Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 18

1 O rue, n’arọ nke-atọ nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Hezekaia nwa Ehaz, bú eze Juda, malitere ibu eze.

2 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abi nwa-nwayi Zekaraia.

3 O me ihe ezi ziri n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.

4 Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n’ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan.

5 Ọ bu na Jehova, bú Chineke Israel, ka ọ tukwasiri obi; mb͕e ọ nwusiri ọ dighi kwa onye ọzọ di ka ya n’etiti eze nile nke Juda, ma-ọbu n’etiti ndi buru ya uzọ.

6 O we rapara Jehova n’aru, o sighi n’iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n’iwu, bú nke Jehova nyere Moses n’iwu.

7 Jehova nọye-kwa-ra ya; n’ebe o bula ọ nāpu o nwere uche: o we nupu isi n’okpuru eze Asiria, o fèghi kwa ya òfùfè.

8 Ya onwe-ya tib͕uru ndi Filistia rue Geza na ókè-ala-ya nile, site n’ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.

9 O rue, n’arọ nke-anọ nke eze, bú Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-asa nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide Sameria, nọchigide ya n’agha.

10 Ha we were ya n’ọgwugwu arọ atọ: ọ bu n’arọ nke-isi nke Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-iteghete nke Hoshea, bú eze Israel, ka ewere Sameria.

11 Eze Asiria we me ka Israel je biri n’Asiria, o we me ka ha nọdu nime Hala na nime Haboa, n’osimiri Gozan, na n’obodo ndi Midia:

12 n’ihi na ha egeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, we gabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya, bú ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere n’iwu, ha anughi kwa ya, ha emeghi kwa ya.

13 Ma n’arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha.

14 Hezekaia, bú eze Juda, we zigara eze Asiria ozi rue Lekish, si, Emehiewom; si n’ebe m’nọ laghachi: ihe i gēbom m’gēburu ya. Eze Asiria we tukwasi Hezekaia, bú eze Juda, ọgu talent ọla-ọcha iri-na-ise na orú talent ọla-edo na iri.

15 Hezekaia we nye ya ọla-ọcha nile nke anāchọta n’ulo Jehova, na n’àkù nile nke ulo eze.

16 Na mb͕e ahu ka Hezekaia bipuru ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Jehova, na ogidi nile nke Hezekaia, bú eze Juda, jiri ọla-edo machita, o were ha nye eze Asiria.

17 Eze Asiria we si na Lekish zie Tatan na Rab-saris na Rabshake jekuru eze, bú Hezekaia, ha na oké usu-ndi-agha, rue Jerusalem. Ha we rigo biarue Jerusalem. Ha we rigo, bia, guzo n’akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n’elu, nke di n’uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.

18 Ha we kpọ eze òkù, Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ha.

19 Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi?

20 I nāsi, (ma ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu) Ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha. Ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n’okpurum?

21 Ub͕u a, le, i tukwasiworo onwe-gi obi n’aru nkpa-n’aka amì a piara apia, bú n’aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n’ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n’ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.

22 Ma ọ buru na unu asim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu onye Hezekaia wezugara ebe nile Ya di elu na ebe-ichu-àjà-ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N’iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala nime Jerusalem?

23 Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m’nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha.

24 Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n’aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?

25 Ub͕u a ọ̀ bu n’ejighi Jehova ka m’rigoro imegide ebe a ibibi ya?

26 Jehovah sirim, Rigo imegide ala nka, bilie ya. Elaiakim nwa Hilkaia, na Shebna, na Joa, we si Rabshake, Biko, gwa ndi orù-gi okwu n’asusu Siria; n’ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: akpaye-kwa-la ayi uka n’asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n’elu mb͕idi.

27 Rabshake we si ha, Ọ̀ bu n’ihi onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n’ihi ndikom ahu ndi nānọdu n’elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha ṅu kwa nwa-miri-ha?

28 Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n’asusu ndi-Ju, kwue, si, Nurunu okwu eze uku ahu, bú eze Asiria.

29 Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu; n’ihi na ọ pughi inaputa unu n’aka-ya:

30 unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi, agaghi-enye kwa obodo a n’aka eze Asiria.

31 Unu egela Hezekaia nti: n’ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya;

32 rue mb͕e m’biara chiri unu je n’ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi.

33 Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n’aka eze Asiria ma-ọli?

34 Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim na Hina na Iva di? hà anaputawo Sameria n’akam?

35 Òle ndi n’etiti chi nile nke ala dum ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n’akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n’akam?

36 Ma ndi-Ju b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n’ihi na ihe eze nyere n’iwu bu nka, si, Unu azala ya.

37 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 19

1 O rue, mb͕e eze, bú Hezakaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n’ulo Jehova.

2 O we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na ndi-okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia, bú onye-amuma, nwa Emoz.

3 Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n’ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha.

4 Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: buli kwa ekpere-gi n’ihi ndi fọduru ndi ahutaworo.

