Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 20

1 Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n’agha, buso ya agha.

2 O we zigara Ehab, bú eze Israel, ndi-ozi, rue obodo, si ya,

3 Otú a ka Ben-hedad siri, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi, nkem ka ọ bu; ndinyom-i kwa na umu-gi, bú nke di nma kari, nkem ka ha bu.

4 Eze Israel we za, si, Dika okwu-gi si di, Onye-nwem, eze; nke gi ka mu onwem na ihe nile m’nwere bu.

5 Ndi-ozi ahu we biaghachi, si, Otú a ka Ben-hedad kwuru, si, N’ezie eziterem i ozi, si, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi na ndinyom-i na umu-gi, mu ka i gēnye ha;

6 ma m’gēzitere gi ndi-orùm dika mb͕e a echi, ha gāchọ kwa n’ulo-gi, na ulo ndi-orù-gi;ọ gēru kwa, na ihe ọ bula anya-gi nāchọsi ike, ha gētiye ya n’aka-ha, were ya.

7 Eze Israel we kpọ ndi-okenye nile nke ala, si, Biko, maranu, hu kwa, na ọ bu ihe ọjọ ka nwoke a nāchọ: n’ihi na o ziterem ozi ichinye ya ndinyom nkem, na ichinye ya umum, na inye ya ọla-ọcham, na inye ya ọla-edom; ma eb͕ochighm ha n’aka-ya.

8 Ndi-okenye nile na ndi Israel nile we si ya, Anula okwu-ya, ekwe-kwa-la.

9 O we si ndi-ozi Ben-hedad, Sinu onye-nwem, bú eze, Ihe nile i buru uzọ zitere orù-gi ozi ime, nke ahu ka m’gēme: ma ihe a, apughm ime ya. Ndi-ozi we la, weghachiri ya okwu.

10 Ben-hedad we zigara ya ozi, si, Ka chi mem otú a, ka ha mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ájá Sameria gēzu nju-aka inye ndi nile nọ n’ukwum.

11 Eze Israel we za, si, Kwuenu, si ya, Ka onye nēke ekike-agha-ya ghara ito onwe-ya dika onye nēkepu ya.

12 O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n’ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n’usoro. Ha we do onwe-ha n’usoro imegide obodo ahu.

13 Ma, le, otù onye-amuma biaruru Ehab, bú eze Israel, nso, si, Otú a ka Jehova siri, Ì huwo oké ìgwè madu nile a? le, anamenye ya n’aka-gi ta; i gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.

14 Ehab we si, Sìte n’aka onye? Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Site n’aka umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi. Ọ si, Ònye gāmalite agha ahu? Ọ si, Gi onwe-gi.

15 O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri.

16 Ha we pua n’etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n’ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka.

17 Umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi we buru uzọ pua; Ben-hedad we zipu, ha we gosi ya, si, Ndikom esiwo na Sameria puta.

18 Ọ si, Ọ buru na ọ bu okwu udo ka ha putaworo, jidenu ha na ndu: ọ buru kwa na ọ bu ibu agha ka ha putaworo, jidenu ha na ndu.

19 Ma ndia siri n’obodo pua, bú umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, na usu-ndi-agha ndi soro ha n’azu.

20 Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n’azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n’elu inyinya, ya na ndi-inyinya.

21 Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n’etiti ndi Siria.

22 Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n’ihi na n’ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi.

23 Ma ndi-orù eze Siria siri ya, Chi ukwu ka chi-ha bu; n’ihi ya ka ha di ike kari ayi: ma otú ọ di, ka ayi buso ha agha n’ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha.

24 Ma me ihe a; wezuga ndi-eze, nwoke ọ bula n’ebe-ya, do ndi nāchi ala n’ọnọdu ha:

25 ma gi onwe-gi, gutara onwe-gi usu-ndi-agha, dika usu-ndi-agha nke dapunariworo gi n’agha, inyinya n’ọnọdu inyinya, na ub͕ọ-ala n’ọnọdu ub͕ọ-ala: ayi gēbuso kwa ha agha n’ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. O we ge nti olu-ha, me otú a.

26 O rue, n’ọb͕ub͕a arọ, na Ben-hedad gukọtara ndi Siria, rigorue Efek, ibuso Israel agha.

27 Agukọta-kwa-ra umu Israel, nye ha ihe-oriri, ha we je izute ha: umu Israel we ma ulo-ikwū-ha n’iru ha dika ìgwè ewu ntà abua; ma ndi Siria juputara ala.

28 Onye nke Chineke we biarue nso, gwa eze Israel okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N’ihi na Siria asiwo, Chi ugwu ka Jehova bu, ma Ọ bughi chi ndagwurugwu; n’ihi ya ka M’gēnye ìgwè uku a nile n’aka-gi, unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.

29 Ha we nọ n’ọmuma-ulo-ikwū, ndi Israel na ncherita-iru ndi Siria, ubọchi asa. O rue, n’ubọchi nke-asa, na agha biaruru nso; umu Israel we tib͕ue Siria, orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje, n’otù ubọchi.

30 Ndi fọduru we b͕alaga n’Efek, rue obodo; mb͕idi obodo we dakwasi orú nnù ndikom atọ na nnù asa na ọgu iri fọduru. Ma Ben-hedad b͕alagara, ba n’obodo, n’ime-ulo nke di n’ime-ulo.

31 Ndi-orù-ya we si ya, Biko, le, ayi anuwo na ndi-eze ulo Israel, na eze ebere ka ha bu: biko, ka ayi ke ákwà-nkpe n’úkwù-ayi, na udọ̀ n’isi-ayi, pukuru eze Israel: eleghi anya ọ gēdebe gi ndu.

32 Ha we ke ákwà-nkpe n’úkwù-ha, na udọ̀ n’isi-ha, biakute eze Israel, si, Orù-gi, bú Ben-hedad, siri, Biko, ka mu onwem di ndu. Ọ si, Ọ̀ nọ ndu ub͕u a? nwa-nnem ka ọ bu.

33 Ma ndikom ahu nāriba ama, ha we me ngwa imata ma ọ bu ihe si n’obi-ya puta; ha we si, Nwa-nne-gi, bú Ben-hedad. Ọ si, Banu n’obodo, kuta ya. Ben-hedad we pukute ya; o me ya ka ọ rigota n’ub͕ọ-ala-ya.

34 Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n’aka nna-gi, m’gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n’ọb͕ub͕a-ndu nka ka m’gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya.

