Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 6

1 Laghachinu n’ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n’etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n’elu Bet-hakarem: n’ihi na ihe ọjọ si n’Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.

2 Nwayi ahu nke mara nma nke di kwa pekepeke, bú ada Zaion, ka M’gēme ka ọ la n’iyì.

3 Ya ka ndi-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ha gābiaru; ha ga-ama ulo-ikwū-ha n’akuku ya buruburu; ha gāzù aturu-ha, onye ọ bula n’ọnọdu nke aka ya.

4 Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n’etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n’ihi na chi eruruwo, n’ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha.

5 Bilienu, ka ayi rigo n’abali, ka ayi bibie ulo-elu-ya nile.

6 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n’etiti ya.

7 Dika olùlù-miri si asuputa miri-ya, otú a ka obodo ahu suputaworo ihe ọjọ ya: ihe-ike na ipunara-madu-ihe ka anānu nime ya; n’irum mb͕e nile ka ọria na ọnyá-ntiputa di.

8 Ka adọ gi aka na nti, Jerusalem, ka nkpuru-obim we ghara ikewapu n’ebe i nọ; ka M’we ghara ime gi ebe tọb͕ọrọ n’efu, ala onye ọ bula nēbighi.

9 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ha gātutukọsi ndi Israel fọduru dika esi atutukọ nkpuru-vine fọduru: seghachi aka-gi dika ọghọ-nkpuru-vine n’elu alaka nile.

10 Ònye ka M’gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.

11 Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n’aru umu-ntakiri n’èzí, na n’aru ìzù umu-okorọbia n’otù: n’ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n’ubọchi ndu-ya.

12 Agēme kwa ulo nile ha ka ha ghọ ihe ndi ọzọ, ubi-ha na ndinyom-ha n’otù: n’ihi na M’gēseti akam n’aru ndi bi n’ala nka, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

13 N’ihi na site n’onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku; ọzọ, site n’onye-amuma we rue onye-nchu-aja onye ọ bula nēme ihe n’ugha.

14 Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.

15 Ọ̀ di ihere mere ha mb͕e ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n’ọnọdu-ihere ha mara: n’ihi nka ha gāda n’etiti ndi nāda ada: na mb͕e M’letara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.

16 Otú a ka Jehova siri, Guzonu n’uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.

17 Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti.

18 N’ihi nka nurunu, unu mba nile, mara kwa, unu nzukọ, ihe di n’etiti ha.

19 Nuru, gi uwa: le, Mu onwem nēme ka ihe ọjọ biakwasi ndi nka, bú nkpuru nke èchìchè nile ha, n’ihi na okwum nile ka ha nāṅaghi nti; iwum kwa, ha ajuwo ya.

20 N’ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n’ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.

21 N’ihi nka ka Jehova ji kwue otú a, si, Le, M’ganētiye ihe-isu-ngọngọ di iche iche n’iru ndi nka: nna na umu-ha gāsukwasi kwa ha ngọngọ; onye-ab͕ata-obi na eyì-ya gāla n’iyì.

22 Otú a ka Jehova siri, Le, otù ndi nēsi n’ala Ugwu bia: mba uku ka agākpọte kwa site na nsọtu nile nke uwa.

23 Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n’usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.

24 Ayi anuwo ùdé-ya; aka-ayi akudawo: ihe-nb͕u ejidewo ayi, ihe-nb͕ali dika nke nwayi ime nēme.

25 Apula ibà n’ọhia, eje-kwa-la ije n’uzọ; n’ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu.

26 Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n’úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n’obi di ilu nke-uku; n’ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.

27 Onye-ọnwunwa-ọla ka M’boro gi n’etiti ndim, ya na ebe ewusiri ike; ka i we mara nwa kwa uzọ-ha.

28 Ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha nke-uku, nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ: ọla na ígwè ka ha bu: ndi ahu nile bu ndi-nbibi.

29 Eko erewo ọku; ọku erechapuwo opi: n’efu ka ha nuchaworo nke-uku; n’ihi na anuchapughi ndi ọjọ.

30 Ọla-ọcha ajuru aju ka akpọrọ ha, n’ihi na Jehova ajuwo ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 7

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Guzo n’ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n’ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n’ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova.

3 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Menu ka uzọ nile nke unu na omume nile nke unu di nma, M’gēme kwa ka unu biri n’ebe a.

4 Unu atukwasila obi-unu n’okwu-ugha nile, si, Ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ka ndi a bu.

5 N’ihi na ọ buru na unu eme ka uzọ nile unu na omume nile unu dizue nma; ọ buru na unu emezue ihe ekpere n’ikpe n’etiti otù onye na ibe-ya;

6 ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n’ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ:

7 M’gēme kwa ka unu biri n’ebe a, n’ala nka nke M’nyere nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-egi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n’iru.

