Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 5

1 Ma ndi Filistia were ib͕e Chineke, ha we si n’Eben-eza bubata ya n’Ashdod.

2 Ndi Filistia we were ib͕e Chineke, bubata ya n’ulo Degon, dọba ya n’akuku Degon.

3 Ndi Ashdod we bilie n’isi-ututu n’echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n’ala n’iru ib͕e Jehova. Ha we were Degon, tiyeghachi ya n’ọnọdu-ya.

4 Ha we bilie n’isi-ututu n’echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n’ala n’iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya.

5 N’ihi ya ndi-nchu-aja Degon na ndi nile nke nābà n’ulo Degon adighi-azọkwasi ukwu na nbata-uzọ Degon n’Ashdod, rue ta.

6 Aka Jehova we di arọ́ n’aru ndi Ashdod, Ọ we kpochapu ha, were kwa emerod tib͕ue ha, bú Ashdod na ókè-ala-ya nile.

7 Ndikom Ashdod we hu na ọ di otú a, ha we si, Ib͕e Chineke Israel agaghi-anọgide n’etiti ayi: n’ihi na aka-Ya esikawo ike n’aru ayi na n’aru Degon, bú chi-ayi.

8 Ha we ziga, chikọtara onwe-ha ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Chineke Israel? Ha we si, Ka eburu ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue Gat. Ha we būru ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue ebe ahu.

9 O rue, mb͕e ha būsiri ya buruburu, na aka Jehova digidere obodo ahu n’ọb͕ub͕a-aghara di uku ri nne: Ọ we tib͕ue ndikom obodo ahu, site n’onye ntà we rue onye uku, emerod we b͕apue n’aru ha.

10 Ha we ziga ib͕e Chineke rue Ekron. O rue, mb͕e ib͕e Chineke biaruru Ekron, na ndi Ekron tiri nkpu, si, Ha eburuwo ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu biakute ayi, ime ka ayi na ndi-ayi nwua.

11 Ha we ziga, chikọta ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Zilaga ib͕e Chineke Israel, ka ọ laghachi kwa n’ebe-ya, ka o we ghara ime ka ayi na ndi-ayi nwua: n’ihi na ọb͕ub͕a-aghara nke ọnwu di n’obodo ahu nile; ọ di arọ́ nke-uku, bú aka Chineke, n’ebe ahu.

12 Ndikom kwa ndi nānwughi, ewere emerod tib͕ue ha: ntiku obodo ahu we rigorue elu-igwe.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 6

1 Ib͕e Jehova we di n’ọhia ndi Filistia ọnwa asa.

2 Ndi Filistia we kpọ ndi-nchu-aja na ndi nāju ase, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Jehova? me ka ayi mara ihe ayi gēji zilaga ya n’ebe-ya.

3 Ha we si, Ọ buru na unu ezilaga ib͕e Chineke Israel, ezilagala ya n’aka efu; kama unu aghaghi inyeghachi Ya àjà-ikpe-ọmuma: mb͕e ahu agēme ka aru-unu di ike, agēme kwa ka unu mara ihe mere anēwezugaghi aka-Ya n’aru unu.

4 Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n’ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu.

5 Unu gēme kwa onyinyo emerod-unu, na onyinyo òké-unu nke nēbibi ala-unu; unu gēnye kwa Chineke Israel nsọpuru: eleghi anya Ọ gēme ka aka-Ya di nfé pua n’aru unu, na n’aru chi nile unu, na n’ala-unu.

6 N’ìhi gini kwa ka unu nēme ka obi-unu di arọ́, dika ndi Ijipt na Fero mere ka obi-ha di arọ́? mb͕e Ọ kwara ha emò, hà ezilagaghi ha, ha we la?

7 Ma ub͕u a, werenu ihe me otù ub͕ọ-ala ọhu, chiri kwa nne-ehi abua nke nēnye umu ara, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ha, kegide-kwa-nu ehi ahu n’ub͕ọ-ala, me ka umu-ha si n’iso ha n’azu lata n’ulo:

8 were-kwa-nu ib͕e Jehova tiyekwasi ya n’ub͕ọ-ala ahu; tiye ihe ọla-edo ahu, nke unu nēnyeghachi Ya ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, n’ib͕e ntà n’akuku-ya; zilaga-kwa-nu ya, ka ọ we la.

9 Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n’uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi oké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigoghi otú a, ayi gāma kwa na ọ bughi aka-Ya tib͕uru ayi; ihe-ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi.

10 Ndikom ahu we me otú a; ha chiri nne-ehi abua nke nēnye umu ara, kegide ha n’ub͕ọ-ala ahu, mechibido umu-ha uzọ n’ulo:

11 ha we tukwasi ib͕e Jehova n’ub͕ọ-ala ahu, na ib͕e ntà ahu, na òké ọla-edo, na onyinyo emerod-ha.

12 Ehi ahu we jezie ejezi n’uzọ rue uzọ Bet-shemesh: ọ bu n’otù uzọ atuliri atuli ka ha jere, nēje nēti nkpu, ha ewezugaghi kwa onwe-ha n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe; ndi-isi ndi Filistia we nējeso ha n’uzọ rue ókè-ala Bet-shemesh.

13 Ma ndi Bet-shemesh nēbì ọka wheat-ha na ndagwurugwu: ha we welie anya-ha, hu ib͕e ahu, ṅuria ọṅu ihu ya.

14 Ub͕ọ-ala ahu we ba n’ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, guzo n’ebe ahu, nkume uku di kwa n’ebe ahu: ha we kpọwa osisi ub͕ọ-ala ahu, sure ehi abua ahu ọku ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

15 Ndi Livai we buda ib͕e Jehova na ib͕e ntà nke di n’akuku ya, nke ihe ọla-edo ahu nile di nime ya, ha we tukwasi ha na nkume uku ahu: ndikom Bet-shemesh we sure àjà-nsure-ọku, chu-kwa-ra Jehova aja ọzọ, n’ubọchi ahu.