35 Ma otù nwoke n’etiti umu ndi-amuma siri ibe-ya n’okwu Jehova, Biko, tiem ihe. Ma nwoke ahu juru iti ya ihe.

36 O we si ya, N’ihi na i geghi nti olu Jehova, le, mb͕e i nēsi n’ebe m’nọ la, ọdum gēb͕u gi. O si n’akuku ya la, ọdum we chọta ya. b͕ue ya.

37 O we chọta nwoke ọzọ, si, Biko, tiem ihe. Nwoke ahu we tie ya ihe, nēti ya nēb͕u kwa ya mma.

38 Onye-amuma ahu we je, guzoro eze n’uzọ, nwogharia onwe-ya, nātukwasi ákwà-ike-n’isi n’anya-ya abua.

39 O rue, mb͕e eze nāgabiga, na onye ahu tikuru eze nkpu: ọ si, Orù-gi puru ba n’etiti agha; ma, le, otù nwoke wezugara onwe-ya, me ka otù nwoke biakutem, ọ si, Debe nwoke a: ọ buru na ele anya ya ma-ọli ma ahughi ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ma-ọbu na i gākwu talent ọla-ọcha.

40 O rue, mb͕e orù-gi nēme ihe n’otù ebe na ebe ọzọ, na ahughm onye ahu. Eze Israel we si ya, Otú a ka ikpé-gi si di; gi onwe-gi ekwubìwo ya.

41 O we me ngwa, wezuga ákwà-ike-n’isi n’anya-ya abua; eze Israel we mata ya na onye sitere na ndi-amuma ka ọ bu.

42 Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N’ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n’aka-gi, bú onye M’wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya.

43 Eze Israel we la n’ulo-ya n’obi arọ́ na nb͕aru-iru, o we ba na Sameria.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 21

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Nebot, bú onye Jezreel, nwere ubi-vine, nke di na Jezreel, n’akuku ulo uku Ehab, bú eze Sameria.

2 Ehab we gwa Nebot okwu, si, Nyem ubi-vine-gi, ka o we burum ubi ab͕ara ogige ebe anāku akwukwọ nri, n’ihi na nke ahu di nso n’akuku ulom; ka m’nye kwa gi ubi-vine di nma kari ya n’ọnọdu ya: ma ọ buru na ọ di nma n’anya-gi, ka m’nye gi ego ruru ọnu-ahia-ya.

3 Nebot we si Ehab, Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú inye gi ihe-nketa nnam-hà.

4 Ehab we ba n’ulo-ya n’obi arọ́ na nb͕aru-iru, n’ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n’ihi na ọ siri, M’gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n’ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri.

5 Jezebel, bú nwunye-ya, we biakute ya, gwa ya okwu, si, Gini me-kwa-ra mọ-gi di arọ́, i nērighi kwa nri?

6 Ọ si ya, N’ihi na agwaram Nebot, bú onye Jezreel, okwu, si ya, Nyem ubi-vine-gi n’ego; ma-ọbu, ọ buru na ọ tọ gi onwe-gi utọ, ka m’nye gi ubi-vine ọzọ n’ọnọdu ya: o we si, M’gaghi-enye gi ubi-vine nkem.

7 Jezebel, bú nwunye-ya, si ya, Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu eze nāchi Israel ub͕u a? bilie, rie nri, ka obi-gi di nma: mu onwem gēnye gi ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel.

8 O we de akwukwọ n’aha Ehab, were nb͕a-aka-akàrà-ya ka ha, zigara ndi-okenye akwukwọ ahu, ziga-kwa-ra ndi amara aha-ha ndi nọ n’obodo-ya, ndi ha na Nebot bi.

9 O we de n’akwukwọ ahu, si, Kpọsanu obu-bu-ọnu, me ka Nebot nọdu n’isi ọnọdu n’etiti ndi Israel:

10 me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n’iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.

11 Ndikom obodo-ya, bú ndi-okenye na ndi amara aha-ha ndi bi n’obodo-ya, we me dika Jezebel zitere ha ozi, dika edere ya n’akwukwọ nke o zitere ha.

12 Ha kpọsara obubu-ọnu, me ka Nebot nọdu n’isi ọnọdu n’etiti ndi Israel.

13 Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n’iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n’iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.

14 Ha we zigara Jezebel ozi, si, Atub͕uwo Nebot na nkume, ọ nwuwo kwa.

15 O rue, mb͕e Jezebel nuru na atub͕uwo Nebot na nkume, na ọ nwuwo kwa, na Jezebel siri Ehab, Bilie, nweta ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, nke ọ juru inye gi n’ego: n’ihi na Nebot adighi ndu, kama ọ nwuwo.

16 O rue, mb͕e Ehab nuru na Nebot anwuwo, na Ehab biliri iridaru ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, inweta ya.

17 Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,

18 Bilie, ridata izute Ehab, bú eze Israel, onye bi na Sameria; le, ọ nọ n’ubi-vine Nebot, ebe ọ ridara inweta ya.

19 Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N’ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.

20 Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n’ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.

21 Le, M’nēme ka ihe ọjọ bakute gi, M’gēkpochapu ndi-gi fọduru, M’gēbipu kwa n’aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n’Israel, ka Jehova kwuru:

22 M’gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n’ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie.

23 Ọzọ kwa, Jehova kwuru okwu bayere Jezebel, si, Nkita gēri Jezebel n’ékpè Jezreel.

24 Onye nke Ehab nke nwuru anwu n’obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n’ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.

25 (Otú ọ di, ọ dighi onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, onye Jezebel, bú nwunye-ya, rafuru.

26 Ọ we me ihe-árú nke-uku n’ijeso arusi di iche iche, dika ihe nile si di nke ndi-Amorait mere, ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel.)

27 O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n’anu-aru-ya, bue ọnu, dina n’ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.

28 Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,

29 Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n’ala n’irum? n’ihi na o wedawo onwe-ya n’ala n’irum, M’gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n’ubọchi-ya: ọ bu n’ubọchi nwa-ya ka M’gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 22

1 Ha we nọdu arọ atọ agha adighi n’etiti Siria na Israel.

2 O rue, n’arọ nke-atọ, na Jehoshafat, bú eze Juda, ridakuru eze Israel.

3 Eze Israel we si ndi-orù-ya, Ùnu mara na ọ bu ayi nwe Remot-gilead, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti, ghara inaputa ya n’aka eze Siria?

4 Ọ si Jehoshafat, Ì gēsorom je agha na Remot-gilead? Jehoshafat we si eze Israel, Dika m’di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.

5 Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzo ju ase okwu Jehova.