8 Le, unu onwe-unu nātukwasi obi-unu n’okwu-ugha nile, o we ghara ibara unu urù.

9 Ùnu ganēzu ori, nēb͕u madu, nākwa iko, nāṅu iyi ugha, nēsurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nējeso chi ọzọ di iche iche nke unu nāmaghi,

10 we bia guzo n’irum n’ulo a, nke akpọkwasiri aham, si, Anaputawo ayi; ka unu we me ihe-árú ndia nile?

11 Ọ̀ bu ọb͕à ndi nēme ihe-ike ka ulo a, nke akpọkwasiri aham, ghọworo n’anya-unu? Ọbuná Mu onwem, le, ahuwom ya, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 Otú ọ di, biko, jeruenu ọnọdum nke di na Shailo, ebe M’mere ka aham biri na mbu, hunu ihe M’mere ya n’ihi ihe ọjọ nke ndim, bú Israel.

13 Ma ub͕u a, n’ihi na unu aluwo ọlu ndia nile, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’we gwa unu okwu, nēbili n’isi-ututu nēkwu, ma unu anughi; M’we kpọ unu òkù, ma unu azagh:

14 M’gēme kwa ulo a, nke akpọkwasiri aham, nke unu onwe-unu nātukwasi obi, M’gēme kwa ọnọdu a nke M’nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, M’gēme ha dika M’gēme ha dika M’mere Shailo.

15 M’gēsi kwa n’irum tufue unu, dika M’tufuru umu-nna-unu nile, bú nkpuru nile nke Efraim.

16 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha, ariọ-kwa-lam aririọ: n’ihi na M’gaghi-anānu olu-gi.

17 Ì dighi-ahu ihe ndi ahu nēme n’obodo nile nke Juda na n’èzí nile nke Jerusalem?

18 Umu-ha nāchikọta nkú, ndi bu nna nāfunwu ọku, ndinyom-ha nāgwọ utu ọka flour koro eko, imere eze-nwanyi nke elu-igwe achicha, na iwusiri chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.

19 Ọ̀ bu Mu ka ndi ahu nākpasu iwe? (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); ọ̀ bughi ha onwe-ha ka ha nākpasu iwe, ka ihere we me ha n’iru?

20 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, iwem na ọnumam ka anāwusi n’ebe a, n’aru madu, na n’aru anu-ulo, na n’aru osisi ọhia, na n’aru nkpuru nke ala-ubi; ọ gēre kwa ọku, agaghi-emenyu kwa ya.

21 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Tukwasinu àjà-nsure-ọku nile unu n’elu àjà nile unu, ri-kwa-nu anu.

22 N’ihi na agwaghm nna-unu-hà okwu, enyeghkwam ha iwu n’ubọchi M’mere ka ha si n’ala Ijipt puta, bayere ihe nile nke àjà-nsure-ọku na nke àjà ọzọ:

23 kama ọ bu okwu a ka M’nyere ha n’iwu, si, Genu nti olum, M’gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n’uzọ nile nke M’nēnye unu n’iwu, ka o we diri unu nma.

24 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha-n’ala, ha we jegharia na ndum-ọdu nile na n’isi-ike nke obi ọjọ ha, ha we daghachi azu, ghara iga n’iru.

25 Site n’ubọchi ahu nke nna-unu-hà ji si n’ala Ijipt puta rue ta ka M’nēzitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha kwa-ubọchi:

26 ma ha egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n’ala, ha we kwesie olu-ha ike: ha mere ihe ọjọ kari ndi bu nna-ha.

27 I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi.

28 I gāsi kwa ha, Nka bu mba ahu nke nēgeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, nke nānaraghi kwa idọ-aka-na-nti: ikwesi-ntukwasi-obi alawo n’iyì, ebipuwo kwa ya n’ọnu-ha.

29 Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n’elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n’ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

30 N’ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n’anyam; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n’ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

31 Ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Tofet, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, isure umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n’ọku; bú ihe nke M’nēnyeghi n’iwu, ọ bataghi kwa n’obim.

32 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ya Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u: ha gēlì kwa ozu na Tofet n’ihi na ebe ilì ozu adighi.

33 Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha.

34 M’gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem: n’ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 8

1 Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ha gēkpoputa ọkpukpu ndi-eze Juda, na ọkpukpu ndi-isi-ya, na ọkpukpu ndi-nchu-àjà, na ọkpukpu ndi-amuma, na ọkpukpu ndi bi na Jerusalem, n’íhì-ha:

2 ha gāb͕asa ha n’anyanwu, na n’ọnwa, na n’usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n’anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n’iru ala ka ha gāghọ.

3 Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n’ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n’ebe nile M’chusaworo ha, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke ndi-agha puta.

4 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Ha ga-ada, ghara ibili ọzọ? madu, ọ̀ gādaghachi azu, ghara ilata?

5 Gini mere ndi nka nke Jerusalem ji adaghachi azu na ndaghachi-azu ebighi-ebi? ha ejidesiwo aghughọ ike, ha ajuwo ilọta.