16 Ndi-isi ise nke ndi Filistia we hu ya, laghachi rue Ekron n’ubọchi ahu.

17 Ndia bu emerod ọla-edo nke ndi Filistia nyeghachiri, ibu àjà-ikpe-ọmuma ichuru Jehova; Ashdod nwere otù, Geza nwere otù, Ashkelon nwere otù, Gat nwere otù, Ekron nwere otù;

18 òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n’obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n’elu ya: ọ di n’ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta.

19 O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n’ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n’etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n’ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n’etiti ndi Israel.

20 Ndikom Bet-shemesh we si, Ònye puru iguzo n’iru Jehova, bú Chineke nsọ a? Ọ̀ bu kwa onye ka O gēsi n’ebe ayi nọ rigokuru?

21 Ha we zigara ndi bi na Kiriat-jearim ndi-ozi, si, Ndi Filistia ebughachiwo ib͕e Jehova; ridatanu, bugo ya n’ebe unu nọ.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 7

1 Ndikom Kiriat-jearim we bia, bugo ib͕e Jehova, bubata ya n’ulo Abinadab n’ugwu ntà ya, do Eleeza nwa-ya nwoke nsọ idebe ib͕e Jehova.

2 O rue, site n’ubọchi ib͕e ahu nọduru na Kiriat-jearim, na ubọchi bara uba; o we di orú arọ: ulo Israel nile we kwaso Jehova.

3 Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n’etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n’aka ndi Filistia.

4 Umu Israel we wezuga Bealim na Ashtarot, fè nání Jehova òfùfè.

5 Samuel we si, Chikọtanu Israel nile rue Mizpa, m’gēkpe-kwa-ra Jehova ekpere bayere unu.

6 Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n’iru Jehova, bue ọnu n’ubọchi ahu, kwue n’ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa.

7 Ndi Filistia we nu na umu Israel chikọtara onwe-ha na Mizpa, ndi-isi ndi Filistia we rigo imegide Israel. Umu Israel we nu ya, tua egwu ndi Filistia.

8 Umu Israel we si Samuel, Ab͕ala nkiti bayere ayi n’itiku Jehova, bú Chineke-ayi, nkpu, ka O we zọputa ayi n’aka ndi Filistia.

9 Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya.

10 O rue, mb͕e Samuel nēsure àjà-nsure-ọku ahu, na ndi Filistia biaruru nso ibuso Israel agha: Jehova we were oké olu makwasi ndi Filistia éb͕è-elu-igwe n’ubọchi ahu, we me ka ha b͕a aghara; ewe tib͕ue ha n’iru Israel.

11 Ndikom Israel we si na Mizpa puta, chua ndi Filistia, tib͕ue ha rue okpuru Bet-ka.

12 Samuel we were otù nkume do ya n’etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a.

13 Ewe me ka ndi Filistia ruru ala, ha abàghi ọzọ n’ókè-ala Israel: aka Jehova we digide ndi Filistia ubọchi nile nke Samuel.

14 Ewe nyeghachi Israel obodo nile nke ndi Filistia nara Israel, site n’Ekron we rue Gat; ókè-ala-ha ka Israel naputara n’aka ndi Filistia. Ma udo di n’etiti Israel na ndi-Amorait.

15 Samuel we kpe Israel ikpe ubọchi nile nke ndu-ya.

16 O we nēje buruburu kwa-arọ rue Bet-el, na Gilgal, na Mizpa; o we kpe Israel ikpe n’ebe ahu nile.

17 Nlata-ya bu na Rema, n’ihi na n’ebe ahu ka ulo-ya di; ọ bu kwa n’ebe ahu ka ọ kpere Israel ikpe: o we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n’ebe ahu.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 8

1 O rue, mb͕e Samuel ghọrọ agadi, na o doro umu-ya ndikom ndi-ikpe ikpe Israel.

2 Ma aha ọkpara-ya bu Joel; aha nwa-ya nwoke nke-abua bu Abaija: ha bu ndi-ikpe nime Bia-sheba.

3 Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n’uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.

4 Ndi-okenye nile nke Israel we chikọta onwe-ha, biakute Samuel rue Rema:

5 ha we si ya, Le, gi onwe-gi aghọwo agadi, ma umu-gi ndikom adighi-eje ije n’uzọ-gi nile: ub͕u a mere ayi eze ikpe ayi ikpe dika mba nile.

6 Ma okwu ahu jọrọ njọ n’anya Samuel, mb͕e ha siri, Nye ayi eze ikpe ayi ikpe. Samuel we kpere Jehova.

7 Jehova we si Samuel, Ge nti olu ndim n’ihe nile ha nāsi gi: n’ihi na ọ bughi gi ka ha juworo, kama ọ bu Mu ka ha juworo, ka M’ghara iburu ha eze.

8 Dika omume nile si di nke ha meworo site n’ubọchi M’mere ka ha si n’Ijipt rigota we rue ta, ha we rapum, fè chi ọzọ òfùfè, otú a ka ha onwe-ha nēme kwa gi.

9 Ma ub͕u a ge nti olu-ha: nání na i gāb͕asiri ha àmà ike, gosi kwa ha ikpé eze ahu nke gābu eze-ha.

10 Samuel we gwa ndi Israel, ndi nāriọ eze n’aka-ya, okwu nile nke Jehova.

11 O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n’ub͕ọ-ala-ya na n’elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n’iru ub͕ọ-ala-ya:

12 o gēdo-kwa-ra ha onwe-ya ibu ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom abua na iri; na ilu ọlu-ubi-ya, na iwe ihe-ubi-ya, na ikpu ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke ub͕ọ-ala-ya.

13 Ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ọ gāchiri ibu ndi nāsugwa ude nēsì ísì utọ, na ibu ndi-odozi-anu, na ibu ndi-osi-ite.