6 Eze Israel we chikọta ndi-amuma, ra ka nnù ndikom, ọ si ha, M’gēje imegide Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu m’gārapu? Ha we si, Rigo; Onye-nwe-ayi gēnye kwa ya n’aka eze.

7 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n’ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n’aka-ya?

8 Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n’aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n’ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.

9 Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ.

10 Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n’oche-eze-ya, yiri uwe-ha, n’ebe-nzọcha-ọka n’oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n’iru ha.

11 Zedekaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.

12 Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n’aka eze.

13 Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Biko, le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe.

14 Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n’ezie ihe Jehova gāsim, nke ahu ka m’gēkwu.

15 O we biakute eze. Eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu àyi gārapu? Ọ si ya, Rigo, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma; Jehova enyewo kwa ya n’aka eze.

16 Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n’aha Jehova?

17 Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n’ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n’ulo-ya n’udo.

18 Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ?

19 Ọ si, N’ihi nka nuru okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n’oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n’akuku Ya n’aka-nri-Ya na n’aka-ekpe-Ya.

20 Jehova we si, Ònye gārafu Ehab, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Ọtù onye we si otú a; onye ọzọ si-kwa-ra otú a.

21 Mọ ahu we puta, guzo n’iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya.

22 Jehova we si ya, Gini ka i gēji? Ọ si, M’gāpu, buru mọ okwu-ugha n’ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a.

23 Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n’ọnu ndi-amuma-gi ndia nile; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi.

24 Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n’ebe m’nọ gabiga igwa gi okwu?

25 Maikaia we si, Le, i ganāhu n’ubọchi ahu, mb͕e i gābà n’ime-ulo nke di n’ime-ulo izo onwe-gi.

26 Eze Israel we si, Kuru Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze;

27 Igāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n’ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m’gābia n’udo.

28 Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n’udo, Jehova ekwughi okwu n’ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n’uwa, unu nile.

29 Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead.

30 Eze Israel we si Jehoshafat, M’gēnwoghari onwem, ba n’agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya, ba n’agha.

31 Ma eze Siria nyere orú ndi-isi na iri na abua nke ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.

32 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, N’ezie eze Israel ka ọ bu; ha we wezuga onwe-ha ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu.

33 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ya onwe-ya abughi eze Israel, ha we si n’iso ya laghachi.

34 Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n’etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m’si n’ọmuma-ulo-ikwū pua; n’ihi na ọria nāriam.

35 Agha we la elu n’ubọchi ahu: ewe me ka eze guzogide n’ub͕ọ-ala-ya imegide Siria, o we nwua n’anyasi: ọbara ebe ab͕aruru ya aru we b͕apu ba n’etiti ub͕ọ-ala-ya.

36 Iti-nkpu we gazue n’ọmuma-ulo-ikwū mb͕e anyanwu nāda, si, Nwoke ọ bula, ya la n’obodo-ya, nwoke ọ bula, ya la n’ala-ya.

37 Eze we nwua, ewe bubata ya na Sameria; ha we lìe eze na Sameria.

38 Ewe ṅachapu ub͕ọ-ala-ya n’akuku ọdọ-miri Sameria; nkita we racha ọbara-ya; (ma ndinyom nākwa iko sara aru-ha n’ebe ahu;) dika okwu Jehova si di nke O kwuru.

39 Ma okwu Ehab nile nke fọduru, na ihe nile ọ mere, na ulo ọdu nke o wuru, na obodo nile nke o wuru, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

40 Ehab we so nna-ya-hà dina n’ọnwu; Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n’ọnọdu ya.

41 Jehoshafat nwa Esa malitere ibu eze Juda n’arọ nke-anọ nke Ehab, bú eze Israel.

42 Jehoshafat b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise na Jerusalem. Aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi.

43 O jere ije n’uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n’anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe di elu nile.

44 Jehoshafat me-kwa-ra ka ya na eze Israel di n’udo.

45 Ma okwu Jehoshafat nile nke fọduru, na ihe idi-ike-ya nke o mere, na otú o buru agha, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

46 Ọzọ, ndi fọduru n’etiti ndi edoro nsọ ikwa iko, bú ndi fọduru n’ubọchi Esa nna-ya, o kpochapuru ha n’ala.

47 Ma eze adighi n’Edom: onye edoro onye-isi bu eze.

48 Jehoshafat mere ub͕ọ Tashish ijeru Ofia ibute ọla-edo: ma ha ejeghi; n’ihi na etiwara ub͕ọ ahu n’Ezion-geba.

49 Mb͕e ahu Ehazaia nwa Ehab siri Jehoshafat, Ka ndi-orùm soro ndi-orù-gi je n’ub͕ọ-gi. Ma Jehoshafat ekweghi.

50 Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid nna-ya: Jehoram nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

51 Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n’arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua.

52 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, je kwa ije n’uzọ nna-ya, na n’uzọ nne-ya, na n’uzọ Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie.

53 O fè-kwa-ra Beal òfùfè, kpọ isi ala nye ya, we kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 1

1 Moab we jehie megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri.

2 Ehazaia we dapu n’ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m’gādiri ndu n’ọria nka.

3 Ma mọ-ozi Jehova gwara Elaija, bú onye Tisbe, okwu, si, Bilie, rigo izute ndi-ozi eze Sameria, gwa ha okwu, si, Ọ̀ bu n’ihi na ọ dighi Chineke di n’Israel, na unu onwe-unu nēje iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase?

4 Ma n’ihi nka otú a ka Jehova siri, Ihe-ndina ahu ebe i rigoro, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu. Elaija we la.

5 Ndi-ozi ahu we laghachikuru ya, ọ si ha, Gini bu nka na unu laghachiworo?

6 Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n’ihi na ọ dighi Chineke di n’Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n’ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

7 Ọ si ha, Òle aha madu ọ bu, bú nwoke ahu nke rigoro izute unu, we gwa unu okwu ndia?

8 Ha si ya, Ọ bu nwoke nwere aji nke-uku, eke-kwa-ra ya ihe-ọkiké akpukpọ n’úkwù-ya. Ọ si, Elaija onye Tisbe ka ọ bu.

9 O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n’elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata.

10 Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na onye nke Chineke ka m’bu, ka ọku si n’elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n’elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

11 O we ziga-kwa-ra ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ọ za, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siworo, Ngwa ngwa, ridata.

12 Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m’bu, ka ọku si n’elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n’elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

13 Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n’ala n’iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n’anya-gi.

14 Le, ọku siri n’elu-igwe ridata, ripia ndi-isi abua mbu ahu nke ọgu ndi-agha abua na iri, ha na ọgu ndi-agha abua na iri ha: ma ub͕u a ka ndum di oké ọnu-ahia n’anya-gi.

