Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 15

1 Samuel we si Sọl, Mu ka Jehova zitere ite gi manu ka i buru eze ndi-Ya, bú Israel: ma ub͕u a ge nti olu okwu Jehova.

2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Elekọtawom ihe Amalek mere Israel, ihe o doro ya n’uzọ, mb͕e o siri n’Ijipt rigota.

3 Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n’aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.

4 Sọl we me ka ndi Israel nuru, o we gukọta ha na Telaim, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise ndi ji ukwu eje, na orú nnù ndikom Juda na nnù ise.

5 Sọl we biarue obodo Amalek, rue nbì nime ndagwurugwu.

6 Sọl we si ndi-Kinait, Jenu, wezuga onwe-unu, si n’etiti ndi Amalek rida, ka m’we ghara ikpochapu unu na ha: n’ihi na unu onwe-unu mere umu Israel nile ebere, mb͕e ha siri n’Ijipt rigota. Ndi-Kinait we si n’etiti Amalek wezuga onwe-ha.

7 Sọl we tib͕ue Amalek, site na Havila ebe i nābà Shua, nke di n’iru Ijipt.

8 Ọ we nwude Egag, bú eze Amalek, na ndu, were ọnu mma-agha wezuga ndi ahu nile ka ebibie ha.

9 Ma Sọl na ndi Israel nwere ọmiko n’aru Egag, na n’aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu, na nke ìgwè ehi, na nke umu anu mara abuba, na n’aru umu-aturu, na n’aru ihe nile di nma, ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha: ma anu-ulo ọ bula nke di nlelì nke ta-kwa-ra aru, nke ahu ka ha wezugara ka ebibie ya.

10 Okwu Jehova we rue Samuel nti, si,

11 Echeghariwom na emewom Sọl eze: n’ihi na o siwo n’isom n’azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile.

12 Samuel we bilie n’isi-ututu izute Sọl n’ututu; ewe gosi Samuel, si, Sọl biaruru Kamel, ma, le, ọ nēguzoro onwe-ya ihe-ncheta, o we je buruburu, gabiga, ridarue Gilgal.

13 Samuel we biakute Sọl: Sọl we si ya, Onye agọziri agọzi n’ebe Jehova nọ ka i bu: emewom ka okwu Jehova guzosie ike.

14 Samuel we si, Gini bu kwa olu ìgwè aturu na ewu a na ntim, ya na olu ìgwè ehi nke mu onwem nānu?

15 Sọl we si, Ọ bu n’etiti ndi Amalek ka ha si chita ha: n’ihi na ndi Israel nwere ọmiko n’aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi, ka ha we chuara Jehova, bú Chineke-gi, àjà; ma ayi ewezugawo nke fọduru ka ebibie ya.

16 Samuel we si Sọl, Ra aka, m’gēgosi kwa gi okwu nke Jehova gwaworom n’abali a. O we si ya, Kwue.

17 Samuel we si, Ọ bu ezie na onye ntà ka i bu n’anya gi onwe-gi, ma ọ̀ bughi onye-isi ebo nile nke Israel ka emere gi? Jehova we te gi manu ka i buru eze Israel;

18 Jehova we ziga gi ije ije, si, Je wezuga ndi-nmehie ahu, bú ndi Amalek, ka ebibie ha, i gēbuso kwa ha agha rue mb͕e agēme ka ha gwusia.

19 N’ìhi gini kwa ka i nēgeghi nti olu Jehova, kama i dakwasiri ihe-nkwata, we me ihe ọjọ n’anya Jehova?

20 Sọl we si Samuel, N’ezie egewom nti olu Jehova, we je ije ahu nke Jehova zigaram, m’we me ka Egag eze Amalek bia, ma ewezugaram Amalek ka ebibie ya.

21 Ma ndi Israel chiri ufọdu nime ihe-nkwata ichuru Jehova, bú Chineke-gi, àjà, nime Gilgal, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, isi ihe n’ihe ewezugara ka ebibie ya.

22 Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu.

23 N’ihi na nmehie nke iju-ase n’aka ndi-mọ ka nnupu-isi bu, ikpere-arusi na terafim ka isi-ike bu kwa. N’ihi na i juwo okwu Jehova, Ọ juwo kwa gi ka i ghara ibu eze.

24 Sọl we si Samuel, Emehiewom: n’ihi na agabigawom okwu-ọnu Jehova na okwu-gi nile: n’ihi na aturum egwu ndi Israel, we ge nti olu-ha.

25 Ma ub͕u a, biko, b͕aghara nmehiem, sorokwam laghachi, ka m’we kpọ isi ala nye Jehova.

26 Samuel we si Sọl, M’gaghi-esoro gi laghachi: n’ihi na i juwo okwu Jehova, Jehova ajuwo kwa gi ka i ghara ibu eze Israel.

27 Samuel we chigharia ila, ma o jidere ọnu-ọnu uwe-nwuda-ya, o we dọwa.

28 Samuel we si ya, Jehova adọwapuwo ala-eze Israel n’aru gi ta, nye ya madu-ibe-gi, nke di nma kari gi.

29 Ọzọ kwa, Ebube Israel agaghi-ekwu okwu-ugha, Ọ gaghi-echeghari kwa: n’ihi na Ọ bughi madu nke Ọ gēji cheghari.

30 O we si, Emehiewom: biko, sọpurum ub͕u a n’iru ndi-okenye ndim, na n’iru Israel; sorokwam laghachi, ka m’we kpọ isi ala nye Jehova, bú Chineke-gi.

31 Samuel we laghachi soro Sọl n’azu; Sọl we kpọ isi ala nye Jehova.

32 Samuel we si, Menu ka Egag eze Amalek biaruem nso. Egag we biakute ya n’iru-utọ. Egag we si, N’ezi-okwu ilu ọnwu ewezugawo onwe-ya.

33 Samuel we si, Dika mma-agha-gi meworo ndinyom ka ha b͕ara aka nwa, otú a ka nne-gi gāb͕ara aka nwa n’etiti ndinyom. Samuel we b͕ukasia Egag n’iru Jehova nime Gilgal.

34 Samuel we la na Rema; Sọl we rigorue ulo-ya, rue Gibea nke Sọl.

35 Samuel abiaghi kwa ọzọ ihu Sọl rue ubọchi ọnwu-ya; n’ihi na Samuel nēruru Sọl újú: ma Jehova cheghariri na o mere Sọl ka ọ buru eze Israel.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 16

1 Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M’gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n’ihi na ahutaworom onwem eze n’etiti umu-ya ndikom.

2 Samuel we si, M’gēsi aṅa je? ọ buru na Sọl anu ya, ọ gēb͕um. Jehova we si, I gēwere nwa-ab͕ọghọ-ehi n’aka-gi, si, Ichuru Jehova àjà ka m’biaworo.

3 I gākpọ kwa Jesi ibia n’ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M’gāsi gi te.

4 Samuel we me ihe ahu nke Jehova kwuru, ọ biarue Bet-lehem. Ndi-okenye obodo ahu we ma jijiji izute ya, si, Ọ̀ bu n’udo ka i biaworo?