5 Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia.

6 Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n’ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum.

7 Le, M’nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n’ala-ya; M’gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n’ala-ya.

8 Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka o nēbuso Libna agha: n’ihi na ọ nuru na o siwo na Lekish bulie ije.

9 O we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Le, ọ putawo ibuso gi agha: o we zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia ọzọ, si,

10 Otú a ka unu gāgwa Hezekaia, bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si Agaghi-enye Jerusalem n’aka eze Asiria.

11 Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n’iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi?

12 Chi nile nke mba nile ọzọ hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Edem, ndi nọ na Telasa?

13 Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?

14 Hezekaia we nata akwukwọ n’aka ndi-ozi ahu, gua ha: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n’iru Jehova.

15 Hezekaia we kpe ekpere n’iru Jehova, si, Jehova, bú Chineke Israel, Onye nēbi n’etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.

16 Jehova, tọ nti-Gi n’ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke o jiri zite ya ita Chineke di ndu uta.

17 N’ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka mba nile na ala nile ha tọb͕ọrọ n’efu,

18 ha etiyewo kwa chi nile ha n’ọku, n’ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n’ihì.

19 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, biko, zọputa ayi n’aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, nání Gi.

20 Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú, a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya.

21 Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion, elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n’iru; ada Jerusalem efufewo isi n’azu gi.

22 Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.

23 I siri n’aka ndi-ozi-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu ime, rue akuku nile Lebanon; m’gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m’gābà kwa n’ebe-nnọdu-abali nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.

24 Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri ala ọzọ, m’gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.

25 Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M’meworo ya, na ọ bu n’ubọchi mb͕e ochie ka M’kpuworo ya? ub͕u a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n’efu.

26 Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ọka chanwuru achanwu tutu o tolite.

27 Ma amawom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem.

28 N’ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n’ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M’gētiye kwa nb͕a-aka-imim n’imi-gi, na bridle nkem n’eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n’uzọ ahu nke i siri bia.

29 Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n’arọ a ihe nēpu n’onwe-ya, na n’arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n’arọ nke-atọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n’ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha.

30 Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n’ala n’okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n’elu.

31 N’ihi na ọ bu na Jerusalem ka ndi fọduru afọdu gēsi puta, ndi b͕apuru ab͕apu gāputa kwa n’ugwu Zaion: ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.

32 N’ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n’obodo a, ọ gaghi-ab͕a kwa otú àkú n’ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n’iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya.

33 N’uzọ o siri bia, n’uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n’obodo a, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

34 M’gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n’ihi Onwem, na n’ihi Devid, bú orùm.

35 O rue, n’abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n’ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n’isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.

36 Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.

37 O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n’ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n’ala Ararat. Isa-hadon nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 20

1 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n’ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu.

2 O we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova, si,

3 Biko, Jehova, biko, cheta otú m’jeghariworo n’iru Gi n’ezi-okwu na n’obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n’anya-Gi ka m’meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.

4 O rue, mb͕e Aisaia akāpughi ba n’etiti obodo, na okwu Jehova ruru ya nti, si,

5 Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M’nēme ka aru-gi di ike: n’ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova.

6 M’gātukwasi kwa arọ iri na ise n’ubọchi-gi, naputa kwa gi na obodo a n’ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a n’ihi Onwem na n’ihi Devid, bú orùm.

7 Aisaia we si, Werenu mbadamba fig. Ha we were ya tukwasi ya n’elu ihe-ofifi ahu, o we diri ndu.

8 Hezekaia we si Aisaia, Gini gābu ihe-iriba-ama na Jehova gēme ka arum di ike, m’we rigorue ulo Jehova n’ubọchi nke-atọ?

9 Aisaia we si, Nka gāburu gi ihe-iriba-ama sitere n’aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru: onyinyo, ọ̀ gāga n’iru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, ma-ọbu la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri?

10 Hezekaia we si, Ọ di nfe ka onyinyo ruru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri: é-è, kama ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri.

11 Aisaia, bú onye-amuma, we kpọkue Jehova: O we me ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, nke ọ ridara na nzọ-ukwu ebe-nrigo Ehaz.

12 Na mb͕e ahu Berodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: n’ihi na ọ nuru na Hezekaia riarárí ọria.

13 Hezekaia we ge ha nti, me ka ha hu ulo nile nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n’àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n’ulo-ya, ma-ọbu n’ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.

14 Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n’ala di anya ka ha si bia, bú Babilon.

15 Ọ si, Gini ka ha huru n’ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n’ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n’àkùm nile nke m’nēmeghi ka ha hu.

16 Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova.

17 Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n’ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n’ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri.

18 Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n’aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n’ulo uku eze Babilon.

19 Hezekaia we si Aisaia, Ọ di nma, bú okwu Jehova nke i kwuworo. Ọ si kwa, Ọ̀ bughi otú a, ma ọ buru na udo na ezi-okwu adi n’ubọchim nile?

