Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 103

Abù Ọma nke Devid.

1 Gọzie Jehova, nkpuru-obim;

Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.

2 Gọzie Jehova, nkpuru-obim,

Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:

3 Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile;

Onye nāgwọ ọria-gi nile;

4 Onye nāb͕aputa ndu-gi n’aka nbibi;

Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche:

5 Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi;

Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.

6 Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u

Ezi omume nile na ihe nile O kpere n’ikpe.

7 Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile,

Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile.

8 Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara,

Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n’ebere.

9 Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu;

Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe.

10 Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi,

Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi.

11 N’ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n’elu uwa,

Otú a ka ebere-Ya di ike n’aru ndi nātu egwu Ya.

12 Dika Iru-anyanwu si di anya n’Ọdida-anyanwu,

Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n’ebe ayi nọ.

13 Dika nna si enwe obi-ebere n’aru umu-ya,

Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n’aru ndi nātu egwu Ya.

14 N’ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi;

Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu.

15 Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di;

Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko.

16 N’ihi na ifufe agabigawo ya n’isi, o we ghara idi;

Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.

17 Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n’aru ndi nātu egwu Ya,

Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu;

18 Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya,

Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.

19 Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n’elu-igwe;

Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile.

20 Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya,

Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya,

N’ige nti olu nke okwu-Ya.

21 Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile;

Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ.

22 Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile,

N’ebe nile Ọ nāchi:

Gọzie Jehova, nkpuru-obim.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 104

1 Gọzie Jehova, nkpuru-obim.

Jehova, Chinekem I di uku nke-uku;

Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe.

2 Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi;

Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba:

3 Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri:

Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya;

Onye nējeghari n’elu nkù abua nke ifufe:

4 Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe;

Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:

5 Ọ tọwo ntọ-ala uwa n’elu ọnọdu-ya guzosiri ike,

Ka aghara iwezuga ya n’ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6 I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe;

N’elu ugwu nile ka miri nēguzo.

7 Site n’ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga;

Site n’olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ;

8 (Ugwu nile nārigo, ndagwurugwu nile nārida;)

Rue ebe ahu nke I tọrọri ntọ-ala-ya nye ha.

9 I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya;

Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.

10 Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu;

N’etiti ugwu ka ha nērù:

11 Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu;

Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha.

12 N’akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi,

Ha nēsi n’etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà.

13 I bu Onye nēsi n’ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri:

Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile.

14 I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-ulo

Nēme kwa ka ihe akuru n’ala puere ọlu-ubi madu;

Ime ka nri si n’ala puta:

15 Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria,

Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu,

Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n’obi.

16 Afọ nēju osisi nile nke Jehova;

Bú osisi cedar nke Lebanon, nke Ọ kuworo;

17 Ebe umu-nnunu na-akù akwú:

Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya.

18 Ugwu nile di elu diri ewu-ọhia;

Nkume nile di elu buru aṅu ebe-nb͕abà.

19 O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà:

Anyanwu mara ọdida-ya.

20 I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali;

Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa.

21 Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u,

N’ichọ kwa ihe-oriri-ha n’aka Chineke.

22 Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha,

We mākpuru n’ebe-obibi-ha di iche iche.

23 Madu nāpu ga ọlu-ya

Ga kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi.

24 Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova!

N’amam-ihe ka I meworo ha nile:

Uwa juputara n’ihe I nwetara.

25 Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n’aka abua,

Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu,

Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.

26 N’ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;

Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.

27 Ha nile nēle anya Gi,

Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

28 I nēnye ha, ha achikọta ya;

I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.

29 I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;

I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,

We laghachi n’ájá-ha.

30 I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha;

I we me ka iru ala di ọhu.

31 Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi;

Ka Jehova ṅuria n’ọlu-Ya nile:

32 Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji;

Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku.

33 M’gābùku Jehova abù n’ogologo ndum nile:

M’gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m’nọ nādi ndu.

34 Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ:

Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova.

35 Ka eme ka ndi-nmehie si n’uwa gwusia,

Ka ndi nēmebi iwu ghara kwa idi ọzọ.

Gọzie Jehova, nkpuru-obim.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 105

1 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;

Menu ka amara omume-Ya nile n’etiti ndi nile n’uwa.

2 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;

Tugharinu uche n’oké ọlu-Ya nile.

3 Nētonu onwe-unu n’aha nsọ Ya:

Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.