14 Ubi-unu, na ubi-vine-unu, na ubi-olive-unu, bú nke kachasi nma, ka ọ gēwere kwa, nye ndi-orù-ya.

15 Nkpuru-ọghigha-unu na ubi-vine-unu ka ọ gēwere otù uzọ n’uzọ iri, nye ndi nējere ya ozi, nye kwa ndi-orù-ya.

16 Ọ bu kwa ndi-orù-unu ndikom, na ndinyom nējere unu ozi, na umu-okorọbia-unu, bú ndi kachasi nma, na inyinya-ibu-unu, ka ọ gēwere, me ka ha je ozi-ya.

17 Ìgwè ewu na aturu-unu ka ọ gēwere kwa otù uzọ n’uzọ iri: unu onwe-unu gābu-kwa-ra ya orù.

18 Unu gēti kwa nkpu n’ubọchi ahu n’ihi eze-unu nke unu rọputara onwe-unu; ma Jehova agaghi-aza unu n’ubọchi ahu.

19 Ma ndi Israel juru ige nti olu Samuel; ha si, É-è; kama, eze gāchiri ayi;

20 ka ayi we di, ọbuná ayi onwe-ayi, ka mba nile; ka eze-ayi we nēkpe kwa ayi ikpe, nāpu kwa je n’iru ayi, nēbu kwa agha-ayi.

21 Samuel we nu okwu nile nke ndi Israel, o we kwue ha na nti Jehova.

22 Jehova we si Samuel, Ge nti olu-ha, mere ha eze. Samuel we si ndikom Israel, Lanu, nwoke ọ bula n’obodo-ya.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 9

1 Ma otù nwoke Benjamin di, aha-ya bu Kish, nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, nwa onye Benjamin, bú dike nke bu dìnkpà.

2 Ọ nwe-kwa-ra nwa-nwoke, aha-ya bu Sọl, ọ bu nwa-okorọbia, ọ ma-kwa-ra nma: ọ dighi kwa nwoke n’etiti umu Israel mara nma kari ya: site n’ubu-ya we rue elu isi-ya ka ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel.

3 Ma nne-inyinya-ibu nile nke Kish, bú nna Sọl, nwere furu efu. Kish we si Sọl nwa-ya, Biko, kuru otù nime ndi-orù tiyere onwe-gi, bilie, je, chọ nne-inyinya-ibum.

4 O we gabiga n’ugwu Efraim, gabiga kwa n’ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n’ala Shaalim, ma ha adighi n’ebe ahu: o we gabiga n’ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha.

5 Mb͕e ndi ahu batara n’ala Zuf, Sọl siri nwa-okorọbia-ya nke soro ya je, Bia, ka ayi laghachi; ka nnam we ghara igha iche uche bayere nne-inyinya-ibu-ya, we cheb͕u onwe-ya bayere ayi.

6 O we si ya, Biko, le, onye nke Chineke nọ n’obodo a, anāsọpuru kwa nwoke ahu; ihe nile ọ nēkwu aghaghi irè erè: ub͕u a ka ayi je n’ebe ahu; eleghi anya ọ gēgosi ayi uzọ-ayi nke ayi jeworo na ya.

7 Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Ma, le, ọ buru na ayi eje, gini ka ayi gēji bakuru nwoke ahu? n’ihi na achicha alapuwo n’ihe-ayi, ọ dighi kwa onyinye iji bakuru onye nke Chineke: gini di n’aka-ayi?

8 Nwa-okorọbia ahu we za Sọl ọzọ, si, Le, achọtawo n’akam otù uzọ n’uzọ anọ nke shekel ọla-ọcha: m’gēnye kwa ya onye nke Chineke, ka o we gosi ayi uzọ-ayi.

9 (Na mb͕e gara aga n’Israel, otú a ka otu nwoke siri mb͕e o jere iju Chineke ase, Bianu, ka ayi jekuru onye-ọhu-uzọ: n’ihi na onye anākpọ Onye-amuma ta, anākpọ ya Onye-ọhu-uzọ na mb͕e gara aga).

10 Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Okwu-gi di nma; bia, ka ayi je. Ha we je n’obodo ebe onye nke Chineke nọ.

11 Ka ndi ahu nārigo na nrigo obodo ahu, ha onwe-ha hutara umu-ab͕ọghọ ka ha nāputa isere miri, ha we si ha, Onye-ọhu-uzọ, ọ̀ nọ n’ebe a?

12 Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n’iru gi: me ngwa ub͕u a, n’ihi na ta ka ọ batara n’obodo; n’ihi na ndi Israel nwere àjà ta n’ebe di elu a:

13 mb͕e unu bara n’obodo, otú a ka unu gāchọta ya, tutu ọ rigorue ebe di elu iri ihe: n’ihi na ndi Israel agaghi-eri ihe rue mb͕e ọ biara, n’ihi na ya onwe-ya nāgọzi àjà-ha; emesia ndi akpọworo gēri ihe. Ma ub͕u a rigonu; n’ihi na ya onwe-ya, ub͕u a ka unu gāchọta ya.

14 Ha we rigorue obodo; ka ndi ahu nābà n’etiti obodo, le, Samuel nāputa izute ha, irigoru ebe di elu ahu.

15 Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si,

16 Dika mb͕e a echi M’gēzitere gi otù nwoke sitere n’ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n’aka ndi Filistia: n’ihi na ahuwom ndim, n’ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.

17 Mb͕e Samuel huru Sọl, Jehova we za ya, si, Le nwoke ahu onye M’siri gi te manu! onye a gēb͕ochi ndim n’ime ihe ọjọ.

18 Sọl we biarue Samuel nso n’etiti ọnu-uzọ-ama, si, Biko, gosim ebe ọ di, bú ulo onye-ọhu-uzọ.

19 Samuel we za Sọl, si, Mu onwem bu onye-ọhu-uzọ ahu; rigorue ebe di elu n’irum, unu gēsokwam ri ihe ta: m’gēzilaga kwa gi n’ututu, ihe nile nke di n’obi-gi ka m’gēgosi kwa gi.

20 Ma nne-inyinya-ibu-gi nke funariri gi, ta bu ubọchi atọ, atukwasila obi-gi na ha; n’ihi na achọtawo ha. Ma ònye nwere ihe nile anāchọsi ike nke Israel? ọ bughi gi na ulo nile nke nna-gi?

