Categories
JOB

JOB 15

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2 Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za?

Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n’ifufe Iru-anyanwu?

3 Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n’ihe ru uka,

Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?

4 E, gi onwe-gi nēmebi egwu,

Nēbilata kwa ntughari-uche n’iru Chineke.

5 N’ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe,

I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.

6 Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem;

Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.

7 Ì bu madu mbu amuru?

Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?

8 Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti?

Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?

9 Gini ka i mara nke ayi nāmaghi?

Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?

10 Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n’etiti ayi,

Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.

11 Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà,

Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?

12 Gini mere obi-gi ji ebupu gi?

Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?

13 Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke,

We me ka okwu nile di otú a si n’ọnu-gi puta.

14 Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n’obi,

Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?

15 Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;

Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n’anya-Ya.

16 Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n’anya-Ya,

Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?

17 M’gēkwuputara gi, gem nti;

Ma nka ka m’huworo, m’gākọ kwa ya:

18 (Nke ndi mara ihe nēgosi

Site na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;

19 Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,

Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n’etiti ha:)

20 Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali,

Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.

21 Olu oké egwu di na nti-ya abua;

Mb͕e ọ nọ n’udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:

22 Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n’ochichiri lata,

Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:

23 Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di?

Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n’aka-ya:

24 Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku;

Ha nwere ike n’aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha:

25 N’ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke,

Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;

26 Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya,

Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:

27 Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya,

Me ka abuba nke di arọ́ di n’úkwù-ya;

28 O we biri n’obodo ezopuru n’uwa,

Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha,

Nke ejikereworo ighọ obo-ihe.

29 Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike,

Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n’uwa.

30 Ọ gaghi-esi n’ọchichiri wezuga onwe-ya;

Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku,

Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n’iku-ume nke ọnu-Ya.

31 Ka ọ ghara ikwere n’ihe-efu, eduhiewo ya:

N’ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.

32 Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya,

Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu.

33 Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine,

Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.

34 N’ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa,

Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.

35 Ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe,

Afọ-ha nēdozi kwa aghughọ.

Categories
JOB

JOB 16

1 Job we za, si,

2 Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia:

Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu.

3 Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu?

Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?

4 Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu;

Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n’ọnọdu nkpuru-obim,

M’gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu,

Na ifufe isim imegide unu.

5 M’gēwere ọnum b͕a unu ume,

Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.

6 Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um:

Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n’arum la?

7 Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum:

I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu.

8 I we jisiem ike, ọ ghọwo ihe-àmà megidem:

Ọtita-arum we nēbili imegidem, Ọ nāzam n’iru.

9 Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì;

Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya:

Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n’arum.

10 Ha asaghepuwo ọnu-ha n’arum,

Were ita-uta tiem aka na ǹtì:

Ha nāchikọzu onwe-ha n’otù imegidem.

11 Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume,

N’aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.

12 Anọm n’udo, O we mebiem;

Ọzọ, O jidewo olum, piajisiam,

Me ka m’biliere Onwe-ya ibu ihe O dotara ib͕a àkú.

13 Àkú-Ya nile dim buruburu,

Ọ nāb͕awa akurum, Ọ dighi-enwe kwa ọmiko n’arum;

Ọ nāwusi òlùlùm n’ala.

14 O nētipúm ntipú n’elu ntipú-ibe-ya;

Ọ nāb͕akwasim dika dike.

15 Ákwà-nkpe ka m’dukọtaworo n’elu akpukpọ-arum,

Turughari mpim n’ájá.

16 Irum nācha ọbara-ọbara site n’ikwa-ákwá,

Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;

17 Ọ bughi n’ihi na ihe-ike di n’ọbu-akam,

Ekperem di kwa ọcha.

18 Ala, ekpuchila ọbaram,

Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.

19 Ọbuná ub͕u a, le, n’elu-igwe ka Onye-àmàm nọ,

Onye nēkwurum nọ kwa n’ebe di elu.

20 Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò:

Ma ọ bu n’ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;

21 Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka,

Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.

22 N’ihi na arọ ole-na-ole gābia,

M’we je n’uzọ m’gaghi-alaghachi.

Categories
JOB

JOB 17

1 Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia,

Ílì dirim.