6 Aṅaram nti we nu, ihe nēzighi ezi ka ha nēkwu: ọ dighi onye ọ bula chèghariworo uche n’ihe ọjọ ya, si, Gini ka m’meworo? onye ọ bula echighariwo ba n’ọb͕ub͕a-ọsọ-ya, dika inyinya nke nāb͕abiga ọsọ ókè n’agha.

7 Ọbuná ub͕ala n’elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova.

8 Ùnu si aṅa si, Ndi mara ihe ka ayi bu, iwu Jehova di kwa n’aka ayi? Ma otú o di, le, okwu-ugha ka pen ugha nke ndi-ode-akwukwọ meworo ya.

9 Ihere emewo ndi mara ihe, ha atuwo ujọ, ewe jide ha: le, okwu Jehova ka ha juworo; ọ̀ bu kwa aha amam-ihe gini ka ha nwere?

10 N’ihi nka ka M’gāchiri nwunye-ha nye ndi ọzọ, were kwa ubi nile ha nye ndi gēnweta ha: n’ihi na site n’onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku, site n’onye-amuma we rue onye-nchu-àjà onye ọ bula nēme ihe n’ugha.

11 Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.

12 ọ̀ di ihere mere ha megbe ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n’ọnọdu-ihere ha mara: n’ihi nka ha gāda n’etiti ndi nāda ada: na mb͕e eletara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.

13 M’gēkpochapusi ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: nkpuru-vine adighi n’osisi vine, ọ dighi fig di n’osisi fig, akwukwọ akpọnwuwo kwa; M’we doro ha ndi nāgabiga ha n’isi.

14 N’ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n’obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n’ebe ahu: n’ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n’ihi na ayi emehiewo megide Jehova.

15 Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwọ, ma le, oké egwu.

16 Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n’olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.

17 N’ihi na, le, M’ganēzite agwọ, bú ubí, n’etiti unu, nke ọ nādighi urà agārà ha; ha gāta kwa unu aru; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

18 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n’arum ka aru nādighi obim ike.

19 Le, ọ bu olu ntiku nke ada ndim site n’ala di anya nke-uku: Jehova, Ọ̀ nọghi na Zaion? Eze-ya, Ọ̀ nọghi nime ya? Gini mere ha ji were arusi nile ha apiri api, were kwa ihe-efu nile nke onye ala ọzọ, kpasuem iwe?

20 Owuwe-ihe-ubi agabigawo, nghọkọta-nkpuru agwusiwo, ma ayi onwe-ayi, azọputaghi ayi.

21 N’ihi nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim ka ab͕ajiworom ukwu na aka: anameyi uwe-nkpe; iju-anya ejidesiwo m ike.

22 Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n’ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n’aru ada ndim?

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 9

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m’we kwa ákwá n’ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim!

2 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na m’nwere ebe inọ ọnọdu-abali nke ndi-ije n’ọzara; ka m’we rapu ndim, si n’ebe ha nọ la! n’ihi na ha nile bu ndi nākwa iko, nzukọ ndi-nghọb͕u.

3 Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n’ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n’ala: n’ihi na ha esiwo n’ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

4 Lezienu anya, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, unu atukwasi-kwa-la nwa-nne ọ bula obi: n’ihi na nwa-nne ọ bula nējidesi ikiri-ukwu nwa-nne-ya ike, ọzọ, onye-ab͕ata-obi ọ bula nējeghari nāb͕a àmà ọjọ.

5 Ha nākwa kwa emò, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, ma ezi-okwu ka ha nādighi-ekwu: ha ezíwo ire-ha ikwu okwu-ugha; ọ bu n’ime ajọ omume ka ike gwuru ha.

6 Ebe-obibi-gi di n’etiti aghughọ; n’aghughọ ka ha juru imaram; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

7 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue otú a, si, Le, M’gaje inucha ha, we nwaputa ha; n’ihi na M’gēsi aṅa me n’ihi ada ndim?

8 Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n’ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n’obi-ya ọ nēche ya anwu.

9 M’gaghi-eleta ha n’ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ mba nke di otú a ọ́bọ̀?

10 Ugwu nile ayi ka m’gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n’ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.

11 M’gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M’gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, onye-obibi we ghara idi.

12 Ònye bu onye mara ihe, ka o we ghọta nka ònye bu kwa onye ahu ọnu Jehova gwaworo okwu, ka o we gosi ya? n’ìhi gini ka ala nka laworo n’iyì, esure kwa ya ọku dika ọzara, onye-ngabiga we ghara idi?

13 Jehova we si, N’ihi na ha arapuwo iwum nke M’tiyere n’iru ha, na n’ihi na ha egeghi nti olum, ghara kwa ijeghari nime ya;

14 ma ha ejesowo isi-ike nke obi-ha, jeso kwa Bealim, nke ndi bu nna-ha zíri ha:

15 n’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a, Le, M’gaje ime ka ha, bú ndi nka, rie wormwood, M’gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí.