21 Sọl we za, si, Ọ̀ bughi onye Benjamin ka m’bu, sitere n’ebo Israel nke dikarisiri ntà? ab͕urum, ọ̀ pekarisighi npe n’etiti ab͕uru nile nke ebo Benjamin? n’ìhi gini kwa ka i gwaworom okwu dika okwu a si di?

22 Samuel we kuru Sọl na nwa-okorọbia-ya, me ka ha ba n’ime-ulo, o we nye ha isi ọnọdu n’etití ndi akpọrọ n’oriri ahu, ndi ahu ra ka orú madu na iri.

23 Samuel we si odozi-anu, Weta òkè nke m’nyere gi, nke m’siri gi, Dọba ya n’ebe i nọ.

24 Odozi-anu ahu we bulie utaku-ukwu ahu na ihe di n’elu ya, dọba ya n’iru Sọl. Samuel we si, Le ihe fọduru! dọba ya n’iru gi, rie; n’ihi na rue mb͕e akara àkà ka edebeworo gi nka, si, Akpọwom ndi Israel. Sọl we soro Samuel rie ihe ubọchi ahu.

25 Ha we si n’ebe di elu ahu rida n’obodo, o we kpayere Sọl uka n’elu-ulo.

26 Ha we bilie n’isi-ututu: o we rue, mb͕e chi bọrọ, na Samuel kpọrọ Sọl n’elu-ulo, si, Bilie, ka m’we zilaga gi. Sọl we bilie, ha abua we pua, ya onwe-ya na Samuel, rue èzí.

27 Ka ha onwe-ha nārida na nsọtu obodo, Samuel we si Sọl, Si nwa-okorọbia-gi gabiga n’iru ayi, (ọ we gabiga,) ma gi onwe-gi guzogide ub͕u a, ka m’we me ka i nu okwu Chineke.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 10

1 Samuel we were karama manu, wukwasi ya n’isi-ya, sutu ya ọnu, si, Ọ̀ bughi na Jehova etewo gi manu ibu onye-ndú ihe-nketa-Ya?

2 Mb͕e i siri n’ebe m’nọ la ta, i gāhuta kwa ndikom abua n’akuku ílì Rechel n’ókè-ala Benjamin na Zelza; ha gāsi kwa gi, Achọtawo nne-inyinya-ibu nke i jere ichọ: ma, le, nna-gi arapuwo okwu nne-inyinya-ibu-ya, ọ nēcheb͕u kwa onwe-ya bayere unu, si, Gini ka m’gēme ichọta nwam?

3 I gēsi kwa n’ebe ahu gabiga n’iru, bia rue osisi terebinth nke Teboa, ma ndikom atọ ndi nārigokuru Chineke rue Bet-el gāhuta gi n’ebe ahu, otù onye nēbu umu-ewu atọ, otù onye nēbu ob͕e achicha atọ, otù onye nēbu kwa karama-akpukpọ manya-vine:

4 ha gāju kwa gi ajuju bayere udo-gi, we nye gi ob͕e achicha abua; i gānara kwa ha n’aka-ha.

5 Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n’ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n’ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n’iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:

6 Mọ nke Jehova gādakwasi gi n’ike, i gēsoro kwa ha bū amuma, i gāb͕anwe kwa ghọ nwoke ọzọ.

7 O gēru kwa, mb͕e ihe-iriba-ama ndia biaruru gi aru, gi mere onwe-gi dika aka-gi si chọta; n’ihi na Chineke nọyere gi.

8 I gēbukwam uzọ rida rue Gilgal; ma, le, mu onwem nāridakute gi, isure àjà-nsure-ọku, na ichu ihe àjà nke àjà-udo: ubọchi asa ka i ganēche, rue mb͕e m’gābiakute gi, me ka i mara ihe i gēme.

9 O rue, mb͕e o chighariri azu-ya isi n’ebe Samuel nọ la, na Chineke b͕anwere ya obi ọzọ: ihe-iriba-ama ndia nile we rè n’ubọchi ahu.

10 Ha we biarue ebe ahu, rue ugwu ntà ahu, ma, le, usu ndi-amuma zutere ya; Mọ nke Chineke we dakwasi ya n’ike, o we bū amuma n’etiti ha.

11 O rue, mb͕e ndi nile ndi mara ya na mb͕e gara aga huru, ma, le, ọ nēso ndi-amuma bū amuma, ndi ahu we sirita onwe-ha, Gini bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ̀ di kwa n’etiti ndi-amuma?

12 Otù nwoke nke sitere n’ebe ahu we za, si, Ònye bu kwa nna-ha? N’ihi ya ọ ghọrọ ilu, bú okwu a, Sọl, ọ̀ di kwa n’etiti ndi-amuma?

13 O we bubìe amuma, bia rue ebe di elu ahu.

14 Nwa-nne nna Sọl we si ya na nwa-okorọbia-ya, Òle ebe unu jere? Ọ si, Ichọ nne-inyinya-ibu-ayi: ayi we hu na ọ dighi ebe ọ bula ha di, ayi we biakute Samuel.

15 Nwa-nne nna Sọl we si, Biko, gosim ihe Samuel siri unu.

16 Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru.

17 Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;

18 o we si umu Israel, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka Israel si n’Ijipt rigota, M’we naputa unu n’aka ndi Ijipt na n’aka ala-eze nile nke nēmeb͕u unu:

19 ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n’aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n’iru Jehova n’ebo nile unu, na n’usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu.

20 Samuel we me ka ebo Israel nile biarue nso, nzà we ma ebo Benjamin.

21 O we me ka ebo Benjamin biarue nso n’ab͕uru nile ha, nzà we ma ab͕uru Matri: nzà we ma Sọl nwa Kish: ha we chọ ya, ma achọtaghi ya.

22 Ha we ju kwa Jehova ase ọzọ, si, Ọ̀ kābiaghi ebe a, bú nwoke ahu? Jehova we si, Le, onye ahu ezowo onwe-ya n’etiti ihe.