5 Ọ we si, Ọ bu n’udo: ichuru Jehova àjà ka m’biaworo: donu onwe-unu nsọ, sorom bia n’ichu-àjà ahu. O we do Jesi na umu-ya ndikom nsọ, kpọ ha bia n’ichu-aja ahu.

6 O rue, mb͕e ha biara, na ọ huru Elaiab, o we si, N’ezie, ọ nọ n’iru Jehova, bú onye nke Ya etere manu.

7 Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n’ihi na ajuwom ya: n’ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n’ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.

8 Jesi we kpọ Abinadab, me ka ọ gābiga n’iru Samuel. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka.

9 Jesi we me ka Shama gabiga. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka.

10 Jesi we me ka madu asa nime umu-ya ndikom gabiga n’iru Samuel. Samuel we si Jesi, Jehova arọputaghi ndia.

11 Samuel we si Jesi, Hà agwuwo, bú umu-okoro-gi? Ọ si, Ọ fọdu-kwa-ra ọdudù-nwam, ma, le, ọ nāzù aturu. Samuel we si Jesi, Ziga kuta ya: n’ihi na ayi agaghi-anọdu buruburu rue mb͕e ọ biara n’ebe a.

12 Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n’ihi na nka bu ya.

13 Samuel we were mpi manu ahu, te ya n’etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n’ike site n’ubọchi ahu ga n’iru. Samuel we bilie, la Rema.

14 Ma Mọ nke Jehova wezugara Onwe-ya n’ebe Sọl nọ, mọ ọjọ we si n’ebe Jehova nọ me ka ọ tua egwu nke-uku.

15 Ndi-orù Sọl we si ya, Biko, le, mọ ọjọ nke Chineke nēme ka i tua egwu.

16 Biko, ka onye-nwe-ayi si ndi-orù-ya, ndi nọ n’iru gi, ka ha chọ nwoke nke mara ọkpukpọ-ubọ-akwara nke-ọma: ọ gēru kwa, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke dikwasi n’aru gi, na ọ gēwere aka-ya kpọ ubọ, ọ gādi kwa gi nma.

17 Sọl we si ndi-orù-ya, Biko, hutaranum nwoke nke nākpọ ubọ nke-ọma, me-kwa-nu ka ọ biakutem.

18 Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n’okwu, buru kwa nwoke mara nma n’aru, Jehova nọye-kwa-ra ya.

19 Sọl we zigara Jesi ndi-ozi, si, Ziterem Devid nwa-gi, nke nọ n’etiti ìgwè ewu na aturu.

20 Jesi we were otù inyinya-ibu nke eboro ya achicha, na otù karama-akpukpọ manya-vine, na otù nwa-ewu, we zigara Sọl n’aka Devid, bú nwa-ya.

21 Devid we biakute Sọl, guzo n’iru ya: o we hu ya n’anya nke-uku; o we ghọrọ ya onye nēbu ihe-agha.

22 Sọl we zigara Jesi ozi, si, Biko, ka Devid guzo n’irum; n’ihi na ọ hutawo amara n’irum.

23 O rue, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke di n’aru Sọl, na Devid were ubọ-akwara-ya, were aka-ya kpọ ya: aru we dajua Sọl, o we di ya nma, mọ ọjọ ahu we si n’ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 17

1 Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ewe chikọta ha na Soko, nke Juda nwe, ha we ma ulo-ikwū-ha n’etiti Soko na Azeka, n’Efes-damim.

2 Sọl na ndikom Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Ila, we do agha n’usoro izute ndi Filistia.

3 Ndi Filistia we nēguzo n’ugwu n’otù akuku, Israel nēguzo kwa n’ugwu n’akuku nke-ọzọ: ndagwurugwu we di n’etiti ha.

4 Onye-nputa-ọb͕ọ-agha we si n’ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta, aha-ya bu Gọlaiat, sitere na Gat, ogologo-ya di cubit isi na otù ntù-aka.

5 Okpu-agha ọla di kwa n’isi-ya, ọ bu kwa uwe-agha emere dika akpirikpa-azù ka eyikwasiri ya; ọtùtù uwe-agha ahu di nnù shekel ọla iri-na-abua na ọgu iri.

6 Ihe-ọla eji kpuchi ukwu di kwa n’ukwu-ya abua, nkpunkpu ube ọla di kwa n’etiti ubu-ya abua.

7 Osisi ube-ya di kwa ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; isi ube-ya di nnù shekel ígwè na ọgu iri: onye nēbu ọta-ya nēje n’iru ya.

8 O we guzo kpọ usoro-agha nile nke Israel òkù, si ha, N’ìhi gini ka unu putaworo ido agha-unu n’usoro? mu onwem, àbughm onye Filistia? ma unu onwe-unu, ùnu abughi ndi-orù Sọl nwe? rọputaranu onwe-unu otù nwoke, ka ọ ridakutekwam.

9 Ọ buru na ọ puru ilusom ọ̀gù, we tib͕uem, ayi gābu-kwa-ra unu ndi-orù: ma ọ buru na mu onwem puru ilub͕u ya, we tib͕ue ya, unu gābu-kwa-ra ayi ndi-orù, we fè ayi òfùfè.

10 Onye Filistia ahu we si, Mu onwem atawo usoro-agha nile nke Israel uta ta; nyenum otù nwoke, ka ayi we lurita ọ̀gù.

11 Sọl na Israel nile we nu okwu nile ndia nke onye Filistia, ha we tua ujọ, tua egwu nke-uku.

12 Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n’etiti ndikom n’ubọchi Sọl.

13 Umu-ndikom atọ nke Jesi ndi bu okenye we je soro Sọl ibu agha: aha umu-ya ndikom atọ ndi jere agha bu Elaiab ọkpara-ya, na Abinadab nke so ya, na Shama, bú nke-atọ.

14 Ma Devid, ya onwe-ya bu ọdudù-nwa: atọ ahu, bú okenye, we jeso Sọl n’azu.

15 Ma Devid nējekuru Sọl, nēsi kwa n’ebe Sọl nọ laghachi, izù ìgwè ewu na aturu nna-ya na Bet-lehem.

16 Onye Filistia ahu nābiaru kwa nso n’isi-ututu na n’anyasi, we guzo onwe-ya ọgu abali abua.

17 Jesi we si Devid nwa-ya, Biko, wegara umu-nne-gi otù ephah nke ọka nka aṅara n’ọku, na ob͕e achicha iri ndia, būru ha b͕a ọsọ je n’ọmuma-ulo-ikwū jekuru umu-nne-gi;

18 buga-kwa-ra onye-isi usu nnù ndikom na ọgu ise nke ha cheese iri ndia, lekọta kwa umu-nne-gi ma ha nọ n’udo, nara kwa ihe-mbe-ha.

19 Ma Sọl, na ndi ahu, na ndikom nile nke Israel, nọ na ndagwurugwu Ila, nēbuso ndi Filistia agha.

20 Devid we bilie n’isi-ututu, rapu ìgwè ewu na aturu ahu n’aka onye nēdebe aturu, o we būru, je, dika Jesi nyere ya iwu: o we biarue ebe anēdebe ub͕ọ-ala, mb͕e usu-ndi-agha ndi nāpukuru usoro-agha nēti nkpu n’agha.