15 Mọ-ozi nke Jehova we si Elaija, Soro ya rida: atula egwu ya. O we bilie, soro ya ridakuru eze.

16 O we gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N’ihi na i zigawo ndi-ozi iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase, ọ̀ bu n’ihi na ọ dighi Chineke di n’Israel iju ase okwu-Ya? n’ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

17 O we nwua, dika okwu Jehova si di nke Elaija kwuru. Jehoram we malite ibu eze n’ọnọdu ya n’arọ nke-abua nke Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda; n’ihi na o nweghi nwa-nwoke.

18 Ma ihe Ehazaia nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 2

1 O rue, mb͕e Jehova gaje ime ka Elaija rigorue elu-igwe n’oké ifufe, na Elaija siri na Gilgal je, ya na Elaisha.

2 Elaija we si Elaisha, Biko, nọdu n’ebe a; n’ihi na Jehova ezigawom ijeru Bet-el, Elaisha we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we ridarue Bet-el.

3 Umu ndi-amuma ndi nọ na Bet-el we pukute Elaisha, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n’ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.

4 Elaija we si ya, Elaisha, biko, nọdu n’ebe a; n’ihi na Jehova ezigawom ijeru Jeriko. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we biarue Jeriko.

5 Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biarue Elaisha nso, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n’ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.

6 Elaija we si ya, Biko, nọdu n’ebe a; n’ihi na Jehova ezigawom ijeru Jọdan. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha abua we je.

7 Ọgu ndikom abua na iri n’etiti umu ndi-amuma je-kwa-ra, guzo na ncherita-iru ha n’ebe di anya: ha abua we guzo n’akuku Jọdan.

8 Elaija we chiri uwe – nwuda – ya, piakọta ya, tie miri ahu, ewe kera ya, otù uzọ ga n’otù akuku, otù uzọ ga n’akuku ọzọ, ha abua we gabiga n’ala-akọrọ.

9 O rue, mb͕e ha gabigasiri, na Elaija siri Elaisha, Riọ ihe m’gēmere gi, tutu ewepum n’ebe i nọ. Elaisha we si, Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim.

10 Ọ si, I riọwo ihe siri ike: ma ọ buru na i hum mb͕e anēwepum n’ebe i nọ, ọ gādiri gi otú a; ma ọ buru na i hughm, ọ gaghi-adi otú a.

11 O rue na, mb͕e ha nọ nēje, nēje ije nēkwu kwa okwu, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nke kewara ha abua; Elaija we rigorue elu-igwe n’oké ifufe.

12 Ma Elaisha nēle ya anya; ya onwe-ya nēti kwa nkpu, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya! ma ọ hughi ya ọzọ: o we jide uwe nke aka ya, dọwa ha ibe abua.

13 Ọ chili kwa uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, ọ laghachi, guzo n’usọ Jọdan.

14 O we chiri uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, o we tie miri, si, Òle ebe Jehova nọ, bú Chineke Elaija? Ya onwe-ya kwa, o we tie miri, ewe kera ya otù uzọ ga n’otù akuku, otù uzọ ga n’akuku ọzọ; Elaisha we gabiga.

15 Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko na ncherita-iru ya we hu ya, si, Mọ Elaija anọkwasiwo Elaisha. Ha we bia izute ya, ha we kpọrọ ya isi ala.

16 Ha we si ya, Biko, le, ọgu ndikom abua na iri, bú ndi-dìnkpà, nọ n’etiti ndi-orù-gi n’ebe a; biko, ka ha je, chọ onye-nwe-gi: eleghi anya Mọ nke Jehova eweliwo ya, tuda ya n’otù ugwu, ma-ọbu n’otù ndagwurugwu. Ọ si, Unu ezigala.

17 Ha we rugide ya rue mb͕e ihere mere ya, o we si, Ziganu. Ha we ziga ọgu ndikom abua na iri; ha we chọ ya ubọchi atọ, ma ha achọtaghi ya.

18 Ha we laghachikuru ya, ma ya onwe-ya nānọ na Jeriko; ọ si ha, Àsighm unu, Ejela?

19 Ndikom obodo ahu we si Elaisha, Biko, le, ọnọdu obodo a di nma, dika onye-nwem nāhu: ma miri-ya jọrọ njọ, ala nādighi-ekwe kwa ka ihe ka aka.

20 Ọ si, Wetaranum ọkwa ọhu, tiye-kwa-nu nnú nime ya. Ha we wetara ya.

21 Ọ pua je n’ebe miri si asuputa, o we tubà nnú n’ebe ahu, si, Otú a ka Jehova siri, Emewom ka miri a buru ihe inye ezi-ndu; ọnwu ma-ọbu ala nādighi-ekwe ka ihe ka aka agaghi-adi kwa ọzọ site n’ebe ahu.

22 Ewe me ka miri ahu buru ihe inye ezi-ndu rue ta, dika okwu Elaisha si di, nke o kwuru.

23 O si n’ebe ahu rigorue Bet-el: ma mb͕e ya onwe-ya nārigo n’uzọ, umu-okoro siri n’obodo puta, we kwa ya emò, si ya, Rigo, onye-isi-nkwọcha; rigo, onye-isi-nkwọcha.

24 Ọ le anya n’azu-ya, hu ha, kọcha ha n’aha Jehova. Nne anu-ọhia bear abua we si n’oké ọhia puta, dọka ọgu umu-okoro abua na abua n’etiti ha.

25 O si n’ebe ahu jerue ugwu Kamel, si kwa n’ebe ahu laghachi na Sameria.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 3

1 Ma Jehoram nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n’arọ nke-iri-na-asatọ nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze arọ iri na abua.

2 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova; nání na o meghi dika nna-ya, na dika nne-ya: o wezuga ogidi Beal nke nna-ya mere.

3 Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.

4 Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri.

5 O rue, mb͕e Ehab nwuru, na eze Moab jehiere megide eze Israel.

6 Eze, bú Jehoram, we si na Sameria pua n’ubọchi ahu, gukọta Israel nile.

7 O je kwa, zigara Jehoshafat, bú eze Juda, ozi, si, Eze Moab ejehiewo megidem: ì gēsorom jekuru Moab ibu agha? Ọ si, M’gārigo: dika m’di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.

8 Ọ si, Òle nke bu uzọ ayi gēsi rigo? Ọ si, Uzọ ọzara Edom.