2 N’ezie ikwa-emò diyerem,

Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n’ikpasu-obi-ilu nile ha.

3 Biko, do ihe-ibe, burum onye-mbe n’ebe Gi onwe-gi nọ;

Ònye ka ọ bu, bú onye gānaram n’aka?

4 N’ihi na I zopuwo obi-ha n’inwe ezi uche:

N’ihi ya I gaghi-ebuli ha elu.

5 Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè,

Ọbuná anya umu-ya gādala n’isi.

6 Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche;

Onye ha nābusa ọnu-miri n’iru-ya ka m’ghọwo-kwa-ra.

7 Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe,

Ihe dim n’aru di ka onyinyo, ha nile.

8 Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n’aru,

Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.

9 Ma onye ezi omume gējisi ike n’iso uzọ-ya,

Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n’iru n’iru n’inwe ume.

10 Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia:

Ma m’gaghi-achọta onye mara ihe n’etiti unu.

11 Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile,

Bú ihe-nnweta nke obim.

12 Ha nēdo abali n’ọnọdu ehihie:

Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri.

13 Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm;

Ọ buru na ab͕asawom utem n’ọchichiri;

14 Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu;

Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;

15 Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a?

Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?

16 Rue ihe di n’ala-mọ ka ha gārida,

Ọ buru na izu-ike adirim otù mbe ahu n’ájá.

Categories
JOB

JOB 18

1 Bildad, bú onye Shua, we za, si,

2 Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà?

Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.

3 Gini mere aguworo ayi ka anumanu?

Ayi aghọwo ndi ruru árú n’anya-unu.

4 Ọ nādọka onwe-ya n’iwe-ya.

Àgārapu uwa n’ihi gi?

Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n’ọnọdu-ya?

5 Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,

Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.

6 Ìhè aghọwo ọchichiri n’ulo-ikwū-ya,

Agēmenyu kwa oriọna-ya n’elu ya.

7 Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,

Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.

8 N’ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n’ub͕u eji eb͕u anu,

Ọ nējeghari kwa n’elu ihe-ntuhi.

9 Ib͕udu gādakwasi ya n’ikiri-ukwu,

Ọnyà gāma ya.

10 Ezobeworo ya udọ̀ n’ala,

Na ihe iji nwude ya n’elu uzọ.

11 Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu,

Ha we chugharia ya n’ukwu-ya.

12 Agu ganāgu ume-ya,

Edoziwo kwa nhuju-anya n’akuku-ya.

13 Ọ gēripia ihe di n’akpukpọ-aru-ya,

Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n’aru.

14 Agādọpusi ya ike n’ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;

Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.

15 Ihe nābughi nke ya gēbi n’ulo-ikwū-ya:

Agēfesa brimstone n’elu ebe-obibi-ya.

16 Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n’okpuru,

Agēbipu kwa alaka-ya n’elu.

17 Ncheta-ya alawo n’iyì pua n’uwa,

Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n’èzí.

18 Agākwapu ya n’ihè ba n’ọchichiri,

Agēme kwa ka o si n’elu-uwa dum madu bi waghari.

19 Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n’etiti ndi-ya,

Ọ dighi kwa onye fọduru n’ọnọdu-ọbìa-ya nile.

20 Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n’akuku Ọdida-anyanwu n’aru,

Ndi bi n’akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.

21 Otú ọ di, ndia bu ebe-obibi nke ajọ omume,

Nka bu kwa ebe onye nāmaghi Chineke.

Categories
JOB

JOB 19

1 Job we za, si,

2 Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú?

Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam?

3 Ub͕ò iri ndia ka unu nēme ka ihere mem:

Ihere adighi-eme unu na unu nēmejọm.

4 Ọzọ kwa, ọ bu ezie na emehiewom n’amaghi-ama,

Ma n’ebe m’nọ ka nmehiem m’mehiere n’amaghi-ama di.

5 Ọ buru na ọ bu ezie na ọ bu imegidem ka unu nēme onwe-unu uku,

Ọ buru kwa na unu ewere ita-utam som ru uka:

6 Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m’bagọ ab͕agọ,

Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.

7 Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam:

Anametiku Chineke, ma ikpé adighi.