21 Israel na ndi Filistia we do onwe-ha n’usoro-agha izute usoro-agha.

22 Devid we zitu ihe nile o bu rapu n’aka onye nēdebe ihe, o we b͕abà n’usoro-agha, bia, jua umu-nne-ya ajuju bayere udo-ha.

23 Ma mb͕e ya na ha nēkwu okwu, le, onye-nputa-ọb͕ọ-agha ahu nēsi n’usoro-agha ndi Filistia rigota, bú onye Filistia ahu, Gọlaiat bu aha-ya, sitere na Gat, ọ we kwue dika okwu ndia si di: Devid we nu ha.

24 Ndikom nile nke Israel, mb͕e ha huru nwoke ahu, ha we b͕apu n’iru ya, tua egwu nke-uku.

25 Ndikom Israel we si, Ùnu ahuwo nwoke a nke nārigota? n’ihi na ọ bu ita Israel uta ka ọ nārigota: ọ gēru kwa, na nwoke nke nētib͕u ya, eze gēwere àkù uku me ka ọ buru ọgaranya, ọ gēnye kwa ya nwa-ya nwayi, me ka ulo nna-ya nwere onwe-ya n’Israel.

26 Devid we gwa ndikom ndi ya na ha nēguzo okwu, si, Gini ka agēmere nwoke nke gētib͕u onye Filistia nka, wezuga ihe-ita-uta n’aru Israel? n’ihi na ònye bu onye Filistia nka nke anēbìghi úgwù, na ọ gāta usoro-agha nile nke Chineke di ndu uta?

27 Ndi Israel we gwa ya okwu dika okwu a si di, si, Otú a ka agēmere nwoke nke gētib͕u ya.

28 Elaiab, bú nwa-nne-ya nke-okenye, we nu mb͕e ọ nāgwa ndikom ahu okwu; iwe Elaiab we di ọku megide Devid, ọ si, N’ìhi gini kwa ka i ridataworo? ọ̀ bu kwa n’aka onye ka i rapuru aturu ole-na-ole ahu n’ọzara? mu onwem mara nganga-gi, na ihe ọjọ nke obi-gi; n’ihi na ọ bu ihu agha ka i ridataworo.

29 Devid we si, Gini ka m’meworo ub͕u a? ọ̀ bughi okwu efu, bu ihe a m’nēkwu?

30 O we si n’akuku ya chigharia, che onye ọzọ iru, kwue dika okwu a si di: ndi Israel we zaghachi ya okwu dika okwu mbu si di.

31 Ewe nu okwu nke Devid kwuru, ha we gosi ha n’iru Sọl, o we nara ya.

32 Devid we si Sọl, Ka obi madu ọ bula ghara ifepu n’ihi ya; orù-gi gēje luso onye Filistia nka ọ̀gù.

33 Sọl we si Devid, I pughi ijekuru onye Filistia nka iluso ya ọ̀gù: n’ihi na nwata ka i bu, ma ya onwe-ya bu nwoke agha site na mb͕e ọ di na nwata.

34 Devid we si Sọl, Onye nāzùru nna-ya ìgwè ewu na aturu ka orù-gi buworo; ọdum we bia, ya na bear, we būpu nwa-aturu n’ìgwè aturu,

35 m’we pua so ya n’azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n’ọnu-ya: o we bilie imegidem, m’we jide ya n’ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua.

36 Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n’ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta.

37 Devid we si, Jehova nke naputaram n’aka ọdum, na n’aka bear, Ya onwe-ya gānaputam n’aka onye Filistia nka. Sọl we si Devid, Je, Jehova gānọye-kwa-ra gi.

38 Sọl we yikwasi Devid uwe-nwuda-ya, kpukwasi okpu-agha ọla n’isi-ya, yikwasi ya uwe-agha.

39 Devid we kekwasi mma-agha-ya n’uwe-nwuda-ya, we jisie ike ije; n’ihi na ọ nwaghi ya. Devid we si Sọl, Apughm iwere ihe ndia je; n’ihi na anwaghm ha. Devid we yipu ha n’aru ya.

40 O were nkpa-n’aka-ya n’aka-ya, rọputara onwe-ya nkume ise kwọrọ murumuru na miri-iyi, tiye ha n’ihe ndi-ọzùzù-aturu nke o nwere, bú n’àkpà-ya; èbè-ya di kwa n’aka-ya: o we biarue nso onye Filistia ahu.

41 Onye Filistia ahu we bia, ọ nābia nēru kwa nso Devid; nwoke ahu nke nēbu ọta-ya nēje kwa n’iru ya.

42 Onye Filistia ahu we legide anya buruburu, hu Devid, we lelìa ya anya: n’ihi na ọ bu nwata, nācha kwa ọbara-ọbara, ma kwa nma ile anya.

43 Onye Filistia ahu we si Devid, Ọ̀ bu nkita ka m’bu, na gi onwe-gi nēwere nkpa-n’aka biakutem? Onye Filistia ahu we were chi-ya nile kọcha Devid.

44 Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m’were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia.

45 Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta.

46 Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n’akam; m’gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n’aru gi; m’gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel:

47 ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n’ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n’aka-ayi.

48 O rue, mb͕e onye Filistia ahu biliri, bia rue nso izute Devid, na Devid mere ngwa, b͕a ọsọ ijekuru usoro-agha izute onye Filistia ahu.

49 Devid we setia aka-ya tiye n’àkpà-ya, weputa otù nkume nime ya, ma ya, mata onye Filistia ahu n’egedege-iru-ya; nkume ahu we bamìe n’egedege-iru-ya, o we da kpue iru-ya n’ala.

50 Devid we were èbè, were kwa nkume, kwa onye Filistia n’ike, o we tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua; ma mma-agha adighi n’aka Devid.

51 Devid we b͕a ọsọ, guzo n’elu onye Filistia ahu, were mma-agha-ya, miputa ya n’ọbọ-ya, me ka ọ nwua, ọ were ya bipu isi-ya. Ndi Filistia we hu na dike-ha anwuwo, ha we b͕alaga.

52 Ndikom Israel na Juda we bilie, tie nkpu, chua ndi Filistia, rue ebe i nābà Gai, ru kwa ọnu-uzọ-ama Ekron. Ndi Filistia ndi emeruru aru we da n’uzọ Shaaraim, we rue Gat, ru kwa Ekron.

53 Umu Israel we si n’ichusi ndi Filistia ike lata, ha we kwakọrọ ọmuma-ulo-ikwū nile ha.

54 Devid we būru isi onye Filistia ahu, bubata ya na Jerusalem; ma ọ tọb͕ọrọ ihe-agha-ya n’ulo-ikwū-ya.

55 Ma mb͕e Sọl huru Devid ka ọ nāpu izute onye Filistia ahu, ọ siri Abnea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, Abnea, nwà onye ka nwa-okoro nka bu? Abnea we si, Nkpuru-obi-gi nādi ndu, eze, amaghm.

56 Eze we si, Gi onwe-gi juta onye nwata-okorọbia ahu bu nwa-ya.

57 Ma mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, Abnea kuru ya, me ka ọ bata n’iru Sọl, isi onye Filistia ahu di kwa n’aka-ya.