23 Ha we b͕a ọsọ, si n’ebe ahu kuru ya; o we guzo onwe-ya n’etiti ndi Israel, ma ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel site n’ubu-ya we rue elu isi-ya.

24 Samuel we si ndi Israel nile, Ùnu ahuwo onye ahu nke Jehova rọputaworo, na ọ dighi onye di ka ya n’etiti ndi Israel nile? Ndi Israel nile we tie nkpu, si, Ka eze-ayi di ndu.

25 Samuel we gwa ndi Israel ikpe ala-eze ahu, de kwa ya n’akwukwọ, dọba ya n’iru Jehova. Samuel we zilaga ndi Israel nile, nwoke ọ bula n’ulo-ya.

26 Sọl we la kwa n’ulo-ya rue Gibea; ndi bu dìnkpà, ndi Chineke meturu obi-ha aka, we jeso ya.

27 Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 11

1 Nehash, bú onye Amon, we rigota, ma ulo-ikwū-ya imegide Jebesh-gilead: ndikom nile nke Jebesh we si Nehash, Ka ayi na gi b͕a ndu, ayi gēfè kwa gi òfùfè.

2 Nehash, bú onye Amon, we si ha, Na nka ka mu na unu gāb͕a ndu, n’irukpọ unu anya aka-nri nile; m’gātukwasi kwa ya n’aru Israel nile ka ọ buru ihe-ita-uta.

3 Ndi-okenye Jebesh we si ya, Ra ayi aka ubọchi asa, ka ayi we zisa ndi-ozi n’ókè-ala nile nke Israel: ọ buru kwa na ọ dighi onye nāzọputa ayi, ayi gāpukuru kwa gi.

4 Ndi-ozi ahu we biarue Gibea nke Sọl, kwue okwu ndia na nti ndi Israel: ndi Israel nile we welie olu-ha kwa ákwá.

5 Ma, le, Sọl biara, nēso ìgwè ehi si n’ubi; Sọl we si, Gini nēme ndi Israel na ha nākwa ákwá? Ha we kọrọ ya okwu nile nke ndikom Jebesh.

6 Mọ nke Chineke we dakwasi Sọl n’ike mb͕e ọ nuru okwu ndia, iwe-ya we di ọku nke-uku.

7 O we chiri ehi abua, bọkasia ha, zisa ha n’ókè-ala nile nke Israel n’aka ndi-ozi, si, Onye ọ bula nke nāputaghi iso Sọl na iso Samuel n’azu, otú a ka agēme ehi-ya. Oké egwu nke Jehova we dakwasi ndi Israel, ha we puta dika otù nwoke.

8 O we gukọta ha na Bezek; umu Israel we di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa, na nnù iri, ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom uzọ atọ, na nnù iri-na-ise.

9 Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu.

10 Ndikom Jebesh we si, Echi ka ayi gāpukuru unu, unu gēme kwa ayi dika ihe nile si di nke di nma n’anya-unu.

11 O rue, n’echi-ya, na Sọl doro ndi Israel n’usu atọ; ha we ba n’etiti ọmuma-ulo-ikwū n’iche-nche ututu, tib͕ue Amon rue ikpo-ọku nke ehihie: o rue, na ndi fọduru b͕asara, ọ fọdughi kwa ndikom abua n’otù ebe n’etiti ha.

12 Ndi Israel we si Samuel, Ònye ka ọ bu, bú onye nāsi, Sọl, ọ̀ gābu eze-ayi? nyenu ayi ndikom ahu, ka ayi we me ka ha nwua.

13 Sọl we si, Ọ dighi nwoke agēme ka ọ nwua ta: n’ihi na ta ka Jehova zọputara nzọputa n’Israel.

14 Samuel we si ndi Israel, Bianu, ka ayi jerue Gilgal, me ka ala-eze-unu di ọhu ọzọ n’ebe ahu.

15 Ndi Israel nile we jerue Gilgal; ha we me Sọl eze n’ebe ahu n’iru Jehova nime Gilgal; ha we chua ihe àjà nke àjà-udo n’iru Jehova n’ebe ahu. Sọl na ndikom nile nke Israel we ṅuria ọṅu nke-uku n’ebe ahu.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 12

1 Samuel we si Israel nile, Le, egewom nti olu-unu n’ihe nile nke unu sirim, m’we mere unu eze.

2 Ma ub͕u a, le, eze ahu nējeghari n’iru unu: ma mu onwem aghọwo agadi na onye-isi-awọ; ma umum ndikom, le, ha nọ n’etiti unu: ma mu onwem ejeghariwo n’iru unu site na mb͕e m’di na nwata rue ta.

3 Lem: b͕agidem àmà n’iru Jehova, na n’iru onye nke Ya etere manu: ọ̀ bu ehi onye ka m’naraworo? ma-ọbu ìnyinya-ibu onye ka m’naraworo? ma-ọbu ònye ka m’meb͕uworo? ònye ka m’zọpiaworo? ma-ọbu n’àka onye ka m’naraworo ihe-nb͕aputa iji zopu anyam n’aru ya? m’gēnyeghachi kwa unu ya.

4 Ha si, I meb͕ughi ayi, i zọpiaghi kwa ayi, i naraghi kwa ihe ọ bula n’aka nwoke ọ bula.

5 Ọ si ha, Onye-àmà ka Jehova bu imegide unu, onye-àmà ka onye nke Ya etere manu bu kwa ta, na unu achọtaghi ihe ọ bula n’akam. Ha we si, Onye-àmà ka Ọ bu.

6 Samuel we si ndi Israel, Ọ bu Jehova Nke mere Moses na Eron ndi-ndú, Nke me-kwa-ra nna-unu-hà ka ha si n’ala Ijipt rigota.

7 Ma ub͕u a, guzonu onwe-unu, ka mu na unu we kpe ikpe n’iru Jehova bayere ezi omume nile nke Jehova, nke O mere unu na nna-unu-hà.

8 Mb͕e Jekob batara n’Ijipt, mb͕e nna-unu-hà tikuru Jehova nkpu, Jehova we zite Moses na Eron, ndi mere ka nna-unu-hà si n’Ijipt puta, me kwa ka ha biri n’ebe a.