8 Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m’gaghi-agabiga kwa,

N’uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.

9 O yipuwo nsọpurum n’arum dika uwe,

We wezuga okpu-eze n’isim.

10 Ọ nākwatum buruburu, m’we la:

O we ropu olile-anyam dika osisi.

11 O me ka iwe-Ya di ọku imegidem,

Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.

12 Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem,

Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm.

13 O mewo ka umu-nnem nọpurum n’ebe di anya,

Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n’ebe m’nọ.

14 Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo,

Ndi m’mara echezọwokwam.

15 Ndi nọ n’ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n’onye ala ọzọ:

Onye anāmataghi ka m’ghọworo n’anya-ha.

16 Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam,

Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara.

17 Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n’ebe nwunyem nọ,

Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara.

18 Ọbuná umu nāṅu ara ajuwom;

Ọ buru na ebiliem, ha we nēkwugidem.

19 Ndi-ìzum nile nākpọm ihe-árú:

Ndi ahu m’huru n’anya echighariwo imegidem.

20 Ọkpukpum nārapara n’akpukpọ-arum na n’anu-arum,

M’we were akpukpọ ezém wepuga onwem.

21 Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm;

N’ihi na aka Chineke emetuwom n’aru.

22 N’ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke?

N’ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ?

23 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n’akwukwọ ub͕u a!

Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n’akwukwo!

24 Ma asi na eji pen ígwè na òpù

Ka ha n’oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi!

25 Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu,

Na O gēbili kwa ọtọ n’elu ájá n’ikpe-azu:

26 Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka,

Ọ bu na m’gēsi n’anu-arum hu Chineke:

27 Onye mu onwem gāhuru onwem,

Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ.

Akurum abua agwusiwo n’imem.

28 Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya?

Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;

29 Tuanu ujọ n’iru mma-agha:

N’ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha,

Ka unu we mara na ikpé di.

Categories
JOB

JOB 20

1 Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2 N’ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim,

Ọbuná n’ihi ime-ngwam nke di nimem.

3 Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n’ọnọdu-ihere,

Mọ nke nghọtam nāzakwam.

4 Ì mawo nka site na mb͕e ochie,

Site na mb͕e edoro madu n’elu uwa,

5 Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,

Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?

6 Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,

Isi-ya ewe metu igwe-oji;

7 Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n’iyì rue mb͕e ebighi-ebi:

Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?

8 Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:

Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.

9 Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;

Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.

10 Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,

Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.

11 Ọkpukpu-ya nile juputara n’ume okorọbia-ya,

Ma o gēso ya dina n’elu ájá.

12 Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n’ọnu-ya,

Ọ buru na o zobe ya n’okpuru ire-ya;

13 Ọ buru na o nwe ọmiko n’aru ya, we ghara irapu ya,

Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;

14 Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo,

Ọ bu òlùlù aju-ala n’ime-ya.

15 O lodawo àkù, we b͕oputa ya:

Chineke gēsi n’afọ-ya napu ya àkù ahu.

16 Nsi aju-ala ka ọ gāmiri:

Ire agwọ gēb͕u ya.

17 Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,

Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.

18 Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n’ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;

Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.

19 N’ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;

Ọ napuwo ulo n’ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.

20 N’ihi na ọ dighi-ama udo n’afọ-ya,

Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.

21 Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;

N’ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.

22 N’ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:

Aka onye ọ bula nke nọ n’ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.

23 Ka o rue, n’iriju afọ-ya,

Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya,

Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.

24 Ọ gēsi n’ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga,

Uta ọla gāb͕apue ya.

25 Ọ dọputawo ya, o we si n’aru-ya puta:

Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n’òlùlù-ya puta;

Oké ujọ nile di n’aru ya.

26 Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba:

Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya;

Ọ gērechapu ihe fọduru n’ulo-ikwū-ya.

27 Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya,

Ala nēbili kwa imegide ya.

28 Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n’ala ọzọ,

Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n’ubọchi iwe-Ya.

29 Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n’aka Chineke,

Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.

Categories
JOB

JOB 21

1 Job we za, si,

2 Nurunu okwum nke-ọma;

Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu.

3 Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu;

Ma mb͕e m’kwusiri okwu, i gāchì ọchì.