9 Eze Israel we je, ya na eze Juda, na eze Edom: ha we ga ije ubọchi asa buruburu: ma ọ dighi miri diri ọmuma-ulo-ikwū ahu, ma ọbu nke diri anu-ulo nke ha chiri je.

10 Eze Israel we si, Ewó! n’ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n’aka Moab.

11 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n’aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n’aka Elaija.

12 Jehoshafat we si, Okwu Jehova di n’ebe ọ nọ. Eze Israel na Jehoshafat na eze Edom we ridakuru ya.

13 Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n’ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n’aka Moab.

14 Elaisha we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya, n’ezie, ọ buru na ahughm Jehoshafat, bú eze Juda, iru-ọma, m’gaghi-elegide anya n’ebe i nọ ma-ọli, m’gaghi-ahu kwa gi anya ma-ọli.

15 Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n’aru ya.

16 Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Me ndagwurugwu a ka ọ buru olùlù olùlù.

17 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Unu agaghi-ahu ifufe, unu agaghi-ahu kwa oké miri-ozuzo, ma ndagwurugwu ahu gējuputa na miri: unu gāṅu kwa, unu onwe-unu, na anu-ulo-unu, na anumanu-unu nile.

18 Ma nka di nfe n’anya Jehova: Ọ gēnye kwa Moab n’aka-unu.

19 Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula.

20 O rue n’ututu, na, mb͕e anēsure onyinye-inata-iru-ọma, le, miri nēsi n’uzọ Edom bia, ala we juputa na miri.

21 Moab nile we nu na ndi-eze ahu arigotawo ibuso ha agha, ha we kpọkọta onwe-ha, site n’onye ọ bula nke nēke onwe-ya ihe-ọkiké agha n’úkwù, we rigorue ndi bu okenye, ha we guzo n’ókè-ala-ha.

22 Ha we bilie n’isi-ututu, ma anyanwu mukwasiri miri ahu, Moab we hu miri ahu na ncherita-iru ha ka ọ nācha ọbara dika ọbara:

23 ha we si, Nka bu ọbara; ekpochapuwo ndi-eze ahu nọ̄, ha etib͕uwo kwa, nwoke ọ bula ibe-ya: ma ub͕u a, Moab, kwatanu ihe-nkwata.

24 Ha biarue ọmuma-ulo-ikwū Israel, Israel we bilie, tib͕ue Moab, ha we si n’iru ha b͕alaga: ha we ba nime ya nētib͕u Moab.

25 Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n’ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya.

26 Eze Moab we hu na agha ahu di ike kari ya, o we chiri nnù ndikom na ọgu iri-na-ise tiyere onwe-ya, bú ndi nāmiputa mma-agha, itiwaru eze Edom:

27 O we were ọkpara-ya, nke gābu eze n’ọnọdu ya, sure ya ọku n’elu mb͕idi, ka ọ buru àjà-nsure-ọku. Oké iwe we di megide Israel: ha we si n’ebe ọ nọ bulie ije, laghachi n’ala-ha.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 4

1 Ma otù nwayi n’etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n’onwe-ya umum abua ka ha buru orù.

2 Elaisha we si ya, Gini ka m’gēmere gi? gosim; gini ka i nwere n’ulo? Ọ si, Ọ dighi ihe ọ bula orù-gi nwayi nwere n’ulo, ọ bu nání ite manu.

3 Ọ si, Je, riọtara onwe-gi ihe n’èzí n’aka ndi-ab͕ata-obi-gi nile, bú ihe ihe nādighi nime ha; ha abula ole-na-ole.

4 I gābà kwa n’ulo, mechibido onwe-gi, mechibido kwa umu-gi ndikom, uzọ, b͕aye manu di n’ite ahu n’ihe ahu nile, buzuga nke juru eju.

5 O we si n’ebe ọ nọ la, mechibido onwe-ya, mechibido kwa umu-ya ndikom, uzọ; ha onwe-ha nēbutere ya ihe ahu nso, ma ya onwe-ya nāb͕aye ab͕aye.

6 O rue, mb͕e ihe nile juru, na ọ siri nwa-ya, Buterem nso ihe ọzọ. Ọ si ya, Ọ dighi ihe ọzọ di. Manu ahu we kwusi.

7 O we bia, gosi onye nke Chineke. Ọ si, Je, re manu ahu, kwua ugwọ-gi, gi onwe-gi na umu-gi ndikom were nke fọduru di ndu.

8 Ubọchi we rue, na Elaisha gabigara rue Shunem, ma otù nwayi uku nọ n’ebe ahu; o rugide ya ka o rie nri. O rue, mb͕e ọ bula ọ nāgabiga, na o wezugara onwe-ya ba n’ebe ahu iri nri.

9 Nwayi ahu we si di-ya, Biko, le, amawom na onye di nsọ nke Chineke ka ọ bu, bú onye a nagabiga n’akuku ayi mb͕e nile.

10 Biko, ka ayi me ime-ulo-elu ntà nke mb͕idi; ka ayi dọba-kwa-ra ya n’ebe ahu ihe-ndina, na table, na oche, na ihe-idọba-oriọna: o gēru kwa, mb͕e ọ biakutere ayi, na ọ gēwezuga onwe-ya ba n’ebe ahu.

11 Ubọchi we rue, na ọ biara n’ebe ahu, wezuga onwe-ya ba n’ime-ulo-elu ahu, dina n’ebe ahu.

12 Ọ si Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Kpọ nwayi Shunem nka. O we kpọ ya, o we guzo n’iru ya.

13 Elaisha we si Gihezi, Biko, si ya, Le, i werewo ncheb͕u a nile cheb͕u onwe-gi bayere ayi; gini ka agēmere gi? ọ̀ bu igwa eze okwu bayere gi, ma-ọbu igwa onye-isi usu-ndi-agha? Ọ si, N’etiti ndim ka mu onwem nēbi.

14 Ọ si, Gini kwa ka agēmere ya? Gihezi we si, N’ezie ọ nweghi nwa-nwoke, di-ya aghọwo kwa agadi.

15 Ọ si, Kpọ ya. O we kpọ ya, nwayi ahu we guzo n’ọnu-uzọ.

16 Ọ si, Na mb͕e nka akara àkà, dika mb͕e a aka-nile, gi onwe-gi ganāb͕aku nwa-nwoke. Ọ si, É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha.

17 Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke na mb͕e ahu akara àkà, dika mb͕e ahu aka-nile, otú Elaisha gwara ya.

18 Nwata ahu we toputa, ubọchi we rue, na ọ pukuru nna-ya jekuru ndi nēbì ọka.

19 Ọ si nna-ya, Isim, isim. O we si nwa-okorọbia-ya, Kuru ya bakuru nne-ya.