16 M’gāchusa kwa ha n’etiti mba nile, ndi ha nāmaghi, ma ha onwe-ha ma ndi bu nna-ha: M’gēziso ha mma-agha, rue mb͕e M’mere ka ha gwusia.

17 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Tugharinu uche, kpọ-kwa-nu ndinyom nābù abù-ákwá, ka ha we bia; ziga-kwa-nu ikpọ ndinyom mara ihe, ka ha we bia:

18 ka ha me kwa ngwa, buliere ayi igo-ákwá, ka anya-miri we si n’anya-ayi rùda, ka miri we si kwa na mbubere-anya-ayi rùputa.

19 N’ihi na olu nke igo-ákwá ka anuworo site na Zaion, Le ka esi bibisia ayi nke-uku! ihere emewo ayi nke-uku, n’ihi na ayi arapuwo ala-ayi, n’ihi na ha atudawo ebe-obibi nile ayi.

20 Ma nurunu okwu Jehova, unu ndinyom, ka nti-unu nara kwa okwu ọnu-Ya, zí-kwa-nu umu-unu ndinyom igo-ákwá, ka nwayi ọ bula zí kwa nwayi-ibe-ya abù-ákwá.

21 N’ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n’ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n’èzí, na umu-okorọbia n’amá nile.

22 Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n’ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n’ọhia, na dika nju-aka ọka n’azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.

23 Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n’amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n’idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n’àkù-ya:

24 kama, onye nānya isi, ya nya isi na nka, na o nwere uche n’ebe M’nọ, we maram, na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ebere na ikpé ziri ezi na ezi omume n’uwa: n’ihi na ihe ndia atọwom utọ; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

25 Le, ubọchi nābia, (ọbu ihe si N’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gewere nmehie-ha leta ndi nile bìri úgwù n’ebìghi-úgwù-ha;

26 bú Ijipt, na Juda, na Edom, na umu Amon, na Moab, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha, ndi bi n’ọzara: n’ihi na mba nile bu ndi anēbighi úgwù, ulo Israel nile bu kwa ndi anēbighi úgwù n’obi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 10

1 Nurunu okwu Jehova gwaworo unu, unu ulo Israel:

2 Otú a ka Jehova siri, Unu amutala uzọ mba nile, unu atu-kwa-la ujọ ihe-iriba-ama di iche iche nke elu-igwe; n’ihi na mba nile nātu ujọ ha.

3 N’ihi na ukpuru nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: n’ihi na ọ bu nání osisi, nke madu b͕utuworo, ọlu aka abua nke onye-ọ̀kà ji anyu-ike alu ọlu.

4 Ha ji ọla-ọcha, ji kwa ọla-edo, eme ya ka ọ ma nma; ha ji ǹtú, ji kwa otùtù, eme ya ka o sie ike, ka ọ we ghara isu ngọngọ.

5 Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n’ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n’ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n’aka.

6 Ọ dighi nke di ka Gi ma-ọli, Jehova; Onye uku ka I bu, ihe di uku ka aha-Gi di kwa n’idi-ike.

7 Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n’ihi na Gi ka o kwesiri: n’ihi na n’etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n’ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli.

8 Ma ha nile n’otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.

9 Ọla-ọcha di nke etisaworo mbadamba nke anēsi na Tashish weta, na ọla-edo nke sitere n’Ufaz, bú ọlu onye-ọ̀kà na nke aka onye-nnucha-ọla: ákwà anunu na ákwà ododo bu uwe-oyiyi-ha; ọlu nke ndi mara ihe ka ha nile bu.

10 Ma Jehova bu Chineke n’ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n’iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku.

11 Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n’iyì pua n’uwa na n’okpuru elu-igwe, bú chi ndia.

12 Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe:

13 mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n’elu-igwe, O mee ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n’ulo-nkwakọba-Ya nile puta.

14 Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n’ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n’arusi-ya apiri api: n’ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha.

15 Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n’iyì.

16 Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n’ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

17 Chikọputa ihe-agha-gi n’ala, gi onye bi n’obodo anānọchigide n’agha.

18 N’ihi na otú a ka jehova siri, Le, M’gaje imapu ndi bi n’ala nka dika èbè na mb͕e a, M’gākpab͕u kwa ha, ka ha we chọputa ha.

19 Ahuhu dirim bayere nb͕aji ukwu na akam! ọnyám nke etiputa jọrọ njọ: ma mu onwem siri, N’ezie nka bu ọriam, m’gēburu kwa ya.

20 Emebisiwo ulo-ikwūm, etibìsiwo kwa udọ̀m nile: umum esiwo n’ebe m’nọ pua, ha anọghi kwa: ọ dighi kwa onye nēseti ulo-ikwūm nākwuli kwa ákwà-nkwubam.