4 Nāchọnu Jehova na ike-Ya;

Chọnu iru-Ya mb͕e nile.

5 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;

Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;

6 Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya,

Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.

7 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:

N’uwa nile ka ikpé-Ya nile di.

8 O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi,

Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n’iwu;

9 Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,

Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;

10 O we me ka o guzoro Jebok ibu ukpuru,

Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:

11 Si, Gi ka M’gēnye ala Kenean,

Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:

12 Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole,

E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;

13 Ha we nējeghari si n’otù mba jerue mba ọzọ,

Si n’otù ala-eze jerue ndi ọzọ.

14 Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;

O we bara ndi-eze nba n’ihi ha;

15 Si, Unu emetula ndim etere manu aka,

Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam.

16 O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu;

Nkpa-n’aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri.

17 O zìri otù nwoke iga n’iru ha;

Erere Josef ka ọ buru orù:

18 Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike;

Nkpuru-obi-ya bàra n’ígwè:

19 Rue mb͕e okwu-Ya rère;

Okwu-ọnu Jehova nuchara ya.

20 Eze ziri ozi, we tọpu ya;

Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n’ulo-nkpọrọ.

21 O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya,

Na onye nāchi ihe nile o nwetara:

22 Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ,

Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe.

23 Israel we bata nime Ijipt;

Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n’ala Ham.

24 O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku;

O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha.

25 Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì,

Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.

26 O zigara Moses, bú orù-Ya,

Na Eron onye Ọ rọputara.

27 Ha doro n’etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile,

Do kwa ihe-ebube di iche iche n’ala Ham.

28 O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie;

Ha anupughi kwa isi n’okpuru okwu-Ya nile.

29 Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara,

We me ka azù-ha nwua.

30 Ala-ha nuputara awọ,

N’ime-ulo nile nke ndi-eze-ha.

31 O kwuru okwu, odudu we bia,

Na anwu ntà n’ókè-ala-ha nile.

32 O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé,

Na ọku nēnwu enwu n’ala-ha.

33 O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe;

Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha.

34 O kwuru okwu, igurube we da,

Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu,

35 Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n’ala-ha,

Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha.

36 O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n’ala-ha,

Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.

37 O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo:

Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n’etiti ebo-Ya nile.

38 Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara;

N’ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha.

39 Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi;

Na ọku inye ìhè n’abali.

40 Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia,

O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha.

41 O meghere oké nkume, miri we rùputa;

Ha nērù n’ala ọkpọ-nku dika osimiri.

42 N’ihi na O chetara okwu nsọ Ya,

Na Abraham, bú orù-Ya.

43 O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta,

Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta.

44 O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile;

Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n’ọlu inwe ka ha nwetara:

45 Ka ha we debe ukpuru-Ya nile,

Riba kwa iwu-Ya nile ama.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 106

1 Tonu Ja.

Kelenu Jehova; n’ihi na Ọ di nma:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2 Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova?

Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile?

3 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu,

Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile.

4 Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam;

Were nzọputa-Gi letam:

5 Ka m’we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo,

Ka m’we ṅuria n’ọṅù mba-Gi,

Ka m’we soro ihe-nketa-Gi nya isi.

6 Ayi esowo nna-ayi-hà mehie,

Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu.

7 Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n’Ijipt;

Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile;

Ha we nupu isi n’akuku oké osimiri, bú n’Oké Osimiri Uhie.

8 Ma Ọ zọputara ha n’ihi aha-Ya,

Ime ka amara idi-ike-Ya.

9 O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia:

O we me ka ha nēje ije n’ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara.

10 O we zọputa ha n’aka onye nākpọ ha asì,

B͕aputa kwa ha n’aka onye-iro-ha.

11 Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha:

Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.

12 Ha we kwere okwu-Ya nile;

Ha nābù abù otuto-Ya.

13 Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa;

Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:

14 Ha we chọ ajọ ọchichọ n’ọzara,

We nwa Chineke n’ala tọb͕ọrọ n’efu.

15 O we nye ha ihe ha riọrọ;

Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha.

16 Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n’ọmuma-ulo-ikwū-ha,

Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.

17 Ala nēmeghe, we loda Detan,

Kpuchi kwa nzukọ Abairam.

18 Ọku we nēre n’etiti nzukọ-ha;

Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu.

19 Ha nēme nwa-ehi na Horeb,

We kpọ isi ala nye ihe awuru awu.