20 O kuru ya, me ka ọ biakute nne-ya, ọ nọkwasi n’ikperè nne-ya rue etiti-ehihie, we nwua.

21 Ọ rigo, tọb͕ọ ya n’ihe-ndina onye nke Chineke ahu, mechibido ya uzọ, pua.

22 Ọ kpọ di-ya, si, Biko, ziterem otù nime umu-okorọbia, na otù nime nne-inyinya-ibu, ka m’we b͕akuru onye nke Chineke, lata kwa.

23 Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo.

24 O we jikwa inyinya-ibu, si nwa-okorọbia-ya, Nēdu, nēje kwa; eb͕ochilaram inyinya-ibu n’ibum b͕a ọsọ, ma ọ buru na asighm i.

25 O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:

26 biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n’udo? di-gi, ọ̀ nọ n’udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n’udo? Ọ si, Ayi nọ n’udo.

27 O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n’ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n’ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.

28 O we si, Àriọrọm nwa-nwoke n’aka onye-nwem? àsighm, Arafulam?

29 O we si Gihezi, Ke ihe-ọkiké n’úkwù-gi, were kwa nkpa-n’akam n’aka-gi, je: mb͕e i zutere nwoke ọ bula, ekelela ya; mb͕e nwoke ọ bula gēkele gi, azala ya: tukwasi nkpa-n’akam n’iru nwa-okoro ahu.

30 Nne nwa-okoro ahu we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gaghi-arapu gi ma-ọli. O we bilie, jeso ya.

31 Gihezi we gabiga n’iru ha, tukwasi nkpa-n’aka ahu n’iru nwa-okoro ahu; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. O we jeghachi izute ya, gosi ya, si, Nwa-okoro ahu etetaghi.

32 Elaisha we bata n’ulo ahu, ma, le, nwa-okoro ahu anwuwo, atọb͕ọ-kwa-ra ya n’ihe-ndina-ya.

33 O we ba, mechibido ha abua uzọ kpere Jehova.

34 Ọ rigo, dina n’elu nwata ahu, tukwasi ọnu-ya n’ọnu-ya, na anya-ya abua n’anya-ya abua, na ọbu-aka-ya abua n’ọbu-aka-ya abua, ruru ala n’elu ya: anu-aru nwata ahu we di ọku.

35 O we biaghachi, jegharia iru na azu n’ulo otù ub͕ò; ọ rigo, ruru kwa n’elu ya: nwa-okoro ahu we ze uzere rue ub͕ò asa, nwa-okoro we saghe anya-ya abua.

36 Ọ kpọ Gihezi, si, Kpọ nwayi Shunem nka. Ọ kpọ ya. Nwayi ahu we bakute ya, ọ si, Kuru nwa-gi.

37 O we ba nime, da n’ala n’ukwu-ya, kpọ isi ala, kuru nwa-ya, pua.

38 Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n’ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n’iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n’ọku, siere umu ndi-amuma ofé.

39 Otù onye we pua ba n’ọhia ichikọta akwukwọ nri, ọ huta osisi vine ọhia, chikọta afufa-ọhia nime ya nju uwe-ya, bia, biye ha n’ite ofé: n’ihi na ha amaghi ha.

40 Ha we wuputara ndikom ahu, ka ha rie. O rue, mb͕e ha nēri ofé ahu, na ndi ahu tiri nkpu, si, Ọnwu di n’ite, gi onye nke Chineke. Ha apughi kwa iri ya.

41 O we si, Weta-kwa-nu utu ọka. O we tiye ya n’ite ahu, si, Wuputara ndi-ayi, ka ha we rie. Ihe ọjọ adighi kwa n’ite ahu.

42 Ma otù nwoke siri na Beal-shalisha bia, butere onye nke Chineke achicha nke nkpuru mbu, orú ob͕e achicha barley, na ọka nke ubi n’akpa-ya. Ọ we si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie.

43 Onye nējere ya ozi we si, Gini, M’gēche nka n’iru ọgu ndikom ise? Ọ si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie; n’ihi na otú a ka Jehova siri, Ha gēri, rifọ kwa.

44 O we che ya n’iru ha, ha we rie, rifọ kwa, dika okwu Jehova si di.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 5

1 Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n’iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n’ihi na ọ bu n’aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta.

2 Ndi Siria apuwo nēje n’usu ndi nāpunara madu ihe, we si n’ala Israel dọta otù nwa-ob͕ọghọ ntà n’agha; o we nọ n’iru nwunye Neaman.

3 Ọ si nwayi-nwe-ya, Ọ gādim nọ̄ nma, ma asi na onye-nwem nọ n’iru onye-amuma nke nọ na Sameria! mb͕e ahu ọ gēme ka o si n’ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.

4 Otù onye we ba, gosi onye-nwe-ya, si, Otú a na otú a ka nwa-ab͕ọghọ ahu nke sitere n’ala Israel kwuru.

5 Eze Siria we si, Je, ba, ka m’ziga-kwa-ra eze Israel akwukwọ. O we je, chiri n’aka-ya talent ọla-ọcha iri, na nnù ọla-edo iri-na-ise, na uwe nb͕anwe iri.

6 O were akwukwọ ahu biakute eze Israel, si, Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a biakutere gi, le, ezìwom Neaman, bú orùm, biakute gi, ka i we me ka o si n’ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.

7 O rue, mb͕e eze Israel guru akwukwọ ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu Chineke ka m’bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu, na nwoke a nēziterem ozi ime ka nwoke si n’ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta? ma otú ọ di, biko, maranu hu kwa na ya onwe-ya nāchọ uzọ isi megidem.

8 O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N’ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n’Israel.

9 Neaman we bia, ya na inyinya-ya nile na ub͕ọ-ala-ya, o guzo n’ọnu-uzọ ulo Elaisha nwere.

10 Elaisha we zigara ya onye-ozi, si, Je, sa aru ub͕ò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha.

11 Ma Neaman were iwe, laba, si, Le, m’siri, Ọ ghaghi ipukutem, guzo, kpọkue aha Jehova, bú Chineke-ya, fufe aka-ya n’elu ebe ahu, me ka onye-ekpenta di ọcha soro ndi-ya zukọta.

12 Abana na Fapa, bú osimiri Damaskọs, hà adighi nma kari miri Israel nile? #m’gaghi-asa aru nime ha, di ọcha? O we chigharia, laba n’ọnuma.