21 N’ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n’ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa.

22 Ge nti olu nke ihe anuru, le, ọ nābia, oké ùzù agha nēsi kwa n’ala Ugwu bia, ime ka obodo nile nke Juda ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ebe-obibi nke nkita-ọhia.

23 Jehova, amawom na ọ bughi n’aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

24 Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n’ikpé; adọlam aka na nti n’iwe-gi, ka I we ghara ibilatam.

25 Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n’ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n’efu.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 11

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site n’aka Jehova, si,

2 Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu;

3 i gāsi kwa ha, Otúaka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Onye anābu ọnu ka onye ahu bu nke nādighi-anu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a,

4 nke M’nyere nna-unu-hà n’iwu n’ubọchi M’mere ka ha si n’ala Ijipt, si n’oké ọku ígwè ahu, puta, si, Genu nti olum, me ha, dika ihe nile si di nke M’nēnye unu n’iwu: unu ewe burum otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke:

5 ka M’we me ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M’ṅuru nna-unu-hà, inye ha ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya, dika o si di ta. M’we za, si, Amen, Jehova.

6 Jehova we sim, Kpọsa okwu ndia nile n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem, si, Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha.

7 N’ihi na ab͕aworom nna-unu-ha àmà nke-uku n’ubọchi M’mere ka ha si n’ala Ijipt rigoputa, rue ta, nēbili n’isi-ututu nāb͕a àmà, si, Genu nti olum.

8 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha n’ala, ha we jegharia, onye ọ bula n’isi-ike nke obi ọjọ ha: M’we me ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a biakwasi ha, bú nke M’nyere n’iwu ka ha me, ma ha emeghi ha.

9 Jehova we sim, Achọputawo nkekọta imegidem n’etiti ndi Juda, na n’etiti ndi bi na Jerusalem.

10 Ha alaghachikuruwo ajọ omume nile nke ndi bu nna-ochie-ha, ndi juru inu okwum nile; ha onwe-ha ejesowo kwa chi ọzọ di iche iche ifè ha òfùfè: ulo Israel na ulo Juda emebiwo ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara.

11 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M’gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M’gaghi-ege ha nti.

12 Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha.

13 N’ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

14 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n’ihi na M’gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n’ihi ihe ọjọ ha.

15 Gini ka nwayi nke ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere n’ulom, ebe ya na ọtutu madu meworo ajọ ihe-nzube, ọzọ, anu nsọ nēsi kwa n’aru gi gabiga? mb͕e i nēme ihe ọjọ, mb͕e ahu ka i nāṅuri ọṅu.

16 Osisi olive di ndu, nke mara nma n’imì nkpuru ọma, otú a ka Jehova kpọrọ aha-gi: n’olu nkpọtu uku ka O suyeworo ya ọku, alaka-ya nile anyakasiwo kwa.

17 N’ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye ahu nke kuworo gi n’ala, ekwuwo ihe ọjọ megide gi, n’ihi ihe ọjọ nke ulo Israel na ulo Juda, nke ha meworo onwe-ha n’ikpasum iwe n’isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

18 Jehova me-kwa-ram ka m’mara ya, m’we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m’hu omume nile ha.

19 Ma mu onwem di ka nwa-aturu azùbiri azùbi nke anākpuru ije n’ob͕ub͕u-ya; ma amaghm na ọ bu mu ka ha zubereri nzube megide, si, Ka ayi bibie osisi na ihe-oriri-ya, ka ayi bipu kwa ya n’ala ndi di ndu, ka ewe ghara icheta kwa aha-ya ọzọ.

20 Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nēkpe ikpe n’ezi omume, Onye nānwa akuru na obi, kwe ka m’hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha: n’ihi na Gi ka m’kpugheworo okwu-ikpem.

21 N’ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi Anatot, bú ndi nāchọ ndu-gi, si, I gaghi-ebu amuma n’aha Jehova, ka i we ghara inwu site n’aka-ayi:

22 n’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a, Le, M’gaje iwere nmehie-ha leta ha: umu-okorọbia-ha gānwu site na mma-agha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gānwu site n’oké unwu;

23 ọ dighi kwa ndi fọduru ha gēnwe: n’ihi na M’gēme ka ihe ọjọ biakute ndi Anatot, n’arọ nleta-ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 12

1 Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m’gēkwu n’ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n’udo?

2 I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n’ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n’ebe di anya.

3 Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n’ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.

4 Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n’ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n’ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi.

5 Asi na i so ndi ji ukwu eje b͕a ọsọ, ha we me ka ike gwu gi, ì gēsi kwa aṅa nu ọku n’obi ib͕akari inyinya? ọ bu kwa n’ala udo ka i nọ na ntukwasi-obi, ma ì gēsi aṅa me na nbili-elu nke Jọdan?

