwu-gi n’ala, si, Éwù! n’ihi ihe-árú ọjọ nile nke ulo Israel: n’ihi na ha gēsite na mma-agha, site kwa n’oké unwu, site kwa n’ajọ ọria nke nēfe efe, da.

12 Onye nọ n’ebe di anya gēsite n’ajọ ọria nēfe efe nwua; onye nọ nso gēsite na mma-agha da; onye fọduru nke anānọchigide kwa n’agha gēsite n’oké unwu nwua: M’we mezue ọnumam n’aru ha.

13 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e ndi-ha eb͕uru eb͕u di n’etiti arusi nile ha buruburu ebe-ichu-àjà nile ha, n’ugwu ntà ọ bula di elu, na n’elu ugwu nile, na n’okpuru osisi ndu ọ bula, na n’okpuru osisi terebinth ọ bula b͕ara ọhia, bú ebe ha nyere arusi nile ha ihe ísì utọ.

14 M’gēseti kwa akam n’aru ha, me ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu na ihe-iju-anya, site n’ọzara rue Dibla, n’ebe-obibi nile ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 7

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ala Israel, Ọgwugwu: ọgwugwu abiakwasiwo nkuku anọ nke ala-unu.

3 Ub͕u a ka ọgwugwu dikwasi gi, M’gēzite kwa iwem n’aru gi, kpe gi ikpe dika uzọ-gi nile si di; M’gētiyekwasi kwa gi ihe-árú-gi nile.

4 Anyam agaghi-eme-kwa-ra gi ebere, M’gaghi-enwe kwa ọmiko: kama uzọ nile gi ka M’gētiyekwasi gi, ihe-árú-gi nile gādi kwa n’etiti gi: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

5 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ihe ọjọ, otù ihe ọjọ; le, ọ biawo.

6 Ọgwugwu abiawo, ọgwugwu ahu abiawo, o tetawo n’ebe i nọ; le, ọ nābia.

7 Chi-ọbubọ abiakutewo gi, gi onye bi n’ala ahu: mb͕e nke gi abiawo, ubọchi nke gi di nso; ọ bu ọb͕ub͕a-aghara, ọ bughi iti-nkpu-ọṅù, n’elu ugwu-gi nile.

8 Ub͕u a na nwa mb͕e ntà ka M’gāwukwasi gi ọnumam, mezu kwa iwem imegide gi, kpe gi ikpe dika uzọ-gi nile si di; M’gētiyekwasi kwa gi ihe-árú-gi nile.

9 Anyam agaghi-enwe kwa ebere, M’gaghi-enwe kwa ọmiko: dika uzọ-gi nile si di ka M’gētiyekwasi gi ihe, ihe-árú-gi nile gādi kwa n’etiti gi; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, nētib͕u.

10 Le, ubọchi ahu, le, ọ nābia: chi-ọbubọ-gi aputawo; nkpa-n’aka ab͕awawo okoko, nganga amawo ifuru.

11 Ihe-ike ebiliwo ibu nkpa-n’aka nke nmebi-iwu; ọ dighi nke gāfodu nime ha, ma-ọbu nime ìgwè madu-ha, ma-ọbu nime ihe-ha: ọkaka adighi kwa n’etiti ha.

12 Mb͕e ahu abiawo, ubọchi ahu eruwo nso: ka onye nāzu azu ghara iṅuri ọṅu, ka onye nēre ere ghara kwa iru újú: n’ihi na iwe di ọku diri ìgwè madu-ya nile.

13 N’ihi na onye nēre ere agaghi-alaghachikute ihe erere, ọ bu ezie na ndu-ha nādi kwa n’etiti ndi di ndu: n’ihi na ọhù ahu diri ìgwè madu-ya nile, ọ gaghi-alaghachi; ọ dighi kwa onye ọ bula gēji ajọ omume nke ndu-ya me onwe-ya ka ọ di ike.

14 Ha afùwo opì-ha, dozie ihe nile; ma ọ dighi onye nēje agha: n’ihi na iwem nke di ọku nēmegide ìgwè madu-ya nile.

15 Mma-agha di n’èzí, ajọ ọria nke nēfe efe na oké unwu di kwa n’ulo: onye nọ n’ọhia gānwu na mma-agha; ọzọ, onye nọ n’obodo, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gērichapu ya.

16 Ma ndi-ha b͕apuru ab͕apu gāb͕apu, nọ n’ugwu nile dika nduru nke ndagwurugwu, ha nile nēkwo ákwá, onye ọ bula n’ajọ omume-ya.

17 Aka nile gākuda, ikperè nile gābu nání miri miri.

18 Ha gēke kwa ákwà-nkpe n’úkwù-ha, oké ọma-jijiji gēkpuchi kwa ha; ọ bu kwa iru nile ka ihere gēme, n’isi nile ha ka nkwọcha-isi gādi kwa.

19 Ọla-ọcha-ha ka ha gātufu n’èzí nile, ọla-edo-ha gāghọ kwa ihe-isọ-nsọ; ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha n’ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ha agaghi-eme ka afọ ju nkpuru-obi-ha, ha agaghi-emeju kwa ngiri-afọ-ha: n’ihi na ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ọ buworo.

20 Ma ima-nma nke ihe-ichọ-nma-ya, na nbili-elu ka o doro ya: ma onyinyo di iche iche nke ihe-árú nile ha na nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha ka ha mere nime ya: n’ihi nka ka M’meworo ya ka ọ ghọrọ ha ihe-isọ-nsọ.

21 M’gēnye kwa ya n’aka ndi ala ọzọ ibu ihe-nluta-n’agha, M’gēwere kwa ya nye ndi-nmebi-iwu nke uwa ibu ihe-nkwata; ha gēmeru kwa ya.