20 Ha we b͕anwe nsọpuru-ha

N’ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n’ala.

21 Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha,

Onye nēmeri ihe uku di iche iche n’Ijipt;

22 Oké ọlu di iche iche n’ala Ham,

Na ihe di egwu di iche iche n’akuku Oké Osimiri Uhie.

23 O we si na O gēkpochapu ha,

Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n’iru Ya,

Ime ka ọnuma-Ya si n’ibibi ha laghachi.

24 Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike,

Ha ekweghi okwu-Ya;

25 Ha we tamu n’ulo-ikwū nile ha,

Ha egeghi nti n’olu Jehova.

26 O we welie aka-Ya elu n’ebe ha nọ,

Ime ka ha da n’ọzara:

27 Na ime ka nkpuru-ha da n’etiti mba nile,

Na ichusa ha n’ala nile.

28 Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n’aru Beal-peoa,

We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu.

29 Ha we were omume nile ha kpasue Ya iwe:

Ihe-otiti we dakwasi ha.

30 Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n’ikpe:

Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu.

31 Ewe guara ya nka n’ezi omume,

Rue ọb͕ọ nile rua mb͕e ebighi-ebi.

32 Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba,

O we jọrọ Moses njọ n’ihi ha:

33 N’ihi na ha nupuru isi n’okpuru Mọ-Ya,

O we were eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua kwue okwu efu.

34 Ha ekpochapughi ndi di iche iche ahu,

Dika Jehova siri ha;

35 Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu,

We muta ọlu nile ha:

36 Ha we fè arusi nile ha òfùfè;

Arusi ahu we ghọrọ ha ọnyà:

37 Ọzọ, ha were umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom chuara ndi-mọ ọjọ àjà,

38 We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,

Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà;

Ewe were ọbara merua ala ahu.

39 Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú,

Ha we nākwa iko n’omume nile ha.

40 Iwe Jehova we di ọku n’aru ndi-Ya,

O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú.

41 O we nye ha n’aka mba di iche iche;

Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha.

42 Ndi-iro-ha meb͕u-kwa-ra ha,

Ewe me ka ha ruru ala n’okpuru aka-ha.

43 Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha;

Ma ha onwe-ha nānupu isi n’okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha,

Ewe kwada ha n’ajọ omume-ha.

44 O we lekwasi ahuhu diri ha anya,

Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha:

45 O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha,

We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

46 O we me ha ka enwe obi-ebere nile n’aru ha

N’iru ndi nile ndi nādọta ha n’agha.

47 Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi,

Chikọputa kwa ayi n’etiti mba nile

Ikele aha nsọ Gi,

Na inya isi n’otuto-Gi.

48 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu,

Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

Ka ndi Israel nile si kwa, Amen.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 107

1 Kelenu Jehova; n’ihi na Ọ di nma:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2 Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a,

Bú ndi Ọ b͕aputaworo n’aka onye-nkpab͕u;

3 O si-kwa-ra n’ala nile chikọputa ha,

Site n’Iru-anyanwu na site n’Ọdida-anyanwu,

Site n’Ugwu na site n’oké osimiri.

4 Ha fughariri n’ọzara n’uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n’efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara.

5 Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu,

Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha.

6 Ha we tikue Jehova n’ahuhu diri ha,

O we naputa ha n’aka nkpà-ha nile.

7 O me-kwa-ra ka ha zọ ije n’uzọ ziri ezi,

Ijeru obodo obibi.

8 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,

Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

9 N’ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike,

Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.

10 Ndi nānọdu n’ọchichiri na onyinyo ọnwu,

Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n’ala na ígwè;

11 N’ihi na ha nupuru isi n’okpuru okwu Chineke,

Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:

12 O we me ka obi-ha ruru ala n’idọb͕u onwe-ha n’ọlu;

Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.

13 Ha we tikue Jehova n’ahuhu diri ha,

O we zọputa ha n’aka nkpà-ha nile.

14 O nēme ka ha si n’ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,

Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.

15 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,

Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

16 N’ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla,

B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.

17 Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche neweda onwe-ha n’ala

Site n’uzọ njehie-ha na site n’ajọ omume nile ha.

18 Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú;

Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.

19 Ha we tikue Jehova n’ahuhu diri ha,

O we zọputa ha na nkpà-ha nile.