9 Ha we chezọ Jehova, bú Chineke-ha, O we renye ha n’aka Sisera, bú onye-isi usu-ndi-agha Hezoa, na n’aka ndi Filistia, na n’aka eze Moab, ha we buso ha agha.

10 Ha we tikue Jehova nkpu, si, Ayi emehiewo, n’ihi na ayi arapuwo Jehova, we fè Bealim na Ashtarot òfùfè: ma ub͕u a naputa ayi n’aka ndi-iro-ayi, ayi gēfè kwa Gi òfùfè.

11 Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n’aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi.

12 Unu we hu na Nehash, bú eze umu Amom, biara imegide unu, unu we sim, É-è, kama otù eze gāburu ayi eze: ma Jehova, bú Chineke-unu, bu eze-unu.

13 Ma ub͕u a le eze nke unu rọputaworo, onye unu riọrọm n’aka: ma, le, Jehova emewo ka eze nāchi unu.

14 Ọ buru na unu atua egwu Jehova, ọ buru kwa na unu efè Ya òfùfè, we ge nti olu-Ya, ọ buru kwa na unu anupughi isi n’okwu-ọnu Jehova, kama na unu nēsogide Jehova, bú Chineke-unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu kwa nke bu eze-unu, ọ di nma:

15 ma ọ buru na unu egeghi nti olu Jehova, kama unu nānupu isi n’okwu-ọnu Jehova, aka Jehova gādi kwa imegide unu, otú ọ di imegide nna-unu-hà.

16 Ub͕u a kwa guzonu onwe-unu, hu ihe uku a, nke Jehova nēme n’anya-unu.

17 Ọ̀ bughi obìbì ọka wheat ta? M’gākpọku Jehova, Ọ gēnye kwa éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo; mara-kwa-nu hu kwa na ihe ọjọ unu riri nne, nke unu meworo n’anya Jehova, n’iriọrọ onwe-unu eze.

18 Samuel we kpọkue Jehova; Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo ubọchi ahu: ndi Israel nile we tua egwu Jehova na Samuel nke-uku.

19 Ndi Israel nile we si Samuel, Kpere Jehova, bú Chineke-gi, ekpere bayere ndi-orù-gi, ka ayi ghara inwu: n’ihi na ayi atukwasiwo ihe ọjọ a na nmehie-ayi nile, n’iriọrọ onwe-ayi eze.

20 Samuel we si ndi Israel, Unu atula egwu: unu onwe-unu emewo ihe ọjọ a nile; nání unu ewezugala onwe-unu n’iso Jehova, kama werenu obi-unu nile fè Jehova òfùfè;

21 unu ewezuga-kwa-la onwe-unu: n’ihi na mb͕e ahu ka unu ganēso n’azu ihe tọb͕ọrọ n’efu, nke nādighi-abà urù, nke nādighi-anaputa kwa, n’ihi na ihe tọb͕ọrọ n’efu ka ha bu.

22 N’ihi na Jehova agaghi-arapu ndi-Ya n’ihi aha uku Ya: n’ihi na Jehova ekwewo ime unu ka unu buru Ya otù ndi.

23 Mu onwem kwa, ya burum ihe-árú, bú ka m’mehie megide Jehova n’igha ikpe ekpere bayere unu: ma m’gēzí unu ihe n’uzọ ahu di nma nke ziri ezi.

24 Nání tuanu egwu Jehova, were obi-unu nile fè Ya òfùfè n’ezi-okwu: n’ihi na, lenu ihe uku O meworo n’ebe unu nọ.

25 Ma ọ buru na unu eme ihe ọjọ nāga n’iru, agēkpochapu unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 13

1 Sọl b͕ara arọ mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ we buru eze Israel arọ abua.

2 Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n’Israel; nnù ndikom ise we di n’aka Sọl nime Mikmash na n’ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n’aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n’etiti ndi Israel, onye ọ bula n’ulo-ikwū-ya.

3 Jonatan we tib͕ue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia nke di na Geba, ndi Filistia we nu ya. Sọl we fùa opì-ike n’ala ahu nile, si, Ka ndi-Hibru nu.

4 Israel nile we nu, si, na Sọl tib͕uru ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, na Israel aghọwo-kwa-ra ndi Filistia ihe nēsì ísì ọjọ. Ewe kpọkọta ndi Israel iso Sọl rue Gilgal.

5 Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n’usọ oké osimiri n’uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n’akuku Iru-anyanwu Bet-even.

6 Ndikom Israel we hu na nkpà nākpà ha, (n’ihi na anāchi Israel n’ihe-ike), ndi Israel we zo onwe-ha n’ọb͕à, na n’ọhia-ogwu, na nime nkume di elu, na n’ulo-elu, na n’olùlù.

7 Ma ndi-Hibru ufọdu gabigara Jọdan rue ala Gad na Gilead; ma Sọl nọgidere na Gilgal, ndi Israel nile ma-kwa-ra jijiji nēso ya n’azu.

8 O we chere ubọchi asa, dika mb͕e akara àkà si di nke Samuel kara: ma Samuel abiarughi Gilgal; ndi Israel we si n’ebe ọ nọ b͕asa.

9 Sọl we si, Wetaram àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile nso. O we sure àjà-nsure-ọku ahu.

10 O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku ahu, le, Samuel biara; Sọl we pua izute ya, ka o we gọzie ya.

11 Samuel we si, Gini ka i meworo? Sọl we si, N’ihi na ahurum na ndi Israel esiwo n’ebe m’nọ b͕asa, ma gi onwe-gi abiaghi n’ubọchi akara àkà, ndi Filistia nāchikọta kwa onwe-ha na Mikmash;

12 m’we si, Ub͕u a ka ndi Filistia gāridakutem rue Gilgal, ma emeghm ka iru Jehova dajua; m’we jisie onwem ike, we sure àjà-nsure-ọku ahu.

13 Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n’iwu, bú nke O nyere gi n’iwu: n’ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n’ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi.