6 N’ihi na ọbuná umu-nne-gi, na ulo nna-gi, ọbuná ha onwe-ha aghọb͕uwo gi; ọbuná ha onwe-ha akpọzuwo nkpu n’azu gi: ekwela ha, mb͕e ha gāgwa gi ezi ihe.

7 Arapuwom ulom, ajuwom ihe-nketam; ewerewom nwayi nke ihe-ya nātọ nkpuru-obim utọ nke-uku nye n’ọbu-aka ndi-iro-ya.

8 Ihe-nketam aghọworom ihe dika ọdum n’oké ọhia: o mewo ka olu-ya da megidem; n’ihi nka ka M’kpọworo ya asì.

9 Ọ̀ bu udele turu agwa ka ihe-nketam dirim? udele, hà nọ ya buruburu nēmegide ya? jenu, chikọta anu ọhia nile, me ka ha bia iri ihe.

10 Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n’efu.

11 O mewo ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu; o nēru újú n’ebe m’nọ, ebe ọ tọb͕ọrọ n’efu; ebe tọb͕ọrọ n’efu ka ala nka nile bu, n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n’obi.

12 N’elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi nke di n’ọzara ka ndi nāpunara madu ihe biaworo: n’ihi na mma-agha Jehova nwere nēripia site n’otù nsọtu nke ala we rue nsọtu ọzọ nke ala: ọ dighi udo anu-aru ọ bula, bú madu, nwere.

13 Ha aghawo ọka wheat, ma ogwu bu ihe-ubi ha wereworo; ha aghọwo ndi-ọria, ma ọ dighi-abara ha urù: ka ihere ihe-omume nile unu me kwa unu, sita n’iwe di ọku nke Jehova.

14 Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M’meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M’gaje iropu ha n’elu ala-ha, ulo Juda ka M’gēropu kwa n’etiti ha.

15 O gēru kwa, mb͕e M’ropusiri ha, na M’gēnwe kwa obi-ebere n’aru ha ọzọ; M’gēme kwa ka ha lata, onye ọ bula n’ihe-nketa-ya, na onye ọ bula n’ala-ya.

16 Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n’etiti ndim.

17 Ma ọ buru na ha anughi, M’gēropu kwa mba ahu, nēropu ya nēme kwa ka ọ la n’iyì; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 13

1 Otú a ka Jehova sirim, Je, zutara onwe-gi ihe-ọkiké nke flax, tukwasi ya n’úkwù-gi, ma emela ka ọ ba na miri.

2 M’we zuta ihe-ọkiké dika okwu Jehova si di, m’we tukwasi ya n’úkwù.

3 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si,

4 Were ihe-ọkiké ahu nke i zutaworo, nke di n’úkwù-gi, bilie, je Yufretis, zobe ya n’ebe ahu nime nb͕awa nke nkume di elu.

5 M’we je, zobe ya n’akuku Yufretis, dika Jehova nyerem iwu.

6 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n’ebe ahu, bú nke M’nyere gi iwu izobe n’ebe ahu.

7 M’we je Yufretis, gwue, weputa ihe-ọkiké ahu n’ebe m’zobere ya-ri: ma, le, ihe-ọkiké ahu ebibiwo, ọ bàghi n’ihe ọ bula.

8 Okwu Jehova we ruem nti, si,

9 Otú a ka Jehova siri, Otú a ka M’gēbibi npako Juda na npako bara uba nke Jerusalem.

10 Ndi ọjọ nka ndi nāju inu okwum nile, ndi nējeghari n’isi-ike nke obi-ha, we jeso chi di iche iche ọzọ ifè ha, na ikpọ isi ala nye ha, ndi nka gādi kwa ka ihe-ọkiké a, nke nādighi-abà n’ihe ọ bula.

11 N’ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n’úkwù madu, otú a ka M’meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n’arum, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi.

12 I gāgwa kwa ha okwu a, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Agāb͕aju ite ọ bula manya-vine: ha gāsi kwa gi, Ọ̀ bu na ayi amaghi na agāb͕aju ite ọ bula manya-vine?

13 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M’gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n’ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n’oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem.

14 M’gātupia kwa ha, otù onye n’elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n’otù; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: M’gaghi-enwe ọmiko, M’gaghi-eme kwa ebere, M’gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M’we ghara ibibi ha.

15 Nurunu, ge kwa nti; unu adila elu n’obi: n’ihi na Jehova ekwuwo.

16 Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n’elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.

17 Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n’ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n’anyam nke-uku, anya-miri ewe si n’anyam rùda, n’ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n’agha.

18 Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n’ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.

19 Emechiwo obodo nile nke Negeb, ọ dighi kwa onye nēmeghe ha: emewo ka Juda je biri n’ala ọzọ, ha nile emezuwo ka ọ je biri n’ala ọzọ.