58 Sọl we si ya, Nwà onye ka i bu, gi nwa-okorọbia? Devid we si, Nwa orù-gi, bú Jesi, bú onye Bet-lehem, ka m’bu.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 18

1 O rue, mb͕e ọ gwabìri Sọl okwu, na ekekọtara nkpuru-obi Jonatan na nkpuru-obi Devid, Jonatan we hu ya n’anya dika nkpuru-obi-ya.

2 Sọl we nara ya n’ubọchi ahu, o kweghi kwa ka ọ laghachi n’ulo nna-ya.

3 Jonatan na Devid we b͕a ndu, n’ihi na ọ huru ya n’anya dika nkpuru-obi-ya.

4 Jonatan we yipu uwe-nwuda nke di n’aru ya, nye ya Devid, na uwe-ya nile, ọbuná rue mma-agha-ya, ru kwa uta-ya, ru kwa ihe-ike-n’úkwù-ya.

5 Devid we nāpu je ebe ọ bula Sọl nēziga ya, o nwe-kwa-ra uche: Sọl we do ya onye-isi ndikom agha, o we di nma n’anya ndi Israel nile, di kwa nma n’anya ndi-orù Sọl.

6 O rue mb͕e ha nābia, mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, na ndinyom siri n’obobo nile nke Israel puta, ibù abù na ite egwú, izute Sọl, chiri egwú-otiti, were kwa ọṅu, chiri kwa ubọ eji akwara atọ kwe.

7 Ndinyom we zarita onwe-ha, bú ndi nēgwuri egwú, si,

Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,

Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise.

8 Iwe Sọl we di ọku nke-uku, okwu a jọ-kwa-ra njọ n’anya-ya; ọ si, Ha enyewo Devid orú nnù na nnù ise, orú nnù na nnù ise, ma ọ bu mu ka ha nyeworo nání nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: ma nke fọduru inye ya bu nání ala-eze.

9 Sọl we nēle Devid anya ọjọ site n’ubọchi ahu ga n’iru.

10 O rue, n’echi-ya, na mọ ọjọ nke Chineke dakwasiri Sọl n’ike, o we bū amuma n’etiti ulo: Devid nēwere kwa aka-ya kpọ ubọ, dika ọ nēme kwa-ubọchi: ma ube di n’aka Sọl.

11 Sọl we tua ube ahu; ọ si, M’gātugide Devid ọbuná na mb͕idi. Devid we chigharia onwe-ya si n’iru ya pua ub͕ò abua.

12 Sọl we nātu egwu Devid, n’ihi na Jehova nọyere ya, ma O siri n’ebe Sọl nọ wezuga Onwe-ya.

13 Sọl we si n’ebe ọ nọ wezuga ya, do ya ka ọ buru ya onye-isi nnù ndikom abua na ọgu iri; o we nāpu nābata kwa n’iru ndi Israel.

14 Devid we nēnwe uche n’uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya.

15 Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya.

16 Ma Israel nile na Juda nile nāhu Devid n’anya; n’ihi na ya onwe-ya nāpu nābata kwa n’iru ha.

17 Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m’gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N’ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n’aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n’aru ya.

18 Devid we si Sọl, Ònye ka m’bu, gini bu kwa ndum, ma-ọbu ab͕uru nnam n’Israel, na m’gāburu eze di nwa-ya?

19 O rue, na mb͕e agēwere Mirab nwa Sọl nye Devid, na nwayi ahu ka enyere Adriel, bú onye Mehola, na nwunye.

20 Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, huru Devid n’anya: ha we gosi Sọl, ihe ahu ziri ezi n’anya-ya.

21 Sọl we si, M’gēnye ya ya, ka o we ghọrọ ya ọnyà, ka aka ndi Filistia we di n’aru ya. Sọl we si Devid, Nke ub͕ò abua ka i gāburum di nwam ta.

22 Sọl we nye ndi-orù-ya iwu, si, Gwanu Devid okwu na nzuzo, si, Le, ihe-gi nātọ eze utọ, ndi-orù-ya nile hu-kwa-ra gi n’anya: ma ub͕u a buru di nwa eze.

23 Ndi-orù Sọl we kwue okwu ndia na nti Devid. Devid we si, Ọ̀ bu ihe di nfe n’anya-unu ibu di nwa eze, ebe mu onwem bu ob͕eye na onye anākpọghi ihe?

24 Ndi-orù Sọl we gosi ya, si, Dika okwu ndia si di ka Devid kwuru.

25 Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n’aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n’aka ndi Filistia.

26 Ndi-orù-ya we gosi Devid okwu ndia, ma ihe ahu ziri ezi n’anya Devid, bú ka ọ buru di nwa eze. Ma ubọchi nile akēzughi;

27 Devid we bilie, je, ya onwe-ya na ndikom-ya, o we tib͕ue ọgu ndikom iri n’etiti ndi Filistia; Devid we chita api-ha, ha we nye ha eze n’ọnu-ọgugu zuru ezu, ka o we buru di nwa eze. Sọl we nye ya Maikal nwa-ya na nwunye.

28 Sọl we hu mara kwa na Jehova nọyere Devid; Maikal nwa Sọl hu-kwa-ra ya n’anya.

29 Sọl we nātu egwu Devid kari; Sọl we buru onye-iro Devid ubọchi-ya nile.

30 Ndi-isi ndi Filistia we puta: o rue, mb͕e ọ bula ha nāputa, na Devid nwere uche kari ndi-orù nile nke Sọl; aha-ya we di oké ọnu-ahia nke-uku.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 19

1 Sọl we gwa Jonatan nwa-ya na ndi-orù-ya nile okwu, ka ha me ka Devid nwua.

2 Ma ihe Devid tọrọ Jonatan nwa Sọl utọ nke-uku. Jonatan we gosi Devid, si, Sọl, bú nnam, nāchọ ime ka i nwua: ma ub͕u a, biko, lezie onwe-gi anya n’ututu, nọdu n’ebe di nzuzo, zo onwe-gi:

3 ma mu onwem gāpu, guzo n’akuku nnam n’ọhia ebe gi onwe-gi nọ, mu onwem gāgwa kwa nnam okwu bayere gi; ma m’hu ihe ọ bula, m’gēgosi kwa gi.

4 Jonatan we gwa Sọl nna-ya okwu di nma bayere Devid, si ya, Ka eze ghara imehie megide orù-ya, bú Devid; n’ihi na o mehieghi megide gi, na n’ihi na omume-ya nile adiwo nma nke-uku n’ebe i nọ:

5 n’ihi na o tiyere ndu-ya n’ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n’ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n’efu?

6 Sọl we ge nti olu Jonatan: Sọl we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, agaghi-eme ka ọ nwua ma-ọli.

7 Jonatan we kpọ Devid, Jonatan we gosi ya ihe ndia nile. Jonatan we me ka Devid biakute Sọl, o we nọ n’iru ya, dika na mb͕e gara aga.