14 Ma ub͕u a ala-eze-gi agaghi-eguzosi ike: Jehova achọputaworo Onwe-ya otù nwoke dika obi-Ya si chọ, Jehova enyewo kwa ya iwu ibu onye-ndú ndi-Ya, n’ihi na i debeghi ihe ahu nke Jehova nyere gi n’iwu.

15 Samuel we bilie, si na Gilgal rigorue Gibea Benjamin. Sọl we gukota ndi Israel, bú ndi ahutara n’aka-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri.

16 Sọl, na Jonatan nwa-ya, na ndi ahutara n’aka-ha, we nọdu na Geba Benjamin: ma ndi Filistia mara ulo-ikwū-ha na Mikmash.

17 Ndi-nbibi we si n’ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta n’usu atọ: otù usu chere iru n’uzọ Ọfra, rue ala Shual:

18 otù usu we che iru n’uzọ Bet-horon: otù usu we che iru n’uzọ ókè-ala nke nēlekwasi ndagwurugwu Zeboim anya, n’ebe ọzara di.

19 Ma achọtaghi uzú ọ bula n’ala nile nke Israel: n’ihi na ndi Filistia siri, Ka ndi-Hibru we ghara ikpu mma-agha ma-ọbu ube:

20 Israel nile we ridakuru ndi Filistia iti ihe-ọlu-ha ufe, onye ọ bula ígwè-ikpọzè-ala-ya, na mma-ọgè-ya, na anyu-ike-ya, na ọ́gù-ya;

21 (ọnu ọ́gù na nke nma-ọgè na nke ndudu-ilu-ọlu-ubi na nke anyu-ike we ghara idi nkọ); na ikpu ọnu ndudu eji achu ehi.

22 O rue, n’ubọchi agha, na ahutaghi mma-agha ma-ọbu ube n’aka onye ọ bula n’etiti ndi soro Sọl na ndi soro Jonatan: ma ahutara n’aka Sọl na n’aka Jonatan nwa-ya.

23 Ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia we pua rue ngabiga Mikmash.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 14

1 Ubọchi we rue mb͕e Jonatan nwa Sọl siri nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, nke di n’ofè ọzọ ahu. Ma o gosighi nna-ya.

2 Ma Sọl nānọdu na nsọtu Gibea n’okpuru osisi pomegranate nke di na Migron: ndi nọ n’aka-ya ra ka nnù ndikom na ọgu iri;

3 Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo.

4 Ma n’etiti ngabiga abua ahu, nke Jonatan chọrọ isi na ha gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, otú ọnu nkume di elu di n’otù ofè, otù ọnu nkume di elu di kwa n’ofè ọzọ: aha otù bu Bozez, aha nke-ọzọ bu Sene.

5 Otù ọnu bu ogidi n’akuku Ugwu na ncherita-iru Mikmash, nke-ọzọ n’akuku Ndida na ncherita-iru Geba.

6 Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n’ihi na ihe-nb͕ochi adighi n’ebe Jehova nọ izọputa site n’iwere ọtutu madu ma-ọbu site n’iwere madu ole-na-ole.

7 Onye nēbu ihe-agha-ya we si ya, Me ihe nile nke di n’obi-gi: chigharia onwe-gi, le, mu onwem nēso gi dika obi-gi si chọ.

8 Jonatan we si, Le, ayi onwe-ayi nāgabiga rue ndikom ahu, ayi gēkpughe-kwa-ra ha onwe-ayi.

9 Ọ buru na ha asi ayi otú a, Guzonu du rue mb͕e ayi ruru unu aru; ayi gēguzo kwa n’ọnọdu-ayi, ayi agaghi-arigokuru kwa ha.

10 Ma ọ buru na ha asi otú a, Rigokutenu ayi; ayi gārigo kwa: n’ihi na Jehova enyewo ha n’aka-ayi: nka gābu-kwa-ra ayi ihe-iriba-ama.

11 Ha abua we kpughere ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia onwe-ha: ndi Filistia we si, Le, ndi-Hibru nēsi n’ọnu di iche iche ebe ha zoro onwe-ha puta.

12 Ndikom ebe-nguzo-ndi-agha ahu we za Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya, si, Rigokutenu ayi, ayi gēme kwa ka unu mara ihe. Jonatan we si onye nēbu ihe-agha-ya, Sorom n’azu rigo: n’ihi na Jehova enyewo ha n’aka Israel.

13 Jonatan we bikwasi aka-ya na ukwu-ya rigo, onye nēbu ihe-agha-ya nēso kwa ya n’azu: ha we da n’iru Jonatan; onye nēbu ihe-agha-ya nēme kwa ka ha nwua n’azu ya.

14 Ntib͕u mbu ahu, nke Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya tib͕uru, we ra ka orú ndikom, n’ihe ra ka nkera furrow nke otù acre ala-ubi n’ọtùtù.

15 Ọma-jijiji we di n’ọmuma-ulo-ikwū, na n’ọhia, na n’etiti ndi ahu nile; ndi ebe-nguzo-ndi-agha na ndi-nbibi, ha onwe-ha ma-kwa-ra jijiji: ala de-kwa-ra ùdé; o we ghọ ọma-jijiji nke Chineke.

16 Ndi-nche Sọl nwere na Gibea Benjamin we hu; ma, le, ìgwè madu ahu b͕azere, we nēje iru na azu.

17 Sọl we si ndi ya na ha nọ, Biko, gukọtanu, hu onye siworo n’etiti ayi pua. Ha we gukọta, ma, le, Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya anọghi ya.

18 Sọl we si Ahaija, Bute ib͕e Chineke nso. N’ihi na ib͕e Chineke di n’etiti umu Israel n’ubọchi ahu.

19 O rue, mb͕e Sọl nāgwa onye-nchu-àjà ahu okwu, na ùzù nke di n’ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia we nāda kari, nāga n’iru nāba kwa uba: Sọl we si onye-nchu-àjà, Sepu aka-gi.

20 Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n’agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di.