20 Welie anya-unu, hu ndi nēsi n’Ugwu bia: òle ebe ìgwè aturu enyere gi, bú ìgwè ewu na aturu-gi mara nma?

21 Gini ka i gāsi, mb͕e Ọ gēwere nmehie-gi leta gi, ebe gi onwe-gi zíworo ndi ahu imegide gi, bú ezi ndi-eyì-gi, ka ha buru ndi-isi-gi? ihe-nb͕u di iche iche, hà agaghi-ejidesi gi ike, dika nwanyi ime nēme?

22 Ma mb͕e i gāsi n’obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n’ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.

23 Onye Etiopia, ọ̀ gāb͕anwe akpukpọ-aru-ya? ma-ọbu agu, ọ̀ gāb͕anwe agwa-ya? ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ.

24 M’gāchusa kwa ha, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke nāgabiga, nye ifufe ọzara.

25 Nka bu ihe efetara gi na nzà, òkè nke atùworo nye gi site nam, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); n’ihi na i chezọwo Mu onwem, we tukwasi okwu-ugha obi-gi.

26 Ya mere Mu onwem ji kpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi rue iru-gi, ewe hu nlelì-gi.

27 Ikwa-iko-gi nile, na ọbube-gi nile dika inyinya, nzube ọjọ nke ikwa-iko-gi, n’elu ugwu ntà nile n’ọhia, ahuwom ihe-árú-gi nile ndia. Ahuhu diri gi, Jerusalem! i gaghi-adi ọcha; #mb͕e ole gāgabiga tutu ọ di?

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 14

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia nti bayere okwu nb͕ochi miri-ozuzo.

2 Juda eruwo újú, ọnu-uzọ-ama-ya nile atalatawo kwa, ha yiri uwe-nkpe nọdu n’ala; iti-nkpu Jerusalem arigowo.

3 Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n’ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n’ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha.

4 N’ihi ala nke b͕awara ab͕awa, n’ihi na oké miri-ozuzo adighi n’ala, ihere emewo ndi-ọlu-ubi, ha ekpuchiwo isi-ha.

5 N’ihi na ọbuná nne-ele amuwo nwa n’ọhia, we rapu ya, n’ihi na ahihia ndu adighi.

6 Inyinya-ibu-ọhia eguzowo kwa n’elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, ha ekubawo ifufe dika nkita-ọhia; anya-ha adalawo n’isi, n’ihi na ihe-ọkukú adighi.

7 Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n’ihi aha-Gi, Jehova: n’ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.

8 Gi olile-anya Israel, onye-nzọputa-ya na mb͕e ahuhu, n’ìhi gini ka I di ka ọbìa n’ala nka, na dika onye-ije nke setiworo ulo-ikwū-ya inọ ọnọdu-abali?

9 N’ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n’etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi.

10 Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n’anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.

11 Jehova we sim, Ekpela ekpere bayere ndi nka ichọ ọdi-nma-ha.

12 M’gbe ha nēbu ọnu, M’gaghi-nānu iti-nkpu-ha; ọzọ, mb͕e ha nēsure àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma, ihe-ha agaghi-nātọm utọ: kama mma-agha na oké unwu n’ajọ oria na-efe efe ka M’gaje iji me ka ha gwusia.

13 M’we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, ndi-amuma nāsi ha, Unu agaghi-ahu mma-agha, unu agaghi-enwe kwa oké unwu; kama udo nke ezi-okwu ka M’gēnye unu n’ebe a.

14 Jehova we sim, Amuma ugha ka ndi-amuma nēbu n’aham: eziteghm ha, enyekwaghm ha iwu, agwakwaghm ha okwu: amuma ọhù ugha, na nke iju arusi ase, na nke ihe-efu, na nke aghughọ nke obi-ha, ka ha nēburu unu.

15 N’ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ahu ndi nēbu amuma n’aha m, ma Mu onwem eziteghi ha, ma ha onwe-ha nāsi, Mma-agha na oké unwu agaghi-adi n’ala nka: Ọ si, Agēji mma-agha, ji kwa oké unwu, me ka ndi-amuma ahu gwusia.

16 Ọzọ, ndi ahu nke ha onwe-ha nēburu amuma gābu ndi anētufu n’èzí nile nke Jerusalem n’ihi oké unwu na mma-agha; ọ dighi kwa onye nēlì ozu ha gēnwe, ha onwe-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom: n’ihi na M’gāwukwasi ha ihe ọjọ ha.

17 I gāgwa kwa ha okwu a, si, Ka anya-miri si n’anyam erùda abali na ehihie, ka ha ghara kwa iguzo du; n’ihi na nb͕aji ukwu na aka di uku ka ejiworo b͕aji ada ndim nāmaghi nwoke, ọ bu ntiputa-ọnyá nke jọrọ njọ nke-uku.

18 Ọ buru na apuam je n’ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n’obodo a, le, ndi nāria ọria site n’oké unwu! n’ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n’ala, ma ha amaghi ihe.