20 Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na otú o mere ọdọ-miri, na uzọ-miri, we me ka miri rubata n’obodo, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

21 Hezekaia we so nna-ya-hà dina n’ọnwu: Manase nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 21

1 Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hefzi-ba.

2 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel.

3 Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya mere ka ha la n’iyì, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Beal, me kwa Ashera, dika Ehab, bú eze Israel, mere, ọ kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.

4 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n’ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M’gētiye aham.

5 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n’ogige abua nke ulo Jehova.

6 O me-kwa-ra ka nwa-ya mwoke gabiga nime ọku, o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, meso kwa onye nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.

7 Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke Ashera, bú nke o mere, n’ulo ahu nke Jehova siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, N’ulo a, na nime Jerusalem, nke M’rọputaworo n’ebo nile nke Israel, ka M’gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:

8 M’gaghi-eme kwa ka ukwu Israel si n’ala nke M’nyere ndi bu nna-ha waghari ọzọ; nání ọ buru na ha elezi anya ime dika ihe nile si di nke M’nyeworo ha n’iwu, na dika iwu nile si di nke orùm, bú Moses, nyēre ha n’iwu.

9 Ma ha anugh: Manase we me ka ha sihie uzọ ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n’iru umu Israel.

10 Jehova we kwue site n’aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma, si,

11 N’ihi na Manase, bú eze Juda, emewo ihe-árú ndia, we me ihe ọjọ kari ihe nile nke ndi-Amorait mere, ndi buru ya uzọ, o we were arusi-ya nile me ka Juda mehie kwa:

12 n’ihi ya otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M’nēme ka ihe ọjọ biakwasi Jerusalem na Juda, nke nti abua nke onye ọ bula nānu gāzu wuruwuru.

13 M’gēseti kwa n’elu Jerusalem eriri Sameria na ihe-ọtùtù ulo Ehab: M’gēhicha kwa Jerusalem dika madu si ehicha ọkwa, nēhicha ya, nēkpùta ya iru.

14 M’gārapu kwa ndi fọduru nke ihe-nketam, nye ha n’aka ndi-iro-ha; ha gāghọ-kwa-ra ndi-iro-ha nile ihe-nluta-n’agha na ihe ha nānara n’ike;

15 n’ihi na ha emewo ihe jọrọ njọ n’anyam, ha nākpasukwam ìwe, site n’ubọchi ndi bu nna-ha siri n’Ijipt puta, we rue ta.

16 Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n’otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.

17 Ma okwu Manase nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na nmehie-ya nke o mehiere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

18 Manase we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ubi ulo-ya ab͕ara ogige, n’ubi Uza ab͕ara ogige: Emon nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

19 Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e o malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Meshulemet nwa Haruz nke Jọtba.

20 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere.

21 O we je ije n’uzọ nile nke nna-ya jere, o we fè arusi òfùfè nke nna-ya fère, ọ kpọ isi ala nye ha:

22 o we rapu Jehova, bú Chineke nna-ya-hà, ọ jeghi kwa ije n’uzọ Jehova.

23 Ndi-orù Emon we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka eze nwua n’ulo-ya.

24 Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon; ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n’ọnọdu ya.

25 Ma ihe nile nke Emon mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

26 Ewe lìe ya n’ílì-ya n’ubi Uza ab͕ara ogige: Josaia nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 22

1 Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jedida nwa Adaia nke Bọkzat.

2 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, je ije n’uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe.

3 O rue, n’arọ nke-iri-na-asatọ nke eze Josaia, na eze zigara Shefan nwa Azalaia, nwa Meshulam, bú ode-akwukwọ, n’ulo Jehova, si,

4 Rigokuru Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, ka o we guzù ego ahu nke anēwebata n’ulo Jehova, nke ndi nēche nbata-uzọ chikọtaworo n’aka ndi Israel:

5 ka ha nye kwa ya n’aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n’ulo Jehova: ka ha nye kwa ya n’aka ndi nēje ozi nke di n’ulo Jehova, iji me ka ebe etipúru etipú di ike;

6 ka ha nye ya n’aka ndi-ọ̀kà n’osisi, na n’aka ndi nēwu ulo, na n’aka ndi nēdo nkume; na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ulo ahu di ike.

7 Nání na ha na ndi ahu agughi ego nke anēnye n’aka-ha; n’ihi na ọ bu n’ikwesi-ntukwasi-obi ka ndi ahu nēme ihe.

8 Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, we si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n’ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu, ọ gua ya.

9 Shefan, bú ode-akwukwọ, we biakute eze, weghachiri eze okwu, si, Ndi-orù-gi awupuwo ego ahu nke anāchọta n’ulo ahu, ha we nye ya n’aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova.

10 Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n’iru eze.

11 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke akwukwọ iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.

12 Eze we nye Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam nwa Shefan, na Akboa nwa Maikaia, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,

13 Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n’ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n’ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n’ihi ayi.