8 Agha we di kwa ọzọ: Devid we pua, buso ndi Filistia agha, tib͕ue ha ntib͕u uku; ha we b͕apu n’iru ya.

9 Mọ ọjọ nke Jehova we di n’aru Sọl, ma ya onwe-ya nānọdu n’ulo-ya, ube-ya di kwa n’aka-ya; Devid we were aka-ya nākpọ ubọ.

10 Sọl we chọ iwere ube ahu tugide Devid ọbuná na mb͕idi; ma o repuru n’iru Sọl, ọ we tugide ube ahu na mb͕idi: Devid we b͕alaga, wepuga onwe-ya n’abali ahu.

11 Sọl we ziga ndi-ozi n’ulo Devid, iche ya nche, na ime ka ọ nwua n’ututu: Maikal, bú nwunye-ya, we gosi Devid, si, Ọ buru na i zọputaghi ndu-gi abali a, agēme ka gi onwe-gi nwua echi.

12 Maikal we weda Devid site na window: o we je, b͕alaga, wepuga onwe-ya.

13 Maikal we were terafim-ya, tọb͕ọ ya n’ihe-ndina-ya, tiye ákwà-ob͕ub͕o eji aji ewu me n’okpuru isi-ya, were ákwà-nb͕okwasi kpuchie ya.

14 Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid, ma Maikal siri, Aru adighi ya ike.

15 Sọl we ziga ndi-ozi ahu ihu Devid, si, Bugotaram ya n’ihe-ndina-ya, ka m’we me ka ọ nwua.

16 Ndi-ozi ahu we bata, ma, le, terafim ahu di n’ihe-ndina, ákwà-ob͕ub͕o nke eji aji ewu me di kwa n’okpuru isi-ya.

17 Sọl we si Maikal, N’ìhi gini ka i ghọb͕uworom otú a, we zilaga onye-irom, o we wepuga onwe-ya? Maikal we si Sọl, Ya onwe-ya sirim, Zilagam: n’ìhi gini ka m’gēme ka i nwua?

18 Ma Devid b͕alagara, wepuga onwe-ya, biakute Samuel rue Rema, gosi ya ihe nile Sọl mere ya. Ọ we je, ya onwe-ya na Samuel, ha we biri na Naiot.

19 Ewe gosi Sọl, si, Le, Devid nọ na Naiot nime Rema.

20 Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid: ha we hu nzukọ ndi-amuma ahu ka ha nēbu amuma, ha hu kwa Samuel ka ọ nēguzo, dika onye-isi-ha: Mọ nke Chineke we dikwasi ndi-ozi Sọl, ha onwe-ha we bū kwa amuma.

21 Ha we gosi Sọl, o we ziga ndi-ozi ọzọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Sọl we ziga kwa ndi-ozi ọzọ nke ub͕ò atọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma.

22 Ya onwe-ya we je kwa Rema, biarue olùlù-miri uku nke di na Seku: ọ jua, si, Òle ebe Samuel na Devid nọ? Otù onye we si, Le, ha nọ na Naiot nime Rema.

23 O we je n’ebe ahu, rue Naiot nime Rema: Mọ nke Chineke we dikwasi kwa ya, o we nēje, we bue amuma, rue mb͕e ọ batara Naiot nime Rema.

24 Ya onwe-ya we yipu kwa uwe-ya nile, ya onwe-ya we bū kwa amuma n’iru Samuel, da n’ala b͕ara ọtọ ubọchi ahu nile na abali-ya nile. N’ihi ya ka ha nāsi, Sọl, ọ̀ di kwa n’etiti ndi-amuma?

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 20

1 Devid we si na Naiot nime Rema b͕alaga, ọ bia kwue n’iru Jonatan, si, Gini ka m’meworo? gini bu ajọ omumem? gini bu kwa nmehiem n’iru nna-gi, na ọ nāchọ ndum?

2 Ọ si ya, Ya buru ihe-árú; i gaghi-anwu: le, nnam adighi-eme ihe uku ma-ọbu ihe ntà, ma ọ buru na o kpughepughi ntim ka m’nu ya: gini me-kwa-ra nnam ji zonarim ihe a? ọ bughi otú a.

3 Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n’iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n’ab͕ata mu na ọnwu.

4 Jonatan we si Devid, Gini ka nkpuru-obi-gi nāsi? m’gēme-kwa-ra gi ya.

5 Devid we si Jonatan, Le, ọnwa ọhu gāpu echi, mu onwem aghaghi kwa iso eze nọdu n’iri ihe: ma zilagam, ka m’we zo onwem n’ọhia rue anyasi nwa-nne-echi.

6 Ọ buru na nna-gi ele anyam ma-ọli, i gāsi kwa, Devid riọsirim ike ka m’rapu ya ka ọ b͕a ọsọ je Bet-lehem, bú obodo-ya: n’ihi na àjà arọ diri ab͕uru-ya nile n’ebe ahu.

7 Ọ buru na ọ si otú a, Ọ di nma; udo gādiri orù-gi: ma ọ buru na iwe-ya di ọku nke-uku, mara na o zubesiri ihe ọjọ a ike.

8 Ma i gēmere orù-gi ebere; n’ihi na i mere ka orù-gi soro gi ba n’ọb͕ub͕a-ndu Jehova: ma ọ buru na ajọ omume di nimem, gi onwe-gi me ka m’nwua; ma n’ìhi gini kwa ka i gēme ka m’bakuru nna-gi?

9 Jonatan we si, Ya buru gi ihe-árú: n’ihi na ọ buru na amaram n’ezie na nnam zubesiri ike ka ihe ọjọ a biakwasi gi, #m’gaghi-egosi kwa gi ya?

10 Devid we si Jonatan, Ònye gēgosim? ma-ọbu gini gēme ma ọ buru na nna-gi aza gi okwu ike?

11 Jonatan we si Devid, Bia, ka ayi pua je n’ọhia. Ha abua we pua je n’ọhia.

12 Jonatan we si Devid, Jehova, bú Chineke Israel, Ya buru onye-àmà; mb͕e m’gēnyochata obi nnam dika mb͕e a echi, ma-ọbu nwa-nne-echi, ma, le, ọ di nma n’ebe Devid nọ, #m’gaghi-ezite-kwa-ra gi ozi, we kpughepu nti-gi ka i nu ya?

13 Jehova me Jonatan otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, mb͕e ọ di nnam nma ime gi ihe ọjọ a, ma m’kpughepughi nti-gi ka i nu ya, we zilaga gi, ka i we la n’udo: Jehova nọye-kwa-ra gi, dika Ọ nọyeworo nnam.

14 Ma ọ bughi nání mb͕e m’nọ na ndu ka i gēmerem ebere nke Jehova, ka m’we ghara inwu:

15 kama i gaghi-ebipu kwa ebere-gi n’ulom rue mb͕e ebighi-ebi: i gaghi-ebipu kwa ya mb͕e Jehova bipuworo ndi-iro Devid, nwoke ọ bula n’elu uwa.

16 Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n’aka ndi-iro Devid.

17 Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n’ihi na ọ huru ya n’anya: n’ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n’anya, otú a ka ọ huru Devid n’anya.