20 O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma,

O nēme kwa ka ha si n’olùlù nile ha wepuga onwe-ha.

21 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,

Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

22 Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele,

Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.

23 Ndi nārida n’oké osimiri n’ub͕o,

Bú ndi nēje ozi n’ọtutu miri;

24 Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova,

Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.

25 N’ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ,

Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.

26 Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile:

Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n’ọnọdu ọjọ ha.

27 Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè,

Amam-ihe-ha nile nāla kwa n’iyì.

28 Ha we tikue Jehova n’ahuhu diri ha,

Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.

29 Ọ nēme ka oké ifufe guzo n’idere du,

Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.

30 Ha we ṅuria, n’ihi na ha nādaju;

O we durue ha n’ótú nātọ ha utọ.

31 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,

Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

32 Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya,

Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye.

33 O nēme ka osimiri ghọ ọzara,

O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku;

34 Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú,

Site n’ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.

35 Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri,

Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa.

36 O we me ka ndi agu nāgu biri n’ebe ahu,

Ha we dozie obodo obibi;

37 Gha nkpuru n’ubi, kua ubi-vine di iche iche,

Nweta nkepuru nke ihe-ọmume.

38 Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku;

Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.

39 Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n’ala,

Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú.

40 Ọ nāwusa nleda n’aru ndi amara aha-ha,

We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n’efu, ebe uzọ nādighi.

41 Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n’ala nọ n’ebe di elu,

Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu.

42 Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;

Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya.

43 Onye ọ bula nke mara ihe gāriba kwa ihe ndia ama,

Ha gātukwasi kwa uche n’ebere nile nke Jehova.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 108

Abù, Abù Ọma Devid.

1 Edoziwo obim, Chineke;

M’gābù abù, e, m’gābù abù ọma, ọbuná nsọpurum ka m’gēji bù abù.

2 Teta, une na ubọ-akwara: M’gākpọte chi-ọbubọ.

3 M’gēkele Gi n’etiti ndi nile di iche iche, Jehova:

M’gābùku kwa Gi abù ọma netiti mba nile.

4 N’ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe,

Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.

5 Me Onwe-gi ka I di elu n’elu elu-igwe nile, Chineke:

Ka ebube-Gi di kwa n’elu uwa nile.

6 Ka ewe dọputa ndi I huru n’anya,

Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.

7 Chineke ekwuwo okwu n’idi-nsọ-Ya: ka m’ṅuria ọṅu-agha:

M’gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.

8 Mu nwe Gilead; mu nwe Manase;

Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;

Juda bu nkpa-n’aka-ezem.

9 Moab bu ite ọsisa-arum;

N’elu Edom ka m’gātu akpukpọ-ukwum:

N’aru Filsitia ka m’gēti nkpu.

10 Ònye gēdubàm nke-ọma n’obodo ewusiri ike?

Ònye duruworom rue Edom?

11 Ọ̀ bughi Gi, Chineke, juworo ayi aju?

I dighi-apu kwa ije agha n’etiti usu nile nke ndi-agha-ayi, Chineke.

12 Yere ayi aka ka ayi pua n’aka onye-nkpab͕u:

N’ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.

13 Nime Chineke ayi gēme ihe dìnkpà:

Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpabu ayi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 109

Abú Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti;

2 N’ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem:

Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu.

3 Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu,

We busom agha n’efu.

4 N’ọnọdu ihu-n’anya m’huru ha ha nēmegidem:

Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.

5 Ha we tukwasim ihe ọjọ n’ọnọdu ezi ihe,

Na ikpọ-asì n’ọnọdu ihu-n’anyam.

6 Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:

Ka onye-nmegide guzo kwa n’aka-nri-ya.

7 Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;

Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.

8 Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;

Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.

9 Ka umu-ya buru umu-nb͕ei,

Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.

10 Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ;

Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n’ebe di anya.

11 Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà;

Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n’ọlu inweta n’agha.

12 Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;

Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.

13 Ka eriri-umu-ya diri nbipu;

N’ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.

14 Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà;

Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.

15 Ka ha di n’iru Jehova mb͕e nile,

Ka O we bipu ncheta-ha n’uwa.

16 N’ihi na o chetaghi ime ebere,

O we sob͕ue nwoke ewedara n’ala na ob͕eye,

Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua.

17 Ọ hu-kwa-ra nkọcha n’anya, o we biakute ya;

Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n’ebe ọ nọ.