14 Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam, na Akboa, na Shefan, na Asaia, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tikva, nwa Hahas, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n’obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu.

15 Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,

16 Otú a ka Jehova siri, Le, M’nēme ka ihe ọjọ biarue ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú okwu nile nke akwukwọ ahu nke eze Juda guworo:

17 n’ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe muye ọnumam dika ọku megide ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.

18 Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,

19 n’ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n’iru Jehova, mb͕e i nuru ihe M’kwuru megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, na ha gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu na ihe-nkọcha, i we dọwa uwe-gi nile, kwa ákwá n’irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

20 N’ihi ya, le, M’gāchikọta gi na nna-gi-hà n’ala-mọ agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n’ílì-gi n’udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a. Ha we weghachiri eze okwu.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 23

1 Eze we ziga, ha we chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem n’ebe ọ nọ.

2 Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi nile ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi Juda nile, site n’onye ntà we rue onye uku: o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n’ulo Jehova.

3 Eze we guzo n’akuku ogidi, b͕a ndu n’iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n’iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n’akwukwọ a guzosie ike: ndi Juda nile we guzo n’ọb͕ub͕a-ndu ahu.

4 Eze we nye Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nke usoro nke-abua, na ndi nēche nbata-uzọ, iwu, isi n’ulo Jehova weputa ihe nile nke emeworo nye Beal, nye kwa Ashera, nye kwa usu nile nke ihe elu-igwe: o we sure ha ọku n’azu Jerusalem n’ọhia Kidron, būru ntu-ha je Bet-el.

5 O me-kwa-ra ndi-nchu-àjà arusi kwusi, bú ndi-eze Juda doro isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe nile di elu n’obodo Juda nile, na n’ebe di Jerusalem buruburu; o me-kwa-ra ka ndi ahu kwusi, bú ndi nēsurere Beal, na anyanwu, na ọnwa, na kpakpando nējeghari ejeghari, na usu nile nke ihe elu-igwe, ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

6 O si-kwa-ra n’ulo Jehova buputa Ashera je n’azu Jerusalem, rue miri-iyi Kidron, sure ya ọku n’akuku miri-iyi Kidron, supia ya me ka ọ di ka uzuzu, kpofue uzuzu-ya n’elu ílì ndi efu.

7 Ọ kwatu-kwa-ra ulo nile nke ndi edoro nsọ ikwa iko, nke di n’ulo Jehova, ebe ndinyom nākpara Ashera ulo-ikwū.

8 O me-kwa-ra ka ndi-nchu-àjà nile si n’obodo Juda nile bia, o meru-kwa-ra ebe nile di elu ebe ndi-nchu-àjà surere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, site na Geba rue Bia-sheba; ọ kwatu-kwa-ra ebe nile di elu nke ọnu-uzọ-ama nke di n’oghere ọnu-uzọ-ama Joshua, bú onye-isi obodo, nke di n’aka-ekpe madu n’ọnu-uzọ-ama obodo.

9 Nání na ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu adighi-arigo n’ebe-ichu-àjà Jehova nime Jerusalem, ma ha nēri achicha ekoghi-eko n’etiti umu-nne-ha.

10 O meru-kwa-ra Tofet, nke di na ndagwurugwu umu Hinom, ka nwoke ọ bula we ghara ime ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku rue Molek.

11 O me-kwa-ra ka inyinya nile kwusi, bú nke ndi-eze Juda nyere anyanwu, nime nbata ulo Jehova, n’akuku ime-ulo Netan-melek, bú onozi, nke di n’èzí ulo ahu; o sure-kwa-ra ub͕ọ-ala nile nke anyanwu n’ọku.

12 Ebe-ichu-àjà nile nke di n’elu ime-ulo-elu nke Ehaz, nke ndi-eze Juda mere, na ebe-ichu-àjà nile nke Manase mere n’ogige abua nke ulo Jehova, eze kwaturu ha, we si n’ebe ahu b͕a ọsọ, kpofue uzuzu-ha nime miri-iyi Kidron.

13 Ebe nile di elu nke di n’iru Jerusalem, nke di n’aka-nri ugwu nbibi, nke Solomon, bú eze Israel, wuru nye Ashtoret, bú ihe-árú ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú ihe-árú Moab, nye kwa Milkom, bú ihe-árú umu Amon, eze meru-kwa-ra ha.

14 O tipia-kwa-ra ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, were ọkpukpu madu mejue ọnọdu-ha.

15 Ọzọ kwa, ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, na ebe di elu nke Jeroboam nwa Nebat mere, bú onye mere ka Israel mehie, ọbuná ebe-ichu-àjà ahu na ebe ahu di elu ka ọ kwaturu; o sure ebe ahu di elu ọku, supia ya me ka ọ ghọ uzuzu, sure kwa Ashera ọku.