4 Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m’nātamuru ntamu?

Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ?

5 Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n’aru,

Tukwasi-kwa-nu aka n’ọnu.

6 Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji,

Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum.

7 Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu,

Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà?

8 Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n’iru ha,

Emewo kwa ka umu nke putara n’aru-ha guzosie ike n’anya-ha.

9 Ulo-ha di n’udo pua n’oké egwu,

Nkpa-n’aka Chineke adighi kwa n’aru ha.

10 Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie;

Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime.

11 Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu,

Umu-ha nēte kwa egwú.

12 Ha nēweli olu-ha n’egwú-otiti na ubọ-akwara,

Nāṅuri kwa ọǹu n’olu ọ̀jà.

13 Ha nāla ubọchi nile ha n’iyì n’ọdi-nma,

Ma n’otù ntabi-anya ha nārida n’ala-mọ.

14 Ha we si Chineke, Si n’ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi;

N’ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ.

15 Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya?

Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ?

16 Le, ọ bughi n’aka-ha ka ọdi-nma-ha di:

Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n’ebe m’nọ.

17 Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu?

Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha?

Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n’iwe-Ya?

18 Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n’iru ifufe,

Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?

19 Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya.

Ka Ọ kwughachi onye ahu n’onwe-ya, ka o we mara ya.

20 Ka anya-ya abua hu nbibi-ya,

Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.

21 N’ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri,

Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n’etiti?

22 Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.

23 Otù onye nānwu n’ume-ya zuru okè,

Mb͕e ọ nānọzu jū na n’udo:

24 Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,

Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.

25 Onye ọzọ nānwu n’ilu nkpuru-obi,

Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.

26 Ha abua n’otù, n’elu ájá ka ha nēdinakọ,

Ikpuru nēkpuchi kwa ha.

27 Le, amawom èchìchè-unu,

Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.

28 N’ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di?

Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?

29 Ùnu ajughi ndi nāgabiga n’uzọ?

Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha?

30 Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ?

Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?

31 Ònye gēgosi uzọ-ya n’iru ya?

Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya?

32 Ma agēburu onye ahu rue ílì,

Ọ gēche kwa nche n’elu obo-ya.

33 Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ,

Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n’azu,

Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ.

34 Ùnu si kwa aṅa kasiem obi n’efu, Ebe nání nmekpu fọduru nime nzaghachi nile unu?

Categories
JOB

JOB 22

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2 Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n’ihe?

É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n’ihe.

3 Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume?

Ma-ọbu ọ̀ bu urù n’ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè?

4 Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba,

We so gi ba n’ikpé?

5 Ìhe ọjọ gi abaghi uba?

Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.

6 N’ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n’efu,

Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.

7 I dighi-eme ka onye nāda #mbà ṅua miri,

I nēb͕ochi kwa nri n’ebe onye-agu nọ.

8 Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa;

Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.

9 I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n’aka efu,

Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.

10 N’ihi ya ib͕udu di gi buruburu,

Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,

11 Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya,

Na njubiga miri nēkpuchi gi.

12 Chìneke anọghi n’ebe di elu nke elu-igwe?

Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!

13 I we si, Gini ka Chineke mara?

Ò gēsi n’azu oké ochichiri kpe ikpe?

14 Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ;

Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.

15 Ì gēdebe uzọ ochie,

Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu?

16 Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi,

Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:

17 Ndi nāsi Chineke, Si n’ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi:

Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?

18 Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n’ezi ihe:

Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n’ebe m’nọ.

19 Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;

Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:

20 Si, N’ezie ezopuwo ha n’uwa, bú ndi nēbili imegide ayi,

Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.

21 Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n’udo:

Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.

22 Biko, nara iwu n’ọnu-Ya,

Do kwa okwu-Ya nile n’obi-gi.

23 Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo;

I gēme ka ajọ omume di anya n’ebe ulo-ikwū-gi nile di.

24 Tọb͕ọ kwa àkù-gi n’elu ájá,

Na ọla-edo Ofia n’etiti nkume miri-iyi;

25 Onye puru ime ihe nile gābu kwa àkù-gi,

Ọla-ọcha di oké ọnu-ahia ka Ọ gābu-kwa-ra gi.

26 N’ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ,

I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.