13 Ndi-orù-ya we biarue nso, gwa ya okwu, si, Nnam, asi na ọ bu ihe uku onye-amuma gwara gi me, ì gaghi-eme ya? ì gēsi kwa aṅa ghara ime ya mb͕e ọ siri gi, Sa aru, di kwa ọcha?

14 O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha.

15 O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n’iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n’uwa nile, ọ bu nání n’Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n’aka orù-gi.

16 Ọ si, Jehova nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya, m’gaghi-anara ihe ọ bula ma-ọli. O we rugide ya inara ya; ma ọ juru aju.

17 Neaman we si, Ọ buru na i naghi, biko, ka enye orù-gi ibu ájá nke inyinya mule abua gēbu; n’ihi na orù-gi agaghi-emere chi ọzọ àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ site n’ub͕u a, ma ọ bu náni Jehova.

18 Ka Jehova b͕aghara orù-gi ihe a; mb͕e onye-nwem nābà n’ulo Rimon ikpọ isi ala n’ebe ahu, mb͕e ya onwe-ya nādabere kwa n’akam, m’we kpọ isi ala n’ulo Rimon, mb͕e m’kpọrọ isi ala n’ulo Rimon, biko, ka Jehova b͕aghara orù-gi n’ihe a.

19 Ọ si ya, La n’udo. O we si n’ebe ọ nọ je n’uzọ-ya nwantī.

20 Ma Gihezi, bú nwa-okorọbia Elaisha onye nke Chineke, siri, Le, onye-nwem eb͕ochiwo onwe-ya n’ebe Neaman onye Siria nka nọ, n’ighara inara n’aka-ya ihe o wetara: Jehova nādi ndu, n’ezie m’gāb͕aso ya, nara ihe ufọdu n’aka-ya.

21 Gihezi we chuso Neaman. Neamam we hu otù onye nāb͕aso ya, o we si n’ub͕ọ-ala-ya rida izute ya, si, Ùdo di kwa?

22 Ọ si, Udo di. Onye-nwem ezitewom, si, Le, ọbuná ub͕u a umu-okorọbia abua nime umu ndi-amuma esiwo n’ugwu Efraim biakutem; biko, nye ha otù talent ọla-ọcha, na uwe nb͕anwe abua.

23 Neaman we si, Kwere, nara talent abua. O rugide ya, ke talent ọla-ọcha abua n’akpa abua, chiri uwe nb͕anwe abua, nye umu-okorọbia-ya abua; ha we būru ha ga n’iru ya.

24 Ọ biarue ugwu ntà ahu, nara ha n’aka-ha, tiye ha n ulo: o zilaga ndikom ahu, ha we la.

25 Ma ya onwe-ya bara nime, guzo n’akuku onye-nwe-ya. Elaisha we si ya, Òle ebe i si bia, Gihezi? Ọ si, Orù-gi ejeghi ebe ọ bula.

26 Ọ si ya, Òbim ejesoghi gi, mb͕e nwoke ahu siri n’ub͕ọ-ala-ya chigharia izute gi? ọ̀ bu mb͕e inara ego, na inara uwe, na ubi-olive na ubi-vine, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ndi-orù ndikom na ndinyom nēje ozi?

27 Ekpenta Neaman gārapara kwa n’aru gi, na n’aru nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ we si n’iru ya pua, buru onye-ekpenta nēnwu dika snow.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 6

1 Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n’iru gi adikara ayi nkpa.

2 Biko, ka ayi jerue Jọdan, si kwa n’ebe ahu were, nwoke ọ bula otù ntuhie, mere onwe-ayi otù ebe n’ebe ahu, ibiri n’ebe ahu. Ọ si, Jenu.

3 Otù onye we si, Biko, kwere, soro ndi-orù-gi je. Ọ si, Mu onwem gēje.

4 O we so ha je. Ha we biarue Jọdan, b͕utue osisi.

5 O rue, mb͕e otù onye nēb͕utu ntuhie-ya, na anyu-ike dabàra na miri: o we tie nkpu, si, Ewó, onye-nwem! nke ahu bu ihe ariọtara ariọta.

6 Onye nke Chineke we si, Òle ebe ọ dara? Ọ we me ka ọ hu ebe ahu. O we b͕utue otù osisi, tubà ya n’ebe ahu, me ka anyu-ike se n’elu miri.

7 O si, Weliere onwe-gi. O we setia aka-ya, were ya.

8 Ma eze Siria nēbuso Israel agha; o we me ka ndi-orù-ya dua ya ọdu, si, N’ebe di otú a otú a ka ọmuma-ulo-ikwūm gādi.

9 Onye nke Chineke we zigara eze Israel ozi, si, Lezie onwe-gi anya, ka i ghara igabiga ebe ahu; n’ihi na n’ebe ahu ka Siria nāridata.

10 Eze Israel we ziga ozi n’ebe ahu nke onye nke Chineke siri ya dọ kwa ya aka na nti bayere ya; ewe debe ya ndu n’ebe ahu, ọ bughi otù ub͕ò, ọ bughi kwa ub͕ò abua.

11 Ma obi eze Siria anọghi n’otù ebe n’ihi ihe a; o we kpọ ndi-orù-ya, si ha, Ùnu agaghi-egosim onye nime ayi diri eze Israel?

12 Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n’Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n’ime-ulo-ndina-gi.

13 Ọ si, Jenu, hu ebe ya onwe-ya nọ, ka m’we ziga kuta ya. Ewe gosi ya, si, Le, ọ nọ na Dotan.

14 O we ziga inyinya na ub͕ọ-ala na oké usu-ndi-agha n’ebe ahu: ha we bia n’abali, je obodo ahu buruburu.

15 Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n’isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa?

16 Ọ si, Atula egwu: n’ihi na ndi ayi na ha nọ di ọtutu kari ndi ha na ha nọ.

17 Elaisha we kpe ekpere, si, Jehova, biko, saghe anya-ya abua, ka ọ we hu. Jehova we saghe anya nwa-okorọbia ahu; o we hu: ma, le, ugwu ahu juputara n’inyinya na ub͕ọ-ala ọku buruburu Elaisha.

18 Ha we ridakute ya, Elaisha we kpere Jehova, si, Biko, were ìsì tie mba nka. O we were ìsì tie ha dika okwu Elaisha si di.

19 Elaisha we si ha, Nka abughi uzọ, nka abughi kwa obodo; sonum je, m’gēme kwa ka unu jekuru nwoke ahu onye unu nāchọ. O we me ka ha je Sameria.

20 O rue, mb͕e ha bara na Sameria, na Elaisha siri, Jehova, saghe anya ndikom ndia, ka ha we hu. Jehova we saghe anya-la, ha we hu; ma, le, ha nọ n’etiti Sameria.