16 Josaia we chigharia onwe-ya, hu ílì nile nke di n’ebe ahu n’ugwu ahu; o we zìe, chipu ọkpukpu n’ílì nile, sure ha ọku n’elu ebe-ichu-àjà ahu, merua ya, dika okwu Jehova si di nke onye nke Chineke ahu kpọsara, bú onye kpọsara ihe ndia.

17 O we si, Gini bu ihe-iriba-ama ahu nke mu onwem nāhu? Ndikom obodo ahu we si ya, Ọ bu ílì onye nke Chineke, onye siri na Juda bia, kpọsa ihe ndia nke i meworo megide ebe-ichu-àjà Bet-el.

18 Ọ si, Ya nọduru onwe-ya; ka nwoke ọ bula ghara ichipu ọkpukpu-ya. Ha we rapu ọkpukpu-ya, ha na ọkpukpu onye-amuma ahu nke siri na Sameria bia.

19 Ọzọ kwa, ulo nile nke ebe nile di elu, nke di n’obodo nile nke Sameria, nke ndi-eze Israel mere ikpasu Jehova iwe, ha ka Josaia wezugara, me kwa ha dika omume nile si di nke o mere na Bet-el.

20 O b͕ue ndi-nchu-àjà nile nke ebe nile di elu nke di n’ebe ahu, n’elu ebe-ichu-àjà nile, o sure-kwa-ra ọkpukpu madu n’elu ha; o we laghachi na Jerusalem.

21 Eze we nye ndi Juda nile iwu, si, Merenu Jehova, bú Chineke-unu, ememe ngabiga, dika edeworo ya n’akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu nka.

22 N’ezie emeghi ememe ngabiga dika ememe ngabiga nka site n’ubọchi ndi-ikpe ndi kpere Israel, ọbuná ubọchi nile nke ndi-eze Israel, na nke ndi-eze Juda;

23 ma ọ bu n’arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Josaia, ka emere ememe ngabiga nka nye Jehova nime Jerusalem.

24 Ọzọ kwa, ndi nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa, na teraphim, na arusi nile, na ihe-árú nile nke ahuru n’ala Juda, na nime Jerusalem, ndia ka Josaia tkpochapuru, ka o we me ka okwu nile nke iwu guzosie ike, bú nke edeworo n’akwukwọ nke Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara n’ulo Jehova.

25 Ọ dighi eze nke buru ya uzọ di ka ya, onye were obi-ya nile, were kwa nkpuru-obi-ya nile, were kwa ike-ya nile, chigharikute Jehova, dika iwu nke Moses si di; ọ dighi kwa onye ọzọ dika ya biliri mb͕e ọ nwusiri.

26 Otú ọ di, Jehova esighi n’idi-ọku iwe uku Ya laghachi, nke iwe-Ya ji di ọku megide Juda, n’ihi nkpasu-iwe nile nke Manase kpasuru Ya.

27 Jehova we si, M’gēsi kwa n’irum wezuga Juda, dika M’wezugara Israel, M’gāju kwa obodo a nke M’rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M’siri, Aham gādi n’ebe ahu.

28 Ma okwu Josaia nile nke fọduru, na ihe nile nke o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

29 N’ubọchi-ya ka Fero-neko, bú eze Ijipt, rigoro imegide eze Asiria rue osimiri Yufretis: eze, bú Josaia, we je izute ya; o we me ka ọ nwua na Megido, mb͕e ọ huru ya.

30 Ndi-orù-ya we si na Megido buru ya nime ub͕ọ-ala mb͕e ọ nwuru anwu, ha we bubata ya na Jerusalem, lìe ya n’ílì-ya. Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, te ya manu, me ya eze n’ọnọdu nna-ya.

31 Jehoahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.

32 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya-hà mere.

33 Fero-neko we ke ya ab͕u nime Ribla n’ala Hemat, ka o we ghara ibu eze nime Jerusalem; o we tukwasi ala ahu nra, bú ọgu talent ọla-ọcha ise, na otù talent ọla-edo.

34 Fero-neko we me Elaiakim nwa Josaia eze n’ọnọdu Josaia nna-ya, gugharia ya aha Jehoiakim: ma o wepuru Jehoahaz; ọ biarue Ijipt, nwua n’ebe ahu.

35 Jehoiakim we nye Fero ọla-ọcha na ọla-edo ahu; nání na ọ ruru ala ọnu inye ego n’okwu-ọnu Fero: o were ihe-ike nara ndi ala ahu ọla-ọcha na ọla-edo, nwoke ọ bula dika ọ̀rùrù-ọnu-ya si di, inye ya Fero-neko.

36 Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Zebida nwa Pedaia nke Ruma.

37 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya-hà mere.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 24

1 N’ubọchi-ya Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoro, Jehoiakim we ghọrọ ya orù arọ atọ: o we chigharia nupu isi n’okpuru ya.

2 Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n’iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n’aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.