18 Jonatan we si ya, Echi ka ọnwa ọhu gāpu: agēle kwa anya gi, n’ihi na agēle anya ọnọdu-gi nke tọb͕ọrọ n’efu.

19 Ma mb͕e i nọdusiri ubọchi atọ i garida ọsọsọ, ba n’ebe ahu, bú ebe izoro onwe-gi n’ubọchi ihe ahu emere, i gānọdu kwa n’akuku nkume Ezel.

20 Mu onwem gāb͕a kwa àkú atọ n’akuku-ya, dika agāsi na ab͕aram ihe m’dotara.

21 Ma, le, m’gēziga nwa-okorom, si, Je, chọta àkú nile. Ọ buru na asim nwa-okoro ahu ma-ọli, Le, àkú di n’akuku azu gi: chiri ha bia; n’ihi na udo diri gi, okwu adighi kwa, Jehova nādi ndu.

22 Ma ọ buru na asim nwata-okorọbia ahu otú a, Le, àkú di n’akuku iru gi: la; n’ihi na Jehova ezilagawo gi.

23 Ma okwu ahu nke mu na gi kwuworo, le, Jehova nọ n’etiti mu na gi rue mb͕e ebighi-ebi.

24 Devid we zo onwe-ya n’ọhia: ubọchi ọnwa ọhu we rue, eze we nọdu na nri iri ihe.

25 Eze we nọkwasi n’ọnọdu-ya, dika ọ nēme ub͕ò ub͕ò, bú n’ọnọdu di n’akuku mb͕idi; Jonatan we bilie, Abnea we nọdu n’akuku Sọl: ma elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n’efu.

26 Ma Sọl ekwughi ihe ọ bula n’ubọchi ahu: n’ihi na ọ siri, Ihe-ndabà ka ọ bu; onye nādighi ọcha ka ọ bu; n’ezie ọ dighi ọcha.

27 O rue n’echi nke ọnwa ọhu, nke bu ubọchi nke-abua, na elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n’efu: Sọl we si Jonatan nwa-ya, Gini mere nwa Jesi abataghi iri nri ma nyahuru ma ta?

28 Jonatan we za Sọl, si, Devid riọsirim ike ka m’rapu ya ka ọ je na Bet-lehem:

29 ọ si, Biko, zilagam; n’ihi na àjà ab͕uru-ayi ka ayi nwere n’obodo; ya onwe-ya enyewom iwu, bú nwa-nnem, ije: ma ub͕u a, ọ buru na ahutawom amara n’iru gi, biko, ka m’wepuga onwem, we hu umu-nnem. N’ihi ya ọ biaghi na table eze.

30 Iwe Sọl we di ọku megide Jonatan, ọ si ya, Gi nwa nke nwayi b͕agọrọ ab͕agọ nke nānupu kwa isi, àmaghm na gi onwe-gi nārọputa nwa Jesi ibu ihe-ihere-gi na ibu ihe-ihere ọtọ nne-gi?

31 N’ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n’elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n’ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu.

32 Jonatan we za Sọl nna-ya, si ya, N’ìhi gini ka agēme ka ọ nwua? Gini ka o meworo?

33 Sọl we tua ya ube-ya itub͕u ya: Jonatan we mara na nna-ya zubesiri ihe ahu ike, bú ime ka Devid nwua.

34 Jonatan we si na table bilie n’iwe di ọku, o righi kwa nri n’ubọchi nke-abua nke ọnwa ahu: n’ihi na o wutara ya n’ihi Devid, n’ihi na nna-ya mere ya ihe-ihere.

35 O rue, n’ututu, na Jonatan puru je n’ọhia na mb͕e ya na Devid kara àkà, otù nwatakiri-nwoke so kwa ya.

36 Ọ si nwa-okoro-ya, B͕a ọsọ, biko chọta àkú nile nke mu onwem nāb͕a. Mb͕e nwa-okoro ahu nāb͕a ọsọ, ya onwe-ya we b͕a àkú, me ka ọ gabiga ya.

37 Nwa-okoro ahu we biarue ebe àkú ahu di, bú nke Jonatan b͕ara, Jonatan we kpọ òkù n’azu nwa-okoro ahu, si, Àkú ahu, ọ̀ dighi n’akuku iru gi?

38 Jonatan we kpọ òkù n’azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya.

39 Ma nwa-okoro ahu amaghi ihe ọ bula: nání Jonatan na Devid mara okwu ahu.

40 Jonatan we nye nwa-okoro o nwere ihe-ya, si ya, La, chiri ha ba n’obodo.

41 Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n’obodo, Devid we si n’akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n’ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá.

42 Jonatan we si Devid, La n’udo, n’ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n’aha Jehova, si, Jehova gānọ n’etiti mu na gi, na n’etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n’obodo.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 21

1 Devid we biarue Nob biakute Ahimelek, bú onye-nchu-àjà: Ahimelek we ma jijiji izute Devid, si ya Gini mere nání gi onwe-gi biara, ma ọ dighi nwoke gi na ya yikọrọ?

2 Devid we si Ahimelek, bú onye-nchu-àjà, Eze enyewom ihe n’iwu, sim, Ka nwoke ọ bula ghara ima ihe ọ bula bayere ihe ahu nke mu onwem nēziga gi ozi-ya, na nke m’nyeworo gi n’iwu: emewokwam ka umu-okorọbiam mara na ha gēje n’ebe di otú a otú a.

3 Ma ub͕u a gini di n’okpuru aka-gi? nyem ob͕e achicha ise n’aka, ma-ọbu ihe agāchọta.

4 Onye-nchu-àjà ahu we za Devid, si, Ọ dighi achicha anēdoghi nsọ di n’okpuru akam, ma achicha nsọ di; nání ọ buru na umu-okorọbia ahu edebewo onwe-ha ghara imetu nwayi aru.

5 Devid we za onye-nchu-àjà, si ya, N’ezie, ọ buru na eb͕ochiwo ndinyom n’imetu ayi aru, dika na mb͕e gara aga mb͕e m’nāputa, ihe umu-okorọbia we di nsọ, ma nke ahu bu ije nke anēdoghi nsọ; ìhe-ha gēsi kwa aṅa ghara idi nsọ kari ta?

6 Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n’ihi na ọ dighi achicha di n’ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n’iru Jehova, idọba achicha di ọku n’elu table n’ubọchi ewepuru ya.

7 Ma otù nwoke n’etiti ndi-orù Sọl nọ n’ebe ahu n’ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n’iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n’etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere.

8 Devid we si Ahimelek, Ọ̀ dighi kwa ube ma-ọbu mma-agha di n’ebe a n’okpuru aka-gi? n’ihi na ewetaghm ma mma-agham ma ihe-agham, n’ihi na okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku.

9 Onye-nchu-àjà we si, Mma-agha Gọlaiat, bú onye Filistia, onye i tib͕uru na ndagwurugwu Ila, le, nke ahu di, afuchiworo ya n’ákwà n’azu ephod: ọ buru na i gēwere nke ahu, were ya: n’ihi na ọ dighi ọzọ di n’ebe a ma-ọbughi ya. Devid we si, Ọ dighi nke di ka ya; nyem ya.