21 Eze Israel we si Elaisha, mb͕e ọ huru ha, Nnam, #m’gētib͕u ha? #m’gētib͕u ha?

22 Ọ si, Etib͕ula ha: ì gētib͕u ndi i wereworo mma-agha-gi, were kwa uta-gi, dọta n’agha? dọba nri na miri n’iru ha, ka ha we rie, ṅu kwa, lakuru onye-nwe-ha.

23 O we mere ha oké oriri: ha we rie, ṅu kwa, o we zilaga ha, ha we lakuru onye-nwe-ha. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria abataghi ọzọ n’ala Israel.

24 O rue, mb͕e nka gasiri, na Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, rigo, nọchigide Sameria n’agha.

25 Oké unwu uku we di na Sameria: ma, le, ha nānọchigide ya n’agha, rue mb͕e anēre isi inyinya-ibu ọgu ọla-ọcha anọ na otù uzọ n’uzọ anọ nke otù kab ǹsí nduru ọla-ọcha ise.

26 O rue, mb͕e eze Israel nāgabiga n’elu mb͕idi, na otù nwayi tikuru ya nkpu, si, Zọputa, onye-nwem eze.

27 Ọ si, Ọ buru na Jehova azọputaghi gi, òle ebe m’gēsi zọputa gi? ọ̀ bu site n’ebe-nzọcha-ọka, ma-ọbu site n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine?

28 Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, Nwayi a sirim, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya ta, nwam nwoke ka ayi gēri kwa echi.

29 Ayi we sie nwam nwoke, rie ya: m’we si ya n’ubọchi soro ya, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya: ma o zowo nwa-ya nwoke.

30 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke nwayi ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile; (ma ya onwe-ya nāgabiga n’elu mb͕idi;) ndi Israel we le anya, ma, le, ákwà-nkpe dikwasi n’anu-aru-ya n’okpuru uwe-ya.

31 O we si, Ka Chineke mem otú a, ka O me kwa ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na isi Elaisha nwa Shefat gēguzo n’aru ya ta.

32 Ma Elaisha nānọdu n’ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n’ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n’iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n’azu ya?

33 Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, le, onye-ozi ahu nāridakuru ya: ọ si, Le, ihe ọjọ a sitere n’aka Jehova; gini mere m’nēle anya Jehova ọzọ?

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 7

1 Elaisha we si, Nurunu okwu Jehova: otú a ka Jehova siri, Dika mb͕e a echi agēre otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, n’ọnu-uzọ-ama Sameria.

2 Ọchi-agha ahu onye eze nwere, onye ọ nādabere n’aka-ya, we za onye nke Chineke, si, Le, ọ buru na Jehova eme window n’elu-igwe, ihe a, ọ̀ gādi? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya.

3 Ma ndikom anọ, bú ndi-ekpenta, nọ n’oghere ọnu-uzọ-ama: ha we sirita, onwe-ha, Gini mere ayi onwe-ayi nānọdu n’ebe a rue mb͕e ayi nwuru?

4 Ọ buru na ayi asi, Ayi gābà n’obodo, oké unwu di kwa n’obodo, ayi gānwu kwa n’ebe ahu: ọ buru kwa na ayi anọdu n’ebe a, ayi gānwu kwa. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi dabà n’ọmuma-ulo-ikwū Siria: ọ buru na ha edebe ayi ndu, ayi gādi ndu; ọ buru kwa na ha eme ka ayi nwua, ayi gānwu kwa.

5 Ha we bilie n’ururuchi, ibà n’ọmuma-ulo-ikwū Siria: ha we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n’ebe ahu.

6 N’ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.

7 Ha we bilie, b͕alaga n’ururuchi, rapu ulo-ikwū nile ha, na inyinya nile ha, na inyinya-ibu nile ha, ọbuná ọmuma-ulo-ikwū-ha otú di, b͕alaga n’ihi ndu-ha.

8 Ndi-ekpenta ahu we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū, ba n’otù ulo-ikwū, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si n’ebe ahu chiri ọla-ọcha, na ọla-ebo, na uwe, je zo ha; ha we biaghachi, ba n’ulo-ikwū ọzọ, si n’ebe ahu chiri kwa ihe, je zo ha.

9 Ha we sirita onwe-ha, Ọ bughi ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ubọchi ta, ubọchi ozi ọma ka ọ bu, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti: ọ buru na ayi echere rue ìhè ututu, ajọ omume-ayi gāchọputa ayi: ma ub͕u a bianu, ka ayi ba gosi ulo eze.

10 Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n’ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n’ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.

11 O we kpọ ndi-ọnu-uzọ-ama; ha we gosi ya ulo eze nime.

12 Eze we bilie n’abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m’gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n’ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n’ọhia, si, Mb͕e ha siri n’obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n’obodo-ha.

13 Otù nime ndi-orù-ya we za, si, Biko, ka achiri inyinya ise nime inyinya fọduru, nke fọduru nime ya, (le, ha di ka ìgwè nile nke Israel nke fọduru nime ya; le, ha di ka ìgwè nile nke Israel ndi gwusiri agwusi:) ka ayi ziga hu kwa.

14 Ha we chiri ub͕ọ-ala abua, ha na inyinya; eze we ziga ha iso ọmuma-ulo-ikwū Siria, si, Jenu, hu.

15 Ha we jeso ha rue Jọdan: ma, le, uzọ nile juputara n’uwe na ihe, nke ndi Siria tufuru n’ime-ngwa-ngwa-ha. Ndi-ozi we lata, gosi eze.

16 Ndi Israel we pua, luta ọmuma-ulo-ikwū Siria n’agha. Ewe re otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, dika okwu Jehova si di.

17 Eze we me ka onye-isi-agha ahu, bú onye ọ nādabere n’aka-ya, lekọta ọnu-uzọ-ama: ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n’ọnu-uzọ-ama, ọ nwua dika onye nke Chineke kwuru, onye kwuru mb͕e eze ridakuru ya.

18 O rue, dika onye nke chineke gwara eze okwu, si, Agēre mb͕é barley abua otù shekel, na otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, dika mb͕è a echi, n’ọnu-uzọ-ama Sameria;

19 onye-isi-agha we za onye nke Chineke, si, Ma, le, ọ buru na Jehova eme window n’elu-igwe, ọ̀ gādi ka okwu a si di? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya:

20 o we diri ya otú a; ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n’ọnu-uzọ-ama, ọ nwua.