3 N’ezie n’okwu-ọnu Jehova ka ihe a di n’aru Juda, isi n’iru Ya wezuga ha, n’ihi nmehie nile nke Manase, dika ihe nile si di nke o mere;

4 ọzọ kwa, n’ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n’ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.

5 Ma okwu Jehoiakim nile fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

6 Jehoiakim we so nna-ya-hà dina n’ọnwu: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

7 Ma eze Ijipt esighi n’ala-ya puta ọzọ ma-ọli: n’ihi na eze Babilon ewerewo ihe nile eze Ijipt nwere site na miri-iyi Ijipt rue osimiri Yufretis.

8 Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze nime Jerusalem ọnwa atọ: aha nne-ya bu Nehushta nwa Elnetan nke Jerusalem.

9 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.

10 Na mb͕e ahu ka ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoruru Jerusalem, ewe nọchigide obodo ahu n’agha.

11 Nebukadneza, bú eze Babilon, we biarue obodo ahu, mb͕e ndi-orù-ya nānọchigide ya n’agha;

12 Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n’arọ nke-asatọ nke ọ bu eze.

13 O si n’ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n’ulo uku Jehova, dika Jehova siri.

14 O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n’ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu.

15 O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ.

16 Ndikom nile kwa ndi bu dìnkpà, nnù iri-na-asa na ọgu iri, na ndi-ọ̀kà na ndi-uzú, nnù abua na ọgu iri, ha nile bu ndi-dike, ndi nēbu agha, eze Babilon we me ka ha bia Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ.

17 Eze Babilon we me Matanaia nwa-nne nna-ya eze n’ọnọdu ya, gughari kwa ya aha Zedekaia.

18 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.

19 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoaiakim mere.

20 N’ihi na ọ bu n’ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n’iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n’okpuru eze Babilon.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 25

1 O rue, n’arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n’ọnwa nke-iri, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadneza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ọ ma ulo-ikwū megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.

2 Ewe nānọchigide obodo ahu n’agha rue arọ nke-iri-na-otù nke eze, bú Zedekaia.

3 N’ubọchi nke-iteghete nke ọnwa nke-anọ oké unwu siri ike n’obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.

4 Ewe tipue obodo, ndikom agha nile we b͕apu n’abali n’uzọ ọnu-uzọ-ama n’etiti mb͕idi-ya abua, nke di n’akuku ubi eze ab͕ara ogige: (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) eze we je n’uzọ Araba.

5 Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n’azu, rue ya aru n’ala ihe nādighi nke Jeriko: ma usu-ndi-agha-ya nile siri n’ebe ọ nọ b͕asasia.

6 Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla; ha we kwue okwu ikpé n’ebe ọ nọ.

7 Ha we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n’anya-ya, Nebukadneza me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n’anya-ya abua, ha were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ha we me ka ọ ba na Babilon.

8 Ma n’ọnwa nke-ise, n’ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadneza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, orù eze Babilon, biaruru Jerusalem:

9 o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n’ọku.

10 Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.

11 Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n’obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n’etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n’ala ọzọ.

12 Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.

13 Ma ogidi ọla nile nke di n’ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n’ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.

14 Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.

15 Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n’ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n’ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.

16 Ogidi abua ahu, otù oké osimiri ahu, na ihe-ndọkwasi nile, nke Solomon mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.

17 Cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di, isi nke di n’elu ya bu kwa ọla: idi-elu isi ahu di cubit atọ; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n’isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na ihe-ọkpukpa.

18 Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:

19 o si-kwa-ra n’obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha: na ndikom ise nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n’obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n’obodo.

20 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon rue Ribla.

21 Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n’ala Hemat. Eze we me ka Juda si n’ala-ya je biri n’ala ọzọ.

22 Ma ndi fọduru n’ala Juda, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha fọdu, o we me Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka ọ buru onye-nlekọta-ha.

23 Ndi-isi nile nke usu-ndi-agha nile, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia onye-nlekọta, ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan nwa Karca, na Seraia nwa Tanhumet onye Netofa, na Jaazanaia nwa onye Meakat, ha onwe-ha na ndikom-ha.

24 Gedalaia we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si ha, Unu atula egwu n’ihi ndi-orù ndi Kaldea: birinu n’ala, fè kwa eze Babilon òfùfè, ọ gādi-kwa-ra unu nma.

25 O rue, n’ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, biara, ya na ndikom iri, ha we tib͕ue Gedalaia, o we nwua, ha tib͕u-kwa-ra ndi-Ju na ndi Kaldea ndi ya na ha nọ na Mizpa.

26 Ndi-Ju nile, site n’onye ntà we rue onye uku, na ndi-isi usu-ndi-agha nile, we bilie, biarue Ijipt: n’ihi na ha turu egwu ndi Kaldea.

27 O rue, n’arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n’ala ọzọ, n’ọnwa nke-iri-na-abua, n’ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n’arọ ọ malitere ibu eze, o siri n’ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda;

28 o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon.