10 Devid we bilie, b͕apu n’ubọchi ahu n’iru Sọl, bakuru Ekish, bú eze Gat.

11 Ndi-orù Ekish we si ya, Ọ̀ bughi Devid, bú eze ala ahu, bu nka? ọ̀ bughi ihe bayere nwoke a ka ha zaritara onwe-ha n’ite-egwú, si,

Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,

Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?

12 Devid we tiye okwu ndia n’obi-ya, tua egwu Ekish, bú eze Gat, nke-uku.

13 O we b͕anwe omume-ya n’anya-ha, me onwe-ya dika onye anya-ya nādighi nma n’aka-ha, ọ ka kwa akàrà n’ibo ọnu-uzọ-ama, nāgusisi kwa ọnu-miri-ya n’afu-ọnu-ya.

14 Ekish we si ndi-orù-ya, Le, unu nāhu nwoke a ka o nēme onwe-ya dika onye nāwi ara: n’ìhi gini ka unu mere ka ọ biakutem?

15 Ndi nke akam nāwi ara, hà kọrọm ukọ, na unu emewo ka nwoke a bata ime onwe-ya dika onye nāwi ara n’irum? Nwoke a, ọ̀ gābata n’ulom?

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 22

1 Devid we si n’ebe ahu je, wepuga onwe-ya rue ọb͕à Adulam: umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we nu ya, ha we ridakuru ya n’ebe ahu.

2 Ha we chikọta onwe-ha n’ebe ọ nọ, bú nwoke ọ bula nke nọ na nkpab͕u, na nwoke ọ bula nke nwere onye ọ nara ego n’ọmuru-nwa, na nwoke ọ bula nkpuru-obi-ya di ilu; o we buru onye-isi-ha: ihe ra ka nnù ndikom we nọ n’aka-ya.

3 Devid we si n’ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n’etiti unu, rue mb͕e m’mara ihe Chineke gēmerem.

4 O we duru ha bia n’iru eze Moab: ha we biri n’aka-ya ubọchi nile Devid nọ n’ebe ahu ewusiri ike.

5 Gad, bú onye-amuma, we si Devid, Anọdula n’ebe a ewusiri ike; je, bara onwe-gi n’ala Juda. Devid we je, ba n’oké ọhia Heret.

6 Sọl we nu na amatara ihe bayere Devid na ndikom ya na ha nọ: ma Sọl nānọdu na Gibea, n’okpuru osisi tamarisk na Rema, ube-ya di kwa n’aka-ya, ndi-orù-ya nile nēguzo n’akuku ya.

7 Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n’akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise?

8 na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m’nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n’obi n’ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m’nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta.

9 Doeg onye Edom we za, (n’ihi na ya onwe-ya nēguzo n’akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub.

10 O we juara ya ase n’aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n’uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia.

11 Eze we ziga ikpọ Ahimelek nwa Ahaitub, bú onye-nchu-aja, na ulo nna-ya nile, bú ndi-nchu-àjà ndi nọ na Nob: ha we biakute eze, ha nile.

12 Sọl we si, Biko, nuru, gi nwa Ahaitub. O we si, Lem, onye-nwem.

13 Sọl we si ya, N’ìhi gini ka unu kekọtaworo onwe-unu imegidem, gi onwe-gi na nwa Jesi, n’inye ya achicha na mma-agha, na n’ijuru ya ase n’aka Chineke, ka o we bilie imegidem, iche anwu, dika ta?

14 Ahimelek we za eze, si, Ònye kwa n’etiti orù-gi nile di ka Devid? ọ bu onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa di nwa eze, o wezugawo kwa onwe-ya ibà n’etiti ndi nānu okwu-gi, ọ di kwa nsọpuru n’ulo-gi.

15 Ọ̀ bu ta ka m’malitere ijuru ya ase n’aka Chineke? ya burum ihe-árú: ka eze ghara ibo orù-ya ebubo ọ bula, ghara kwa ibo ulo nnam nile: n’ihi na orù-gi amaghi ihe ọ bula n’ihe a nile, nke di ntà ma-ọbu nke di uku.

16 Eze we si, I ghaghi inwu, Ahimelek, gi onwe-gi na ulo nna-gi nile.

17 Eze we si ndi-ọb͕a-ọsọ ndi nēguzo n’akuku ya, Chigharianu, me ka ndi-nchu-àjà Jehova nwua; n’ihi na aka-ha di kwa n’akuku Devid, na n’ihi na ha mara na onye nāb͕apu ka ọ bu, ma ha ekpughepughi ntim ka m’nu ya. Ma ndi-orù eze ekweghi isetipu aka-ha idakwasi ndi-nchu-àjà Jehova.

18 Eze we si Doeg, Gi onwe-gi chigharia, dakwasi ndi-nchu-àjà. Doeg onye Edom we chigharia, ya onwe-ya we dakwasi ndi-nchu-àjà, me ka ọgu ndikom anọ na ise nwua n’ubọchi ahu, bú ndi nēyi ephod nke ákwà ọcha.

19 O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu.

20 Ma otù nwa-nwoke nke Ahimelek nwa Ahaitub nwere, aha-ya bu Abaiata, wepugara onwe-ya, b͕apu soro Devid.

21 Abaiata we gosi Devid na Sọl eb͕uwo ndi-nchu-àjà Jehova.

22 Devid we si Abaiata, Amaram n’ubọchi ahu, mb͕e Doeg, bú onye Edom, nọ n’ebe ahu, na ọ ghaghi igosi Sọl: mu onwem akpatawo ọnwu nke madu nile nke ulo nna-gi.

23 Ka mu na gi nọdu, atula egwu; n’ihi na onye ahu nke nāchọ ndum nāchọ ndu-gi: n’ihi na ihe-ndebe ka i bu n’akam.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 23

1 Ha we gosi Devid, si, Le, ndi Filistia nēbuso Keila agha, ndi ahu nāpunara ha ebe-nzọcha-ọka nile ha.

2 Devid we jua Jehova ase, si, M’gēje tib͕ue ndi Filistia ndia? Jehova we si Devid, Je, tib͕ue ndi Filistia, zọputa Keila.

3 Ndikom Devid we si ya, Le, ayi onwe-ayi nātu egwu n’ebe a nime Juda: àyi gēsi kwa aṅa ghara itu egwu kari mb͕e ayi gēje Keila, rue usoro-agha nile nke ndi Filistia?

4 Devid we ju kwa Jehova ase ọzọ. Jehova we za ya, si, Bilie, rida rue Keila; n’ihi na Mu onwem nēnye ndi Filistia n’aka-gi,

5 Devid na ndikom-ya we jerue Keila, buso ndi Filistia agha, kpuru anu-ulo-ha, tib͕ue ha ntib͕u uku. Devid we zọputa ndi bi na Keila.

6 O rue, mb͕e Abaiata nwa Ahimelek b͕akuru Devid rue Keila, na ọ chiri ephod n’aka-ya rida.

7 Ewe gosi Sọl na Devid abàwo na Keila. Sọl we si, Chineke ajuwo ya, rapu ya n’akam; n’ihi na emechibidowo ya nime, n’ibà n’obodo nwere ibo ọnu-uzọ-ama na nkpọrọ.