27 I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi;

I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.

28 I gēkwubì kwa okwu, ewe me ka o guzosiere gi ike;

Ìhè gāmukwasi kwa uzọ-gi nile.

29 Mb͕e ha gēme ka i di ala, i gāsi, Nweli-elu di;

Onye anya-ya ruru ala ka Ọ gāzọputa kwa.

30 Ọ gēme ka onye nābughi onye nēmeghi ihe ọjọ wepuga onwe-ya:

E, o werewo idi-ọcha nke ọbu-aka-gi abua wepuga onwe-ya.

Categories
JOB

JOB 23

1 Job we za, si,

2 Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu:

Akam di arọ́ n’ihi ize-umem.

3 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m’gāchọta Ya!

Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike!

4 Ka m’do ikpém n’usoro n’iru Ya,

Meju kwa onum n’iru-uka.

5 Kam’mara okwu nile Ọ gāzaghachim,

Ka m’ghọta kwa ihe Ọ gāsim.

6 Ọ̀ bu n’uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe?

É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.

7 N’ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka;

Ewe me ka m’b͕apu n’aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.

8 Le, m’ga n’iru, ma Ọ nọghi ya;

M’ga kwa n’azu, ma adighm-ahuta Ya:

9 M’ga n’aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya:

Ọ nēkpuchi Onwe-ya n’aka-nri, m’we ghara ihu Ya.

10 N’ihi na Ọ mawo uzọ m’nāga;

Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m’gāputa.

11 Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso;

Uzọ-Ya ka m’debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.

12 Adighm-apu kwa n’ihe enyere n’iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya;

Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.

13 Ma Ya onwe-ya nọ n’otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya?

Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.

14 N’ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm:

Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n’aka-Ya.

15 N’ihi ya ka m’nāma jijiji n’iru Ya;

Anamaghọta, m’nātu kwa oké egwu Ya.

16 N’ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri,

Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m’ma jijiji:

17 N’ihi na ekpochapughm n’iru ọchichiri,

O kpuchighi kwa oké ọchichiri n’irum.

Categories
JOB

JOB 24

1 Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e?

Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile?

2 Ufọdu nēwezuga ókè-ala;

Ha anapuwo kwa ìgwè aturu n’ike, we nāzù ha.

3 Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei,

Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n’ihe-ibe.

4 Ha nēsi n’uzọ wezuga ndi-ob͕eye:

Ndi ewedara n’ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n’otù.

5 Le, dika inyinya-ibu-ọhia n’ọzara

Ka ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike;

Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri.

6 N’ọhia ka ha nile n’otù n’otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi;

Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n’ubi-vine onye nēmebi iwu.

7 Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,

Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n’oyi.

8 Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha,

Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume.

9 Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n’ara n’ike,

Nara kwa onye ewedara n’ala ihe-ibe:

10 Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,

N’agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;

11 N’etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu;

Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku.

12 Ha nēsi n’obodo ndikom sua udè,

Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke:

Ma Chineke adighi-agu ya n’ihe-nzuzu.

13 Ndi ahu nọ n’etiti ndi nānupu isi n’okpuru ìhè;

Ha amataghi uzọ-ya nile,

Ha ebighi kwa n’okporo-uzọ-ya nile.

14 Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n’ala na ob͕eye;

N’abali kwa ọ di ka onye-ori.

15 Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama,

Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim:

Ọ nēzobe iru-ya.

16 O gwupúwo ulo n’ọchichiri:

N’ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ;

Ha amaghi ìhè.

17 N’ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu;

N’ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.

18 Onye di nfe n’elu miri ka ọ bu;

Anākọcha òkè-ha n’uwa:

Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru.

19 Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n’ike:

Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo.

20 Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n’oriri;

Agaghi-echeta kwa ya ọzọ:

Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.

21 Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa;

Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma.

22 Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n’ike-Ya:

O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu.

23 Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya;

Ma anya-Ya dikwasi n’uzọ nile ha.

24 Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi;

Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile,

Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.

25 Ma ọ buru na ọ dighi otú a ub͕u a, ònye gēme ka amara na abum onye-ugha,

Me okwum ka ọ buru ihe-efu?