29 O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, ọ we nēri nri n’iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.

30 Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n’aka eze, ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 1

1 Adam, Set, Enosh;

2 Kenan, Mahalalel, Jered;

3 Inok, Metusela, Lemek;

4 Noa, Shem, Ham, na Jefet.

5 Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras.

6 Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Difat, na Togama.

7 Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Rodanim.

8 Umu-ndikom Ham; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean.

9 Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka. Umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.

10 Kush muru Nimrod: onye ahu malitere ibu dike n’uwa.

11 Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim,

12 na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim.

13 Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het;

14 na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;

15 na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin;

16 na ndi Avad, na ndi Zema, na ndi Hemat.

17 Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram, na Uz, na Hul, na Geta, na Meshek.

18 Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.

19 Amuru umu-ndikom abua nye Iba; aha otù nime ha bu Peleg; n’ihi na ọ bu n’ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.

20 Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;

21 na Hadoram, na Uzal, na Dikla;

22 na Ibal, na Abimael, na Sheba;

23 na Ofia, na Havila, na Jobab. Ndia nile bu umu-ndikom Jọktan.

24 Shem, Apakshad, Shela;

25 Iba, Peleg, Reu;

26 Serug, Nehoa, Tira;

27 Abram, (nke ahu bu Abraham).

28 Umu-ndikom Abraham; Aisak, na Ishmael.

29 Ndia bu osuso-ọmumu nile ha: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam,

30 na Mishma, na Duma, na Masa; na Hedad, na Tima,

31 na Jetua, na Nafish, na Kidema. Ndia bu umu-ndikom Ishmael.

32 Umu-ndikom Ketura kwa, bú nwayi-iko Abraham: ọ muru Zimran, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua. Umu-ndikom Jọkshan kwa; Sheba, na Dedan.

33 Umu-ndikom Midian; Ifa, na Ifea, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura.

34 Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel.

35 Umu-ndikom Isọ; Elifaz, na Reuel, na Jeush, na Jalam, na Kora.

36 Umu-ndikom Elifaz; Timan, na Oma, na Zefi, na Gatam, na Kenaz, na Timna, na Amalek.

37 Umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza.

38 Umu-ndikom Sia kwa; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana, na Dishon, na Iza, na Dishan.

39 Umu-ndikom Lotan kwa; Hori, na Homam: nwa-nne-nwayi Lotan bu kwa Timna.

40 Umu-ndikom Shobal; Alian, na Manahat, na Ibal, na Shefi, na Onam. Umu-ndikom Zibeon kwa; Aja, na Ana.

41 Umu-ndikom Ana; Dishon. Umu-ndikom Dishon kwa; Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran.

42 Umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Jaakan. Umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran.

43 Ndia bu eze ndi bu eze n’ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel: Bela nwa Beoa; aha obodo-ya bu Dinhaba.

44 Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bọzra, we buru eze n’ọnọdu ya.

45 Jobab we nwua, Husham, nke sitere n’ala ndi Timan, we buru eze n’ọnọdu ya.

46 Husham we nwua, Hedad nwa Badad, onye tib͕uru Midian n’ọhia Moab, we buru eze n’ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Avit.

47 Hedad we nwua, Samla, nke sitere na Masrika, we buru eze n’ọnọdu ya.

48 Samla we nwua, Shaul, nke sitere na Rehobot n’usọ Osimiri, we buru eze n’ọnọdu ya.

49 Shaul we nwua, Beal-hanan nwa Akboa we buru eze n’ọnọdu ya.

50 Beal-hanan we nwua, Hedad we buru eze n’ọnọdu-ya; aha obodo-ya bu Pai: aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahab.

51 Hedad we nwua. Ndi-isi Edom bu kwa; Timna onye-isi, Alia onye-isi, Jetet onye-isi;

52 Ọhọlibama onye-isi, Ila onye-isi, Pinon onye-isi;

53 Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi;

54 Magdiel onye-isi, Iram onye-isi. Ndia bu ndi-isi Edom.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 2

1 Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun;

2 Dan, Josef na Benjamin, Naftali, Gad na Asha.

3 Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n’anya Jehova; O we me ka ọ nwua.

4 Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise.

5 Umu-ndikom Perez; Hezron na Hamul.

6 Umu-ndikom Zera kwa; Zimri, na Itan, na Himan, na Kalkol, na Dara: ha nile di ise.

7 Umu-ndikom Kami kwa; Eka, bú onye nēmekpa Israel aru, onye mekpuru ihe-nmekpu n’ihe ewezugara nye Jehova.

8 Umu-ndikom Itan kwa; Azaraia.

9 Umu-ndikom Hezron kwa, ndi amuru nye ya; Jerahmeel, na Ram, na Kelubai.

10 Ram we mua Aminadab; Aminadab mua Nahshon, bú onye-isi umu Juda:

11 Nahshon mua Salma, Salma mua Boaz;

12 Boaz mua Obed, Obed mua Jesi;

13 Jesi mua ọkpara-ya, bú Elaiab, na Abinadab, bú nke-abua, na Shimea, bú nke-atọ;

14 na Netanel, bú nke-anọ, na Radai, bú nke-ise;

15 na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa:

16 Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ.