19 Ì jusiwo Juda? ọ̀ bu Zaion ka nkpuru-obi-Gi sọworo oyi? gini mere I ji tib͕u ayi, ma ọ dighi ọgwugwọ diri ayi? Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwo, ma, le, oké egwu!

20 Jehova, ayi mara nmebi-iwu-ayi, na ajọ omume nna-ayi-hà: n’ihi na ayi emehiewo megide Gi.

21 Elelìla ayi, n’ihi aha-Gi; akpọla oche-eze nke ebube-Gi ihe-nzuzu: cheta, emebila ọb͕ub͕a-ndu-Gi ayi na Gi b͕ara.

22 Ọ̀ di ihe ọ bula n’etiti ihe-efu nile nke mba nile nke nēme ka miri zo? ma-ọbu elu-igwe, hà gēnye oké miri-ozuzo? ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Onye ahu, Jehova, bú Chineke-ayi? ayi gēle kwa anya Gi; n’ihi na Gi onwe-gi emewo ihe ndia nile.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 15

1 Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n’irum, nkpuru-obim agaghi-adi n’ebe ndi nka nọ: chupu ha n’irum, ka ha pu kwa.

2 O gēru kwa, mb͕e ha gāsi gi, Òle ebe ayi gāpu? i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ndi diri ọnwu gāpukuru ọnwu; ndi diri mma-agha gāpukuru mma-agha; ndi diri oké unwu gāpukuru oké unwu; ndi diri ndọta-n’agha gāpukuru ndọta-n’agha.

3 M’gēme kwa ka ab͕uru ihe anọ buru ndi-nlekọta-ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): mma-agha ib͕u eb͕u, na nkita idọb͕u adọb͕u, na anu-ufe nke elu-igwe, na anumanu nke uwa, iripia na ibibi.

4 M’gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n’ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n’ihi ihe o mere na Jerusalem.

5 N’ihi na ònye gēnwe ọmiko n’aru gi, Jerusalem? ma-ọbu ònye gēgosi gi ebere o nwere n’aru gi? ma-ọbu ònye gēwezuga onwe-ya iju ajuju bayere udo-gi?

6 Gi onwe-gi arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), azu ka i nālaghachi: M’we setipu akam imegide gi, we bibie gi; ike ncheghari agwusiwom.

7 M’we were ihe-nfucha fucha ha n’ọnu-uzọ-ama nke ala nka; ab͕abawom ha aka umu, emewom ka ndim la n’iyì; ha esighi n’uzọ nile ha lata.

8 Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n’etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede.

9 Nwayi nke muworo umu asa atalatawo; o kubìwo ume; anyanwu-ya adawo mb͕e ubọchi fọduru; ihere emewo ya, o we nwe iru-ihere: ọzọ, ndi-ha fọduru, ọ bu n’aka mma-agha ka M’gēnye ha n’iru ndi-iro-ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

10 Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n’ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n’uma; madu ebinyeghkwam ego n’uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham.

11 Jehova siri, N’ezie atọpuwom i ime ezi ihe; n’ezie emewom ka onye-iro-gi riọ gi aririọ na mb͕e ihe ọjọ na nime mb͕e nkpab͕u.

12 Àgētiji ígwè si n’Ugwu puta, na ọla?

13 Ume-gi na àkù-gi nile ka M’gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n’agha, ọ bughi n’ihi ọnu-ahia, ma n’ihi nmehie-gi nile, ọbuná n’ókè-ala-gi nile.

14 M’gēme kwa ka ha soro ndi-iro-gi gabiga n’ala i nāmagh: n’ihi na amuyewo ọku n’iwem, n’aru unu ka ọ gēre.

15 Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n’eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n’ihi Gi.

16 Achọputawo okwu-Gi, m’we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n’ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha.

17 Anọdughm ala n’ìzù nzuzo nke ndi nāchì ọchì nke-uku, aṅurighkwam ọṅu: n’ihi aka-Gi náním otú nọduru ala; n’ihi na oké iwe ka I jiworo mejuem.

18 N’ìhi gini ka ihe-nb͕um digidere mb͕e nile? n’ìhi gini ka ntiputa-ọnyám nādighi ngwọta? ọ juwo ka agwọta ya. Ì gāburum nání ihe di ka miri-iyi nārafu arafu, dika miri na-ekwesighi ntukwasi-obi?

19 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a, Ọ buru na i lata, M’gēme kwa ka i lata, n’irum ka i gēguzo; ọ buru na i me ka ihe di oké ọnu-ahia si n’ihe jọb͕uru onwe-ya puta, dika ọnum ka i gābu: ndi ahu gālaghachikute gi, ma gi onwe-gi agaghi-alaghachikute ha.

20 M’gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n’ihi na gi ka M’nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

21 M’gānaputa kwa gi n’aka ndi ọjọ, b͕aputa gi n’aka ndi nēme ka madu ma jijiji.