21 Ma ndi-Hibru ndi diri ndi Filistia na mb͕e gara aga, ndi soro ha rigo n’ọmuma-ulo-ikwū buruburu, ndi ahu we chighari kwa idi n’akuku Israel ndi nọ n’aka Sọl na Jonatan.

22 Ndikom nile nke Israel ndi zoro onwe-ha n’ugwu Efraim we nu na ndi Filistia ab͕alagawo, ha onwe-ha we sogidesi kwa ha ike n’agha ahu.

23 Jehova we zọputa Israel n’ubọchi ahu: agha ahu we gabiga rue Bet-even.

24 Ma achiri ndikom Israel n’ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m’bọsiri ọ́bọ̀ n’aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu.

25 Ndi ala ahu nile we ba n’oké ọhia; ma manu-aṅu di n’elu ọhia.

26 Ndi Israel we ba n’oké ọhia ahu, ma, le, manu-aṅu nērù erù: ma ọ dighi onye kwere ka aka-ya rue ọnu-ya; n’ihi na ndi Israel turu egwu ọb͕ub͕a-iyi ahu.

27 Ma Jonatan anughi mb͕e nna-ya b͕ara ndi Israel iyi: o we setipu ọnu-ọnu nkpa-n’aka nke di n’aka-ya, rutu ya nime ub͕ub͕ọ-manu-aṅu, weghachi aka-ya n’ọnu-ya; anya-ya we nwue enwu.

28 Otù nwoke n’etiti ndi Israel we za, si, Nna-gi b͕asiri ndi Israel iyi ike, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri ta. Ndi Israel we nāda #mbà.

29 Jonatan we si, Nnam emekpawo ala-ayi aru: biko, lenu na anyam enwuwo enwu, n’ihi na edetuwom nwantī manu-aṅu nka ire.

30 Ànya ndi Israel gēsi aṅa ghara inwukari enwu nke-uku, ma ọ buru na ha rijuru afọ ta site n’ihe-nkwata ndi-iro-ha nke ha hutara? n’ihi na ub͕u a ntib͕u n’etiti ndi Filistia abaghi uba.

31 Ha we tib͕ue ufọdu nime ndi Filistia n’ubọchi ahu site na Mikmash rue Ajalon: ndi Israel we da #mbà nke-uku.

32 Ndi Israel we dakwasi ihe akwatara n’agha, ha we chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na umu-ehi, b͕ue ha n’ala ahu: ndi Israel we rie ha na ọbara.

33 Ha we gosi Sọl, si, Le, ndi Israel nēmehie megide Jehova n’iri anu, ya na ọbara. O we si, Unu aghọwo aghughọ: kpọrekutem nkume uku ta.

34 Sọl we si, B͕asanu onwe-unu n’etiti ndi Israel, si ha, Wetaranum nso, nwoke ọ bula ehi-ya, na nwoke ọ bula aturu-ya, b͕u-kwa-nu ha n’ebe a, rie; unu emehie-kwa-la megide Jehova n’iri anu. ya na ọbara. Ndi Israel nile we weta nso, nwoke ọ bula ehi-ya n’aka-ya n’abali ahu, ha we b͕ue ha n’ebe ahu.

35 Sọl we wuere Jehova ebe-ichu-àjà: nke ahu ka ọ malitere iwu ka ọ buru ebe-ichu-àjà diri Jehova.

36 Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n’azu n’abali, luta ihe-ha n’agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n’etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n’anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n’ebe a.

37 Sọl we jua Jehova ase, si, M’gārida sochie ndi Filistia n’azu? Ì gēnye ha n’aka Israel? Ma Ọ zaghi ya n’ubọchi ahu.

38 Sọl we si, Biaruenu nso n’ebe a, unu ndi-isi nile nke ndi Israel: mara-kwa-nu hu ihe nke nmehie a diworo nime ya ta.

39 N’ihi na Jehova nādi ndu, Onye nāzọputa Israel; n’ezie ọ buru na ọ di nime Jonatan nwam, n’ezie ọ ghaghi inwu. Ma ọ dighi onye nāza ya okwu n’etiti ndi Israel nile.

40 O we si Israel nile, Unu onwe-unu nọ n’otù ofè, mu onwem na Jonatan nwam gānọ kwa n’ofè nke-ọzọ. Ndi Israel we si Sọl, Me ihe nke di nma n’anya-gi.

41 Sọl we si Jehova, bú Chineke Israel, Nye nzà zuru okè. Nzà we ma Jonatan na Sọl: ma ndi Israel puru ya.

42 Sọl we si, Fenu nzà n’etiti mu na Jonatan nwam. Nzà we ma Jonatan.

43 Sọl we si Jonatan, Gosim ihe i meworo. Jonatan we gosi ya, si, N’ezie ewerem ọnu-ọnu nkpa-n’aka nke di n’akam detu nwantī manu-aṅu ire; lem, m’gānwu.

44 Sọl we si, Chineke me otú a, me kwa ihe ọzọ otú a: n’ihi na i ghaghi inwu, Jonatan.

45 Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n’Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n’ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu.

46 Sọl we si n’iso ndi Filistia rigo: ndi Filistia we la n’ebe nke ha.

47 Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n’ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha.

48 O we me ihe dìnkpà, tib͕u kwa Amalek, we naputa Israel n’aka ndi nāpunara ha ihe.

49 Ma umu-ndikom Sọl bu Jonatan, na Ishvi, na Malki-shua: aha umu-ya ndinyom abua kwa: aha nke ada-ya bu Mirab, aha nke-ntà bu Maikal:

50 aha nwunye Sọl bu Ahinoam nwa Ahimaaz: aha onye-isi usu-ndi-agha-ya bu Abnea nwa Nea, nwa-nne nna Sọl.

51 Kish bu nna Sọl; Nea nna Abnea bu nwa Abiel.

52 Agha we sie ike megide ndi Filistia ubọchi nile nke Sọl: mb͕e Sọl huru nwoke ọ bula bu dike, ma-ọbu nwoke ọ bula bu dìnkpà, o were ya n’onwe-ya.