17 Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael.

18 Keleb nwa Hezron muru umu site n’Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon.

19 Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua.

20 Hua mua Uri, Uri mua Bezalel.

21 Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub.

22 Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n’ala Gilead.

23 Geshua na Eram we nara ha Havot-jaia, ha na Kenat, na umu-obodo-ya, bú ọgu obodo atọ. Ndia nile bu umu-ndikom Makia nna Gilead.

24 Ma mb͕e Hezron nwusiri nime Keleb-efrata, mb͕e ahu nwunye Hezron, bú Abia, we muara ya Ashua nna Tekoa.

25 Umu-ndikom Jerahmeel ọkpara Hezron bu kwa: Ram, bú ọkpara, na Buna, na Oren, na Ozem, na Ahaija.

26 Ma Jerahmeel nwere nwunye ọzọ, aha-ya bu Atara; nwayi ahu bu nne Onam.

27 Umu-ndikom Ram, bú ọkpara Jerahmeel, bu Maaz, na Jamin, na Eka.

28 Umu-ndikom Onam bu Shamai, na Jada: umu-ndikom Shamai kwa; Nedab, na Abishua.

29 Aha nwunye Abishua bu Abihail; o we muara ya Ahban, na Molid.

30 Umu-ndikom Nedab kwa; Seled, na Apaim: Seled we nwua nēnweghi umu-ndikom.

31 Umu-ndikom Apaim kwa; Ishi. Umu-ndikom Ishi kwa; Sheshan. Umu-ndikom Sheshan kwa; Ahlai.

32 Umu-ndikom Jada kwa, bú nwa-nne Shamai; Jeta, na Jonatan: Jeta we nwua nēnweghi umu-ndikom.

33 Umu-ndikom Jonatan kwa; Pelet, na Zaza. Ndia bu umu-ndikom Jerahmeel.

34 Ma Sheshan enweghi umu-ndikom, nání umu-ndinyom ka o nwere. Sheshan nwe-kwa-ra orù, bú onye Ijipt, aha-ya bu Jaha.

35 Sheshan we were nwa-ya nwayi nye Jaha, bú orù-ya, na nwunye; o we muara ya Atai.

36 Atai mua Netan, Netan mua Zabad;

37 Zabad mua Eflal, Eflal mua Obed;

38 Obed mua Jihu, Jihu mua Azaraia;

39 Azaraia mua Helez, Helez mua Eleasa;

40 Eleasa mua Sismai, Sismai mua Shalum;

41 Shalum mua Jekamaia, Jekamaia mua Elishama.

42 Umu-ndikom Keleb kwa, bú nwa-nne Jerahmeel; Misha, bú ọkpara-ya, onye ahu bu nna Zif; na umu-ndikom Marisha, bú nna Hebron.

43 Umu-ndikom Hebron kwa; Kora, na Tapua, na Rekem, na Shema.

44 Shema we mua Raham, bú nna Jọkeam; Rekem mu-kwa-ra Shamai.

45 Nwa-nwoke Shamai bu Maon; Maon bu nna Bet-zua.

46 Ifa, bú iko-nwayi Keleb, muru Haran, na Moza, na Gazez: Haran we mua Gazez.

47 Umu-ndikom Jahdai kwa; Regem, na Jotam, na Gishan, na Pelet, na Ifa, na Shaaf.

48 Iko-nwayi Keleb, bú Meaka, muru Sheba na Tiahana.

49 Ọ mu-kwa-ra Shaaf nna Madmana, na Sheva nna Makbina, na nna Gibea; nwa-nwayi Keleb bu Aksa.

50 Ndia bu umu-ndikom Keleb; nwa-nwoke Hua, ọkpara Efrata, Shobal nna Kiriat-jearim;

51 Salma nna Bet-lehem, Harif nna Bet-gadea.

52 Shobal nna Kiriat-jearim nwe-kwa-ra umu-ndikom; Haroe, nkera Menuhot.

53 Ab͕uru nile nke Kiriat-jearim kwa; ndi-Jeta, na ndi-Putait, na ndi-Shumatait, na ndi-Mishraait; nime ndia ka ndi Zọra na ndi Eshtaol si puta.

54 Umu-ndikom Salma; Bet-lehem, na ndi Netofa, Atrot-bet-Joab, na nkera ndi Mahanat, ndi Zọra.

55 Ab͕uru nile kwa nke ndi-ode-akwukwọ ndi bi na Jebez; ndi-Tiratait, ndi-Shimeatait, ndi-Sukatait. Ndia bu ndi-Kinait, ndi nēsite na Hamat, bú nna ulo Rikab.