18 O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya,

O we ba nime ya dika miri,

Ba kwa n’ọkpukpu-ya nile dika manu.

19 Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya,

Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile.

20 Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n’aka Jehova bia,

Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.

21 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n’ihi aha-Gi:

N’ihi na ebere-Gi di nma, naputam.

22 N’ihi na onye ewedara n’ala na ob͕eye ka m’bu,

Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.

23 Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n’ọdida anyanwu, otú a ka m’laworo:

Arurupuwom dika igurube.

24 Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n’obubu-ọnu;

Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba.

25 Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta:

Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha.

26 Yerem aka, Jehova, Chinekem;

Zọputam dika ebere-Gi si di:

27 Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu;

Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya.

28 Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi:

Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.

29 Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe,

Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.

30 M’gēwere ọnum kele Jehova nke-uku;

E, n’etiti ọtutu madu ka m’gēto Ya.

31 N’ihi na O gēguzo n’aka-nri nke ob͕eye,

Izọputa ya n’aka ndi nēkpe nkpuru-obi-ya ikpe.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 110

Abù Ọma Devid.

1 Ihe nke si n’ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n’aka-nrim,

Rue mb͕e M’gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.

2 Nkpa-n’aka nke ike-gi ka Jehova gēsi na Zaion ziputa:

Gi nwe ike n’aru madu n’etiti ndi-iro-gi.

3 Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n’ubọchi usu-ndi-agha-gi;

N’ima-nma nile nke idi-nsọ, site n’afọ nke ututu;

Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.

4 Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya,

Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi

Dika usoro Melkizedek si di.

5 Onye-nwe-ayi n’aka-nri-gi

Amapúwo ndi-eze n’ubọchi iwe-Ya.

6 Ọ gēkpe ikpe n’etiti mba nile,

Ebe nile juputara n’ozu;

Ọ mapúwo isi madu n’elu ọtutu ala.

7 Miri nke sitere na miri-iyi nke di n’uzọ ka Ọ gāṅu:

N’ihi nka ka Ọ gēweli isi-Ya elu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 111

1 Tonu Ja.

M’gēwere obim nile kele Jehova,

N’ìzu nzuzo nke ndi ziri ezi, na nime nzukọ Israel.

2 Ọlu nile nke Jehova di uku,

Buru ihe ndi nile ha nātọ utọ nāchọputa.

3 Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu:

Ezi omume-Ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

4 Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile:

Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu.

5 Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya:

Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi.

6 O gosiwo ndi-Ya ike nke ọlu-Ya nile,

N’inye ha ihe-nketa mba nile.

7 Ọlu nile nke aka-Ya bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi;

Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ukpuru-Ya nile bu.

8 Ihe anākwagide rue mb͕e nile ebighi-ebi ka ha bu,

Ha bu ihe anēme n’ezi-okwu na izi-ezi.

9 Nb͕aputa ka O ziteworo ndi-Ya;

O nyewo ọb͕ub͕a-ndu-Ya iwu rue mb͕e ebighi-ebi:

Ihe di nsọ na ihe anātu egwu ka aha-Ya bu.

10 Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu;

Ezi uche ka ndi nile nēme ha nwere:

Otuto-Ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 112

1 Tonu Ja.

Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova.

Nke ihe nile O nyere n’iwu nātọ utọ nke-uku.

2 Ndi-dike ka nkpuru-ya gābu n’uwa:

Agāgọzi ọb͕ọ ndi ziri ezi.

3 Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n’ulo-ya:

Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

4 Ihè awaliwo n’ọchichiri nye ndi ziri ezi:

Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume.

5 Ọ diri nwoke ahu nma, bú onye nēme-ebere, nēbinye kwa madu ihe;

Ọ gākwagide okwu-ya nile n’ikpé.

6 N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n’onọdu-ya:

Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.

7 Ọ gaghi-esite n’ihe ọjọ anuworo tu egwu:

Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi Jehova obi.

8 Ihe anākwagide ka obi-ya bu, ọ gaghi-atu egwu,

Rue mb͕e ọ gēlekwasi ndi nākpab͕u ya anya.

9 Ọ ghasawo àkù-ya, o nyewo ndi-ob͕eye ihe;

Ezi omume-ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:

Agēwere nsọpuru me ka mpi-ya di elu.

10 Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe;

Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa:

Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n’iyì.