8 Sọl we me ka ndi Israel nile nuru na ha gēje agha, iridaru Keila, inọchigide Devid na ndikom-ya n’agha.

9 Devid we mara na ọ bu ya ka Sọl nēcheputa ihe ọjọ megide; o we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, Chita ephod nso.

10 Devid we si, Jehova, bú Chineke Israel, orù-Gi anuwo n’ezie na Sọl nāchọ ibiaru Keila, ibibi obodo a n’ihim.

11 Ndi-nwe Keila, ha gēmechibidom nye n’aka-ya? Sọl, ọ̀ gāridata, dika orù-Gi nuworo? Jehova, bú Chineke Israel, biko, gosi orù-Gi. Jehova we si, Ọ gāridata.

12 Devid we si, Ndi-nwe Keila, hà gēmechibidom na ndikom nkem nye n’aka Sọl? Jehova we si, Ha gēmechibido gi nye.

13 Devid na ndikom-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri, we bilie, si na Keila pua, ha we nējeghari ebe ha huru uzọ ijeghari. Ewe gosi Sọl na Devid esiwo na Keila wepuga onwe-ya; o we ghara iputa.

14 Devid we nọdu n’ọzara n’ebe ewusiri ike, o we nọdu n’ugwu n’ọzara Zif. Sọl we nāchọ ya ubọchi nile, ma Chineke enyeghi ya n’aka-ya.

15 Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n’ọzara Zif n’oké ọhia.

16 Jonatan nwa Sọl we bilie, jekuru Devid n’oké ọhia ahu, me ka aka-ya di ike nime Chineke.

17 Ọ si ya, Atula egwu: n’ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka.

18 Ha abua we b͕a ndu n’iru Jehova: Devid we nọdu n’oké ọhia, ma Jonatan lara n’ulo-ya.

19 Ndi Zif we rigokuru Sọl rue Gibea, si, Devid, ò zoghi onwe-ya n’etiti ayi n’ebe ewusiri ike n’oké ọhia, n’ugwu ntà Hakila, nke di na Ndida nke ala ahu nke tọb͕ọrọ n’efu?

20 Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n’aka eze.

21 Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n’ihi na unu enwewo ọmiko n’arum.

22 Biko, lanu, dozi-kwa-nu ọzọ, mára hu kwa ọnọdu-ya ebe ukwu-ya di, na onye huworo ya n’ebe ahu: n’ihi na agwawom na ya onwe-ya nāghọ aghughọ nke-uku.

23 Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m’gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n’ala nka, na m’gāchọputa ya n’usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile.

24 Ha we bilie, jerue Zif n’iru Sọl: ma Devid na ndikom-ya di n’ọzara Maon, n’Araba, na Ndida nke ala ahu tọb͕ọrọ n’efu.

25 Sọl na ndikom-ya we je ichọ ya. Ha we gosi Devid: o we rida rue nkume ahu di elu, nọdu n’ọzara Maon. Sọl we nu ya, chua Devid n’azu n’ọzara Maon.

26 Sọl we je n’otù akuku ugwu, Devid na ndikom-ya n’akuku nke-ọzọ nke ugwu ahu: Devid we zọlie ọsọsọ ib͕apu n’iru Sọl; ma Sọl na ndikom-ya nāb͕a Devid na ndikom-ya buruburu inwude ha.

27 Ma onye-ozi biakutere Sọl, si, Me ngwa, lata; n’ihi na ndi Filistia amadewo imegide ala-ayi.

28 Sọl we si n’ichu Devid n’azu laghachi, je izute ndi Filistia: n’ihi ya ka ha kpọrọ ebe ahu Sela-hamahlekot.

29 Devid we si n’ebe ahu rigo, nọdu n’ebe ewusiri ike nke En-gedi.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 24

1 O rue, mb͕e Sọl siri n’iso ndi Filistia lata, na egosiri ya, si, Le, Devid nọ n’ọzara En-gedi.

2 Sọl we chiri nnù ndikom asa na ọgu iri arọputara n’Israel nile, ọ je ichọ Devid na ndikom-ya n’elu oké nkume nke ewu-ọhia.

3 Ọ biarue ogige ìgwè ewu na aturu n’uzọ, ọb͕à di kwa n’ebe ahu; Sọl we ba ikpuchi ukwu-ya. Ma Devid na ndikom-ya nānọdu n’akuku ime ọb͕à ahu.

4 Ndikom Devid we si ya, Le, ubọchi nke Jehova siri gi, Le, Mu onwem nēnye onye-iro-gi n’aka-gi, i gēme kwa ya dika o si di nma n’anya-gi. Devid we bilie, were nzuzo bipu ọnu-ọnu uwe-nwuda nke Sọl nwere.

5 O rue, ka emesiri, na obi Devid tara ya uta, n’ihi na o bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda Sọl nwere.

6 Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m’gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n’ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.

7 Devid we were okwu ndia b͕ochie ndikom-ya, o kweghi kwa ka ha bilie imegide Sọl. Sọl we si n’ọb͕à ahu bilie, je ije-ya.

8 Devid we bilie ka emesiri, si n’ọb͕à ahu pua, kpọ òkù n’azu Sọl, si, Onye-nwem eze. Sọl we legide anya n’azu-ya, Devid we rube iru-ya n’ala, kpọ isi ala.

9 Devid we si Sọl, N’ìhi gini ka i nēge nti okwu madu, si, Le, Devid nāchọ imejọ gi?

10 Le, ubọchi ta ka anya-gi abua huworo otú Jehova nyere gi n’akam ta n’ọb͕à: ewe si ka m’b͕ue gi: ma anyam mere gi ebere; m’we si, M’gaghi-eseti akam megide onye-nwem, n’ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.

11 Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n’akam: n’ihi na nime nbipu m’bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n’akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya.

12 Jehova kpe ikpe n’etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n’aru gi: ma akam agaghi-adi n’aru gi.

13 Dika ilu ndi mb͕e mbu nāsi, Na ndi nēmebi iwu ka nmebi-iwu si aputa: ma akam agaghi-adi n’aru gi.

14 Ònye ka eze Israel putaworo iso n’azu? ònye ka i nāchu n’azu? ọ bu n’azu nkita nwuru anwu, n’azu otù igwu.

15 Ma Jehova buru onye-ikpe, kpe ikpe n’etiti mu na gi, Ya hu kwa, kpe ọnum n’ikpe, kpeputam n’aka-gi.

16 O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá.

17 Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n’ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.

18 Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n’ebe m’nọ: n’ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n’aka-gi, i b͕ughm.

19 Ma mb͕e madu gāchọta onye-iro-ya, ò gēzilaga kwa ya n’ezi uzọ? Jehova kwughachi kwa gi ezi ihe n’ọnọdu ihe a i meworom ta.

20 Ma ub͕u a, le, amawom na i ghaghi ibu eze, na agēme kwa ka ala-eze Israel guzosie ike n’aka-gi.

21 Ma ub͕u a were Jehova ṅuaram iyi, na i gaghi-ebipu nkpurum gānọchim n’azu, na i gaghi-ekpochapu aham n’ulo nnam.

22 Devid we ṅuara Sọl iyi. Sọl we laghachi; ma Devid na ndikom-ya rigoro n’ebe ahu ewusiri ike.