22 M’gēsi kwa n’ebe ha nọ chigharia irum, ha gēme kwa ka ebe-nzuzom ghara idi nsọ: ndi nēme ihe-ike gābà kwa nime ya, me ka ọ ghara idi nsọ.

23 Me iyab͕a ahu: n’ihi na ala ahu juputara n’ikpé ọbara, obodo ahu juputa-kwa-ra n’ihe-ike.

24 M’gēme kwa ka ndi ọjọ nke mba di iche iche bia, ha ewe nweta ulo nile ha: M’gēme kwa ka npako nke ndi di ike kwusi; agēme kwa ka ebe nsọ nile ha ghara idi nsọ.

25 Nkpà abiawo; ha gāchọ kwa udo, ma ọ dighi.

26 Nbibi gēsochi nbibi bia, akukọ gānọchi kwa akukọ; ha gāchọ kwa ọhù n’aka onye-amuma; ma iwu gālanari onye-nchu-àjà n’iyì, ndum-ọdu gālanari kwa ndi-okenye n’iyì.

27 Eze-ha gēru kwa újú, onye-isi gēyiri itọb͕ọ-n’efu dika uwe, aka nile nke ndi ala ahu gāma kwa jijiji: dika uzọ-ha si di ka M’gēme ha, M’gēji kwa ikpé nile ha kpe ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Categories
EZIKIEL

EZIKIEL 8

1 O rue, n’arọ nke-isi, n’ọnwa nke-isi, n’ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n’ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n’irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n’ebe ahu.

2 M’we hu, ma, le, oyiyi dika ọku si di n’ile ya anya; site n’ihe bu úkwù-Ya n’ile ya anya we ridata, ọ bu ọku: ọzọ, site n’úkwù-Ya we rigo elu, ọ di ka onwunwu-ìhè si di n’ile ya anya, dika ib͕u-maramara amber.

3 O we setipu udi aka madu, jidem n’agiri-isi nke isim; Mọ Chineke we buliem elu n’etiti ala na elu-igwe, me ka m’bata Jerusalem n’ọhù nke Chineke, rue oghere nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche Ugwu iru; ebe ọnọdu ihe-oyiyi nke ekworo di, bú nke nākpasu ekworo.

4 Ma, le, n’ebe ahu ka ebube nke Chineke nke Israel di, dika ihe-ọhuhu ahu nke m’huru na ndagwurugwu.

5 O we sim, Nwa nke madu, biko, welie anya-gi le n’uzọ Ugwu. M’we welie anyam abua le n’uzọ Ugwu, ma, le, n’akuku Ugwu nke ọnu-uzọ-ama nke ebe-ichu-àjà ka ihe-oyiyi a nke ekworo di nime nbata.

6 O we sim, Nwa nke madu, Gì onwe-gi nāhu ihe ha onwe-ha nēme? bú ihe-árú nile di uku nke ulo Israel nēme n’ebe a, ka M’we si n’ebe nsọm je n’ebe di anya? ma i gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche.

7 O we me ka m’biarue ọnu-uzọ ogige ahu; m’we hu, ma, le, otù oghere di na mb͕idi ogige.

8 O we sim, Nwa nke madu, biko, gwue na mb͕idi a: m’we gwue na mb͕idi ahu, ma, le, otù ọnu-uzọ.

9 O we sim, Ba, hu ihe-árú ọjọ nile nke ha onwe-ha nēme n’ebe a.

10 M’we ba, hu; ma, le, udi nile ọ bula nke ihe nākpu akpu, na anumanu nke bu ihe-árú, na arusi nile nke ulo Israel, di, akàra na mb͕idi ahu buruburu n’ebe nile.

11 Ma ọgu ndikom atọ na iri nime ndi-okenye nke ulo Israel nēguzo n’iru ha, Jeazanaia nwa Shefan nēguzo kwa n’etiti ha, onye ọ bula o jide ihe-ya iji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’aka-ya; ísì utọ nke igwe-oji nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure we rigo.

12 O we sim, Nwa nke madu, ì huwo ihe ndi-okenye nke ulo Israel nēme n’ọchichiri, onye ọ bula n’ime-ulo nile nke ihe o mere ka ha yie ihe? n’ihi na ha nāsi, Ọ dighi Jehova nāhu ayi; Jehova arapuwo ala-ayi.

13 O we sim, I gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche nke ha onwe-ha nēme.

14 O we me ka m’biarue oghere ọnu-uzọ-ama nke ulo Jehova nke di n’akuku Ugwu; ma, le, n’ebe ahu ka ndinyom nānọdu ala nākwara Tamuz ákwá.

15 O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? i gāhu kwa ihe-árú ọzọ di iche iche nke di uku kari ndia.

16 O we me ka m’ba nime ogige di nime nke ulo Jehova, ma, le, n’ọnu-uzọ ulo uku nke Jehova, n’etiti uzọ-nbata na ebe-ichu-àjà, ka ihe ra ka orú ndikom na ise nọ, b͕akuta ulo uku nke Jehova azu-ha, che iru-ha n’akuku Iru-anyanwu; ndi ahu nākpọ kwa isi ala nye anyanwu che Iru-anyanwu iru.

17 O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? Ọ̀ buru ulo Juda ihe di nfe ime ihe-árú nile nke ha meworo n’ebe a? n’ihi na ha emejuwo ala-ha n’ihe-ike, we chigharia ikpasum iwe; ma, le, ha nēsetipu alaka rue imi-ha.

18 Ma Mu onwem gēmeso kwa ha n’ọnuma: anyam agaghi-enwe ebere, M’gaghi-enwe kwa ọmiko: ọ buru kwa na ha akpọ nkpu na ntim abua n’oké olu, ma M’gaghi-anu olu-ha.